Gịnị meworo ịbụ isi?
NDỊ na-eche echiche maara ịdị mkpa nke ịbụ isi. Ọ bụrụ na e nweghị ụdị ịbụ isi ụfọdụ e guzobere, ngwa ngwa njikọ ụmụ mmadụ ga-aghọ ihe na-enweghị nchịkwata. N’ihi ya, otu akwụkwọ ọgụgụ mara mma e dere n’asụsụ French banyere iwu e ji achị obodo sịrị: “N’ìgwè ọ bụla nke ụmụ mmadụ, a na-ahụ ụdị òtù ụmụ mmadụ abụọ: ndị na-enye iwu na ndị na-erube isi, ndị na-enye ụkpụrụ iwu na ndị na-eme ya eme, ndị ndú na ndị òtù, ndị na-achị achị na ndị a na-achị. . . . A pụrụ ịhụ ịdị adị nke ịbụ isi ná njikọ nile nke ụmụ mmadụ.”a
Otú ọ dị, àgwà ndị e nwere n’ebe ịbụ isi dị agbanwewo kemgbe Agha Ụwa nke Abụọ ma karịsịa kemgbe afọ ndị 1960. N’ikwu okwu banyere oge ahụ, akwụkwọ Encyclopædia Universalis nke e dere n’asụsụ French na-ekwu banyere “ọgba aghara nke imegide ọkwá na imegide ịbụ isi.” Ọgba aghara dị otú ahụ abụghị ihe ijuanya nye ndị mmụta Bible. Pọl onyeozi buru amụma sị: “Cheta, ọgbọ ikpeazụ nke ụwa nke a ga-abụ oge oké nsogbu! Ndị mmadụ ga-ahụ nanị onwe ha na ego n’anya; ha ga na-etu ọnụ, na-anya isi, na-akpọkwa iyi; ndị na-adịghị asọpụrụ ndị mụrụ ha . . . ; ọ ga-esi ike ịgbanwe ha n’ịkpọasị ha, . . . na-enweghị nchịkwata na ndị na-eme ihe ike, . . . ndị a fụliworo elu n’ịdị mkpa nke onwe onye. Ha ga-ahụ ihe ụtọ ha n’anya karịa Chineke ha.”—2 Timoti 3:1-4, The Revised English Bible.
Ịbụ Isi Nọ n’Ọgba Aghara
Amụma nke a kọwara oge na ọgbọ anyị nke ọma. A na-ama ịbụ isi aka n’akụkụ nile—ezinụlọ, ụlọ akwụkwọ ọha mmadụ, mahadum, ụlọ ọrụ achụmnta ego, gọọmenti mba na nke ime obodo. Mgbanwe nke omume mmekọahụ, egwú rap ndị ọkpọka ya, ngagharị iwe nke ụmụ akwụkwọ, mfanye aka n’ụkwụ ndị ọrụ ụfọdụ, inupụrụ ọchịchị isi, na omume dị iche iche nke iyi egwu bụcha mgbaama nke ndakpọ ná nsọpụrụ nye ịbụ isi.
Ná nzukọ nke ụlọ ọrụ Institute of Political Science dị na France na akwụkwọ akụkọ Paris bụ́ Le Monde haziri na Paris, Professor Yves Mény kwuru, sị: “Ịbụ isi pụrụ ịdị adị nanị ma ọ bụrụ na iwu kwadoro ya.” Otu ihe kpatara ọgba aghara nke ịbụ isi taa bụ na ọtụtụ ndị na-enwe obi abụọ banyere izi ezi nke ndị nọ n’ọchịchị. Ya bụ, ha na-enwe obi abụọ n’iru eru ha ịnọ n’isi. Otu ịgba ajụjụ ọnụ e mere kpughere na ná mmalite afọ ndị 1980, 9 pasent nke ọnụ ọgụgụ ndị bi na United States, 10 pasent n’Australia, 24 pasent na Britain, 26 pasent na France, na 41 pasent n’India lere gọọmenti ha anya dị ka nke na-ezighị ezi.
Ọchịchọ Mmadụ Maka Ịbụ Isi Ziri Ezi
Dị ka Bible kwuru, mmadụ nọ kpọmkwem n’okpuru ịbụ isi Chineke na mbụ. (Jenesis 1:27, 28; 2:16, 17) Otú ọ dị, ná mmalite, ụmụ mmadụ zọọrọ nnwere onwe nke omume site n’ebe Onye Okike ha nọ. (Jenesis 3:1-6) Ebe ha jụworo ọchịchị Chineke ma ọ bụ ịchịisi Chineke, ha aghaghị ịchọta ụdị usoro ịbụ isi ndị ọzọ. (Eklisiastis 8:9) Ụfọdụ gosipụtara ịbụ isi ha n’ike. Nye ha, ike nyere ha ikike ime ihe. O zuru ezu nke na ha nwere ike ịhụ na e mere ihe ha chọrọ. Otú ọ dị, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ hụrụ mkpa ọ dị iji iwu kwadoo oruru o ruuru ha ịchị achị.
Site n’oge gboo ọtụtụ ndị ọchịchị mere nke a site n’ikwu na ha bụ chi ma ọ bụ na ha natara ikike site n’aka ndị bụ chi. Nke a bụ nkwenkwe akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme nke “ịchịisi dị nsọ,” ndị ọchịchị oge gboo nke Mesopotamia na Fero dị iche iche nke Ijipt oge ochie zọọrọ.
Alexander Onye Ukwu, ndị eze Gris nọchiri ya, na ọtụtụ ndị ọchịchị alaeze ukwu Rom zọkwaara na ha bụ chi, ọbụna chọọkwa ka e fee ha ofufe. A maara usoro dị iche iche n’okpuru ndị ọchịchị dị otú a dị ka “òtù ndị na-achị achị,” nzube ha bụkwa imesiwanye ịbụ isi nke onye ọchịchị ahụ n’elu ndị mmadụ ndị e meriri emeri gwara ọgwa ike. Ịjụ ife onye ọchịchị ahụ ofufe bụ nke a kagburu dị ka ime ihe megide Obodo. N’akwụkwọ bụ́ The Legacy of Rome, Professor Ernest Barker dere, sị: “Chi a na-eme onye ọchịchị alaeze ukwu [Rom], ya na nsọpụrụ ọ na-enweta n’ihi ịbụ chi ya, bụ n’ụzọ doro anya ntọala, ma ọ bụ ma ọ dịghị ihe ọzọ, ihe ndị jikọtara alaeze ukwu ahụ ọnụ.”
Nke a nọgidere bụrụ eziokwu ọbụna mgbe Emperor Constantine mesịrị mee ka “Iso Ụzọ Kraịst” bụrụ nke iwu kwadoro (ọ chịrị 306-337 O.A.) ma mesịa bụrụ nke Emperor Theodosius nke Mbu (ọ chịrị 379-395 O.A.) weghaara dị ka okpukpe Obodo nke Alaeze Ukwu Rom. E fegidere ụfọdụ n’ime ndị ọchịchị alaeze ukwu bụ́ “ndị Kraịst” ofufe dị ka chi gamiekwa n’ime narị afọ nke ise O.A.
“Ike Abụọ,” “Mma Agha Abụọ”
Ka usoro nke ndị popu na-esiwanye ike, nsogbu ndị dị n’etiti Chọọchị na Obodo jọwanyere njọ. N’ihi ya, ná ngwụsị nke narị afọ nke ise O.A., Pope Gelasius nke Mbụ setịpụrụ ụkpụrụ nke “ike abụọ”: ịbụ isi dị nsọ nke ndị popu nke ya na ike nke ndị eze na-achị n’otu mgbe ahụ—bụ́ nke ndị eze ga-anọ n’okpuru ndị popu. Ụkpụrụ nke a mesịrị ghọọ ozizi nke “mma agha abụọ”: “Mma agha ime mmụọ ka ndị popu na-ebu n’onwe ha, na-ekenye ndị ọchịchị nkịtị mma agha a na-ahụ anya, ma ka o sina dị ndị ikpeazụ a aghaghị iji mma agha a na-ahụ anya mee ihe dị ka ntụzi nke ndị popu si dị.” (The New Encyclopædia Britannica) Ná ndabere nke ozizi a, n’Oge Ụwa Na-emepechabeghị Anya, Chọọchị Katọlik zọọrọ ikike nke ikpudo ndị ọchịchị alaeze ukwu na ndị eze okpu iji mee ka ịbụ isi ha bụrụ nke iwu kwadoro, wee si otú a na-eme ka akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme oge ochie nke “ịchịisi dị nsọ” dịgide.
Otú ọ dị, anyị ekwesịghị iche na nke a na ihe ahụ a sịrị na ọ bụ ikike Chineke nyere ndị eze bụ otu ihe ahụ, bụ́ ihe pụtara ka oge na-aga nke nzube ya bụ iji mee ka ndị ọchịchị ndọrọ ndọrọ nwere onwe ha pụọ n’okpuru usoro ndị popu. Ozizi nke ikike Chineke nyere ndị eze na-ekwu na ndị eze na-enweta ikike nke ịchị achị ha kpọmkwem site n’aka Chineke, ọ bụghị site n’aka popu nke Rom. Akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia sịrị: “N’otu oge mgbe popu na-enwe ike ime mmụọ na ọbụna ike ọchịchị zuru ụwa ọnụ n’isi ndị isi ala, echiche nke ikike Chineke nyere mere ka ndị eze nke mba dị iche iche nọrọ n’ọnọdụ nke ịgọpụ na ịbụ isi ha n’otu aka ahụkwa sitere n’aka Chineke dịkwa ka nke popu.”b
Nkwenkwe Ụgha nke Ịchịisi Ọha Mmadụ Họpụtara
Ka oge na-aga, ndị mmadụ tụrụ aro isi iyi ndị ọzọ nke ịbụ isi. Otu bụ ịchịisi nke ndị mmadụ họpụtara. Ọtụtụ ndị kwetara na echiche nke a malitere na Gris. Otú ọ dị, e guzobere ọchịchị onye kwuo uche ya nke Gris oge ochie nanị n’ime obodo ole na ole ndị di n’ime obodo ukwu, ọbụna n’ime ndị a nanị ụmụ amaala bụ ndị ikom mere ntụli aka elu. A hapụrụ ụmụ nwanyị, ndị ohu na ndị ọbịa bi n’ala—ndị e chere na ha ga-eru site n’ọkara ruo ụzọ anọ n’ime ụzọ ise nke ọnụ ọgụgụ ndị bi n’ebe ahụ. Ọ bụghị ịchịisi nke ọha mmadụ họpụtara ma ọlị!
Ònye kwalitere echiche nke ịchịisi nke ndị mmadụ họpụtara? N’ụzọ dị ịtụnanya, a malitere ya n’Oge Ụwa Na-emepechabeghị Anya site n’aka ndị ọkà mmụta okpukpe Roman Katọlik. Na narị afọ nke 13, Thomas Aquinas sịrị na ọ bụ ezie na ịchịisi na-esite n’aka Chineke, na a na-enye ya ụmụ mmadụ. A nakweere echiche nke a n’ebe nile. Akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia na-asị: “Ihe ka ọtụtụ n’ime ndị ọkà mmụta okpukpe Katọlik nke narị afọ nke 17 kwadoro echiche nke a nke ndị mmadụ ịbụ isi iyi nke ịbụ isi.”
Gịnị mere ndị ọkà mmụta okpukpe nke chọọchị ebe ndị mmadụ na-enweghị ọnụ ọ bụla n’okwu n’ịhọpụta popu, bishọp, ma ọ bụ ndị ụkọchukwu ga-eji akwalite echiche nke ịchịisi nke ndị mmadụ họpụtara? N’ihi na ụfọdụ ndị eze Europe na-enwewanye ahụ erughị ala n’okpuru ịbụ isi ndị popu. Ozizi nke ịchịisi ọha mmadụ họpụtara nyere popu ikike iweghara ọchịchị nke onye ọchịchị alaeze ukwu ma ọ bụ eze ma ọ bụrụ na o yiri ihe dị mkpa. Ndị na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Will na Ariel Durant dere, sị: “Ndị nkwado nke ịchịisi ọha mmadụ họpụtara gụnyere ọtụtụ ndị Jesuit, ndị hụrụ site n’echiche a ụzọ isi belata ike onye eze kama nke popu. Cardinal Bellarmine rụrụ ụka na ọ bụrụ na e nwetara ịbụ isi ndị eze site n’aka ndị mmadụ, ma n’ihi ya nọrọ n’okpuru ndị mmadụ, ọ dị n’ezie n’okpuru ịbụ isi nke ndị popu . . . Luis Molina, onye Spain bụ onye Jesuit, kwubiri na ndị mmadụ, dị ka isi iyi nke ike na-abụghị nke chọọchị, pụrụ n’ụzọ ziri ezi—kama site n’ụzọ gara n’usoro—ịkwatu eze na-adịghị ekpe ikpe ziri ezi.”
Otú ọ dị, “ụzọ gara n’usoro” nke a bụ nke popu ga-ahazi. N’imesi nke a ike, akwụkwọ ndị Katọlik e dere n’asụsụ French bụ́ Histoire Universelle de l’Eglise Catholique na-ehota akwụkwọ bụ́ Biographie universelle, bụ́ nke sịrị: “Bellarmine . . . na-ezi dị ka nkụzi Katọlik zuru ọha si dị na ndị isi nwetara ike ha site na nhọpụta nke ndị mmadụ, ndị mmadụ nwekwara ike iji ike a ruuru ha mee ihe nanị n’okpuru mmetụta nke popu.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụzọ dị iche.) Ịchịisi ọha mmadụ họpụtara si otú a ghọọ ngwa ọrụ popu pụrụ iji eme ihe na-enwe mmetụta ná nhọpụta nke ndị ọchịchị, ọ bụrụkwa na ọ dị mkpa, wepụ ha. N’oge ndị na-adịchabeghị anya, o kwewo ka usoro ịbụ isi Katọlik metụta ndị Katọlik na-eme ntụli aka elu n’ọchịchị onye kwuo uche ya dị iche iche nwere ndị nnọchiteanya.
N’ọchịchị onye kwuo uche ya ndị nke oge a, ịbụ isi iwu kwadoro nke gọọmenti dabeere n’ihe a kpọrọ “nkweta nke ndị a na-achị achị.” Otú ọ dị, n’ụzọ kasị mma nke a bụ “nkweta nke ndị ka n’ọnụ ọgụgụ,” ma n’ihi enweghị mmasị nke ndị na-atụli aka elu na aghụghọ ndọrọ ndọro ọchịchị, ndị a “ka n’ọnụ ọgụgụ” na-abụkarị n’ezie nanị mmadụ ole na ole n’ụba mmadụ. Taa, “nkweta nke ndị a na-achị achị” adịghị apụtakebe oké ihe ọ bụla ọzọ ma e wezụga “ndị a na-achị achị ikwere ihe e kwuru, ma ọ bụ ịgbachi nkịtị.”
Nkwenkwe Ụgha nke Ịchịisi nke Mba
Nkwenkwe ụgha nke ọbụbụeze dị nsọ nke ndị popu mbụ kwalitere tụgharịrị megide ọchịchị nke ndị popu mgbe ọ gbanwere ma ghọọ ikike Chineke nyere ndị eze. Ozizi nke ịchịisi ọha mmadụ họpụtara n’otu aka ahụkwa tụgharịrị megide Chọọchị Katọlik. N’ime narị afọ nke 17 na nke 18, ndị ọkà ihe ọmụma nke ụwa, ndị dị ka ndị England bụ́ Thomas Hobbes na John Locke na nwoke France bụ́ JeanJacques Rousseau, lebara anya n’echiche nke ịchịisi ọha mmadụ họpụtara. Ha malitere ụdị dị iche iche nke ozizi nke “nkwekọrịta ọha mmadụ” n’etiti ndị ọchịchị na ndị a na-achị. Ụkpụrụ ha dabeere ọ bụghị na nkà mmụta okpukpe kama ‘n’iwu nke okike,’ nkweta ndị a rukwara n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu n’echiche ndị megidere Chọọchị Katọlik na usoro ndị popu ahụ n’ụzọ siri ike.
N’oge na-adịghị anya mgbe Rousseau nwụsịrị, Oké Mgbanwe nke France tiwapụrụ. Oké mgbanwe nke a mebisịrị echiche ụfọdụ nke ịbụ nke iwu kwadoro, ma o kepụtara nke ọhụrụ, echiche nke ịchịisi nke mba. Akwụkwọ bụ́ The New Encyclopædia Britannica kwuru, sị: “Ndị France jụrụ ikike Chineke nyere ndị eze, nrịgo n’ọkwá nke ndị a maara aha ha, ihe ùgwù dị iche iche nke Chọọchị Roman Katọlik.” Ma, Britannica na-asị, “Oké Mgbanwe ahụ emewo ka nchepụta ọhụrụ, bụ́ ọchịchị obodo, bụrụ ihe tozuru okè.” “Nchepụta” ọhụrụ nke a dị ndị ahụ na-akwado oké mgbanwe ahụ mkpa. N’ihi gịnị?
N’ihi na n’okpuru usoro ahụ Rousseau kwadoro, ụmụ amaala nile gaara enwe ọnụ okwu ha nhata n’ihe banyere nhọpụta nke ndị ọchịchị. Nke a gaara edugaworị n’ọchịchị onye kwuo uche ya nke dabeere n’ikike onye ọ bụla nwere ime ntụli aka elu—ihe ndị ndú nke Oké Mgbanwe nke France na-akwadoghị. Professor Duverger na-akọwa, sị: “Ọ bụ kpọmkwem iji zere ụdị ihe nke a ọ ga-arụpụta, nke e lere anya dị ka ihe na-adịghị mma, mere, site na 1789 ruo 1791, ndị òtù ọkwá etiti nke ụlọ Nzukọ Ndị Ome Iwu ji chepụta ozizi nke ịchịisi nke mba. Ha na-eji ‘Mba’ amata ndị mmadụ, bụ́ nke ha lere anya dị ka ihe nọọrọ onwe ya n’ezie, nke dị iche site n’akụkụ ya ndị ọzọ. Nanị Mba ahụ, site na ndị nnọchiteanya ya, nwere ikike ịchị onwe ya . . . Ọ bụ ezie na o yiri ọchịchị onye kwuo uche ya n’ọdịdị, ozizi nke ịchịisi nke mba abụchaghị n’ezie nke ọchịchị onye kwuo uche ya n’ihi na a pụkwara iji ya gosipụta izi ezi nke ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụdị ọchịchị ọ bụla, karịsịa ọchịchị nchịgbu.” (Ọ bụ ya dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.)
Mgbalị Ụmụ Mmadụ Bụ Ihe Dara Ada
Nnakwere a nakweere Ọchịchị Obodo dị ka ebe iwu kwadoro a pụrụ isi nweta ịbụ isi dugara n’ịhụ mba n’anya. Akwụkwọ bụ́ The New Encyclopædia Britannica kwuru, sị: “A na-echekarị na ịhụ mba n’anya bụ ihe ochie; mgbe ụfọdụ a na-ewere ya n’ụzọ hiere ụzọ dị ka ihe na-adịgide adịgide n’omume ndọrọ ndọrọ ọchịchị. N’ezie, a pụrụ ile oké mgbanwe nke America na France anya dị ka ngosipụta mbụ ya siri ike.” Eri mgbe e mesịrị oké mgbanwe ndị ahụ, ịhụ mba n’anya agbasawo na kọntinent nile nke America, Europe, Africa na Esia. Agha ndị jọgburu onwe ha abụrụwo ihe e ji iwu kwadoo n’ihi ịhụ mba n’anya.
Onye Britain na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Arnold Toynbee dere, sị: “Mmụọ nke Ịhụ Mba n’Anya bụ ngwakọta na-adịghị ụtọ nke mmanya ọhụrụ nke Ọchịchị Onye Kwuo Uche Ya n’ime karama ochie nke Ịkpa Ókè Agbụrụ. . . . Nkwekọrịta nke a dị ịtụnanya n’etiti Ọchịchị Onye Kwuo Uche Ya na Ịkpa Ókè Agbụrụ abụwo ihe kasị arụ ọrụ na ndọrọ ndọrọ ọchịchị a ma ama nke Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa anyị nke oge a karịa n’Ọchịchị Onye Kwuo Uche Ya n’onwe ya.” Ịhụ mba n’anya arụpụtabeghị ụwa nke nọ n’udo. Toynbee sịrị: “Agha Ịhụ Mba n’Anya esochiwo Agha Okpukpe, ka nkwụsị nwa oge dịkarịsịrị nta gasịrị; n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa anyị nke oge a kwa, mmụọ nke ịnụbiga ọkụ n’obi banyere okpukpe na mmụọ nke ịnụbiga ọkụ n’obi banyere mba bụ n’ụzọ pụtara ìhè otu oké ọchịchọ ọjọọ ahụ.”
Site ná nkweta ụgha dị iche iche ahụ nke “ịchịisi dị nsọ,” “ikike Chineke nyere ndị eze,” “ịchịisi ọha mmadụ họpụtara,” na “ịchịisi nke mba,” ndị ọchịchị anwawo iji iwu kwadoo ịbụ isi ha n’elu ndị mmadụ ndị ọzọ. Otú ọ dị, mgbe a tụlesịrị ihe ndekọ nke ndị ọchịchị bụ́ mmadụ, onye Kraịst aghaghị inwe otu ụdị echiche ahụ Solomọn kwupụtara: “Mmadụ nwere ike n’ahụ mmadụ ibe ya imejọ ya.”—Eklisiastis 8:9.
Kama ife Obodo ndọrọ ndọrọ ọchịchị ofufe, ndị Kraịst na-efe Chineke ofufe, na-aghọtakwa na ọ bụ ya bụ isi iyi ziri ezi nke ịbụ isi. Ha kwere n’ihe onye ọbụ abụ ahụ bụ Devid kwuru, onye sịrị: “Yahweh, gị nwe ịdị ukwuu, ịdị ike, ịma mma, ogologo ụbọchị na ebube, ihe nile dị n’eluigwe na ụwa bụ nke gị. Gị nwe ọkaaka, Yahweh; ị bụ onye e buliri elu, onye isi mmadụ nile.” (1 Ihe Emere 29:11, The New Jerusalem Bible) Otú ọ dị, n’ihi nsọpụrụ nye Chineke, ha na-egosi nsọpụrụ ziri ezi nye ịbụ isi ma n’ụzọ ụwa ma n’ụzọ ime mmụọ. A ga-enyocha ụzọ na ihe mere ha pụrụ isi jiri ọṅụ mee nke a n’isiokwu abụọ ndị na-esonụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Droit constitutionnel et institutions politiques, nke Maurice Duverger dere.
b Akwụkwọ bụ́ The Catholic Encyclopedia sịrị: “‘Ikike nke a nke Chineke nyere ndị eze’ (dị nnọọ iche n’ebe ozizi ahụ bụ na ịbụ isi nile, ma ọ bụ nke ndị eze, ma ọ bụ nke ndị ọchịchị, sitere n’aka Chineke), enweghị mgbe ọ bụla Chọọchị Katọlik nakweere ya. N’oge Oké Mgbanwe ahụ, o weere ọdịdị nke mmegide karịrị akarị nye ikpe Okpukpe Katọlik, ndị eze dị ka Henry nke Asatọ, na James nke Mbụ, nke England, na-azọrọ ịbụ isi ime mmụọ nakwa nke obodo n’ozuzu ya.”
[Foto dị na peeji nke 15]
Chọọchị Katọlik zọọrọ ikike nke ikpube ndị ọchịchị alaeze ukwu na ndị eze okpu eze
[Ebe e si nweta foto]
Odudo nso nke Charlemagne: Bibliothèque Nationale, Paris