Sayensị, Okpukpe, na Ọchịchọ A Na-achọ Eziokwu
“Eziokwu ahụ bụ na ọtụtụ okpukpe ụgha agbasawo . . . nwere mmetụta ụfọdụ n’ahụ m.”—Charles Darwin
NÁ MMALITE narị afọ nke 19, nkà mmụta sayensị na okpukpe nwere mmekọrịta nke nkwekọrịta. “Ọbụna n’ihe odide nke nkà mmụta sayensị,” ka akwụkwọ bụ́ Darwin: Before and After na-asị, “ndị na-ede akwụkwọ alaghị azụ n’ikwu banyere Chineke n’ụzọ doro anya na ọ bụ nke dị dị ka e si kee mmadụ na nke obi eziokwu.”
Akwụkwọ Darwin bụ́ Origin of Species nyere aka ịgbanwe nke ahụ. Nkà mmụta sayensị na evolushọn bịara nwee mmekọrịta nke wepụrụ okpukpe—na Chineke—n’ihe a na-ekwu. “N’usoro iche echiche nke evolushọn,” ka Sir Julian Huxley na-ekwu, “e nwekwaghị mkpa ma ọ bụ ohere ọ bụla maka ike karịrị nke mmadụ.”
Taa a na-azọrọ ozizi evolushọn ịbụ ntọala a na-apụghị ileghara anya nke nkà mmụta sayensị. Isi ihe kpatara mmekọrịta ahụ bụ nke onye ọkà mmụta physics bụ́ Fred Hoyle kọwapụtara: “Ndị ọkà mmụta sayensị jigidesiri echiche ndị mbụ e nwere ike na-echegbu onwe ha karị banyere igbochi ịlaghachi gaa n’imebiga ihe ókè dị iche iche nke okpukpe n’oge ndị gara aga karịa ịdị na-elepụ anya n’ihu n’ebe eziokwu dị.” Olee ụdị imebiga ihe ókè ndị meworo ka okpukpe bụrụ nke nkà mmụta sayensị na-enweghị mmasị na ya?
Okpukpe Enye Okike Aha Ọjọọ
Ná mgbalị e chere na e mere ịkwado Bible, “ndị kwere n’okike”—nke ndị ya na ha kasị jikọọ aka bụ ndị Protestant na-akọwa Bible n’ụzọ nkịtị—esiwo ọnwụ na ụwa na eluigwe na ala erubeghị 10,000 afọ. Echiche nke a gabigara ókè akpatawo ịkwa emo nke ndị ọkà mmụta banyere ala na ihe ndị dị n’ime ya, ndị ọkà mmụta banyere ụwa mbara igwe, na ndị ọkà mmụta physics, n’ihi na ọ na-emegide ihe ndị ha chọpụtara.
Ma, gịnị n’ezie ka Bible na-ekwu? “Na mbụ Chineke kere eluigwe na ụwa.” (Jenesis 1:1) E kwughị kpọmkwem ogologo oge o were. E hotadịghị ‘ụbọchị mbụ’ nke okike ruokwa na Jenesis 1:3-5. “Eluigwe na ụwa” dịrịị adị mgbe “ụbọchị” mbụ nke a malitere. Ya mere, eluigwe na ụwa hà pụrụ ịdịworị ọtụtụ ijeri afọ, dị ka ndị ọkà mmụta sayensị na-azọrọ? Ha pụrụ ịdịworị. Bible ekwughị nnọọ kpọmkwem ogologo oge o were.
Imebiga ihe ókè ọzọ nke okpukpe bụ ụzọ ụfọdụ si akọwa “ụbọchị” isii ahụ nke okike. Ụfọdụ ndị na-akọwa Bible n’ụzọ nkịtị na-esi ọnwụ na ụbọchị ndị a bụ ụbọchị nkịtị, na-akpara okike nke ụwa ókè ịbụ 144 hour. Nke a na-akpali inwe obi abụọ n’ime ndị ọkà mmụta sayensị, n’ihi na ha na-eche na nzọrọ nke a na-emegide nchọpụta nke nkà mmụta sayensị ndị doro anya.
Otú ọ dị, ọ bụ nkọwa nke ndị na-akọwa Bible n’ụzọ nkịtị—ọ bụghị Bible n’onwe ya—bụ nke ya na sayensị na-ekwekọghị. Bible ekwughị na “ụbọchị” okike nke ọ bụla dị 24 hour n’ogologo; n’ezie ọ na-agụnye “ụbọchị” ndị a nile “n’ụbọchị ahụ mgbe Jehova, bụ́ Chineke, mere ụwa na eluigwe,” bụ́ nke dị ogologo karị, na-egosi na ọ bụghị “ụbọchị” nile nke Bible nwere nanị 24 hour. (Jenesis 2:4) Ụfọdụ pụrụ ịdịworị ọtụtụ puku afọ n’ogologo.a
Otú a, ndị kwere n’okike na ndị na-akọwa Bible n’ụzọ nkịtị enyewo echiche nke okike aha ọjọọ. Nkụzi ha dị iche iche banyere afọ olè eluigwe na ụwa dị na ogologo oge nke “ụbọchị” okike ndị ahụ were ekwekọghị na nkà mmụta sayensị ezi uche dị na ya ma ọ bụkwanụ Bible. Otú ọ dị, e nwekwara imebiga ihe ókè ndị ọzọ bụ́ ndị meworo okpukpe ihe ndị ọkà mmụta sayensị na-enweghị mmasị na ya.
Iji Ike Eme Ihe n’Ụzọ Na-ezighị Ezi
N’akụkọ ihe mere eme nile, ọ bụ okpukpe kpatara ikpe na-ezighị ezi dị ukwuu. Dị ka ihe atụ, n’Oge Ụwa Na-emepechabeghị Anya, a rọgharịrị ozizi nke okike iji gosi na nkwado chọọchị na-akwado ọchịchị eze onye agwala m nke Europe ziri ezi. Ihe ọ pụtara bụ na ọ bụ iwu Chineke debere ụmụ mmadụ n’ọkwá ha dị iche iche, aka ji akụ ma ọ bụ ogbenye. Akwụkwọ bụ́ The Intelligent Universe na-akọwa, sị: “A gwara ụmụaka ndị nwoke ka ntakịrị nke ndị aka ji akụ na ọ bụ ‘usoro nke Chineke’ nye ha ịnata ihe dị nta ma ọ bụ anataghị ihe ọ bụla n’akụ na ụba ezinụlọ, a na-agbakwa nwoke na-arụ ọrụ ume mgbe mgbe ịnọgide na-enwe afọ ojuju ‘n’ọkwá ọ masịrị Chineke ịkpọ ya na ya.’”
Ka a sịkwa ihe mere na ụfọdụ na-atụ ụjọ ịlaghachi “n’imebiga ihe ókè dị iche iche nke okpukpe n’oge ndị gara aga”! Kama igbo mkpa ime mmụọ nke mmadụ, mgbe mgbe okpukpe ejiwo ya mee ihe maka abamuru nke onwe ya. (Ezikiel 34:2) Uche akwụkwọ akụkọ nke magazin bụ́ India Today na-ekwu: “N’ihi ụdị ihe ndekọ o mewooro onwe ya n’ime ọtụtụ afọ ndị gafeworonụ, ọ bụ ihe ijuanya na a ka na-ele okpukpe anya ọma ma ọlị. . . . N’aha Onye Okike Kasị Ukwuu, . . . ụmụ mmadụ emewo oké ihe ọjọọ kasị jọgbuo onwe ha megide ihe ndị e kere eke ibe ha.”
N’ezie, ihe ndekọ na-awụ akpata oyi n’ahụ nke okpukpe nwere mmetụta dị ukwuu n’echiche Darwin. “Eji m nke nta nke nta jụ ikweta n’Iso Ụzọ Kraịst dị ka mkpughe sitere n’aka Chineke,” ka o dere. “Eziokwu ahụ bụ́ na ọtụtụ okpukpe ụgha agbasawo n’akụkụ dị ukwuu nke ụwa dị ka ọkụ na-agba n’ọzara nwere mmetụta ụfọdụ n’ahụ m.”
Mmeri nke Ezi Okpukpe
Omume ihu abụọ nke okpukpe abụrụghị ụwa nke a ihe ọhụrụ. Jisọs gwara ndị ndú okpukpe nke oge ya bụ́ ndị agụụ inwe ike na-agụ, sị: “Unu na-adị ka ezi mmadụ n’elu ahụ—ma n’ime, unu bụ mkpokọta nke ihu abụọ na ajọ omume.”—Matiu 23:28, Phillips.
Otú ọ dị, ezi Iso Ụzọ Kraịst “esiteghị n’ụwa.” (Jọn 17:16) Ndị na-agbaso ya adịghị ekere òkè n’okpukpe na ndọrọ ndọrọ ọchịchị rụrụ arụ; a dịghịkwa eji nkà ihe ọmụma bụ́ ndị na-agọnarị ịdị adị nke Onye Okike eduhie ha. “Amamihe nke ụwa nke a bụ ihe nzuzu n’ebe Chineke nọ,” ka Pọl onyeozi dere.—1 Ndị Kọrint 3:19.
Ma, nke a apụtaghị na ezi ndị Kraịst amaghị ihe ọ bụla banyere nkà mmụta sayensị. N’ụzọ megidere nke ahụ, ndị na-agbaso ezi okpukpe bụ ndị nkà mmụta sayensị na-akpali mmasị ha. ‘Welie anya gị elu, hụ,’ ka a gwara onye amụma oge ochie bụ́ Aịsaịa. “Ọ̀ bụ Ònye kere ihe ndị a?” (Aịsaịa 40:26) N’otu aka ahụ, iji ghọta Onye Okike ahụ nke ọma karị, a kpọrọ Job òkù inyocha ihe ijuanya dị iche iche nke okike na eluigwe na ala.—Job, isi 38-41.
Ee, ndị kwere n’Onye Okike na-eji egwu nkwanye ùgwù ele ihe okike anya. (Abụ Ọma 139:14) Ọzọkwa, ha na-atụkwasị obi n’ihe Onye Okike ahụ, bụ́ Jehova Chineke, kwuru banyere olileanya dị ebube maka ọdịnihu. (Mkpughe 21:1-4) Site n’ọmụmụ Bible, ọtụtụ nde na-amụta na ma mmalite nke mmadụ ma ọdịnihu ya adịghị nke dabeere n’ihe ndapụta efu. Jehova nwere nzube o ji mee mmadụ, a ghaghịkwa imezu nzube ahụ—maka ngọzi nke ụmụ mmadụ nile ndị na-erube isi. Anyị na-akpọ gị òkù inyocha okwu ahụ n’onwe gị.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee Teta! (Bekee), November 8, 1982, peji nke 6-9, na Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke 1, peji nke 545, bụ́ ndị Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara. Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere ozizi nke okike na enweghị nkwekọ nke ya na nkà mmụta sayensị na Bible, lee mbipụta Teta! (Bekee) ndị nke March 8, 1983, peji nke 12-15, na March 22, 1983, peji nke 12-15.
[Igbe dị na peeji nke 6]
Ọ̀ BỤ NA HA AMAGHỊ BANYERE IHE ÀMÀ AHỤ?
“ỌBỤNA Ndịàmà Jehova amụtawo ihe dị ukwuu banyere nkà mmụta ihe ndị dị ndụ,” ka otu onye ọkà iwu bụ́ Norman Macbeth dere na 1971 n’akwụkwọ ya bụ́ Darwin Retried—An Appeal to Reason. Mgbe ọ gụrụ otu isiokwu Teta! banyere evolushọn, Macbeth kwuru, sị: “O juru m anya ịhụ na nkatọ ụfọdụ nke ezi uche dị na ha nke ozizi Darwin dị n’ime ya.” N’ịrịba ama oké nnyocha na nhota okwu ezi uche dị na ha nke ndị maara nke a na-akọ n’isiokwu ahụ, onye ahụ na-ede ihe kwubiri, sị: “O zikwaghị ezi bụ́ Simpson ikwu, sị: ‘. . . ndị na-ekweghị na ya [evolushọn] bụ, nye ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ onye ọ bụla, ndị na-amaghị nke a na-akọ n’ihe àmà nke nkà mmụta sayensị.’”
[Foto dị na peeji nke 7]
A hapụrụghị ihe ndapụta efu ọdịnihu nke ihe a kpọrọ mmadụ