Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 7/15 p. 28-30
  • Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka Kalenda Ndị Juu Ziri Ezi?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka Kalenda Ndị Juu Ziri Ezi?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Iguzobe Ebe Mmalite Ahụ
  • “Oge nke Okike”
  • Ihe Ndabere Maka Ọgụgụ Oge Ahụ
  • Ọdịnala na Nkọwa Dị Iche Iche
  • Ihe Ncheta Okpukpe
  • Otú Amụma Daniel Si Gosi Mgbe Mezaịa Ga-abịa
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 7/15 p. 28-30

Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka Kalenda Ndị Juu Ziri Ezi?

DỊ KA kalenda ndị Juu na-egosi, Thursday, September 16, 1993, bụ ụbọchị ememe Rosh Hashanah. Site n’ọdịnala, a fụrụ opi shofar, ma ọ bụ mpi ebulu, iji kpọsaa afọ ọhụrụ ahụ na-erutenụ. Afọ ahụ bụ 5754 (kalenda ndị Juu), ọ malitekwara na September 16, 1993, ruo September 5, 1994.

Ozugbo, anyị na-ahụta na e nwere ọdịiche nke 3,760 afọ n’etiti ọgụgụ oge ndị Juu na kalenda nke ndị Ọdịda Anyanwụ, ma ọ bụ nke Gregory, bụ́ nke a na-ejikarị eme ihe ugbu a. N’ihi gịnị ka e ji nwee ọdịiche nke a? Ruokwa ókè hà aṅaa ka kalenda ndị Juu ziri ezi?

Iguzobe Ebe Mmalite Ahụ

Usoro ọ bụla nke ọgụgụ oge aghaghị inwe ebe mmalite ma ọ bụ ntụaka kpọmkwem. Dị ka ihe atụ, Krisendọm na-agụ oge malite n’afọ ahụ e chere na a mụrụ Jisọs Kraịst na ya. Akara ụbọchị nile eri mgbe ahụ ka a sịrị na ha bụ oge ndị Kraịst. A na-ejikarị okwu ndebiri bụ́ A.D. na-egosipụta ha, site n’okwu Latin bụ́ anno Domini, nke pụtara “n’afọ Onyenwe anyị.” Akara ụbọchị ndị bu oge ahụ ụzọ ka a na-akpọ B.C., “Tupu Kraịst.”a Ndị China na-eso ọdịnala na-agụkwa oge n’otu aka ahụ malite na 2698 T.O.A., mmalite nke ọchịchị Huang-Ti dị n’akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme, bụ́ Onye Ọchịchị Alaeze Ukwu Yellow. Otú a, February 10, 1994, kara akara mmalite nke afọ 4692 nke ndị China dị ka usoro ọnwa si dị. Ma, gịnị banyere kalenda ndị Juu?

Akwụkwọ bụ́ The Jewish Encyclopedia na-asị: “Usoro a na-ejikarị eme ihe ugbu a n’etiti ndị Juu maka idekọ ụbọchị ihe mere bụ idetu ọnụ ọgụgụ afọ gafeworo kemgbe e kesịrị ụwa.” Usoro nke a, nke a maara n’etiti ndị Juu dị ka Oge nke Okike, bụ́ nke ọha mmadụ malitere iji na-eme ihe n’ihe dị ka na narị afọ nke itoolu O.A. Otú a, okwu bụ́ A.M. na-ebukarị akara ụbọchị ndị dị na kalenda ndị Juu ụzọ. Ọ na-eguzo maka anno mundi, bụ́ ụdị okwu ndebiri maka ab creatione mundi, nke pụtara “malite n’okike nke ụwa.” Ebe ọ bụ na afọ dị ugbu a bụ A.M. 5754, dị ka usoro ọgụgụ oge nke a si dị, a na-ewere na “okike nke ụwa” ewerewo ọnọdụ na 5,753 afọ gara aga. Ka anyị lee otú e si kpebie nke ahụ.

“Oge nke Okike”

Akwụkwọ bụ́ Encyclopaedia Judaica (1971) na-enye nkọwa nke a: “Ná ngụkọ dị iche iche nke ndị rabaị ‘Oge nke Okike’ malitere n’oge mgbụsị akwụkwọ nke otu n’ime afọ ndị dị n’agbata 3762 na 3758 T.O.A. Otú ọ dị, malite na narị afọ nke 12 O.A., a nakweere na ‘Oge nke Okike’ malitere na 3761 T.O.A. (kpọmkwem, n’Oct. 7 nke afọ ahụ). Ngụkọ nke a nwetara ihe ndị ya na ya kwekọrọ bụ́ ndị e dekọrọ n’ime Bible na ngụkọ dị iche iche a na-achọta n’akwụkwọ dị iche iche nke ndị Juu bụ́ ndị e dere mgbe e desịrị Bible.”

Usoro nke inye akara ụbọchị site “n’okike nke ụwa” dabeere n’ụzọ bụ́ isi ná nkọwa ndị rabaị na-enye ihe ndekọ Bible. N’ihi nkwenkwe ha nke na e kere ụwa na ihe nile dị n’ime ya n’ime ụbọchị isii nke 24 hour nkịtị, ndị ọkà mmụta bụ́ ndị rabaị, nakwa ndị nke Krisendọm, na-eche na okike nke nwoke mbụ, bụ́ Adam, weere ọnọdụ n’otu afọ ahụ dị ka okike nke ụwa. Otú ọ dị, nke a ezitụdịghị ezi ma ọlị.

Isiakwụkwọ mbụ nke Jenesis na-emeghe site n’ịsị: “Na mbụ Chineke kere eluigwe na ụwa.” O wee gaa n’ihu ịkọwa ihe Chineke mere ‘n’ụbọchị’ isii ndị na-esote iji gbanwee ụwa site n’ọnọdụ nke ịbụ “ihe tọgbọrọ n’efu na ihe tọgbọrọ nkịtị” gaa n’ịbụ ebe dị mma obibi nye ụmụ mmadụ. (Jenesis 1:​1, 2) Ọtụtụ nde afọ agabigawo n’etiti agba abụọ ndị a. Ọzọkwa, ụbọchị okike ndị ahụ abụghị ogologo oge nke 24 hour, dị ka a ga-asị na a kpaara ọrụ nile nke Onye Okike ókè n’ụzọ dị otú ahụ. Na “ụbọchị” n’okwu a pụrụ ịdị ogologo karịa 24 hour ka a na-egosipụta site na Jenesis 2:4, bụ́ nke na-ekwu banyere oge nile nke okike ihe ahụ dị ka otu “ụbọchị.” Ọtụtụ puku afọ gabigara n’etiti ụbọchị okike nke mbụ na nke isii, mgbe e kere Adam. Inye okike Adam otu akara ụbọchị dị ka e nyere eluigwe na ala a na-ahụ anya ekwekọghị n’Akwụkwọ Nsọ ma ọ bụ nkà mmụta sayensị. Ma, olee otú e si kpebie na “Oge nke Okike” malitere na 3761 T.O.A.?

Ihe Ndabere Maka Ọgụgụ Oge Ahụ

N’ụzọ dị mwute, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’akwụkwọ ndị Juu ebe ndị a dabeere wee mee ngụkọ ndị a na-atụle adịkwaghị adị. Ihe fọdụrụnụ bụ akwụkwọ ọgụgụ oge nke a kpọburu Seder ʽOlam (Usoro Ụwa). A sịrị na ọ bụ onye ọkà mmụta Talmud na narị afọ nke abụọ O.A. bụ́ Yose ben Halafta dere ya. Akwụkwọ a (nke e mesịrị na-akpọ Seder ʽOlam Rabbah iji mee ka e nwee ọdịiche ya na akwụkwọ ọgụgụ oge nke Oge Ụwa Na-emepechabeghị Anya bụ́ Seder ʽOlam Zuṭa) na-enye akụkọ ihe mere eme n’usoro ọgụgụ oge malite n’Adam ruo na narị afọ nke abụọ O.A. Mbili ndị Juu megide Rom n’okpuru Mesaịa ụgha bụ́ Bar Kokhba. Olee otú onye ahụ dere ya si nweta ihe ọmụma dị otú ahụ?

Ọ bụ ezie na Yose ben Halafta gbalịrị ịgbaso ihe ndekọ Bible, o tinyere nkọwa ndị nke ya n’ebe ihe odide ahụ na-ekwughị okwu hoo haa banyere akara ụbọchị o metụtara. “N’ọtụtụ ọnọdụ, . . . o nyere akara ụbọchị dị ka ọdịnala si dị, e wezụgakwa nke ahụ, gbakwụnyekwa okwu na halakot [ọdịnala dị iche iche] nke ndị rabaị bu ya ụzọ na ndị dịrị ndụ n’oge ya,” ka akwụkwọ bụ́ The Jewish Encyclopedia na-ekwu. Ndị ọzọ emereghị ya ebere n’ịtụ ya n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀. Akwụkwọ bụ́ The Book of Jewish Knowledge na-ekwusi ike, sị: “O mere ngụkọ malite n’Oge nke Okike ma, n’ihi ya, kanye akara ụbọchị ndị dị ya mma maka ihe omume dị iche iche nke ndị Juu bụ́ ndị a na-ewere na ha mere malite n’oge Adam, bụ́ nwoke mbụ ahụ, ruo n’oge Aleksanda Onye Ukwu.” Ma olee nnọọ ụzọ nkọwa na okwu mgbakwụnye ndị dị otú ahụ si metụta izi ezi na ịbụ eziokwu nke ọgụgụ oge ndị Juu? Ka anyị lee.

Ọdịnala na Nkọwa Dị Iche Iche

N’ụzọ kwekọrọ n’ọdịnala ndị rabaị, Yose ben Halafta gụkọrọ na ụlọ nsọ nke abụọ na Jerusalem dịruru ngụkọta nke 420 afọ. Nke a dabeere ná nkọwa ndị rabaị nke amụma Daniel nke “iri izu asaa,” ma ọ bụ 490 afọ. (Daniel 9:24) E ji ogologo oge nke a mee ihe banyere oge gafere n’etiti mbibi nke ụlọ nsọ mbụ ahụ na ntikpọsị nke abụọ. Iji nye ohere maka 70 afọ nke ịnọ n’ala ọzọ na Babilọn, Yose ben Halafta bịara ná nkwubi okwu nke na ụlọ nsọ nke abụọ ahụ dịruru 420 afọ.

Otú ọ dị, nkọwa nke a na-adabanye ná nsogbu siri ike. Ma afọ ahụ e meriri Babilọn (539 T.O.A.) ma nke mbibi ụlọ nsọ nke abụọ ahụ (70 O.A.) bụ akara oge ndị a ma ama n’akụkọ ihe mere eme. Ya mere, ogologo oge nke ụlọ nsọ nke abụọ ahụ gaje ịbụ 605 afọ kama ịbụ 420 afọ. Site n’ikenye ogologo oge a nanị 420 afọ, ọgụgụ oge ndị Juu na-eji 185 afọ ebi nkenke.

Amụma Daniel abụghị maka ogologo oge ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem ga-anọru. Kama nke ahụ, o buru amụma oge mgbe Mesaịa ahụ ga-apụta. Amụma ahụ gosiri n’ụzọ doro anya na “site ná mpụta okwu ahụ iwughachi na iwuzi Jerusalem ruo mgbe onye e tere mmanụ, bụ́ onye ndú, ga-adị izu asaa: na [iri izu isii na abụọ].” (Daniel 9:​25, 26) Ọ bụ ezie na a tọrọ ntọala nke ụlọ nsọ ahụ n’afọ nke abụọ mgbe ndị Juu si n’ịga biri n’ala ọzọ lọta (536 T.O.A.), “okwu ahụ” bụ́ iwughachi obodo Jerusalem apụtaghị ruo “n’afọ nke [iri abụọ] nke Ataksakses, bụ́ eze.” (Nehemaịa 2:​1-⁠8) Akụkọ ihe mere eme ụwa nke ziri ezi na-eguzobe 455 T.O.A. dị ka afọ ahụ. Ịgụ 69 “izu,” ma ọ bụ 483 afọ, gaa n’ihu na-ewerute anyị na 29 O.A. Nke ahụ bụ oge nke mpụta Mesaịa ahụ, na baptism Jisọs.b

Isi ihe ọzọ nke nkọwa ndị rabaị nke dubara n’oké ekwekọghị ekwekọ n’ọgụgụ oge ndị Juu metụtara oge ọmụmụ nke Abraham. Ndị rabaị gbakọrọ afọ nke ọgbọ ndị na-esochi ibe ha e dekọrọ na Jenesis 11:​10-⁠26 ma kenye oge dịrị malite n’Iju Mmiri ahụ ruo n’ọmụmụ Abraham (Abram) 292 afọ. Otú ọ dị, nsogbu ahụ dị ná nkọwa ndị rabaị maka amaokwu nke 26, nke na-asị: “Tira dị ndụ [iri afọ asaa], mụọ Abram, na Nehoa, na Heran.” Site na nke a, ọdịnala ndị Juu na-ewere ya na Tira dị 70 afọ mgbe a mụrụ Abram. Ma, amaokwu ahụ ekwughị hoo haa na Tira mụrụ Abraham n’afọ ndụ nke 70. Kama nke ahụ, nanị ihe o kwuru bụ na ọ mụrụ ụmụ atọ mgbe ọ gbasịrị 70 afọ.

Iji chọta afọ ndụ Tira kpọmkwem mgbe a mụrụ Abraham, ọ dị anyị mkpa ịgụrụ ihe ndekọ Bible ahụ gaa n’ihu. Site na Jenesis 11:32–12:4, anyị na-amụta na mgbe Tira nwụsịrị n’afọ ndụ nke 205, Abraham na ezinụlọ ya hapụrụ Heran site n’okwu Jehova. Mgbe ahụ Abraham dị 75 afọ. N’ihi ya, a ghaghị ịmụwo Abraham mgbe Tira dị 130 afọ, kama ịbụ 70. Otú a, oge dịrị malite n’Iju Mmiri ahụ ruo n’ọmụmụ Abraham bụ 352 afọ, kama ịbụ 292 afọ. N’ebe a ọgụgụ oge ndị Juu ji 60 afọ ghara izi ezi.

Ihe Ncheta Okpukpe

Ihie ụzọ na ekwekọghị ekwekọ ndị dị otú ahụ n’akwụkwọ Seder ‘Olam Rabbah na akwụkwọ Talmud ndị ọzọ nke ọgụgụ oge akpatawo ọtụtụ mmechuihu na oké nkwurịta okwu n’etiti ndị mmụta bụ́ ndị Juu. Ọ bụ ezie na e mewo ọtụtụ mgbalị ime ka ọgụgụ oge a kwekọọ n’ihe ndị a ma ama mere eme, ha enwechabeghị ihe ịga nke ọma. N’ihi gịnị? “Ihe na-amasị ha abụchaghị nkà mmụta dị ka ọ bụ okpukpe,” ka akwụkwọ Encyclopaedia Judaica na-ekwu. “A ghaghị ịkwado ọdịnala n’agbanyeghị ihe ọ ga-efu, karịsịa n’ihi ọdịdị nke ịrọ òtù dị iche iche na-agba isi akwara.” Kama iwepụsị mgbagwoju anya nke ọdịnala na-akpata, ndị ọkà mmụta ụfọdụ bụ́ ndị Juu anwawo ịkatọ ihe ndekọ Bible. Ndị ọzọ nwara inweta nkwado n’akụkọ ọdịnala ndị na-emeghị eme na ọdịnala dị iche iche nke ndị Babilọn, Ijipt, na India.

N’ihi ya, ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme adịkwaghị ele “Oge nke Okike” anya dị ka ihe usoro ọgụgụ oge nke siri ike. Ndị ọkà mmụta ole na ole bụ́ ndị Juu ga-agbalị ịgbachitere ya, ọbụnakwa akwụkwọ ntụaka ndị a na-akwanyere ùgwù dị ka The Jewish Encyclopedia na Encyclopaedia Judaica na-ele ya anya n’ụzọ na-adịghị mma. N’ihi ya, a pụghị ile usoro ọdịnala nke ndị Juu nke ịgụ oge malite n’okike ụwa anya dị ka nke ziri ezi site n’ụzọ ile ihe anya nke ọgụgụ oge Bible, bụ́ usoro ọgụgụ oge na-ekpughe ekpughe nke amụma nke Jehova Chineke.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ihe àmà ma nke Bible ma nke akụkọ ihe mere eme na-atụ ọmụmụ Jisọs Kraịst aka ịbụ n’afọ 2 B.C. Ya mere, maka izi ezi, ọtụtụ na-ahọrọ iji okwu bụ́ O.A. (Oge Anyị) na T.O.A. (Tupu Oge Anyị) eme ihe, nke a bụkwa otú e si na-egosipụta akara ụbọchị n’akwụkwọ dị iche iche nke Watch Tower Society.

b Maka nkọwa zuru ezu, lee akwụkwọ Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke 2, peji nke 614-616, 900-902, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara. Leekwa Ụlọ Nche nke October 1, 1992, peji nke 11, paragraf nke 8-⁠11.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya