Ma n’Ọwụwa Anyanwụ ma n’Ọdịda Anyanwụ, Jehova Na-enye Ndị Ya Ume
N’ÓKÈALA ebe a machibidoro ọrụ nkwusa ahụ iwu, n’ala ndị ime ihe ike tirisịrị, na ná mba ebe ndị a ka wepụrụ mmachibido iwu—n’ezie, n’ubi ụwa nile—Jehova nọgidere na-enye Ndịàmà ya “ọkịka nke ike.”—2 Ndị Kọrint 4:7.
Ụba n’Okpuru Mmachibido Iwu
N’otu obere agwaetiti nke Ime Ime Ọwụwa Anyanwụ, a machibidowo ọrụ nkwusa ahụ iwu ruo afọ 17 ugbu a. À kụdara Ndịàmà nọ n’ebe ahụ obi? Ọ dịghị ma ọlị! Na May gara aga, ha ruru ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu bụ́ 10,756 nke ndị nkwusa, nke 1,297 n’ime ha na-eje ozi dị ka ndị ozi oge nile. Ka ọnọdụ ụwa na-eretọ, ndị agwaetiti ahụ na-achọkarị ịṅa ntị n’eziokwu ahụ. Ya mere ha anọwo na-enye akụkọ 15,654 ọmụmụ Bible n’ebe obibi ndị nwere mmasị. Tupu mgbe ahụ, 25,397 gara nzukọ ndị e mere ná nzuzo iji cheta ọnwụ Jisọs.
Mgbe Mgbakọ Distrikti “Izi Ihe Chineke” weere ọnọdụ—ọzọkwa n’ụzọ akọ dị ka ọnọdụ e nwere n’ebe ahụ si dị—o mere ụmụnna ahụ obi ụtọ inweta, n’asụsụ nke ha, otu akwụkwọ ndị ahụ e wepụtaworo na United States. Ndị nsụgharị okwu, ndị ngụgharị, na ndị ọzọ enyewo onwe ha n’afọ ofufo ịrụkwu ọrụ ọtụtụ hour ka ha wee nwee ike ịkwadebe akwụkwọ bụ isi e wepụtara, ya na ọtụtụ narị peji ya, n’oge. Otu ụlọ ọrụ kwa na-abụghị nke anyị, bụ́ nke na-ebi akwụkwọ, nwekwara obi ụtọ ịrụ ọrụ mara mma n’ibi akwụkwọ ahụ na ịpịakọta ya. Ndị bịara mgbakọ ahụ nwere obi ụtọ ịnata akwụkwọ a, ya na njupụta nke ihe karịrị otu puku foto ndị mara mma dị na ya. Ọtụtụ ndị ọrụ gọọmenti na-akwanyere Ndịàmà Jehova ùgwù, mmegide na-abịakwa karịsịa site n’aka ndị ụkọchukwu Krisendọm. A na-ele anya na n’isi nso a ga-ewepụ mmachibido iwu ahụ.
Gịnị Banyere Kọntinenti Ndị Dị n’America?
Ndịàmà Jehova nọ ná mba Ọdịda Anyanwụ ndị a na ụmụnna ha n’Ọwụwa Anyanwụ dị n’otu n’iji obi ike na-anagide nsogbu ha nile, mmụọ nsọ Jehova na-enyekwara ha aka imeri ọnọdụ ndị siri ike. Were, dị ka ihe atụ, akụkọ na-esonụ nke sitere n’otu ala Latin America ebe ndị òtù ahịa ọgwụ ọjọọ na-ejegharịkarị n’oké ọhịa nile.
Otu ìgwè Ndịàmà ji bọs gaa n’otu ókèala dịpụrụ adịpụ. Ka ha si na bọs na-arịtu, ha hụrụ otu obere ụzọ dị n’akụkụ nke si n’obodo nta ahụ na-apụ. Ya mere ụmụnna ise ahụ gbasoro ya iji mara ebe ụzọ ájá ahụ gara, na-ekenye ụmụnna ndị nwanyị na ụmụaka ịrụ ọrụ n’obodo nta ahụ. Otu n’ime ụmụnna ahụ na-akọ, sị:
“Anyị hụrụ nanị ụlọ ole na ole mgbe anyị gbasoworo ụzọ ahụ ruo hour abụọ. Mgbe ahụ, ndị ikom asatọ bu ngwá agha bụ́ ndị ji ihe kpuchie ihu ha si n’ọhịa pụta na mberede. Ụfọdụ bu égbè na-awụpụ mgbọ, ụfọdụ bukwa mma oge. Gịnị ka anyị zuteworo? Anyị malitere ịjụ ihe ha chọrọ, ma a gwara anyị ka anyị nọrọ duu ma ghara ikwu okwu—nanị zọrọ ije na-aga n’ihu. Anyị mere otú ahụ! Hour abụọ ọzọ nke ịga ije gabiga otu oké ọhịa wetara anyị n’otu ebe a sụchara asụcha nke na-aghaghị ịbụ ogige ndị agha. Ndị nche bu égbè nọ n’ebe nile. N’etiti e nwere otu ụlọ e wuru nke ọma bụ́ ebe e duuru anyị gaa.
“Ozugbo anyị nọdụrụ ala, otu onye yiri onye isi ogige ahụ gwara anyị okwu. O yi uwe dị mma, gụọ akwụkwọ nke ọma, ma dị nnọọ ùgwù. Ọ tụrụ otu n’ime ụmụnna nọ n’ìgwè anyị aka ma gwa ya ka o guzo ọtọ. O wee jụọ ya sị: ‘Gịnị ka i chere banyere òtù [anyị]?’ N’ịmata nke ọma ebe anyị nọ, nwanna ahụ zaghachiri: ‘Ee m, anyị maara banyere òtù unu, ma anyị enweghị mmasị na ya ma ọ bụ n’òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọ bụla ọzọ. Nanị ihe kpatara anyị ji nọrọ ebe a bụ ikwusa banyere Alaeze Jehova Chineke n’aka Kraịst Jisọs. N’isi nso ọ ga-ebibi gọọmenti nile nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’usoro ihe dị ugbu a ma wetara ndị mmadụ ngọzi ndị dị ebube n’elu ụwa nke a n’okpuru ọnọdụ nile nke Paradaịs—ihe ọ na-adịghị mmadụ ma ọ bụ òtù ụmụ mmadụ pụrụ ime ya.’
“Àgwà nwoke ahụ gbanwere. Ọ malitere ịjụ ajụjụ. ‘Ebee ka unu mụtara ihe a dum? Olee otú e si kwadebe unu ikwu okwu otú ahụ?’ Ruo otu hour na ọkara, anyị nwere ike ịgba àmà dị mma banyere ọnọdụ ụwa ma gosi na Bible na-akọwa olileanya e nwere nanị ya maka ihe a kpọrọ mmadụ. Anyị kọwakwara Ndị Rom isi nke 13—na anyị na-erubere ndị nọ n’ike ọchịchị isi, ma mgbe e nwere esemokwu n’etiti Okwu Jehova na nke ha, anyị na-ebu ụzọ erubere Chineke anyị bụ́ Jehova isi. N’ikpeazụ, anyị nyefere ya akwụkwọ ndị anyị ji. O weere atọ n’ime ha na otu Bible na, n’oké ijuanya nye anyị, nye anyị ụtụ maka ha. O kwuru na ya ga-agụ ha.
“Ọzọ, onye ndú ahụ feere otu n’ime ndị ikom ahụ aka ka ọ kpọpụ anyị n’ogige ahụ. Ngwa ngwa, anyị nọ n’ụzọ ụla, na-ekele Jehova maka mmeri anyị nwere n’akụkụ ọzọ nke ịgba àmà.”
N’Africa Esemokwu Tikpọsịrị
N’ebe etiti n’agbata Ime Ime Ọwụwa Anyanwụ na ime ime Ọdịda Anyanwụ ka e nwere kọntinenti Africa. Mburịta agha nke ebo dị iche iche emewo ka mba ụfọdụ n’ebe ahụ ghọọ ebe oké ọgba aghara nke ime ihe ike. Na Liberia, ntiwapụ nke agha obodo emetụtawokwa ndị Jehova nke ukwuu ọzọ. Nke mbụ a lụrụ ọgụ n’ime na gburugburu isi obodo n’ime ọnwa October na November 1992. E mesịa, ka agha ahụ gbasaara gaa n’ebe ugwu, e kposasịrị ọgbakọ dum dị iche iche ebe ụmụnna sooro ndị ọzọ bi n’ebe ndị ahụ gbalaga n’ọhịa. Otú ọ dị, ịnụ ọkụ n’obi ha anọgidewo n’anyụghị anyụ. Ka ha na-agba ọsọ, ha na-eme nkwusa, nke a akpatawokwa ịgba àmà dị ukwuu n’akụkụ ndị dịkarịsịrị anya n’ime obodo.
Otu ọgbakọ nke ụmụnna a chụpụrụ n’ebe obibi ha mejupụtara wuru Ụlọ Nzukọ Alaeze na-adịru nwa oge n’etiti ugbo osisi rọba. N’otu obodo ukwu dị nso ebe ndị agha kasị nwee nkà nọ, n’oge ehihie ndị nkịtị ga-agbalaga n’ugbo rọba dị gburugburu iji zere ịbụ ndị a tụrụ bọmbụ site n’elu. Ụmụnna bi n’ebe ahụ (gụnyere ọtụtụ ndị nkwusa a chụpụrụ n’ụlọ ha site n’isi obodo, Monrovia) haziri ozi ubi, a pụkwara ịhụ ha mgbe mgbe ka ha na-ekwusara ọtụtụ puku mmadụ ahụ zopụrụ n’okpuru osisi rọba ozi ọma! Mgbe ọ bụla ụgbọ elu rutere nso, ụmụnna nwoke na nwanyị ndị ahụ na-awụbanye n’olulu dị nso, e mesịakwa, mgbe ihe ize ndụ ahụ gafere, ha agaa n’ihu n’ịkpọtụrụ ndị mmadụ.
N’ụzọ na-atụ n’anya, ihe karịrị otu puku ndị nkwusa ọgbakọ ndị nwere ike izitere Society akụkọ ozi ha eruwo ná nkezi, n’agbanyeghị ọnọdụ nile nke agha obodo ahụ, 18.1 hour n’ozi ubi, ha na-eduzikwa 3,111 ọmụmụ Bible kwa ọnwa.
N’Africa n’ime afọ anọ gara aga, e wepụwo ihe mgbochi ndị e tinyere n’ọrụ Ndịàmà Jehova na 18 mba. Leekwa ihe oké ọṅụ dara! N’August 12, e wepụrụ iwu a machibidoro Ndịàmà na Malawi bụ́ nke a mara n’October 1967. Ime nkwusa nke ozi ọma ahụ n’okpuru anọwo na-aga n’ihu, ma ugbu a Ndịàmà nwere ike ịga n’ihu n’enweghị ihe mgbochi, ọ bụ ezie na ha gaje ichere mbilite n’ọnwụ iji keleekwa ọzọ ọtụtụ ndị ibe ha bụ́ ndị ndị mkpagbu ahụ gbuworo.
Na Mozambique, nkwekọrịta udo malitere ịdị irè n’October 4, 1992. A na-eru ugbu a n’ókèala ndị a na-apụghị ịga na ha na mbụ n’ihi agha mbibi ahụ a lụrụ n’afọ 16 gara aga. N’akụkụ Carioco, a maliteghachiri ịnụta okwu site n’ọnụ 375 ụmụnna nwoke na nwanyị ndị na-apụghị iso nzukọ ahụ nwee mmekọrịta n’afọ asaa gara aga. E mere mgbakọ pụrụ iche nke were otu ụbọchị na Milange, bụ́ isi obodo nke mpaghara a mabuuru dị ka ebe e nwere ogige ịta ahụhụ na ebe “nzigharị ihe” maka Ndịàmà Jehova, nke ọtụtụ n’ime ha bụ ndị gbara ọsọ agha site Malawi. Ngụkọta dị ịtụnanya nke 2,915 mmadụ bịara, gụnyere onye isi obodo ahụ, bụ́ onye nabatara Ndịàmà Jehova. Ya mere ebe “nzigharị ihe” mbụ ahụ ghọrọ ebe a na-enye ozizi Chineke maka ụbọchị ahụ.
Otu onye ozi ala ọzọ na-ede, sị: “Banyere ụmụnna anyị chọtara onwe ha n’ogige ndị ọsọ agha ndị dị na Tete Province, onye nnọchite anya nke òtù UNHCR (United Nations High Commissioner for Refugees) chọpụtara ihe na-adọrọ mmasị. Ọ sịrị na Ndịàmà Jehova ahaziwo ogige ndị nke ha, nke dị iche site n’ìgwè ndị ọzọ. ‘Ogige ha,’ ka ọ sịrị, ‘bụ nanị nke a na-elekọta nke ọma,’ na-ekwukwasị, ‘Ndịàmà Jehova na-adị ọcha, na-adị n’usoro, bụrụkwa ndị a zụrụ azụ.’ O wee sị ka ya buru m n’ụgbọ elu banye n’ọhịa ka m jiri anya m hụ. Site n’elu, onye na-anya ụgbọ elu ahụ tụrụ aka n’ogige abụọ. Otu dị nkịkara ma ruo unyi, a rụkọtasịa ụlọ ájá aghara aghara. A haziri nke ọzọ nke ọma, mee ka ụlọ nile dịpụsịara onwe ha n’ahịrị n’ahịrị n’akụkụ ụzọ. Ụlọ ndị ahụ dị ọcha n’ile anya, nwee èzí a zara aza. E jidị àgbà ha mepụtara n’onwe ha tee ụfọdụ. ‘Kọkene nke bụ nke ndị òtù unu?’ ka ọkwọ ụgbọ elu ahụ kwuru. Ọ bụ oké ihe ọṅụ nye m izute ụmụnna nọ n’ogige nke a. E nwere ugbu a ọgbakọ asatọ n’obodo nta nke a nke Ndịàmà.”
‘N’Ala Ugo’
Ee e, nke a abụghị ugo United States! N’etiti Ọwụwa Anyanwụ na Ọdịda Anyanwụ ka otu mba Europe, Albania, dị, aha ya n’asụsụ mba ahụ ji eme ihe, Shqipëria, na-apụta “Ala Ugo.” N’isi nso a, e wepụwo mmachibido iwu obi ọjọọ were 50 afọ megide Ndịàmà Jehova n’ala a, ha nwekwara ike iso ụmụnna ha sitere Ọwụwa Anyanwụ na site n’Ọdịda Anyanwụ dị n’otu n’inwe nnwere onwe nke ofufe. N’ezie ha ‘na-azụchapụta oge.’ (Ndị Efesọs 5:16) E mere mgbakọ mbụ n’akụkọ ihe mere eme nke Albania, mgbakọ otu ụbọchị, n’ámá National Theater, n’isi obodo bụ́ Tiranë, na Sunday, March 21. N’ehihie Saturday ìgwè 75 mmadụ ndị ọrụ afọ ofufo bụ́ Ndịàmà emewo ka ebe nzukọ na-adakpọsị adakpọsị ghọọ ụlọ mgbakọ na-egbukepụ egbukepụ, nke dị ọcha. O nyeghị ndị na-elekọta ya ọnụ okwu. A ga-arịbakwa ama na n’ime 75 mmadụ ndị ọrụ afọ ofufo ahụ, nanị 20 ka e meworo baptism!
Ọnọdụ ihu igwe dị nnọọ mma. Ka ndị bịara site n’ofesi na-erute, ekele—karịsịa site ná mmegharị ahụ na mmakụ—mere ụbọchị mgbakọ ahụ pụrụ iche nke pụrụ nnọọ iche. Ka ọ chiliri aka ya abụọ elu, Nwanna Nasho Dori kpere ekpere mmeghe. E mere ya baptism na 1930, ọ naghị ahụchakwa ụzọ. E mere usoro ihe omume ahụ n’asụsụ Albanian, akụkụ ka ukwuu site n’ọnụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche si ofesi. Mmadụ 585 bịara ya bụrụ abụ ahụ bụ́ “Christian Dedication” (Nraranye Ndị Kraịst)—otu n’ime abụ isii a sụgharịrị gaa n’asụsụ Albanian maka ihe omume ahụ—ka 41 ụmụnna nwoke na nwanyị ndị ọhụrụ zọọrọ ije pụọ ịga n’ọdọ mmiri nke ụmụnna si Gris bịa jiworo obi ọma guzobe n’ime Ụlọ Nzukọ Alaeze dị n’ebe ahụ. Leenụ mgbanwe nke ahụ bụ! N’oge mbụ, inwe Bible pụtara ịga n’ogige ọrụ ike, a kpakwaara nzukọ nile ókè ịbụ ìgwè nke mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ.
Ụbọchị na-eso mgbakọ ahụ, ụlọ ọrụ Watch Tower natara òkù telifon site n’aka onye ntụzi nke ámá egwuregwu ahụ. Dị ka ọ na-adịkarị, onye jiri ámá egwuregwu ahụ mee ihe adịghị agbasakarị ya. Ọ bụ ọrụ osote onye ntụzi ahụ. Ma ọ sịrị: “M ghaghị nnọọ ịkpọ òkù iji kelee unu. M hụtụbeghị ka ebe a dị ọcha otu a. A sị m kọwaa ya, m ga-asị na ikuku sitere n’eluigwe kukwasara ámá egwuregwu anyị ụnyaahụ. Mgbe ọ bụla unu ga-achọ iji ihe owuwu anyị mee ihe, biko bịaghachinụ, unu ga-abụkwa ndị mbụ anyị ga-atụle. Leenụ, anyị ga-achọ nnọọ ka unu na-abịa ọnwa atọ ọ bụla n’anaghị unu ego ọ bụla.”
Ndịàmà ahụ lọghachiri n’obodo ha dị ka ndị a gbara ume, nwee obi ekele ma malite ịkwadebe maka Ememe Ncheta nke ọnwụ Jisọs. Nanị ụbọchị 15 n’ihu, na Tuesday, April 6, e mere Ememe Ncheta nke mbụ e mere n’ìhè n’ebe asaa.
N’obodo Berat, ọnụ ọgụgụ ndị na-abịa nzukọ arịruwo 170, oké iwe jikwa ụkọchukwu nọ n’ebe ahụ. N’ime 33 ndị nkwusa Alaeze nọ na Berat, e mere 21 baptism ná mgbakọ ahụ. Berat nyere akụkọ 472 mmadụ ndị bịara Ememe Ncheta ahụ. Ọnụ ọgụgụ ndị ọzọ bịara Ememe Ncheta ahụ dịkwa ịrịba ama, karịsịa n’ihi ezi nduzi ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche nyere.
N’obodo Albania a kasị nwee ndị Katọlik, bụ́ Shkodër, ebe e nwere basilika, chọọchị ahụ malitere ibipụta otu mpempe akwụkwọ a na-ekesara ndị chọọchị kwa ọnwa, mbipụta nke ọ bụla abụwokwa maka “Ụzọ Isi Zere Ndịàmà Jehova.” Mbipụta nke ikpeazụ sịrị: “Ndịàmà Jehova ewegharawo Shkodër”! Usuu buru ibu nke Ndịàmà abụọ nọ n’ebe ahụ chịkọtara 74 mmadụ na-akpazi àgwà ma na-eji ihe a kpọrọ ihe n’Ememe Ncheta. Mgbe ha nụsịrị okwu Ememe Ncheta ahụ, ezinụlọ 15 rịọrọ maka ọmụmụ Bible ebe obibi. N’obodo ọzọ, Durres, ebe e nwere usuu nke Ndịàmà anọ, ọnụ ọgụgụ ndị bịara bụ 79 magburu onwe ya.
N’ihi mmegide nke ndị ntorobịa bụ́ ndị Katọlik, bụ́ ndị yiri egwu iji nkume chụlaga Ndịàmà, Ememe Ncheta ahụ n’obodo nta dị n’elu ugwu bụ́ Kalmeti i Vogel bụ nke e bufere n’ebe obibi nke otu nwanna nwoke n’ebe ahụ, ebe 22 mmadụ zukọrọ n’udo. E nwere ndị nkwusa ise n’ìgwè a, nke e mere atọ n’ime ha baptism ná mgbakọ e nwere na Tiranë.
Na Vlorë ụmụ okorobịa abụọ natara otu Ụlọ Nche, gụọ ya, wee detara Society akwụkwọ: “Anyị na-akpọzi onwe anyị ugbu a Ndịàmà Jehova n’ihi eziokwu anyị mụtaworo n’Ụlọ Nche ahụ. Biko ziterenụ anyị enyemaka.” E kenyere ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche abụọ ọrụ n’ebe ahụ, otu n’ime ụmụ okorobịa ndị a mere ngwa ngwa iru eru dị ka onye nkwusa. Obi dị ya ụtọ iso n’etiti 64 mmadụ bịara Ememe Ncheta ahụ na Vlorë.
Otu nwanna nwoke bụ onye Albania bụ́ onye mụtara eziokwu ahụ na United States lọghachitere n’afọ ndị 1950 n’obodo nna ya bụ́ Gjirokastër, ebe o jere ozi ruo ókè o kwere omume ruo ọnwụ ya. Ọ kụnyere mkpụrụ nke eziokwu n’obi nwa ya nwoke. Mgbe e wepụrụ mmachibido iwu ahụ, nwa nwoke a rịọrọ Watch Tower Society maka enyemaka. Onye ọzọ nwere mmasị nke bi n’otu obodo nta dị nnọọ n’akụkụ ebe ugwu edetawokwa akwụkwọ maka enyemaka, ya mere e zigara ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche anọ n’ebe ahụ. N’ụtụtụ Wednesday na-esote Ememe Ncheta ahụ, otu n’ime ha kpọrọ ụlọ ọrụ Society dị na Tiranë òkù: “M pụghị ịghara ịkọrọ unu oké ọrụ mmụọ Jehova rụworo. Obi dị anyị ụtọ nke ukwuu. Ememe Ncheta ahụ gara nnọọ nke ọma.” Ọnụ ọgụgụ ndị bịara bụ 106, gụnyere ìgwè ndị nkwusa asaa nke Alaeze.
Gịnị banyere ngụkọta ọnụ ọgụgụ ndị bịara Ememe Ncheta? Na 1992, mgbe e nwere nanị 30 ndị nkwusa Alaeze, ọnụ ọgụgụ ndị bịara ya bụ 325. Na 1993, 131 ndị nkwusa ahụ achịkọtawo 1,318 mmadụ bịaranụ. N’afọ abụọ ahụ, ọnụ ọgụgụ ndị bịara abụwo okpukpu iri nke ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa. Lee ka o si bụrụ ihe na-akpali akpali ịhụ ka ‘onye nta na-aghọ otu puku’ n’ime oge dị mkpụmkpụ otú ahụ!—Aịsaịa 60:22.
“Mee Ka Ụdọ Gị Nile Dị Ogologo”
Ka ọrụ nkwusa nke Ndịàmà Jehova na-agbasawanye banye n’akụkụ nile nke ụwa, a na-akpọ òkù ahụ bụ́: “Mee ka ebe ụlọikwuu gị saa mbara, ka ha setịakwa ákwà nkwụba nile nke ebe obibi gị nile; egbochila: mee ka ụdọ gị nile dị ogologo, meekwa ka ntu gị nile dị ike. N’ihi na n’aka nri na n’aka ekpe ka ị ga-agbasa.” (Aịsaịa 54:2, 3) Mgbasa nke a ‘n’ebe obibi nile’ nke Chineke—nke ọgbakọ zuru ụwa ọnụ nke ndị na-efe ya ofufe nọchitere anya ya—apụtawo nnọọ ìhè n’Ọwụwa Anyanwụ Europe, karịsịa n’ala ndị nke Soviet Union oge mbụ. Ka ọ kwadosịrị ndị na-ejere ya ozi n’ọtụtụ iri afọ nke mmegbu, ugbu a Jehova na-enye Ndịàmà ya ume dị ike a chọrọ iji gbasawanye ma mee ka nzukọ ahụ siwanye ike.
Na Moscow, Russia, n’ámá egwuregwu Locomotive Stadium, na July 22-25, ọnụ ọgụgụ kasị elu bụ́ 23,743 bịara mgbakọ mba dị iche iche dị ịrịba ama nke usoro afọ gara aga nke “Izi Ihe Chineke.” Ònye gaara eche na nke a ga-ekwe omume, ọbụna afọ abụọ gara aga? Ma leenụ ha n’ebe ahụ! Ihe karịrị 1,000 mmadụ si Japan na Korea bịa, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 4,000 sitere United States na Canada, ọtụtụ puku ndị ọzọ sitekwara n’ihe karịrị 30 mba n’Ebe Ndịda Pacific, Africa, Europe, na ebe ndị ọzọ—n’ezie nzute nke Ọwụwa Anyanwụ na Ọdịda Anyanwụ. Lee aha agbamume ọ bụụrụ ndị a nile inwere onwe ha iso ihe karịrị 15,000 ụmụnna ha ndị ikom na ndị inyom bụ́ ndị Russia na-akpakọrịta! E nwere ọṅụ dị ukwuu.
E mere ngụkọta na-atụ n’anya nke 1,489 Ndịàmà ọhụrụ baptism. Usoro mgbasa akụkọ gbasara akụkọ baptism ahụ gburugburu ụwa nke ukwuu, gụnyere foto mara mma na peji mbụ nke The New York Times. Ọ bụ ezie na aka a kụrụ n’oge baptism ahụ dara ka ụda égbè eluigwe, a kụrụ nke karịrị ya n’okwu ikpeazụ mgbe, ka ọkà okwu kelesịrị 4,752 ndị ọrụ afọ ofufo na ndị nlekọta ọrụ nyeworo aka n’ime ka mgbakọ ahụ gaa nke ọma, o wee kwuo, sị: “Karịsịa ihe nile, anyị na-ekele Jehova!” Ee, mmụọ Jehova ejighachiwo mmegide siri ike nke ndị okpukpe Orthodox ma nye ume dị mkpa nke mere mgbakọ ahụ ji bụrụ ihe mere eme nke na-akpali akpali.
Otú ọ dị, nke kanụ ka na-abịa, n’obodo Kiev nke Ukraine, August 5-8. Ọzọ, ndị ọrụ afọ ofufo nyefere onwe ha rụzigharịrị kpam kpam ámá egwuregwu ahụ, nnukwute Ụlọ Nzukọ Alaeze nke a batakwara 64,714 mmadụ dị ka ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị bịara. Ọzọkwa, Ndịàmà ahụ sitere n’Ọwụwa Anyanwụ na Ọdịda Anyanwụ na n’ebe nile dị n’etiti. A sụgharịrị okwu ndị bụ isi n’asụsụ 12. A ghaghị ije zute ihe dị ka 53,000 ndị bịaranụ, ndị ji ụgbọ ndị na-ebu ọtụtụ mmadụ bịa, n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè na ọdụ ụgbọ elu dị iche iche wee buga ha n’ebe e nyere ha ụlọ n’ụlọ oriri na ọṅụṅụ dị iche iche, ụlọ akwụkwọ, na n’ebe obibi ndị mmadụ, nakwa n’ụgbọ mmiri. E mezuru ihe a dum ná mmefu ego dị nta n’ụzọ gara werewere na ịdị irè nke nhazi nke mere ka ndị uwe ojii obodo ahụ kwuo okwu inwe ijuanya na otuto.
Akụkụ kasị pụta ìhè n’usoro ihe omume mgbakọ ahụ na-akpali akpali bụ baptism ahụ, nke were hour abụọ na ọkara dum. Ngụkọta nke 7,402 ụmụnna ọhụrụ bụ́ ndị ikom na ndị inyom gosipụtara nrara ha nye Jehova, ebe aka a na-akụ dagidere ụda gburugburu nnukwute ámá egwuregwu ahụ. Nke a karịrị ọnụ ọgụgụ kasị elu e nwetụworo mgbe ọ bụla nke ndị e mere baptism bụ́ 7,136 nke e mere ndekọ ya mgbe 253,922 ndị bịara mgbakọ zukọrọ na New York City na 1958.
Ka oge ikpe a na-aga n’ihu ugbu a iru ọgwụgwụ ya, a na-achịkọta ndị yiri atụrụ site n’Ọwụwa Anyanwụ, Ọdịda Anyanwụ, na ọbụna site ‘n’ebe ụwa sọtụrụ’ banye n’ịdị n’otu nke na-enweghị atụ n’akụkọ ihe mere eme nile nke ihe a kpọrọ mmadụ. N’ezie, “oké ìgwè mmadụ . . . ndị si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile” na-esonyere Israel ime mmụọ n’ikwupụta okwukwe ha n’àjà mgbapụta dị oké ọnụ ahịa nke Jisọs, ntọala nke ihe nile a na-arụzu n’iwepụ ịchịisi ọkaaka Jehova n’ụta.—Ọrụ 1:8; Mkpughe 7:4, 9, 10.
[Foto ndị dị na peeji nke 8, 9]
Ọwụwa Anyanwụ ezute Ọdịda Anyanwụ na Moscow na Kiev