Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
Okwu Chineke Na-arụsi Ọrụ Ike
“OKWU Chineke dị ndụ, na-arụsikwa ọrụ ike.” (Ndị Hibru 4:12) Okwu ndị a aghọwo eziokwu ọtụtụ ugboro mgbe e kpughepụrụ eziokwu dị iche iche nke Bible nye ndị mmadụ okpukpe ụgha duhieworo. Dị ka ahụmahụ na-esonụ nke si Dominican Republic na-egosi, ike nke Bible pụrụ ịgbanwe ndụ ndị mmadụ ma nye olileanya.
Ndịàmà Jehova letara otu nwanyị onye Katọlik a ma ama bụ́ onye ụmụntakịrị abụọ ka nwụnahụrụ. Iru újú jupụtara ya n’obi, ọ na-akwakwa ákwá kwa ụbọchị n’ihi ọdachi ya. Ndịàmà ahụ gosiri ya ihe Bible kwuru na Jọn 5:28, 29 banyere olileanya mbilite n’ọnwụ. Mgbe nkwurịta okwu ndị ọzọ nke ya na Ndịàmà gasịrị, ọ bụghị nanị na o nwetara nkasi obi n’olileanya mbilite n’ọnwụ kama ọ ghọtara na ndị ndú okpukpe ya bụ́ ndị Katọlik na-eduhie ya.
O gbughị oge ọ bụla n’itinye akwụkwọ nsepụ aka site na Chọọchị Katọlik, ọ nakwerekwaara ọmụmụ Bible a na-eduzi mgbe nile ya na Ndịàmà Jehova. Otú ọ dị, di ya ekwenyeghị n’echiche ya. Ebe ya onwe ya bụkwa onye Katọlik a ma ama, o mere ndokwa ka ndị enyi a ma ama ná ndọrọ ndọrọ ọchịchị na n’okpukpe bịa leta nwunye ya ná mgbalị iwezụga ya n’ụzọ ya ma kpọghachite ya n’ofufe Katọlik. E mesịa o ji ịgba alụkwaghịm yie ya egwu, n’otu oge ọbụna na-agwa ndị ikwu ya na ndị ya na ha nọ na chọọchị na ha na-aga ịgba alụkwaghịm.
Ma aghụghọ ya arụghị ọrụ. N’ụzọ megidere nke ahụ, nwunye ya kpebisikwuru ike ịga n’ihu n’ọmụmụ Bible ya. N’ihi uto ime mmụọ ya na ya ịzụlite àgwà ọma nke ndị Kraịst, di ya kpebiri ya na ya ịnọgide kama ịchọ ịgba alụkwaghịm. Ọbụna na n’otu ụbọchị o kwere inyocha akwụkwọ Bible ọ na-amụ—ma ọ bụ nanị n’otu ọnọdụ. Ọ chọrọ iji nsụgharị Bible ya nke ndị Katọlik.
Dị ka ihe ịtụnanya nye ya, site n’enyemaka akwụkwọ Ndịàmà Jehova, ọ malitere ịmụta ihe ndị ọhụrụ kpọmkwem site na Bible nke ya. Ọ chọpụtara na nwunye ya ahọrọwo ụzọ nke ziri ezi, n’oge na-adịghịkwa anya ọ dị njikere ịgbaso ihe nlereanya ya. N’ezie, ọ hụrụ mkpa ọ dị ime mgbanwe ná ndụ nke ya. Otu ihe ịma aka siri ike bụ ịkwụsị àgwà ya nke ise siga. Mgbe ọ gụsịrị mbipụta December 8, 1990, nke magazin Teta! nke nwere ihu akwụkwọ e dere “Ọnwụ A Na-ere Ere—Ụzọ Iri E Si Akwụsị Ise Siga,” o kpebisiri ike ịkwụsị àgwà nke a Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị. N’ọnọdụ nke mkpo siga a na-achọtakarịbu n’akpa uwe ya, ọ malitere ibu mbipụta Teta! ahụ. Mgbe ọ bụla o nwere mkpali ise siga, ọ na-agụ isiokwu ndị ahụ banyere ise siga. Ụzọ nke a rụrụ ọrụ! Mgbe ọ gụsịrị isiokwu ndị ahụ ọtụtụ ugboro, o nwere ike ịkwụsị ise siga.
Taa ma di ma nwunye ahụ na-ejere Jehova ozi dị ka ndị ozi e mere baptism. Mgbe ọnọdụ nyere ohere ya, ọ na-eje ozi dị ka onye ozi oge nile, na-etinye ihe ka ukwuu n’oge ya ná nkwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke, ọ na-ejekwa ozi dị ka ohu na-eje ozi n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova ọ nọ na ya. Ya na nwunye ya na-ele anya gaa ná mbilite n’ọnwụ mgbe ha pụrụ ịnabataghachi ụmụ ha ná ndụ n’ime ụwa ọhụrụ. Ee, Okwu Chineke, bụ́ Bible, dị ndụ na-arụsikwa ọrụ ike!