N’ihi Gịnị Ka Ị Ga-eji Na-agbaghara Mmehie?
ONYE Juu bụ́ ọkà mmụta na onye na-ede ihe bụ Joseph Jacobs n’otu mgbe kọwara mgbaghara dị ka “nke kasị elu na nke kasị sie ike n’ihe mmụta omume nile.” N’ezie, ọtụtụ na-ahụta okwu ahụ bụ́ “Agbagharawo m gị” ịbụ ihe siri nnọọ ike okwukwu.
O yiri ka mgbaghara ọ dị nnọọ ka ego. A pụrụ imefu ya were were na n’ụzọ ebere n’ebe ndị ọzọ nọ ma ọ bụ jichiere ya onwe onye n’ụzọ aka ntagide. Nke mbụ bụ ụzọ nke Chineke. Anyị kwesịrị ịzụlite àgwà imefu ya n’ụzọ mmesapụ aka ma a bịa n’ịgbaghara mmadụ. N’ihi gịnị? N’ihi na Chineke na-agba ume ime nke a, nakwa n’ihi na mmụọ nke ịbụ onye na-adịghị agbaghara, nke ịbọ ọ́bọ̀ pụrụ nanị ime ka ihe dịwanye njọ.
A na-anụkarị okwu ndị bụ: “Adịghị m ewe iwe; m na-emegwara!” N’ụzọ dị mwute, okwu a bụ ụkpụrụ na-eduzi ọtụtụ ndụ a na-ebi taa. Otu nwanyị, dị ka ihe atụ, jụrụ ighe nwunye nwanne ya nwoke ọnụ ruo ihe karịrị afọ asaa n’ihi na, dị ka nwanyị ahụ kwuru, “o mejọrọ m nke ukwuu, enwebeghịkwa m ike ịgbaghara ya.” Ma ụdị mmeso mgbachi nkịtị dị otú ahụ, mgbe e ji ya mee ihe dị ka ihe e ji enweta arịrịọ onye ahụ e boro ebubo maka mgbaghara ma ọ bụ dị ka ngwá ọgụ e ji enye ahụhụ, ọ dịghị emejukebe ọchịchọ nke imegwara. Kama nke ahụ, ọ pụrụ nanị ime ka esemokwu ahụ dịwanye ogologo, na-enye ohere ka oké iwe tolite. Ọ bụrụ na a dọbighị ogologo oge nke nhụsianya nke a, njikpọ dị ike nke ịbọ ọ́bọ̀ pụrụ imebi mmekọrịta dị iche iche na ọbụna ahụ ike mmadụ.
Ihe Dị Njọ ná Mmụọ nke Enweghị Mgbaghara
Mgbe mmadụ bụ onye na-adịghị agbaghara, nsọrịta mpi nke na-esi na ya apụta na-akpata nchekasị. N’otu aka ahụ, nchekasị pụrụ iduje n’ọrịa siri ike. Dr. William S. Sadler dere, sị: “Ọ dịghị onye pụrụ ịghọta n’ụzọ zuru ezu dị ka onye dọkịta ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu dị ịtụnanya nke ọrịa na ịta ahụhụ mmadụ nke nchekasị, ụjọ, ịsọ mpi, . . . iche echiche na-adịghị mma na ibi ndụ rere ure na-akpata.” Otú ọ dị, n’ezie, ókè mbibi ha aṅaa ka nsogbu mmetụta uche na-akpata? Otu akwụkwọ na-ekwu banyere ahụ ike zara: “Ngụkọ ndị e mere . . . na-egosi na ụzọ abụọ n’ime ụzọ atọ nke ndị na-arịa ọrịa gakwuuru onye dibịa nwere ihe mgbàmà ọrịa nke nrụgide uche kpatara ma ọ bụ mee ka ọ dịwanye njọ.”
Ee, obi ilu, ọnụma, na iwe abụghị ihe na-adịghị emerụ ahụ ma ọlị. Mmetụta uche ndị a na-erichapụ erichapụ dị nnọọ ka ịta nchara nke ji nwayọọ nwayọọ na-erichapụ ahụ ụgbọ ala. Elu ahụ ụgbọ ala ahụ pụrụ ịdị mma ile anya, ma n’okpuru ágbá ahụ usoro nke na-ebibi ebibi na-ewere ọnọdụ.
Ọbụna ihe ka mkpa, anyị ịjụ ịgbaghara mgbe e nwere ihe ndabere maka ime ebere pụrụ imerụ anyị ahụ n’ụzọ ime mmụọ. N’anya Jehova Chineke, anyị pụrụ ịghọ onye dị ka ohu ahụ dị n’ilu Jisọs. Nna ukwu nke ohu ahụ gbaghaara ya oké ụgwọ o ji. Ma, mgbe ohu ibe ya rịọrọ ya ka ọ gbaghara ya ụgwọ dị nnọọ nta ma e jiri ya tụnyere nke ya onwe ya ji, o meghị ihe n’ụzọ dị nro, o nweghịkwa mgbaghara. Jisọs mere ka o doo anya na ọ bụrụ na anyị adịghị njikere ịgbaghara n’otu aka ahụ, Jehova ga-ajụ ịgbaghara anyị mmehie anyị nile. (Matiu 18:21-35) Ya mere, ọ bụrụ na anyị adịghị agbaghara, anyị pụrụ ịtụfu akọ na uche dị ọcha anyị nwere n’ebe Chineke nọ na ọbụna olileanya anyị maka ọdịnihu! (Tụlee 2 Timoti 1:3.) Mgbe ahụ, gịnị ka anyị pụrụ ime?
Mụta Ịdị Na-agbaghara
Ezi mgbaghara na-esite n’obi. Ọ gụnyere ịgbaghara mmejọ nke onye ahụ mejọrọnụ na ịhapụ ọchịchọ ọ bụla maka ịbọ ọ́bọ̀. Otú a, a na-ahapụrụ Jehova ikpe ziri ezi ikpeazụ na nkwụghachi ụgwọ a pụrụ inye.—Ndị Rom 12:19.
Otú ọ dị, a ghaghị ịrịba ama na ebe “obi dị aghụghọ karịa ihe nile, ihe na-adịghị ngwọta ka ọ bụkwa,” ọ dịghị enwekarị ọchịchọ mgbaghara ọbụna mgbe o kwesịrị. (Jeremaịa 17:9) Jisọs n’onwe ya kwuru, sị: “N’obi ka ajọ echiche nile, igbu mmadụ nile, ịkwa iko nile nke ndị ikom nwere nwunye na ndị inyom nwere di, ịkwa iko nile, ohi nile, àmà ụgha nile, nkwulu nile, si apụta.”—Matiu 15:19.
Ọ bụ ihe obi ụtọ na a pụrụ ịzụ obi anyị ime ihe ziri ezi. Otú ọ dị, ọzụzụ dị anyị mkpa aghaghị isi n’ebe ka elu bịa. Anyị apụghị ime ya nanị anyị. (Jeremaịa 10:23) Onye ọbụ abụ e nyere mmụọ Chineke ghọtara nke a ma kpee ekpere maka nduzi Chineke. Ọ rịọrọ Jehova n’ekpere: “Gị zi m ụkpụrụ Gị nile. Mee ka m ghọta ụzọ nke ihe ịrịba ama Gị nile.”—Abụ Ọma 119:26, 27.
Dị ka abụ ọma ọzọ si kwuo, Eze Devid nke Israel oge ochie bịara “ghọta ụzọ” nke Jehova. O nwere ahụmahụ ya n’onwe ya ma mụta ihe site na ya. Ya mere, ọ pụrụ ịsị: “Jehova nwere obi ebere, na-emekwa amara, Ọ dịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Ọ na-abakwa ụba n’ebere. Dị ka nna si enwe obi ebere n’ahụ ụmụ ya, otú a ka Jehova nwere obi ebere n’ahụ ndị na-atụ egwu Ya.”—Abụ Ọma 103:8, 13.
Ọ dị anyị mkpa ịmụta ihe dị ka Eze Devid mere. Jiri ekpere mụọ ihe nlereanya zuru okè nke Chineke banyere mgbaghara, nakwa nke Ọkpara ya. Otú a, anyị pụrụ ịmụta isi n’obi na-agbaghara.
Ma, ụfọdụ pụrụ ịjụ n’ụzọ ziri ezi, sị: Gịnị banyere mmehie dị oké njọ? Ọ bụ iwu na a ga-agbaghara mmehie nile?
Ịchọ Ezi Nguzo
Mgbe e mejọrọ mmadụ n’ụzọ dị oké njọ, ihe mgbu ya pụrụ ịdị ukwuu. Nke a bụ eziokwu karịsịa ma ọ bụrụ na mmadụ bụ onye aka ya dị ọcha e mere mmehie dị njọ megide. Ụfọdụ pụrụ ọbụna iche, sị, ‘Olee otú m pụrụ isi agbaghara onye raara m nye ma merụọ m ahụ?’ N’ọnọdụ nke mmehie jọgburu onwe ya nke pụrụ iweta ịchụpụ n’ọgbakọ, ọ pụrụ ịdị onye ahụ e mejọrọ mkpa itinye ndụmọdụ ahụ dị na Matiu 18:15-17 n’ọrụ.
Otú ọ bụla o si dị, ihe dị ukwuu pụrụ ịdabere n’ebe onye ahụ mehierenụ nọ. Kemgbe e mere ihe ọjọọ ahụ, è nwewo ihe àmà ọ bụla nke nchegharị sitere n’ezi obi? Onye mmehie ahụ ọ̀ gbanwewo, ma eleghị anya ọbụna mee mgbalị imezigharị ihe n’ezie? N’anya Jehova ụdị nchegharị ahụ bụ isi ihe na-eweta mgbaghara ọbụna n’ọnọdụ nke mmehie jọgburu onwe ya n’ezie. Dị ka ihe atụ, Jehova gbaghaara Manase, otu onye n’ime eze ndị obi kasị taa mmiri n’akụkọ ihe mere eme nke Israel. N’ihe ndabere dị aṅaa? Chineke mere otú ahụ n’ihi na Manase mesịrị n’ikpeazụ wetuo onwe ya ala ma si n’ime ụzọ ọjọọ ya nile chegharịa.—2 Ihe Emere 33:12, 13.
N’ime Bible ezi nchegharị gụnyere mgbanwe àgwà e mere n’ezi obi, ịkwa ụta sitere n’ala ala obi banyere ihe ọjọọ ọ bụla e mere. Ebe o kwesịrị ekwesị ma kwee omume, nchegharị bụ nke ya na mgbalị ịkwụghachi onye e mejọrọ ihe o furu ya na-aga ụkwụ na ụkwụ. (Luk 19:7-10; 2 Ndị Kọrint 7:11) Ebe a na-enweghị ụdị nchegharị ahụ, Jehova adịghị agbaghara.a Ọzọkwa, Chineke adịghị atụ ndị Kraịst anya ịgbaghara ndị nweburu ìhè n’ụzọ ime mmụọ ma bụrụ ndị kpachapụrụ anya ugbu a, n’ụzọ enweghị nchegharị na-eme ihe ọjọọ. (Ndị Hibru 10:26-31) N’ọnọdụ ndị gafere ókè, mgbaghara pụrụ ịbụ nnọọ ihe na-ekwesịghị ekwesị.—Abụ Ọma 139:21, 22; Ezikiel 18:30-32.
Ma mgbaghara ọ ga-ekwe omume ma ọ bụ na ọ gaghị ekwe, onye e mere mmehie dị oké njọ megide pụrụ ịchọ ịtụle ajụjụ ọzọ: Ọ̀ bụ iwu na m ga-anọgide na nhụjuanya mmetụta uche siri ike, na-enwe oké mwute na iwe, ruo mgbe e kpebiri okwu ahụ n’ụzọ zuru ezu? Tụlee otu ihe atụ. Eze Devid nwere oké mwute mgbe ọchịagha ya, bụ́ Joab, gburu Abnea na Amasa, “ndị ikom abụọ bụ́ ndị ezi omume na ndị dị mma karịa [Joab].” (1 Ndị Eze 2:32) Devid gosipụtara ọnụma ya n’okwu ọnụ, ihe ịrụ ụka adịghịkwa ya na ọ gwara ya Jehova site n’ekpere. Otú ọ dị, mgbe oge na-aga, ịdị ọkụ nke mmetụta Devid yikarịrị ka ọ dajụrụ. Ọ bụghị onye ọnụma rikpuru ruo ọgwụgwụ nke ndụ ya. Devid ọbụna gara n’ihu isoro Joab na-arụkọ ọrụ, ma ọ gbagharaghị nnọọ onye a gburu ọchụ nke na-enweghị nchegharị. Devid hụrụ na e mere ihe n’ikpe ziri ezi n’ikpeazụ.—2 Samuel 3:28-39; 1 Ndị Eze 2:5, 6.
Ọ pụrụ iwe oge na mgbalị ụfọdụ tupu ndị e merụrụ ahụ site ná mmehie dị oké njọ nke ndị ọzọ emee ka iwe ha mbụ dajụọ. Usoro ọgwụgwọ ahụ pụrụ ịdị mfe karị mgbe onye ahụ mejọrọnụ kwetara ihe ọjọọ ya ma chegharịa. Otú ọ dị, onye ahụ aka ya dị ọcha e mejọrọ kwesịrị inwe ike ịchọta nkasi obi n’ihe ọ maara banyere ikpe ziri ezi na amamihe Jehova nakwa n’ime ọgbakọ ndị Kraịst, n’agbanyeghị ụzọ onye ahụ mere ihe ọjọọ na-agbaso.
Ghọtakwa na mgbe ị na-agbaghara onye mmehie, nke a apụtaghị na ị na-anabata mmehie ahụ. Nye onye Kraịst, mgbaghara pụtara iji ntụkwasị obi hapụrụ Jehova okwu ahụ. Ọ bụ Onye Ikpe ezi omume nke eluigwe na ala nile, ọ ga-ekpekwa ikpe ziri ezi n’oge kwesịrị ekwesị. Nke ahụ ga-agụnye ikpe ‘ndị na-akwa iko na ndị na-akwa iko, bụ́ ndị ikom nwere nwunye na ndị inyom nwere di,’ bụ́ ndị na-aghọ aghụghọ, ikpe.—Ndị Hibru 13:4.
Abamuru Dị Iche Iche nke Ịgbaghara
Onye ọbụ abụ bụ́ Devid bụrụ, sị: “N’ihi na Gị onwe gị, Onyenwe anyị, dị mma, Ị bụkwa onye na-agbaghara mmehie, Ị na-abakwa ụba n’ebere n’ahụ ndị nile na-akpọku Gị.” (Abụ Ọma 86:5) Dị ka Jehova, ị̀ “na-agbaghara mmehie”? Abamuru ndị dị na ya dị ọtụtụ.
Nke mbụ, ịgbaghara ndị ọzọ na-akwalite ezi mmekọrịta. Bible na-agba ndị Kraịst ume, sị: “Nwerịtanụ obi ọma n’ahụ ibe unu, nweenụ obi ọmịiko, werekwanụ amara gbaghara onwe unu, dị ka Chineke werekwara amara gbaghara unu n’ime Kraịst.”—Ndị Efesọs 4:32.
Nke abụọ, mgbaghara na-eweta udo. Nke a abụghị nanị udo n’ebe mmadụ ibe anyị nọ kamakwa udo nke ime.—Ndị Rom 14:19; Ndị Kọlọsi 3:13-15.
Nke atọ, ịgbaghara ndị ọzọ na-enyere anyị aka icheta na anyị onwe anyị nwekwara mkpa nke mgbaghara. Ee, “mmadụ nile emehiewo, ha adịghị erukwa otuto Chineke.”—Ndị Rom 3:23.
N’ikpeazụ, ịgbaghara ndị ọzọ na-emeghe ụzọ ka Chineke gbaghara anyị mmehie anyị. Jisọs kwuru, sị: “Ọ bụrụ na unu agbaghara mmadụ ndahie nile ha, Nna unu ga-agbagharakwa unu.”—Matiu 6:14.
Cheedị echiche ọtụtụ ihe na-aghaghị ijupụta n’uche Jisọs n’ehihie ụbọchị ọnwụ ya. Ọ na-enwe nchegbu banyere ndị na-eso ụzọ ya, ọrụ nkwusa ahụ, na karịsịa ikwesị ntụkwasị obi ya nye Jehova. Ma, ọbụna mgbe ọ na-ata oké ahụhụ n’elu osisi ịta ahụhụ, gịnị ka o kwuru banyere ya? Ihe so n’okwu ikpeazụ ya bụ, “Nna, gbaghara ha.” (Luk 23:34) Anyị pụrụ iṅomi ihe nlereanya zuru okè nke Jisọs site n’ịgbaghara ibe anyị site n’obi.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Otú ọ dị, Jehova na-echebara ihe ndị ọzọ echiche mgbe ọ na-atụle mgbaghara. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na onye ahụ mere ihe ọjọọ amaghị ụkpụrụ Chineke, ụdị amaghị ihe dị otú ahụ pụrụ ibelata ibu arọ nke ikpe ọmụma. Mgbe Jisọs rịọrọ Nna ya ka ọ gbaghara ndị gburu ya, o doro anya na Jisọs na-ekwu banyere ndị agha Rom gburu ya. Ha “amataghị ihe ha na-eme,” ebe ha na-amaghị onye ọ bụ n’ezie. Otú ọ dị, ndị ndú okpukpe ahụ kpatara ogbugbu ahụ nwere ikpe ọmụma ka ukwuu—nyekwa ọtụtụ n’ime ha, mgbaghara ọ bụla agaghị ekwe omume.—Jọn 11:45-53; tụlee Ọrụ Ndị Ozi 17:30.
[Foto ndị dị na peeji nke 5]
Ị̀ ghọtara isi ihe dị n’ilu Jisọs banyere ohu ahụ na-adịghị agbaghara?
[Foto ndị dị na peeji nke 7]
Ịgbaghara ndị ọzọ na-akwalite ezi mmekọrịta ma na-eweta obi ụtọ