Okpukpe Gị Ọ̀ Bụ Ụgbọ Nke Ọ Na-adịghị Mgbe A Ga-agbahapụ Ya?
OTU ụgbọ mmiri nọ n’etiti oké ajọ ifufe. Ndị ọrụ ya, bụ́ ndị na-agbasi mgba ike ịzọpụta ụgbọ ha, na-eche otu mkpebi dị ike ihu: ịnọgide n’ime ụgbọ mmiri ahụ ma ọ bụ ịgbahapụ ya ma zọọ isi ha. Ị̀ maara na e ji ihe omume nke a na-atụ ụjọ eme ihe dị ka ihe atụ nkà mmụta okpukpe?
Ndị ọkà mmụta okpukpe, karịsịa ndị mmụta Katọlik, na-ejikarị chọọchị ha atụnyere ụgbọ mmiri nke na-agabiga oké ifufe. Ha na-asị na ụgbọ mmiri nke a, nke nwere Jisọs ma ọ bụ Pita n’isi ụgbọ, na-anọchite anya ụzọ e nwere nanị ya maka nzọpụta. Nguzo ndị ndú okpukpe bụ, ‘Agbahapụla ụgbọ mmiri ahụ mgbe ọ bụla. Chọọchị a agabigawo oge ndị siri ike na mbụ, ma ọ bụ ụgbọ mmiri nke gabigaworo oké ajọ ifufe nile nke akụkọ ihe mere eme.’ Ụfọdụ na-asị, ‘N’ihi gịnị ka a ga-eji gbahapụ ya? Olee nhọrọ ndị ọzọ e nwere? N’ihi gịnị ka a na-agaghị eji nọgide ma nye aka ịnyara ya gaa ná mmiri ndị dị jụụ karị?’
N’ikwekọ n’ọnọdụ ihe atụ nke a, ọtụtụ mmadụ, ndị nọ n’ụdị okpukpe nile, na-eche sị, ‘Amaara m na okpukpe m ezighị ezi n’ọtụtụ ihe, ma enwere m olileanya na ọ ga-agbanwe. Achọghị m ịgbahapụ ya. Aga m achọ ikere òkè n’inyere ya aka imeri ihe isi ike ya dị iche iche.’ Echiche dị otú a pụrụ ịbụ nke ịhụnanya sitere n’ezi obi maka okpukpe ndị nna nna mmadụ ma ọ bụ ọbụna egwu nke “ịrara ya nye” kpaliri.
Otu ihe atụ bụ Hans Küng, ọkà mmụta okpukpe ndị Katọlik na-adịghị ekwenyere ndị ọzọ, bụ́ onye a maara nke ọma, onye chere n’uche ya sị: “M̀ kwesịrị ịgbahapụ ụgbọ epeepe ahụ n’oge oké ifufe, na-ahapụ ndị mụ na ha mekọworo njem mmiri ruo ugbu a iche ifufe ahụ ihu, ịkwọpụsị mmiri, na ma eleghị anya ịlụ ọgụ maka nlanarị?” Ọ zara, sị: “M gaghị ahapụ ịdị irè m n’ime chọọchị.” Nhọrọ ọzọ ga-abụ “ikewapụ site na chọọchị a, n’ihi ngọnarị ya, maka ịhụnanya maka ụkpụrụ ndị ka elu, na ma eleghị anya, iji bụrụkwuo ezigbo ndị Kraịst.”—Die Hoffnung bewahren.
Ma mmadụ ọ̀ pụrụ ịnọgide n’ụgbọ epeepe nke chọọchị ya n’olileanya nke na Chineke, n’ebere ya, ga-enye okpukpe nile ogologo oge a na-akparaghị ókè iji mee ndozigharị ihe? Nke ahụ bụ ajụjụ siri ike. Dị ka e gosiri n’ihe atụ ahụ, iji ọsọ hapụ ụgbọ mmiri nọ n’ihe ize ndụ site n’ịgbaba n’ụgbọ epeepe nta e ji azọ ndụ bụ́ ndị na-adịghị enye nchebe dị ize ndụ dị ka ịnọgide n’ụgbọ mmiri nke na-ekpu ekpu. Ọ̀ bụ ihe amamihe ịnọgide n’otu chọọchị n’agbanyeghị ihe ọ ga-efu, ihe ọ sọrọ ọnọdụ ya ya bụrụ? Olee olileanya ndozigharị nke okpukpe ndị e nwere taa na-enye? Ruo ogologo oge hà aṅaa ka Chineke ga-enye ha ohere ịrụ ọrụ megide uche ya?
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]
Chesnot/Sipa Press