Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị—Ugboro Ole Ka E Kwesịrị Ịdị Na-eme Ya?
KRISMAS, Ista, ụbọchị “ndị senti.” Chọọchị nile nke Krisendọm na-edebe ọtụtụ ụbọchị izu ike na oriri. Ma ị̀ maara ememe ole Jisọs Kraịst nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ime? Azịza ya bụ, Nanị otu! Ọ dịghị nke n’ime oriri ndị ọzọ ahụ Onye Guzobere Iso Ụzọ Kraịst nyere iwu ya.
O doro anya na ọ bụrụ na Jisọs malitere nanị otu ememe, ọ dị oké mkpa. Ndị Kraịst kwesịrị ịdị na-eme ya kpọmkwem dị ka Jisọs nyere iwu ya. Gịnị ka ememe nke a pụrụ iche bụ?
Otu Ememe Ahụ
Jisọs malitere ememe nke a n’ụbọchị ọ nwụrụ. O sorowo ndị ozi ya mee ncheta nke oriri ndị Juu bụ́ Ememe Ngabiga. Mgbe ahụ o bugharịịrị ha ụfọdụ n’achịcha ekoghị eko ahụ nke Ememe Ngabiga, na-asị: “Nke a bụ ahụ m nke a na-enye n’ihi unu.” Ọzọkwa, Jisọs bugharịịrị ha otu iko mmanya, na-asị: “Iko a bụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ n’ime ọbara m, bụ́ nke a na-awụsị n’ihi unu.” O kwukwara, sị: “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.” (Luk 22:19, 20; 1 Ndị Kọrint 11:24-26) A na-akpọ ememe nke a Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, ma ọ bụ Ememe Ncheta. Ọ bụ nanị ememe nke Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha na-eme.
Ọtụtụ chọọchị na-azọrọ na ha na-emekọta ememe nke a na oriri ha nile ndị ọzọ, ma ihe ka n’ọnụ ọgụgụ na-eme ya n’ụzọ dị iche site n’ụzọ Jisọs nyere n’iwu. Ma eleghị anya ọdịiche kasị dị ịrịba ama bụ ọtụtụ ugboro a na-eme ememe ahụ. Chọọchị ụfọdụ na-eme ya kwa ọnwa, kwa izu, ọbụna kwa ụbọchị. Nke a ọ̀ bụ ihe Jisọs bu n’uche mgbe ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m”? The New English Bible na-asị: “Meenụ nke a dị ka ihe ncheta nke m.” (1 Ndị Kọrint 11:24, 25) Ugboro ole ka a na-eme ememe ncheta ma ọ bụ ememe mgbaafọ? Ọ na-abụkarị nanị otu ugbo kwa afọ.
Chetakwa na Jisọs malitere ememe nke a wee nwụọ n’ụbọchị Nisan 14 nke kalenda ndị Juu.a Nke ahụ bụ ụbọchị Ememe Ngabiga, ememe nke na-echetara ndị Juu oké mgbapụta a gbapụtara ha n’Ijipt na narị afọ nke 16 T.O.A. Mgbe ahụ ịchụ nwa atụrụ n’àjà rụpụtara nzọpụta nke ụmụ mbụ ndị Juu, ebe mmụọ ozi Jehova tigburu ụmụ mbụ nile nke Ijipt.—Ọpụpụ 12:21, 24-27.
Olee otú nke a si enyere nghọta anyị aka? Pọl onyeozi bụ́ onye Kraịst dere, sị: “A chụkwara àjà ngabiga anyị, bụ́ Kraịst.” (1 Ndị Kọrint 5:7) Ọnwụ Jisọs bụ àjà Ememe Ngabiga nke ka ukwuu, na-enye ihe a kpọrọ mmadụ ohere maka nzọpụta dị nnọọ ebube karị. Ya mere, nye ndị Kraịst, Ememe Ncheta nke ọnwụ Kraịst anọchiwo Ememe Ngabiga ndị Juu.—Jọn 3:16.
Ememe Ngabiga bụ ememe a na-eme otu ugbo n’afọ. Mgbe ahụ, ezi uche dị ya na Ememe Ncheta bụ otu ihe ahụ. Ememe Ngabiga—ụbọchị Jisọs nwụrụ—na-adaba mgbe nile n’ụbọchị nke 14 nke ọnwa Nisan ndị Juu. Ya mere, e kwesịrị ime ncheta ọnwụ Kraịst otu ugbo n’afọ n’ụbọchị kalenda nke kwekọrọ na Nisan 14. Na 1994 ụbọchị ahụ bụ Saturday, March 26, mgbe anyanwụ dasịrị. Ma, n’ihi gịnị ka o ji bụrụ na chọọchị nile nke Krisendọm emebeghị nke a ka ọ bụrụ ụbọchị maka ememe pụrụ iche? Ilenyetụ anya n’akụkọ ihe mere eme ga-aza ajụjụ ahụ.
Omenala Ndị Ozi Nọ n’Ihe Ize Ndụ
Ihe ịrụ ụka adịghị ya na n’ime narị afọ mbụ O.A., ndị ndị ozi Jisọs duziri mere ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị kpọmkwem dị ka o nyere iwu ya. Otú ọ dị, n’ime narị afọ nke abụọ, ụfọdụ malitere ịgbanwe oge e ji eme ya. Ha mere Ememe Ncheta ahụ n’ụbọchị mbụ n’izu (nke a na-akpọ Sunday ugbu a), ọ bụghị n’ụbọchị kwekọrọ na Nisan 14. N’ihi gịnị ka e ji mee nke ahụ?
Nye ndị Juu, ụbọchị na-amalite n’ihe dị ka n’elekere anya isii n’uhuruchi ma nọgide ruo n’otu oge ahụ n’ụbọchị na-esonụ. Jisọs nwụrụ na Nisan 14, 33 O.A., nke malitere n’uhuruchi Thursday ruo uhuruchi Friday. A kpọlitere ya n’ụbọchị nke atọ, isi ụtụtụ Sunday. Ụfọdụ chọrọ ka a na-eme ncheta nke ọnwụ Jisọs n’otu ụbọchị n’izu kpọmkwem kwa afọ, kama ịbụ n’ụbọchị nke Nisan 14 dabara na ya. Ha lekwara ụbọchị mbilite n’ọnwụ Jisọs anya dị ka nke dị mkpa karịa ụbọchị ọnwụ ya. N’ihi ya, ha kpebiri ime ya na Sunday.
Jisọs nyere iwu ka a na-eme ncheta ọnwụ ya, ọ bụghị mbilite n’ọnwụ ya. Ebe ọ bụkwa na Ememe Ngabiga ndị Juu na-adaba n’ụbọchị dị iche kwa afọ dị ka kalenda Gregory nke anyị ji eme ihe ugbu a si dị, ọ bụ nnọọ ihe kwesịrị ekwesị na otu ihe ahụ ga-abụkwa eziokwu banyere Ememe Ncheta ahụ. Ya mere ọtụtụ gbara isi akwara ná ndokwa mbụ ahụ ma na-eme ememe Nri Anyasị Onyenwe Anyị na Nisan 14 kwa afọ. Mgbe oge na-aga, a malitere ịkpọ ha ndị Quartodeciman, nke pụtara “Ndị Ụbọchị nke Iri na Anọ.”
Ụfọdụ ndị mmụta matara na “Ndị Ụbọchị nke Iri na Anọ” ndị a na-agbaso ụkpụrụ mbụ nke ndị ozi. Otu ọkọ akụkọ ihe mere eme sịrị: “Banyere ụbọchị ime ememe Pascha [Nri Anyasị Onyenwe Anyị], ojiji chọọchị nile nke ndị Quartodeciman n’Esia ji ya mee ihe bụ iwere nke chọọchị ahụ na Jerusalem gaa n’ihu. Na narị afọ nke abụọ chọọchị ndị a n’oge Pascha ha n’ụbọchị nke 14 nke Nisan mere ncheta nke mgbapụta nke ọnwụ Kraịst wetara.”—Studia Patristica, Mpịakọta nke 5, 1962, peji nke 8.
Esemokwu Arịa Elu
Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị n’Asia Minor gbasoro ihe ndị ozi mere, e setịpụrụ Sunday iche maka ime ememe na Rom. N’ihe dị ka n’afọ 155 O.A., Polycarp nke Smụana, onye nnọchiteanya nke ọgbakọ ndị dị n’Esia, letara Rom iji tụlee nke a na nsogbu ndị ọzọ. N’ụzọ na-adịghị enye obi ụtọ, e nweghị nkwekọrịta ọ bụla n’okwu a.
Irenaeus nke Lyons dere n’otu akwụkwọ ozi, sị: “Anicetus [nke Rom] apụghịkwa ime ka Polycarp kwere ịhapụ ime ememe ya na Jọn onye na-eso ụzọ Onyenwe anyị na ndị ozi ndị ọzọ ha na ya kpakọworo nọworo na-eme; Polycarp emebeghịkwa ka Anicetus kwere ime ya, n’ihi na o kwuru na ya kwesịrị ịrapagidesi ike n’omenala ndị okenye bu ya ụzọ.” (Eusebius, Akwụkwọ nke 5, isi nke 24) Rịba ama na a kọrọ na Polycarp dabeere nguzo ya n’ikike ndị ozi ahụ, ebe Anicetus zoro aka n’omenala ndị okenye bu ya ụzọ na Rom.
Esemokwu a siwanyere ike ka ọ na-eru ọgwụgwụ nke narị afọ nke abụọ O.A. N’ihe dị ka 190 O.A., a họpụtara otu onye a na-akpọ Victor ịbụ bishọp nke Rom. O kwenyere na e kwesịrị ịdị na-eme ememe Nri Anyasị Onyenwe Anyị na Sunday, ọ chọkwara nkwado nke ọtụtụ ndị ndú ndị ọzọ dị ka o nwere ike. Victor rụgidere ọgbakọ Esia ndị ahụ ka ha gbanwee gaa ná ndokwa nke Sunday ahụ.
Ka ọ na-azaghachi n’aha ndị nọ n’Asia Minor, Polycrates nke Efesọs jụrụ ikwenye ná nrụgide ya. Ọ sịrị: “Anyị na-edebe ụbọchị ahụ n’agbanweghị ya, n’etinyeghị ya ihe, ma ọ̀ bụ wepụ ya ihe.” O depụtazịrị ọtụtụ ihe ndabere ya, gụnyere Jọn onyeozi. “Ndị a nile,” ka o kwusiri ike, “mere ncheta ụbọchị nke 14 maka Pascha dị ka Oziọma ahụ na-egosi, n’esighị na ya wezụga onwe ha ma ọlị.” Polycrates kwukwasịrị: “Nye mụ onwe m, ụmụnna m, . . . iyi egwu adịghị emenye m ụjọ. N’ihi na ndị ka mụ mma ekwuwo sị, Anyị aghaghị irubere Chineke isi karịa mmadụ.”—Eusebius, Akwụkwọ nke 5, isi nke 24.
Victor enweghị obi ụtọ ná nzaghachi nke a. Otu akwụkwọ akụkọ ihe mere eme na-asị na ọ “kewapụrụ Chọọchị nile nke Esia, zigakwara Chọọchị nile nwere echiche ya akwụkwọ, ka ha ghara iso ha nwee mkpakọrịta ọ bụla.” Otú ọ dị, “ndị òtù ya nile maara ihe ma nwee obi eziokwu anabataghị omume ya nke ime ihe ọkụ ọkụ na nke anyaike nke ọma, ọtụtụ n’ime ha degakwaara ya akwụkwọ ozi dị ike, na-agwa ya . . . ka o chebe ịhụnanya, ịdị n’otu, na udo.”—Antiquities of the Christian Church nke Bingham, Akwụkwọ nke 20, isi nke 5.
E Guzobe Ndapụ n’Ezi Ofufe
N’agbanyeghị mmegide ndị dị otú ahụ, ndị Kraịst n’Asia Minor bụwanyere ndị a kpapụrụ iche n’okwu banyere mgbe a ga-eme ememe Nri Anyasị Onyenwe Anyị. Ihe ndị dị iche egbebatawo n’ebe ọzọ. Ụfọdụ mere ememe ahụ ogologo oge nile malite na Nisan 14 ruo na Sunday na-esote ya. Ndị ọzọ na-eme ememe ahụ ọtụtụ ugboro karị—kwa izu na Sunday.
Na 314 O.A. Kansụl nke Arles (France) nwara ịmanye ndokwa nke Rom n’ike ma bịada ihe ọ bụla ọzọ a na-eme. Ndị Quartodeciman fọdụrụnụ jụrụ. Iji dozie nke a na okwu ndị ọzọ na-ekewa ndị kpọrọ onwe ha ndị Kraịst n’alaeze ukwu ya, na 325 O.A. onye ọchịchị alaeze ukwu bụ́ onye ọgọ mmụọ bụ́ Constantine kpọkọrọ nzukọ ezumezu, Kansụl nke Nicaea. O nyere iwu nke gwara ndị nile nọ n’Asia Minor ka ha mee ihe kwekọrọ n’ihe ndị Rom na-eme.
Ọ bụ ihe na-akpali mmasị ịrịba ama otu n’ime arụmụka ndị bụ isi maka ịhapụ ime Ememe Ncheta nke ọnwụ Kraịst ikwekọ n’ụbọchị ahụ na kalenda ndị Juu. A History of the Christian Councils, nke K. J. Hefele, na-asị: “E kwupụtara na o kwesịghị ekwesị ma ọlị maka nke a, bụ́ ememe kasị ndị ọzọ nile nsọ, ịgbaso omenala (usoro ịgụ oge) nke ndị Juu, bụ́ ndị merụworo aka ha ná mpụ kasị na-atụ egwu, na ndị uche ha kpuru ìsì.” (Mpịakọta nke 1, peji nke 322) E lere ịnọ n’ọnọdụ dị otú ahụ anya dị ka “‘ịnọ n’okpuru na-eweta ihere’ nye Ụlọ Nzukọ ahụ bụ́ nke kpasuru Chọọchị ahụ iwe,” ka J. Juster kwuru, bụ́ nke e hotara na Studia Patristica, Mpịakọta nke 4, 1961, peji nke 412.
Ịkpa ókè agbụrụ megide ndị Juu! E lere ndị mere Ememe Ncheta nke ọnwụ Jisọs n’otu ụbọchị ahụ ọ nwụrụ anya dị ka ndị na-agbaso omenala ndị Juu. E chezọrọ na Jisọs n’onwe ya bụ onye Juu nakwa na o nyewo ụbọchị ahụ ihe ọ pụtara site n’ịchụ ndụ ya n’àjà n’ihi ihe a kpọrọ mmadụ. Site na mgbe ahụ gaa n’ihu, a mara ndị Quartodeciman ikpe dị ka ndị jụrụ okwukwe na ndị na-akpata nkewa, a kpagbukwara ha. Kansụl nke Antiọk na 341 O.A. mara iwu na a ga-achụpụ ha. Ka o sina dị, a ka nwere ọtụtụ n’ime ha na 400 O.A., ha dịgidekwara n’ọnụ ọgụgụ dị nta ruo ogologo oge mgbe nke ahụ gasịrị.
Eri ụbọchị ndị ahụ, Krisendọm adawo ada n’ịlaghachi ná ndokwa mbụ Jisọs mere. Professor William Bright kwetara, sị: “Mgbe e wepụtara ụbọchị pụrụ iche, bụ́ Friday Ọma, maka ime ncheta Ahụhụ Jisọs ịbụ ya, oge agafewo nke ukwuu ịkpara ya ókè n’ihe jikọrọ ya na ‘ememe ngabiga’ ahụ nke Senti Pọl jikọworo ya na ọnwụ ịchụ àjà ahụ: e jikọwo ha nnọọ n’ememe Mbilite n’Ọnwụ ahu n’onwe ya, mgbagwoju anya nke echiche dị iche iche bilitekwara n’asụsụ omenala nke Krisendọm nke Grik na Latin.”—The Age of the Fathers, Mpịakọta nke 1, peji nke 102.
Gịnị Banyere Taa?
‘Mgbe afọ ndị a nile gasịrị,’ ka ị pụrụ ịjụ, ‘ò nwere n’ezie ihe o mere bụ́ mgbe a na-eme Ememe Ncheta ahụ?’ Ee, o nwere ihe o mere. Ọ bụ ndị ikom kpọrọ ekwo nkụ bụ́ ndị na-achọ inwe ike wetara mgbanwe. Ndị mmadụ gbasoro echiche nke aka ha kama irubere Jisọs Kraịst isi. E mezuru n’ụzọ doro anya ịdọ aka ná ntị Pọl onyeozi: “Mụ onwe m matara na mgbe m lasịrị agụ jọgburu onwe ha ga-aba n’etiti unu [ndị Kraịst], ghara imere ìgwè atụrụ ebere; ndị ikom ga-esitekwa n’etiti unu bilie, na-ekwu ihe dị iche iche na-eduhie mmadụ ụzọ, ka ha dọpụ ndị na-eso ụzọ Jisọs iso ha n’azụ.”—Ọrụ 20:29, 30.
Ihe bụ isiokwu bụ okwu banyere nrubeisi. Jisọs guzobere nanị otu ememe maka ndị Kraịst ime. Bible na-akọwa n’ụzọ doro anya mgbe na ụzọ e kwesịrị isi mee ya. Mgbe ahụ, ònye nwere ikike ịgbanwe nke ahụ? Ndị Quartodeciman oge mbụ ahụ tara ahụhụ mkpagbu na nkewapụ iche kama imebi okwukwe ha n’okwu a.
Ọ pụrụ ịmasị gị ịmara na a ka nwere ndị Kraịst n’elu ụwa bụ́ ndị na-akwanyere ihe Jisọs chọrọ ùgwù ma na-eme Ememe Ncheta nke ọnwụ ya n’ụbọchị nke o guzobere. N’afọ a, Ndịàmà Jehova ga-ezukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha gburugburu ụwa nile mgbe 6:00 uhuruchi gasịrị, na Saturday, March 26—mgbe ụbọchị nke 14 nke Nisan na-amalite. Mgbe ahụ ha ga-eme kpọmkwem ihe Jisọs kwuru na e kwesịrị ime n’oge nke a pụtara oké ihe. Gịnị mere ị gaghị eso ha mee ememe Nri Anyasị Onyenwe Anyị? Site n’ịnọ na ya, gị onwe gị kwa pụrụ igosipụta nkwanye ùgwù gị maka ihe Jisọs Kraịst chọrọ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Nisan, ọnwa mbụ nke afọ ndị Juu, na-eji mpụta mbụ nke ọnwa ọhụrụ amalite. Nisan 14 si otú a na-erute mgbe nile n’oge ọnwa gbazuru.
[Igbe dị na peeji nke 6]
“IHE MGBAPỤTA AHỤ DỊ OKÉ ỌNỤ AHỊA”
Àjà mgbapụta Jisọs Kraịst karịrị ozizi nke ukwuu. Jisọs kwuru banyere onwe ya: “Nwa nke mmadụ Onwe ya abịaghị ka e jeere Ya ozi, kama ka O jee ozi, ka O werekwa ndụ Ya nye ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” (Mak 10:45) Ọ kọwakwara, sị: “Chineke hụrụ ụwa [nke ihe a kpọrọ mmadụ] n’anya otú a, na O nyere ọbụna Ọkpara Ọ mụrụ nanị Ya, ka onye ọ bụla nke kwere na Ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Nye ndị nwụrụ anwụ, ihe mgbapụta ahụ na-emeghe ụzọ maka mbilite n’ọnwụ na olileanya nke ndụ agwụ agwụ.—Jọn 5:28, 29.
Ọ bụ ọnwụ dị oké mkpa nke Jisọs Kraịst ka a na-eme ncheta ya n’ememe nke Nri Anyasị Onyenwe Anyị. Àjà ya na-emezu ọtụtụ ihe nnọọ! Otu nwanyị ndị nne na nna na-atụ egwu Chineke zụlitere, onye jewokwara ije n’eziokwu Chineke ruo ọtụtụ iri afọ kwupụtara obi ekele ya n’okwu ndị a:
“Anyị na-atụ anya Ememe Ncheta ahụ. Ọ na-apụwanye iche kwa afọ. Ana m echeta iguzo n’ebe a na-akwadebe ozu 20 afọ gara aga, na-ele ezigbo papa m anya wee na-enweta ezi obi ekele maka ihe mgbapụta ahụ. Ọ bụwo isiokwu nke ihe ọmụma e bu n’isi tupu mgbe ahụ. Oo, m maara akụkụ akwụkwọ nsọ ya nile na ụzọ isi kọwaa ha! Ma nanị mgbe m nwere mmetụta nke ajọ ịbụ eziokwu nke ọnwụ ka obi m maliri n’ọṅụ nke ihe a ga-arụzuru anyị site n’ihe mgbapụta ahụ dị oké ọnụ ahịa.”