Ndị Gụsịrị Akwụkwọ na Gilead Enweta ‘Ngọzi Ka Ukwuu n’Inye Ihe’
NA SUNDAY, March 6, 1994, ezinụlọ Betel dị n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova na ndị ọbịa zukọtara maka oge otu ememe—ngụsị akwụkwọ nke klasị nke 96 nke Watchtower Bible School of Gilead. N’okwu mmeghe ya, onye isi oche nke ihe omume ahụ bụ́ Karl F. Klein, bụ́ onye jeworo ozi n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ iri afọ abụọ, gwara ụmụ akwụkwọ 46 ahụ, sị: “Jisọs sịrị na ọ dị ngọzi inye ihe karịa ịnara ihe. Otú ahụ ka ọ ga-adị n’ọrụ ozi ala ọzọ gị—ị nọgide na-enye ihe karị, obi ụtọ ga-abụ nke gị karị.”—Ọrụ 20:35.
Okwu Ndụmọdụ Ikpeazụ
Usoro okwu ndị a gwara ụmụ akwụkwọ ahụ sochiri. Leon Weaver, onye so na Kọmitii Ngalaba Ije Ozi, wulitere isiokwu bụ́ “Ntachi Obi Na-enye Jehova Otuto.” Anyị nile na-eche ọnwụnwa ihu. (2 Ndị Kọrint 6:3-5) “Mgbe anyị na-enwe nrụgide,” ka Nwanna Weaver rịbara ama, “ọ na-adị nnọọ mfe ịdabere n’onwe anyị.” Otú ọ dị, o chetaara ụmụ akwụkwọ ahụ, sị: “Ihe ọ bụla ị ga-eche ihu dị ka ọnwụnwa na-abịara mmadụ, Jehova nwere mmasị na ya. Ọ gaghị ekwe ma ọlị ka a nwaa gị gabiga ihe ị pụrụ ịnagide.”—1 Ndị Kọrint 10:13.
“Na-eji Ọrụ Gị Akpọrọ Ihe Mgbe Nile” bụ isiokwu nke okwu sochirinụ, nke Lyman Swingle so n’Òtù Na-achị Isi kwuru. Ndị Israel ahọrọghị mgbe nile ebe ha ga-ebi na ihe ha ga-eme. E kenyere agbụrụ nke ọ bụla otu ókèala, e kenyekwara ndị Livaị ọrụ ndị pụtara ìhè ha ga-arụ. N’otu aka ahụ, ọtụtụ ndị nọ n’ozi oge nile taa—dị ka ndị ozi ala ọzọ na ndị òtù ezinụlọ Betel—adịghị ekpebiri onwe ha ebe ha ga-ebi na ụdị ọrụ ha ga-arụ. Gịnị ma ọ bụrụ na mmadụ enwee mmetụta nke ejighị n’aka ihe ga-abụ ọrụ ya? “Ọ bụrụ na i legide anya n’ebe Onyendú nke okwukwe anyị nọ, bụ́ Jisọs, ma na-atụgharị uche nke ọma n’ihe nlereanya ya, ike agaghị agwụ gị,” ka Nwanna Swingle kwuru.—Ndị Hibru 12:2, 3.
Leonard Pearson, onye so na Kọmitii Ugbo Ụlọ Nche, sochiri n’isiokwu bụ́ “Nọgide Na-ele Anya n’Otu Ebe.” Ọ sịrị: “Ị pụrụ inwe kamera kasị mma, ihe kasị mma iseta, ọnọdụ mara mma dị ya gburugburu, ma ka nwee foto a na-eseghị nke ọma—ma ọ bụrụ na kamera gị esetaghị ihe a chọrọ.” Dị ka anya kamera nke na-ahụ ihe sara mbara, ihe anyị na-ahụ aghaghị ịgụnye nkwusa ahụ zuru ụwa ọnụ nke a na-eme. Anyị ekwesịghị iwepụ anya anyị n’onyinyo ahụ buru ibu. “Ndị na-elegide anya n’onwe ha agaghị enwe obi ụtọ n’ọrụ ha,” ka Nwanna Pearson kwuru. “Ndị na-elegide anya na Jehova nakwa n’ọrụ o nyeworo ha ịrụ ga-eme nke ọma.”
“Ọtụtụ Ihe Mere A Ga-eji Nwee Ekele” bụ isiokwu nke okwu ọzọ sochirinụ, nke John E. Barr kwuru, bụ́ onye ọzọ so n’Òtù Na-achị Isi. “Ya adịla mgbe ị ga-akwụsị inwe mmetụta nke inye Jehova ekele,” ka Nwanna Barr dụrụ ụmụ akwụkwọ ahụ ọdụ. “Ọ bụ otu n’ime ebe kasị ukwuu e si enweta afọ ojuju, n’agbanyeghị ụdị ọrụ e kenyere gị.” Àgwà nke inye ekele kpaliri Devid ide, sị: “Ụdọ ọ̀tụ̀tụ̀ nile adaworo m n’ebe dị ụtọ; n’ezie ihe nketa m dị m ezi mma.” (Abụ Ọma 16:6) “I nwere nnọọ ihe dị oké ọnụ ahịa n’inwe mmetụta nke ịnọ Jehova nso ná ndụ ị na-adị kwa ụbọchị,” ka Nwanna Barr kwuru. “Ọ dịghị mgbe Jehova ga-anapụ gị mmekọrịta ahụ ma ọ bụrụhaala na ị nọgide na-ele ya anya dị ka ihe dị gị ezi mma nke i nwere ekele banyere ya.”
Onye nkụzi Gilead bụ́ Jack Redford bụ onye ọzọ kwuru okwu, n’isiokwu bụ́ “Olee Ụzọ Ị Ga-esi Jiri Ire Gị Na-eme Ihe?” Lee aha mbibi okwu a na-echeghị eche kwuo pụrụ ịkpata! (Ilu 18:21) Olee ụzọ a pụrụ isi chịkwaa ire? “Ị ghaghị ibu ụzọ nye uche gị ọzụzụ,” ka Nwanna Redford zara, “n’ihi na ire na-egosipụta ihe dị n’uche na n’obi.” (Matiu 12:34-37) Jisọs gosipụtara ihe nlereanya magburu onwe ya; o ji ire ya bulie aha Jehova elu. “Taa e nwere oké ụnwụ maka ịnụ okwu Jehova,” ka Nwanna Redford gwara klasị ahụ. “Unu maara okwu ndị ahụ. Unu nwere ‘ire nke ndị e ziri ihe.’ Ya mere na-ekwere mgbe nile ka ire gị bụrụ nke a na-eduzi site n’uche na obi ndị a raara n’ụzọ zuru ezu nye Jehova.”—Aịsaịa 50:4.
E mesiri ike ịdị mkpa nke ekpere n’okwu ahụ bụ́ “Ị̀ Na-eje Ije dị ka Ị Nọ n’Ihu Jehova?” Ulysses Glass, bụ́ onye na-edeba aha n’ụlọ akwụkwọ ahụ, rịbara ama, sị: “Ọ bụrụ na onye bụ nna arụsie ọrụ ike iji kwadoo ezinụlọ ya ma ọ dịghị mgbe o kwunyeere ha okwu, ọ dịghịkwa mgbe o kwuru okwu ịhụnanya, ezinụlọ ya pụrụ ikwubi na ebumnuche ya bụ nke onye nwere ibu ọrụ na-adịghị enye obi ụtọ kama ịbụ nke ịhụnanya. Otú ahụ ka ọ dị n’ebe anyị nọ. Anyị pụrụ iji ọrụ n’aka n’ozi Chineke. Ma ọ bụrụ na anyị adịghị ekpe ekpere, mgbe ahụ anyị bụ nanị ndị raara onwe anyị nye ọrụ kama ịbụ nye Nna eluigwe nke na-ahụ n’anya.”
Theodore Jaracz, nke so n’Òtù Na-achị Isi, kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Ihe Mere Ọtụtụ Ìgwè Mmadụ Ji Esonyere Ndị Chineke.” Kwa afọ, ọtụtụ narị puku na-enubata ná nzukọ Jehova. (Zekaraịa 8:23) Gịnị na-egosi na Ndịàmà Jehova bụ ndị Chineke? Nke mbụ, ha nakweere Bible dum dị ka Okwu Chineke. (2 Timoti 3:16) Nke abụọ, ha na-anọpụ iche ná ndọrọ ndọrọ ọchịchị. (Jọn 17:16) Nke atọ, ha na-agba àmà nye aha Chineke. (Jọn 17:26) Nke anọ, ha na-egosipụta ịhụnanya na-eji onwe ya achụ àjà. (Jọn 13:35; 15:13) Site n’ezi akara ndị a, anyị pụrụ iji obi ike ‘na-ekwusa ịdị mma nile nke onye ahụ kpọpụtara anyị n’ọchịchịrị baa n’ìhè ya dị ebube.’—1 Pita 2:9.
Mgbe okwu ndị a na-akpali akpali gasịrị, ụmụ akwụkwọ 46 ahụ dum nwetara diplọma ha. E kenyere ha ọrụ n’ala 16 gburugburu ụwa.
Ihe Omume Oge Ehihie nke Gwara Ọgwa
N’oge ehihie Donald Krebs so na Kọmitii Betel duziri Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche e gburu nkenke. Mgbe ahụ ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ mere ihe omume nke a kpọrọ “Amamihe Na-eti Mkpu n’Èzí.” (Ilu 1:20) Ha kọrọ ahụmahụ ndị na-akwụghachi ụgwọ ha nweworo n’ịgba àmà n’okporo ámá na n’ógbè azụmahịa. N’ezie, Jehova na-agọzi ndị na-enwe obi ike ime nkwusa mberede. “Ọ na-amasị m iche na anyị yiri mmà iwe ihe ubi ndị dị n’aka ndị mmụọ ozi na-ewe ihe ubi,” ka otu onye na-agụsị akwụkwọ kwuru. “Ọ bụrụ na nkà anyị adị nkọ karị, ndị mmụọ ozi ahụ pụrụ iji anyị rụọ ọtụtụ ọrụ karị.” (Tụlee Mkpughe 14:6.) Ihe omume ụmụ akwụkwọ ahụ gụnyekwara ihe ngosi slide nwere ihe mmụta nke dọọrọ uche ndị na-ege ntị gaa n’ihe na-ewere ọnọdụ na Bolivia, Malta, na Taiwan—atọ n’ime ala ebe ndị e zigaworo ndị gụsịrị akwụkwọ na klasị nke a.
Ọzọ, a gbara Wallace na Jane Liverance—ndị ozi ala ọzọ ruo afọ 17—ajụjụ ọnụ. N’October 1993, a kpọrọ ha òkù ịbịa n’Ugbo Ụlọ Nche, bụ́ ebe Nwanna Liverance na-eje ozi ugbu dị ka otu n’ime ndị nkụzi Gilead.
Ihe ngosi nwere ihe nkiri anọ sochiri, nke a kpọrọ “Ịsọpụrụ Ndị Ruru Eru Nọ n’Afọ Agadi Ha.” Ka ndị mmadụ na-eme agadi, ụjọ nke ịghọ ndị na-abaghị uru na ndị a gbahapụrụ pụrụ ibelata obi ike ha nwere n’onwe ha. (Abụ Ọma 71:9) Ihe ngosi nke a na-emetụ n’ahụ gosiri ụzọ mmadụ nile nọ n’ọgbakọ pụrụ isi nye ndị agadi dị otú ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi nkwado.
Mgbe abụ na ekpere mmechi gasịrị, 6,220 ndị nile zukọrọ n’Ụlọ Mgbakọ Jersey City nakwa n’ụlọ nzukọ ndị nwere ọkwá nzite ozi satellite nwetara ume ọhụrụ. Ekpere anyị na-agara ndị ahụ gụsịrị akwụkwọ nọ n’ọrụ ọhụrụ e kenyere ha. Ka ha nọgide na-enweta obi ụtọ ka ukwuu nke na-abịa site n’inye ihe.
[Igbe dị na peeji nke 26]
Ihe Banyere Klasị Ahụ
Ọnụ ọgụgụ mba ha si bịa: 9
Ọnụ ọgụgụ mba e zijere ha: 16
Ọnụ ọgụgụ ụmụ akwụkwọ: 46
Nkezi afọ ndụ: 33.85
Nkezi afọ ha nọworo n’eziokwu: 16.6
Nkezi afọ ha nọworo n’ozi oge nile: 12.2
[Igbe dị na peeji nke 27]
E Lekwasịrị Anya na Malta
KRISENDỌM kpuchiri eziokwu Bible na Malta ruo ọtụtụ afọ. Ndị ozi ala ọzọ nke Gilead ikpeazụ e zijere n’ebe ahụ, bụ́ Frederick Smedley na Peter Bridle, gụsịrị akwụkwọ na klasị nke asatọ laa azụ na 1947. Otú ọ dị, e jidere ha ma chụpụ ha na Malta n’oge na-adịghị anya mgbe ha bịarutere. Akwụkwọ 1948 Yearbook of Jehovah’s Witnesses kọrọ, sị: “Ndị ozi ala ọzọ abụọ ndị a etinyewo oge dị ukwuu n’ije ụlọ ikpe na ịhụ ndị isi ala bụ́ nke ruru ihe ha tinyeworo n’ịrụ ọrụ ije ozi ha, nanị n’ihi mmegide nke Òtù Ndị Ndú Roman Katọlik. Ndị ụkọchukwu na-asị na Malta bụ nke ndị Katọlik, onye ọ bụla ọzọ aghaghịkwa isi na ya pụọ.” Ugbu a, ihe dị ka 45 afọ mgbe nke ahụ gasịrị, e kenyewo ndị ozi ala ọzọ anọ sitere na klasị Gilead nke 96 ọrụ na Malta.
[Foto dị na peeji nke 26]
Ndị Na-agụsị Akwụkwọ na Klasị nke 96 nke Watchtower Bible School of Gilead
Ná ndepụta dị n’okpuru, e nyere ahịrị ndị ahụ nọmba site n’ihu gaa n’azụ, e depụtakwara aha ha site n’aka ekpe gaa n’aka nri n’ahịrị nke ọ bụla. (1) Ehlers, P.; Giese, M.; Sellman, S.; Zusperregui, J.; Rowe, S.; Jackson, K.; Scott, T. (2) Liehr, T.; Garcia, I.; Garcia, J.; Fernández, A.; Davidson, L.; Liidemann, P.; Gibson, L.; Juárez, C. (3) Fouts, C.; Pastrana, G.; Claeson, D.; Fernández, L.; Walls, M.; Dressen, M.; Pastrana, F.; Burks, J. (4) Burks, D.; Scott, S.; Jackson, M.; Mauray, H.; Juárez, L.; Zusperregui, A.; Brorsson, C.; Rowe, C. (5) Sellman, K.; Liidemann, P.; Davidson, C.; Mauray, S.; Walls, D.; Dressen, D.; Schaafsma, G.; Liehr, S. (6) Claeson, T.; Gibson, T.; Giese, C.; Ehlers, D.; Fouts, R.; Schaafsma, S.; Brorsson, L.