Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 1/15 p. 24-30
  • Mgbakọ Ndị Na-akpali Akpali Na-akwalite Izi Ihe Chineke

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mgbakọ Ndị Na-akpali Akpali Na-akwalite Izi Ihe Chineke
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ehihie nke Ụbọchị Mbụ
  • Ụtụtụ nke Abụọ
  • Ehihie nke Abụọ
  • Ụtụtụ Ụbọchị nke Atọ
  • Ehihie Ụbọchị nke Atọ
  • Ụtụtụ nke Anọ
  • Ehihie nke Ikpeazụ
  • A Gbaa Ndị Na-ezi Okwu Chineke Ume Ịrụzu Ọrụ Ha
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • “Ndị Nkwusa Alaeze Na-anụ Ọkụ n’Obi” Ejiri Ọṅụ Gbakọta
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Nye Chineke Otuto—Ọ Bụghị Mmadụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Ndị Na-eme Okwu Chineke Na-enweta Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 1/15 p. 24-30

Mgbakọ Ndị Na-akpali Akpali Na-akwalite Izi Ihe Chineke

TAA, ụwa na-enwe oké njubiga ókè nke ihe ọmụma. Na telivishọn na redio, n’ụdị nke akwụkwọ ma ọ bụ site na kọmputa, e nwere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ njupụta nke ihe ọmụma na-adịghị agwụ agwụ n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ isiokwu ọ bụla a pụrụ ichepụta. Ma, ndị mmadụ ka na-arịakwa ọrịa ma na-anwụ. Mpụ, agụụ, na ịda ogbenye dị n’ụwa nile, ọrịa nke mmetụta uche na-ejidekwa ọtụtụ ndị mmadụ karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Ihe ọmụma nile e nwere adawo n’idozi ọnọdụ ndị dịnụ. N’ihi gịnị? N’ihi na ihe a kpọrọ mmadụ agbakụtawo amamihe Chineke azụ.

Mgbe ahụ, lee ka o si kwesị ekwesị na “Izi Ihe Chineke” bụ isiokwu a họpụtara maka mgbakọ Ndịàmà Jehova nwere n’oge na-adịbeghị anya! Usoro ihe omume ahụ chetaara ndị bịaranụ na ọ bụ nanị ozizi nke a na-achọta n’Okwu Chineke, bụ́ Bible, nwere ezi abamuru nke ichebe ndụ.

Mgbakọ nke mbụ malitere na Thursday, June 3, na Uniondale, New York, U.S.A. Site na mgbe ahụ gaa n’ihu, e mere usoro ihe omume ahụ n’obodo ukwu dị iche iche ná mba dị iche iche, na-ejedebe na kọntinent nke Africa na Ndịda America.

Ehihie nke Ụbọchị Mbụ

Ụbọchị ọ bụla nwere isiokwu nke na-emesi otu akụkụ nke izi ihe Chineke ike. Dị ka ihe atụ, usoro ihe omume nke ụbọchị mbụ dabeere n’isiokwu bụ “Ịmata Ozizi ahụ nke Sitere n’Aka Chineke.” (Jọn 7:17) A kọwara echiche nke a nke ọma ka ụbọchị ahụ na-aga n’ihu.

Mgbe abụ na ekpere gasịrị, onye isi oche mgbakọ ji okwu nke isiokwu ya bụ “Izi Ihe Chineke Na-ejikọta Anyị Ọnụ” mepee usoro ihe omume ahụ. O gosiri na a na-ejikọ ndị Jehova ọnụ site n’ịmụta ụzọ Ya na ijegharị n’okporo ụzọ Ya. (Maịka 4:​1-⁠5) Izi ihe Chineke na-eme ka ịdị n’otu ha siwanye ike. A gbara ndị bịara mgbakọ ume ka ha na-aṅụrị n’ofufe ha e jikọrọ ọnụ.​—⁠Abụ Ọma 133:​1-⁠3.

Nwa obere oge n’ehihie ahụ, e kwuru banyere nzukọ ndị a na-enwe mgbe nile n’ọgbakọ n’usoro isiokwu nke isiokwu ya bụ “Nzukọ Ndị Na-enye Anyị Ntụziaka Banyere Ụzọ Nile nke Jehova.” Onye ọkà okwu nke mbụ chetaara ndị bịara mgbakọ na mgbe anyị zukọrọ n’otu, anyị na-asọpụrụ Jehova ma si otú a na-anata ngọzi Ya. Onye ọkà okwu nke na-eso mesiri mkpa ọ dị ike ikere òkè ná nzukọ dị iche iche. N’ime otú ahụ, anyị na-eto Jehova n’ihu ọha, na-egosipụta okwukwe anyị, ma na-ewusi okwukwe ndị ọzọ ike. Onye ọkà okwu nke atọ n’usoro isiokwu ahụ gosiri mkpa nke itinye ihe anyị na-amụta ná nzukọ n’ọrụ. Anyị aghaghị ịbụ ‘ndị na-eme okwu ahụ, ọ bụghị ndị na-anụ nanị ọnụnụ.’​—⁠Jemes 1:22.

Ihe sochiri bụ okwu mara mma banyere ịbụ abụ otuto nye Jehova. Abụ sitere n’ala ala obi bụ akụkụ dị mkpa nke ofufe anyị. Okwu bụ isi, nke bụ “Izi Ihe Chineke Na-enwe Mmeri” sochiri okwu nke a. Lee isiokwu magburu onwe ya ọ bụ! “Jehova bụ Isi Iyi nke izi ihe kasị mma nke onye ọ bụla pụrụ inweta,” ka onye ọkà okwu ahụ kwuru. Mgbe o kwusiri okwu nke nta banyere ọrụ ebube nke ụbụrụ mmadụ, ọ sịrị: “Anyị kwesịrị iji ikike iche echiche anyị mee ihe n’ụzọ bụ isi iji nata izi ihe Chineke. Ọ bụ nanị ya na-arụpụta ezi amamihe.” Lee ka o si bụrụ eziokwu!

Ụtụtụ nke Abụọ

“Na-achọ Ozizi nke Onye Nzọpụta Anyị bụ́ Chineke Mma” bụ isiokwu ụbọchị nke abụọ nke mgbakọ ahụ. (Taịtọs 2:10) Ụkpụrụ nke a pụtara ìhè n’okwu bụ́ “Izi Ihe Chineke Megide Ozizi Ndị Mmụọ Ọjọọ.” Ee, ndị mmụọ ọjọọ nwere ozizi ha. (1 Timoti 4:1) Dị ka onye ọkà okwu ahụ kọwara, izi ihe Chineke na-emeri “amamihe” Setan site n’ikpughe ozizi ụgha na ụzọ aghụghọ dị iche iche nke Ekwensu. N’ihi nke a, ihe dị ka 4,500,000 ndị Kraịst obi ha ziri ezi abụkwaghị ndị ohu ọzọ n’ọchịchịrị nke Setan.​—⁠Jọn 8:32.

Ma, anyị kwesịrị ịnọgide na-eguzogide Setan. E mesiri nke a ike n’okwu bụ́ “Ị̀ Na-eguzogide Mmụọ nke Ụwa?” Mmụọ ụwa nke a na-egbu egbu. Ọ na-agba ume inwe omume rụrụ arụ, iji nnupụisi na-ele ịbụisi anya, na inwe ọchịchọ ịkwakọba ihe onwunwe. Onye Kraịst kwesịrị inyocha onwe ya mgbe nile. Ọ̀ ka nwekwara ụkpụrụ ndị dị elu mgbe a bịara n’ihe ọ na-ekiri, ihe ọ na-ege ntị, ma ọ bụ ihe ọ na-agụ? N’ụzọ nke ịgba ume, onye ọkà okwu ahụ sịrị: “Anyị na-aja unu mma, ụmụnna ndị nwoke, nwanyị, na ndị na-eto eto, maka ezi mgbalị unu malitewororị itinye n’akụkụ nke a.”​—⁠1 Jọn 2:​15-⁠17.

E nwere ihe na-eme ka o sie ike iguzogide mmụọ nke ụwa. Gịnị ka ọ bụ? Anyị nile bụ ndị na-ezughị okè. N’eziokwu, Jisọs nwụrụ n’ihi mmehie anyị, ma anyị ka kwesịkwara ibuso mkpali nke ime mmehie agha. A tụlere nke a n’okwu bụ́ “Ịlụ Ọgụ Megide Aka Mmehie Ji Anụ Ahụ Dara Ada.” Tinyere ihe ndị ọzọ, onye ọkà okwu ahụ sịrị na anyị pụrụ imeri n’agha anyị na-ebuso mmehie ma ọ bụrụ na anyị eyikwasị mmadụ ọhụrụ ahụ ma zere ihe ọ bụla na-akwado mkpali nke anyị ime mmehie.

“Mee Ka Ozizi Na-enye Ezi Ndụ Bụrụ Ụzọ Ndụ Gị” bụ isiokwu nke okwu sochiri. Ụfọdụ ndị na-enwe nchegbu gabigara ókè banyere ahụ ike elu ahụ ha. Ma n’eziokwu, ahụ ike ime mmụọ dị mkpa nke ukwuu karị. Onye ọkà okwu ahụ mesiri ike mkpa ọ dị iji ibu ọrụ anyị kpọrọ ihe n’akụkụ nke a, o nwekwara okwu na-agba ume karịsịa maka ndị inyom bụ́ ndị Kraịst. Ọ sịrị: “Anyị nwere ekele nke ukwuu maka ma ụmụnna ndị nwanyị meworo okenye ma ndị ka na-eto eto bụ́ ndị guzoziri nke ọma n’ịnụ ọkụ n’obi ha maka ozi ahụ na n’ilekọta ibu ọrụ ndị ha nwere n’onwe ha.” Ee, anyị nile na-ekelekwa Jehova maka ozizi na-enye ezi ndụ nke setịpụrụ anyị iche n’ebe ụwa dị.

Ihe e ji mechie usoro ihe omume nke ụtụtụ bụ okwu bụ́ “Izi Ihe Chineke Na-ekpughe Nzube nke Ndụ.” Onye ọkà okwu ahụ sịrị: “N’oge ụfọdụ, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile na-ajụ sị, ‘Gịnị bụ nzube nke ndụ?’” N’iji okwu arụmụka ndị siri ike mee ihe, o gosipụtara na ọ bụ nanị Bible na-enye ezi azịza n’ajụjụ ahụ. Mgbe ahụ onye ọkà okwu ahụ gosiri na nkwa ndị dị ebube nke Chineke na-enye anyị nzube ná ndụ n’ụzọ dị irè. Eleghị anya ọtụtụ ndị na-ege ntị na-eche sị, ‘Nke a bụ nnọọ ihe ndị nọ n’ókèala m kwesịrị ịnụ.’ Òtù Na-achị Isi kwenyere. Ná ngwụsị nke okwu a, e wepụtara akwụkwọ nta ọhụrụ aha ya bụ Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Lee aha ọṅụ mmadụ nile nwere! Nkwụsịtụ nke oge ehihie nyere ohere ileba anya n’akwụkwọ ọhụrụ nke a.

Ehihie nke Abụọ

Okwu mbụ nke ehihie nwere isiokwu na-akasi obi nke bụ “Tụkwasị Jehova Nchegbu Gị Nile.” Ọtụtụ ihe na-akpata nchegbu; ma, Okwu Chineke na-asị na anyị kwesịrị ịtụkwasị ya nchegbu anyị nile. (1 Pita 5:​6, 7) N’eziokwu, nsogbu ụfọdụ na-adịgide, banyekwara nke a onye ọkà okwu ahụ gbara ume, sị: ‘Nwee ndidi. Chere Jehova. Kweresie ike na ịgbaso Bible bụ ihe kasị mma mgbe nile. Ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi anyị, anyị ga-enweta “udo nke Chineke” nke kachasị uche nile.’​—⁠Ndị Filipaị 4:​6, 7.

Okwu anọ ndị sochiri gosiri na izi ihe Chineke metụtara ndụ ezinụlọ. Nke mbụ, bụ́ “Ime Alụmdi na Nwunye Njikọ Na-adịgide Adịgide,” chetaara ndị bịara mgbakọ na n’anya Jehova alụmdi na nwunye abụghị ihe a pụrụ ịgbahapụ, dị ka ọtụtụ si ele ya anya n’ụwa. Otú ọ dị, iji nweta ihe ịga nke ọma n’alụmdi na nwunye, anyị aghaghị ịgbaso nduzi Jehova. Ọ bụ ya mere anyị. Ya mere, Okwu ya nke e dere n’ike mmụọ nsọ nwere ndụmọdụ kasị mma dịnụ banyere alụmdi na nwunye.

Okwu bụ́ “Rụsie Ọrụ Ike Maka Nzọpụta nke Ezinụlọ Gị” kwuru banyere ihe ịma aka nke ilekọta ezinụlọ n’oge ndị a dị oké egwu. (2 Timoti 3:1) Ndị mụrụ ụmụ na-akụziri ụmụ ha ịdị ọcha nke elu ahụ, ezi àgwà, otú e si arụ ọrụ, na otú e si emesapụ aka ma na-eche banyere ndị ọzọ. Nke ka mkpa, ha aghaghị ịkụziri ụmụ ha ịbụ ndị ozi Jehova raara onwe ha nye.​—⁠Ilu 22:6.

N’okwu nke na-eso, “Ndị Nne na Nna, Ụmụ Unu Nwere Mkpa Nlekọta Pụrụ Iche,” onye ọkà okwu ahụ chetaara ndị bịara mgbakọ mkpa nke ịja ụmụaka mma, ọ bụ ezie na ha agaghịkwa eleghara adịghị ike ha anya. Ndị mụrụ ụmụ aghaghị ịmụrụ anya karịsịa banyere ọnọdụ ndị na-eduga n’emeghị ihe n’eziokwu, ịhụnanya ihe onwunwe, ma ọ bụ ịchọ ọdịmma onwe onye nanị.

Ndị na-eto eto bịara mgbakọ ahụ gere ntị nke ọma karịsịa n’okwu bụ́ “Ndị Ntorobịa​—⁠Ozizi Ònye Ka Unu Na-ege Ntị?” Ihe na-esiri ndị Kraịst na-eto eto ike taa. Ịgbaso ụwa dị mfe, ma nke a na-eduje n’ọnwụ. Ọ bụ ezie na ịrapagide n’izi ihe Chineke na-achọ obi ike n’aka onye na-eto eto, ọ na-eweta ngọzi dị ukwuu ugbu a na ndụ ebighị ebi nke na-abịanụ.​—⁠1 Timoti 4:8.

Ụbọchị nke abụọ ji ihe nkiri na-enye obi ụtọ bụ́ Ndị Ntorobịa Ndị Na-echeta Onye Kere Ha Ugbu A bịa ná njedebe. N’okwu mmalite, onye nduzi kpọrọ ndị ntorobịa nọ ná nzukọ Chineke “òtù ndị agha ọchịchị Chineke nke ji ịnọgidesi ike n’ihe na-ekere òkè n’ije ozi a raara nye Jehova Chineke na Eze ya a họpụtara ahọpụta, bụ́ Kraịst Jisọs.” O kwukwara, sị: “Ndị anyị na-eto eto na-arụzu ihe dị mma!” Ihe nkiri ahụ gosiri n’ụzọ pụtara ìhè na ọ bụrụ na nne ma ọ bụ nna azụọ nwata nke ọma, nke ahụ ga-abara nwa ahụ uru mgbe o toro ma na-efe Jehova n’onwe nke ya.

Ụtụtụ Ụbọchị nke Atọ

Isiokwu ụbọchị nke atọ bụ́ “Gaanụ n’Ihu Na-ezi Ndị nke Mba Nile Ihe.” (Matiu 28:​19, 20) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndị bịara mgbakọ tụrụ anya ịnata ndụmọdụ bịara n’oge ya banyere ọrụ nkwusa ahụ, olileanya ha akụghịkwa afọ n’ala. Usoro isiokwu nke a kpọrọ “Iji Ọṅụ Na-arụzu Ọrụ Nkwusa na Izi Ihe Anyị” mesiri mkpebi ha ike ịnọgide na-ekere òkè n’ọrụ ịgba àmà. Okwu mmalite kọrọ banyere ọbịbịa mbụ; okwu nke abụọ, banyere nletaghachi; nke atọ kwa, banyere ọmụmụ Bible. A kpọwo ndị ozi ala ọzọ gburugburu ụwa òkù ịla ụlọ ma soro ezinụlọ ha na ndị enyi ha gaa otu mgbakọ. N’ebe ụfọdụ, ndị ozi ala keere òkè n’akụkụ nke a nke usoro ihe omume ahụ. Ọ bụ ihe na-enye ọṅụ inweta ihe ọmụma ụfọdụ banyere ihe ịga nke ọma ha na-enwe n’ebe ha ketara ọrụ. Nke ọzọ, bụ́ “Iji Ozi Ọma ahụ Na-erute Mmadụ Nile” tụlere mmetụta ịgba àmà mberede na-enwe.

E ji okwu baptism, nke na-abụ akụkụ na-apụta ìhè ná nnukwu nzukọ nke Ndịàmà Jehova, mechie nnọkọ ụtụtụ ahụ. N’ọtụtụ mgbakọ dị iche iche, ìgwè dị ukwuu nke ndị raara onwe ha nye ọhụrụ guzoro n’ihu ìgwè mmadụ zukọrọnụ ma jiri obi ike zaa ee n’ajụjụ abụọ ndị ahụ a jụrụ ha. Mgbe ahụ e mere ha baptism ihu ọha. Lee ihe àmà dị ike ọ bụ nye mmetụta dị ukwuu nke izi ihe Chineke!

Ehihie Ụbọchị nke Atọ

Usoro ihe omume nke ehihie ji okwu dị omimi nke Akwụkwọ Nsọ malite. Ndịàmà Jehova maara okwu ndị dị na Matiu isi nke 24 na Luk isi nke 21. Ụfọdụ ndị hà chere na ọ dịghị ihe ọhụrụ ọ bụla a pụrụ ikwu banyere isiakwụkwọ ndị a nke Bible? Lee ka ha si hie ụzọ! Okwu ndị bụ́ “Gịnị Ga-abụkwa Ihe Ịrịba Ama nke Ọnụnọ Gị?” na “Gwa Anyị, Olee Mgbe Ihe Ndị A Ga-abụ?” mere ka ndị bịara mgbakọ nụrụ okwu dabeere n’akụkụ dị iche iche nke isiakwụkwọ abụọ ndị ahụ ma nye nkọwa ọhụrụ ndị e nwere banyere amaokwu ụfọdụ. E nwere mkparịta ụka ndị na-akpali akpali mgbe nnọkọ ahụ gasịrị ka ndị bịara mgbakọ na-atụlerịta ihe ha mụtara iji hụ ma hà ghọtara isi ihe ndị ahụ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na a ga-aza ọtụtụ ajụjụ mgbe a ga-ebipụta ihe ọmụma nke a n’Ụlọ Nche.

Isiokwu nke ọmụmụ Bible gara n’ihu n’okwu bụ́ “Azịza Ndị Na-enye Ihe Ọmụma nye Ajụjụ Bible Gị Dị Iche Iche.” Mgbe ahụ usoro ihe omume ahụ dọọrọ uche gaa n’akụkụ dị iche. Afọ 1993 kara akara ememe afọ 50 nke ụlọ akwụkwọ Watchtower Bible School of Gilead. Okwu bụ́ “Iri Afọ Ise nke Ọzụzụ na Ọrụ Ije Ozi Ala Ọzọ nke Gilead” gosiri ndị bịara mgbakọ ihe a rụzuworo n’ime oge ahụ. Ọ bụrụ na e nwere ndị ozi ala ọzọ ọ bụla nọ ya mgbe a na-ekwu okwu bụ́ “Ihe Ndị A Rụzuru n’Ime Nkwusa n’Ime Ubi Zuru Ụwa Ọnụ,” a kpọlitere ha ka ha soro ndị na-ege ntị kerịta ụfọdụ n’ahụmahụ ndị ha nwere. Ịnụ akụkọ ozi ndị ozi ala ọzọ ahụ bụ ihe na-akpali akpali!

Okwu na-eso, bụ́ “Ihe Mere Ndịàmà Jehova Ji Anọgide na Nche,” bụ ihe ọmụmụ ọzọ n’akụkọ ihe mere eme. O gosiri na ndị Kraịst anọrọworị na nche site na narị afọ mbụ O.A. ruo ugbu a. Nke ahụ dujere n’ihe ịtụnanya ọzọ. Ná mmalite okwu nke na-eso, nke a kpọrọ “Ndị Nkwusa Alaeze Na-arụsi Ọrụ Ike n’Ụwa Nile,” onye ọkà okwu bulitere akwụkwọ buru ibu (mgbe e nweworo ya n’asụsụ obodo ahụ) ma sị: “Ọ bụ ihe obi ụtọ ịma ọkwa n’ebe a taa mwepụta nke akwụkwọ ọhụrụ nke a, nke a kpọrọ Jehovah’s Witnesses​—⁠Proclaimers of God’s Kingdom.” Akwụkwọ ahụ nwere ndekọ zuru ezu nke akụkọ ihe mere eme oge dị ugbu a nke Ndịàmà Jehova. Ọ na-akọ akụkọ na-akpali akpali nke inwe ntachi obi, mkpebi siri ike, na ihe ịga nke ọma, na-enye ihe àmà siri ike nke mmụọ Jehova ịrụsi ọrụ ike n’ahụ ndị na-ejere ya ozi.

Ụtụtụ nke Anọ

Ọ bụrụworị ụbọchị ikpeazụ nke mgbakọ ahụ. Isiokwu ụbọchị ahụ, bụ́ “Ime Ka Izi Ihe Chineke Baara Anyị Onwe Anyị Uru,” yiri ka ọ na-aga ịbụ mmechi mara mma nke usoro ihe omume ahụ. (Aịsaịa 48:17) N’ụtụtụ e mere ka ige ntị nke ndị bịara mgbakọ dịgidesie ike n’usoro isiokwu nke nwere okwu atọ ndị kpụ ọkụ n’ọnụ. N’ịbụ nke a kpọrọ “Ozi Ịdọ Aka ná Ntị Jeremaịa nke Sitere n’Ike Mmụọ Nsọ​—⁠Maka Oge Gara Aga na Ugbu A,” usoro isiokwu ahụ nwere ntụle amaokwu nile nke Jeremaịa isi nke 23, 24, na 25. Lee ozi siri ike nke dị n’isiakwụkwọ ndị a! Ndị Israel na-ekwesịghị ntụkwasị obi nke oge Jeremaịa aghaghị ịkụjaworị n’ịdọ aka ná ntị ya nke ezoghị ọnụ, nke sitere n’ọnụ Chineke. Ụwa nile kụjara ọbụna karị mgbe e mezuru ịdọ aka ná ntị ndị ahụ. Ihe ọ̀ dị iche taa? Ọ dịghị ma ọlị. Ndịàmà Jehova ji obi ike na-ekwusa ozi amamikpe nke Chineke. N’ikpeazụ, usoro ihe a nile dị ugbu a aghaghị iche ihe Jehova kpere n’ikpe ihu. Nke ahụ ga-apụta mbibi nye ụwa Setan kpam kpam.

Ụtụtụ Sunday ji ihe nkiri nke abụọ bụ́ Abụla Onye E Duhiere ma ọ bụ Onye Na-elelị Chineke bịa ná njedebe. N’ụzọ pụtara ìhè, o gosiri otú izi ihe Chineke pụrụ isi chebe anyị pụọ n’ịbụ ndị vidio na egwú ndị rụrụ arụ metụtara nakwa pụọ n’àgwà nke ịkụnye esemokwu n’etiti ndị Kraịst ibe anyị. Ná ngwụsị nke ihe nkiri ahụ, onye isi oche hotara okwu ndị a na-akpali iche echiche nke otu n’ime ndị so mee ihe nkịrị ahụ: “Anyị abụghị ndị mmetụta ụwa na-apụghị ịdakwasị. Ọ bụrụ na anyị eguzogideghị ya, ụwa pụrụ iji ụzọ aghụghọ metọọ echiche anyị. Ma ànyị nọgidekwara na-ekwesị ntụkwasị obi ma ọ bụ na anyị anọgideghị ga-adabere n’ihe anyị nọworo na-akụ.” Lee ka nke ahụ si bụrụ eziokwu!

Ehihie nke Ikpeazụ

Mgbakọ ahụ ji ọsọ na-abịaru mmechi ya ka onye ọkà okwu gbagoro n’ikpo okwu ma nye okwu ihu ọha, nke isiokwu ya bụ “Izi Ihe Na-enye Aka Maka Oge Anyị Dị Oké Egwu.” N’ụzọ doro anya ma bụrụ nke ọgụgụ isi dị na ya, o gosipụtara nsogbu ndị bụ isi na-emetụta anyị taa ma gosi ụzọ ụfọdụ izi ihe Chineke pụrụ isi nyere anyị aka ịdị ndụ ka mma. Ọ sịrị na ọ bụrụ na anyị na-agbaso izi ihe nke Akwụkwọ Nsọ ugbu a, anyị ga-enwe ike ịgbaso ya ruo ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ Jehova.

Mgbe e nwesịrị nchịkọta nke ọmụmụ ihe Ụlọ Nche nke a na-enwe kwa izu, oge ruru maka okwu ikpeazụ. Onye ọkà okwu ya tụleghachiri isi ihe nile nke usoro ihe omume abalị anọ ahụ ma chetara ndị bịara mgbakọ akwụkwọ ndị ahụ pụtara ọhụrụ. Ọ makwara ọkwa na a ga-ewepụta vidio nke abụọ n’usoro isiokwu ahụ bụ́ The Bible​—⁠A Book of Fact and Prophecy n’oge na-adịghị anya. N’ezie, vidio ahụ, nke a kpọrọ The Bible​—⁠Mankind’s Oldest Modern Book dị adị ugbu n’asụsụ Bekee. A gụrụ akụkọ ozi na-emetụ n’ahụ ndị sitere n’ebe ndị e nwere oké ọgba aghara, dị ka Bosnia na Herzegovina. Ná mmechi, onye ọkà okwu ahụ gụrụ okwu ndị ahụ dị n’Eklisiastis 12:13: “Ka anyị nụrụ nkwubi okwu a nile: tụọ egwu Chineke, debekwa ihe nile O nyere n’iwu; n’ihi na nke a bụ ọrụ mmadụ nile.”

Lee ihe ncheta mara mma ọ bụ! Ka anyị na-adị ndụ maka ụbọchị ahụ mgbe ihe nile a kpọrọ mmadụ ga-eto Onye Ozizi anyị Kasị Ukwuu, bụ́ Jehova, ma gee ntị n’izi ihe ya.

[Foto ndị dị na peeji nke 24, 25]

Mgbakọ “Izi Ihe Chineke” ndị e nwere na Moscow na Kiev kpatara ọṅụ dị ukwuu

[Foto ndị dị na peeji nke 26, 27]

1. Site n’ịbụ ndị e mere baptism, ọtụtụ ndị gosipụtara nrara ha raara onwe ha nye Chineke

2. Otu onye bịara mgbakọ nke dị 100 afọ nwere obi ụtọ ịnata otu akwụkwọ ọhụrụ

3, 4. E nwere ekele dị ukwuu maka ihe nkiri ndị na-akpali iche echiche

5. Ndị ozi ala ọzọ a jụrụ ajụjụ ọnụ ná mgbakọ kwuru okwu n’uru dị iche iche nke izi ihe Chineke

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya