Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 9/1 p. 3-5
  • A Na-ekpe Evolushọn Ikpe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • A Na-ekpe Evolushọn Ikpe
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Akaebe Na-emegide Onwe Ya
  • Evolushọn Ọ̀ Bụ Nhọrọ Ọgụgụ Isi Dị Na Ya?
  • Okwu Okwukwe
  • Ozizi Evolushọn Ò Kwekọrọ na Baịbụl?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 9/1 p. 3-5

A Na-ekpe Evolushọn Ikpe

Ndị kwenyesiri ike n’evolushọn na-ekwusi okwu ike ugbu a ka e nwee nnyochagharị zuru ezu nke mmalite ndụ

KA E were ya na ị bụ onye ọkà ikpe n’ikpe a na-ekpe onye mere mpụ. Onye ahụ na-azara ọnụ ya ekwupụta n’ihu ọha na aka ya dị ọcha, ndị akaebe apụtakwa ịgbara ya akaebe. Otú ọ dị, ka ị na-ege ntị n’akaebe ha, ị na-achọpụta na onye akaebe nke ọ bụla na-ekwu ihe megidere ihe ndị ọzọ kwuru. Ka e mesịrị, mgbe a kpọliteghachiri ndị akaebe ahụ n’ebe ndị akaebe na-anọ ekwu okwu, ihe nile ha kwuru gbanwee. Dị ka onye ọkàikpe, ị̀ ga-ewere akaebe ha dị ka ihe a pụrụ iji eme ihe? Ị̀ ga-enwe ọchịchọ ịtọhapụ onye ahụ a na-ebo ebubo? O yighị, n’ihi na enweghị nkwekọ ọ bụla ná nzara ọnụ ahụ na-eme ka a ghara iwere onye ahụ na-azara ọnụ ya dị ka onye na-ekwu eziokwu.

Otú ahụ ka ọ dị banyere ozizi evolushọn. Ọtụtụ ndị akaebe apụtawo inye nkọwa dị iche iche banyere mmalite nke ndụ, na-azọchitere ozizi evolushọn. Ma akaebe ha, ọ̀ ga-enwe ike iguzo n’ụlọ ikpe? Ndị na-akwado ozizi ahụ, hà na-ekwu otu ihe?

Akaebe Na-emegide Onwe Ya

Olee otú ndụ si malite? Ma eleghị anya ọ dịghị ajụjụ ọzọ kpaliworo ịkọ nkọ, kpasuokwa arụmụka karịa ya. Ma, arụmụka ahụ abụghị nanị banyere evolushọn megide okike; ihe dị ukwuu n’arụmụka ahụ na-ewere ọnọdụ n’etiti ndị ahụ kwere n’evolushọn n’onwe ha. A na-arụsi ụka ike banyere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nkọwa nile nke evolushọn​—⁠otú o si mee, ebe ọ malitere, onye ma ọ bụ ihe malitere ya, na ogologo oge usoro ahụ were.

Ruo ọtụtụ afọ ndị kwere n’evolushọn zọọrọ na ndụ malitere n’ọdọ dị ṅara ṅara nke “ngwakọta” nke ihe ndị dị ndụ. Ụfọdụ na-ekweta ugbu a na ụfụfụ nke dị n’oké osimiri pụrụ imepụtaworị ndụ. Mmiri ọkụ ndị dị n’okpuru osimiri bụkwa ebe ọzọ a na-atụ aro ndụ si malite. Ụfọdụ na-akọ nkọ na ihe ndị dị ndụ so iberibe ụwa mbara igwe ndị datara n’ụwa bịa. Ma ọ bụkwanụ ma eleghị anya, ka ndị ọzọ na-asị, obere ụwa mbara igwe dara n’ụwa wee gbanwee mbara ikuku, si otú ahụ kpalie ndụ. “Gwubanye otu nnukwute ụwa mbara igwe bụ́ ígwè n’ime ala,” ka otu onye na-eme nchọpụta na-asị, “ị ga-ahụkwa n’ezie na ọtụtụ ihe na-adọrọ mmasị ga-eme.”

A na-atụleghachikwa ọdịdị nke mmalite ndụ. “Ndụ amaliteghị n’okpuru ọnọdụ ndị dị jụụ, ndị mara mma, dị ka a na-eche na mbụ,” ka magazin bụ́ Time na-atụ aro ya, “kama n’okpuru eluigwe jọbigara njọ ókè nke ụwa mbara igwe nke mgbọwa ugwu dị iche iche meworo ka o si n’ọnọdụ ya pụọ na comet na obere ụwa mbara igwe dị iche iche na-eyi egwu.” Ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị na-ekwu ugbu a, na ka ndụ wee nwee ike ịpụta n’ọnọdụ ọgba aghara dị otú ahụ, usoro ahụ nile aghaghị iwereworịị ọnọdụ n’oge dị mkpirikpi karị otú e cheburu.

Ndị ọkà mmụta sayensị nwekwara echiche dịgasị iche iche banyere ebe Chineke​—⁠“ma ọ bụrụ na ọ dị”⁠—​nọ bata n’okwu ahụ. Ụfọdụ na-asị na ndụ pụtara n’enweghị ntinye aka nke Onye Okike, ebe ndị ọzọ na-atụ aro na Chineke malitere usoro ahụ wee hapụziere ya evolushọn.

Ka ndụ malitesịrị, olee otú evolushọn si were ọnọdụ? Ọbụna n’ebe a, akụkọ ndị a na-akọ na-emegide onwe ha. Na 1958, otu narị afọ ka e bipụtasịrị akwụkwọ bụ́ The Origin of Species, onye kwere n’evolushọn bụ́ Sir Julian Huxley kwuru, sị: “Oké nchọpụta nke Darwin, ụkpụrụ zuru ọha nke onye ọ dabaara, bụ nke a nwapụtaworo n’ụzọ siri ike nakwa n’ikpeazụ dị ka nanị otu ihe nke mere ka e nwee mgbanwe dị mkpa nke evolushọn.” Otú ọ dị, 24 afọ ka e mesịrị, onye kwere n’evolushọn bụ́ Michael Ruse dere, sị: “Ọnụ ọgụgụ na-etowanye eto nke ndị ọkà mmụta ihe ndị dị ndụ . . . na-arụ ụka na ozizi ọ bụla nke evolushọn nke dabeere n’ụkpụrụ dị iche iche nke Darwin​—⁠karịsịa, ozizi ọ bụla nke na-ele ụkpụrụ nke onye ọ dabaara anya dị ka isi ihe dị ná mgbanwe nke evolushọn⁠—​bụ nke na-ezughị ezu n’ụzọ na-eduhie eduhie.”

Magazin bụ́ Time ọ bụ ezie na ọ na-ekwu na e nwere “ọtụtụ eziokwu gbara ọkpụrụkpụ” ndị na-akwado ozizi evolushọn, ka o sina dị kwetara na evolushọn bụ akụkọ dị mgbagwoju anya nke nwere “ọtụtụ ntụpọ nakwa ụbara ozizi ndị na-emegide onwe ha banyere otú a pụrụ isi mejuo ihe àmà ndị a na-achọ achọ.” Kama ịtụ aro na okwu ahụ ebiela, ụfọdụ n’ime ndị kasị kwenyesie ike n’ozizi evolushọn na-ekwusi ike ugbu a ka e nwee nnyochagharị zuru ezu nke mmalite ndụ.

Otú a, arụmụka maka evolushọn​—⁠karịsịa maka mmalite nke ndụ dị ka evolushọn si kwuo⁠—​adabereghị n’akaebe ndị kwekọrọ ekwekọ. Onye ọkà mmụta sayensị bụ́ T. H. Janabi na-ekwu na ndị ahụ na-akwado evolushọn “azụlitewo ma gbahapụ ọtụtụ ozizi ndị na-ezighị ezi n’ime afọ ndị gara aga, ndị ọkà mmụta sayensị kwa enwebeghị ike ikwekọrịta n’otu ozizi ọ bụla.”

N’ụzọ na-adọrọ mmasị, Charles Darwin tụrụ anya enweghị nkwekọrịta dị otú ahụ. N’okwu mmalite nke akwụkwọ bụ́ The Origin of Species, o dere, sị: “Amaara m nke ọma na o siri ike ịhụ otu isi ihe a tụlere ná mpịakọta nke a nke a na-apụghị ikwu ihe ndị bụ eziokwu banyere ya, na-edujekarị n’ụzọ doro anya ná nkwubi okwu ndị dị nnọọ iche ná ndị m ruteworo.”

N’ezie, akaebe dị otú ahụ na-emegide onwe ya na-akpalite ajụjụ dị iche iche banyere ịbụ eziokwu nke ozizi evolushọn.

Evolushọn Ọ̀ Bụ Nhọrọ Ọgụgụ Isi Dị Na Ya?

Site ná mmalite ya, ka akwụkwọ bụ́ Milestones of History na-ekwu, ozizi evolushọn “masịrị ọtụtụ ndị n’ihi na o yiri ka ọ bụ nke nkà mmụta sayensị n’ezie karịa ozizi nke okike ndị pụru iche.”

Ọzọkwa, okwu nkwesi olu ike nke ụfọdụ ndị kwere n’evolushọn pụrụ ịdị na-amaja mmadụ. Dị ka ihe atụ, ọkà mmụta sayensị bụ́ H. S. Shelton na-ekwu na echiche nke okike pụrụ iche bụ “ihe nzuzu nke ukwuu maka ntụle siri ike.” Ọkà mmụta ihe ndị dị ndụ bụ́ Richard Dawkins na-ekwu hoo haa, sị: “Ọ bụrụ na ị hụ onye ọ bụla nke na-asị na ya ekweghị n’evolushọn, onye ahụ amaghị nke a na-akọ, bụrụ onye nzuzu ma ọ bụ onye ara.” N’otu aka ahụ, Professor René Dubos na-asị: “Ihe ka ná ndị ma nke a na-akọ na-anakwere ugbu a dị ka eziokwu na ihe nile dị n’elu ụwa​—⁠malite n’ihe ndị dị ná mbara igwe ruo ná ndị mmadụ⁠—​apụtawo ma nọgide na-apụta site n’usoro dị iche iche nke evolushọn.”

Site n’okwu ndị a, ọ ga-eyi ka onye ọ bụla nke nwetụrụ ọgụgụ isi ga-anakwere ozizi evolushọn ngwa ngwa. E kwuwerị, ime otú ahụ ga-apụta na onye ahụ “maara nke a na-akọ” kama ịbụ onye “nzuzu.” Ma, e nwere ọtụtụ ndị ikom na ndị inyom gụrụ akwụkwọ nke ọma ndị na-adịghị akwado ozizi evolushọn. “Ahụrụ m ọtụtụ ndị ọkà mmụta sayensị nwere obi abụọ n’onwe ha,” ka Francis Hitching na-ede n’akwụkwọ ya bụ́ The Neck of the Giraffe, “nakwa ọtụtụ ndị sịrị na e kpughewo ozizi evolushọn nke Darwin dị ka ihe na-abụghị ozizi nke nkà mmụta sayensị ma ọlị.”

Chandra Wickramasinghe, bụ́ onye ọkà mmụta sayensị a ma ama bụ́ onye Britain, nwekwara otu echiche ahụ. “E nweghị ihe àmà maka nke ọ bụla n’ụkpụrụ ndị bụ isi n’ozizi evolushọn nke Darwin,” ka ọ na-asị. “Ọ bụ ikike ọha mmadụ nke weghaara ụwa na 1860, m na-echekwa na ọ bụwo ọdachi nye nkà mmụta sayensị kemgbe.”

T. H. Janabi nyochara arụmụka nile ndị kwere n’evolushọn wepụtara. “Achọpụtara m na ihe merenụ dị nnọọ iche n’ihe e dujere anyị ikwere,” ka ọ na-asị. “Ihe àmà dị ntakịrị nke ukwuu, bụrụkwa nke na-ezughị ezu nke ukwuu ịkwado ozizi ahụ dị mgbagwoju anya dị ka nke mmalite nke ndụ.”

N’ihi ya, a gaghị nnọọ eleghara ndị jụrụ ozizi evolushọn anya dị ka ‘ndị na-amaghị nke a na-akọ, ndị nzuzu ma ọ bụ ndị ara.’ Banyere echiche ndị na-emegide ozizi evolushọn, ọbụna onye ahụ kwenyesiri ike n’evolushọn bụ́ George Gaylord Simpson aghaghị ikweta, sị: “Ọ ga-abụ ihie ụzọ n’ezie nanị iji ọchị leghara echiche ndị a anya dị ka ihe na-enweghị isi ma ọ bụ ịkwa ha emo. Ndị na-emegide ozizi ahụ bụrịị (ma nọgide na-abụ) ndị mmụta dị uchu, ndị nwekwara ọgụgụ isi.”

Okwu Okwukwe

Ụfọdụ na-eche na nkweta n’evolushọn dabeere n’eziokwu, ebe nkweta n’okike dabeere n’okwukwe. Ọ bụ eziokwu na ọ dịghị mmadụ ọ bụla hụworo Chineke. (Jọn 1:18; tụlee 2 Ndị Kọrint 5:7.) Ma, ozizi evolushọn anọghị n’ọnọdụ ka mma na nke a, ebe ọ bụ na a tọrọ ntọala ya n’elu ihe omume ndị ụmụ mmadụ na-ahụtụbeghị ma ọ bụ meghachi.

Dị ka ihe atụ, ndị ọkà mmụta sayensị ejitụbeghị anya ha hụ mgbanwe nke ihe ndị dị ndụ​—⁠ọbụna ndị bara uru⁠—​ndị na-emepụta ụdị ihe ndị dị ndụ ndị ọhụrụ; n’agbanyeghị nke ahụ ha ji n’aka na nke a bụ kpọmkwem otú ụdị ihe ọhụrụ dị iche iche si malite. Ha ahụbeghị mpụta ọhụrụ nke ihe ndị dị ndụ site n’ihe ndị na-adịghị ndụ; n’agbanyeghị nke ahụ ha na-esi ọnwụ na ọ bụ otú a ka ndụ si malite.

Ụdị ụkọ dị otú ahụ nke ihe àmà mere T. H. Janabi ji kpọọ ozizi evolushọn “‘okwukwe’ efu.” Onye ọkà mmụta physics bụ́ Fred Hoyle kpọrọ ya “Oziọma dị ka Darwin dere ya.” Dr. Evan Shute weere ya gakwuo n’ihu. “Ana m eche na onye kwere n’okike nwere ihe omimi dị nta ịkọwapụta karịa onye ji obi ya nile kwere n’evolushọn,” ka ọ na-ekwu.

Ndị ọkachamara ndị ọzọ kwetara. “Mgbe m na-atụgharị uche n’ọdịdị nke mmadụ,” ka ọkà mmụta nke ụwa mbara igwe bụ́ Robert Jastrow na-ekweta, “mpụta nke mmadụ nke a pụrụ iche site ná mmiri ọgwụ dị iche iche nke a gbariri n’ime ọdọ mmiri nke dị ṅara ṅara yiri ka ọ bụ ọrụ ebube dịkwa ka ihe ndekọ Bible banyere mmalite ya.”

Gịnịzi mere ọtụtụ mmadụ ka ji na-ajụ echiche ahụ bụ na e kere ndụ eke?

[Foto dị na peeji nke 3]

Okwu nkwesi olu ike nke ndị ụfọdụ pụrụ ịbụ nke na-emenye ụjọ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya