Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 6/1 p. 3-5
  • Nkwa nke Ụwa Omume Rụrụ Arụ Na-adịghị Ya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nkwa nke Ụwa Omume Rụrụ Arụ Na-adịghị Ya
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Omume Rụrụ Arụ Na-emetụta Gị
  • Ihe Bible Na-agwa Anyị
  • Ndị Mmadụ Pụrụ Ịgbanwe
  • Nkwa Jehova
  • N’ihi Gịnị Ka E Ji Nwee Nnọọ Oké Nrụrụ Aka?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Iji Mma Agha nke Mmụọ Nsọ Alụso Nrụrụ Aka Ọgụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Ò Nwere Ebe Nrụrụ Aka Na-adịghị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Nrụrụ Aka Agaghị Adị n’Alaeze Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 6/1 p. 3-5

Nkwa nke Ụwa Omume Rụrụ Arụ Na-adịghị Ya

OMUME rụrụ arụ abanyewo n’akụkụ nile nke ọha na eze. Ma ọ̀ bụ n’ọchịchị, sayensị, egwuregwu, okpukpe, ma ọ bụ achụmnta ego, omume rụrụ arụ yiri ka o nwekwaghị nchịkwa.

N’ọtụtụ mba, akụkọ ndị na-egbu mmụọ nke omume rụrụ arụ na-aghọ ihe ndị e ji eme isi akụkọ. A na-ekpughe ọtụtụ ndị kweworo nkwa ije ozi maka ọdịmma ndị mmadụ dị ka ndị na-eje ozi maka ọdịmma ndị nke onwe ha site n’ịnara ngo na aka azụ. Mpụ a na-akpọ “mpụ ọcha” juru ebe nile. Ikpe ajọ ime mpụ na ịkpa àgwà ọjọọ na-ama ọtụtụ ndị karị bụ́ ndị nọ n’ọkwá ndị dị elu n’ọha mmadụ ma ọ bụ nke ọnọdụ akụ̀ na ụba n’ihe banyere ọrụ ha na-arụ kwa ụbọchị.

E nwere nchegbu na-arị elu banyere ihe otu akwụkwọ Europe na-akọwa dị ka “‘ịrụ arụ ndị oké ozu’—omume nke ndị nọ n’isi ọrụ, ndị minista na, ọtụtụ mgbe nnọọ, ndị isi ala ịchọ ka a kwụọ ha ụgwọ tupu ịkwado ka a zụta ma ọ bụ rụọ oké ihe dị iche iche.” N’otu mba “afọ abụọ nke ime nchọpụta ndị uwe ojii na ijide ndị mmadụ kwa ụbọchị a ka akwụsịbeghịkwa ndị rụrụ arụ na-enweghị mgbanwe,” ka magazin ndị Britain bụ́ The Economist kwuru.

N’ihi omume rụrụ arụ dị otú a gbasapụrụ agbasapụ, ọtụtụ ndị taa na-enwe mmetụta nke na ọ dịghị onye ha pụrụ ịtụkwasị obi. Ha na-ekwupụta echiche Devid ahụ so dee Bible mgbe ọ sịrị: “Ha nile ewezụgawo onwe ha; ha agbarụwo n’otu dị ka mmiri; ọ dịghị onye na-eme ezi ihe, ọ dịghị ọbụna otu onye.”—Abụ Ọma 14:3.

Olee otú i si anagide ịdị adị nke omume rụrụ arụ gbasapụrụ agbasapụ? Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ taa na-eleghara ya nnọọ anya. Ma ọbụna ma i leghara omume rụrụ arụ anya, ọ ka ga-emerụkwa gị ahụ. N’ụzọ dị aṅaa?

Omume Rụrụ Arụ Na-emetụta Gị

Ma omume rụrụ arụ ndị dị ukwu ma ndị dị nta na-eweli ọnụ ahịa ihe ndị e ji ebi ndụ, belata ọdịdị nke ihe ndị a na-emepụta, tinyekwa ihe n’inwe ọnụ ọgụgụ ọrụ dị nta na ụgwọ ọrụ dị ala karị. Dị ka ihe atụ, e mere atụmatụ na mpụ ndị dị ka iri ego ọha na igwu wayo na-efu ma ọ dịkarịa ala okpukpu iri karịa nchịkọta nke ihe mwaba n’ụlọ, iji égbè eje ohi, na ohi nkịtị na-efu. Akwụkwọ The New Encyclopædia Britannica (1992) na-ekwu na “mpụ ndị nnukwute ụlọ ọrụ dị iche iche na-eme na United States bụ́ nke e meworo atụmatụ ya ịbụ $200,000,000,000 kwa afọ—okpukpu atọ nke ihe mpụ ndị a haziri ahazi na-ewe.” Akwụkwọ a na-akọwa na ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na a gaghị achọpụta mmetụta ha ozugbo, “mpụ ndị dị otú ahụ na-enwe mmetụta dị ukwuu n’ịnọ ná nchebe nke ndị ọrụ, ndị ahịa, na gburugburu ebe obibi.”

Mkpụrụ ndị dị ilu nke omume rụrụ arụ na-echetara anyị okwu Eze Solomọn: “Mụ onwe m wee laghachi hụ mmegbu nile a na-emegbu n’okpuru anyanwụ: ma, lee, anya mmiri nke ndị a na-emegbu, ma ọ dịghị onye nkasi obi ha nwere; ma n’akụkụ ndị na-emegbu ha ka ike dị, ma ọ dịghị onye nkasi obi ha nwere.”—Eklisiastis 4:1.

Mgbe ahụ, ànyị ga-achịsazi aka nakwere omume rụrụ arụ? Ọ̀ bụ ihe a na-apụghị izere ezere? Ụwa omume rụrụ arụ na-adịghị ya ọ̀ bụ nrọ na-apụghị ime eme? N’ụzọ na-enye obi ụtọ, ọ bụghị! Bible na-akụziri anyị na a ga-ekpochapụ ikpe na-ezighị ezi na mmebi iwu n’isi nso.

Ihe Bible Na-agwa Anyị

Bible na-agwa anyị na omume rụrụ arụ malitere mgbe otu mmụọ ozi dị ike nupụrụ isi megide Chineke ma mee ka mmadụ abụọ mbụ sonyere ya. (Jenesis 3:1-6) Ọ dịghị ezi ihe nke ụzọ mmehie ha rụpụtara. Kama nke ahụ, site n’ụbọchị Adam na Iv mehiere megide Jehova Chineke, ha malitere ịta ahụhụ ihe ọjọọ ndị omume rụrụ arụ kpatara. Anụ ahụ ha malitere usoro dị nwayọọ nke nretọ, na-eduba n’ọnwụ a na-apụghị izere ezere. (Jenesis 3:16-19) Kemgbe ahụ, akụkọ ihe mere eme jupụtara n’ihe atụ nke iri ngo, nghọrị, na igwu wayo. Ma, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị na-eme ha yiri ka ọ dịghị ihe a na-eme ha.

N’adịghị ka ndị ome mpụ nkịtị, ndị isi na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị rụrụ arụ adịghị ejekebe nga ma ọ bụ na-akwụ ụgwọ maka uru ha nwetara n’ụzọ na-ezighị ezi. N’ihi ọdịdị dị nzuzo nke iri ngo, aka azụ, na ịgba tọọchị, ọ na-esikarị ike ikpughe omume rụrụ arụ nke ndị nọ n’ọkwá dị elu. Ma nke a apụtaghị na ụwa nke omume rụrụ arụ na-adịghị na ya bụ nrọ na-apụghị ime eme.

Mgbapụta site n’omume rụrụ arụ ga-esite n’aka Onye Okike mmadụ, bụ́ Jehova Chineke. Ntinye aka Chineke bụ ngwọta e nwere nanị ya. N’ihi gịnị? N’ihi na onye iro a na-adịghị ahụ anya nke ihe a kpọrọ mmadụ, bụ́ Setan Ekwensu, na-anọgide na-eduhie ihe a kpọrọ mmadụ. Dị ka anyị na-agụ na 1 Jọn 5:19, “ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.” Gịnị ọzọ pụrụ ịkọwa ịrị elu n’omume rụrụ arụ—ihe ka ukwuu n’ime ya bụrụ ndị a na-eme n’enwetaghị ntaramahụhụ?

Ọ dịghị ọ̀tụ̀tụ̀ ọ bụla nke mgbalị mmadụ pụrụ imeri Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya. Nanị ntinye aka Chineke pụrụ ime ka ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi jide ‘ọnọdụ inwe onwe nke ebube nke ụmụ Chineke’ n’aka. (Ndị Rom 8:21) Jehova na-ekwe nkwa na n’isi nso a ga-egbochi Setan ka o wee ghara inwe ike iduhie ihe a kpọrọ mmadụ ọzọ. (Mkpughe 20:3) Ka ọ dị ugbu a, ọ bụrụ na anyị chọrọ ibi n’ụwa ọhụrụ Chineke nke omume rụrụ arụ na-adịghị ya, anyị aghaghị ịjụ ụzọ rụrụ arụ nile nke ụwa a.

Ndị Mmadụ Pụrụ Ịgbanwe

N’ụbọchị Jisọs Kraịst, e nwere ndị ji ike ha mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi ma kpagbuo ndị mmadụ ibe ha. Dị ka ihe atụ, e ji ime omume rụrụ arụ mara ndị ọna ụtụ. Nke a dị otú ahụ n’agbanyeghị iwu doro anya nke Chineke: “Anarakwala ihe iri ngo: n’ihi na ihe iri ngo na-eme ka ndị na-ahụ ụzọ kpuo ìsì, ọ na-emekwa ka okwu ndị ezi omume gbagọọ agbagọọ.” (Ọpụpụ 23:8) Zakịọs, otu onye isi ọna ụtụ, kwetara na ya erigbuwo ndị mmadụ site n’ibo ebubo ụgha. Ma kama ịkwalite ndozigharị usoro ọha mmadụ n’ụzọ sara mbara, Jisọs kpọrọ ndị mmadụ òkù ka ha chegharịa ma gbahapụ ụzọ ha ndị rụrụ arụ. N’ihi ya, ndị ọna ụtụ rụrụ arụ a ma ama dị ka Matiu na Zakịọs hapụrụ ụzọ ndụ ha mbụ.—Matiu 4:17; 9:9-13; Luk 19:1-10.

Ndị aka ha dị n’omume akwụwaghị aka ọtọ taa pụrụ n’otu aka ahụ ịjụ omume rụrụ arụ site n’iyikwasị ‘mmadụ ọhụrụ ahụ, nke e kere dị ka Chineke chọrọ n’ime ezi omume na ịdị ọcha nke eziokwu ahụ.’ (Ndị Efesọs 4:24) Ọ pụrụ ịbụ na ọ gaghị adị mfe ịkwụwa aka ọtọ n’ịtụ ụtụ isi ma ọ bụ ịkwụsị ikere òkè n’ihe omume ndị a na-enyo enyo. Ma, uru ndị dị na ya ruru mgbalị ọ bụla.

N’abụkwaghị ndị ụwa a rụrụ arụ na-akpụzi, ndị na-eche banyere ọdịmma nke ndị ọzọ na-enwe udo n’ime. E nweghị egwu ọ bụla nke ịbụ onye e jidere n’ime ihe ọjọọ. Kama nke ahụ, ha na-enwe ezi akọ na uche. Ha na-eṅomi ihe atụ Bible nke Daniel onye amụma. Ihe ndekọ Bible na-ekwu na ndị isi ọchịchị nọ mgbe nile na-achọ ihe ebubo iji megide Daniel. “Ma ọ dịghị ihe ebubo ma ọ bụ omume bibiri ebibi ọ bụla ha pụrụ ịchọpụta; n’ihi na onye kwesịrị ntụkwasị obi ka ọ bụ, ọ dịghịkwa mmehie ma ọ bụ omume bibiri ebibi ọ bụla a chọpụtara n’ahụ ya.”—Daniel 6:4.

Nkwa Jehova

Jehova na-ekwe nkwa na “a sị na onye mmehie emee ihe ọjọọ [otu narị ugbo], meekwa ka ụbọchị ya dị ogologo, ma mụ onwe m maara n’ezie na ọ ga-adịrị ndị na-atụ egwu Chineke mma, bụ́ ndị na-atụ egwu n’ihu Ya: ma ọ gaghị adịrị onye na-emebi iwu mma, ọ gaghị emekwa ka ụbọchị ya dị ogologo, bụ́ nke dị ka onyinyo; n’ihi na ọ dịghị atụ egwu n’ihu Chineke.”—Eklisiastis 8:12, 13.

Lee ihe na-enye ahụ efe ọ ga-abụ mgbe omume rụrụ arụ na-agakwaghị akpata enweghị obi ụtọ! Lee aha ihe ngọzi ọ ga-abụ ibi ndụ ebighị ebi n’ụwa omume rụrụ arụ na-adịghị ya! Nke a abụghị ihe na-apụghị ime eme. Bible na-ekwu banyere ‘olileanya nke ndụ ebighị ebi, nke Chineke, Onye na-apụghị ikwu okwu ụgha, kwere nkwa ya tupu mgbe ebighị ebi eruo.’ (Taịtọs 1:2) Ọ bụrụ na ị kpọrọ omume rụrụ arụ asị ma hụ ezi omume n’anya, ị pụrụ n’ezie ịhụ mmezu nke nkwa Chineke nke ụwa omume rụrụ arụ na-adịghị ya.

[Foto dị na peeji nke 4]

Omume rụrụ arụ juru eju n’etiti ndị gọọmenti na ndị oji ego achụ ego

[Foto dị na peeji nke 5]

Ọtụtụ mgbe omume rụrụ arụ na-emetụta iso ndị ọrụ ọdịmma ọha na eze mekọọ ihe

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya