Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 1/15 p. 10-15
  • Ọṅụ Jehova Bụ Ike Anyị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọṅụ Jehova Bụ Ike Anyị
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Na-aṅụrị Nanị Ọṅụ”
  • Mmekọrịta E Nwere n’Ebe Chineke Nọ Site na Kraịst
  • Nnwere Onwe Okpukpe na Nghọta
  • Olileanya Alaeze na Ndụ Agwụghị Agwụ
  • Òtù Ụmụnna A Gọziri Agọzi
  • Ndụ nke Nwere Nzube
  • Ike Na-adịghị Ada Ada
  • Fee Jehova Ofufe n’Ọṅụ nke Obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Nnwere Onwe nke Chineke Nyere Na-eweta Ọṅụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Ọṅụ Bụ Àgwà Chineke Na-eme Ka Anyị Nwee
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Ọṅụ Jehova
    Bụkuo Jehova Abụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 1/15 p. 10-15

Ọṅụ Jehova Bụ Ike Anyị

“Nsọ ka ụbọchị taa dịịrị Onyenwe anyị: ihe ewutekwala unu; n’ihi na ọṅụ Jehova bụ ike unu.”—NEHEMAỊA 8:10.

1, 2. (a) Gịnị bụ ebe dị ike? (b) Olee otú Devid si gosi na ya gbabara n’ime Jehova?

JEHOVA bụ ike na-enweghị atụ. Gịnịkwa bụ ike? Ọ bụ ebe e wusiri ike, ebe ntụkwasị obi ma ọ bụ nlanarị. Devid nke Israel oge ochie lere Chineke anya dị ka ike ya. Dị ka ihe atụ, tụlee abụ nke Devid bụụrụ Onye Kasị Elu “n’ụbọchị Jehova napụtara ya n’ọbụ aka ndị iro ya nile, na n’ọbụ aka Sọl,” eze nke Israel.—Abụ Ọma 18, okwu dị n’elu ya.

2 Devid malitere abụ ahụ na-akpali akpali n’okwu ndị a: “Ana m ahụ Gị n’anya nke ukwuu, Jehova, bụ́ ike m. Jehova bụ nkume m dị elu, na ebe m e wusiri ike, na onye na-eme ka m gbapụ; Ọ bụ Chineke m, na oké nkume m, ana m agbaba n’ime Ya; Ọ bụ ọta m, na mpi nke nzọpụta m, na ụlọ elu m.” (Abụ Ọma 18:1, 2) N’ịbụ onye Eze Sọl napụrụ nchebe nke iwu n’ụzọ na-ezighị ezi ma na-achụgharị, Devid ziri ezi gbabara n’ime Jehova, dị ka mmadụ pụrụ ịgbaba n’ime ebe e wusiri ike iji lanarị ọdachi.

3. N’ihi gịnị ka ndị Juu nke oge Ezra jiri nwee “oké ọṅụ”?

3 Ọṅụ nke Jehova na-enye bụ ike na-adịghị ada ada nye ndị na-ejegharị n’ụzọ ya dị ka ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe. (Ilu 2:6-8; 10:29) Otú ọ dị, iji nwee ọṅụ nke Chineke na-enye, mmadụ aghaghị ime uche Chineke. Banyere nke a, tụlee ihe mere na Jerusalem na 468 T.O.A. Odeakwụkwọ bụ́ Ezra na ndị ọzọ nyere nghọta site n’ịgụ Iwu ahụ n’ụzọ na-eme ka a ghọta ihe ọ pụtara. Mgbe ahụ a gbara ndị mba ahụ ume, sị: “Jeerenụ onwe unu, rie ihe mara abụba, ṅụọ ihe ọṅụṅụ dị ụtọ, were òkè zigara ndị ọ na-adịghị ihe e doziwooro ha: n’ihi na nsọ ka ụbọchị taa dịịrị Onyenwe anyị: ihe ewutekwala unu; n’ihi na ọṅụ Jehova bụ ike unu.” “Oké ọṅụ” dapụtara ka ndị Juu tinyere ihe ọmụma ha nwetaworo n’ọrụ ma mee Ememe Ụlọ Ntu na-eweta ọṅụ. (Nehemaịa 8:1-12) Ndị ahụ nwere ‘ọṅụ nke Jehova dị ka ike ha’ nwetara ume maka ofufe na ozi ya. Ebe ọṅụ Jehova bụ ike ha, anyị kwesịkwara ịtụ anya na ndị Chineke taa ga-enwekwa ọṅụ. Mgbe ahụ, gịnị bụ ụfọdụ ihe ndị na-akpatara ha ọṅụ n’oge ugbu a?

“Na-aṅụrị Nanị Ọṅụ”

4. Gịnị bụ otu isi iyi pụrụ iche nke ọṅụ nye ndị Jehova?

4 Otu ihe pụrụ iche kpatara ọṅụ bụ ndokwa Jehova mere maka izukọ ọnụ. Mgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova na-enye ha ọṅụ taa, dị nnọọ ka ememe kwa afọ ndị Israel na-enwe na-ewetara obi ha ọṅụ. A gwara ndị Israel, sị: “Ụbọchị asaa ka ị ga-emere Jehova, bụ́ Chineke gị, ememe [nke ụlọ ntu] n’ebe ahụ nke Jehova ga-ahọpụta: n’ihi na Jehova, bụ́ Chineke gị, ga-agọzi gị n’ihe omume gị nile, na n’omume nile nke aka gị, ị ga-abụkwa onye na-aṅụrị nanị ọṅụ.” (Deuterọnọmi 16:13-15) Ee, Chineke chọrọ ka ha “na-aṅụrị nanị ọṅụ.” Otú ahụ ka ọ dịkwa ndị Kraịst, n’ihi na Pọl onyeozi gbara ndị kwere ekwe ibe ya ume, sị: “Na-aṅụrịnụ ọṅụ n’Onyenwe anyị mgbe nile: m ga-asị ọzọ, Na-aṅụrịnụ ọṅụ.”—Ndị Filipaị 4:4.

5. (a) Gịnị bụ ọṅụ, oleekwa otú ndị Kraịst si enweta ya? (b) Olee otú anyị pụrụ isi nwee ọṅụ n’agbanyeghị ọnwụnwa?

5 Ebe Jehova chọrọ ka anyị nwee ọṅụ, ọ na-enye anyị ọṅụ dị ka otu n’ime mkpụrụ nke mmụọ nsọ ya. (Ndị Galetia 5:22, 23) Gịnịkwa bụ ọṅụ? Ọ bụ mmetụta uche obi ụtọ nke ihe ọma e nwetara ma ọ bụ na-atụ anya inweta kpatara. Ọṅụ bụ ọnọdụ nke ezi obi ụtọ, ọbụna itegharị egwú ọṅụ. Mkpụrụ nke a nke mmụọ nsọ Chineke na-akwagide anyị n’okpuru ule. “N’ihi ọṅụ e debere n’ihu Ya [Jisọs] na-atachi obi [n’osisi ịta ahụhụ ya, NW], na-elelị ihere anya, O wee nọdụ n’aka nri nke ocheeze Chineke.” (Ndị Hibru 12:2) Onye na-eso ụzọ bụ́ Jemes dere, sị: “Gụọnụ ya n’ọṅụ nile, ụmụnna m, mgbe ọ bụla unu dabara n’ọnwụnwa dị iche iche; ebe unu maara na nnwapụta nke okwukwe unu na-arụpụta ntachi obi.” Ma gịnị ma ọ bụrụ na anyị amaghị ihe anyị ga-eme banyere otu ọnwụnwa? Mgbe ahụ anyị pụrụ iji obi ike kpee ekpere maka amamihe iji mee ihe banyere ya. Ime ihe kwekọrọ n’amamihe si n’eluigwe bịa na-enye ume idozi nsogbu ma ọ bụ ịnagide ọnwụnwa ndị nọgidere na-adị n’atụfughị ọṅụ Jehova.—Jemes 1:2-8.

6. Mmekọrịta dị aṅaa dị n’etiti ọṅụ na ezi ofufe?

6 Ọṅụ Jehova na-enye na-ewusi anyị ike ịkwalite ezi ofufe. Nke ahụ bụ ihe mere n’ụbọchị Nehemaịa na Ezra. Ndị Juu nke oge ahụ bụ́ ndị nwere ọṅụ nke Jehova dị ka ike ha bụ ndị e wusiri ike iwere ọdịmma nke ezi ofufe gaa n’ihu. Ka ha na-akwalitekwa ofufe Jehova, ọṅụ ha mụbara. Otú ahụ ka ọ dịkwa taa. Dị ka ndị na-efe Jehova ofufe, anyị nwere ihe mere anyị ga-eji na-aṅụrị oké ọṅụ. Ugbu a ka anyị tụlee ole na ole ndị ọzọ n’ime ọtụtụ ihe na-akpatara anyị ọṅụ.

Mmekọrịta E Nwere n’Ebe Chineke Nọ Site na Kraịst

7. Banyere Jehova, gịnị ka ndị Kraịst nwere nke mere ha ga-eji na-enwe ọṅụ?

7 Mmekọrịta chiri anya nke anyị na Jehova nwere na-eme anyị ndị kasị enwe obi ụtọ n’elu ala. Tupu anyị aghọọ ndị Kraịst, anyị bụ akụkụ nke òtù ụmụ mmadụ na-eme ajọ omume nke nọ ‘n’ọchịchịrị n’echiche uche ha, e meekwa ka ha bụrụ ndị ala ọzọ n’ebe ndụ nke Chineke dị.’ (Ndị Efesọs 4:18) Lee ka obi si dị anyị ụtọ na anyi abụkwaghị ndị mba ọzọ n’ebe Jehova nọ! Otú ọ dị, ọ na-ewe mgbalị iji nọgide n’ihu ọma ya. Anyị aghaghị ‘ịnọgide n’okwukwe anyị, bụrụ ndị a tọworo ntọala, ndị na-eguzosikwa ike, ndị a na-adịghị ewepụkwa n’olileanya nke ozi ọma ahụ.’ (Ndị Kọlọsi 1:21-23) Anyị pụrụ ịṅụrị ọṅụ na Jehova dọtara anyị n’ebe Ọkpara ya nọ n’ikwekọ n’okwu Jisọs n’onwe ya: “Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịbịakwute m, ọ bụrụ na Nna Nke zitere m adọghị ya.” (Jọn 6:44) Ọ bụrụ na anyị nwere obi ekele maka mmekọrịta dị oké ọnụ ahịa nke anyị na Chineke site na Kraịst n’ezie, anyị ga-ezere ihe ọ bụla pụrụ imebi ya.

8. Olee otú Jisọs siworo tinye ihe n’ọnọdụ ọṅụ anyị?

8 Mgbaghara mmehie site n’inwe okwukwe n’àjà mgbapụta nke Jisọs bụ oké ihe na-akpata ọṅụ n’ihi na nke a bụ ihe na-eme ka mmekọrịta anyị na Chineke kwe omume. Site n’ụzọ mmehie ọ kpachaara anya na-agbaso, nna nna anyị bụ́ Adam wetaara ihe nile a kpọrọ mmadụ ọnwụ. Otú ọ dị, Pọl onyeozi kọwara, sị: “Chineke na-eme ka ịhụnanya nke aka Ya n’ebe anyị nọ pụta ìhè, n’ihi na, mgbe anyị nọ na-abụ ndị mmehie, Kraịst nwụrụ n’ihi anyị.” Pọl dekwara, sị: “Dị ka ikpe ahụ sitere n’otu ndahie bịa ruo mmadụ nile iwetara ha amamikpe; ọbụna otú a ka onyinye amara ahụ sitere n’otu ọrụ ezi omume bịa ruo mmadụ nile ịgụ ha ná ndị ezi omume ka ha nata ndụ. N’ihi na dị ka e doro ọha mmadụ ná ndị mmehie site n’aṅaghị ntị nke otu mmadụ ahụ, ọbụna otú a ka a ga-edo ọha mmadụ ná ndị ezi omume site n’ịṅa ntị nke otu Onye ahụ.” (Ndị Rom 5:8, 18, 19) Lee aha ọṅụ anyị pụrụ inwe na ọ masịrị Jehova Chineke ịgbapụta ụmụ Adam bụ́ ndị ji ụdị ndokwa ahụ eme ihe!

Nnwere Onwe Okpukpe na Nghọta

9. N’ihi gịnị ka anyị ji enwe ọṅụ n’ihe banyere okpukpe?

9 Nnwere onwe pụọ na Babilọn Ukwu ahụ, alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, bụ ihe ọzọ kpatara a ga-eji nwee ọṅụ. Ọ bụ eziokwu Chineke meworo ka anyị pụọ n’ohu. (Jọn 8:32) Nnwere onwe pụọ n’akwụna okpukpe nke a pụtakwara na anyị agaghị ekere òkè ná mmehie ya, nata ihe otiti ya nile, bụrụkwa ndị e bibikọrọ ha na ya. (Mkpughe 18:1-8) O nweghị ihe mwute ọ bụla dị n’ịlanarị ihe ndị ahụ nile!

10. Nghọta dị aṅaa ka anyị na-enweta dị ka ndị Jehova?

10 Ịghọta na itinye Okwu Chineke n’ọrụ ná ndụ bụcha ihe ndị na-akpata oké nṅụrị ọṅụ. N’ịbụ ndị nweere onwe ha pụọ ná mmetụta okpukpe ụgha, anyị na-anụ ụtọ nghọta ime mmụọ na-edowanye anya n’ụzọ na-aga n’ihu nke Nna anyị nke eluigwe na-enye site n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.” (Matiu 24:45-47) N’ime mmadụ nile dị ndụ n’elu ụwa, nanị ndị raara onwe ha nye nanị Jehova nwere mmụọ nsọ ya nakwa nghọta a gọziri agọzi nke Okwu na uche ya. Ọ bụ dị ka Pọl kwuru: “Ọ bụ anyị onwe anyị ka Chineke kpugheere ha [ihe ndị ọ kwadebewooro ndị hụrụ ya n’anya] site n’aka Mmụọ Nsọ: n’ihi na Mmụọ Nsọ na-enyocha ihe nile, ọbụna ihe nile dị omimi nke Chineke.” (1 Ndị Kọrint 2:9, 10) Anyị pụrụ inwe ma obi ekele ma ọṅụ na anyị na-enweta nghọta nọgidere na-aga n’ihu nke e gosiri n’okwu ndị dị n’Ilu 4:18: “Okporo ụzọ ndị ezi omume dị ka ìhè na-enwu enwu, nke na-amụ aga n’ihu n’ihu ruo mgbe chi bọchara.”

Olileanya Alaeze na Ndụ Agwụghị Agwụ

11. Olee otú e siworo soro ndị ọzọ kerịta olileanya Alaeze ahụ na-enye ọṅụ?

11 Olileanya Alaeze anyị na-emekwa ka anyị nwee ọṅụ. (Matiu 6:9, 10) Dị ka Ndịàmà Jehova, o tewo anya anyị kpọsawara na Alaeze Chineke bụ nanị olileanya dịịrị ihe nile a kpọrọ mmadụ. Dị ka ihe atụ, tụlee afọ 1931, mgbe anyị nakweere aha ahụ bụ́ Ndịàmà Jehova site n’otu nkwupụta okwu e ji ọṅụ nakweere na 51 mgbakọ gburugburu ụwa. (Aịsaịa 43:10-12) E bipụtachara ma nkwupụta okwu ahụ ma okwu mgbakọ dị ịrịba ama nke J. F. Rutherford (onye isi oche nke Watch Tower Society mgbe ahụ) kwuru n’akwụkwọ nta bụ́ The Kingdom, the Hope of the World. Ihe ọzọ e denyere na ya bụ nkwupụta okwu e mere ná mgbakọ ahụ, nke katọrọ Krisendọm n’ihi ndapụ n’ezi ofufe ya na ilelị ndụmọdụ Jehova. O kwupụtakwara, sị: “Olileanya nke ụwa bụ Alaeze Chineke, e nweghịkwa olileanya ọzọ dịnụ.” N’ime ọnwa ole na ole, Ndịàmà Jehova kesara ihe karịrị nde ise nke akwụkwọ nta nke a n’akụkụ ụwa nile. Kemgbe ahụ anyị ekwusiwo ike ọtụtụ mgbe na Alaeze ahụ bụ nanị olileanya dịịrị ihe a kpọrọ mmadụ.

12. Olileanya ndụ na-enye ọṅụ dị aṅaa ka e setịpụworo n’ihu ndị na-ejere Jehova ozi?

12 Anyị na-aṅụrịkwa ọṅụ n’olileanya nke ndụ agwụghị agwụ n’okpuru ịchịisi Alaeze. “Ìgwè atụrụ nta” nke ndị Kraịst ahụ e tere mmanụ nwere olileanya nke eluigwe na-enye ọṅụ. “Onye a gọziri agọzi ka Ọ bụ, bụ́ Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst,” ka Pita onyeozi dere, “dị ka oké ebere Ya si dị, ka anyị wee nwee olileanya dị ndụ, site ná mbilite ahụ nke Jisọs Kraịst si ná ndị nwụrụ anwụ bilite, ka anyị wee keta nketa nke a na-apụghị imebi, nke a na-adịghị emerụkwa emerụ, nke na-adịghị atalatakwa, nke e debeworo n’eluigwe nye unu.” (Luk 12:32; 1 Pita 1:3, 4) Taa, ihe ka nnọọ n’ọnụ ọgụgụ nke Ndịàmà Jehova na-atụ anya ndụ ebighị ebi na Paradaịs n’ebe Alaeze ahụ ga-achị. (Luk 23:43; Jọn 17:3) O nweghị ndị ọzọ n’elu ụwa nwere ihe ọ bụla a ga-atụnyere olileanya ndị na-enye ọṅụ anyị nwere. Anyị kwesịrị iwere ha n’ihe dị oké ọnụ ahịa!

Òtù Ụmụnna A Gọziri Agọzi

13. Olee otú anyị kwesịrị isi ele òtù ụmụnna anyị nke mba nile anya?

13 Ịbụ akụkụ nke nanị òtù ụmụnna nke mba nile Chineke kwadoro bụkwa isi iyi nke oké ọṅụ. Dị ka ihe obi ụtọ, anyị nwere ndị enyi kasị mma n’elu ụwa. Jehova Chineke n’onwe ya tụrụ aka n’oge anyị, wee sị: “M ga-emekwa ka mba nile mee mkpatụ, ihe a na-achọsi ike nke mba nile ga-abịakwa, M ga-emejukwa ụlọ a n’ebube.” (Hagaị 2:7) N’eziokwu, ndị Kraịst nile bụ ndị na-ezughị okè. Otú ọ dị, Jehova adọtawo ndị dị otú ahụ n’ebe ya onwe ya nọ site na Jisọs Kraịst. (Jọn 14:6) Ebe ọ bụ na Jehova adọtawo ndị o lere anya dị ka ndị a na-achọsi ike n’ebe ya onwe ya nọ, ọṅụ anyị ga-ejupụta ma ọ bụrụ na anyị egosi ha ịhụnanya ụmụnna, were ha kpọrọ oké ihe, soro ha rụkọọ ọrụ n’ihe omume dị iche iche nke Chineke, na-akwado ha n’ọnwụnwa ha nile, na-ekpekwara ha ekpere.

14. Agbamume dị aṅaa ka anyị pụrụ inweta site na 1 Pita 5:5-11?

14 Ihe a nile ga-etinye ihe n’ọṅụ anyị. N’ezie, ọ bụ ọṅụ Jehova bụ ike nke òtù ụmụnna ime mmụọ anyị gbaa ụwa gburugburu. Ee, anyị nile na-enweta mkpagbu na ihe isi ike ndị ọzọ. Ma nke a kwesịrị ịdọkọta anyị ọnụ ma nye anyị mmetụta nke ịdị n’otu dị ka akụkụ nke otu ezi nzukọ nke Chineke n’elu ụwa. Dị ka Pita kwuru, anyị kwesịrị iweda onwe anyị ala n’okpuru aka dị ike nke Chineke, na-atụkwasị ya nchegbu anyị nile n’ịmara na ọ na-eche banyere anyị. Ọ dị anyị mkpa ịmụrụ anya n’ihi na Ekwensu na-achọ ilomi anyị, ma na nke a anyị anọghị nanị anyị, n’ihi na Pita kwukwasịrị: “Na-eguzogidenụ ya, n’ihi na unu dị ike n’okwukwe unu, ebe unu matara na a na-emezu otu ahụhụ ahụ n’ahụ ndị bụ òtù ụmụnna unu ndị nọ n’ụwa.” Òtù ụmụnna nke mba nile nke a nwere ọṅụ adịghịkwa mgbe ọ ga-adakpọsị, n’ihi na anyị nwere obi ike na ‘mgbe anyị hụworo ahụhụ nwa oge, Chineke ga-eme ka anyị zuo okè, meekwa ka anyị guzosie ike, meekwa ka anyị dị ike.’ (1 Pita 5:5-11) Chebadịrị ya echiche. Òtù ụmụnna anyị nwere ọṅụ ga-adị ruo mgbe ebighị ebi!

Ndụ nke Nwere Nzube

15. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na Ndịàmà Jehova nwere ndụ nke nwere nzube?

15 Ọṅụ bụ nke anyị n’ụwa nsogbu nke a n’ihi na anyị nwere ndụ nke nwere nzube. E nyere anyị ozi nke na-eme anyị na ndị ọzọ obi ụtọ n’aka idebe. (Ndị Rom 10:10) N’ezie ọ bụ ihe ùgwù na-enye ọṅụ ịbụ ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ. N’akụkụ nke a, Pọl kwuru, sị: “Gịnịkwa bụ Apọlọs? gịnị bụkwa Pọl? Ndị na-eje ozi, ndị unu si n’aka ha kwere; dị ka Onyenwe anyị nyekwara ha abụọ n’otu n’otu. Mụ onwe m kụrụ osisi, Apọlọs kwọsara ya mmiri; ma ọ bụ Chineke na-eme ka ọ na-aba ụba. Ya mere onye na-akụ abụghị ihe ọ bụla, onye na-akwọsa mmiri abụghị ihe ọ bụla; kama Chineke, Onye na-eme ka ọ na-aba ụba, bụ ihe nile. Ma onye na-akụ na onye na-akwọsa mmiri bụ otu: ma ha abụọ n’otu n’otu ga-anata ụgwọ ọrụ nke aka ha, onye ọ bụla dị ka ndọgbu ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ si dị. N’ihi na anyị bụ ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ: unu bụ ubi Chineke, bụrụkwa ụlọ Chineke na-ewu.”—1 Ndị Kọrint 3:5-9.

16, 17. Ihe atụ ndị dị aṅaa ka a pụrụ ihota iji nwapụta na ndị Jehova nwere ndụ ọṅụ nke nzube?

16 A pụrụ ihota ọtụtụ ihe atụ iji gosi na ijere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi na-eweta ndụ nke nwere nzube nke na-eme ka anyị jupụta n’ọṅụ. Otu ihe atụ ha bụ okwu a: “Elegharịrị m anya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke jupụtara na mmadụ [n’ụbọchị ihe omume nraranye ya], apụkwara m ịhụ ndị òtù ezinụlọ m asatọ nọ ebe ahụ, tinyere mụ na nwunye m na atọ n’ime ụmụ m na ndị òtù ọlụlụ ha. . . . Mụ na nwunye m n’ezie enwewo ndụ obi ụtọ, nke nwere nzube n’ije ozi Chineke.”

17 Ọ bụkwa ihe obi ụtọ ịmata na n’afọ ndụ ọ bụla mmadụ pụrụ ịmalite ndụ ọṅụ nke nwere ezi nzube n’ije ozi Jehova. Dị ka ihe atụ, otu inyom mụtara eziokwu Bible n’ebe a na-elekọta ndị agadi ka e mere baptism dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova n’afọ ndụ nke 102. O si otú a jiri nzube na-enye ọṅụ weta ndụ ya ná njedebe, ‘na-atụ egwu ezi Chineke ahụ, debekwa ihe nile o nyere n’iwu.’—Eklisiastis 12:13.

Ike Na-adịghị Ada Ada

18. Gịnị ka a pụrụ ime iji merie ịda mbà n’obi na iji mụbaa ọṅụ anyị?

18 Ọṅụ Jehova bụ ike na-adịghị ada ada nye ndị na-ekwesị ntụkwasị obi. Ma, inwe ọṅụ nke a apụtaghị na ọ dịghị mgbe anyị ga-enwe hour ndị dị mwute dị ka ndị ahụ kpaliri Jisọs ikwu na Getsemane, sị: “Ọ na-ewute mkpụrụ obi m nke ukwuu, ruo ọnwụ.” (Mak 14:32-34) Ka e weredị ya na ịda mbà n’obi si n’anyị ịdaba ná nchụso nke ọdịmma onwe onye nanị pụta. Mgbe ahụ ka anyị gbanwee ụzọ ndụ anyị. Ọ bụrụ na ọṅụ anyị adalatawo n’ihi na anyị bu ibu arọ nke ibu ọrụ Akwụkwọ Nsọ kwadoro n’ụzọ ọdịmma onwe onye nanị na-adịghị ya, eleghị anya anyị pụrụ ime nhazigharị ndị ga-ewepụ nrụgide ma weghachi mmụọ ọṅụ anyị. Ọzọkwa, Jehova ga-eji ọṅụ gọzie anyị ma ọ bụrụ na anyị achọọ ime ihe na-atọ ya ụtọ site n’iguzogide anụ ahụ na-eme mmehie, ụwa ajọ omume, na Ekwensu n’ụzọ siri ike.—Ndị Galetia 5:24; 6:14; Jemes 4:7.

19. Olee otú anyị kwesịrị isi ele ihe ùgwù ọ bụla anyị nwere n’ime nzukọ Chineke anya?

19 N’ihi ihe ndị anyị tụleworo, nakwa ọtụtụ ndị ọzọ, anyị nwere oké ọṅụ. Ma ànyị bụ ndị nkwusa ọgbakọ ma ọ bụ na-ekere òkè n’ụdị ụfọdụ nke ije ozi oge nile, anyị nile pụrụ ịrụbiga ọrụ Onyenwe anyị ókè, nke a aghaghịkwa itinye ihe n’ọṅụ anyị. (1 Ndị Kọrint 15:58) N’agbanyeghị ihe ùgwù ọ bụla anyị nwere ná nzukọ Jehova, ka anyị nwee ekele maka ha ma jiri ọṅụ gaa n’ihu na-eje ozi dị nsọ nye Chineke anyị nke obi ụtọ, nke na-ahụ n’anya.—1 Timoti 1:11.

20. Gịnị bụ ihe ùgwù anyị kasị ukwuu, gịnịkwa ka anyị pụrụ ijide n’aka?

20 Anyị na-enwe ọṅụ karịsịa n’ihi ihe ùgwù anyị nke ịza aha ukwu Jehova dị ka Ndịàmà ya. Ee, anyị bụ ndị na-ezughị okè ma na-eche ọtụtụ ọnwụnwa ihu, ma ka anyị buru n’uche ngọzi anyị ndị dị ebube dị ka Ndịàmà Jehova. Chetakwa, ezi Nna anyị nke eluigwe agaghị emechu anyị ihu ma ọlị. Anyị pụrụ ijide n’aka na a ga-agọzi anyị mgbe nile ma ọ bụrụ na ọṅụ Jehova bụ ike anyị.

Olee Otú Ị Ga-esi Zaghachi?

◻ Gịnị bụ “ọṅụ Jehova”?

◻ Olee otú ndị Kraịst si enweta ezi ọṅụ?

◻ Gịnị bụ ihe ụfọdụ mere Ndịàmà Jehova na-eji enwe ọṅụ?

◻ N’ihi gịnị ka ọṅụ Jehova jiri bụrụ ike na-adịghị ada ada?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya