Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 11/15 p. 3-4
  • Ogologo Oge Hà Aṅaa Ka Ị Pụrụ Ịdị Ndụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ogologo Oge Hà Aṅaa Ka Ị Pụrụ Ịdị Ndụ?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọ̀ Bụ Ogologo Ndụ A Gbatịkwuru?
  • N’ihi Gịnị Ka Ndụ Ji Dị Mkpirikpi Otú A?
  • Mbọ Ndị Mmadụ Na-agba Ka Mmadụ Na-adị Ogologo Ndụ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2019
  • Olee Otú Ọchịchọ A Na-achọ Ndụ Ka Ogologo Pụrụ Isi Nwee Ihe Ịga nke Ọma?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Gịnị Mere Anyị Ji Aka Nká?
    Teta!—2006
  • Dịkwuo Ogologo Ndụ ma Nwee Ahụ Ịdị Mma
    Teta!—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 11/15 p. 3-4

Ogologo Oge Hà Aṅaa Ka Ị Pụrụ Ịdị Ndụ?

IHE ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime anyị ga-ekweta ozugbo na e nwere nsogbu dị iche iche n’ụzọ nke ndụ. N’agbanyeghị nke ahụ, obi dị anyị ụtọ ịdị ndụ. Nanị oge ịbụ nwata anyị ma ọ bụ ogologo ndụ dị mkpụmkpụ adịghị ezuru anyị; anyị ga-achọ idị ndụ ruo ọtụtụ afọ. Ka o sina dị, ọnwụ yiri ihe a na-apụghị izere ezere. Ọ̀ dị otú ahụ?

Ọ̀ pụrụ ikwe mee ime ka ọnwụ ghara ịbịa ngwa ngwa? À pụrụ ịgbatịkwu ogologo ndụ anyị?

Ọ̀ Bụ Ogologo Ndụ A Gbatịkwuru?

Na 1990 otu akụkọ mara ọkwa ohere e nwere iji gbatịkwuo ogologo ndụ mmadụ ruo “ọgụ afọ ise na iri.” Ihe ịrụ ụka adịghị ya na nke a bụ iji ụzọ nzuzo na-ezo aka n’okwu ndị a nke onye ọbụ abụ ahụ nke Bible bụ́ Mosis: “Ụbọchị nile nke afọ anyị bụ ọgụ afọ atọ na iri: ọ bụrụkwa na n’ihi ume ha abụrụ ọgụ afọ anọ, ma ume ha bụ ndọlị na iru újú; n’ihi na ngwa ngwa a na-ebipụ ya, anyị ewee felaga.” (Abụ Ọma 90:10, King James Version) Ya mere Bible na-enye 70 afọ ma ọ bụ 80 dị ka nkezi ogologo ndụ mmadụ. Ma ọnụ ọgụgụ afọ ole ka mmadụ pụrụ ịtụ anya ịdịru ndụ taa?

Akụkọ òtù WHO (World Health Organization) bipụtara na 1992 debere nkezi afọ ndụ a na-atụ anya ya gburugburu ụwa ịbụ 65 afọ. Dị ka WHO si kwuo, “a tụrụ anya ka nke a jiri ihe dị ka ọnwa anọ kwa afọ rịa elu n’afọ ise na-esonụ, karịsịa n’ihi ibelata ọnwụ ụmụ ọhụrụ.” Otú ọ dị, ọbụna ma ọ bụrụ na ọrụ ebube nkà ọgwụ na ahụ ike egbochie ọnwụ mmadụ tupu o ruo afọ ndụ nke 50, magazin bụ́ Time na-asị na na United States, “ịrị elu ná nkezi ogologo ndụ mmadụ ga-abụ nanị afọ 3 1/2.”

N’ihi Gịnị Ka Ndụ Ji Dị Mkpirikpi Otú A?

Dr. Jan Vijg nke ụlọ ọrụ Institute of Experimental Gerontology nke Netherlands na-arụ ụka na dị nnọọ ka e jikọrọ ọrịa ụfọdụ na ihe ndị na-adịzighị adịzi n’ọdịdị mkpụrụ ndụ ahụ mmadụ, otú ahụ ka o yiri ka ihe ndị metụtara ebumpụta ụwa hà na-emetụta usoro ịka nká. Ndị nnyocha ụfọdụ kwenyere na anyị pụrụ ibi ogologo ndụ karị ma ọ bụrụ na a pụrụ idochi “mkpụrụ ndụ ole na ole ndị bụ́ isi metụtara ebumpụta ụwa” ka anyị na-emewanye okenye. Ndị ọzọ na-akpọ nchepụta dị otú ahụ “echiche ụmụaka.”

Ka o sina dị, ndị mmụta sayensị kwenyere na “o yiri ka e nwere ụdị njedebe usoro ndụ a rụnyere n’ime mkpụrụ ndụ ahụ mmadụ,” ka magazin Time na-akọ. Ọbụna ndị na-arụ ụka na “a haziri anyị ịdịgide ndụ” na-ekwere na “ọ dị ihe na-agahie.” N’ezie, n’afọ ndụ 65, 70, ma ọ bụ 80 ma ọ bụ afọ ole na ole ọzọ, “ngwa ngwa a na-ebipụ” ndụ anyị n’ọnwụ, dị ka Bible kwuru.

Ma, onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi nke narị afọ mbụ O.A. ji obi ike buo amụma, sị: “Dị ka onye iro ikpeazụ, a gaje ime ka ọnwụ ghara ịdị irè.” (1 Ndị Kọrint 15:26) Olee otú a pụrụ isi weta ọnwụ ná ngwụsị? Ọbụna ma e mee ya, olee otú ị pụrụ isi nagide ọnwụ nke ndị a hụrụ n’anya taa?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya