Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 7/15 p. 10-15
  • Mee Alụmdi na Nwunye Gị Njikọ Na-adịgide Adịgide

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mee Alụmdi na Nwunye Gị Njikọ Na-adịgide Adịgide
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịdịgide Adịgide nke Alụmdi na Nwunye
  • Ịbụ Isi na Ịnọ n’Okpuru
  • Nkwurịta Okwu​—⁠Ọbara Ndụ nke Alụmdi na Nwunye
  • Ịhụ Maka Ihe Ndị A Na-ekwekọrịtaghị
  • Na-ekwesị Ntụkwasị Obi Nye Ibe Unu
  • Otú Di na Nwunye Bụ́ Ndị Kraịst Ga-esi Na-ebi n’Udo
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Unu Atọsala Ihe Chineke Kekọtara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Ndụ Ezinụlọ—Ụzọ Ị Pụrụ Isi Nwee Ihe Ịga nke Ọma
    Obi Ụtọ—Ụzọ E Si Enweta Ya
  • Mkpịsị Ugodi Abụọ Na-eduga n’Alụmdi na Nwunye Na-adịgide Adịgide
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 7/15 p. 10-15

Mee Alụmdi na Nwunye Gị Njikọ Na-adịgide Adịgide

“Ihe Chineke kekọtara, mmadụ atọsala.”​—⁠MATIU 19:6.

1. Gịnị bụ ihe ndabere nke ihe ịga nke ọma n’alụmdi na nwunye n’etiti ezi ndị Kraịst taa?

ỌTỤTỤ puku mmadụ n’etiti ndị Jehova taa na-enwe alụmdi na nwunye na-enye afọ ojuju na ndị na-adịgide adịgide. Otú ọ dị, ihe ịga nke ọma dị otú ahụ zuru ebe nile abụghị ihe ndabara ma ọlị. Alụmdi na nwunye ndị Kraịst na-aga nke ọma mgbe mmadụ abụọ ahụ (1) na-akwanyere echiche Chineke maka alụmdi na nwunye ùgwù ma (2) na-agbalị iji ụkpụrụ ndị dị n’Okwu ya na-ebi ndụ. E kwuwerị, ọ bụ Chineke n’onwe ya bụ onye guzobere ndokwa alụmdi na nwunye. Ọ bụ ya bụ Onye ‘e sitere na ya gụọ eriri nna nile ọ bụla n’eluigwe na n’elu ụwa aha.’ (Ndị Efesọs 3:​14, 15) Ebe ọ bụ na Jehova maara ihe ọ na-ewe iji nwee ihe ịga nke ọma n’alụmdi na nwunye, anyị na-erite uru site n’ịgbaso nduzi ya.​—⁠Aịsaịa 48:17.

2. Gịnị na-esite n’etinyeghị ụkpụrụ Bible n’ọrụ n’alụmdi na nwunye?

2 N’ụzọ dị iche, ịghara itinye ụkpụrụ dị iche iche nke Bible n’ọrụ pụrụ iweta nhụjuanya alụmdi na nwunye. Ndị ọkachamara ụfọdụ kwenyere na ihe dị ọtụtụ dị ka ụzọ abụọ n’ime ụzọ atọ nke ndị na-agba akwụkwọ taa na United States ga-emesịa gbaa alụkwaghịm. Ọbụna ndị Kraịst enwereghị onwe ha pụọ n’ihe nrụgide na ndọlị nile nke ‘oge ndị a dị oké egwu.’ (2 Timoti 3:1) Ihe isi ike ọnọdụ akụ na ụba na nrụgide nke ụlọ ọrụ pụrụ inwe mmetụta ọjọọ n’alụmdi na nwunye ọ bụla. Ndị Kraịst ụfọdụ enwewokwa mmechuihu dị ilu n’ihi onye ha lụrụ ịghara itinye ụkpụrụ dị iche iche nke Bible n’ọrụ. “Ahụrụ m Jehova n’anya,” ka otu nwunye bụ́ onye Kraịst kwuru, “ma alụmdi na nwunye m abụwo ihe ihere ruo 20 afọ. Di m na-achọ ihe na-amasị nanị onwe ya, ọ chọghịkwa ime mgbanwe ọ bụla. Eyiri m onye tọrọ atọ.” Ọtụtụ ndị Kraịst bụ́ di ma ọ bụ nwunye ekwupụtawo mmetụta ndị yiri ya. Gịnị na-agahie? Gịnịkwa pụrụ igbochi alụmdi na nwunye ka ọ ghara ịdaba n’ịbụ nke a na-enweghị mmasị na ya ma ọlị ma ọ bụ nke ịkpọasị pụtara ìhè?

Ịdịgide Adịgide nke Alụmdi na Nwunye

3, 4. (a) Gịnị bụ ụkpụrụ Chineke maka alụmdi na nwunye? (b) N’ihi gịnị ka ndịgide nke alụmdi na nwunye ji bụrụ nke ezi ikpe na nke bara uru?

3 Ọbụna n’okpuru ọnọdụ ndị kasị mma, alụmdi na nwunye bụ njikọ nke mmadụ abụọ na-ezughị okè. (Deuterọnọmi 32:5) N’ihi ya Pọl onyeozi sịrị na “ndị [lụrụ di ma ọ bụ nwunye] ga-enwe mkpagbu n’anụ ahụ ha.” (1 Ndị Kọrint 7:28) Ọnọdụ ụfọdụ gabigara ókè pụrụ ọbụna iduba ná nkewa ma ọ bụ ịgba alụkwaghịm. (Matiu 19:9; 1 Ndị Kọrint 7:​12-⁠15) Otú ọ dị, n’ihe ka n’ọnọdụ nile, ndị Kraịst na-etinye n’ọrụ ndụmọdụ Pọl bụ́: “Ka nwunye ghara ikewapụ onwe ya n’ahụ di ya . . . , ka di gharakwa ịhapụ nwunye ya.” (1 Ndị Kọrint 7:​10, 11) N’ezie, e bu n’uche ka alụmdi na nwunye bụrụ nkekọ na-adịgide adịgide, n’ihi na Jisọs Kraịst kwupụtara, sị: “Ihe Chineke kekọtara, mmadụ atọsala.”​—⁠Matiu 19:6.

4 Nye onye chere na ya tọrọ atọ n’alụmdi na nwunye nke ịkpọasị ma ọ bụ nke ịhụnanya na-adịghị ya, ụkpụrụ Jehova pụrụ iyi nke obi ịta mmiri na nke ezi uche na-adịghị ya. Ma ọ bụghị. Ndịgide nke nkekọ alụmdi na nwunye na-akpali di na nwunye na-atụ egwu Chineke iche nsogbu ha ihu ma chọọ idozi ha, kama iji ọsọ si n’ibu ọrụ ndị dịịrị ha wezụga onwe ha ozugbo ha hụtara mgbaama nke nsogbu. Otu nwoke lụworo nwunye ruo ihe karịrị 20 afọ kwuru ya otú a: “Ị pụghị ịgbanarị oge nsogbu. Unu agaghị na-enwe obi ụtọ n’ebe ibe unu nọ mgbe nile. Ọ bụ mgbe ahụ ka nkwekọrịta na-adị mkpa n’ezie.” Otú ọ dị, ndị Kraịst bụ di na nwunye na-enwe mmetụta nke ibu ọrụ bụ́ isi n’ebe Jehova Chineke nọ, bụ́ Isi Mmalite nke alụmdi na nwunye.​—⁠Tụlee Eklisiastis 5:4.

Ịbụ Isi na Ịnọ n’Okpuru

5. Gịnị bụ ụfọdụ ná ndụmọdụ Pọl maka ndị bụ di na nwunye?

5 Ya mere, mgbe nsogbu bilitere, ọ bụ oge ịchọ, ọ bụghị ụzọ mgbapụ, kama ụzọ ka mma isi tinye ndụmọdụ Okwu Chineke n’ọrụ. Dị ka ihe atụ, tụlee okwu ndị a nke Pọl, bụ́ ndị a na-achọta ná Ndị Efesọs 5:​22-25, 28, 29: “Ndị bụ nwunye, na-edonụ onwe unu n’okpuru di nke aka unu, dị ka n’okpuru Onyenwe anyị. N’ihi na di bụ isi nke nwunye, dị ka Kraịst anyị bụkwa isi nzukọ Ya, ebe Ya onwe ya bụ Onye nzọpụta nke ahụ. Ma dị ka a na-edo nzukọ ahụ n’okpuru Kraịst anyị, otú a ka ndị bụ nwunye dookwa onwe ha n’okpuru di ha n’ihe nile ọ bụla. Ndị bụ di, hụnụ nwunye unu n’anya, dị ka Kraịst anyị hụkwara nzukọ Ya n’anya, rarakwa Onwe ya nye n’ihi ya. Otú a ndị bụ di jikwa ụgwọ ịhụ nwunye nke aka ha n’anya dị ka ha hụrụ ahụ nke onwe ha n’anya. Onye na-ahụ nwunye nke aka ya n’anya na-ahụ onwe ya n’anya: n’ihi na ọ dịghị onye ọ bụla kpọrọ ahụ onwe ya asị mgbe ọ bụla; kama ọ na-azụ ya na-elezikwa ya anya nke ọma, dị ka Kraịst na-emekwa nzukọ Ya.”

6. Olee otú ndị Kraịst bụ́ di ga-esi dị iche n’ebe ndị ikom nke ụwa nọ?

6 Ọtụtụ mgbe ndị ikom ejiwo ịbụ isi ha dị ka di mee ihe n’ụzọ na-adịghị mma ma chịgbuo ndị nwunye ha. (Jenesis 3:16) Otú ọ dị, Pọl gbara ndị Kraịst bụ́ di ume ka ha dị iche site ná ndị ikom ndị ụwa, ka ha dị ka Kraịst, ọ bụghị ndị ọchịchị nchịgbu na-achịkwa akụkụ nile nke ịdị adị nwunye ha. N’ezie, nwoke ahụ bụ́ Jisọs Kraịst adịghị mgbe ọ dị aka ike ma ọ bụ na-achịgbu achịgbu. O ji nsọpụrụ na nkwanye ùgwù mesoo ndị na-eso ụzọ ya, na-asị: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ, Mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike. Nyaranụ yoke nke m n’olu unu, mụtakwanụ ihe n’ọnụ; n’ihi na abụ m Onye nwayọọ na Onye wedatara Onwe ya ala n’obi.”​—⁠Matiu 11:​28, 29.

7. Olee otú nwoke ga-esi kenye nwunye ya nsọpụrụ mgbe nwunye ya na-arụ ọrụ ego?

7 Onye Kraịst bụ́ di na-ekenye nwunye ya nsọpụrụ dị ka onye na-adịghị ike karị. (1 Pita 3:7) Dị ka ihe atụ, ka e were ya na ọ gaje ịrụ ọrụ ego. Di ya ga-echebara nke a echiche, na-enye aka ma na-enwe ọmịiko dị ka o kwere omume. Otu ihe gbara ọkpụrụkpụ ụmụ nwanyị kwuworo na-akpata ịgba alụkwaghịm bụ nleghara anya nke ndị di ha n’ebe ụmụaka ma ọ bụ ebe obibi dị. Ya mere, onye Kraịst bụ́ di na-achọ inyere ya aka n’ụlọ n’ụzọ ndị dị irè bụ́ ndị ga-abara ezinụlọ ahụ dum uru.

8. Gịnị ka ịnọ n’okpuru gụnyere maka ndị Kraịst bụ́ nwunye?

8 Ịbụ ndị e ji nsọpụrụ mesoo ihe na-eme ka ọ kara ndị Kraịst bụ́ nwunye mfe ịnọ n’okpuru ndị di ha. Otú ọ dị, nke a apụtaghị ajọ ịnọ n’ohu. Chineke nyere iwu na nwunye agajeghị ịbụ ohu, kama onye “kwesịrị ya” (“onye ibe,” ntụaka ala ala peji, NW), na-egosi ihe dabara adaba maka nwoke ahụ. (Jenesis 2:18) Na Malakaị 2:14, e kwuru banyere nwunye dị ka “onye e jikọtara” ya na nwoke. N’ụzọ dị otú a, ndị bụ nwunye n’oge Bible nwere ọ̀tụ̀tụ̀ nnwere onwe na mmesapụ ahụ ụfọdụ. Banyere “nwanyị nke na-ejide onwe ya nke ọma,” Bible na-asị: “Obi di ya atụkwasịwo ya obi.” N’ezie, e tinyere n’aka ya okwu ndị dị ka nlekọta nke ezinụlọ, ilekọta nzụta nke ihe oriri, ịhụ maka ịzụta ala, na ilekọta obere azụmahịa.​—⁠Ilu 31:​10-⁠31.

9. (a) Olee otú ndị inyom na-atụ egwu Chineke n’oge Bible si gosipụta ezi ido onwe onye n’okpuru? (b) Gịnị pụrụ inyere onye Kraịst bụ́ nwunye aka ịnọgide na-edo onwe ya n’okpuru taa?

9 Ka o sina dị, nwunye nke na-atụ egwu Chineke ghọtara ibu isi nke di ya. Dị ka ihe atụ, Sera “ṅara Abraham ntị, na-akpọ ya onyenwe ya,” ọ bụghị dị ka ihe imeju iwu nkịtị nke àgwà ọma, kama dị ka ngosipụta si n’ezi obi nke ido onwe ya n’okpuru. (1 Pita 3:6; Jenesis 18:12) O jikwa obi ya kwere ịhapụ ụlọ ya doro ya ahụ n’obodo Ua iji soro di ya na-ebi n’ụlọikwuu. (Ndị Hibru 11:​8, 9) Ma ịnọ n’okpuru apụtaghị na nwanyị apụghị ime ihe onye tozuru okè mgbe ọ dịrị mkpa. Mgbe Mosis na-emeghị ihe kwekọrọ n’iwu Chineke banyere ibi úgwù, nwunye ya, bụ́ Zipora, gbochiri ọdachi site n’ime ihe siri ike. (Ọpụpụ 4:​24-⁠26) Ihe o metụtara karịrị nanị ime ihe na-atọ nwoke na-ezughị okè ụtọ. Ndị nwunye aghaghị ‘ịdị na-edo onwe ha n’okpuru di nke aka ha, dị ka n’okpuru Onyenwe anyị.’ (Ndị Efesọs 5:22) Mgbe onye Kraịst bụ́ nwunye na-eche echiche n’ihe banyere mmekọrịta ya na Chineke, nke a na-enyere ya aka ileghara ndahie na erughị eru ndị dị nta nke di ya, ọbụna dị ka ọ dị di ya mkpa ime n’imeso ya ihe.

Nkwurịta Okwu​—⁠Ọbara Ndụ nke Alụmdi na Nwunye

10. Olee otú nkwurịta okwu dịruru ná mkpa n’ime alụmdi na nwunye?

10 Mgbe a jụrụ ya otu mkpụrụ ihe kasị ukwuu mere ndị di na nwunye ji agbasa, otu ọkà iwu maka ịgba alụkwaghịm zara, sị: “Enweghị ike isoro ibe ha kwurịta okwu n’obi eziokwu, kọwapụta ihe ndị dị n’ime ime uche ha ma mesoo ibe ha dị ka enyi ha kasị mma.” Ee, nkwurịta okwu bụ ọbara ndụ nke alụmdi na nwunye siri ike. Dị ka Bible na-ekwu, “mmebi echiche nile dị mgbe izu nzuzo na-adịghị.” (Ilu 15:22) Ọ dị ndị bụ di na nwunye mkpa ịbụ ‘ndị enyi dị nso karịsịa,’ na-enwe mmekọrịta na-ekpo ọkụ, nke ịhụnanya. (Ilu 2:17, NW) Ma, ọtụtụ ndị di na nwunye na-ada ada mgbe a bịara ná nkwurịta okwu, otú a kwa mkpasu iwe na-arị elu ruo mgbe e nwere mwụpụ nke iwe na-emebi ihe. Ma ọ bụ ndị bụ di na nwunye pụrụ izo n’ihe mkpuchi na-esighị ike nke ịbụ ndị ọma, na-akpapụga ibe ha iche ná mmetụta uche.

11. Olee otú a pụrụ isi meziwanye nkwurịta okwu n’etiti di na nwunye?

11 Akụkụ nke nsogbu ahụ yiri ka ọ bụ na ndị ikom na ndị inyom na-enwekarị ụdị dịgasị iche isi kwurịta okwu. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị inyom yiri ka ha na-enwe afọ ojuju ịkparịta mmetụta, ebe ndị ikom yikarịrị ka ha na-ahọrọ ịkparịta ihe ndị bụ eziokwu. Ndị inyom na-achọkarị igosi ọmịiko ma nye nkwado mmetụta uche, ebe ndị ikom na-achọ inweta na inye ihe ngwọta. Ma, ikike inwe nkwurịta okwu dị mma na-adị ya n’ebe di na nwunye kpebisiri ike ‘ịnụ ihe ọsọ ọsọ, ghara ịdị ngwa ikwu okwu, gharakwa ịdị ngwa iwe iwe.’ (Jemes 1:19) Na-elerịta onwe unu anya, na-egekwa ntị n’ezie. Jiri ajụjụ ndị na-egosi ọmịiko ghụpụta uche ibe unu. (Tụlee 1 Samuel 1:8; Ilu 20:5.) Kama ịnwa inye ihe ngwọta dị ngwa mgbe onye ị lụrụ kpughere otu nsogbu, gee ntị nke ọma ka ị na-arụ ọrụ iji dozie nsogbu ahụ. Jirikwa obi umeala kpekọọ ekpere, na-achọ nduzi Chineke.​—⁠Abụ Ọma 65:2; Ndị Rom 12:12.

12. Olee otú di na nwunye bụ́ ndị Kraịst pụrụ isi zụchapụta oge maka ibe ha?

12 Mgbe ụfọdụ ihe nrụgide na ndọlị nile nke ndụ na-eyi ka ha na-ahapụrụ di na nwunye oge na ume dị nta maka nkwurịta okwu bara uru. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ndị Kraịst gaje ime ka alụmdi na nwunye ha bụrụ nke dị nsọpụrụ ma chebe ya megide mmetọ, ha aghaghị ịnọgide na-anọ onwe ha nso. Ọ dị ha mkpa imeso njikọ ha dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa, bara uru, ha aghaghịkwa ịzụchapụta oge maka ya na maka onwe ha. (Tụlee Ndị Kọlọsi 4:5.) N’ọnọdụ ụfọdụ ihe ngwọta maka ịchọta oge maka okwu na-ewuli elu pụrụ ịbụ nanị ịgbanyụ TV. Irikọ nri ọnụ mgbe mgbe pụrụ inyere ndị di na nwunye aka ịnọ nso ná mmetụta uche. N’ọnọdụ ndị dị otú ahụ ha pụrụ ‘ịdụkọrịta ọdụ’ n’okwu dị iche iche banyere ezinụlọ. (Ilu 13:10) Leekwa ka o si bụrụ ihe amamihe ịzụlite àgwà nke ịkparịta banyere ihe mgbakasị ahụ na nghọtahie ndị dị nta tupu ha aghọọ isi iyi ndị buru ibu nke esemokwu!​—⁠Tụlee Matiu 5:​23, 24; Ndị Efesọs 4:26.

13. (a) Ihe ilereanya dị aṅaa ka Jisọs setịpụrụ n’ikwu okwu n’ezoghị ọnụ na n’obi eziokwu? (b) Olee ụzọ ụfọdụ ndị di na nwunye pụrụ isi garuo ibe ha nso?

13 Otu nwoke kwupụtara, sị: “Ọtụtụ mgbe nnọọ, ọ na-esiri m ike ikwupụta uche m n’ezie ma gwa [nwunye m] kpọmkwem otú ihe dị m n’obi.” Ma, ịkọwapụta onwe onye bụ ụzọ dị mkpa isi zụlite ịhụnanya. Rịba ama ụzọ ezoghị ọnụ na nke obi eziokwu Jisọs si gwa ndị gaje ịbụ akụkụ nke òtù nwunye ya okwu. Ọ sịrị: “Akpọkwaghị m unu ndị ohu ọzọ site n’ugbu a; n’ihi na ohu adịghị amara ihe onye nwe ya na-eme: ma akpọwo m unu ndị enyi; n’ihi na ihe nile M nụrụ site n’ọnụ Nna m ka M mere ka unu mara.” (Jọn 15:15) Ya mere lee onye ị lụrụ anya dị ka enyi. Mee ka onye ị lụrụ mata mmetụta gị nile. Mee mgbalị ịdị na-ekwu “okwu ịhụnanya” ndị dị mfe, ndị obi eziokwu. (Abụ nke Abụ 1:2, NW) Nkwurịta okwu n’ezoghị ọnụ pụrụ mgbe ụfọdụ iyi ihe na-adabaghị adaba, ma mgbe di na nwunye ahụ tinyere mgbalị zuru ezu, a ga-arụzu ihe dị ukwuu n’ime ka alụmdi na nwunye ha bụrụ njikọ na-adịgide adịgide.

Ịhụ Maka Ihe Ndị A Na-ekwekọrịtaghị

14, 15. Olee otú a pụrụ isi zere ise okwu?

14 Ekwekọrịtaghị n’ihe site n’ezi obi aghaghị ibilite site n’oge ruo n’oge. Ma ọ bụghị iwu na ụlọ gị ga-eretọ ghọọ ‘ụlọ jupụtara n’ịlụ ọgụ.’ (Ilu 17:1) Kpachara anya ịhapụ ịtụle okwu ndị na-akpali obi ọkụ n’ebe ụmụaka pụrụ ịnụ ya, gosikwa nchebara echiche maka mmetụta nke di ma ọ bụ nwunye gị. Mgbe Rechel kwupụtara obi ilu maka ọnọdụ ịbụ àgà ya ma rịọ Jekọb ka o nye ya nwa, Jekọb ji iwe zaghachi, sị: “Ọ̀ bụ n’ọnọdụ Chineke ka m nọ, Onye gbochiwooro gị mkpụrụ nke afọ?” (Jenesis 30:​1, 2) Ọ bụrụ na ihe isi ike ezinụlọ ebilite, lụso nsogbu ahụ ọgụ, ọ bụghị onye ahụ. N’oge nkwurịta okwu nzuzo, zere ‘ikwu okwu n’echeghị eche’ ma ọ bụ ịdị na-anabiri ibe unu okwu n’ụzọ na-adịghị mkpa.​—⁠Ilu 12:18.

15 N’eziokwu, ị pụrụ inwe mmetụta ndị siri ike banyere echiche nke gị, ma a pụrụ ikwupụta ndị a n’enweghị “ihe ilu na ọnụma na iwe na iti mkpu na nkwulu nile.” (Ndị Efesọs 4:31) “Tụlee nsogbu unu n’olu unu na-ejikarị eme ihe,” ka otu di kwuru. “Ọ bụrụ na e welie olu, kwụsị. Lọghachite mgbe nwa oge gasịrị. Malitekwa ọzọ.” Ilu 17:14 na-enye okwu ndụmọdụ nke a dị mma: “Tupu ịlụ ọgụ esie ike hapụ ha.” Nwaa ịtụle okwu mgbe ọzọ mgbe unu abụọ dajụworo.

Na-ekwesị Ntụkwasị Obi Nye Ibe Unu

16. N’ihi gịnị ka ịkwa iko onye bụ́ di ma ọ bụ nwunye ji bụrụ okwu siri oké ike?

16 Ndị Hibru 13:4 na-asị: “Ka ịlụ di na nwunye bụrụ ihe a na-asọpụrụ n’etiti unu nile, ka ihe ndina unu bụrụkwa ihe a dịghị emerụ emerụ: n’ihi na Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko ikpe, ha na ndị na-akwa iko, bụ́ ndị ikom nwere nwunye na ndị inyom nwere di.” Ịkwa iko ndị di ma ọ bụ nwunye bụ mmehie megide Chineke. Ọ na-etisasịkwa alụmdi na nwunye. (Jenesis 39:9) Otu onye ndụmọdụ banyere alụmdi na nwunye dere, sị: “Ozugbo a chọpụtara ya, ịkwa iko di ma ọ bụ nwunye na-etikwasị ezinụlọ dum dị ka nnukwute ajọ ifufe, na-akụjasị ezinụlọ, na-etikpọsị ntụkwasị obi na ùgwù onwe onye, na-emerụsị ndị na-eto eto ahụ.” Ntụrụ ime ma ọ bụ ọrịa a na-ebute site ná mmekọahụ pụrụ ịdapụta.

17. Olee otú a pụrụ isi zere ma ọ bụ jụ ọchịchọ ịkwa iko nke ndị bụ́ di ma ọ bụ nwunye?

17 Ụfọdụ ndị bụ́ di ma ọ bụ nwunye na-azụlite ọchịchọ ịkwa iko site n’ịnakwere echiche rụrụ arụ nke ụwa banyere mmekọahụ nke a na-egosi n’akwụkwọ, telivishọn, na na sịnịma. (Ndị Galetia 6:8) Ma, ndị na-eme nnyocha na-asị na di ma ọ bụ nwunye ịkwa iko na-esitekarị, ọ bụchaghị site n’ọchịchọ maka mmekọahụ kama site n’echiche nke mkpa ọ dị ịnwapụta na mmadụ ka mara mma ma ọ bụ site n’ọchịchọ inwe mmetụta nke ịbụ onye a hụrụ n’anya karị. (Tụlee Ilu 7:18.) Ihe ọ sọrọ ya ya bụrụ ihe kpatara ya, onye Kraịst aghaghị ịjụ echiche efu nile nke omume rụrụ arụ. Site n’obi eziokwu soro di ma ọ bụ nwunye gị tụlee mmetụta gị nile. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa, chọọ enyemaka site n’aka ndị okenye ọgbakọ. Ime otú ahụ pụrụ igbochi nnọọ mmadụ ịdaba ná mmehie. Ọzọkwa, ọ dị ndị Kraịst mkpa ịkpachara anya n’iso ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ha ihe na-emekọ ihe. Ọ ga-abụ ihe megidere ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ịlụ otu onye ma na-ele onye ọzọ anya n’ụzọ agụụ mmekọahụ. (Job 31:1; Matiu 5:28) Ndị Kraịst kwesịrị ịkpachara anya karịsịa banyere ịzụlite njikọ mmetụta uche n’ebe ndị ha na ha na-arụkọ ọrụ nọ. Mee ka mmekọrịta ndị dị otú ahụ dị mma ma bụrụ nke azụmahịa.

18. Gịnị na-abụkarị ihe na-akpata nsogbu mmekọahụ n’alụmdi na nwunye, oleekwa ụzọ a pụrụ isi dozie ndị a?

18 Ihe nchebe ọbụna nke ka ukwuu bụ mmadụ iso di ma ọ bụ nwunye ya nwee mmekọrịta na-ekpo ọkụ, nke ntụsara ahụ. Ọtụtụ ndị na-eme nchọpụta na-asị na nsogbu mmekọahụ n’alụmdi na nwunye adịghị abụkarị nke anụ ahụ kama ọ bụ ihe na-esikarị n’enweghị ezi nkwurịta okwu apụta. Nsogbu n’akụkụ ndị a na-adị ụkọ mgbe di na nwunye na-enwe nkwurịta okwu n’ezoghị ọnụ ma na-enye onye nke ọ bụla ihe ruuru ya dị ka ngosipụta nke ịhụnanya kama ịbụ nanị dị ka iji mezuo ibu ọrụ.a N’okpuru ọnọdụ ndị kwesịrị ekwesị, mmekọrịta ịhụnanya pụrụ inye aka ime ka nkekọ ezinụlọ sie ike.​—⁠1 Ndị Kọrint 7:2-⁠5; 10:24.

19. Gịnị bụ “ihe nkekọ nke izu okè,” mmetụta dịkwa aṅaa ka ọ pụrụ inwe n’alụmdi na nwunye?

19 Ọ bụ ịhụnanya bụ “ihe nkekọ nke izu okè” n’ime ọgbakọ ndị Kraịst. Site n’ịzụlite ịhụnanya, di na nwunye na-atụ egwu Chineke pụrụ inwe ike ‘ịnagiderịta ibe ha na iji amara gbaghara ibe ha.’ (Ndị Kọlọsi 3:​13, 14) Ịhụnanya sitere n’ụkpụrụ na-achọ ọdịmma nke ndị ọzọ. (1 Ndị Kọrint 13:​4-⁠8) Zụlite ịhụnanya dị otú ahụ. Ọ ga-enyere gị aka ime ka ihe nkekọ alụmdi na nwunye gị siwanye ike. Tinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ ná ndụ alụmdi na nwunye gị. Ọ bụrụ na i mee nke ahụ, alụmdi na nwunye gị ga-aghọ njikọ na-adịgide adịgide, ọ ga-ewetakwara Jehova Chineke otuto na nsọpụrụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Isiokwu bụ́ “Nkwurịta Okwu​—⁠Karịrị Ikwu Nanị Okwu,” nke pụtara n’Ụlọ Nche nke August 1, 1993, gosiri ụzọ di na nwunye pụrụ isi merie nsogbu n’akụkụ nke a.

Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?

◻ N’ihi gịnị ka alụmdi na nwunye ga-eji bụrụ nkekọ na-adịgide adịgide?

◻ Gịnị bụ echiche Bible maka ịbụ isi na ịnọ n’okpuru?

◻ Olee otú di na nwunye pụrụ isi meziwanye nkwurịta okwu?

◻ Olee otú di na nwunye pụrụ isi hụ maka ihe ndị a na-ekwekọrịtaghị n’ụzọ ndị Kraịst?

◻ Gịnị ga-enye aka ime ka nkekọ alụmdi na nwunye siwanye ike?

[Foto dị na peeji nke 12]

Ọ bụrụ na nwunye ya aghaghị ịrụ ọrụ ego, onye Kraịst bụ́ di agaghị ekwe ka ọrụ na-anyịgbu ya

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya