Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 1/15 p. 29-31
  • Ọ Nakweere Nduzi Chineke

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọ Nakweere Nduzi Chineke
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nwoke Ezi Omume Nwere Nsogbu Dị Iche Iche
  • Mmadụ Mmụọ Na-achị
  • Olileanya Dịịrị Josef
  • O Chebere Ezinụlọ Ya, Gbooro Ha Mkpa Ha ma Rubere Chineke Isi Ruo Ọnwụ
    Ṅomie Okwukwe Ha
  • O Chebere Ezinụlọ Ya, Gbooro Ha Mkpa Ha, Rubekwara Chineke Isi Ruo Ọnwụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Meri Dị Ime ma Ọ Lụbeghị Di
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Ịmụta Ihe Site n’Ezinụlọ Jizọs n’Ụwa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 1/15 p. 29-31

Ọ Nakweere Nduzi Chineke

KA A sị na a kpọnyere gị nwa zuru okè ka i lekọta, a tụọkwa anya ka ị zụlite ya nke ọma. Lee nnọọ ihe ịma aka ọ bụ! Olee otú mmadụ ọ bụla na-ezughị okè pụrụ isi mee nke ahụ? Nanị site n’ịnara nduzi Chineke na itinye ya n’ọrụ ná ndụ kwa ụbọchị.

Nke ahụ bụ kpọmkwem ihe Josef mere, bụ́ nna kuchiri Jisọs. N’ụzọ dị iche pụọ n’akụkọ ifo ndị dị n’akwụkwọ apọkrịfa dị iche iche banyere Josef, Bible ekwughị ihe dị ukwuu banyere òkè dị umeala n’obi o keere ná mmalite ndụ Jisọs. Anyị maara na Josef na nwunye ya, Meri, zụlitere Jisọs, ụmụ ndị ikom anọ ndị ọzọ, na ndị inyom kwa.—Mak 6:3.

Josef bụ nwa Eze Devid nke Israel site n’eriri Solomọn. Ọ bụ nwa nwoke nke Jekọb na ọgọ nwoke nke Hili. (Matiu 1:16; Luk 3:23) Dị ka onye ọkwa nkà n’ime obodo ukwu bụ́ Nazaret dị na Galili, Josef na-akpata ego dị nta. (Matiu 13:55; Luk 2:4, 24; tụlee Levitikọs 12:8.) Ma ọ bara ọgaranya n’ime mmụọ. (Ilu 10:22) Nke a bụ n’ihi na ọ nakweere nduzi Chineke n’ezie.

N’enweghị ihe ịrụ ụka, Josef bụ onye Juu dị umeala n’obi onye nwere okwukwe na Chineke ma nwee ọchịchọ ime ihe ziri ezi. Ihe ndekọ ndụ ya ole na ole dị n’ime Akwụkwọ Nsọ na-egosi na o rubere isi n’iwu Jehova mgbe dum. Nke a dị otú ahụ ma ndị a hà dị n’ime Iwu ahụ ma ọ bụ ndị Josef natara kpọmkwem site n’aka ndị mmụọ ozi.

Nwoke Ezi Omume Nwere Nsogbu Dị Iche Iche

Gịnị ka onye nke Chineke ga-eme mgbe o chere nsogbu tara akpụ ihu? Leenụ, o kwesịrị ‘ịtụkwasị Jehova ibu ya’ ma gbasoo nduzi Chineke! (Abụ Ọma 55:22) Nke ahụ bụ ihe Josef mere. Ebe o kwererịị Meri nkwa ọlụlụ, “mgbe ha a ka edinakọtaghị a hụrụ na ọ dị ime site na Mmụọ Nsọ.” N’ihi na Josef “bụ onye ezi omume, ma ọ chọghị igosi ya n’ihu ọha, o zubere ịhapụ ya na nzuzo.” Mgbe Josef chebasịịrị okwu ndị ahụ echiche, mmụọ ozi Jehova bịakwutere ya ná nrọ ma kwuo, sị: “Josef, nwa Devid, atụla egwu ikuru nwunye gị Meri: n’ihi na Ihe Nke ọ dị ime Ya sitere n’aka Mmụọ Nsọ. Ọ ga-amụpụtakwa Nwa nwoke; ị ga-akpọkwa aha Ya Jisọs; n’ihi na Ya onwe ya ga-azọpụta ndị nke Ya ná mmehie nile ha.” Ka o si n’ụra teta, Josef wee “mee dị ka mmụọ ozi nke Onyenwe anyị nyere ya iwu, wee kuru nwunye ya; ọ maghịkwa ya ruo mgbe ọ mụpụtara Nwa nwoke: o wee kpọọ aha Ya Jisọs.” (Matiu 1:18-25) Josef nakweere nduzi Chineke.

Ọgọstọs Siza nyere iwu na mmadụ nile ga-edebanye aha ha n’akwụkwọ n’obodo ha. Ná nrubeisi, Josef na Meri gara Betlehem nke Judia. N’ebe ahụ ka Meri mụrụ Jisọs ma dinawa ya n’ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri n’ihi na e nweghị ụlọ ọzọ dịnụ. N’abalị ahụ ndị ọzụzụ atụrụ ndị nụrụ ịma ọkwa nke mmụọ ozi banyere ọmụmụ nwa nke a pụrụ iche bịara ịhụ nwa ọhụrụ ahụ. Mgbe ihe dị ka 40 ụbọchị gasịrị, Josef na Meri rubere isi n’Iwu ahụ site n’ikubata Jisọs n’ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem na-eji ihe ịchụ àjà. Ọ tụrụ ha abụọ n’anya ka ha nụrụ okwu amụma nke Simeọn meworo agadi banyere ihe ndị dị ukwuu Jisọs ga-eme.—Luk 2:1-33; tụlee Levitikọs 12:2-4, 6-8.

Ọ bụ ezie na Luk 2:39 pụrụ iyi ka ọ na-egosi na Josef na Meri gara Nazaret ozugbo ha kubatasịrị Jisọs n’ụlọ nsọ ahụ, ihe odide nke a bụ akụkụ nke ihe ndekọ e mere ka ọ dị mkpirikpi. Ọ dị ka oge ụfọdụ mgbe nkubata ahụ na Jerusalem gasịrị, ndị na-agụ kpakpando si n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa (ndị Magus) letara Meri na Jisọs n’ime ụlọ dị na Betlehem. Mgbochi sitere n’aka Chineke mere ka nleta nke a ghara iwetara Jisọs ọnwụ. Mgbe ndị Magus ahụ lasịrị, mmụọ ozi Jehova bịakwutere Josef ná nrọ ma gwa ya, sị: “Herọd gaje ịchọ Nwatakịrị ahụ ka ọ laa Ya n’iyi.” Dị ka ọ na-emekarị, Josef ṅara ntị ná nduzi Chineke ma kpọrọ ezinụlọ ya gaa Ijipt.—Matiu 2:1-14

Ka ọnwụ Herọd gasịrị, otu mmụọ ozi bịakwutere Josef ná nrọ n’Ijipt, na-asị: “Bilie, kuru Nwatakịrị ahụ na nne Ya, gaa ala Israel.” N’ịnụ na Akeleọs bụ́ nwa Herọd na-achị n’ọnọdụ nna ya, egwu tụrụ Josef ịlaghachi Judia. N’ịṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị Chineke nyere ná nrọ, ọ gara n’ókèala nke Galili ma biri n’obodo ukwu bụ Nazaret.—Matiu 2:15-23.

Mmadụ Mmụọ Na-achị

Josef hụrụ na ezinụlọ ya rubere isi n’iwu Chineke ma na-eriju afọ n’ụzọ ime mmụọ. Kwa afọ ọ na-akpọrọ ezinụlọ ya dum gaa Ememe Ngabiga na Jerusalem. N’otu n’ime ememe ndị a, Josef na Meri na-alaghachi Nazaret, ha agawokwa njem otu ụbọchị site Jerusalem mgbe ha chọpụtara na Jisọs dị afọ 12 na-efu efu. N’ịlaghachi na Jerusalem, ha chọsiri ya ike ma mesịa chọta ya n’ụlọ nsọ ahụ, ebe ọ na-ege ntị ma na-ajụkwa ndị nkụzi ajụjụ.—Luk 2:41-50.

O yiri ka Josef o kwere ka nwunye ya bute ụzọ n’ime ihe ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, mgbe ha laghachitere Jerusalem ma chọta Jisọs n’ime ụlọ nsọ ahụ, ọ bụ Meri bụ onye gwara nwa ya nwoke na-eto eto okwu banyere okwu ahụ. (Luk 2:48, 49) Ka ọ na-etolite dị ka “Nwa onye ọkà,” Jisọs natara ọzụzụ ime mmụọ. Josef kụzikwaara ya ọrụ ịkwa nkà, n’ihi na a kpọrọ Jisọs “onye ọkà ahụ, nwa Meri.” (Matiu 13:55; Mak 6:3) Ndị nne na nna bụ́ ndị na-atụ egwu Chineke taa kwesịrị iji ohere nile dị otú ahụ kụziere ụmụ ha ihe, karịsịa na-enye ha ọzụzụ ime mmụọ.—Ndị Efesọs 6:4; 2 Timoti 1:5; 3:14-16.

Olileanya Dịịrị Josef

Akwụkwọ Nsọ ekwughị ihe ọ bụla banyere ọnwụ Josef. Ma ọ bụ ihe kwesịrị ịrịba ama na Mak 6:3 kpọrọ Jisọs “nwa Meri,” ọ bụghị nwa Josef. Nke a na-egosi na Josef anwụworị mgbe ahụ. Ọzọkwa, ọ bụrụ na Josef dịgidere ndụ ruo 33 O.A., ọ gaghị eyi ihe kwesịrị ekwesị Jisọs ahụ a kpọgidere n’elu osisi inyefe Meri ná nlekọta anya nke Jọn onyeozi.—Jọn 19:26, 27.

Mgbe ahụ, Josef ga-eso ná ndị ga-anụ olu Nwa nke mmadụ ma bịa ná mbilite n’ọnwụ. (Jọn 5:28, 29) Ịmụ banyere ndokwa Jehova maka ndụ ebighị ebi, ihe ịrụ ụka adịghị ya na Josef ga-eji obi ụtọ jiri ya mee ihe ma bụrụ onye ga-eji nrubeisi doo onwe ya n’okpuru Eze eluigwe ukwu ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst, ọbụna dị ka ọ ṅara ntị ná nduzi Chineke n’ihe karịrị 1,900 afọ gara aga.

[Foto dị na peeji nke 31]

Josef nyere Jisọs ntụziaka ime mmụọ ma kụzikwaara ya ọrụ ịkwa nkà

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya