Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Olee otú uru dị iche iche nke ije ozi onye isi nchụàjà nke Kraịst Jisọs, nke a kpọtụrụ aha ná Ndị Hibru 4:15, 16, si emetụta “atụrụ ọzọ” ahụ ugbu a?
Ọ bụ ezie na òkè Jisọs dị ka Onye Isi Nchụàjà nwere ihe ọ pụtara n’ụzọ bụ isi nye ndị ahụ ga-eso ya anọ n’eluigwe, ndị Kraịst nwere olileanya elu ala na-erite uru ọbụna ugbu a site n’ije ozi onye nchụàjà nke Jisọs.
Kemgbe Adam mehiere, ụmụ mmadụ abụrụwo ndị e ji mmehie bogbuo. Anyị na-ahụ ahụhụ site n’ezughị okè e ketara eketa, dị ka ndị Israel hụrụ. Ha chigharịkwuuru ogologo ahịrị nke ndị isi nchụàjà na ndị nchụàjà ndị na-eso ha arụkọ ọrụ, ndị chụrụ àjà maka mmehie nke onwe ha tinyekwara nke ndị Israel. Ka oge na-aga, e tere Jisọs mmanụ dị ka onye nchụàjà “dị ka usoro Melkizedek si dị.” Mgbe a kpọlitesịrị ya n’ọnwụ, Jisọs pụtara n’ihu Jehova igosi uru nke àjà mmadụ ya zuru okè.—Abụ Ọma 110:1, 4.
Gịnị ka nke a pụtara nye anyị taa? N’akwụkwọ ozi ya nye ndị Hibru, Pọl kwuru okwu banyere ije ozi Jisọs dị ka Onye Isi Nchụàjà. Ná Ndị Hibru 5:1, anyị na-agụ, sị: “Onye isi nchụàjà ọ bụla, ebe e si n’etiti mmadụ wepụta ya, ọ bụ n’ihi mmadụ ka a na-edo ya onye isi nchụàjà n’ihe dịịrị Chineke, ka o wee na-eche onyinye na àjà dị iche iche n’ihi mmehie n’ihu Chineke.” Mgbe ahụ, n’amaokwu nke 5 na nke 6, Pọl gosiri na Jisọs ghọrọ onye isi nchụàjà, nke pụrụ iduga n’uru dị iche iche maka anyị.
Olee otú o si bụrụ otú ahụ? Pọl dere, si: “Ọ bụ ezie na Ọ bụ Ọkpara, ma Ọ mụtara ịṅa ntị Ya site n’ahụhụ nile Ọ hụrụ; ebe e mesịrị Ya ka O zuo okè, O wee ghọọrọ ndị nile na-aṅa Ya ntị Onye na-ewetara ha nzọpụta ebighị ebi.” (Ndị Hibru 5:8, 9) Na mbụ, amaokwu ahụ pụrụ ime ka anyị chee otú anyị ga-esi nwee ike irite uru n’ime ụwa ọhụrụ ahụ, mgbe a ga-ewepụ ọnọdụ mmehie nke ndị ahụ guzosiri ike n’ihe nye Chineke na Jisọs ma nweta ndụ ebighị ebi. Nke ahụ bụ olileanya siri ike, nke dabeere n’uru mgbapụta nke àjà Jisọs na ije ozi ya dị ka Onye Isi Nchụàjà.
Otú ọ dị, n’eziokwu, anyị pụrụ irite uru kpọmkwem ugbu a site n’òkè ọ na-ekere ma ọ bụ n’ije ozi ya dị ka Onye Isi Nchụàjà. Rịba ama Ndị Hibru 4:15, 16: “Anyị enweghị onye isi nchụàjà onye na-apụghị iji obi soo anyị hụkọọ ahụhụ n’adịghị ike anyị; kama anyị nwere Onye a nwaworo n’ihe nile n’otu ụzọ ahụ a na-anwa anyị, ma O mehieghị. Ya mere ka anyị were nkwuwa okwu bịaruo ocheeze amara, ka e wee meere anyị ebere, ka anyị wee hụkwa amara inyere anyị aka n’oge mkpa.” Olee mgbe “oge mkpa” ahụ ga-abụ? Ọ bụ mgbe ebere na amara na-erughịrị mmadụ dị anyị mkpa. Anyị nile, n’ihi ezughị okè anyị, kwesịrị inwe mkpa nke a ugbu a.
Ndị Hibru 4:15, 16 na-ekwu na Jisọs—onye bụ́ onye nchụàjà ugbu a n’eluigwe—abụwokwa mmadụ, n’ihi ya ọ pụrụ inwe ọmịiko. N’ebe ole ndị nọ? N’ebe anyị nọ. Ole mgbe? Ugbu a. Mgbe ọ bụ mmadụ, Jisọs nwere ahụmahụ nke ndọlị na nrụgide nke ụmụ mmadụ na-enwe. N’otu oge, agụụ gụrụ Jisọs, akpịrị kpọkwara ya nkụ. N’agbanyeghịkwa na o zuru okè, ike gwụrụ ya. Nke ahụ kwesịrị imesi anyị obi ike. N’ihi gịnị? N’ihi na Jisọs nwere ahụmahụ nke ike ọgwụgwụ ebumpụta ụwa, ọ maara ụdị mmetụta anyị na-enwekarị. Chetakwa na Jisọs aghaghị ịnagide esemokwu ekworo n’etiti ndị ozi ya. (Mak 9:33-37; Luk 22:24) Ee, o nwere mmechuihu. Nke ahụ ó kwesịghị inye anyị obi ike na ọ na-aghọta mgbe anyị nwere mmechuihu, nkụda aka? N’ezie o kwesịrị.
Mgbe i nwere nkụda aka, gịnị ka ị pụrụ ime? Pọl ò kwuru na i ghaghị nnọọ ichere ruo mgbe Onye Isi Nchụàjà gị, bụ́ Jisọs, nyeere gị aka izu okè n’uche na n’ahụ, n’ime ụwa ọhụrụ ahụ? Ee e. Pọl kwuru, sị: “E wee meere anyị ebere, ka anyị wee hụkwa amara inyere anyị aka n’oge mkpa,” nke ahụ na-agụnyekwa ugbu a. Ọzọkwa, mgbe Jisọs bụ mmadụ, o nwere ahụmahụ nke ahụhụ na ihe isi ike dị iche iche, n’ịbụ “Onye a nwaworo ya n’ihe nile n’otu ụzọ ahụ a na-anwa anyị.” N’ihi ya mgbe anyị na-eche ihe ndị dị otú ahụ ihu, ọ dị njikere inyere anyị aka, n’ịdabere ná nghọta ya nke ihe anyị na-enwe ahụmahụ ya. Nke ahụ ọ́ dịghị adọta gị n’ebe ọ nọ?
Ugbu a rịba ama amaokwu nke 16. Pọl na-asị na anyị—nke a na-agụnyekwa ma ndị e tere mmanụ ma ndị nke atụrụ ọzọ ahụ—pụrụ iji nkwuwa okwu bịaruo Chineke nso. (Jọn 10:16) Onyeozi ahụ adịghị ekwu na anyị pụrụ ikwu nnọọ ihe ọ bụla anyị chọrọ ikwu n’ekpere, ọbụna okwu iwe, ndị na-adịghị egosi nsọpụrụ. Kama, ná ndabere nke àjà Jisọs na òkè ndị ọ na-ekere dị ka Onye Isi Nchụàjà, anyị pụrụ ịbịakwute Chineke n’agbanyeghị na anyị bụ ndị mmehie.
Ụzọ ọzọ anyị pụrụ isi rite uru ọbụna ugbu a site n’ije ozi nke Onye Isi Nchụàjà anyị, bụ́ Jisọs Kraịst, na-emetụta mmehie ma ọ bụ ndahie anyị. N’ezie anyị adịghị atụ anya na n’usoro ihe nke dị ugbu a, Jisọs ga-etinye uru zuru ezu nke àjà ya n’ọrụ n’ebe anyị nọ. Ọ bụrụgodị na o mee otú ahụ, anyị agaghịkwa enwe ndụ ebighị ebi. Ì chetara ọnọdụ ahụ e dekọrọ na Luk 5:18-26, nke metụtara nwoke ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ onye e si n’oghere dị n’elu ụlọ buda àkwà ya? Jisọs gwara ya, sị: “Nwoke, a gbagharawo gị mmehie gị nile.” Nke ahụ apụtaghị mmehie ụfọdụ kpọmkwem nke kpatara ahụ mkpọnwụ ahụ. Ọ ghaghị ịpụtaworịị mmehie nwoke ahụ n’ozuzu ya, ruokwa n’ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ ọ pụrụ ịgụnyewo ezughị okè o ketara eketa, nke na-akpata oké ahụhụ.
N’ịdabere n’àjà nke ọ ga-achụ, Jisọs pụrụ ibupụ mmehie nile nke nwoke ahụ, dị ka ewu ọpụpụ ahụ bupụrụ mmehie nile nke Israel n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie. (Levitikọs 16:7-10) Ma, nwoke ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ ka nọgidere bụrụ mmadụ. Ọ ga-eme mmehie ọzọ, ka oge na-agakwa ọ nwụrụ, dị ka ndị mmehie na-aghaghị ịnwụ. (Ndị Rom 5:12; 6:23) Ihe Jisọs kwuru apụtaghị na nwoke ahụ nwetara ndụ ebighị ebi kpọmkwem n’ebe ahụ. Kama e jiri ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke mgbaghara mmehie gọzie nwoke ahụ n’oge ahụ.
Ugbu a tụlee ọnọdụ anyị. N’ihi ịbụ ndị mmehie, anyị na-emehie kwa ụbọchị. (Jemes 3:2) Gịnị ka anyị pụrụ ime banyere nke ahụ? Leenụ, anyị nwere Onye Isi Nchụàjà nwere obi ebere n’eluigwe, onye anyị pụrụ isite n’aka ya gakwuru Jehova n’ekpere. Ee, dị ka Pọl dere, anyị nile pụrụ iji “nkwuwa okwu bịaruo ocheeze amara [Chineke], ka e wee meere anyị ebere, ka anyị wee hụkwa amara inyere anyị aka n’oge mkpa.” N’ihi nke a, ndị nile so n’atụrụ ọzọ ahụ taa na-enweta n’ezie uru ndị dị ebube, tinyere akọ na uche dị ọcha, site n’ije ozi onye isi nchụàjà nke Kraịst.
Ndị Kraịst nile nwere olileanya elu ala pụrụ ilepụ anya n’ihu maka uru ndị ka ukwuu n’ime ụwa ọhụrụ ahụ na-abịanụ. Mgbe ahụ Onye Isi Nchụàjà anyị nke eluigwe ga-etinye uru nke àjà ya n’ọrụ n’ụzọ zuru ezu, na-eduga ná mgbaghara zuru ezu nke mmehie. Ọ ga-emekwa ka uru ndị ka ukwuu rutere ha site n’ịhụ banyere ahụ ike nke anụ ahụ na nke ime mmụọ nke ndị nile. Jisọs ga-agbasakwa mmụta nke ndị Chineke n’elu ala n’ụzọ dị ukwuu, ebe ọ bụ na ịkụzi Iwu ahụ bụ ibu ọrụ bụ́ isi nke ndị nchụàjà n’Israel. (Levitikọs 10:8-11; Deuterọnọmi 24:8; 33:8, 10) N’ihi ya, ọ bụ ezie na anyị na-erite uru site n’ije ozi onye nchụàjà nke Jisọs ugbu a, ihe ka nnọọ ukwuu na-echere anyị!