Ọzụzụ Gilead n’Okwukwe nke Kasị Nsọ
“A ZỤWO ụmụ akwụkwọ anyị n’ime okwukwe kasị nsọ.” Ndị a bụ okwu ndị e ji meghee usoro ihe omume ngụsị akwụkwọ nke klasị nke 95 nke Watchtower Bible School of Gilead, nke e mere na Sunday, September 12, 1993. N’ụtụtụ ahụ 4,614 ndị ọbịa a kpọrọ akpọ na ndị òtù ezinụlọ Betel bụ́ ndị zukọrọ n’Ụlọ Mgbakọ Jersey City bụ ndị George Gangas duru n’ekpere mmeghe. Nwanna Gangas abụwo onye òtù ezinụlọ Betel ruo 65 afọ, n’afọ ndụ nke 97 kwa ọ bụ onye kasị mee okenye so n’Òtù Na-achị Isi.
Albert Schroeder, onye nọkwa n’Òtù Na-achị Isi na onye isi oche usoro ihe omume ahụ, kwuru, sị: “Ruo ọnwa ise usoro agụmakwụkwọ Gilead adaberewo n’okwukwe nke kasị nsọ.” Ma gịnị bụ “okwukwe kasị nsọ”? Ọ kọwara na “okwukwe nke kasị nsọ” nke a, nke e hotara na Jud 20, bụ ọ̀tụ̀tụ̀ dum nke eziokwu Bible. Ya mere usoro agụmakwụkwọ Gilead dabeere n’Okwu Jehova, Bible, bụ́ akwụkwọ ọgụgụ ya bụ isi.
Ụmụ Akwụkwọ Anatakwuo Ntụziaka
Ọkà okwu mbụ bụ John Stuefloten nke Kọmitii Ugbo Watchtower, onye kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Irite Uru Site ná Mmetụta nke Ndị Maara Ihe.” Bible na-ekwu na ndị ‘na-ejeso ndị maara ihe ga-amakwa ihe.’ (Ilu 13:20) N’oge agụmakwụkwọ Gilead ahụ, ụmụ akwụkwọ ahụ tinyere ihe karịrị 900 hour n’imụ Bible. Nwanna Stuefloten jụrụ ụmụ akwụkwọ ahụ, sị: “Olee otú mmetụta Jehova ga-esi nwee ike n’ahụ unu n’ọdịnihu? Unu na-aga ná mba 18 nwere ngụkọta ụba mmadụ nke ihe dị ka 170 nde mmadụ. Ya mere olee otú unu ga-esi nwee mmetụta n’ahụ ndị ahụ?” Site n’igosipụta amamihe Jehova, ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ ahụ ga-enwe ike inyere ndị ọzọ aka ịghọ ndị na-efe Jehova, bụ́ Isi Iyi nke amamihe na-enweghị nsọtụ.
“Ịghọrọ Mmadụ Nile Ihe Nile” bụ isiokwu nke okwu sochiri, nke Lloyd Barry nke Òtù Na-achị Isi kwuru. (1 Ndị Kọrint 9:22, King James Version) Ihe dị ka 45 afọ gara aga, Nwanna Barry n’onwe ya bụ nwa akwụkwọ nke klasị nke 11 nke Gilead. Ugbu a klasị nke 95 nwere obi ekele ịnata ndụmọdụ bara uru site n’aka onye bụbu onye ozi ala ọzọ nke nwere ọtụtụ afọ nke ahụmahụ n’ala na-abụghị nke ya. Ọ gbara ụmụ akwụkwọ ahụ ume ikwekọ ngwa ngwa n’usoro ndị nọ n’ókèala ọhụrụ ha nke ala n’abụghị nke ha site n’ịmata ọdịbendị ha na ịmụta asụsụ obodo ahụ. Ọ sịrị na a pụrụ ime nke a n’ụzọ kasị mma site n’iso ndị obodo na-emekọrịta ihe ma na-arụkọ ọrụ nakwa site n’ịmụta omenala ha na iji ha na-eme ihe mgbe ọ bụla o kwesịrị ekwesị.
Ọzọ, Dean Songer so na Kọmitii Ebe Obibi Akwụkwọ kwuru okwu n’isiokwu ahụ na-akpali mmasị bụ́ “Inwere Onwe Onye Pụọ n’Ọrụ.” Mgbe ihe karịrị 35 afọ nke ije ozi oge nile gasịrị, Nwanna Songer ghọtara ihe ọ pụtara bụ́ ibi ndụ dị mfe nke nwere ihe mgbaru ọsọ doro anya, na-atụkwasị uche n’ọrụ e ji n’aka, nwere onwe ya pụọ ná nchegbu nile nke ihe onwunwe. Nke ahụ bụkwa isi ihe nke ndụmọdụ ya nye ụmụ akwụkwọ ahụ. E mere ka ndị ọbụ abụ nọ n’ụlọ nsọ Jehova nwere onwe ha pụọ n’ọrụ ndị Livaị ndị ọzọ na-arụkarị iji tinye onwe ha n’ụzọ zuru ezu n’ọrụ pụrụ iche e kenyere ha. (1 Ihe Emere 9:33) N’otu aka ahụ, e mewo ka ndị ozi ala ọzọ Gilead nwere onwe ha pụọ n’ihe nkịtị ndị dị otú ahụ dị ka ọrụ ego ka ha wee nwee ike ịtụkwasị uche ha n’ije ozi ha pụrụ iche. Nwanna Songer mechiri n’okwu ịdọ aka ná ntị a: “Mee ka ụzọ isi ele ihe anya bụrụ nke e ji n’aka, meekwa ka ndụ gị dị mfe. Ibu ọrụ unu dị ka ndị e mere ka ha nwere onwe ha pụọ n’ọrụ bụ ịnọ n’ọrụ ahụ ma n’ehihie ma n’abalị, na-eto Jehova.”
Daniel Sydlik so n’Òtù Na-achị Isi sochiri n’isiokwu bụ́ “Ịkụziri Ndị Ọzọ Ụzọ Isi Nweta Ihe Kachasị Mma ná Ndụ.” Ọ gbara ụmụ akwụkwọ ahụ ume “ịkụzi ọ bụghị nanị ozizi kamakwa inwe nkwuwa okwu zuru ezu iji gosi ndị mmadụ ihe ha na-aghaghị ime iji mee ka ndụ ha kwekọọ n’uche Chineke.” Ezigbo ndị nkụzi aghaghị ịdị na-akpali akpali. “Buru n’uche iwulite ụkpụrụ ndị Kraịst kama nanị ịkụzi ụkpụrụ iwu na ntụziaka dị iche iche,” ka o kwuru ma kwukwasị ná mmechi: “Karịsịa ihe nile, ezi ụmụnna m, kụziere onwe unu, kụziekwara ndị ọzọ ụzọ isi hụ n’anya, n’ihi na ọ bụ ihe nkekọ nke izu okè.”—1 Ndị Kọrint 13:1-3; Ndị Kọlọsi 3:14.
Mgbe ọnwa ole na ole nke ọzụzụ gasịrị, ụmụ akwụkwọ ahụ zụlitere mmasị ịhụnanya karịsịa n’ebe ndị nkụzi abụọ ha nke Gilead nọ. Jack Redford, onye ozi ala ọzọ n’onwe ya n’oge mbụ, bu ụzọ kwuo okwu, n’isiokwu bụ́ “Unu Emewo Nhọrọ nke Ziri Ezi.” N’ụwa ndị Juu oge ochie, tupu ọ ghọọ onye ozi ndị Kraịst, Pọl nwere ọkwá, ùgwù, ike, na akụ̀. Ma ná Ndị Filipaị 3:8, Pọl kọwara ihe a dum dị ka ‘ihe mkpofu,’ ma ọ bụ ‘ihe unyi,’ dị ka nsụgharị Phillips si tinye ya. Obi ya dị n’ozi ahụ, o mekwara nhọrọ nke ziri ezi. N’ụzọ dị iche, ihe ka n’ihe a kpọrọ mmadụ taa na-egosi site ná nhọrọ ha dị iche iche ná ndụ na ha na-ewere ihe onwunwe ndị ha nwere dị ka ihe dị uru karịa ndụ ebighị ebi. Ndị ozi ala ọzọ nke Gilead emewo nhọrọ nke ziri ezi. Jack Redford mechiri site n’ịsị: “E nweghị ihe ụwa Ekwensu pụrụ inye unu nke a pụrụ iji tụnyere ije ozi ala ọzọ. Lekọta ihe ùgwù ahụ dị oké ọnụ ahịa, hapụkwa ụwa ka o lekọta ihe unyi ya!”
Ruo 32 afọ gara aga, Ulysses Glass abụwo onye nkụzi nke Gilead. O nyere ụmụ akwụkwọ ahụ ndụmọdụ gaa nke ọma nke nwere isiokwu bụ́ “Nanị Chineke Pụrụ Ime Osisi,” na-adabere okwu ya n’Abụ Ọma 1:3. Nkà na ụzụ ọgbara ọhụrụ adịbeghị mgbe o nwere ike imepụta ihe yiri ụzọ e si mee osisi, bụ́ nke Chineke haziri. N’otu echiche, ezi ndị Kraịst dị ka osisi, ndị Jehova kụrụ, na-akwọsakwa mmiri. Nwanna Glass rịbara ama na ruo ọnwa ise, ụmụ akwụkwọ ahụ abụwo ndị “a gbara mmiri mgbe nile site n’ọnụ mmiri nke mmiri ndị na-enye ndụ dị n’Okwu Chineke,” dị ka osisi ndị dị n’ugbo ime mmụọ ma ọ bụ paradaịs. Ma, dị ka ndị ozi ala ọzọ, ha aghaghị ichekwa “usoro ha nke mkpọrọgwu ime mmụọ megide mmebi ọ bụla.” A gbara ha ume ka ha ‘nọgide na-aṅụ mmiri nke ndụ site n’aka Jehova n’ihi na nanị Chineke pụrụ ime osisi.’
Carey Barber, onye so n’Òtù Na-achị Isi, kwuru okwu ikpeazụ. Mgbe 70 afọ gasịrị nke ije ozi oge nile, Nwanna Barber pụrụ iji obi ike kwuo okwu n’isiokwu bụ́ “Nye Jehova Nsọpụrụ A Na-ekeghị Eke.” Ihe ka nnọọ n’ọnụ ọgụgụ ihe a kpọrọ mmadụ enyebeghị Jehova nsọpụrụ a na-ekeghị eke. (Deuterọnọmi 5:9) Otú ọ dị, dị ka Nwanna Barber gosiri, n’agbanyeghị ezughị okè anyị, “ọ pụrụ nnọọ ikwe mee inyefe Chineke onwe anyị kpam kpam.” O kwukwasịrị: “Ọ dịghị onye pụrụ ikwu n’ezie sị: ‘Ekwensu mere ka m mee ya.’” Ma Ekwensu pụrụ imeri anyị ma ọ bụrụ na anyị ahapụ iguzogide ya. (Jemes 4:7) Iji ọrụ n’aka n’ọrụ Jehova bụ ụzọ kasị mma isi guzogide Setan na ụwa ya na inye Jehova nsọpụrụ a na-ekeghị eke.
Ndị A Họpụtara dị ka Ndị Ozi Ala Ọzọ
Usoro ihe omume ụtụtụ ahụ mechiri n’ezi nhọpụta nke 46 ụmụ akwụkwọ dum ahụ dị ka ndị ozi ala ọzọ. Di na nwunye 23 ahụ natara akwụkwọ ngụsị akwụkwọ nke na-ekwu n’akụkụ ụfọdụ na ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ “ruru eru n’ụzọ pụrụ iche ịrụ ọrụ nkụzi, ịkwalite ezi ihe na ịrụ ọrụ maka udo na-adịgide adịgide na iwu nke ndokwa zuru okè na ezi omume n’etiti ndị nile.” Klasị nke 95 nke Gilead gaje n’ezie ịgbalịsi ike ịrụzu ọrụ a e buliri elu ná mba 18 e zigaworo ha. Ọrụ e kenyere ha gbasara n’akụkụ nile nke ụwa, na-agụnyekwa mba ndị dị n’Esia, Africa, Europe, Latin America, na Caribbean.
N’ehihie, mgbe Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche e biri nkenke gasịrị bụ́ nke Charles Woody so na Kọmitii Ngalaba Ije Ozi duziri, ndị ngụsị akwụkwọ ọhụrụ ahụ nke Gilead mere usoro ihe omume ụlọ akwụkwọ ha, n’isiokwu bụ́ “Gilead Akwadebewo Anyị Ịkụzi Ihe dị ka Ndị Ozi Ala Ọzọ.” Nnọkọ ahụ ji ihe nkiri bụ́ “Nhọrọ Ndị Na-eche Anyị Ihu” mechie.
Mgbe usoro ihe omume a na-akpali akpali gasịrị, ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ ahụ dịzi njikere ugbu a ka e ziga ha ná nkuku anọ nke ụwa iji soro ndị ọzọ kerịta “okwukwe nke kasị nsọ.”
[Igbe dị na peeji nke 26]
Ihe Banyere Klasị Ahụ
Ọnụ ọgụgụ mba ha si bịa: 7
Ọnụ ọgụgụ mba e zijere ha: 18
Ọnụ ọgụgụ ụmụ akwụkwọ: 46
Ọnụ ọgụgụ ndị di na nwunye: 23
Nkezi afọ ndụ: 30.06
Nkezi afọ ha nọworo n’eziokwu: 12.92
Nkezi afọ ha nọworo n’ozi oge nile: 9.4
[Foto dị na peeji nke 26]
Ndị Na-agụsị Akwụkwọ na Klasị nke 95 nke Watchtower Bible School of Gilead
Ná ndepụta dị n’okpuru, e nyere ahịrị ndị ahụ nọmba site n’ihu gaa n’azụ, e depụtakwara aha ha site n’aka ekpe gaa n’aka nri n’ahịrị nke ọ bụla.
(1) Buelow, D.; Donzé, V.; Innes, S.; Fulk, N.; Billingsby, M.; Hoddinott, L.; Nygren, B.; Eriksson, L. (2) Boker, J.; Thomas, M.; Stedman, S.; Billingsby, D.; Waugh, I.; Purves, M.; Luttrell, M.
(3) Jacobsen, T.; Boker, J.; Martínez, L.; Nilsson, E.; Purves, P.; Holt, L.; Larsen, M.; Jones, L. (4) Numminen, P.; Numminen, H.; Buelow, M.; Olson, W.; Holt, S.; Donzé, G.; DesJardins, C.; DesJardins, D. (5) Larsen, K.; Martínez, D.; Nygren, P.; Waugh, P.; Jones, D.; Hoddinott, J.; Thomas, G. (6) Innes, B.; Fulk, R.; Eriksson, A.; Nilsson, S.; Stedman, J.; Olson, K.; Jacobsen, F.; Luttrell, J.