N’isi Nso, Ọ Dịghị Onye Ga-abụ Ogbenye!
“UNU atụla egwu; n’ihi na lee, ana m ezi unu ozi ọma nke oké ọṅụ nke ga-adịrị ndị Israel nile.” (Luk 2:10) Ndị na-azụ atụrụ nwere ihe ijuanya nụrụ okwu ndị a na-ewuli elu na nso nso Betlehem n’abalị ahụ a mụrụ Jisọs. N’ikwekọ ná nkwupụta ahụ, Jisọs kwusiri okwu ike banyere “ozi ọma” n’oge ije ozi elu ala ya. Taa, ebe anyị na-adaberesi ike n’ego iji lekọta mkpa anyị dị iche iche, olee otú ozi ọma banyere Jisọs pụrụ isi bara anyị uru?
Jisọs Kraịst kwusaara “ndị ogbenye ozi ọma.” (Luk 4:18) Dị ka Matiu 9:35 si kwuo, “Jisọs wee na-ejegharị n’obodo na obodo nta ha nile, na-ezi ihe n’ụlọ nzukọ nile ha, na-ekwusakwa ozi ọma nke alaeze ahụ.” Ozi ya bụ ihe na-agba ume karịsịa nye ndị dara ogbenye. “Ma mgbe Ọ hụrụ ìgwè mmadụ nile, O nwere ọmịiko n’ahụ ha, n’ihi na a na-esogbu ha, na-achụsakwa ha, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.” (Matiu 9:36) N’eziokwu, Jisọs sịrị, “Unu nwere ndị ogbenye n’etiti unu mgbe nile,” ma anyị ekwesịghị ikwubi site n’okwu ndị a na ọ dịghị olileanya dịịrị ndị nọ ná mkpa. (John 12:8) Ka usoro ihe ọjọọ nke a na-anọgide, a ga-enwe ndị ogbenye, n’agbanyeghị ihe pụrụ ịkpata nsogbu ha. Okwu Chineke adịghị eleghara ịbụ ezie nke ịda ogbenye anya, ma ọ dịghị elekwasị anya n’akụkụ ndị na-ezighị ezi. Kama, ọ na-enyere ndị ogbenye aka ịnagide nchegbu dị iche iche nke ndụ.
Enyemaka Maka Ndị Ogbenye
N’ụzọ dị ịrịba ama, e kwuwo sị: “Ọ dịghị ibu arọ mmadụ pụrụ ibu nke karịrị ịmata na ọ dịghị onye na-echegbu onwe ya banyere ya ma ọ bụ na-aghọta.” Otú ọ dị, n’agbanyeghị enweghị ọmịiko n’akụkụ nke ihe ka n’ọnụ ọgụgụ, a ka nwere ozi ọma maka ndị ogbenye—ma ugbu a ma n’ọdịnihu.
N’ụzọ dị mwute, ọtụtụ nwere mmasị dị nta n’inyere ndị ogbenye aka. Dị ka akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia si kwuo, ụfọdụ ndị kwere na “ndị mmadụ n’etiti ọha na eze na-asọrịta mpi maka nlanarị . . . ndị kakwa ndị ọzọ na-aghọ ndị dị ike na ndị ọgaranya.” Ndị kwere n’ozizi a, a kpọrọ social Darwinism, pụrụ ile ndị ogbenye anya dị nnọọ ka ndị umengwụ ma ọ bụ ndị na-emefusị ego n’ihe na-abaghị uru. Otú ọ dị, ndị ọrụ e goro ego nke ime ime obodo, ndị ọrụ na-eme nkwagharị, na ndị ọzọ, na-arụsikarị ọrụ ike iji zụọ ezinụlọ ha, n’agbanyeghị na a na-akwụ ha ụgwọ dị ala.
N’ọtụtụ ala, ọnọdụ ogbenye jupụtara nnọọ ebe nile. Ya mere, a dịghị eme ka ndị ogbenye—ihe ka n’ọnụ ọgụgụ—na-eche na ha bụ ndị na-abaghị uru ọ bụla. Ka o sina dị, n’ala ndị dị otú ahụ, e nwere ndị na-ebi ndụ oké okomoko n’etiti ọnọdụ ogbenye ahụ. E nwere ebe obibi ndị na-edo ahụ, ndị jupụtara n’ihe ndị dara oké ọnụ n’akụkụ nkịkara ụlọ ndị na-adịghị mma maka ahụ ike, ndị ọtụtụ mmadụ jupụtara. Ndị a na-akwụ ezigbo ụgwọ na-agba ụgbọ ala ha dị oké ọnụ ahịa n’okporo ámá ndị jupụtara ná ndị ihe ụwa na-atụ n’ọnụ na ndị na-enweghị ọrụ. N’ala ndị dị otú ahụ, ndị ogbenye na-amata ọnọdụ ọjọọ ha n’ụzọ na-afụ ụfụ. N’ezie, “ndị ogbenye na-ahụ ahụhụ ọ bụghị nanị site n’erighị ihe na-edozi ahụ, ebe obibi na-adịghị mma, na nlekọta ahụ ike na-erughị eru, kamakwa site ná nchegbu na-adịgide adịgide banyere ọnọdụ ha,” ka akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia na-ekwu. “N’enweghị ike inweta na ijigide ọrụ dị mma, ha na-atụfu mmetụta nile nke ịdị ùgwù na nsọpụrụ onwe onye.” Mgbe ahụ, olee otú ụfọdụ n’ime ndị dara nnọọ ogbenye si anagide ọnọdụ ha? Olee ihe ozi ọma banyere Jisọs nwere ime n’ịnagide ihe?
Nke mbụ, cheta na a pụrụ ime ka ọnọdụ ogbenye kawanye njọ site n’omume ndị amamihe na-adịghị na ha. Tụlee ihe atụ ụfọdụ. Valdecir kwetara na ọ bụ ezie na nwunye ya na ụmụntakịrị ya nwere ihe dị nta iri, o mefusịrị ego n’ịnọgide n’ụzọ ndụ rụrụ arụ. Ọ na-ekwu, sị: “Ọ bụ ezie na ana m arụ ọrụ, ọ dịghị mgbe ọ bụla m nwere ego, kama enwere m ụdị tiketi lọtrị dị iche iche mgbe nile n’ime akpa uwe m.” N’ihi oké aṅụrụma na ise siga, Milton tụfuru azụmahịa nke o were 23 mmadụ n’ọrụ na ya. Ọ na-ekwu, sị: “Arahụrụ m n’okporo ámá ọtụtụ abalị, n’enweghị ike ịla ụlọ, ezinụlọ m takwara ahụhụ dị ukwuu n’ihi m.”
João mefusịkwara ego ụgwọ ọnwa ya n’omume rụrụ arụ. “Arahụrụ m ọtụtụ abalị n’ebe na-abụghị ebe obibi m. Ego nile m na-arụta ezughị ezu maka ndụ rụrụ arụ na mmekọrịta ịhụnanya ndị m na-enwe. Ọnọdụ ahụ ghọrọ ihe a na-apụghị ịnagide anagide, nwunye m chọkwara nkewa.” Tụkwasị ná nsogbu akụ̀ na ụba na nke alụmdi na nwunye ya, a ka nwekwara ndị ọzọ. Ọ na-ekwu, sị: “Akpatara m nsogbu n’etiti ndị ikwu na ndị agbata obi, enwekwara m nsogbu karịsịa n’ebe ọrụ. Dị ka ihe si n’ime ya pụta, anọgidere m n’enweghị ọrụ.” Júlio bụ onye ọgwụ ọjọọ riri ahụ. Otú ọ dị, ọ na-akọwa, sị: “Ebe ọ bụ na ọ dịghị mgbe ụgwọ ọnwa m na-ezu ezu iji jigide àgwà m nke iji ọgwụ ọjọọ eme ihe, amalitere m ịrụ ọrụ dị ka onye na-ere ọgwụ ike ka m wee ghara ịdị na-azụ ọgwụ ọjọọ azụ.”
N’ịbụ onye a zụlitere n’ezinụlọ dara ogbenye ebe e nwere ụmụ asatọ, José chọrọ inwetara onwe ya ihe. N’iche na ọ dịghị ihe ga-efunahụ ya, ọ malitere izu ndị mmadụ ohi, ya na ndị na-eto eto ndị ọzọ. N’obi nkoropụ, otu onye na-eto eto ọzọ ghọrọ onye òtù nke otu òtù a kpọrọ Headbangers (Ndị Nkụwa). Ọ na-akọwa, sị: “Ebe ọ bụ na ihe ka ọtụtụ n’ime anyị dara nnọọ ogbenye, anyị na-achọta nnọọ afọ ojuju n’ịkụwasị ihe na ịwakpo ndị mmadụ.”
Otú ọ dị, taa ndị ikom ndị a na ezinụlọ ha adịghị ahụkwa ahụhụ nke oké ụkọ ma ọ bụ mmetụta nke obi ilu na iwe. Ha abụghịkwa ndị na-enweghị enyemaka ma ọ bụ olileanya ọzọ. Gịnị mere ha abụghị? N’ihi na ha mụrụ ozi ọma ahụ nke Jisọs kwusara. Ha tinyere ndụmọdụ Bible n’ọrụ, sorokwa ndị nwere otu uche ahụ na-akpakọrịta n’ọgbakọ nke Ndịàmà Jehova. Ha mụtakwara ihe ụfọdụ dị nnọọ mkpa banyere akụ̀ na ụba na ịda ogbenye.
Enyemaka Iji Nagide Ịda Ogbenye
Nke mbụ, ha mụtara na ọ bụrụ na e tinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ, a pụrụ ibelata mmetụta ọjọọ nke ịda ogbenye. Bible na-akatọ omume rụrụ arụ, aṅụrụma, ịgba chaa chaa, na iji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. (1 Ndị Kọrint 6:9, 10) Ihe ndị dị otú ahụ na-efu oké ego. Ha pụrụ ime onye bara ọgaranya ka ọ daa ogbenye, na onye dara ogbenye ka ọ dakwuo ogbenye. Ịhapụ omume ndị a rụrụ arụ na ndị ọzọ yiri ha na-eme ihe dị ukwuu n’imeziwanye ọnọdụ akụ̀ na ụba nke ezinụlọ.
Nke abụọ, ha chọpụtara na e nwere ihe ndị dị mkpa ná ndụ karịa akụ̀ na ụba. E kwupụtara echiche ziri ezi n’okwu ndị a sitere n’ike mmụọ nsọ: “Amamihe bụ ndò, ego bụkwa ndò: ma ọkaaka nke ihe ọmụma bụ, na amamihe na-eme ka onye nwe ya dị ndụ.” (Eklisiastis 7:12) Ee, ego dị mkpa. Ma amamihe dabeere na Bible na ihe ọmụma nke nzube nile nke Chineke bara uru nke ukwuu karị. N’ezie, nye onye na-enweghị amamihe, inwebiga ego ókè pụrụ ịbụ ibu arọ dịkwa ka inwe ego dịbigara nta ókè. Onye ahụ so dee Bible jiri amamihe kpee ekpere, sị: “Enyela m ọnọdụ ogbenye ma ọ bụ akụ̀; mee ka m rie nri ruuru m: ka afọ wee ghara iju m, m wee gọọ agọ, sị, Ònye bụ Jehova? Ma ọ bụ ka e wee ghara ịnapụ m ihe nile, m wee zuo ohi, wee were aha Chineke m mee ihe ọjọọ.”—Ilu 30:8, 9.
Nke atọ, ha chọpụtara na ọ bụrụ na mmadụ ana-ebi ndụ dị ka ozi ọma Jisọs kwusara si dị, ọ dịghị ya mkpa ma ọlị inwe mmetụta nke ịbụ onye a gbahapụrụ. Ozi ọma ahụ metụtara Alaeze Chineke. A kpọrọ ozi ahụ “ozi ọma nke a nke alaeze,” n’ụbọchị anyị kwa, a na-ekwusa ya n’elu ụwa dum mmadụ bi. (Matiu 24:14) Jisọs gwara anyị na a ga-akwado anyị ma ọ bụrụ na anyị etinye olileanya anyị n’Alaeze ahụ. O kwuru, sị: “Ma burunụ ụzọ chọọ alaeze Ya, na ezi omume [Chineke]; a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a nile.” (Matiu 6:33) Chineke adịghị ekwe nkwa ụgbọ ala ndị mara oké mma n’anya ma ọ bụ ụlọ okomoko. Jisọs na-ekwu banyere ihe ndị dị mkpa ná ndụ, ihe ndị dị ka ihe oriri na uwe. (Matiu 6:31) Ma ọtụtụ nde mmadụ taa pụrụ ịgba akaebe na a pụrụ ịdabere ná nkwa Jisọs. Ọ dịghị onye a na-agbahapụ kpam kpam, ọbụna onye dara nnọọ ogbenye, ma ọ bụrụ na ọ na-edote Alaeze ahụ n’ọnọdụ mbụ.
Nke anọ, ha chọpụtara na onye na-etinye Alaeze Chineke n’ọnọdụ mbụ adịghị enwe obi ilu n’ihi ihe isi ike ọnọdụ akụ̀ na ụba. Ee, onye ogbenye aghaghị ịrụsi ọrụ ike. Ma ọ bụrụ na ọ na-ejere Chineke ozi, o nwere mmekọrịta dị ùgwù n’ebe Onye Okike ya nọ, onye Bible na-ekwu banyere ya, sị: “O ledaghị mweda n’ala nke onye e wedara n’ala anya, Ọ kpọghịkwa ya ihe arụ; O zonarịghịkwa ya ihu Ya; ma mgbe o tikuru Ya, Ọ nụrụ olu ya.” (Abụ Ọma 22:24) Ọzọkwa, onye ogbenye nwere enyemaka iji nagide nsogbu dị iche iche nke ndụ. Ọ na-eso ndị Kraịst ibe ya enwe mmekọrịta na-ekpo ọkụ, nweekwa ihe ọmụma banyere na ntụkwasị obi n’uche Jehova e kpughere ekpughe. Ihe ndị dị otú a bụ ‘ihe a na-achọsi ike karịa ọlaedo, ee, karịa ọtụtụ ọlaedo a nụchara anụcha.’—Abụ Ọma 19:10.
N’ikpeazụ, Ịda Ogbenye Adịkwaghị!
N’ikpeazụ, ndị ṅara ntị n’ozi ọma ahụ na-amụta na Jehova Chineke ezubewo idozi nsogbu nke ịda ogbenye kpam kpam site n’Alaeze ya. Bible na-ekwe nkwa, sị: “Ọ bụghị ruo mgbe ebighị ebi ka a ga-echezọ ogbenye, olileanya nke ndị dị umeala n’obi agaghị ala n’iyi ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 9:18) Alaeze ahụ bụ ọchịchị n’ezie, nke e guzobere n’eluigwe na-enwe Jisọs Kraịst dị ka Onye Ọchịchị. N’isi nso, Alaeze ahụ ga-anọchi ọnọdụ ọchịchị ụmụ mmadụ n’ịhazi ihe metụtara ụmụ mmadụ. (Daniel 2:44) Mgbe ahụ, dị ka Eze nọkwasịworo n’ocheeze, Jisọs “ga-emere onye na-enweghị ike na ogbenye ebere, ọ bụkwa mkpụrụ obi ndị ogbenye ka ọ ga-azọpụta. Ọ ga-esi n’aka nzọgbu na n’aka ime ihe ike gbapụta mkpụrụ obi ha; ọbara ha ga-adịkwa oké ọnụ ahịa n’anya ya.”—Abụ Ọma 72:13, 14.
N’ilepụ anya n’ihu maka oge ahụ, Maịka 4:3, 4 na-asị: “Ha ga-ebi, onye ọ bụla n’okpuru osisi vine ya na n’okpuru osisi fig ya; ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji: n’ihi na ọnụ nke Jehova nke usuu nile nke ndị agha ekwuwo okwu.” Ònye ka e kwuru okwu ya n’ebe a? Ee, ndị nile na-edo onwe ha n’okpuru Alaeze Chineke. Alaeze ahụ ga-edozi nsogbu nile na-eti ihe a kpọrọ mmadụ ihe otiti—ọbụna nsogbu nke ọrịa na ọnwụ. “O lodawo ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi; Onyenwe anyị Jehova ga-ehichapụkwa anya mmiri n’ihu nile.” (Aịsaịa 25:8; 33:24) Lee ụwa dị iche nke ahụ ga-abụ! Chetakwa, anyị pụrụ ikwere nkwa ndị a n’ihi na ha si n’obi Chineke n’onwe ya pụta. Ọ na-ekwu, sị: “Ndị m ga-anọkwa n’ụlọ obibi udo, na n’ebe obibi dị iche iche kwesịrị ntụkwasị obi, na n’ebe izu ike dị iche iche dị jụụ.”—Aịsaịa 32:18.
Ịtụkwasị obi n’Alaeze Chineke na-emeri enweghị nsọpụrụ onwe onye nke ịda ogbenye na-akpatakarị. Onye Kraịst bụ ogbenye maara na ya dị nnọọ mkpa n’anya Chineke dịkwa ka onye Kraịst bara ọgaranya. Chineke na-ahụ ha abụọ n’anya n’ụzọ hà nhata, ha abụọ nwekwara otu olileanya ahụ. Ha abụọ ji ịnụ ọkụ n’obi na-elepụ anya n’ihu maka oge ahụ mgbe, n’okpuru Alaeze Chineke, ịda ogbenye ga-abụ ihe gara aga. Lee aha oge dị ebube nke ahụ ga-abụ! N’ikpeazụ, ọ dịghị onye ga-abụ ogbenye!
[Foto dị na peeji nke 5]
Gịnị mere a ga-eji na-emefusị akụ̀ na ụba n’ịgba chaa chaa, ise siga, oké aṅụrụma, iji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, ma ọ bụ n’ụzọ ndụ rụrụ arụ?
[Foto dị na peeji nke 7]
Jehova Chineke ga-edozi nsogbu nile nke ịda ogbenye mmadụ site n’Alaeze ya