Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 11/1 p. 6
  • Nkwanye Ùgwù Maka Ịdị Nsọ nke Ndụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nkwanye Ùgwù Maka Ịdị Nsọ nke Ndụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Enyemaka Iji Nọgide Na-akwado Ịdị Nsọ nke Ọbara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Ọ Bụ Ezie Na M Kpuru Ìsì, Ahụrụ M Ụzọ!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Iji Ọbara Azọpụta Ndụ—N’ụzọ Dị Aṅaa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Anakweere M Echiche Chineke Banyere Ọbara
    Teta!—2003
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 11/1 p. 6

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

Nkwanye Ùgwù Maka Ịdị Nsọ nke Ndụ

BIBLE na-egosi na ọbara dị oké ọnụ ahịa n’anya Chineke na ọ na-amakwa ikpe iji ya na-eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. (Levitikọs 17:14; Ọrụ 15:19, 20, 28, 29) N’ihi ntụziaka ndị a nke Bible, Ndịàmà Jehova adịghị anakwere mmịnye ọbara.

Iji nyere ndị dọkịta na ndị ọrụ ụlọ ọgwụ aka ịghọta nguzo okpukpe nke Ndịàmà Jehova n’okwu a na iji ghọta na Ndịàmà ga-anakwere ụdị ọgwụgwọ ndị ọzọ, Watch Tower Society ahaziwo Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ (HLC) n’ala dị iche iche. Ndị òtù nke kọmitii a na-eleta ụlọ ọgwụ dị iche iche iji soro ndị ọrụ ahụ ike kwurịta okwu. N’oge na-adịbeghị anya, na obodo ukwu 12 dị na Poland, e nwere ihe karịrị 200 nzukọ dị iche iche, na-agụnye ihe karịrị 500 ndị dọkịta ahụ ike, karịsịa ndị isi ụlọ ọgwụ ma ọ bụ nke ngalaba dị iche iche nke ụlọ ọgwụ. Ihe na-esonụ mere mgbe e mere otu n’ime nleta dị otú ahụ:

“Otu nzukọ e mere na Cardio-Surgical Clinic dị na Zabrze bụ otu ihe a rụzuru nke kasị nwee ihe ịga nke ọma. Kemgbe 1986 ndị ọrụ ụlọ ọgwụ ahụ anọwo na-awa ụmụnna anyị ahụ n’ejighị ọbara. Ka ọ dị ugbu a, a wawo 40 ahụ dị otú ahụ. Ụlọ ọgwụ ahụ dị njikere ịnabata ndị ọrịa si Poland nile na ndị sikwa ofesi. Mgbe mkparịta ụka were 50 minit gasịrị, osote onye isi nke otu ngalaba ụlọ ọgwụ kọwaara otu ìgwè ndị ọrịa ndị ndị òtù nke HLC bụ wee sị: ‘Ndị a bụ Ndịàmà Jehova. Ha na-eso ụlọ ọgwụ anyị emekọrịta ihe, ha na-enyekwara anyị aka. Ọ bụghị nanị ndị kwere ekwe ibe ha kama ndị ọrịa ndị ọzọ na-eritekwa uru site n’enyemaka ha. N’ihi Ndịàmà Jehova, anyị enwewo ihe ido anya na a pụrụ ịwa mmadụ ahụ n’obi n’ejighị ọbara.

“‘Dị ka ihe atụ, anyị wara nwa ada a ahụ [na-atụ otu n’ime ndị ọrịa ya aka] n’ejighị ọbara, na Monday ọ ga-alakwa n’ụlọ ya. Ọ ga-amasị m ịrịba ama na anyị adịghị ejikebe ọbara eme ihe otu anyị si emebu n’ihi na ọ dị ize ndụ. A na-esi na ya enweta HIV, ịba ọcha n’anya, na agbakeghị ná ngwa.

“‘Abụ m onye Katọlik, ma n’ụlọ anyị anyị na-anabata echiche ndị ọzọ mgbe nile. Otu ụbọchị mụ na ụmụ m so na-ejegharị n’ámá egwuregwu Slaski Stadium. N’oge gara aga e legharawo ámá egwuregwu a anya, ma anyị rịbara ama na ọ gbanwewo gabiga otú a pụrụ ịmata ya. M jụrụ otu n’ime ndị na-arụ ọrụ n’ebe ahụ otú mgbanwe nke a si bịa. Ọ sịrị na ọ fọdụrụ nke nta ka ndị na-elekọta ebe ahụ tụfuo olileanya nke ilekọta ámá egwuregwu ahụ, ma e kwere ka Ndịàmà Jehova kwụta ụgwọ iji ya mee ihe, ha wee rụzigharịa ya.

“‘Ya mere ndị a bụ ndị anyị nile pụrụ ịmụta ihe dị ukwuu n’aka ha. Echere m na ná ngalaba ụlọ ọgwụ a anyị kwesịrị ịnabata echiche ndị ọzọ.’ Mgbe ahụ, n’ịtụ otu Onyeàmà a gaje ịwa ahụ n’ụbọchị ole na ole na-abịa aka, o kwuru, sị: ‘Nwa ada a bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova, a gajekwa ịwa ya ahụ n’ejighị ọbara.’”

Ọ bụ ezie na Ndịàmà Jehova adịghị amanye ndị ọzọ ịnakwere ihe ndị ha kwere, ha onwe ha na-agbaso ihe nlereanya nke ndị ozi ma ‘na-ekwenyere Chineke karịa mmadụ.’ (Ọrụ 5:29) Nke a na-agụnye ịkwanyere ọbara ùgwù. Ha na-enwe ekele mgbe ndị ọzọ kwanyeere ihe ido anya nile nke okpukpe ha n’okwu nke a ùgwù.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya