Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 1/15 p. 21-23
  • Ọ̀ Dịwo Onye Ị Gbara Ume na Nso Nso A?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọ̀ Dịwo Onye Ị Gbara Ume na Nso Nso A?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee Ihe Agbamume Gụnyere?
  • Ha Nyere Agbamume
  • Jiri Ohere Nile Nye Agbamume
  • Ònye Nwere Mkpa Agbamume?
  • Na-agba Ume
  • “Na-agbanụ Ibe Unu Ume Kwa Ụbọchị”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Ṅomie Jehova Bụ́ Chineke nke Na-agba Ndị Ya Ume
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Na-agbarịtanụ Ibe Unu Ume, Karịchaa Ugbu A
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Nkasi Obi Na Agbamume—Ihe Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa Nke Nwere Ọtụtụ Akụkụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 1/15 p. 21-23

Ọ̀ Dịwo Onye Ị Gbara Ume na Nso Nso A?

ELENA dị nanị afọ 17 mgbe ndị dọkịta chọpụtara na o nwere ọrịa cancer n’akụkụ na-emepụta àkwá. Nne ya, bụ́ Mari, aghaghị ịnagide nhụjuanya nke ịhụ Elena ka ọ nọ n’oké ihe mgbu.

Otú ọ dị, a kpọgara Elena n’otu ụlọ ọgwụ dị na Madrid, Spain, 1,900 kilomita site n’ụlọ ya dị na Canary Islands. Na Madrid otu ìgwè ndị dọkịta dị njikere ịwa ahụ n’ejighị ọbara. (Ọrụ 15:28, 29) Ma n’oge na-adịghị anya a malitere ịwa ahụ ahụ, o doro anya na ọnọdụ Elena ga-egbu ya. Ọrịa cancer ahụ agbasazuworị n’ahụ ya dum, ndị dọkịta na-awa ahụ apụghị ime ihe ọ bụla. Elena nwụrụ mgbe ụbọchị asatọ o rutesịrị Madrid gasịrị.

Ọ dịghị mkpa na Mari ga-eche oké nhụjuanya dị otú ahụ ihu nanị ya. Ná mmefu ego nke ha, ndị Kraịst abụọ bụ okenye sonyeere ya na nwa ya nwoke kasị mee okenye gaa Madrid ma nọgide n’ebe ahụ ruo n’ọnwụ Elena. “Ha nyeere m aka ịnagide oké ịtọgbọ chakoo ahụ m nwere n’ime onwe m,” ka Mari na-akọwa. “Ọ dịghị mgbe m ga-echefu agbamume ha nyere m. Nkwado ime mmụọ na enyemaka ha dị irè dị oké ọnụ ahịa. Ha bụ n’ezie ‘ebe izonarị ifufe.’”—Aịsaịa 32:1, 2.

Obi na-adị Jehova ụtọ na ndị ọzụzụ atụrụ na-ahụ n’anya dị ka ndị a na-elekọta atụrụ ya n’ụzọ dị nro. (Ilu 19:17; 1 Pita 5:2-4) Otú ọ dị, inye agbamume abụghị ihe ùgwù nke nanị ndị okenye. Ndị Kraịst nile na-ezukọta n’otu iji nara izi ihe ime mmụọ na iji “na-adụsi ndị ọzọ ọdụ ike.” (Ndị Hibru 10:24, 25) Agbamume bụ otu akụkụ dị mkpa nke mkpakọrịta ndị Kraịst.

Olee Ihe Agbamume Gụnyere?

Dị nnọọ ka okooko osisi mara mma si na-ehulata mgbe ọ na-enweghị mmiri, otú a ka ndị mmadụ n’otu n’otu—ma n’ime ezinụlọ ma n’ime ọgbakọ—pụrụ ịda mbà site n’ụkọ nke agbamume. N’aka nke ọzọ, agbamume bịara n’oge ya pụrụ ịgba ndị na-eche ọnwụnwa ihu, wulite mmụọ nke ndị dara mbà elu, ma nyekwuo ndị na-ejere Chineke ozi n’ikwesị ntụkwasị obi ike.

Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “agbamume” na-agụnye echiche nke ngụgụ, ịdụ ọdụ, na nkasi obi. Ya mere, agbamume ejedebeghị nanị n’ịgwa mmadụ na ọ na-eme nke ọma. Ọ pụkwara ịgụnye enyemaka dị irè na enyemaka ime mmụọ.

N’ezie, okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “agbamume” pụtara n’ụzọ nkịtị “òkù ịbịa ịnọrọ n’akụkụ mmadụ.” Isoro ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ime mmụọ anyị na-emekọ ihe ọnụ na-enyere anyị aka inye nkwado ozugbo ma ọ bụrụ na otu onye n’ime ha adaa mbà ma ọ bụ sụọ ngọngọ. (Eklisiastis 4:9, 10) N’ụzọ na-akpali mmasị, ndị Jehova ‘na-efe ya ofufe n’otu ùbú.’ (Zefanaịa 3:9) Pọl onyeozi kpọkwara otu onye Kraịst “onye e kekọtaworo mụ na gị n’ezie n’ọrụ.” (Ndị Filipaị 4:3) Ịrụkọ ọrụ ọnụ dị ka ndị e kekọtara ọnụ site n’ije ozi n’otu ùbú na-eme ka ibu ahụ dịtụ mfe, karịsịa nye ndị na-esighị ike n’ime mmụọ.—Tụlee Matiu 11:29.

Ha Nyere Agbamume

Ebe ọ bụ na agbamume dị oké mkpa, ka anyị tụlee ụfọdụ ihe atụ Akwụkwọ Nsọ maka ya. Mgbe onye amụma Chineke bụ́ Mosis na-eru nso ọgwụgwụ nke ndụ ya, Jehova nyere Joshua ọrụ ịbụ onye ndú nke ndị Israel. Nke a abụghị ọrụ dị mfe, dị ka Mosis n’onwe ya maara nke ọma. (Ọnụ Ọgụgụ 11:14, 15) Ya mere, Jehova gwara Mosis ka o ‘nye Joshua iwu, meekwa ya ka ọ dị ike, gbaakwa ya ume.’—Deuterọnọmi 3:28.

N’oge ndị ikpe Israel, nwa nwanyị Jefta n’afọ ofufo kwenyere ná nkwa nna ya site n’ịhapụ ohere nke inwe ezinụlọ iji jee ozi n’ụlọ nsọ Jehova. È lefuuru àjà ya anya? Ee e, n’ihi na Ndị Ikpe 11:40 na-asị: “Ụmụ ndị inyom Israel na-eje kwa afọ ịkọ akụkọ nwa nwanyị Jefta onye Gilead ụbọchị anọ n’afọ.” Ụdị nleta dị otú ahụ aghaghị ịbụ nnọọ ihe ịgba ume nye nwa nwanyị Jefta ji onwe ya chụọ àjà.

Inye agbamume mgbe ụfọdụ na-achọ obi ike. N’oge ime njem ozi ala ọzọ mbụ nke Pọl onyeozi, o zutere mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ n’obodo dị iche iche nke Asia Minor. A chụpụrụ ya n’Antiọk, o ji ntakịrị ihe lanarị ogbugbu n’Aịkoniọm, a tụkwara ya nkume na Listra ma hapụ ya na-eche na ọ nwụwo. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya ka nke ahụ gasịrị, Pọl na ndị ibe ya laghachiri n’obodo ndị a, “na-eme ka mkpụrụ obi ndị na-eso ụzọ Jisọs guzosie ike, na-arịọ ha ka ha nọgide n’okwukwe anyị, na-egosikwa na anyị aghaghị isite n’ọtụtụ mkpagbu baa n’alaeze Chineke.” (Ọrụ 14:21, 22) Pọl dị njikere itinye ndụ ya n’ihe ize ndụ iji gbaa ndị ọhụrụ a na-eso ụzọ ume.

Ma, ọ bụghị nanị ndị ọhụrụ na-eso ụzọ bụ ndị Kraịst nwere mkpa agbamume. Mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, Pọl mere njem tara akpụ gaa Rom, ebe a ga-anọ kpee ya ikpe. Ka ọ na-erute ebe ọ na-eje, ọ pụrụ ịbụ na o nwetụrụ nkụda obi. Ma mgbe o rutere otu ebe dị 74 kilomita n’akụkụ ndịda ọwụwa anyanwụ nke Rom, mmụọ ya sighachiri ike. N’ihi gịnị? N’ihi na ụmụnna si Rom abịawo izute ya n’Ahịa Apịọs na Ụlọ Ndị Ije Atọ. “Mgbe Pọl hụrụ ha, o kelee Chineke, nweekwa obi ike.” (Ọrụ 28:15) N’ọnọdụ ndị yiri nke ahụ, nanị ọnụnọ anyị nọ ya pụrụ ịbụ nnọọ ihe agbamume nye ndị kwere ekwe ibe anyị.

Jiri Ohere Nile Nye Agbamume

N’ezie, e nwere ọtụtụ ohere dịnụ iji nye agbamume. Okwu onye mmụta dị mma nke nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị kwuru n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke ò nyere gị obi ụtọ? Ì nwere ọṅụ na e nwere ndị nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu siri ike n’ime mmụọ n’ọgbakọ? Ntachi obi nke ndị meworo agadi ọ̀ kpaliwo gị? Ì nwere mmasị n’ụzọ otu onye n’ime ndị ọsụ ụzọ siri jiri Bible mee ihe n’ozi ụlọ n’ụlọ? Mgbe ahụ nye ịja mma, ma kwuo ihe na-agba ume.

Agbamume na-arụ ọrụ dị oké mkpa n’ime ezinụlọ dịkwa ka ọ dị n’ọgbakọ. Ọ pụrụ inyere ndị nne na nna aka ịzụlite ụmụ ha “n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.” (Ndị Efesọs 6:4) Ịgwa nwatakịrị na o mewo nke ọma, na ikwu ihe kpatara ya, pụrụ ịbụ nnọọ ihe ịgba ume! N’afọ ndụ agbata iri na atọ na iri na itoolu, mgbe ndị na-eto eto na-eche ọnwụnwa na nrụgide dị iche iche ihu, inyechi agbamume anya dị mkpa.

Ụkọ nke agbamume n’oge a dị na nwata pụrụ ịbụ nnọọ ihe mbibi. Taa Michael, onye Kraịst bụ́ okenye, nwere omume enyi, ma ọ na-asị: “Ọ dịtụghị otu mgbe nna m sịrị na m metara ihe ọ bụla. Ya mere etolitere m n’enweghị ùgwù onwe onye. . . . Ọ bụ ezie na adị m 50 afọ ugbu a, m ka na-enwe mmasị ná mmesi obi ike nke ndị enyi m na m na-arụ ọrụ dị mma dị ka okenye. . . . Ahụmahụ onwe m akụziworo m mkpa ọ dị inye ndị ọzọ agbamume, m na-agbalịsikwa ike inye ya.”

Ònye Nwere Mkpa Agbamume?

Ndị Kraịst bụ ndị okenye na-arụsi ọrụ ike kwesịrị ịnata agbamume. Pọl dere, sị: “Anyị na-ekpere unu, ụmụnna anyị, ka unu mata ndị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ n’etiti unu, ndị bụkwa ndị isi unu n’ime Onyenwe anyị, ndị na-adụkwa unu ọdụ; ka unu werekwa ịhụnanya sọpụrụ ha gabiga ókè nke ukwuu hie nne n’ihi ọrụ ha.” (1 Ndị Tesalọnaịka 5:12, 13) Ọ dị mfe ịghara iji ịrụsi ọrụ ike nke ndị okenye kpọrọ ihe. Ma okwu ezi obi ekele na agbamume pụrụ ime ka ibu ha yie ihe dịtụ mfe.

Ndị nọ n’etiti anyị bụ́ ndị na-atachi obi n’ọnọdụ ndị siri oké ike nwekwara mkpa agbamume. “Na-agụgụnụ ndị dara mbà n’obi, na-enyerenụ ndị na-adịghị ike aka.” (1 Ndị Tesalọnaịka 5:14) Ndị nne ma ọ bụ nna ọ bụ nanị ha, ndị inyom di ha nwụrụ, ndị nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu, ndị agadi, na ndị ahụ na-esichaghị ike so ná ndị pụrụ inwe mmetụta ịda mbà ma ọ bụ adịghị ike ime mmụọ site n’oge ruo n’oge.

María bụ onye Kraịst nke chọtara onwe ya na mberede ịbụ onye di ya gbahapụrụ. Ọ sịrị: “Dị ka Job, m na-achọ ịnwụ mgbe ụfọdụ. [Job 14:13] Ma anwụghị m, n’ihi agbamume m nwetara. Ndị okenye abụọ, ndị m maara nnọọ nke ọma, tinyere ọtụtụ hour n’inyere m aka ịhụ uru ọ bara ịnọgide n’ozi oge nile. Ụmụnna nwanyị abụọ nwere nghọta kasikwara m obi, jirikwa ndidi na-ege ntị ka m na-ekwupụta ihe dị m n’obi. Site n’iji Bible mee ihe, ha nyeere m aka ile ihe anya site n’ụzọ Jehova si ele ihe anya. Amaghị m ugbo ole anyị gụrụ Abụ Ọma 55:22, ma amaara m na site n’itinye akụkụ akwụkwọ nsọ nke a n’ọrụ, ejiri m nke nta nke nta nwetaghachi nguzo ime mmụọ na nke mmetụta uche m. Ihe a nile mere n’afọ 12 gara aga, enwekwara m ọṅụ ikwu na anọgidewo m n’ozi oge nile ruo ugbu a. Ndụ m na-enyeghachi ụgwọ ọrụ na obi ụtọ n’agbanyeghị mmetụta uche na-egbu mgbu mgbe ụfọdụ. Ekwetara m na agbamume n’oge dị otú ahụ pụrụ ime ka e nwee nnukwu ọdịiche ná ndụ mmadụ.”

Ụfọdụ nwere mkpa agbamume n’ihi na ha emehiewo ihe ma ugbu a na-agbalị imezi ha. Ma eleghị anya ha anatawo ịdọ aka ná ntị ịhụnanya. (Ilu 27:6) Ndị okenye nyere ịdọ aka ná ntị ahụ pụrụ ịdị njikere inye ịja mma mgbe ha hụrụ na a na-etinye ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ n’ọrụ. Okwu agbamume ha ga-aba uru abụọ—imesi ịhụnanya ha ike maka onye ahụ mehiere emehie nke na ọ gaghị ‘enwebiga mwute ókè’ na ichetara ya uru dị iche iche nke itinye ndụmọdụ ahụ n’ọrụ.—2 Ndị Kọrint 2:7, 8.

Otu onye okenye mere mmehie dị oké njọ ma tụfuo ihe ùgwù nke nlekọta n’ime ọgbakọ. “Mgbe a mara ọkwa banyere mwepụ m dị ka onye okenye, echere m na ụmụnna ga-enwe mgbakasị ahụ ná mkpakọrịta m,” ka o kwuru. “Otú o sina dị, ndị okenye jigidere okwu ahụ dị ka ihe nzuzo ma gbalịsie ike inye m agbamume. Ndị ọzọ n’ọgbakọ gosikwara otu ụdị ịhụnanya ahụ na mkpakọrịta, nke kwalitere mgbake ime mmụọ m n’ezie.”

Na-agba Ume

Ná ndụ anyị nke iji ọrụ n’aka, ọ dị mfe ileghara agbamume anya. Ma lee nnọọ ihe dị oké mma ọ pụrụ ịrụzu! Iji nye agbamume dị irè, ị ghaghị iburu ihe abụọ n’uche. Nke mbụ, chee echiche banyere ihe ị ga-ekwu, ka agbamume gị wee kwụrụ chịm. Nke abụọ, chọpụta ohere dịnụ ịgwa onye kwesịrị ịja mma okwu ma ọ bụ onye ọ dị mkpa ka e wulie ya elu.

Ka ị na-emekarị nke a, ị ga-enwekwu obi ụtọ. E kwuwerị, Jisọs na-emesi anyị obi ike, sị: “Ọ dị ngọzi inye ihe karịa ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) Site n’inye ndị ọzọ agbamume, ị ga-agba onwe gị ume. Gịnị ma i mee ya ihe mgbaru ọsọ gị inye otu onye agbamume kwa ụbọchị?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya