Nduzi Ụmụ Mmadụ Ọ̀ Dawo?
ÒNYE kere ihe nile? Ọ bụrụ na azịza gị bụ “Chineke,” mgbe ahụ i so n’ọtụtụ nde mmadụ kwenyere na Chineke nke Bible, bụ́ Onye Okike ahụ.
Ma, ọtụtụ ndị kwenyere na Chineke nwere ihe isi ike ịnakwere na ọ na-eme ihe doro anya n’ịgwọta nsogbu nile nke ihe a kpọrọ mmadụ. Ezi uche ọ̀ dị n’iche na Chineke nwere usoro ihe omume dị n’ọrụ nke ga-ewetara ihe a kpọrọ mmadụ ahụ efe? Ụfọdụ adịghị ahụ ihe àmà ọ bụla gbara ọkpụrụkpụ na nke a dị otú ahụ.
N’ọtụtụ puku afọ, ụmụ mmadụ anwalewo ọnụ ọgụgụ ụzọ a na-apụghị ịgụta ọnụ isi nyere onwe ha aka n’ọchịchọ ha na-achọ ihe ngwọta, na-ahapụ iwebata Chineke n’okwu. Ma ụmụ mmadụ hà achọtawo ihe ngwọta ndị ahụ? Ka nsogbu ndị ahụ hà na-akawanye njọ, na-esiwanyekwa ike ịgwọta? Olee otú mmadụ si na-ahụ maka nsogbu ndị chọrọ ime ihe ngwa ngwa n’ụwa taa?
Otu ọkachamara tinyere ya otú a: “Kemgbe Mgbanwe Mmepanya ná Mmepụta Ihe, mba ndị mepere emepe ejiwo ihe okike ndị e nwere n’ụwa mee ihe gabiga ókè n’ụzọ mmepụta ihe na iji ihe eme ihe bụ́ ndị na-apụghị idochi ihe, na-akpatara mbara ụwa dum mbibi, na-ewetara mba ndị na-emepe emepe ihe isi ike.”
Mmadụ nọgidere na-emebi ụwa. Akwụkwọ akụkọ ndị Argentina bụ́ Clarín kwuru, sị: “Ná nkera nke abụọ nke narị afọ a, anyaukwu ọnọdụ akụ̀ na ụba, akpacharaghị anya, na ileghara ihe anya kpatara oké ọdachi ndị, ọ bụghị nanị na ha gburu ndị mmadụ, kamakwa ha weturu ịdị mma mbara ụwa ala, ọtụtụ mgbe ruo n’ókè a na-apụghị ịgụkọli.”
Ogbenye ọnụ ntụ yiri ugbu a ka ọ bụ akụkụ na-adịgide adịgide n’ọha mmadụ nke oge a. Ọbụna mba ndị a sịrị na ha bara ọgaranya n’ụwa na-ekweta na oké ibu arọ nke ịda ogbenye karịrị ha. Dị ka akwụkwọ bụ́ The Globe and Mail nke Toronto, Canada na-ekwu, e mere atụmatụ na “otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ndị Canada nile ga-enwe ahụmahụ ịda ogbenye n’afọ ndụ ha nile ha nwere ike ịrụ ọrụ.” Akwụkwọ akụkọ ahụ kwukwasịrị na “ndakpọ ezinụlọ bụ otu n’ime ihe ndị bụ isi na-akpata ịda ogbenye, ọ̀tụ̀tụ̀ ya amụbawokwa n’afọ ndị a.”
Iji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi bụ ihe mgbaama ọzọ nke ọha mmadụ na-eretọ eretọ. Gịnị ka ihe a kpọrọ mmadụ pụrụ ime banyere ya? O doro anya na ọ bụ nnọọ ihe dị nta. Ọtụtụ nde nọgidere na-enwe ahụmahụ nke ndakpọ n’anụ ahụ, mmetụta uche, na omume dị ka ihe na-esite kpọmkwem na ha iji ọgwụ dị iche iche na-eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Nsogbu ahụ na-agbasakwa dị ka ọkụ na-agba ọzara.
Ndị mmụta sayensị yiri ka à na-emeri ha n’agha megide ọrịa. N’eziokwu, nkà na ụzụ ọgbara ọhụrụ emeriwo n’ọtụtụ ọgụ. Ma, usoro nkà sayensị ụfọdụ n’onwe ha esowo kpata mpụta nke ụdị nje ndị ọhụrụ anya na-adịghị ahụ bụ́ ndị na-eguzogide ọgwụ.
Gọọmenti ụmụ mmadụ apụghị ịkwụsị mmebi nke ihe ndị ruuru mmadụ bụ́ nke gbasara ebe nile. Dị ka ihe atụ, n’agbanyeghị ọtụtụ nkwekọrịta na iwu ndị e guzobere iji gbochie ịgba ohu, a na-eme atụmatụ na gburugburu ụwa, a na-amanye ihe karịrị otu narị nde mmadụ ịrụ ọrụ n’okpuru ọnọdụ ndị ha na ajọ ịgba ohu bụ otu ihe ahụ.
Ma n’ihi gịnị ka nduzi ụmụ mmadụ ji daa? Tụlee ihe ndị a kpatara ya. Nduzi ụmụ mmadụ sitere n’aka ndị mmadụ—ndị mmadụ nwere oké ihe ndị na-akpara ha ókè. Ahụmahụ ha ná ndụ dị nnọọ mkpụmkpụ, bụrụkwa n’ozuzu ya nke a kpaara ókè site n’ọdịnala ma ọ bụ ọnọdụ ebe obibi dị iche iche. Ihe ọmụma ha dịkwa nta. Nduzi ọ bụla ha nyere na-egosipụta ịkpa ókè ndị a. Dị ka Pọl onyeozi kwuru, “mmadụ nile emehiewo, ha adịghị erukwa otuto Chineke.”—Ndị Rom 3:23.
N’eziokwu ihe ka ukwuu ná nsogbu na ihe isi ike nke ihe ka ukwuu n’ihe a kpọrọ mmadụ na-enwe bụ kpọmkwem ma ọ bụ n’ụzọ ndị ọzọ ihe sitere n’ileghara nduzi Chineke anya. Ma, olee ebe a pụrụ isi nweta nduzi dị otú ahụ? Olee otú Chineke si enye anyị ntụzi taa? Isiokwu nke na-esonụ ga-atụle azịza ha.