Ndị Nkwusa Alaeze Na-arụsi Ọrụ Ike n’Ụwa Nile
“Unu ga-abụkwa ndị àmà m . . . ruokwa ebe ụwa sọtụrụ.”—ỌRỤ 1:8.
1. Ozi dị aṅaa ka Jisọs sịrị na ndị na-eso ụzọ ya ga-akpọsa n’ụbọchị anyị?
MGBE ọ na-akọwa ọrụ ahụ Jehova zitere Ọkpara ya ịrụ n’ụwa, Jisọs kwuru, sị: “Aghaghị m izikwa obodo nile ọzọ ozi ọma alaeze Chineke.” (Luk 4:43) N’otu aka ahụ, mgbe ọ na-ekwu maka ọrụ nke ndị na-eso ụzọ ya gaje ịrụ n’elu ala mgbe ọ lọghachiri n’ike eze, Jisọs sịrị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.”—Matiu 24:14.
2. (a) N’ihi gịnị ka o ji dị oké mkpa ka a kpọsaa ozi Alaeze ahụ n’ụzọ sara mbara? (b) Ajụjụ dị aṅaa ka anyị nile kwesịrị ịjụ onwe anyị?
2 N’ihi gịnị ka ozi banyere Alaeze Chineke ji dị oké mkpa? N’ihi gịnị ka Alaeze ahụ ji chọọ ịbụ nke a kpọsara n’ụzọ sara mbara otú a? N’ihi na ọ bụ Alaeze Mesaịa ahụ nke ga-ewepụ ọkaaka eluigwe na ala nke Jehova n’ụta. (1 Ndị Kọrint 15:24-28) Site na ya, Jehova ga-emezu ihe e kpere n’ikpe n’isi usoro ihe dị ugbu a nke Setan ma mezuo nkwa ya ịgọzi ezinụlọ nile nke ụwa. (Jenesis 22:17, 18; Daniel 2:44) Site n’ime ka a gbaa àmà banyere Alaeze ahụ, Jehova achọtawo ndị o mesịrị tee mmanụ ịbụ ndị ha na Ọkpara ya ga-eso ketakọọ ihe. Site ná mkpọsa Alaeze ahụ, a na-arụzukwa ọrụ nkewa taa. (Matiu 25:31-33) Jehova chọrọ ka e mee ka ndị nke mba nile mara banyere nzube ya. Ọ chọkwara ka ha nwee ohere nke ịhọrọ ndụ dị ka ndị Alaeze ya ga-achị. (Jọn 3:16; Ọrụ 13:47) Ị̀ na-ekere òkè zuru ezu n’ịkpọsa Alaeze a?
N’ịtụ Anya Ọgwụgwụ nke Oge Ndị Jentaịl
3. (a) N’ụzọ kwesịrị ekwesị, gịnị bụ isiokwu nke C. T. Russell jiri mee ihe ná njem mbụ nke ịhazi ìgwè dị iche iche maka ọmụmụ Bible? (b) Gịnị ka Ndị Mmụta Bible mbụ ahụ ghọtara dị ka ọnọdụ Alaeze Chineke kwesịrị inwe ná ndụ ha?
3 Laa azụ na 1880, Charles Taze Russell, editọ mbụ nke magazin Ụlọ Nche, mere njem gabiga ebe ugwu nke ebe ọwụwa anyanwụ United States iji gbaa ume maka nguzobe nke ìgwè dị iche iche maka ọmụmụ Bible. N’ụzọ kwesịrị ekwesị, isiokwu o kwuru okwu na ya bụ “Ihe Ndị Metụtara Alaeze Chineke.” Dị ka ọ pụtara ná mbipụta ndị mbụ nke Ụlọ Nche, Ndị Mmụta Bible (dị ka a mabuuru Ndịàmà Jehova na mgbe ahụ) ghọtara na ọ bụrụ na ha gaje ịbụ ndị ruru eru ikere òkè n’Alaeze Chineke, ha aghaghị ime Alaeze ahụ ihe mbụ na-amasị ha, n’obi ụtọ na-ejiri ndụ ha, ikike ha, na ihe onwunwe ha na-eme ihe maka ya. Ihe ọ bụla ọzọ ná ndụ ha gaje iwere ọnọdụ nke abụọ. (Matiu 13:44-46) Ibu ọrụ ha gụnyere ikwusara ndị ọzọ ozi ọma banyere Alaeze Chineke. (Aịsaịa 61:1, 2) Ruo ókè hà aṅaa ka ha mere nke ahụ tupu ọgwụgwụ nke Oge Ndị Jentaịl na 1914?
4. Ruo ókè hà aṅaa ka ìgwè nta nke Ndị Mmụta Bible ahụ kesara akwụkwọ dabeere na Bible tupu 1914?
4 Malite n’afọ ndị 1870 ruo 1914, Ndị Mmụta Bible dị ole na ole n’ọnụ ọgụgụ ma e jiri ya tụnyere ndị ọzọ. Na 1914, ọ bụ nanị ihe dị ka 5,100 na-ekeresi òkè ike n’ịgba àmà ihu ọha. Ma lee ka o si bụrụ ịgba àmà pụrụ iche! Na 1881, nanị afọ abụọ e bipụtasịrị Ụlọ Nche nke mbụ ya, ha malitere nkesa nke akwụkwọ dị 162 peji bụ́ Food for Thinking Christians. N’ime ọnwa ole na ole, ha kesara 1,200,000 n’ime ha. N’ime afọ ole na ole, a na-ekesa ọtụtụ iri nde traktị kwa afọ n’ọtụtụ asụsụ.
5. Olee ndị bụ ndị colporteur, ụdị mmụọ dịkwa aṅaa ka ha gosipụtara?
5 Na-amalitekwa na 1881, ụfọdụ wepụtara onwe ha ije ozi dị ka ndị nkwusa colporteur. Ndị a bụ ndị obu ụzọ nke ndị ọsụ ụzọ nke taa (ndị nkwusa oge nile). Ụfọdụ n’ime ndị colporteur, na-eji ụkwụ ma ọ bụ ịnyịnya ígwè na-eme njem, gbara àmà n’onwe ha n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’akụkụ nile nke mba ebe ha bi. Ndị ọzọ nwere ọchịchọ maka ije ubi ala ọzọ, ha bụkwa ndị mbụ ji ozi ọma ahụ ruo ebe ndị dị ka Finland, Barbados, na Burma (nke bụ ugbu a Myanmar). Ha gosipụtara ịnụ ọkụ n’obi maka ozi ala ọzọ nke yiri nke Jisọs Kraịst na ndị ozi ya.—Luk 4:43; Ndị Rom 15:23-25.
6. (a) Ruo ókè hà aṅaa ka njem ndị Nwanna Russell mere iji kpọsaa eziokwu Bible dịruru ukwuu? (b) Gịnị ọzọ ka e mere iji kwusakwuo ozi ọma ahụ n’ubi ala ọzọ dị iche iche tupu ọgwụgwụ nke Oge Ndị Jentaịl?
6 Nwanna Russell n’onwe ya mere ọtụtụ njem iji gbasaa eziokwu ahụ. O jere Canada ugboro ugboro; kwuo okwu na Panama, Jamaica, na Cuba; ọ gara Europe ọtụtụ ugbo; ọ gakwara ụwa gburugburu ná njem ime nkwusa. O zipụkwara ndị ikom ndị ọzọ ije malite ma bute ụzọ n’ikwusa ozi ọma ahụ n’ubi ala ọzọ dị iche iche. E zigara Adolf Weber na Europe n’etiti afọ ndị 1890, ije ozi ya gbasakwara site na Switzerland banye France, Ịtali, Germany, na Belgium. E zigara E. J. Coward n’ógbè Caribbean. E kenyere Robert Hollister ọrụ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa na 1912. N’ebe ahụ, a kwadebere traktị ndị pụrụ iche n’asụrụ iri, e kesakwara ọtụtụ nde ndị a n’India, China, Japan, na Korea site n’aka ndị nkesa bụ́ ndị obodo ahụ. A sị na i biri mgbe ahụ, obi gị ọ̀ gaara akwali gị ime mgbalị siri ike iji jiri ozi ọma ahụ rute ndị ọzọ n’ógbè gị ma gabiga ya?
7. (a) Olee otú e si jiri akwụkwọ akụkọ mee ihe iji gbasikwuo àmà ahụ ike? (b) Gịnị bụ “Foto Ihe Nkiri nke Okike,” mmadụ olè hụkwara ya n’ime otu afọ nanị?
7 Ka Oge Ndị Jentaịl na-eru ọgwụgwụ ya nso, e ji akwụkwọ akụkọ gbasaa okwu Bible ndị Nwanna Russell kwuru. Ihe bụ isi ha na-emesi ike abụghị afọ ahụ bụ́ 1914, kama nke ahụ, ọ bụ nzube nke Chineke na ịbụ ihe e ji n’aka nke mmezu ya. Ihe ruru 2,000 akwụkwọ akụkọ dị iche iche n’otu mgbe, na-erute 15,000,000 mmadụ ndị na-agụ ha aka, nọgidere na-ebu okwu ndị a. Mgbe ahụ, ka afọ 1914 na-achọ ịmalite, Society malitere ngosi ihu ọha ya nke “Foto Ihe Nkiri nke Okike.” N’ihe ngosi na-ewe hour 2 dị nkebi anọ, o wepụtara eziokwu dị iche iche nke Bible site n’okike banye nnọọ na Narị Afọ Iri ahụ. N’ime nanị otu afọ, ndị ruru ngụkọta nke ihe karịrị nde itoolu n’Ebe Ugwu Kọntinent America, Europe, Australia, na New Zealand ekiriworị ya.
8. Ka ọ na-erule 1914, ala ole ka Ndị Mmụta Bible ji ozi ọma ahụ ruo?
8 Dị ka ihe ndekọ ndị e nwere na-ekwu, mgbe ọ na-erule akụkụ ikpeazụ nke 1914, ìgwè ndị nkwusa nke a na-anụ ọkụ n’obi agbasawo mkpọsa ha nke Alaeze Chineke banye na 68 ala dị iche iche.a Ma nke ahụ bụ nanị mmalite!
Iji Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-akpọsa Alaeze ahụ E Guzobeworo
9. Ná mgbakọ Cedar Point ndị ahụ, olee otú e si nye ọrụ ịgba àmà Alaeze ahụ nkwali pụrụ iche?
9 Mgbe Ndị Mmụta Bible gbakọrọ na Cedar Point, Ohio, na 1919, J. F. Rutherford, onye bụ onye isi oche Watch Tower Society na mgbe ahụ, kwupụtara, sị: “Ọrụ dịịrị anyị bụ, ọ ka bụkwa, ịkpọsa ọbịbịa neke alaeze Mesaịa ahụ dị ebube.” Ná mgbakọ nke abụọ na Cedar Point, na 1922, Nwanna Rutherford mere ka eziokwu ahụ pụta ìhè na n’ọgwụgwụ nke Oge Ndị Jentaịl, na 1914, ‘Eze ahụ dị ebube ewegharawo n’onwe ya oké ike ya, ọ malitewokwa ịchị achị.’ Ọzọ, o mere ka okwu ahụ doo ndị na-ege ya ntị anya, na-asị: “Ùnu kwetara na Eze ebube ahụ amalitewo ịchị isi ya? Mgbe ahụ baghachinụ n’ubi, Unu ụmụ nke Chineke onye kasị ihe nile elu! . . . Kwusaanụ ozi ahụ ruo nsọtụ nile. Ụwa aghaghị ịmara na Jehova bụ Chineke nakwa na Jisọs Kraịst bụ Eze kachasị ndị eze nile na Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ nile. Nke a bụ ụbọchị kachasị ụbọchị nile. Lee, Eze ahụ na-achị achị! Unu bụ ndị mkpọsa ya.”
10, 11. Olee otú e si jiri redio, ụgbọ ala ndị a rụnyere ihe ndị e ji agbasa ozi, na obodobo akwụkwọ mee ihe n’ụzọ dị irè n’iji eziokwu Alaeze ruo ndị ọzọ?
10 Ihe karịrị 70 afọ agafewo kemgbe e nwere mgbakọ ndị ahụ na Cedar Point—ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 80 afọ kemgbe Jehova malitere igosipụta ọbụbụeze ya site n’ịchịisi Mesaịa nke Ọkpara ya. Ruo ókè hà aṅaa ka Ndịàmà Jehova rụzuworo n’ezie ọrụ ahụ e setịpụrụ maka ha n’Okwu Chineke? Òkè dị aṅaa ka ị na-ekere n’onwe gị na ya?
11 Ná mmalite afọ ndị 1920, redio ghọrọ ihe ọrụ a pụrụ iji kpọsaa ozi Alaeze ahụ n’ụzọ sara mbara. N’afọ ndị 1930, usoro mgbasa ozi redio ma ọ bụ usoro mgbasa akụkọ ndị na-agapụ n’ebe dị anya na eriri telifon ndị gbara ụwa gburugburu buru okwu mgbakọ dị iche iche ndị na-egosipụta Alaeze ahụ dị ka olileanya e nwere nanị ya maka ụwa. Ụgbọ ala ndị a rụnyere ihe e ji agbasa ozi ka e jikwara mee ihe n’ịkpọ rekọd okwu Bible dị iche iche n’ebe mgbakọ ọha na eze. Mgbe ahụ, na 1936, na Glasgow, Scotland, ụmụnna anyị malitere iyi obodobo akwụkwọ e dekwasịrị ihe n’elu ahụ ha ma ọ bụ kokwasị ha site n’ubu ha ka ha na-azọ ije gabiga ógbè azụmahịa dị iche iche iji kpọsaa okwu ihu ọha. Ihe ndị a nile bụ ụzọ ndị dị irè isi gbaa àmà nye ọtụtụ ndị n’oge ahụ mgbe ọnụ ọgụgụ anyị dị ole na ole.
12. Dị ka Akwụkwọ Nsọ na-egosi, gịnị bụ otu n’ime ụzọ ndị kasị dị irè anyị n’otu n’otu pụrụ isi gbaa àmà?
12 Otú ọ dị, Akwụkwọ Nsọ na-eme ka ọ pụta ìhè na dị ka ndị Kraịst, anyị n’otu n’otu nwere ibu ọrụ nke ịgba àmà. Anyị apụghị nnọọ ịhapụ ka isiokwu akwụkwọ akụkọ ma ọ bụ mgbasa ozi redio rụọ ọrụ ahụ. Ọtụtụ puku ndị Kraịst na-eguzosi ike n’ihe—ndị ikom, ndị inyom, na ndị ntorobịa—anakwerewo ibu ọrụ ahụ. Dị ka ihe si na ya pụta, nkwusa ụlọ n’ụlọ abụrụwo akara e ji amata Ndịàmà Jehova.—Ọrụ 5:42; 20:20.
Irute Elu Ụwa Dum Mmadụ Bi
13, 14. (a) N’ihi gịnị ka ụfọdụ Ndịàmà ji kwaga n’ógbè ndị ọzọ, ọbụna mba ndị ọzọ, iji jiri ozi ha gaa n’ihu? (b) Olee otú nchegbu ịhụnanya maka ndị mmadụ n’ebe a mụrụ onye si nye aka ná mgbasa nke ozi ọma ahụ?
13 N’ịmara na a ga-ekwusa ozi Alaeze ahụ n’elu ụwa dum mmadụ bi, ụfọdụ n’ime Ndịàmà Jehova atụlesiwokwa ike ihe ha pụrụ ime iji rute n’ógbè ndị gabigara ógbè nke ha.
14 Ọtụtụ ndị amụtawo eziokwu ahụ mgbe ha hapụsịrị ala ebe a mụrụ ha. Ọ bụ ezie na ha pụrụ ịkwapụwo n’ihi uru ihe onwunwe, ha na-achọta ihe dị oké ọnụ ahịa karị, ụfọdụ enwewokwa mmetụta nke ịbụ ndị a rụgidere ịlaghachi n’ala ma ọ bụ ógbè ebe a mụrụ ha iji soro ndị ọzọ kerịta eziokwu ahụ. Otú a, ná mmalite narị afọ nke a, nkwusa nke ozi ọma ahụ agbasawo banye na Scandinavia, Gris, Ịtali, mba dị iche iche nke Ọwụwa Anyanwụ Europe, na ọtụtụ ebe ndị ọzọ. Ọbụna ugbu a, n’ime afọ ndị 1990, ozi Alaeze ahụ na-agbasa n’otu ụzọ ahụ.
15. N’afọ ndị 1920 na 1930, olee ihe ụfọdụ ndị nwere àgwà yiri nke e kwupụtara n’Aịsaịa 6:8 rụzuru?
15 N’itinye ndụmọdụ Okwu Chineke n’ọrụ ná ndụ ha, ụfọdụ enwewo ike iwepụta onwe ha maka ije ozi n’ebe ndị ha na-ebibeghị na mbụ. W. R. Brown (nke a na-akpọkarị “Bible Brown”) bụ otu n’ime ndị a. Na 1923, iji mee ka ọrụ nkwusa ozi ọma ahụ gaa n’ihu, o si Trinidad kwaga Ọdịda Anyanwụ Africa. N’afọ ndị 1930, Frank na Gray Smith, Robert Nisbet, na David Norman so ná ndị buuru ozi Alaeze ahụ gaa n’ụsọ osimiri nke ebe ọwụwa anyanwụ Africa. Ndị ọzọ nyere aka n’ịkọ ubi nke Ebe Ndịda Kọntinent America. Ná mmalite afọ ndị 1920, George Young, onye Canada, keere òkè n’ọrụ ahụ n’Argentina, Brazil, Bolivia, Chile, na Peru. Juan Muñiz, onye jeworo ozi na Spain, jiri ọrụ ahụ gaa n’ihu n’Argentina, Chile, Paraguay, na Uruguay. Ndị a nile gosipụtara mmụọ yiri nke e kwupụtara n’Aịsaịa 6:8: “Lee m, ziga m.”
16. Olee ebe ma e wezụga n’ebe ndị e nwere ụba mmadụ karị ka a na-agba àmà n’afọ ndị bu agha ahụ ụzọ?
16 Nkwusa nke ozi ọma ahụ na-eru ọbụna n’ógbè ndị dịpụrụ adịpụ. Ụgbọ mmiri nke Ndịàmà ji aka ha akwọ nọ na-eleta obodo nta dị iche iche ebe a na-akụ azụ na Newfoundland, ụsọ osimiri Norway banye n’Arctic, agwaetiti dị iche iche nke Osimiri Pacific, na ọdụ ụgbọ mmiri nile nke Ndịda Ebe Ọwụwa Anyanwụ Esia.
17. (a) Ka ọ na-eru 1935, ala ole ka Ndịàmà ahụ ruworo? (b) N’ihi gịnị ka ọrụ ahụ na-ejighị bụrụ nke a rụzuru mgbe ahụ?
17 N’ụzọ dị ịtụnanya, ka ọ na-eru afọ 1935, Ndịàmà Jehova ji ọrụ n’aka n’ime nkwusa na 115 ala dị iche iche, ha eruwokwarị 34 ala ndị ọzọ ná njem ịgba àmà ma ọ bụ site n’akwụkwọ ọgụgụ ndị ha zipụrụ site n’usoro nzipụ ozi. Ma, ọrụ ahụ agwụbeghị. N’afọ ahụ, Jehova meghere anya ha gaa ná nzube ya nke ịchịkọta “oké ìgwè mmadụ” ndị ga-alanarị banye n’ụwa ọhụrụ ya kpọmkwem. (Mkpughe 7:9, 10, 14) A ka nwere àmà dị ukwuu a ga-agba!
18. N’ọrụ mkpọsa nke Alaeze, òkè dị aṅaa ka Ụlọ Akwụkwọ Gilead na Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi kerewooro?
18 Ọbụna mgbe Agha Ụwa nke Abụọ rikpuru ụwa, a machibidokwa akwụkwọ ọgụgụ ma ọ bụ ọrụ Ndịàmà Jehova iwu n’ọtụtụ ala, ụlọ akwụkwọ Watchtower Bible School of Gilead mepere ụzọ ya ịzụ ndị gaje ịbụ ndị ozi ala ọzọ ịrụzu ọrụ ọbụna nke ka ukwuu nke mkpọsa Alaeze ahụ na mba nile. Ka ọ dị ugbu a, ndị gụsịrị akwụkwọ na Gilead ejewo ozi n’ihe ruru 200 ala dị iche iche. Ha emewo ihe karịrị itinye akwụkwọ n’aka ndị mmadụ ma gafere n’ógbè ọzọ. Ha eduziwo ọmụmụ Bible dị iche iche, guzobe ọgbakọ dị iche iche, ma zụọ ndị mmadụ iburu ibu ọrụ nke ọchịchị Chineke. Ná nso nso a karị, ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi ndị gụsịrị akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi enyewokwa aka igbo oké mkpa e nwere n’ihe banyere ọrụ a na kọntinent isii. A tọwo ntọala siri ike maka uto na-aga n’ihu.—Tụlee 2 Timoti 2:2.
19. Ruo ókè hà aṅaa ka ndị na-ejere Jehova ozi zaghachiworo n’òkù a na-akpọ ije ozi n’ebe ndị e nwere mkpa ka ukwuu?
19 Ndị ọzọ hà pụrụ inye aka n’ilekọta ókèala ndị ọzọ a na-arụbeghị ọrụ na ha? Na 1957, ná mgbakọ e mere gburugburu ụwa, ndị mmadụ n’otu n’otu na ezinụlọ dị iche iche—Ndịàmà Jehova tozuru okè—bụ ndị a gbara ume ịtụle ma ha ga-akwaga n’ógbè ndị e nwere mkpa ka ukwuu ije biri ma were ozi ha gaa n’ihu n’ebe ndị ahụ. Òkù ahụ yiri nnọọ nke ahụ Chineke kpọrọ Pọl onyeozi, onye hụrụ n’ọhụụ otu nwoke nke na-arịọ ya, sị: “Gabita na Masedọnia, nyere anyị aka.” (Ọrụ 16:9, 10) Ụfọdụ pụrụ n’afọ ndị 1950, ndị ọzọ pụrụ mgbe e mesịrị. Ihe ruru otu puku Ndịàmà kwagara Ireland nakwa Colombia; ọtụtụ narị kwagara ọtụtụ ebe ndị ọzọ. Ọtụtụ iri puku kwagara n’ógbè ndị nwere mkpa ka ukwuu ná mba nke aka ha.—Abụ Ọma 110:3.
20. (a) Eri 1935, gịnị ka a rụzuworo ná mmezu nke amụma Jisọs na Matiu 24:14? (b) N’ime afọ ole na ole gara aga, olee otú e siworo nwee ịbịa ọsọ ọsọ nke ọrụ ahụ?
20 Site ná ngọzi Jehova n’isi ndị ya, ọrụ mkpọsa Alaeze ahụ nọgidere na-aga n’ihu n’ọ̀tụ̀tụ̀ pụrụ iche. Eri 1935 ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa arịwo elu ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ okpukpu iri asatọ, ọ̀tụ̀tụ̀ ịrị elu nke ndị ọsụ ụzọ ejiwo 60 pasent karịa ọ̀tụ̀tụ̀ ịrị elu nke ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa. E guzobere nke ọmụmụ Bible ebe obibi n’afọ ndị 1930. E nwere ugbu a ná nkezi ihe karịrị nde anọ na ọkara a na-eduzi kwa ọnwa. Kemgbe 1935 e tinyewo ihe ruru ijeri hour 15 n’ọrụ mkpọsa nke Alaeze. A na-ekwusa ozi ọma ahụ mgbe nile ugbu a na 231 ala dị iche iche. Ka ókèala ndị dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe na Africa megheworo maka nkwusa ozi ọma ahụ ná nnwere onwe ka ukwuu, e jiwo mgbakọ mba nile mee ihe n’ụzọ dị irè iji gosipụta ozi Alaeze ahụ n’ụzọ pụtara ìhè n’ihu ọha. Dị ka Jehova kwere ná nkwa ogologo oge gara aga, n’Aịsaịa 60:22, ọ na-eme n’ezie ‘ka ọrụ ahụ bịa ọsọ ọsọ na mgbe ya.’ Lee oké ihe ùgwù ọ bụ anyị ikere òkè na ya!
Iji Ozi Ọma ahụ Rute Onye Ọ Bụla dị ka O Kwere Omume
21, 22. Olee ihe anyị pụrụ ime n’onwe anyị iji bụrụ Ndịàmà dị irè karị n’ebe ọ bụla anyị na-eje ozi?
21 Onyenwenụ ahụ ekwubeghị na ọrụ ahụ agwụla. Ọtụtụ puku mmadụ ka na-anakwere ezi ofufe. Ya mere ajụjụ na-ebilite bụ, Ànyị na-eme ihe nile ọ bụla anyị pụrụ ime iji jiri oge ntachi obi nke Jehova nyeworo maka ọrụ a mee ihe nke ọma?—2 Pita 3:15.
22 Ọ bụghị mmadụ nile pụrụ ịkwaga n’ókèala a na-adịghị arụkebe ọrụ. Ma ị̀ na-eji ohere ndị ghere oghe nye gị eme ihe n’ụzọ zuru ezu? Ị̀ na-agbara ndị ọrụ ibe gị àmà? ndị nkụzi na ụmụ akwụkwọ ibe gị? Ì mewo mgbanwe iji kwekọọ n’ọnọdụ ndị na-agbanwe agbanwe n’ókèala gị? Ọ bụrụ na, n’ihi usoro ọrụ ndị na-agbanwe agbanwe, mmadụ ole na ole na-anọ n’ụlọ n’oge ehihie, ì megharịwo usoro ihe omume gị iji kpọtụrụ ha n’oge uhuruchi? Ọ bụrụ na e mere ka ọ ghara ịdị mfe ịnabata ndị ọbịa n’ụlọ, ị̀ na-eji telifon agba àmà ma ọ bụ na-agba àmà site n’akwụkwọ ozi? Ị̀ na-esochi mmasị e gosipụtara ma na-ewepụta onwe gị iduzi ọmụmụ Bible ebe obibi? Ị̀ na-ejezu ozi gị nke ọma?—Tụlee Ọrụ 20:21; 2 Timoti 4:5.
23. Ka Jehova na-ahụta ihe anyị na-eme n’ije ozi ya, gịnị kwesịrị ịpụta ìhè n’ọnọdụ nke anyị?
23 Ka anyị nile na-eje ozi anyị n’ụzọ na-egosi Jehova nke ọma na anyị nwere obi ekele n’ezie maka oké ihe ùgwù ahụ nke ịbụ Ndịàmà ya n’oge ndị a oké ihe na-eme. Ka ọ bụrụkwa ihe ùgwù nye anyị ịbụ ndị ga-eji anya anyị hụ ka Jehova na-emezu ihe e kpere n’ikpe n’isi usoro ihe ochie nke a rụrụ arụ ma webata Ọchịchị Narị Afọ Iri nke Jisọs Kraịst!
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a A gụrụ ya n’ụzọ e si kewasịa ụwa ná mmalite afọ ndị 1990.
Ná Ntụleghachi
◻ N’ihi gịnị ka nkwusa ozi Alaeze ji dị oké mkpa?
◻ Ruo ókè hà aṅaa ka e kwusara ozi ọma ahụ ruo 1914?
◻ Àmà dị ukwuu dị aṅaa ka a gbaworo kemgbe e guzobere Alaeze ahụ?
◻ Gịnị pụrụ ime ka òkè anyị n’ozi ahụ mịpụtakwuo mkpụrụ?
[Igbe dị na peeji nke 16, 17]
NDỊÀMÀ JEHOVA Ndị Nkwusa nke Alaeze Chineke
N’ọtụtụ narị mgbakọ ndị e nwere gburugburu ụwa na 1993-1994, a mara ọkwa mwepụta nke akwụkwọ ọhụrụ a kpọrọ Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom. Nke a bụ akụkọ ihe mere eme kasị zuo ezu nke kasịkwa nwee ihe ọmụma nke Ndịàmà Jehova. Ọ bụ akwụkwọ dị 752 peji, nwere ihe osise ndị mara mma, nke nwere ihe karịrị otu puku foto ndị a chịkọtara site na 96 ala dị iche iche. Ka ọ na-erule ngwụsị nke 1993, e bipụtaworị ya na 25 asụsụ, a na-asụgharịkwa ya gaa na ndị ọzọ.
Gịnị mere akwụkwọ dị otú a ji bụrụ nke bịara n’oge ya? N’afọ ndị a ọtụtụ nde mmadụ gburugburu ụwa aghọwo Ndịàmà Jehova. Ha nile kwesịrị ịmata nke ọma banyere akụkọ ihe mere eme nke nzukọ ha so na-akpakọrịta. Ọzọkwa, nkwusa ha na ụzọ ofufe ha abamiwo n’ìgwè mba na agbụrụ dị iche iche gburugburu ụwa, bụrụkwa nke ndị na-eto eto na ndị agadi nabataworo, n’ọ̀tụ̀tụ̀ ọ bụla nke ọnọdụ akụ na ụba na agụmakwụkwọ. N’ihi ya, ọtụtụ ndị na-ekiri ihe na-emenụ nwere ọtụtụ ajụjụ banyere Ndịàmà—ọ bụghị nanị banyere ihe ha kwere na ha kamakwa mmalite ha, akụkọ ihe mere eme ha, nzukọ ha, nzube ha. Ndị ọzọ edewo ihe banyere ha, ọ bụ ezie na ọ bụghị mgbe nile n’ebughị ihe ọjọọ n’uche. Otú ọ dị, ọ dịghị onye maara akụkọ ihe mere eme nke oge a nke Ndịàmà Jehova nke ọma karịa Ndịàmà ahụ n’onwe ha. Ndị editọ nke akwụkwọ a agbalịwo iwepụta akụkọ ihe mere eme ahụ n’echiche ziri ezi n’eziokwu. N’ime otú ahụ, ha edekọwo ruo ugbu a mmezu nke akụkụ ahụ pụtara nnọọ ìhè nke ihe ịrịba ama nke ọnụnọ Kraịst bụ́ nke e dekọrọ na Matiu 24:14, ha emewo ya site n’inye nkọwa ndị a pụrụ inweta site nanị n’aka ndị ahụ mikpuru onwe ha n’ọrụ nke e buru amụma ya n’ebe ahụ.
E kewara akwụkwọ ahụ gaa ná nkebi asaa bụ́ isi:
Nkebi 1: Akụkụ nke a nyobara anya ná ntọala akụkọ ihe mere eme nile nke Ndịàmà Jehova. Ọ gụnyere nchịkọta dị mkpirikpi, nke jupụtara n’ihe ọmụma nke akụkọ ihe mere eme ha n’oge ugbu a malite na 1870 ruo 1992.
Nkebi nke 2: Nke a bụ ntụleghachi na-ekpughe ihe nke nghọta na-aga n’ihu nke nkwenkwe dị iche iche na-esetịpụ Ndịàmà Jehova iche site n’òtù okpukpe ndị ọzọ.
Nkebi nke 3: Akụkụ nke a nke akwụkwọ ahụ na-enyocha ntolite nke ọdịdị nke nzukọ ha. Ọ na-akọ ihe ndị mere eme na-akpali mmasị banyere nzukọ nile nke ọgbakọ ha na mgbakọ ha dị iche iche, nakwa ụzọ ha si ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze, Ụlọ Mgbakọ ndị ka ibu, na ihe owuwu dị iche iche maka ibipụta akwụkwọ Bible. Ọ na-akọ ịnụ ọkụ n’obi nke Ndịàmà Jehova ji ekwusa Alaeze Chineke na ịhụnanya nke na-apụta ìhè ka ha na-elekọta ibe ha n’oge ihe isi ike.
Nkebi nke 4: N’ebe a ị ga-achọta ụmụ irighiri ihe na-adọrọ mmasị banyere otú nkwusa nke Alaeze Chineke siworo ruo mba ndị a ma ama na agwaetiti ndị dịpụrụ adịpụ gburugburu ụwa. Chetụdị echiche—ime nkwusa na 43 ala dị iche iche n’afọ 1914, ma na 229 ala ka ọ na-eru 1992! Ahụmahụ dị iche iche nke ndị kerewooro òkè ná mmụba a zuru ụwa ọnụ na-akpata obi ụtọ n’ezie.
Nkebi nke 5: Ịrụzu ọrụ a dum nke nkwusa Alaeze achọwo mwepụta nke ihe owuwu dị iche iche gburugburu ụwa maka ibipụta Bible nakwa akwụkwọ ndị e ji amụ Bible ná mba dị iche iche n’ihe karịrị narị asụsụ abụọ. N’ebe a ị ga-amụta banyere akụkụ ahụ nke ọrụ ha.
Nkebi nke 6: Ndịàmà ahụ echewokwa ule dị iche iche ihu—ụfọdụ n’ihi ezughị okè mmadụ, ndị ọzọ n’ihi ụmụnna ụgha, na ọbụna karịsịa n’ihi mkpagbu pụtara ìhè. Okwu Chineke dọrọ aka ná ntị na nke a ga-adị otú ahụ. (Luk 17:1; 2 Timoti 3:12; 1 Pita 4:12; 2 Pita 2:1, 2) Nkebi nke a nke akwụkwọ ahụ n’ụzọ pụtara ìhè na-akọ ihe meworo eme na ụzọ okwukwe Ndịàmà Jehova siworo nyere ha aka inwe mmeri.
Nkebi nke 7: Ná mmechi, akwụkwọ ahụ na-atụle ihe mere obi ji sie Ndịàmà Jehova ike nke ukwuu na nzukọ ahụ nke ha bụ akụkụ ya bụ n’ezie nke Chineke na-eduzi. Ọ kọkwara ihe mere ha ji were ya n’ihe dị mkpa, ma dị ka otu nzukọ ma dị ka ndị mmadụ n’otu n’otu, ịnọgide na-eche nche.
Tụkwasị n’ihe dị n’elu, akwụkwọ ukwu a haziri n’ụzọ na-adọrọ anya gụnyere akụkụ mara mma na nke jupụtara n’ihe ọmụma, nke dị 50 peji nke foto ndị dị n’àgwà dị iche iche, bụ́ ndị na-egosi isi ụlọ ọrụ ụwa nile nakwa alaka ụlọ ọrụ dị iche iche Ndịàmà Jehova ji eme ihe gburugburu ụwa.
Ọ bụrụ na i mebeghịrịị otú ahụ, ị ghaghị irite uru site n’inweta na ịgụ otu n’ime akwụkwọ a na-akpali mmasị.
Okwu Ndị Sitere n’Ọnụ Ụfọdụ Ndị Gụworo Ya
Olee ihe bụ mmeghachi omume nke ndị gụworo akwụkwọ a? Nke a bụ ole na ole:
“Aka m gụpụrụ akwụkwọ ahụ na-akpali mmasị, nke ihe bụ eziokwu, bụ́ Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom. Nanị nzukọ nke ji iguzosi ike n’ihe ma dịkwa obi umeala nye eziokwu ahụ pụrụ ide ihe hoo haa, n’obi ike, na n’ụzọ na-akpali akpali otú a.”
“O yiri ka ịgụ Ọrụ Ndị Ozi, ya na ikwu eziokwu na ịkwụwa aka ọtọ ya.”
“Lee akwụkwọ ọhụrụ na-akpali akpali ọ bụ! . . . Ọ bụ ọrụ nkà nke akụkọ ihe mere eme.”
Mgbe ọ gụchara ihe dị ka ọkara nke akwụkwọ ahụ, otu nwoke dere, sị: “O juru m anya, rie m ọnụ, anya mmiri chọọkwa ịpụ m. . . . N’afọ ndụ m nile, ọ dịghị akwụkwọ ọ bụla ọzọ jupụtara n’oké mmetụta otú a.”
“Obi m na-aṅụrị ọṅụ mgbe ọ bụla m chere otú akwụkwọ a ga-esi gbaa okwukwe ndị na-eto eto nakwa ndị ọhụrụ na-abata ná nzukọ ahụ taa ume.”
“Ana m enwe ekele mgbe nile maka eziokwu ahụ, ma ịgụ akwụkwọ nke a emeghewo anya m, nyekwara m aka ịghọta karịa mgbe ọ bụla ọzọ na mmụọ nsọ Jehova kwụ n’azụ ihe ahụ dum.”
[Foto ndị dị na peeji nke 18]
E jiri ozi Alaeze ahụ rute ọtụtụ ndị ọbụna mgbe Ndịàmà ahụ dị ole na ole n’ọnụ ọgụgụ