Bịa Mgbakọ Distrikti “Ndị Ji Ọṅụ Enye Otuto”
LEE nnọọ isiokwu mara mma a họrọwooro maka mgbakọ distrikti nke 1995: “Ndị Ji Ọṅụ Enye Otuto”! Nke a bụ ihe Ndịàmà Jehova bụ n’ezie. Ndị na-enye ònye otuto? Ọ bụnụ Jehova Chineke n’ezie!
Ọ dịghị onye ya na Jehova hà, o nweghị oyiri, o nweghị atụ, ọ pụrụ iche n’ọtụtụ ụzọ. O nwere ike ime ihe nile, ọ mazuru ihe nile, zuo okè n’ikpe, bụrụkwa ịhụnanya n’onwe ya. O ruru eru, karị ndị ọzọ nile, inweta ofufe na otuto anyị.
N’ezie anyị ga-achọ ịbụ ndị ji ọṅụ na-enye ya otuto! Iji nyere anyị aka, Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova emewo ndokwa usoro ihe omume mgbakọ ụbọchị atọ mara mma, na-amalite n’oge ọkọchị nke 1995. Ụbọchị atọ ndị a ga-abụ n’ezie ndị nke ọṅụ, Onyeàmà Jehova ọ bụla ga-achọkwa ime ihe nile ọ pụrụ ime iji nọrọ ya site n’abụ mmalite n’ụtụtụ Friday ruo n’abụ na ekpere mmechi n’ehihie Sunday.