Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 2/15 p. 27-30
  • Ihe Mmụta n’Ụzọ E Si Edozi Nsogbu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Mmụta n’Ụzọ E Si Edozi Nsogbu
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Mmụta n’Inye Ndụmọdụ Na-ezighị Ezi
  • Otú E Si Enye Ndụmọdụ
  • Ụzọ A Na-ekwesịghị Isi Meghachi Omume n’Ọnọdụ Ndị Siri Ike
  • Ụgwọ Ọrụ Job—Isi Iyi nke Olileanya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Job Toro Aha Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Job
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • “Unu Anụwo Banyere Ntachi Obi Job”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 2/15 p. 27-30

Ihe Mmụta n’Ụzọ E Si Edozi Nsogbu

MMADỤ ole na ole anọtụwo n’ọnọdụ nke ịnagide nsogbu nile Job nwere. N’ime oge dị mkpirikpi, ọdachi dakwasịrị ya site ná mfu nke akụ̀ na ụba ya na ihe ndị e ji ebi ndụ, ajọ ọnwụ nke ụmụ ya nile, na n’ikpeazụ ọrịa na-egbu oké mgbu. N’ịbụ onye ndị enyi na ndị ikwu mapụrụ n’iwu, nwunye ya gbara ya ume ka ọ “gbakụta Chineke azụ, nwụọ.”—Job 2:9; 19:13, 14.

Otú ọ dị, Job bụ isi iyi pụrụ iche nke agbamume nye onye ọ bụla na-enwe ule ndị yiri ha. Ihe ndị dị mma si n’ule ya pụta na-egosi na ntachi obi mgbe e nwere ihe isi ike na-eme ka obi Jehova ṅụrịa, mgbe ezi nsọpụrụ Chineke kpaliri anyị kama ịbụ uru onwe onye.—Job, isi nke 1, 2; 42:10-17; Ilu 27:11.

Ihe ndekọ Bible nke a nwekwara ihe mmụta ndị bara uru n’ụzọ isi dozie nsogbu. Ọ na-enye ihe atụ ndị pụtara ìhè otú e kwesịrị—na otú a na-ekwesịghị—isi nye onye na-eche ule dị iche iche ihu ndụmọdụ. N’ịgakwu n’ihu, ahụmahụ Job n’onwe ya pụrụ inyere anyị aka imeghachi omume n’ụzọ ziri ezi mgbe anyị chọtara onwe anyị ka ọnọdụ ọjọọ dị iche iche na-ebuso anyị agha.

Ihe Mmụta n’Inye Ndụmọdụ Na-ezighị Ezi

Okwu ahụ bụ́ “ndị nkasi obi Job” abụwo okwu e jikọrọ ya na onye, kama inwe ọmịiko n’oge ọdachi, ọ na-eme ka ihe tawanye akpụ. Ma n’agbanyeghị aha ndị enyi atọ Job metawooro onwe ha, anyị ekwesịghị iburu n’uche na nzube ha nile dị njọ. Ruo n’ókè ụfọdụ, ha pụrụ ịchọworị inyere Job aka, n’echiche ha ndị na-ezighị ezi. Gịnị mere ha ji daa? Olee otú ha si ghọọ ngwá ọrụ Setan, bụ́ onye kpebisiri ike imebi nguzosi ike n’ezi ihe nke Job?

Ọ fọdụrụ nke nta ka ndụmọdụ nile ha dabere n’echiche na-ezighị ezi: na ịta ahụhụ na-abịara nanị ndị mere mmehie. N’okwu mbụ ya, Elifaz sịrị: ‘Ònye laworo n’iyi, mgbe ya onwe ya bụ onye na-emeghị ihe ọjọọ? Ma ọ bụ olee ebe e zipụworo ndị ziri ezi? Dị ka m hụworo anya, ndị na-egwu ajọ ihe dị ka ala ubi, ndị na-aghakwa mmegbu dị ka mkpụrụ ọghịgha, ha na-ewe ya dị ka ihe ubi.’ (Job 4:7, 8) Elifaz kwetara n’ụzọ na-ezighị ezi na ndị na-emeghị ihe ọjọọ apụghị inwe ọdachi. O mere ntụgharị uche nke na ebe Job nọ n’oké nhụjuanya, ọ ghaghị ịbụ na o mehiewo megide Chineke.a Ma Bildad ma Zofa siri ọnwụ n’otu aka ahụ ka Job chegharịa site ná mmehie ya nile.—Job 8:5, 6; 11:13-15.

Ndị enyi atọ ya gara n’ihu ịkụda Job obi site n’ikwupụta echiche onwe onye dị iche iche kama ikwupụta amamihe Chineke. Elifaz ruru n’ókè nke ịsị na ‘Chineke adịghị atụkwasị ndị ohu ya obi,’ na ọ baghịkwara Jehova uru ma Job ọ̀ bụ onye ezi omume ma ọ bụ na ọ bụghị. (Job 4:18; 22:2, 3) O siri ike iche n’echiche okwu na-akụda obi—ma ọ bụ nke ka bụrụ ụgha—karịa nke ahụ! Ọ bụghị ihe ijuanya na Jehova mesịrị baara Elifaz na ndị enyi ya mba maka nkwulu a. “Unu ekwughị ihe ziri ezi banyere m,” ka o kwuru. (Job 42:7) Ma okwu nke kasị na-emerụ ahụ ka ga-abịa.

Elifaz n’ikpeazụ kwubigara okwu ókè n’ibo ebubo ndị pụtara ìhè. Ebe ọ na-enweghị ike ịnụ site n’ọnụ Job nkweta nke mmejọ, o kpebiziri ichepụta mmehie ndị o chere Job na-aghaghị imeworị. “Ihe ọjọọ gị [ọ́] baghị ụba? Ọ dịghịkwa nsọtụ dịịrị ajọ omume gị,” ka Elifaz jụrụ. “N’ihi na ị narawo nwanne gị ihe ibe n’efu, uwe nile nke ndị gba ọtọ ka ị na-eyipụkwa. Ị dịghị eme ka onye na-ada mbà ṅụọ mmiri, ị na-egbochikwa nri n’ebe onye agụụ nọ.” (Job 22:5-7) Ebubo ndị a bụ ndị a na-ejighị n’aka ma ọlị. Jehova n’onwe ya akọwawo Job dị ka nwoke “zuru okè, ziekwa ezi.”—Job 1:8.

Olee otú Job si meghachi omume ná mwakwasị ndị a nke iguzosi ike n’ezi ihe ya? N’ụzọ kwere nghọta, ha wetaara ya nnọọ obi ilu na nkụda obi ma mee ka o kpebisie ike karịa mgbe ọ bụla ọzọ igosipụta na ebubo ndị ahụ abụghị eziokwu. N’ezie, o tinyere uche gabiga ókè n’iwepụ onwe ya n’ụta nke na, n’otú ụzọ, ọ malitere ịta Jehova ụta maka nsogbu ya. (Job 6:4; 9:16-18; 16:11, 12) E lefuuru isi ihe iseokwu ndị ọ gụnyere anya, arụmarụ ụka ahụ ghọkwara nke na-abaghị n’ihe banyere ma Job ọ̀ bụ onye ezi omume, ma ọ bụ na ọ bụghị. Olee ihe ndị Kraịst pụrụ ịmụta site ná nnọkọ inye ndụmọdụ nke kụrụ afọ n’ala?

1. Onye Kraịst na-ahụ n’anya adịghị ebu n’uche ná mmalite na nsogbu nile nke otu nwanna bụ ihe ndị ọ kpataara onwe ya. Oké nkatọ nke mmehie ndị gara aga—ma o mere eme ma ọ bụ ihe e chepụtara echepụta—pụrụ ịkụda onye na-agbalị ịnọgide na-aga n’ihu aka kpam kpam. Obi dara mbà nwere mkpa nke ‘ngụgụ’ kama ịba mba. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:14) Jehova chọrọ ka ndị nlekọta bụrụ “ebe izonarị ifufe,” ọ bụghị “ndị nkasi obi na-eweta ọnọdụ ọjọọ” dị ka Elifaz, Bildad, na Zofa.—Aịsaịa 32:2; Job 16:2.

2. Anyị ekwesịghị ịnwa anwa boo ebubo n’enweghị ihe àmà doro anya. Na a nụrụ ma ọ bụ na e chere—dị ka ndị nke Elifaz—abụghị ihe ndabere dị mma maka inye ịdọ aka ná ntị. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na onye okenye eboo ebubo na-ezighị ezi, ọ pụrụ isi otú ahụ ghọọ onye a na-apụghị ịtụkwasị obi ma weta nhụjuanya nke mmetụta uche. Olee mmetụta Job n’ịbụ onye e mere ka ọ ṅaa ntị na ndụmọdụ nduhie dị otú ahụ? Ọ wụpụrụ nhụsianya n’okwu ịkwa emo e tiri ná mkpu bụ́: “Ì siwo aṅaa nyere ya aka, bụ́ onye na-enweghị ike?” (Job 26:2) Onye nlekọta na-enwe nchegbu ‘ga-eme ka aka na-eruda eruda guzozie,’ ọ bụghị ime ka nsogbu ahụ ka njọ.—Ndị Hibru 12:12.

3. Ndụmọdụ kwesịrị ịdabere n’Okwu Chineke, ọ bụghị n’echiche onwe onye dị iche iche. Ịrụ ụka nile nke ndị enyi Job ezighị ezi ma na-ebibi ebibi. Kama ịdọta Job nso n’ebe Jehova nọ karị, ha dugara ya n’iche na e nwere ihe mgbochi na-ekewa ya pụọ n’ebe Nna ya nke eluigwe nọ. (Job 19:2, 6, 8) N’aka nke ọzọ, iji nkà na-eji Bible eme ihe pụrụ ime ka ihe guzozie, nyekwuo ndị ọzọ ume, ma nye ezi nkasi obi.—Luk 24:32; Ndị Rom 15:4; 2 Timoti 3:16; 4:2.

Ọ bụ ezie na akwụkwọ Job na-enyere ndị Kraịst aka ịmata ọnyà ụfọdụ, ọ na-enyekwa ihe mmụta n’ụzọ e si enye ndụmọdụ dị irè.

Otú E Si Enye Ndụmọdụ

Ndụmọdụ Elaịhu dị nnọọ iche pụọ na nke ndị enyi atọ Job, ma n’ihe dị n’okwu ya ma n’ụzọ Elaịhu si mesoo Job. O jiri aha Job mee ihe ma gwa ya okwu dị ka enyi, ọ bụghị dị ka onye ikpe Job. “Ma otú ọ dị, biko, Job, nụrụ okwu m nile, ṅaakwa ntị okwu m nile. Lee, mụ onwe m dị ka i si dị n’ebe Chineke nọ: site n’ụrọ ka a kpụrụ m, ọbụna mụ onwe m.” (Job 33:1, 6) Elaịhu mekwara ngwa ịja Job mma maka ụzọ ezi omume ya. “Ọ dị m ụtọ ịgụ gị n’onye ezi omume,” ka o mesighachiri Job obi ike. (Job 33:32) E wezụga àgwà obi ebere nke a nke inye ndụmọdụ, Elaịhu nwere ihe ịga nke ọma n’ihi ihe ndị ọzọ.

N’iji ndidi chere ruo mgbe ndị ọzọ kwusịrị okwu, Elaịhu nwere nnọọ ike ịghọta ihe ndị na-ese okwu tupu ya amalite inye ndụmọdụ. Ka e were ya na Job bụ onye ezi omume, Jehova ọ̀ ga-ata ya ahụhụ? “Ya bụrụ Chineke ihe arụ, bụ́ imebi iwu; ya bụrụkwa Onye pụrụ ime ihe nile ihe arụ, bụ́ ime ajọ omume,” ka Elaịhu kwupụtasiri ike. “Ọ dịghị esepụ anya Ya n’ahụ onye ezi omume.”—Job 34:10; 36:7.

Ọ̀ bụ ezi omume Job bụ n’ezie ihe bụ́ isi esemokwu? Elaịhu dọọrọ uche Job gaa n’echiche na-ezighị ezi. “Ị sịwo, Ezi omume m karịrị nke Chineke,” ka ọ kọwara. “Legide eluigwe anya, hụ; kiriekwa mbara igwe nile, nke dị elu karịa gị.” (Job 35:2, 5) Dị nnọọ ka mbara igwe si dị elu karị anyị, otú a ka ụzọ Jehova nile si dị elu karị ụzọ anyị nile. Anyị anọghị n’ọnọdụ nke ikpe ụzọ o si na-eme ihe ikpe. “N’ihi ya mmadụ na-atụ egwu Ya: ọ dịghị ahụ ndị nile obi ha maara ihe,” ka Elaịhu kwubiri.—Job 37:24; Aịsaịa 55:9.

Ndụmọdụ ọma Elaịhu kwadebere ụzọ ka Job natakwuo ntụziaka sitere n’aka Jehova n’onwe ya. N’ezie, e nwere myirịta na-akpali akpali dị n’etiti ntụleghachi nke Elaịhu banyere “oké ọrụ nile nke Chineke,” n’isi nke 37, na okwu ndị nke Jehova n’onwe ya gwara Job, ndị e dekọrọ n’isi nke 38 ruo 41. N’ụzọ doro anya, Elaịhu lere okwu anya n’ụzọ Jehova si ele ihe anya. (Job 37:14) Olee otú ndị Kraịst pụrụ isi ṅomie ihe nlereanya ọma Elaịhu?

Dị ka Elaịhu, ndị nlekọta karịsịa ga-achọ ịbụ ndị na-enwe ọmịiko na obi ebere, na-echeta na ha bụkwa ndị na-ezughị okè. Ha ga-eme nke ọma iji nlezianya na-ege ntị iji nweta eziokwu nile ma ghọta isi ihe nile tupu a malite inye ndụmọdụ. (Ilu 18:13) Karịsịa, site n’iji Bible na akwụkwọ ndị dabere n’Akwụkwọ Nsọ na-eme ihe, ha pụrụ ijide n’aka na echiche Jehova ga-emeri.—Ndị Rom 3:4.

N’agbanyeghị ihe mmụta ndị a dị irè maka ndị okenye, akwụkwọ Job na-akụziri anyị ụzọ isi chee nsogbu ihu n’ụzọ ziri ezi.

Ụzọ A Na-ekwesịghị Isi Meghachi Omume n’Ọnọdụ Ndị Siri Ike

N’ịbụ onye ahụhụ ya kụjasịrị nakwa ịbụ onye ndị nkasi obi ụgha ya wetaara mgbakasị ahụ, Job nwere obi ilu na obi ịda mbà. “Ka ụbọchị nke a mụrụ m n’ime ya laa n’iyi . . . Ike ndụ m agwụwo mkpụrụ obi m,” ka ọ sụrụ n’ude. (Job 3:3; 10:1) N’amaghị na ọ bụ Setan bụ onye ụta dịịrị, o chere na ọ bụ Chineke na-akpatara ya ọdachi. O yiri nnọọ ihe ezi ikpe na-adịghị na ya, na ya—onye ezi omume—kwesịrị ịta ahụhụ. (Job 23:10, 11; 27:2; 30:20, 21) Àgwà nke a mere ka Job kpuo ìsì ịhụ echiche ndị ọzọ ma duga ya n’ịkatọ ụzọ Chineke si emeso ihe a kpọrọ mmadụ ihe. Jehova jụrụ, sị: “Ị̀ na-emebikwa ikpe m? Ị̀ na-ama m ikpe, ka i wee bụrụ onye ezi omume?”—Job 40:8.

Ma eleghị anya mmeghachi omume anyị ga-enwe ozugbo anyị chere ihe isi ike ihu bụ iche na a ghọgbuwo anyị, dị ka o yiri ka Job chere. Nzaghachi a na-ahụkarị bụ ịjụ, ‘Gịnị mere o ji bụrụ m? Gịnị mere ndị ọzọ—ndị dị njọ karịa m—ji ama ụtọ ndụ nwetụụrụ onwe ya pụọ ná nsogbu?’ Ndị a bụ echiche ndị na-ezighị ezi anyị pụrụ iguzogide site n’ịtụgharị uche n’Okwu Chineke.

N’adịghị ka Job, anyị nọ n’ọnọdụ nke ịghọta ihe iseokwu ndị ka ukwuu ọ gụnyere. Anyị maara na Setan “dị ka ọdụm na-agbọ ụja, ọ na-ejegharị, na-achọ onye ọ ga-elomi.” (1 Pita 5:8) Dị ka akwụkwọ Job na-ekpughe, Ekwensu ga-enwe ọṅụ ibibi nguzosi ike n’ezi ihe anyị site n’ịkpatara anyị nsogbu. O kpebisiri ike ịnwapụta nzọrọ ya nke na anyị bụ Ndịàmà nke Jehova nanị mgbe ihe na-agaziri anyị. (Job 1:9-11; 2:3-5) Ànyị ga-enwe obi ike ijigidesi ọkaaka Jehova ike ma si otú ahụ gosipụta na Ekwensu bụ onye ụgha?

Ihe nlereanya nke Jisọs, na ọtụtụ ndị ohu ọzọ a na-apụghị ịgụta ọnụ ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi, na-egosi na ụdị ụfọdụ nke ahụhụ fọrọ nke nta ka ha bụrụ ndị a na-apụghị ịgbanarị agbanarị n’ime usoro ihe nke a. Jisọs sịrị na ndị na-eso ụzọ ya aghaghị ịdị njikere ‘iburu osisi ịta ahụhụ ha’ ma ọ bụrụ na ha chọrọ iso ya. (Luk 9:23 NW) “Osisi ịta ahụhụ” nke onwe anyị pụrụ ịbụ otu ma ọ bụ karị n’ọtụtụ ihe isi ike ndị Job tachiri obi na ha—ọrịa, ọnwụ nke ndị a hụrụ n’anya, obi ịda mbà, ihe isi ike ọnọdụ akụ̀ na ụba, ma ọ bụ mmegide site n’aka ndị na-ekweghị ekwe. N’agbanyeghị ụdị nsogbu anyị pụrụ ịdị na-eche ihu, e nwere akụkụ dị mma. Anyị pụrụ ile ọnọdụ anyị anya dị ka ohere iji gosi ntachi obi na nrapagidesi ike anyị kwụ chịm nye Jehova.—Jemes 1:2, 3.

Nke ahụ bụ ụzọ ndị ozi Jisọs si meghachi omume. N’oge na-adịghị anya ka Pentikọst gasịrị a pịara ha ihe maka ikwusa banyere Jisọs. Kama ịbụ ndị a kụdara aka, ha gara n’ihu “na-aṅụrị.” Ha nwere ọṅụ, ọ bụghị n’ihi ahụhụ ahụ n’onwe ya, kama n’ihi na “a gụrụ ha ná ndị kwesịrị ka e mee ha ihe ihere n’ihi Aha ahụ [Kraịst].”—Ọrụ 5:40, 41.

Otú ọ dị, ọ bụghị ihe isi ike anyị nile na-adakwasị anyị n’ihi ijere Jehova ozi. Nsogbu anyị pụrụ ịbụ ndị anyị kpataara onwe anyị—ma ọ dị karịa ala ruo ókè ụfọdụ. Ma ọ bụ ma eleghị anya, na-abụghị site ná mmejọ ihe nke onwe anyị, nsogbu ahụ emetụtawo ezi nhazi ime mmụọ anyị. N’agbanyeghị ihe kpatara ya, àgwà ịdị umeala n’obi dị ka nke Job ga-enyere anyị aka ịmata ebe ndị e mehiere ihe. Job kwenyeere Jehova, sị: “M gosiworo ihe nke m na-adịghị aghọta.” (Job 42:3) Onye na-arịba mmehie ihe ya ama n’ụzọ dị otú a yikarịrị nnọọ ka ọ ga-ezere ụdị ihe isi ike ndị dị otú ahụ n’ọdịnihu. Dị ka ilu ahụ na-ekwu, “onye nwere ezi uche ahụwo ihe ọjọọ, wee zobe onwe ya.”—Ilu 22:3.

Nke kasị mkpa, akwụkwọ Job na-echetara anyị na nsogbu anyị agaghị adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Bible na-asị: “Anyị na-akpọ ha ndị ngọzi dịịrị, bụ́ ndị tachiri obi: unu nụrụ ihe banyere ntachi obi nke Job, hụkwa ihe Onyenwe anyị zubere, na Onyenwe anyị bụ onye nwere ọmịiko hie nne, nweekwa obi ebere.” (Jemes 5:11) Anyị pụrụ ijide n’aka na Jehova n’otu ụzọ ahụ ga-akwụghachikwa ikwesị ntụkwasị obi nke ndị ohu ya taa ụgwọ.

Anyị na-elekwa anya n’ihu n’oge mgbe nsogbu nke ụdị ọ bụla—“ihe mbụ nile”—gabigaworo. (Mkpughe 21:4) Ruo mgbe ụbọchị ahụ ga-abọ, akwụkwọ Job na-arụ ọrụ dị ka ihe nduzi bara oké uru nke pụrụ inyere anyị aka idozi nsogbu nile n’amamihe na n’obi ike.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ọ bụ ezie na Bible na-asị na “mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke ahụ ka ọ ga-ewetakwa n’ubi,” nke a apụtaghị na ahụhụ mmadụ na-ata aghaghị ịbụ nkwụghachi ụgwọ sitere n’aka Chineke. (Ndị Galetia 6:7) N’ime ụwa a Setan na-achị, ndị ezi omume na-echekarị ọtụtụ nsogbu ihu karịa ndị ajọ omume. (1 Jọn 5:19) “Mmadụ nile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m,” ka Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya. (Matiu 10:22) Ọrịa na ọdachi ndị ọzọ pụrụ ịdakwasị otu n’ime ndị ohu Chineke ọ bụla na-ekwesị ntụkwasị obi.—Abụ Ọma 41:3; 73:3-5; Ndị Filipaị 2:25-27.

[Foto dị na peeji nke 28]

“Kiriekwa mbara igwe nile, nke dị elu karịa gị.” Elaịhu si otú a nyere Job aka ịghọta na ụzọ nile nke Chineke dị elu karịa ụzọ nile nke mmadụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya