Oké Ìgwè Mmadụ nke Ndị Na-efe Ezi Ofufe—Olee Ebe Ha Si Bịa?
“Lee, oké ìgwè mmadụ, . . . ndị si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile, pụta, na-eguzo n’ihu ocheeze ahụ na n’ihu Nwa atụrụ ahụ.”—MKPUGHE 7:9.
1. N’ihi gịnị ka ọhụụ amụma ndị dị ná Mkpughe ji bụrụ ihe na-akpali mmasị nke ukwuu nye anyị taa?
MGBE ọ na-aga ná ngwụsị nke narị afọ mbụ O.A., Jọn onyeozi hụrụ ọhụụ nke ihe omume ndị dị ịtụnanya metụtara nzube Jehova. Ụfọdụ n’ime ihe ndị ọ hụrụ n’ọhụụ na-emezu ugbu a kpọmkwem. Ndị ọzọ ka ga-emezu n’ọdịnihu dị nso. Ihe ndị a nile gbara gburugburu mmezu dị ịtụnanya nke nzube dị ebube nke Jehova ido aha ya nsọ n’ihu ihe nile e kere eke. (Ezikiel 38:23; Mkpughe 4:11; 5:13) Ọzọ, ha metụtara olileanya ndụ nke onye ọ bụla n’ime anyị. Olee ụzọ o si dị otú a?
2. (a) Gịnị ka Jọn onyeozi hụrụ n’ọhụụ ya nke anọ? (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa banyere ọhụụ nke a ka anyị gaje ịtụle?
2 Ná nke anọ n’usoro ọhụụ nke Mkpughe, Jọn hụrụ ndị mmụọ ozi na-ejide ifufe nke mbibi ruo mgbe a ga-akasị “ndị ohu Chineke anyị” akara n’egedege ihu ha. Mgbe ahụ o wee hụ ihe omume kasị akpali mmasị—“oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile, pụta,” na-adị n’otu n’ife Jehova na ịsọpụrụ Ọkpara ya. A gwara Jọn na ndị a bụ ndị ga-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta. (Mkpughe 7:1-17) Òle ndị bụ ndị ahụ a kọwara dị ka “ndị ohu Chineke anyị”? Òle ndị kwa ga-emejupụta “oké ìgwè mmadụ” ahụ lanarịrị mkpagbu? Ị̀ ga-abụ otu n’ime ha?
Òle Ndị Bụ “Ndị Ohu Chineke Anyị”?
3. (a) Na Jọn 10:1-18, olee otú Jisọs si mee ihe atụ mmekọrịta nke ya na ndị na-eso ụzọ ya? (b) Gịnị ka Jisọs mere ka o kwee atụrụ ya omume site n’ọnwụ ịchụ àjà ya?
3 Ihe dị ka ọnwa anọ tupu ọnwụ ya, Jisọs kwuru banyere onwe ya dị ka “onye ọzụzụ atụrụ ọma ahụ” nakwa ndị na-eso ụzọ ya dị ka “atụrụ” ọ ga-eji n’ihi ha tọgbọ ndụ ya. N’ụzọ pụrụ iche o kwuru okwu banyere atụrụ nke ọ hụrụ n’ime ogige atụrụ ihe atụ, mesịakwa nye ha nlekọta pụrụ iche. (Jọn 10:1-18)a N’ụzọ ịhụnanya, Jisọs tọgbọrọ ndụ ya n’ezie n’ihi atụrụ ya, na-enye ụgwọ mgbapụta dị mkpa iji mee ka ha pụọ n’ohu nke mmehie na ọnwụ.
4. Òle ndị bụ́ ndị mbụ a chịkọtara dị ka atụrụ n’ikwekọ n’ihe Jisọs kwuru n’ebe a?
4 Otú ọ dị, tupu ya emee nke ahụ, Jisọs dị ka Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ chịkọtara ndị na-eso ụzọ ya n’onwe ya. Jọn Baptist, bụ́ “onye ọnụ ụzọ” nke ihe atụ Jisọs mere ka ọ mara ndị mbụ. Jisọs na-achọ ndị ga-azaghachi n’ohere ahụ nke ịbụ akụkụ nke ‘mkpụrụ Abraham’ ahụ ọtụtụ ndị mejupụtara. (Jenesis 22:18; Ndị Galetia 3:16, 29) Ọ kụnyere ekele maka Alaeze nke eluigwe n’ime obi ha, o mesikwara ha obi ike na ya na-aga ịkwadebere ha ọnọdụ n’ụlọ Nna ya nke eluigwe. (Matiu 13:44-46; Jọn 14:2, 3) N’ụzọ kwekọrọ ekwekọ o kwuru, sị: “Site n’ụbọchị Jọn Baptist ruo ugbu a alaeze eluigwe bụ ihe mgbaru ọsọ ndị mmadụ na-achụso, ndị na-achụsokwa ya na-enweta ya.” (Matiu 11:12, NW) Ndị a sooro ya iji nweta ihe mgbaru ọsọ ahụ nwapụtara ịnọ n’ime ogige atụrụ ahụ nke Jisọs kwuru maka ya.
5. (a) Òle ndị bụ “ndị ohu Chineke anyị” e hotara ná Mkpughe 7:3-8? (b) Gịnị na-egosi na ọtụtụ ndị ọzọ ga-esonyere ndị Israel ime mmụọ n’ofufe?
5 Ná Mkpughe 7:3-8, a na-akpọkwa ndị nwere ihe ịga nke ọma n’ịchụso ihe mgbaru ọsọ eluigwe ahụ “ndị ohu Chineke anyị.” (Lee 1 Pita 2:9, 16.) Ndị ahụ dị 144,000 a kpọtụrụ aha n’ebe ahụ hà bụ nanị ndị Juu anụ ahụ? Ndị ahụ nọ n’ime ogige atụrụ ihe atụ nke ilu Jisọs hà bụ nanị ndị Juu? Ọ dịghị ma ọlị; ha bụ ndị so n’Israel ime mmụọ nke Chineke, ha nile na-esonyere Kraịst ná mkpụrụ ime mmụọ nke Abraham. (Ndị Galetia 3:28, 29; 6:16; Mkpughe 14:1, 3) Otú ọ dị, oge ga-emesịa bịa, mgbe a ga-emeju ọnụ ọgụgụ ahụ a kara akara. Gịnị emezie? Dị ka Bible buru n’amụma, ndị ọzọ—oké ìgwè mmadụ n’ime ha—ga-esonyere ndị Israel ime mmụọ ndị a n’ife Jehova ofufe.—Zekaraịa 8:23.
“Atụrụ Ọzọ” ahụ—Hà Bụ Ndị Kraịst Bụ́ Ndị Jentaịl?
6. N’ihe omume dị aṅaa ka Jọn 10:16 rụrụ aka?
6 Mgbe ọ kpọtụsịrị otu ogige atụrụ aha na Jọn 10:7-15, Jisọs webatara ìgwè ọzọ n’ihe omume ahụ, na-asị: “Atụrụ ọzọ ka M nwekwara, ndị na-esiteghị n’ogige atụrụ nke a; aghaghị m idutekwa ndị ahụ, ha ga-anụkwa olu m; otu ìgwè atụrụ ga-adịkwa, otu Onye ọzụzụ atụrụ.” (Jọn 10:16) Òle ndị bụ “atụrụ ọzọ” ndị ahụ?
7, 8. (a) N’ihi gịnị ka echiche ahụ bụ́ na atụrụ ọzọ ahụ bụ ndị Kraịst bụ́ ndị Jentaịl ji dabere n’echiche na-ezighị ezi? (b) Eziokwu ndị dị aṅaa banyere nzube Chineke maka elu ụwa kwesịrị imetụta nghọta anyị nke ndị atụrụ ọzọ ahụ bụ?
7 Ndị Krisendọm na-akọwa okwu n’ozuzu ha nwere echiche nke na atụrụ ọzọ ndị a bụ ndị Kraịst bụ́ ndị Jentaịl nakwa na ndị ahụ nọ n’ogige atụrụ ahụ a rụtụrụ aka na mbụ bụ ndị Juu, ndị nọ n’okpuru ọgbụgba ndụ Iwu ahụ, nakwa na ìgwè abụọ a na-agacha eluigwe. Ma a mụrụ Jisọs ịbụ onye Juu, ọ nọkwa n’okpuru ọgbụgba ndụ Iwu ahụ site n’ọmụmụ. (Ndị Galetia 4:4) Ọzọ, ndị ahụ lere atụrụ ọzọ ahụ anya dị ka ndị Kraịst bụ́ ndị Jentaịl a ga-eji ndụ eluigwe kwụghachi ụgwọ adịghị echebara otu akụkụ dị mkpa nke nzube Chineke echiche. Mgbe Jehova kere ndị mmadụ mbụ ma tinye ha n’ogige Iden, o mere ka o doo anya na nzube ya bụ ka a mụjupụta ụwa, ka akụkụ ya nile bụrụ paradaịs, nakwa ka ụmụ mmadụ na-elekọta ya bie ndụ ebighị ebi—nanị ma ọ bụrụ na ha ga-akwanyere Onye Okike ha ùgwù ma rubere ya isi.—Jenesis 1:26-28; 2:15-17; Aịsaịa 45:18.
8 Mgbe Adam mehiere, e mebighị nzube Jehova. N’ụzọ ịhụnanya, Chineke mere ndokwa ka ụmụ Adam nwee ohere ịnụ ụtọ ihe Adam jụworo inwe ekele maka ya. Jehova buru amụma na ya ga-ewelite onye nzọpụta, mkpụrụ, onye a ga-esi n’aka ya gọzie mba nile. (Jenesis 3:15; 22:18) Nkwa ahụ apụtaghị na a ga-akpọrọ ndị ọma nile nọ n’elu ụwa gaa eluigwe. Jisọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ikpe ekpere, sị: “Ka alaeze Gị bịa. Ka e mee ihe Ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.” (Matiu 6:9, 10) Oge na-adịghị anya tupu ya ekwuo ihe atụ ahụ e dekọrọ na Jọn 10:1-16, Jisọs agwaworị ndị na-eso ụzọ ya na ọ bụ nanị “ìgwè atụrụ nta” ka ọ dị Nna ya ezi mma inye Alaeze eluigwe. (Luk 12:32, 33) Ya mere mgbe anyị gụrụ ihe atụ Jisọs banyere onwe ya dị ka Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ bụ́ onye na-atọgbọ ndụ ya n’ihi atụrụ ya, ọ ga-abụ ihie ụzọ ịgụpụ n’okwu ahụ ihe ka n’ọnụ ọgụgụ bụ́ ndị Jisọs webatara n’okpuru nlekọta ịhụnanya ya, ndị ghọrọ ndị nọ n’elu ala ebe Alaeze eluigwe ya ga-achị.—Jọn 3:16.
9. Laa azụ na 1884, gịnị ka Ndị Mmụta Bible ahụ ghọtara ịbụ atụrụ ọzọ ahụ?
9 Laa azụ na 1884, Ụlọ Nche matara atụrụ ọzọ ahụ ịbụ ndị a ga-enye ohere ibi ndụ n’elu ala nke a n’okpuru ọnọdụ ndị ga-emezu nzube mbụ nke Chineke. Ndị Mmụta Bible oge mbụ ahụ ghọtara na ụfọdụ n’ime atụrụ ọzọ ndị a ga-abụ ndị dịworo ndụ ma nwụọ tupu ozi elu ala nke Jisọs. Otú ọ dị, e nwere ụmụ irighiri ihe ndị ha na-aghọtaghị nke ọma. Dị ka ihe atụ, ha chere na nchịkọta nke atụrụ ọzọ ahụ ga-ewere ọnọdụ mgbe ndị nile e tere mmadụ natasịworo ụgwọ eluigwe ha. Ma, ha ghọtara kpọmkwem na atụrụ ọzọ ahụ abụghị nanị ndị Kraịst bụ́ ndị Jentaịl. Ohere nke ịghọ otu onye n’ime atụrụ ọzọ ahụ dịịrị ma ndị Juu ma ndị Jentaịl, nye ndị nke mba na agbụrụ nile.—Tụlee Ọrụ Ndị Ozi 10:34, 35.
10. Ka anyị wee bụrụ ndị Jisọs lere anya n’ezie dị ka atụrụ ọzọ ya, gịnị ga-abụrịrị eziokwu banyere anyị?
10 Iji kwekọọ ná nkọwa ahụ Jisọs nyere, atụrụ ọzọ ahụ aghaghị ịbụ ndị, n’agbanyeghị agbụrụ ma ọ bụ ebo ha si bịa, matara Jisọs Kraịst dị ka Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ. Gịnị ka nke ahụ gụnyere? Ha aghaghị igosipụta umeala n’obi ma dị njikere ịbụ ndị a ga-edu edu, nke bụ àgwà ndị e ji mara atụrụ. (Abụ Ọma 37:11) Dị ka ọ bụ eziokwu n’ebe ìgwè atụrụ nta ahụ nọ, ha aghaghị ‘ịma olu [onye ọzụzụ atụrụ ọma ahụ]’ ma ghara ikwe ka ndị ọzọ ga-achọ inwe mmetụta n’ebe ha nọ dufuo ha. (Jọn 10:4; 2 Jọn 9, 10) Ha aghaghị ịghọta ịdị mkpa nke ihe Jisọs mere n’ịtọgbọ ndụ ya n’ihi atụrụ ya ma nwee okwukwe zuru ezu ná ndokwa ahụ. (Ọrụ 4:12) Ha aghaghị ‘ịnụ’ olu nke Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ mgbe ọ gbara ha ume ijere nanị Jehova ozi dị nsọ, ịnọgide buru ụzọ na-achọ Alaeze ahụ, ịnọgide na-adị iche n’ebe ụwa dị, na igosirịta ibe ha ịhụnanya nke ịchụ onwe onye n’àjà. (Matiu 4:10; 6:31-33; Jọn 15:12, 13, 19) Ì kwekọrọ ná nkọwa ahụ nke ndị Jisọs lere anya dị ka atụrụ ọzọ ya? Ị̀ chọrọ ikwekọ? Lee aha mmekọrịta dị oké ọnụ ahịa meghepụụrụ ndị nile ghọrọ n’ezie atụrụ ọzọ nke Jisọs!
Nkwanye Ùgwù Maka Ike Alaeze
11. (a) N’ihe ịrịba àmà nke ọnụnọ ya, gịnị ka Jisọs kwuru banyere ụmụ atụrụ na ụmụ ewu? (b) Òle ndị bụ ụmụnna ahụ Jisọs zoro aka na ha?
11 Ọtụtụ ọnwa ka o nyesịrị ihe atụ ahụ dị n’elu, Jisọs nọkwa ọzọ na Jerusalem. Mgbe ọ na-anọdụ n’elu Ugwu Olive na-eleda anya n’ebe ụlọ nsọ ahụ, o nyere ndị na-eso ụzọ ya ihe ọmụma zuru ezu nke ‘ihe àmà nke ọnụnọ ya na nke ọgwụgwụ nke usoro ihe a nile.’ (Matiu 24:3) O kwukwara ọzọ banyere nchịkọta nke atụrụ. Tinyere ihe ndị ọzọ, o kwuru, sị: “Mgbe ọ bụla Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube Ya, Ya na ndị mmụọ ozi nile, mgbe ahụ ka Ọ ga-anọkwasị n’ocheeze nke ebube Ya: ma n’ihu Ya ka a ga-eme ka mba nile zukọọ: Ọ ga-ekewapụtakwa ha, otu n’ahụ ibe ya, dị ka onye na-azụ atụrụ na-ekewapụta atụrụ n’ụmụ ewu: Ọ ga-edebekwa atụrụ n’aka nri Ya, ma ụmụ ewu n’aka ekpe.” N’ilu nke a, Jisọs gosiri na a ga-ekpe ndị Eze ahụ si otú a lebara anya ikpe dabere n’otú ha si mesoo “ụmụnna” ya omume. (Matiu 25:31-46) Òle ndị bụ ụmụnna ndị a? Ha bụ ndị Kraịst e ji mmụọ mụta bụ́ ndị si otú a bụrụ “ụmụ Chineke.” Jisọs bụ Ọkpara Chineke bu ụzọ mụọ. N’ihi ya, ha bụ ụmụnna Kraịst. Ha bụ “ndị ohu Chineke anyị” ahụ a kpọtụrụ aha ná Mkpughe 7:3, ndị ahụ a họpụtara site n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ isoro Kraịst ketakọọ Alaeze eluigwe ya.—Ndị Rom 8:14-17.
12. N’ihi gịnị ka ụzọ ndị mmadụ si na-emeso ụmụnna Kraịst omume ji dịrị oké mkpa?
12 Ụzọ ụmụ mmadụ ndị ọzọ na-esi emeso ndị nketa nke a nke Alaeze ahụ omume dị oké mkpa. Ị̀ na-ele ha anya dị ka Jisọs Kraịst si na-ele ha nakwa dị ka Jehova si na-ele ha? (Matiu 24:45-47; 2 Ndị Tesalọnaịka 2:13) Àgwà mmadụ n’ebe ndị a e tere mmanụ nọ na-egosi àgwà ya n’ebe Jisọs Kraịst n’onwe ya nọ nakwa n’ebe Nna ya, bụ́ Ọkaaka Eluigwe na Ala nọ.—Matiu 10:40; 25:34-46.
13. Ruo n’ókè ha aṅaa ka Ndị Mmụta Bible ahụ na 1884 ghọtara ilu nke ụmụ atụrụ na ụmụ ewu ahụ?
13 Ná mbipụta ya nke August 1884, Ụlọ Nche rụtụrụ aka n’ụzọ ziri ezi na “atụrụ” ahụ dị n’ilu a bụ ndị ga-esetịpụwororị onwe ha olileanya nke ndụ zuru okè n’elu ala. A ghọtakwara na ilu ahụ aghaghị inwe mmezu mgbe Kraịst na-achị site n’ocheeze eluigwe ya dị ebube. Ma, n’oge ahụ ha aghọtaghị n’ụzọ doro anya mgbe ọ ga-amalite ọrụ nkewa ahụ a kọwara ebe ahụ ma ọ bụ ogologo oge ọ ga-ewe.
14. Olee otú okwu ihu ọha nke mgbakọ na 1923 si nyere Ndị Mmụta Bible ahụ aka ịghọta mgbe ilu amụma Jisọs ga-emezu?
14 Otú ọ dị, na 1923, n’okwu ihu ọha mgbakọ, J. F. Rutherford, bụ́ onye isi oche nke Watch Tower Society n’oge ahụ, mere ka oge maka mmezu nke ilu nke atụrụ na ewu ahụ doo anya. N’ihi gịnị? N’otu akụkụ, n’ihi na ilu ahụ gosiri na ụmụnna Eze ahụ—ma ọ dịghị ihe ọzọ ụfọdụ n’ime ha—ka ga-anọ n’ụwa. N’etiti ụmụ mmadụ, nanị ndị na-eso ụzọ ya e ji mmụọ nsọ mụọ ka a pụrụ n’ezie ịkpọ ụmụnna ya. (Ndị Hibru 2:10-12) Ndị a agaghị anọ n’ụwa ruo mgbe Narị Afọ Iri ahụ gwụsịrị, na-enye ohere ka ndị mmadụ meere ha ihe ọma n’ụzọ ndị ahụ Jisọs kọwara.—Mkpughe 20:6.
15. (a) Ihe omume ndị dị aṅaa nyeere Ndị Mmụta Bible ahụ aka ịmata atụrụ nke ilu Jisọs n’ụzọ ziri ezi? (b) Olee otú atụrụ ahụ siworo nye ihe àmà nke obi ekele ha maka Alaeze ahụ?
15 N’okwu ihu ọha ahụ na 1923, e mere mgbalị ịmata ndị ahụ kwekọrọ ná nkọwa Onyenwe anyị banyere ụmụ atụrụ na ụmụ ewu ahụ, ma ọ dị mkpa ka a ghọta okwu ndị ọzọ tupu isi ihe nke ilu ahụ apụta ìhè. N’afọ ndị na-esonụ, Jehova mere ka ndị ohu ya mara irighiri ihe ndị a dị mkpa n’ụzọ na-aga n’ihu. Ndị a gụnyere ịghọta n’ụzọ doro anya, na 1927, na “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” bụ òtù nke ndị Kraịst nile e ji mmụọ nsọ tee mmanụ nọ n’elu ụwa; na-aghọtakwa, na 1932, mkpa ọ dị ịdịnyere ndị ohu Jehova e tere mmanụ n’atụghị egwu, dị ka Jonadab dịnyeere Jihu. (Matiu 24:45; 2 Ndị Eze 10:15) N’oge ahụ, ná ndabere nke Mkpughe 22:17, a gbara ndị a yiri atụrụ ume kpọmkwem ikere òkè n’iwere ozi Alaeze ahụ gakwuru ndị ọzọ. Obi ekele ha maka Alaeze Mesaịa ahụ ga-akpali ha ọ bụghị nanị inye ndị e tere mmanụ nke Onyenwe anyị nlekọta obi ọma kama ịrara ndụ ha nye Jehova site na Kraịst na isonyere ndị ya e tere mmanụ n’ụzọ chiri anya, jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekere òkè n’ọrụ nke ha na-arụ. Ị̀ na-eme nke ahụ? Nye ndị na-eme otú ahụ, Eze ahụ ga-asị: “Bịanụ, ndị a gọziri agọzi nke Nna m, ketanụ alaeze e doziwooro unu site ná ntọala nke ụwa.” Ha ga-enwe olileanya dị ebube nke ndụ ebighị ebi n’izu okè n’elu ụwa ebe Alaeze ahụ ga-achị.—Matiu 25:34, 46.
“Oké Ìgwè Mmadụ” ahụ—Olee Ebe Ha Na-aga?
16. (a) Nghọtahie ndị dị aṅaa ka Ndị Mmụta Bible mbụ ahụ nwere banyere ndị bụ́ oké ìgwè mmadụ nke Mkpughe 7:9? (b) Òle mgbe ka a gbanwere echiche ha, ná ndabere dịkwa aṅaa?
16 Ruo oge ụfọdụ ndị ohu Jehova kweere na oké ìgwè mmadụ nke Mkpughe 7:9, 10 dị iche n’atụrụ ọzọ ahụ nke Jọn 10:16 na atụrụ nke Matiu 25:33. N’ihi na Bible sịrị na ha “na-eguzo n’ihu ocheeze ahụ,” e chere na ha ga-anọ n’eluigwe, ọ bụghị n’elu ocheeze, soro Kraịst na-achị dị ka ndị nketakọ, kama n’ebe na-abụghị ọkwá mbụ n’ihu ocheeze ahụ. E lere ha anya dị ka ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi dị nta karị, ndị na-egosighị mmụọ nke ezi ịchụ onwe onye n’àjà. Na 1935 a gbaziri echiche ahụ.b Nnyocha nke Mkpughe 7:9 ma a tụlekọọ ya na akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị ka Matiu 25:31, 32, mere ka o doo anya na ndị nọ n’elu ụwa ebe a pụrụ ịnọ “n’ihu ocheeze ahụ.” Ọzọ a rụtụrụ aka na Chineke enweghị ụkpụrụ abụọ nke ikwesị ntụkwasị obi. Ndị nile ga-enweta nnwapụta ya aghaghị ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe nye ya.—Matiu 22:37, 38; Luk 16:10.
17, 18. (a) Gịnị kpatara oké mmụba, kemgbe 1935, n’ọnụ ọgụgụ nke ndị na-atụ anya ndụ ebighị ebi n’elu ụwa? (b) N’ọrụ dị aṅaa dị mkpa ka ndị nke oké ìgwè mmadụ ahụ na-eji ịnụ ọkụ n’obi na-ekere òkè na ya?
17 Ruo ọtụtụ afọ ndị Jehova ekwuwo okwu banyere nkwa nile nke Chineke metụta ụwa. N’ihi ihe ha tụrụ anya na ọ ga-eme laa azụ n’afọ ndị 1920, ha kpọsara na “Ọtụtụ Nde Ndị Dị Ndụ Ugbu A Agaghị Anwụ Ma Ọlị.” Ma e nweghị ọtụtụ nde ndị nakweere ndokwa Chineke maka ndụ n’oge ahụ. N’ime ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị nakweere eziokwu ahụ, mmụọ nsọ kpaliri olileanya nke ndụ eluigwe. Otú ọ dị, karịsịa mgbe afọ 1935 gasịrị, mgbanwe dị ịrịba ama weere ọnọdụ. Ọ bụghị na Ụlọ Nche elegharawo olileanya nke ndụ ebighị ebi n’elu ụwa anya. Ruo ọtụtụ iri afọ, ndị ohu Jehova ekwuwo banyere nke a ma na-atụ anya maka ndị kwekọrọ ná nkọwa Bible ahụ. Otú ọ dị, n’oge Jehova, o mere ihe iji hụ na ndị a gosipụtara onwe ha.
18 Ihe ndekọ e nwere na-egosi na ruo ọtụtụ afọ ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị bịara Ememe Ncheta keere òkè n’ihe nnọchianya ndị ahụ. Ma n’ime 25 afọ mgbe 1935 gasịrị, ọnụ ọgụgụ bịara Ememe Ncheta nke ọnwụ Kraịst a na-eme kwa afọ rịrị elu nke ukwuu ruo ọnụ ọgụgụ ji otu narị okpukpu karịa ndị ahụ na-ekere òkè. Òle ndị bụ ndị ọzọ ndị a? Ndị ga-emesịa bụrụ ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ. N’ụzọ doro anya, oge Jehova abịawo ịchịkọta ha na ịkwadebe ha maka ịlanarị oké mkpagbu ahụ dị nnọọ n’ihu. Dị ka e buru ya n’amụma, ha esiwo “ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile, pụta.” (Mkpughe 7:9) Ha ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekere òkè n’ọrụ ahụ nke Jisọs buru amụma ya mgbe o kwuru, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.”—Matiu 24:14.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Maka ntụle sara mbara, nke dị ọhụrụ banyere ogige atụrụ ndị ahụ nke Jọn isi nke 10, lee Ụlọ Nche, August 15, 1984, peji nke 10-20, 31.
b Ụlọ Nche (Bekee), August 1 na 15, 1935.
Gịnị Ka I Nwere Ikwu?
◻ N’ihi gịnị ka ọhụụ ahụ dị ná Mkpughe isi 7 ji na-akpali mmasị n’ụzọ pụrụ iche?
◻ N’ihi gịnị ka atụrụ ọzọ nke Jọn 10:16 na-ejighị bụrụ nanị ndị Kraịst bụ́ ndị Jentaịl?
◻ Gịnị ga-abụrịrị eziokwu banyere ndị kwekọrọ ná nkọwa Bible nke atụrụ ọzọ ahụ?
◻ Olee otú ilu nke ụmụ atụrụ na ụmụ ewu ahụ si mee ka nsọpụrụ maka ike Alaeze pụta ìhè?
◻ Gịnị na-egosi mgbe oge Jehova bịara ịchịkọta oké ìgwè mmadụ nke Mkpughe 7:9?