Ịnagide Oké Ọchịchọ Ịla Ụlọ n’Ije Ozi Chineke
JISỌS KRAỊST nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu, sị: “Gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.” (Matiu 28:19) Nye ọtụtụ ndị Kraịst, ịrụ ọrụ ahụ apụtawo ịnakwere ọnọdụ ndị siri ike n’ebe dị anya site n’ụlọ ha. Ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, ndị nwunye ha, na ndị ọzọ na-ahapụ ọtụtụ ihe n’azụ n’ihi ije ozi Chineke. Oké ọchịchọ ịla ụlọ pụrụ ịbụ oké ihe ịma aka nye Ndịàmà Jehova ndị a nile.
Oké ọchịchọ ịla ụlọ na-abịa mgbe ike ncheta buuru echiche gị laghachi azụ n’ịnọ ná ntụkwasị obi na ịhụnanya e nwere n’oge gara aga. Nke a pụrụ ịkpata mmetụta uche dị oké ike nke na ị na-enwe ịda mbà n’obi ma ghara inwe ike ịnọ na-aga n’ihu. N’ezie, mgbe ha resịrị ihe onwunwe ha ma mee njem furu oké ihe gaa n’ala mba ọzọ, ọ dịwo ụfọdụ mkpa ịgbahapụ atụmatụ ha ma laghachi be ha. Oké ọchịchọ ịla ụlọ meriri ha.
Mwakpo ndị dị otú ahụ ná mmetụta uche na-adịkarị ọtụtụ mgbe a ka kwagasịrị akwaga, ma n’ebe ụfọdụ nọ ha na-adịgide ogologo ndụ nile. Mgbe ọ na-anọbeghị n’ụlọ ruo ihe karịrị 20 afọ, ‘agụụ ụlọ nna ya gụsịrị Jekọb ike.’ (Jenesis 31:30) Ònye pụrụ ịtụ anya ịta ahụhụ oké ọchịchọ ịla ụlọ? Gịnị na-akpalite ya? Olee otú mmadụ pụrụ isi ịnagide mmetụta ndị dị otú ahụ?
Gịnị Na-akpalite Obi Ilu Ahụ?
Oké ọchịchọ ịla ụlọ pụrụ imetụta onye ọ bụla. Amytis, nwa nwanyị nke eze Media bụ́ Astyages, yiri ka o nwere ihe nile mere ọ ga-eji nwee obi ụtọ: akụ̀, ùgwù, ụlọ mara mma. Ka o sina dị, o nwere oké ọchịchọ ịla ụlọ n’ihi ugwu ndị ahụ nke Media nke na di ya, Eze Nebukadneza, wuru ubi ndị ahụ ko n’elu nke Babilọn ná mgbalị iji kasie ya obi.
Oké ọchịchọ ịla ụlọ pụrụ iweta oké ule mgbe ndụ yiri ka o siri ike karịa ka ọ dị tupu mmadụ akwapụ. Mgbe ndị Juda ghọrọ ndị a dọọrọ laa n’agha, ha kwara arịrị, sị: “N’akụkụ osimiri nile nke Babilọn, n’ebe ahụ ka anyị nọdụrụ ala, ee, anyị kwara ákwá, mgbe anyị chetara Zaịọn. Ànyị ga-esi aṅaa bụọ abụ Jehova n’ala nke onye ala ọzọ?”—Abụ Ọma 137:1, 4.
Ọtụtụ ihe pụrụ ịkpali obi ilu nke oké ọchịchọ ịla ụlọ. Terri, onye hapụworo Canada, na-asị: “Otu ụbọchị otu foto ezinụlọ m dapụrụ site n’otu akwụkwọ. Mgbe m tụtụlitere ya, oké ọchịchọ ịla ụlọ jupụtara m obi, m wee kwaa ákwá.” Chris, onye si England kwaga ná mba dara ogbenye karị, kwetara, sị: “Nanị ịmata otú otu egwú ochie si ada ma ọ bụ ísìsì ọma nke nri a maara nke ọma pụrụ ime ka m chọsie ike ihe m hapụburu.”—Tụlee Ọnụ Ọgụgụ 11:5.
Ndị òtù ezinụlọ dị mmadụ nso na-esokarị na-akpata ya. Roseli, onye Brazil bi ugbu a ná mba gbara ha agbata obi, na-ekwu, sị: “Ọ na-akụda m obi mgbe m nụrụ akụkọ ọjọọ site n’ụlọ, m gharakwa inwe ike ịnọ ebe ahụ iji nye aka. Mgbe ụfọdụ ọ na-adị njọ karị mgbe m na-anụghị ihe ọ bụla ma malite iche ihe dị iche iche n’echiche.” Janice si Kọntinenti Ebe Ugwu America kwaga n’otu obodo nta dị n’ala okpomọkụ Amazon. Ọ na-asị: “Ana m enwe oké ọchịchọ ịla ụlọ mgbe m nụrụ akụkọ ọma site n’ụlọ. M na-anụ otú ha si na-enwekọ obi ụtọ, ọ na-agụkwa m agụụ ka m nọnyere ha.”
Ọ bụghị nnọọ ịhapụ ndị mmadụ na-akpata oké ọchịchọ ịla ụlọ. Linda na-akọwa, sị: “M na-enwe nkụda mmụọ mgbe m na-amaghị ebe m ga-azụta ihe ndị m chọrọ. Amaghị m ego ole ha na-ada ma ọ bụ ụzọ e si ekwe ọnụ. Inwe ụgbọ ala dị oké ọnụ, ndị mmadụ na-akwagharịkwa m aka mgbe m na-agbalị ịbanye n’ụgbọ njem ọha na eze. Nke a mere m nnọọ ka nwee agụụ ịla ụlọ.” N’ikwu okwu banyere ọdịiche ọdịbendị na akụ na ụba, Janet na-ekwu, sị: “Ọ bụ ịda ogbenye ahụ na-agbakasị m ahụ. Ahụtụbeghị mbụ ndị mmadụ ka ha na-arịọ nri, ma ọ bụ ezinụlọ ndi buru ibu ka ha dum bi n’otu ọnụ ụlọ n’enweghị mmiri pọmpụ. . . . Ihe ndị dị otú ahụ na-agbakasị m ahụ nke ukwuu nke na m chere na m pụghị ịnọkwu n’ebe ahụ.”
Ịnagide Mmetụta Gị Nile
Ihere ekwesịghị ime anyị n’ihi inwe mmetụta uche ndị siri ike maka ndị anyị hụrụ n’anya ma ọ bụ gburugburu anyị maara nke ọma nke ebe anyị nọ too. Jehova Chineke nyere anyị mmetụta uche ka anyị wee nụ ụtọ mmekọrịta onwe onye ndị na-ekpo ọkụ. Ndị nlekọta bụ́ ndị Kraịst nke ọgbakọ dị n’Efesọs bụ ndị ikom tozuru okè ná mmetụta uche. Ma gịnị mere mgbe nleta Pọl onyeozi letara ha bịara n’ọgwụgwụ ya? Ee, “ha nile wee kwaa ákwá nke ukwuu, dakwasị Pọl n’olu, sutukwa ya ọnụ”! (Ọrụ 20:37) Otú ọ dị, ihe ahụ merenụ emetụtaghị oké ọchịchọ ịla ụlọ. Ma, ọ na-enye anyị ihe anyị ga-echere echiche. Ọ bụ ihe sitere n’okike inwe mmetụta, ma anyị ekwesịghị ịhapụ ha ka ha na-achịkwa anyị. Mgbe ahụ, olee otú ị pụrụ isi nwee ihe ịga nke ọma n’ịnagide oké ọchịchọ ịla ụlọ?
Ịmụta asụsụ ndị obodo ahụ bụ otu ụzọ bụ́ isi isi nwee ahụ iru ala. Mmetụta oké ọchịchọ ịla ụlọ pụrụ ịkawanye njọ mgbe a na-egbochi nkwurịta okwu n’ihi na ị ghaghị iche asụsụ ala ọzọ ihu. Ya mere, ọ bụrụ na ọ ga-ekwe omume, mụta ịgụ na ide asụsụ ógbè ahụ tupu ị kwaga ebe ahụ. Ma ọ bụghị otú ahụ, tinye uche n’ịmụ asụsụ n’ime izu ndị mbụ mgbe i rutesịrị. Ọ bụ mgbe ahụ ka ị na-enwe mkpali sikarịsịrị ike wee si otú ahụ nwee olileanya kasị mma ịmụta ya. Ọ bụrụ na i tinye izu ndị ahụ karịsịa n’ịmụ asụsụ, ngwa ngwa ị ga-amalite ịnụ ụtọ nke nkwurịta okwu, nke ahụ pụkwara inye aka ibelata mmetụta nile nke oké ọchịchọ ịla ụlọ.
Mee ndị enyi ọhụrụ ngwa ngwa o kwere omume, n’ihi na nke a ga-enyere gị aka inwe mmetụta nke onye nọ n’ụlọ ya. Ọgbakọ Ndịàmà Jehova bụ ebe kasị mma ime ezi ndị enyi. Buru ụzọ mee ihe ma nweekwa mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ. Tinye mgbalị ịmata ọnọdụ ha, ezinụlọ ha, nsogbu ha, na ihe ndị na-amasị ha. Kpọọ ndị kwere ekwe ibe gị ka ha bịa n’ebe i bi. N’aka nke ọzọ, ị ga-achọpụta na ndị ọzọ ga-enwe mmasị n’ebe ị nọ.
N’etiti ndị Chineke, ọbụbụenyi pụrụ ịdị nso dị ka njikọ ezinụlọ. Jisọs sịrị: “Onye ọ bụla nke ga-eme ihe Chineke na-achọ, onye ahụ bụ nwanne m nwoke, na nwanne m nwanyị, na nne m.” (Mak 3:35) Kraịst kwekwara ndị na-eso ụzọ ya nkwa, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla nke hapụrụ ụlọ, ma ọ bụ ụmụnne ndị ikom, ma ọ bụ ụmụnne ndị inyom, ma ọ bụ nne, ma ọ bụ nna, ma ọ bụ ụmụ, ma ọ bụ ubi, n’ihi m, na n’ihi ozi ọma nke m, ma ọ bụghị na ọ ga-anata [otu narị] ugbu a n’oge a, ụlọ, na ụmụnne ndị ikom, na ụmụnne ndị inyom, na nne, na ụmụ, na ubi, ha na nsogbu; ọ ga-anatakwa ndụ ebighị ebi n’oge nke na-abịa.” (Mak 10:29, 30) Site n’òtù ụmụnna ime mmụọ dị otú ahụ magburu onwe ya, anyị anọghị nanị anyị, ọbụna n’ala ọhụrụ.
Ịnọgide na-edebe ọbụbụenyi nke gị na ndị ị hapụrụ n’ụlọ pụkwara inyere gị aka ịnagide oké ọchịchọ ịla ụlọ. Ọ pụrụ ịtụ gị n’anya ịchọpụta na ugbu a ị kwagharịworo, mkpakọrịta site n’akwụkwọ ozi bara uru nke ukwuu, ebe ị ga na-echekwu echiche ma eleghị anya banyere okwu gị. A ga-enwe ihe ndị na-akpali akpali a ga-akọ. Janet, onye a kpọtụrụ aha na mbụ, na-atụ aro, sị: “Òkù telifon gaa ebe dị anya dị oké ọnụ, ma i ziga kaseti site n’usoro nzipụ ozi dị ọnụ ala karị. Ịgwa ígwè ọrụ okwu na-eyi ihe nzuzu ná mmalite. Ma, ọ bụrụ na i jiri ihe e ji agụnye okwu na kaseti soro mmadụ kparịta nkata, ọ dị mfe ma na-atọ ụtọ.” Ị pụkwara ikwu ka e zitere gị kaseti ná nzaghachi.
Shirley, onye si United States kwapụ gaa Latin America 25 afọ gara aga, na-asị: “M na-ede mgbe nile banyere ahụmahụ ndị na-ewuli elu kama banyere nsogbu. Nke a na-agba ndị ọzọ ume ịnọgide na-edetara m akwụkwọ.” Ma, lezie anya. Oké ide akwụkwọ ozi pụrụ igbochi gị ime ndị enyi ọhụrụ. Del, onye si Canada kwaga mba ọzọ, na-asị: “Zere ịdị na-anọ n’ụlọ na-echegbu onwe gị banyere ihe ndị ị hapụrụ. Kama nke ahụ, pụọ èzí ma nụ ụtọ ebe ọhụrụ i bi.”
Mụta omenala, akụkọ ihe mere eme, ihe ọchị, na ebe ndị na-akpali mmasị na ndị mara mma nke ala ahụ. Nke a ga-enyere gị aka ịghara ịtụkwasị uche n’ihe ndị na-adịghị enye obi ụtọ. Ọ bụrụkwa na i bu n’uche ịnọgide n’ebe ị kwagara, ọ kasị mma ịhapụ ileta ala nna gị ngwa ngwa ma ọ bụ ọtụtụ ugbo karị. Ọ na-ewe oge iwulite ọbụbụenyi ndị ọhụrụ ma nwee ahụ iru ala na gburugburu ebe ọhụrụ. Nleta ndị dị ogologo gaa n’ụlọ na-egbochi usoro ahụ. Ozugbo ịgbanyere mkpọrọgwụ ndị ọhụrụ, ịla ụlọ maka nleta ga-atọ gị ụtọ—mgbe ahụ kwa lọta. Ka ọ dị ugbu a, jide ọrụ n’aka iji nwee mmasị n’ebe ọhụrụ i bi.
Nọgide Na-elepụ Anya
Jehova nyere anyị ụwa dum dị ka ebe obibi anyị. (Abụ Ọma 115:16) Site ná mmụọ ọṅụ nke ndị Kraịst, ndụ pụrụ ịbụ ihe na-atọ ụtọ n’ala ọ bụla. Ọ bụrụ na ị kwagharịrị iji kwalite ọdịmma Alaeze ahụ ma kwusaa ozi ọma ahụ ná mba ọzọ ma ọ bụ n’ebe ọzọ n’ala nna gị, mee otú ahụ na-atụ anya ihe obi ụtọ. Lepụ anya n’ihu ime ndị enyi ndị ọhụrụ, ịmụta banyere omenala ndị dị iche, ime ndị na-eso ụzọ, ma ọ bụ ime ihe ndị na-enyeghachi ụgwọ ọrụ n’ije ozi Chineke.
Jehova Chineke bụ otu Enyi nke ga-anọnyere gị mgbe nile, ebe ọ sọrọ gị nọrọ. (Abụ Ọma 94:14; 145:14, 18) Ya mere nọrọ ya nso n’ekpere. (Ndị Rom 12:12) Nke a ga-enyere gị aka iburu n’uche nzube gị ná ndụ dị ka onye na-ejere Chineke ozi. Abraham na Sera bugidere nzube ha n’uche mgbe ha hapụrụ ụlọ ha dị ha mma n’ahụ n’obodo Ua. N’irube isi n’iwu Jehova nyere, ha hapụrụ ndị enyi na ndị ikwu. (Ọrụ 7:2-4) À sị na ha nọgidere na-echeta ma na-enwe agụụ maka ebe ha hapụrụ, ha gaara enweworị ohere ịlaghachi. Ma ha na-eche ihu n’ebe ka mma—n’ikpeazụ ndụ na paradaịs elu ala n’okpuru Alaeze eluigwe nke Chineke.—Ndị Hibru 11:15, 16.
Ime nkwusa n’ubi ndị dị n’ofesi ma ọ bụ n’ebe mkpa maka ndị nkwusa Alaeze ka ukwuu n’ala nna gị pụrụ ịbụ nnọọ ihe ịma aka. Ma ọ bụkwa ọrụ na-amịpụta mkpụrụ na nke na-enyeghachi ụgwọ ọrụ dị ukwuu. (Jọn 15:8) Ọ bụrụ na echiche ndị na-adịghị mma ejupụta gị obi ruo nwa oge mgbe ụfọdụ, ị pụrụ imeri ha site n’iburu ihe mgbaru ọsọ gị n’uche na ilepụ anya gaa n’ọdịnihu. Otu nwanna nwanyị na-alụbeghị di bụ́ onye ozi ala ọzọ, sịrị: “Mgbe o yiri ka iwe ọ̀ na-abata m n’obi, m na-agbalị iche echiche banyere ụwa ọhụrụ ahụ na ụzọ ihe nile a kpọrọ mmadụ ga-esi bụrụ otu ezinụlọ.” Echiche ndị dị otú a dị ụtọ pụrụ inyere gị aka ijigide ọṅụ gị ma ghara ikwe ka oké ọchịchọ ịla ụlọ merie gị.
[Foto dị na peeji nke 29]
Ọ dịghị mkpa na oké ọchịchọ ịla ụlọ ga-egbochi ozi ndi Kraịst