Ndị Nne na Nna, Ụmụ Unu Nwere Mkpa Nlekọta Pụrụ Iche
“Ụmụ gị ga-adị ka ome osisi olive gburugburu table gị.”—ABỤ ỌMA 128:3.
1. Olee otú a pụrụ isi jiri ịzụlite ihe ọkụkụ tụnyere ịzụlite ụmụaka?
N’ỌTỤTỤ akụkụ, ụmụaka na-eto dị ka ihe ọkụkụ. Ya mere, ọ bụghị ihe ijuanya na Bible na-ekwu banyere nwunye mmadụ dị ka “osisi vine na-amị mkpụrụ” ma na-eji ụmụaka na-atụnyere “ome osisi olive gburugburu table [ya].” (Abụ Ọma 128:3) Onye ọrụ ugbo ga-agwa gị na ịzụlite otu ihe ọkụkụ dị nta adịghị mfe, karịsịa mgbe ọnọdụ ihu igwe na ala na-adịghị mma. N’otu aka ahụ, n’oge “mgbe ikpeazụ” ndị a di oké egwu, o siri oké ike ịzụlite ụmụaka ịghọ ndị toro eto nọ n’ezi nguzo, na-atụ egwu Chineke.—2 Timoti 3:1-5.
2. Gịnị ka a chọrọ n’ezie iji nweta owuwe ihe ubi dị mma?
2 Iji nweta ezi mkpụrụ dị ka ihe ubi, ala na-eme nri, anwụ na-ekpotu ọkụ, na mmiri dị onye ọrụ ugbo mkpa. Tinyere ịkọ ubi na ịrụcha ahịhịa, ọ ghaghị ibelata ahụhụ ndị na-eri ihe a kụrụ, meekwa ihe nchebe ndị ọzọ. A pụrụ inwe oge ndị ọzọ nke ihe isi ike ruo mgbe owuwe ihe ubi. Lee ka o si abụ ihe mwute mgbe mkpụrụ ahụ na-emeghị nke ọma! Ma, lee aha afọ ojuju onye na-akọ ugbo pụrụ inwe mgbe, ka ọrụ siri ike gasịrị, o nweta mkpụrụ ọma dị ka ihe ubi!—Aịsaịa 60:20-22; 61:3.
3. Ihe ọkụkụ na ụmụaka olee nke ka mkpa, ụdị nlekọta dịkwa aṅaa ka ụmụaka kwesịrị inweta?
3 Ndụ mmadụ nke gara nke ọma, nke rụpụtara ihe, n’ezie dị oké ọnụ ahịa karịa owuwe ihe ubi nke onye na-akọ ugbo. Ya mere ọ bụghị ihe ijuanya na ịzụlite nwatakịrị n’ụzọ gara nke ọma pụrụ iwe ọbụna oge na mgbalị ka ukwuu karịa ịzụlite ihe ọkụkụ bara ụba. (Deuterọnọmi 11:18-21) Nwa dị ntakịrị a kụrụ n’ugbo nke ndụ, ọ bụrụ na e jiri ịhụnanya gbaa ya mmiri ma kpaara ya ókè ndị na-enye ahụ ike, pụrụ itolite ma maa ifuru n’ụzọ ime mmụọ ọbụna n’ụwa nke jupụtara n’ụkpụrụ omume ndị na-asọ oyi. Ma ọ bụrụ na e mesoo ya n’ụzọ na-adịghị mma ma ọ bụ megbuo ya, nwa ahụ ga-atụbọ na ma eleghị anya nwụọ n’ụzọ ime mmụọ. (Ndị Kọlọsi 3:21; tụlee Jeremaịa 2:21; 12:2.) N’ezie, ụmụaka nile nwere mkpa nlekọta pụrụ iche!
Nlekọta Kwa Ụbọchị Site na Nwata
4. Nlekọta dị aṅaa dị ụmụaka mkpa site “na nwa ọhụrụ”?
4 Ndị nne na nna aghaghị inye nwa ọhụrụ nlekọta mgbe nile nnọọ. Otú ọ dị, nwa ọhụrụ ahụ ò nwere nanị mkpa nlekọta anụ ahụ ma ọ bụ nke ihe onwunwe kwa ụbọchị? Nye Timoti jeere Chineke ozi, Pọl onyeozi dere, sị: “I sitere n’oge ị dị na nwa ọhụrụ mata ihe dị nsọ nile e deworo n’akwụkwọ nsọ nke pụrụ ime ka ị bụrụ onye amamihe ịnata nzọpụta.” (2 Timoti 3:15) Ya mere nlekọta nne na nna Timoti natara, ọbụna na nwa ọhụrụ, bụkwa ụdị nke ime mmụọ. Ma olee mgbe nwa ọhụrụ na-amalite?
5, 6. (a) Gịnị ka Bible na-ekwu banyere nwa a na-amụbeghị amụ? (b) Gịnị na-egosi na ndị nne na nna kwesịrị inwe nchegbu banyere ọdịmma nke nwa a na-amụbeghị amụ?
5 A na-ejikwa okwu Grik Pọl ji mee ihe n’ebe a (breʹphos) eme ihe banyere nwa a na-amụbeghị amụ. Elizabet, nne Jọn Onye Na-eme Baptism, gwara onye ikwu ya bụ́ Meri: “Mgbe olu ekele gị ruru ná ntị m, nwa [breʹphos] m wuliri n’afọ m n’obi ụtọ.” (Luk 1:44) Otú a, a na-akpọ ọbụna ndị a na-amụbeghị amụ ụmụ ọhụrụ, Bible na-egosikwa na ha pụrụ ịzaghachi n’ihe ndị na-eme n’èzí nke akpa nwa. Ya mere, nlekọta nne na nna, nke a na-agbakarị ume ya taa, ò kwesịrị ịgụnye nlekọta maka ọdịmma ime mmụọ nke ụmụ ọhụrụ a na-amụbeghị amụ?
6 Nke a bụ ihe a ga-echebara echiche, ebe ọ bụ na ihe àmà na-ekpughe na nwa a na-amụbeghị amụ pụrụ irite uru ma ọ bụ nweta mmetụta ọjọọ nke ihe ha na-anụ. Onye nduzi egwú chọpụtara na ọtụtụ ụdị egwú ọ na-amụgharị yiri n’ụzọ dị ịtụnanya ka ọ̀ mabu ha, karịsịa akụkụ nke ụbọ cello. Mgbe ọ gwara nne ya, bụ́ ọkà n’egwú cello, aha egwú ndị ahụ, ọ sịrị na ndị a bụ kpọmkwem egwú ndị ọ na-amụgharị mgbe ọ dị ime ya. N’otu aka ahụ, a pụrụ inwe mmetụta dị njọ n’ahụ nwa a na-amụbeghị amụ mgbe nne ha nwere àgwà nke ikiri ihe nkiri a na-eme kwa izu nke TV. N’ihi ya, otu akwụkwọ ahụ ike kwuru banyere “iri ahụ na-egbu egbu nke ihe nkiri a na-eme kwa izu.”
7. (a) Olee otú ọtụtụ ndị nne na nna siworo lebara ọdịmma nke nwa ha a na-amụbeghị amụ anya? (b) Olee ikike ndị nwatakịrị nwere?
7 Ịmata uru nke ihe mkpali ndị dị mma nye ụmụ ọhụrụ, ọtụtụ ndị nne na nna na-amalite ịgụrụ nwa ha ihe, na-ekwunyere ya okwu, na-agụrụ ya egwú ọbụna tupu a mụọ ya. Ị pụrụ ime otu ihe ahụ. Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na nwa ọhụrụ gị agaghị aghọta okwu ndị ahụ, o yikarịrị ka ọ ga-erite uru n’olu dị nro na ụda olu ịhụnanya ya. Mgbe a mụsịrị ya, nwa ahụ ga-amalite ịghọta okwu gị, ma eleghị anya oké ngwa ngwa karịa otú i chere. N’afọ abụọ ma ọ bụ atọ nanị, nwatakịrị na-amụta asụsụ dị mgbagwoju anya nanị site n’ịbụ onye e kpughepụrụ nye ya. Nwa ọhụrụ pụkwara ịmalite ịmụta “asụsụ dị ọcha” ahụ nke eziokwu Bible.—Zefanaịa 3:9, NW.
8. (a) Gịnị ka ihe àmà na-egosi na Bible bu n’uche mgbe ọ sịrị na Timoti maara ihe nile dị nso e dere n’akwụkwọ site “na nwa ọhụrụ”? (b) Gịnị ghọrọ eziokwu banyere Timoti?
8 Gịnị ka Pọl bu n’uche mgbe o kwuru na Timoti ‘amarawo ihe dị nsọ nile e deworo n’akwụkwọ site na nwa ọhụrụ’? Ihe àmà na-egosi na o bu n’uche na Timoti anarawo ọzụzụ ime mmụọ site na nwa ọhụrụ, ọ bụghị nanị site na nwata. Nke a kwekọrọ n’ihe okwu Grik ahụ bụ́ breʹphos pụtara, nke na-ezokarị aka n’ebe nwa a ka mụrụ ọhụrụ nọ. (Luk 2:12, 16; Ọrụ 7:19) Timoti natara ntụziaka ime mmụọ site n’aka nne ya bụ́ Yunaịsi na nne ya ochie bụ́ Lọịs site nnọọ na mgbe ọ pụrụ icheta. (2 Timoti 1:5) Okwu ahụ bụ́, ‘Otú e si na-agbazi ome osisi na-akabeghị aka, otú ahụ ka osisi ahụ si eto’ n’ezie bụ eziokwu n’ebe Timoti nọ. ‘A zụlitewo ya dị ka ụzọ ya si dị,’ n’ihi ya kwa, ọ ghọrọ ezi onye na-ejere Chineke ozi.—Ilu 22:6; Ndị Filipaị 2:19-22.
Nlekọta Pụrụ Iche nke Dị Mkpa
9. (a) Gịnị ka ndị nne na nna kwesịrị izere ime, n’ihi gịnịkwa? (b) Ka nwatakịrị na-etolite, gịnị dị ndị nne na nna mkpa ime, ihe nlereanya dị aṅaa ka ha kwesịrị ịnakwere?
9 Ụmụaka dịkwa ka ihe ọkụkụ n’echiche nke na ọ bụghị ha nile nwere otu ụdị ejimara, ha nile adịghịkwa azaghachi n’otu ụdị ụzọ dị iche iche nke nlekọta. Ndị nne na nna mara ihe ga-aghọta ọdịiche ndị ahụ ma zere iji otu nwata tụnyere ọzọ. (Tụlee Ndị Galetia 6:4.) Ọ bụrụ na ụmụ gị ga-ama ifuru ịghọ ndị okenye, ọ dị gị mkpa ịhụta ụkpụrụ ụdịdị onwe onye ndị dịịrị ya kpọmkwem, na-azụlite ndị nke dị mma ma na-arụchapụ ndị dị njọ. Gịnị ma ọ bụrụ na ị chọpụta otu adịghị ike ma ọ bụ ọchịchọ na-ezighị ezi, ma eleghị anya banyere emeghị ihe n’eziokwu, ịhụ ihe onwunwe n’anya, ma ọ bụ ọchịchọ ọdịmma onwe onye nanị? Jiri obi ọma dozie ya, ọbụna dị ka Jisọs doziri adịghị ike dị iche iche nke ndị ozi ya. (Mak 9:33-37) Karịsịa, na-aja nwata nke ọ bụla mma mgbe mgbe maka ume na àgwà ọma ya dị iche iche.
10. Gịnị ka ụmụaka chọrọ karịsịa, oleekwa ụzọ a pụrụ isi nye ya?
10 Ihe ụmụaka chọrọ karịsịa bụ nlebara anya onwe onye n’ịhụnanya. Jisọs wepụtara oge iji nye ụmụntakịrị nlekọta pụrụ iche dị otú ahụ, ọbụna n’ụbọchị ndị ikpeazụ nke ozi ya mgbe o ji ọrụ n’aka. (Mak 10:13-16, 32) Ndị nne na nna, gbasoonụ ihe nlereanya ahụ! N’enweghị ọchịchọ ọdịmma onwe onye nanị wepụta oge soro ụmụ gị nọkọọ. Ihere emekwala gị igosi ha ezigbo ịhụnanya. Konye ha aka, dị ka Jisọs mere. Makụọ ha, susuokwa ha ọnụ n’ịhụnanya na n’ụzọ na-ekpo ọkụ. Mgbe a jụrụ nne na nna nke ndị okenye nọ n’ezi nguzo ndụmọdụ ha pụrụ inye ndị nne na nna ndị ọzọ, ihe ndị so ná nzaghachi ndị a na-anụkarị bụ: ‘hụ n’anya nke ukwuu,’ ‘wepụta oge nọkọọ ọnụ,’ ‘na-akwanyererịta ùgwù,’ ‘na-ege ha ntị n’ezie,’ ‘na-enye nduzi kama ịdị na-ekwu okwu,’ na ‘nwee echiche ziri ezi.’
11. (a) Olee otú nne na nna kwesịrị isi lee inye ụmụ ha nlekọta pụrụ iche anya? (b) Olee mgbe ndị nne na nna pụrụ inwe ike iso ụmụ ha nwee nkwurịta okwu ndị bara uru?
11 Inye nlekọta pụrụ iche dị otú ahụ pụrụ ịbụ ihe ọṅụ. Otu nna nwere ihe ịga nke ọma dere, sị: “Mgbe ụmụ anyị ndị ikom abụọ dị nta karị, usoro nke ijikere ha maka ịlakpu ụra, ịgụrụ ha ihe, ịfọnye uwe elu ha n’ime, na isoro ha kpee ekpere na-enye obi ụtọ.” Oge ndị dị otú ahụ a nọkọrọ ọnụ na-enye ohere maka nkwurịta okwu nke pụrụ ịbụ ihe agbamume nye ma nne na nna ma nwa. (Tụlee Ndị Rom 1:11, 12.) Otu di na nwunye gere ntị mgbe nwa ha dị afọ atọ rịọrọ Chineke ka ọ gọzie “Wally.” O kpere ekpere maka “Wally” n’abalị ndị na-esonụ, a gbakwara nne na nna ahụ ume nke ukwuu mgbe ha chọpụtara na ihe o bu n’uche bụ ụmụnna nọ na Malawi, ndị na-enwe mkpagbu na mgbe ahụ. Otu nwanyị kwuru: ‘Mgbe m gbara nanị afọ anọ, nne m nyeere m aka iburu akụkụ akwụkwọ nsọ dị iche iche n’isi na ịbụ abụ Alaeze mgbe m na-eguzo n’elu oche na-ehichasị mmiri n’arịa nri dị iche iche ka ọ na-asa ha.’ Ị̀ pụrụ icheta oge dị iche iche mgbe ị pụrụ isoro ụmụntakịrị gị nwee nkwurịta okwu ndị bara uru?
12. Gịnị ka ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst ga-eji amamihe nye ụmụ ha, ụzọ ndị dịkwa aṅaa ka a pụrụ iji mee ihe?
12 Ndị nne na nna maara ihe bụ́ ndị Kraịst na-eme ndokwa maka usoro ịmụ ihe mgbe mgbe. Ọ bụ ezie na ị pụrụ iji ụzọ a na-ejikarị eme ihe nke ajụjụ na azịza, ị̀ pụrụ itinye ihe n’ịdị ụto nke nkwurịta okwu site n’ịgbanwe ụkpụrụ ọmụmụ ihe, karịsịa maka ụmụaka ndị dị nta karị? Ị pụrụ itinye ise ihe osise dị iche iche nke ihe ndị dị na Bible, ịkọ akụkọ Bible, ma ọ bụ ige ntị n’ihe ị gwaworo nwatakịrị ka ọ kwadebe. Mee ka Okwu Chineke dị ụtọ dị ka ị pụrụ maka ụmụ gị ka ha wee zụlite agụụ maka ya. (1 Pita 2:2, 3) Otu nna sịrị: ‘Mgbe ụmụaka ahụ dị nta karị, anyị na-eso ha na-egbegharị igbe n’ala ma na-eme ihe nkiri nke ihe akụkọ ndị mere eme bụ́ ndị metụtara ndị a ma ama na Bible. Ọ na-atọ ụmụaka ahụ ụtọ nke ukwuu.’
13. Gịnị bụ abamuru nke oge mmụgharị ihe, gịnịkwa ka unu pụrụ ịmụgharị n’oge ndị a?
13 Oge mmụgharị dị iche iche na-ewetakwa nkwurịta okwu ndị bara uru n’ihi na ha na-enyere ndị na-eto eto aka ịkwadebe maka ọnọdụ ndị na-eme eme n’ezie. Otu n’ime ụmụ Kusserow—nke ha dum dị 11 nọgidere n’ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke n’oge mkpagbu ndị Nazi—kwuru banyere ndị mụrụ ha: “Ha gosiri anyị ụzọ anyị ga-esi jiri Bible na-eme ihe ma na-azọrọ isi anyị. [1 Pita 3:15] Ọtụtụ mgbe anyị na-enwe oge mmụgharị, na-ajụ ajụjụ ma na-enye azịza.” Gịnị mere ị gaghị eme otu ihe ahụ? Ị pụrụ ịmụgharị ụzọ isi jee ozi, ebe nne ma ọ bụ nna na-eme dị ka onye nwe ụlọ. Ma ọ bụ oge mmụgharị ihe pụrụ imetụta ọnwụnwa ndị a na-enwe n’ezie. (Ilu 1:10-15) “Ịmụgharị ọnọdụ ndị siri ike pụrụ iwulite nkà na obi ike nwatakịrị,” ka otu onye kọwara. “Mmụgharị ahụ pụrụ ịgụnye ime dị ka otu enyi nke na-enye nwa gị sịga, ihe ọṅụṅụ ma ọ bụ ọgwụ ọjọọ.” Oge ndị a pụrụ inyere gị aka ịmata ụzọ nwa gị ga-esi meghachi omume n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ.
14. N’ihi gịnị ka iso ụmụ gị nwee nkwurịta okwu ịhụnanya na ndị dị nro ji dị oké mkpa?
14 Mgbe i so nwa gị na-ekwurịta okwu, gwa ya okwu n’otu olu ahụ dị nro nke onye dere okwu ndị a na-esonụ ji mee ihe: “Nwa m, echezọla iwu m; ma ka obi gị chebe ihe nile m nyere n’iwu: n’ihi na ụbọchị ndụ nke dị ogologo, na ọtụtụ afọ nke ndụ, na udo, ka ha ga-atụkwasịrị gị.” (Ilu 3:1, 2) Ọ̀ bụ na ọ gaghị emetụ nwa gị n’obi ma ọ bụrụ na i jiri ịhụnanya kọwaa na ị chọrọ nrubeisi n’ihi na nke a ga-arụpụtara ya inwe udo na ụbọchị ndụ nke dị ogologo—n’ezie, ndụ agwụ agwụ n’ụwa ọhụrụ Chineke nke udo? Buru ọdịdị onye nke nwatakịrị gị n’uche mgbe ị na-atụgharị uche site n’Okwu Chineke. Jiri ekpere mee nke a, Jehova ga-agọzikwa mgbalị gị nile. Ntụle ndị dị otú ahụ dabeere na Bible nke e ji ịhụnanya na ịdị nro mee yikarịrị ka ọ ga-arụpụta ihe ndị dị mma ma weta uru na-adịru ebighị ebi.—Ilu 22:6.
15. Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi nyere ụmụ ha aka idozi nsogbu?
15 Ọ bụrụgodi na nkwurịta okwu dị otú ahụ ewereghị ọnọdụ n’oge ọmụmụ ihe i mere atụmatụ ya, ka ihe ndị ọzọ ghara ịdọpụ uche gị. Gee ntị nke ọma ọ bụghị nanị n’ihe nwa gị na-ekwu kamakwa n’ụzọ o si kwupụta echiche ahụ. “Na-ele nwa gị anya,” ka otu ọkachamara kwuru. “Tinye uche gị dum n’ebe ọ nọ. Ọ dị gị mkpa ịghọta, ọ bụghị nanị ịnụ ihe. Nne na nna ndị na-etinyekwu mgbalị ahụ pụrụ ime ka e nwee oké ọdịiche ná ndụ ụmụ ha.” Ụmụaka taa na-ezutekarị nsogbu ndị siri ike n’ụlọ akwụkwọ na n’ebe ndị ọzọ. Dị ka nne ma ọ bụ nna, mee ka nwa ahụ kwupụta uche ya, nyekwara ya aka ile okwu anya site n’ụzọ Chineke si ele ihe anya. Ọ bụrụ na i jighị n’aka ụzọ isi dozie nsogbu ahụ, mee nnyocha n’Akwụkwọ Nsọ na akwụkwọ ndị e wepụtara site n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.” (Matiu 24:45) Mee ihe nile ị pụrụ ime iji nye nwa gị nlekọta nile pụrụ iche nke dị mkpa iji dozie nsogbu ahụ.
Were Oge Unu Nọkọrọ Ọnụ n’Ihe Dị Oké Ọnụ
16, 17. (a) N’ihi gịnị ka ndị na-eto eto ji nwee mkpa nlekọta pụrụ iche na ntụziaka nke ukwuu taa? (b) Gịnị ka ọ dị ụmụaka mkpa ịmara mgbe nne na nna ha na-adọ ha aka ná ntị?
16 Ndị na-eto eto nwere mkpa nlekọta pụrụ iche ka ukwuu taa karịa mgbe ọ bụla ọzọ n’ihi na anyị na-ebi na “mgbe ikpeazụ,” ndị a bụkwa “oge dị oké egwu.” (2 Timoti 3:1-5; Matiu 24:3-14) Ndị nne na nna na ụmụaka n’otu aka ahụ nwere mkpa nke ezi amamihe nke “na-eme ka onye nwe ya dị ndụ.” (Eklisiastis 7:12) Ebe ọ bụ na amamihe Chineke gụnyere ntinye nke ihe ọmụma dabeere na Bible n’ọrụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ụmụaka nwere mkpa nke ntụziaka a na-enye mgbe nile n’Okwu Chineke. Ya mere, soro ụmụntakịrị gị na-amụ Akwụkwọ Nsọ. Na-agwa ha banyere Jehova, jiri nlezianya na-akọwa ihe ndị ọ chọrọ n’aka ha, meekwa ka e nwee atụmanya na-enye ọṅụ maka mmezu nkwa ya ndị dị ebube. Na-ekwu okwu banyere ihe ndị dị otú ahụ n’ụlọ, ka ị na-aga ije ụmụ gị na-eso gị n’akụkụ gị—n’ezie, n’ọnọdụ ọ bụla kwesịrị ekwesị.—Deuterọnọmi 6:4-7.
17 Ndị ọrụ ugbo maara na ọ bụghị ihe ọkụkụ nile na-eme nke ọma n’okpuru otu ụdị ọnọdụ. Ihe ọkụkụ chọrọ nlekọta pụrụ iche. N’otu aka ahụ, nwatakịrị nke ọ bụla dị iche ma chọọ nlekọta, ntụziaka, na ọzụzụ pụrụ iche. Dị ka ihe atụ, Ile anya n’iwe nke nne ma ọ bụ nna pụrụ izu ezu ịkwụsị ụzọ ọjọọ nke otu onye na-eto eto, ebe nwatakịrị ọzọ pụrụ ịchọ ịdọ aka ná ntị siri ike karị. Ma ọ dị ụmụ gị nile mkpa ịmara ihe mere i ji wee iwe n’ihi okwu ma ọ bụ omume ụfọdụ, nne na nna ahụ kwesịkwara imekọ ihe ọnụ ka ọzụzụ ahụ wee na-eguzosi ike. (Ndị Efesọs 6:4) Ọ dị oké mkpa ka nne na nna bụ́ ndị Kraịst nye nduzi doro anya nke kwekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ.
18, 19. Ibu ọrụ dị aṅaa ka ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst nwere n’ebe ụmụ ha nọ, gịnịkwa ka o yiri ka ọ ga-arụpụta ma a rụọ ọrụ ahụ nke ọma?
18 Onye ọrụ ugbo aghaghị ịrụ ọrụ nke ịkụ ihe na ịzụlite ihe n’oge kwesịrị ekwesị. Ọ bụrụ na o gbuo oge ma ọ bụ leghara ihe ọkụkụ ya anya, ọ ga-enwe ihe dị nta ma ọ bụ ghara inwe ma ọlị ihe ọ ga-ewe dị ka ihe ubi. Ma, ụmụntakịrị gị bụ “ihe ọkụkụ” ndị na-etolite etolite nwere mkpa nke nlekọta pụrụ iche ugbu a, ọ bụghị n’ọnwa na-abịa ma ọ bụ n’afọ na-abịa. Ekwela ka ohere ndị dị oké ọnụ ahịa maka ịkwalite uto ime mmụọ ha n’ụzọ kwekọrọ n’Okwu Chineke na ịrụchapụ echiche dị iche iche nke ụwa bụ́ ndị pụrụ ịkpata ha ịkpọnwụ ma nwụọ n’ime mmụọ gabiga. Were hour na ụbọchị ndị i nwere ihe ùgwù nke iso ụmụ gị nọkọọ n’ihe dị oké ọnụ ahịa, n’ihi na oge ndị a na-agabiga ngwa ngwa. Rụsie ọrụ ike ịzụlite n’ime nwa gị àgwà dị iche iche nke Chineke bụ́ ndị a chọrọ maka ndụ obi ụtọ dị ka ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi. (Ndị Galetia 5:22, 23; Ndị Kọlọsi 3:12-14) Nke a abụghị ọrụ dịịrị onye ọzọ; ọ bụ ọrụ gị, Chineke pụkwara inyere gị aka ịrụ ya.
19 Nye ụmụ gị ihe nketa ime mmụọ bara ụba. Soro ha mụọ Okwu Chineke, nwekọọkwa ntụrụndụ na-ewuli elu. Kpọrọ ụmụntakịrị gị gaa nzukọ ndị Kraịst, meekwa ka ha nọrọ gị n’akụkụ n’ọrụ nkwusa Alaeze. Wulite n’ime nwa gị ị hụrụ n’anya ụdị mmadụ nke ruru inweta nnwapụta Jehova, o yikarịkwara ka ha ga-ewetara gị oké ọṅụ mgbe ị na-emewanye okenye. N’ezie, “nna nke onye ezi omume ga-etegharị egwú ọṅụ nke ukwuu: onye na-amụkwa onye maara ihe ga-aṅụrị ọṅụ na ya. Ka nna gị na nne gị ṅụrịa, ka nwanyị mụworo gị tegharịakwa egwú ọṅụ.”—Ilu 23:24, 25.
Ụgwọ Ọrụ Bara Ụba
20. Gịnị bụ ụzọ isi bụrụ nne ma ọ bụ nna na-enwe ihe ịga nke ọma nye ndị nọ n’agbata afọ ndụ nke iri na atọ na iri na itoolu?
20 Ọzụzụ nke ụmụaka bụ ọrụ siri ike nke na-ewe ogologo oge. A kpọwo ịzụlite ‘ome osisi olive ndị a nọ gburugburu table gị’ ịghọ ndị okenye na-atụ egwu Chineke ndị na-amị mkpụrụ Alaeze ọrụ na-ewe 20 afọ. (Abụ Ọma 128:3; Jọn 15:8) Ọrụ a na-esikarịkwu ike mgbe ụmụaka ruru afọ ndụ agbata iri na atọ na iri na itoolu, mgbe nrụgide na-abịakwasị ha na-arịwanyekarị elu, ọ dịkwa ndị nne na nna mkpa imesiwanyekwu mgbali ha ike. Ma ụzọ isi nwee ihe ịga nke ọma na-anọgide na-abụ otu ihe ahụ—ileru anya, na-ekpo ọkụ, na-aghọtakwa. Cheta na ụmụntakịrị gị n’ezie nwere mkpa maka nlekọta pụrụ iche. Ị pụrụ inye ha nlekọta dị otú ahụ site n’igosi nchegbu ịhụnanya maka ọdịmma ha. Iji nyere ha aka, ị ghaghị itinye onwe gị n’ọrụ site n’inye oge, ịhụnanya na nchegbu nke ha nwere mkpa ya n’ezie.
21. Gịnị pụrụ ịbụ ụgwọ ọrụ nke inye ụmụaka nlekọta pụrụ iche?
21 Ụgwọ ọrụ maka mgbalị gị nile iji lekọta mkpụrụ dị oké ọnụ ahịa Jehova tinyeworo n’aka gị pụrụ inye afọ ojuju nke ukwuu karịa owuwe ihe ubi bara ụba nke onye ọrụ ugbo. (Abụ Ọma 127:3-5) Ya mere ndị nne na nna, nọgidenụ na-enye ụmụ unu nlekọta pụrụ iche. Mee otú ahụ maka ọdịmma ha na iji nye Nna anyị nke eluigwe bụ́ Jehova, otuto.
Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?
◻ Olee otú a pụrụ isi jiri ịzụlite ihe ọkụkụ tụnyere ịzụlite ụmụaka?
◻ Ụdị nlekọta dị aṅaa ka nwatakịrị kwesịrị inweta kwa ụbọchị site na nwa ọhụrụ?
◻ Nlekọta pụrụ iche dị aṅaa dị ụmụaka mkpa, oleekwa otú a pụrụ isi nye ya?
◻ N’ihi gịnị ka ị ga-eji nye ụmụ gị nlekọta pụrụ iche?