Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 10/1 p. 4-8
  • Bible—Akwụkwọ E Mere Ka A Aghọta Ya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Bible—Akwụkwọ E Mere Ka A Aghọta Ya
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • N’ihi Gịnị Ka E Ji Dee Bible?
  • Ọ̀ Dị Mgbagwoju Anya nke Ukwu Ịghọta Ya?
  • Bible na Ndị Na-eso Ụzọ Jisọs
  • Olee Enyemaka Dịnụ?
  • N’ihi Gịnị Ka Bible Ji Dị Mkpa?
  • AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Inyocha “Ihe Ndị Miri Emi nke Chineke”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Gụọ Okwu Chineke Ma Jeere Ya Ozi n’Eziokwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Gịnị Ga-enyere Gị Aka Ịghọta Bible?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 10/1 p. 4-8

Bible—Akwụkwọ E Mere Ka A Aghọta Ya

ỤFỌDỤ ndị kwenyere na Bible bụ Okwu doro anya nke Chineke nke e kwesịrị ịgbaso n’ụzọ nkịtị. Nye ndị ọzọ, “ozi Bible dị nnọọ mgbagwoju anya karị.” Otú ahụ ka kọmitii mmadụ 12 mejupụtara nke okwukwe na nkà mmụta okpukpe maka chọọchị Protestant kasị ibu na Canada kwuru. Ụkọchukwu bụ́ Clifford Elliott, nke ụka United Church, na-eche na nye ụfọdụ “Bible na-aghọ ihe siri ike nghọta, ihe na-adịghị akpali mmasị, na ihe na-abaghị uru.”

Echiche ndị dị otú ahụ na-ewelite ajụjụ ndị dị mkpa e kwesịrị ịza aza. Nke dị mkpa n’etiti ndị a bụ, N’ihi gịnị ka e ji dee Bible? Ọ̀ na-eju anya dịkwa mgbagwoju anya nke ukwuu ịghọta ya? Mmadụ nkịtị ọ̀ pụrụ ịghọta ya? Olee enyemaka dị mkpa maka mmadụ inwe nghọta nke Akwụkwọ Nsọ? N’ihi gịnịkwa ka ezi ihe ọmụma nke Bible ji dị mkpa n’oge ndị a nke oké nsogbu?

N’ihi Gịnị Ka E Ji Dee Bible?

Ọmụmụ nke Okwu Chineke abụwo mgbe nile ihe a chọrọ n’aka ndị gaje inweta ihu ọma na nnwapụta nke Chineke Kachasị Elu, Jehova. A gwara ndị eze, ndị nchụàjà, ndị nne na nna, ndị ikom, ndị inyom, na ụmụaka​—⁠ma ndị ọgaranya ma ndị ogbenye⁠—​ka ha wepụta oge site n’ihe ndị ha na-eme kwa ụbọchị iji jiri ekpere tụlesie Okwu Chineke e dere ede ike.​—⁠Deuterọnọmi 6:6, 7; 17:18-⁠20; 31:9-⁠12; Nehemaịa 8:8; Abụ Ọma 1:1, 2; 119:7-⁠11, 72, 98-⁠100, 104, 142; Ilu 3:​13-⁠18.

Dị ka ihe atụ, a tụziiri Joshua, sị: “Hụ na ị na-agụ akwụkwọ Iwu ahụ mgbe nile n’ofufe gị. Na-amụ ya ehihie na abalị, jidekwa n’aka na ị na-erube isi n’ihe ọ bụla e dere n’ime ya. Mgbe ahụ ka ị ga-aba ụba nweekwa ihe ịga nke ọma.” (Joshua 1:8, Today’s English Version) Ọmụmụ ihe na itinye Iwu Chineke n’ọrụ dị otú ahụ e mere site ná nlezianya ga-arụpụta ihe ịga nke ọma na obi ụtọ. Jehova bu n’uche na “mmadụ nile” abụghị nanị na ha ga-aghọta Okwu ya, bụ́ Bible, kamakwa ha ga-erubere ya isi, na-enwe olileanya nke ịnata onyinye nke ndụ.​—⁠1 Timoti 2:​3, 4; Jọn 17:3.

Ọ̀ Dị Mgbagwoju Anya nke Ukwu Ịghọta Ya?

Tupu nrịgo Jisọs n’eluigwe, o mere ka o doo anya na ya chọrọ ka nnukwute usoro ihe omume nke nkụzi Bible gaa n’ihu gburugburu ụwa. (Ọrụ 1:8) Ọ matara na e mere Bible ka a ghọta ya. Mgbe ọ kọwasịrị na Jehova enyewo ya ike nile dị n’eluigwe na n’elu ụwa, o nyere iwu nke a doro anya: “Ya mere, gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ [ma ọ bụ, ndị na-amụ banyere] m, na-eme ha baptism baa n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ: na-ezi ha ka ha debe ihe nile, ha ha hà, bụ́ nke M nyere unu n’iwu.”​—⁠Matiu 28:​19, 20.

Tupu baptism, a ga-akụziri ndị ọhụrụ na-eso ụzọ banyere Jehova, Ọkpara ya, na ịrụ ọrụ nke mmụọ nsọ. Ọzọkwa, a ga-ezi ha ihe n’iwu nke usoro ihe ndị Kraịst. (1 Ndị Kọrint 9:21; Ndị Galetia 6:2) Iji rụzuo nke a, ọ dị ndị kwesịrị ekwesị mkpa nke mbụ ikwere na Bible sitere n’aka Jehova, nke abụọ ikwere na e mere ya ka a ghọta ya.​—⁠Matiu 10:​11-⁠13.

Gịnị ka a chọrọ n’akụkụ nke gị iji ghọta Bible? Ọkpara Chineke tinyere mgbalị nile iji kọwaa Akwụkwọ Nsọ. Ọ matara na Ihe Odide Dị Nsọ ahụ bụ eziokwu nakwa na o nwere uche doro anya nke Jehova. (Jọn 17:17) Banyere ọrụ e kenyere ya, Jisọs Kraịst sịrị: “A mụrụ m m bịakwa n’ụwa n’ihi otu nzube nke a, ikwu banyere eziokwu ahụ. Onye ọ bụla nke dịịrị eziokwu ahụ na-aṅa m ntị.” (Jọn 18:37, TEV; Luk 4:43) Jisọs alaghị azụ n’ịkụziri ndị nwere obi na uche dị njikere ịnakwere ihe ihe. Na Luk 24:45, a gwara anyị, sị: “Mgbe ahụ ka O [Kraịst Jisọs] meghere uche ha, ka ha wee ghọta ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ.”

N’oge ije ozi Jisọs o mere nhota aghara aghara site n’Okwu ahụ e dere ede, na-akọwa ma na-ezo aka n’akwụkwọ nsọ “n’akwụkwọ iwu Mosis, na ndị amụma, na abụ ọma.” (Luk 24:​27, 44) Ndị nụrụ nkọwa Akwụkwọ Nsọ ya bụ ndị a kwaliri nke ukwuu site ná nghọta ya doro anya, nakwa site n’ikike ya izi ihe. (Matiu 7:​28, 29; Mak 1:22; Luk 4:32; 24:32) Nye ya, Akwụkwọ Nsọ bụ akwụkwọ ghere oghe.

Bible na Ndị Na-eso Ụzọ Jisọs

Pọl onyeozi, onye na-eṅomi Jisọs Kraịst, hụrụ mkpa ọ dị ịkụziri ndị ọzọ ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ. Ya onwe ya matakwara na e mere ha ka a ghọta ha. Ọ bụ ya mere o ji kụzie ihe n’ihu ọha, kọwaakwa Akwụkwọ Nsọ n’ụzọ ihe ịrụ ụka na-adịghị ya n’ụlọ ndị chọrọ ịghọta ha. Pọl mere ka a mata ọnọdụ ya mgbe ọ sịrị: “Unu matara na ezochighị m ihe ọ bụla ga-abara unu uru ka m na-ekwusa ma na-ezi ihe n’ihu ọha na n’ụlọ unu.” (Ọrụ 20:20, TEV) Ná nkwurịta okwu ya nile ọ tụgharịrị uche n’Akwụkwọ Nsọ, na-akọwa ma na-anwapụta isi ihe ya nile site n’izo aka. (Ọrụ 17:​2, 3) O nwere mmasị n’inyere ndị ọzọ aka ịghọta ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ.

Ọ̀ na-agụ gị agụụ ịghọta ihe Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya kụziri? (1 Pita 2:2) Ndị bi na Beria oge ochie nwere ọchịchọ dị otú ahụ, ha nụkwara ọkụ n’obi ikwere ihe Pọl onyeozi na-akụziri ha banyere Kraịst. Ya mere a gbara ha ume ịmụ Akwụkwọ Nsọ kwa ụbọchị wee si otú ahụ jide n’aka na ozi ọma ha nụrụ bụ n’ezie eziokwu. N’ihi na uche ha na-anakwere ihe, “ọtụtụ mmadụ n’ime ha kweere na Jisọs.”​—⁠Ọrụ 17:​11, 12.

Iji ghọta Bible, mmadụ aghaghị inwe ọnọdụ obi nke ziri ezi, ọchịchọ ezi obi ịmụta ihe, na ‘mmata nke mkpa ime mmụọ ya.’ (Matiu 5:3) Mgbe a jụrụ Jisọs: “N’ihi gịnị ka ị na-agwa ha okwu n’ilu?” ọ zara, sị: “Ọ bụ unu ka e nyeworo ịmara ihe omimi alaeze eluigwe, ma e nyeghị ndị ahụ.” E buru amụma na ọ ‘ga-asaghe ọnụ ya n’ịtụ ilu ma kwuo ihe ndị zoro ezo.’ (Matiu 13:​10, 11, 35) Ya mere Jisọs ji ilu kwuo okwu iji kewaa ndị na-ejighị mmasị na ndị ji oké ọchịchọ ịmata ihe na-ege ntị pụọ ná ndị ji obi eziokwu na-ajụ ajụjụ. Ndị na-eso ụzọ Jisọs gosipụtara obi eziokwu ha n’otu oge mgbe ha sooro ya banye n’otu ụlọ ma sị: “Kọọrọ anyị isi ilu ata dị n’ubi ahụ.”​—⁠Matiu 13:36.

O doro anya na enyemaka dị anyị mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-aghọta Bible. Ụkọchukwu bụ́ Hal Llewellyn, odeakwụkwọ ndị United Church n’ihe banyere nkà mmụta okpukpe, okwukwe, na njikọ okpukpe, sịrị: “Ọ dị nnọọ mkpa ime ka ihe Bible pụtara nye anyị na ụzọ e si agụ ma na-akọwa ya doo anya.” Ma ọbụna ma ọ bụrụ na mmadụ nile aghọtaghị ya, ihe bụ eziokwu bụ na anyị apụghị ịghọta Bible nanị n’onwe anyị. Enyemaka dị anyị mkpa.

Olee Enyemaka Dịnụ?

N’ime Bible e nwere okwu ndị na-eju anya, ajụjụ ndị na-agbagwoju anya, na okwu ndị na-etigharị anya bụ́ ndị chọrọ ka a kọwaa ha. A pụrụ ịma ụma mee ka ha ghara ido anya, na-eji ihe ntụnyere ndị bara uru bụ́ ndị a na-emeghị ka a ghọta ha n’oge e dere ha. Ma ha metụtara nzube Jehova. Dị ka ihe atụ, Mkpughe 13:18 na-ekwu na “ọnụ ọgụgụ nke anụ ọhịa ahụ” bụ “[narị isii na iri isii na isii].” Ọ bụ ezie na amaokwu ahụ na-ekwu na “n’ebe a ka amamihe dị,” ọ kọwaghị ihe ọnụ ọgụgụ ahụ pụtara. Otú ọ dị, Jehova, site ná nzukọ ya, enyewo ndị ji ịnọgidesi ike na-ejere ya ozi ohere ịghọta ihe ọ pụtara taa. (Lee igbe, “Ụzọ Isi Ghọta Bible.”) Gị onwe gị kwa pụrụ inweta nghọta nke a site n’enyemaka nke ndị nweworo ahụmahụ ‘n’ikwuzi okwu nke eziokwu ahụ.’​—⁠2 Timoti 2:2, 15, 23-⁠25; 4:2-⁠5; Ilu 2:​1-⁠5.

Mgbe ụfọdụ Jisọs jiri ihe atụ gosi nzaghachi ma ọ bụ enweghị nzaghachi n’ozi Alaeze ahụ. O gosiri na ụfọdụ agaghị enwe ọganihu n’ihi ịbụ ndị a kụdara aka site ná mmegide sitere n’aka ndị enyi na ndị ikwu. Ndị ọzọ ga-ekwere ka “mkpagbu ma ọ bụ nsogbu” bibie ekele ha maka ozi Alaeze ahụ. Ndị ọzọkwa ga-ekwere ka ihe ndị a na-eme kwa ụbọchị ná ndụ, “nchegbu nke oge a na aghụghọ nke akụ̀,” kpagbuo ịhụnanya ọ bụla ha pụrụ inwe maka ozi ọma ahụ. N’aka nke ọzọ, e nwere ndị ga-eji obi ụtọ zaghachi ma dị njikere ịnụ okwu ahụ dị oké ọnụ ahịa ma nweta nghọta ya. Ha ‘na-eze ume na-asụkwa ude n’ihi ihe arụ nile a na-eme’ na Krisendọm, ndị a sị na ọ bụ n’aha Jisọs Kraịst. Ọ na-anụ ndị dị otú ahụ ọkụ n’obi ka e zie ha ihe n’ụzọ Jehova, n’ihi ya ka ha ghọta ihe ha na-agụ na Bible.​—⁠Matiu 13:​3-9, 18-⁠23; Ezikiel 9:4; Aịsaịa 2:​2-⁠4.

Nye ndị chọrọ inweta nghọta nke nzube Jehova n’onwe ha, Jehova pụrụ ịhụ na ha nwetara enyemaka dị mkpa. Iji maa atụ, Bible na-akọ na mmụọ Jehova duziri Filip onye na-ekwusa ozi ọma ịga nyere nwoke Etiopia aka bụ́ onye na-atụle akwụkwọ Bible bụ́ Aịsaịa ka o si Jerusalem na-ala. N’ụzọ ụla ya, ọ na-agụ ya n’ụgbọ ịnyịnya ya. N’irubere nduzi mmụọ nsọ Jehova isi, Filip gbara ọsọ n’akụkụ ụgbọ ịnyịnya ahụ ma jụọ, sị: ‘Ị̀ na-aghọta ihe ị na-agụ?’ Nwoke ahụ dị obi umeala nweekwa obi eziokwu ikweta na enyemaka dị ya mkpa. Filip ji obi ụtọ kụziere onye a agụụ ihe ime mmụọ na-agụ na nke kwere izi ihe ihe. Ozizi ihe ahụ nyeere ya aka ịghọta Akwụkwọ Nsọ. Ọ mụtara ihe dị ya mkpa ugbu a ime iji nwee mmekọrịta ihu ọma Jehova iji nweta ndụ ebighị ebi. Ọ ghọrọ onye na-ejere Jehova ozi nke nwere obi ụtọ, nke e mere baptism, onye gbasoro ndụ nke na-atọ Chineke ụtọ.​—⁠Ọrụ 8:​26-⁠39.

Ị pụrụ inwe Bible n’ebe obibi gị, ị pụkwara ịgụwo ya ọtụtụ ugboro. Ma eleghị nnọọ anya i nwewo otu ahụmahụ ahụ dị ka onye Etiopia ahụ nwere obi eziokwu, nke dị obi umeala nwere. Ọ pụghị ịghọta ihe ọ na-agụ. Enyemaka dị ya mkpa, o gbughịkwa oge ịnakwere enyemaka Jehova Chineke ji obi ụtọ nye ya. Dị ka Filip, Ndịàmà Jehova nwere obi ụtọ inyere gị aka ịghọta ihe dị iche iche banyere Chineke bụ́ ndị e dere n’Okwu ya, bụ́ Bible. Ha maara na Jehova wepụtara Bible, burukwa n’uche na e kwesịrị ịghọta ya.​—⁠1 Ndị Kọrint 2:10; Ndị Efesọs 3:18; 2 Pita 3:16.

N’ihi Gịnị Ka Bible Ji Dị Mkpa?

Anyị na-ebi n’oge kasị ngwa n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. Bible na-ezo aka na ya dị ka “ọgwụgwụ oge a.” (Matiu 24:3) Ọtụtụ ihe omume ndị na-ewere ọnọdụ ná mmezu nke amụma Bible kemgbe afọ ahụ bụ́ 1914 na-egosi na n’isi nso ugbu a Alaeze eluigwe nke Chineke ‘ga-etipịa ma mee ka gọọmenti ndị ọzọ nile gwụsịa.’​—⁠Daniel 2:44.

Gụọrọ onwe gị ihe e buru amụma ya na Bible na Matiu isi 24, Mak isi 13, na Luk isi 21. Ị ga-ahụ na ihe omume ndị a kọwara gbasara ụwa nile. Ha gụnyere agha ụwa dị iche iche​—⁠ndị dị iche pụọ n’agha ndị ọzọ nile. Eri Agha Ụwa Mbụ, anyị ahụwo ụkọ nri, ala ọma jijiji, na oge mmebi iwu pụrụ iche, bụ́ ndị e buru amụma ha. Ugbu a kwa mba nile na-achọ ime nzọrọ nke ga-enye ihe mgbaàmà doro anya nke na mbibi ụwa dị nso. Banyere nke a, Pọl onyeozi dere, sị: “Dị ka onye ohi na-abịa n’abalị, otú a ka ụbọchị nke Onyenwe anyị na-abịa. Mgbe ha na-asị, Udo na ntụkwasị obi dị, mgbe ahụ na mberede ka mbibi na-abịakwasị ha, . . . ha agaghị agbanarịkwa ya ma ọlị.” (1 Ndị Tesalọnaịka 5:​2, 3) Olè ndị bụ ndị na-agaghị agbanarị? Pọl na-akọwa, sị: “Ndị na-amataghị Chineke, ha na ndị na-aṅaghị ntị ozi ọma nke Onyenwe anyị Jisọs.” (2 Ndị Tesalọnaịka 1:​7-⁠9) Ndị na-erube isi n’ihe ahụ e nyere n’iwu na Matiu 24:14 ikwusa “ozi ọma nke a nke alaeze . . . n’elu ụwa dum mmadụ bi” gaje imezu akụkụ nke ihe àmà ahụ ọtụtụ ihe mejupụtara.

Ọtụtụ nde Ndịàmà Jehova na-emezu ihe nke a e nyere n’iwu n’ime 231 ala na agwaetiti nke oké osimiri. Ha na-aga n’ụlọ ndị mmadụ jirikwa aka ha na-akpọ ha òkù ịbịa mụta banyere gọọmenti Alaeze Jehova. Ha na-eji obi ọma na-atụpụta ụzọ ime ihe nke onye ọ bụla na-aghaghị ịgbaso iji soro ná ndị nlanarị nke usoro ihe a ma biri ndụ na paradaịs elu ụwa ebe a na-agaghị enwekwa iru újú, ịsụ ude, ahụ mgbu, ma ọ bụ ọnwụ.​—⁠Mkpughe 21:​3, 4.

Oge ji ọsọ na-agwụnarị ụwa ọjọọ nke a, ọ bụkwa ihe dị mkpa nye anyị nile ndị chọrọ ịlanarị ọgwụgwụ ụwa nke a ịmụta ihe a gụnyere ‘n’ịṅa ntị n’ozi ọma ahụ’ wee si otú ahụ gbanarị mbibi. Mgbe ọzọ Ndịàmà Jehova bịara n’ụlọ gị, gịnị ma ị nakwere ọkpụkpọ òkù ahụ inwe ọmụmụ Bible kwa izu? Nke kakwa mma, gịnị ma ị gwa ha ka ha mụọrọ gị Bible n’ihi na ị chọrọ ịghọta ya?

[Igbe dị na peeji nke 8]

ỤZỌ ISI GHỌTA BIBLE

JISỌS kwere anyị nkwa na mgbe ọnwụ na mbilite n’ọnwụ ya gasịrị, ọ gaje iwelite otu “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” nke ga-eje ozi dị ka ụzọ nkwurịta okwu ya. (Matiu 24:​45-⁠47) Pọl onyeozi kọwaara ndị Kraịst bụ́ ndị Efesọs ụzọ a mgbe o dere ka a “mara ọtụtụ okpukpu amamihe Chineke dị iche iche site n’aka nzukọ Ya, dị ka izu nke mgbe nile ebighị ebi si dị nke O zubere n’ime Kraịst anyị, bụ́ Jisọs Onyenwe anyị.” (Ndị Efesọs 3:​10, 11) Ọ bụ nzukọ nke ndị Kraịst e tere mmanụ, nke a mụrụ na Pentikọst 33 O.A., ka e tinyere “ihe nile e kpughere ekpughe” n’aka. (Deuterọnọmi 29:29) Dị ka otu ìgwè, ndị Kraịst e tere mmanụ na-eje ozi dị ka ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche. (Luk 12:​42-⁠44) Ọrụ sitere n’aka Chineke e kenyere ha bụ ime ka e nwee nghọta ime mmụọ nke “ihe nile e kpughere ekpughe.”

Ọbụna dị ka amụma Bible tụrụ aka n’ihu gaa na Mesaịa ahụ, ọ na-adọrọkwa anyị gaa n’ìgwè e jikọtara ọnụ n’ụzọ chiri anya nke Ndịàmà bụ́ ndị Kraịst e tere mmanụ ndị na-eje ozi ugbu a dị ka ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.a Ọ na-enyere anyị aka ịghọta Okwu Chineke. Ndị nile chọrọ ịghọta Bible kwesịrị ịghọta na a pụrụ ịmata “ọtụtụ okpukpu amamihe Chineke dị iche iche” nanị site n’ụzọ nkwurịta okwu nke Jehova nwere, ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.​—⁠Jọn 6:68.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a  Lee Ụlọ Nche, September 1, 1981, peji nke 24-⁠30.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya