Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 7/1 p. 5-8
  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Chọọ Eziokwu?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Chọọ Eziokwu?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụgwọ nke Ozizi Onye na Uche Ya
  • Gịnị Bụ Eziokwu Ahụ?
  • Eziokwu Nọ n’Ọrụ
  • Akụ̀ nke Kwesịrị Ụgwọ Ọ Bụla
  • Ndị Kraịst Na-efe Ofufe n’Ime Mmụọ na n’Eziokwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • “M Ga-eje Ije n’Eziokwu Gị”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Iṅomi Chineke Nke Eziokwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • ‘Nọgidenụ Na-eje Ije n’Eziokwu Ahụ’
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 7/1 p. 5-8

N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Chọọ Eziokwu?

ỌTỤTỤ òtù okpukpe na-azọrọ na ha nwere eziokwu, ha na-ejikwa ịnụ ọkụ n’obi eche ya n’ihu ndị ọzọ. Ma, n’etiti ha, ha na-enye ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu na-agbagwoju anya nke “eziokwu.” Nke a ọ̀ bụ nanị ihe àmà ọzọ nke na eziokwu bụ ihe onye na uche ya, na e nweghị eziokwu na-enweghị mgbagha? Ee e.

N’akwụkwọ ya bụ́ The Art of Thinking, Professor V. R. Ruggiero na-ekwupụta ijuanya ya na ọbụna ndị nwere ọgụgụ isi mgbe ụfọdụ na-ekwu na eziokwu dabeere n’uche onye. Ọ rụrụ ụka, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla ekpebie eziokwu nke onwe ya, o nweghịzi onye echiche ya ga-aka nke ibe ya mma. Ha ga-aha nhata. Ọ bụrụkwa na echiche nile hà nhata, gịnị mere a ga-eji na-enyocha isiokwu ọ bụla? N’ihi gịnị ka a na-eji na-egwu ala maka azịza nye ajụjụ nke nkà ihe ndị e gwutere n’ala? N’ihi gịnị ka a na-eji na-achọ ihe kpatara ahụ erughị ala n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa? N’ihi gịnị ka a na-eji achọ ngwọta nke ọrịa cancer? N’ihi gịnị ka a na-eji enyocha ụyọkọ kpakpando? Ezi uche dị n’ihe omume ndị a nanị ma ọ bụrụ na ụfọdụ azịza ka ndị ọzọ mma, ma ọ bụrụ na eziokwu bụ ihe dị iche site n’otú mmadụ si na-ele ihe anya, na nke ọ na-adịghị emetụta.”

N’ezie, ọ dịghị onye na-ekwere n’ezie na eziokwu adịghị. Mgbe ọ bịara n’ịdị adị nke ihe ndị a na-ahụ anya, dị ka ọgwụ, mgbakọ na mwepụ, ma ọ bụ iwu physics, ọbụna onye kasị na-akwado echiche onye na uche ya ga-ekwere na ụfọdụ ihe bụ eziokwu. Ònye n’ime anyị ga-anwa ịgba ụgbọ elu ma ọ bụrụ na anyị echeghị na iwu nke ikike ife n’elu bụcha eziokwu na-enweghị mgbagha? E nwere eziokwu ndị a pụrụ ịnwapụtali; ha gbara anyị gburugburu, anyị na-atọgbọkwa ndụ anyị na ha.

Ụgwọ nke Ozizi Onye na Uche Ya

Ma, ọ bụ n’ógbè omume ka njehie echiche onye na uche ya na-apụtakarịsị ìhè, n’ihi na ọ bụ n’ebe a ka ụdị echiche a meworo ihe kasị njọ. The Encyclopedia Americana na-ekwu isi ihe a: “A rụsiwo ya ụka ike ma ihe ọmụma, ma ọ bụ eziokwu a maara amara, ọ̀ bụ ihe mmadụ ga-enwetali . . . Otú ọ dị, o doro anya na mgbe ọ bụla a jụrụ ihe abụọ ahụ zuru okè bụ eziokwu na ihe ọmụma dị ka ihe a na-arọ ná nrọ ma ọ bụ ihe na-emerụ ahụ, ọha mmadụ na-eretọ.”

Ikekwe ị hụwo ụdị nretọ ahụ. Dị ka ihe atụ, ozizi omume nke Bible, nke na-asị hoo haa na mmekọahụ rụrụ arụ dị njọ, bụ nke ọ na-esi nnọọ ike iwerekwa dị ka eziokwu. Ụkpụrụ omume mgbe ọnọdụ dapụtara—“kpebiere onwe gị ihe dị gị mma”—bụ ihe a na-ahụkarị ugbu a. Ọ̀ dị onye pụrụ ịzọrọ na nretọ nke ọha mmadụ abụghị nke si n’echiche onye na uche ya nke a pụta? N’ezie ntiwapụ zuru ụwa ọnụ nke ọrịa ndị a na-ebute ná mmekọahụ, ezinụlọ ndị kewara ekewa, ntụrụ ime nke ndị nọ n’agbata afọ 13 na 19 na-enye ihe àmà zuru ezu maka nke a.

Gịnị Bụ Eziokwu Ahụ?

Ya mere ka anyị hapụ mmiri ọjọọ nke echiche onye na uche ya ma nyochatụ ihe Bible kọwara dị ka mmiri dị ọcha nke eziokwu. (Jọn 4:14; Mkpughe 22:17) N’ime Bible, “eziokwu” adịtụghị ka echiche efu, nke na-adịghị adị nke ndị ọkà ihe ọmụma ụwa na-arụ ụka banyere ya.

Mgbe Jisọs sịrị na nzube ya nile ná ndụ bụ ikwu banyere eziokwu, ọ na-ekwu banyere ihe ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi jiworo kpọrọ ihe kemgbe ọtụtụ narị afọ. N’ihe odide ha ndị dị nsọ, ọ dịworị anya ndị Juu gụrụ banyere “eziokwu” dị ka ihe gbara ọkpụrụkpụ, ọ bụghị ihe a na-ekwu n’ọnụ. N’ime Bible, “eziokwu” na-asụgharị okwu Hibru bụ́ “ʼemethʹ,” nke na-egosi ihe kwụrụ chịm, sie ike, na, ma eleghị anya nke kasị mkpa, kwesị ndabere.

Ndị Juu nwere ihe dị mma mere ha ji ele eziokwu anya n’ụzọ dị otú ahụ. Ha kpọrọ Chineke ha, bụ́ Jehova, “Chineke nke eziokwu.” (Abụ Ọma 31:5) Nke a bụ n’ihi na ihe ọ bụla Jehova sịrị na ya ga-eme, o mere ya. Mgbe o kwere nkwa, o mezuru ha. Mgbe o mere ka e buo amụma, ha mezuru. Mgbe o kwupụtara okwu ikpe ikpeazụ, e mezuru ha. Ọtụtụ nde ndị Isreal abụwo ndị ji anya ha hụ eziokwu ndị a. Ndị dere Bible n’okpuru ike mmụọ nsọ dekọrọ ha dị ka eziokwu nke akụkọ ihe mere eme a na-apụghị ịrụ ụka. N’adịghị ka akwụkwọ ndị ọzọ e lere anya dị ka ndị dị nsọ, e deghị Bible ná ndabere nke akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme ma ọ bụ akụkọ ifo. Ọ gbagidesiri ụkwụ ike n’eziokwu a pụrụ ịnwapụta anwapụta—eziokwu akụkọ ihe mere eme, ihe ndị e gwutere n’ala, sayensị, na nkà mmụta ọha mmadụ. Ka a sịkwa ihe mere ọbụ abụ ahụ ji kwuo banyere Jehova, sị: “Iwu Gị bụkwa eziokwu. . . . Ihe nile I nyere n’iwu bụ eziokwu. . . . Isi ihe nke okwu Gị bụ eziokwu”!—Abụ Ọma 119:142, 151, 160.

Jisọs Kraịst kwughachiri okwu nke abụ ọma ahụ mgbe ọ gwara Jehova n’ekpere: “Okwu Gị bụ eziokwu.” (Jọn 17:17) Jisọs maara na ihe ọ bụla Nna ya kwuru kwụ nnọọ chịm ma bụrụ ihe kwesịrị ndabere. N’otu aka ahụ, Jisọs ‘jupụtara n’eziokwu.’ (Jọn 1:14) Ụmụazụ ya mụtara ihe dị ka ndị ji anya ha hụ ihe merenụ, ma dekọọ ha maka ọgbọ ọdịnihu dum, na ihe nile o kwuru siri ike ka nkume, bụrụ eziokwu.a

Ma, mgbe Jisọs gwara Paịlet na ya abịawo n’ụwa ikwu eziokwu, o bu n’uche otu eziokwu kpọmkwem. Jisọs kwuru ihe ahụ n’azịza nye ajụjụ Paịlet: “Gị onwe gị bụ̀kwa Eze?” (Jọn 18:37) Alaeze Chineke, na òkè nke Jisọs n’onwe ya dị ka Eze ya, bụ nnọọ isiokwu, isi ihe, nke ozizi Jisọs mgbe ọ nọ n’ụwa. (Luk 4:43) Na Alaeze a ga-edo aha Jehova nsọ, wepụ ọkaaka ya n’ụta, ma weghachi ụmụ mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi ná ndụ ebighị ebi na obi ụtọ bụ “eziokwu” ahụ nke ezi ndị Kraịst nile na-ele anya ya. Ebe òkè Jisọs ná mmezu nke nkwa nile nke Chineke dị oké mkpa, ebe ọ bụkwa na amụma nile nke Chineke na-aghọ “Amen,” ma ọ bụ eziokwu, n’ihi ya, Jisọs pụrụ nnọọ ikwu, sị: “Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu, na ndụ.”—Jọn 14:6; 2 Ndị Kọrint 1:20; Mkpughe 3:14.

Ịghọta eziokwu a dị ka ihe kwesịrị ndabere kpam kpam pụtara oké ihe nye ndị Kraịst taa. Ọ pụtara na okwukwe ha na Chineke nakwa olileanya ha ná nkwa ya nile dabeere n’eziokwu, n’ihe ndị dị adị.

Eziokwu Nọ n’Ọrụ

Ọ bụghị ihe ijuanya na Bible jikọrọ eziokwu na ịrụ ọrụ. (1 Samuel 12:24; 1 Jọn 3:18) Nye ndị Juu na-atụ egwu Chineke, eziokwu abụghị isiokwu nke nkà ihe ọmụma ụwa; ọ bụ ụzọ nke ndụ. Okwu Hibru maka “eziokwu” pụkwara ịpụta “ikwesị ntụkwasị obi,” e jikwara ya kọwaa onye a pụrụ ịtụkwasị obi ime ihe o kwuru. Jisọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ile eziokwu anya n’echiche dị otú ahụ. O ji ịnụ ọkụ n’obi katọọ ihu abụọ nke ndị Farisii, olulu sara mbara dị n’etiti okwu ịgụ onwe onye dị ka onye ezi omume na ajọ omume ha. O setịpụkwara ihe nlereanya n’ibi ndụ kwekọrọ n’eziokwu ndị ọ kụziri.

Otú a ka o kwesịrị ịdị n’ebe ndị nile na-eso ụzọ Kraịst nọ. Nye ha, eziokwu nke Okwu Chineke, ozi ọma na-enye ume ọhụrụ nke Alaeze Chineke dị n’okpuru ọchịchị Jisọs Kraịst, dị nnọọ ukwuu karịa nanị ihe ọmụma. Eziokwu ahụ na-akpali ha ịrụ ọrụ, kwagide ha ibi ndụ kwekọrọ na ya ma soro ndị ọzọ kerịta ya. (Tụlee Jeremaịa 20:9.) Nye ọgbakọ ndị Kraịst nke narị afọ mbụ, ụzọ ndụ ha biri dị ka ndị na-eso ụzọ Kraịst bụ nke a maara mgbe ụfọdụ nanị dị ka “eziokwu” ma ọ bụ “ụzọ nke eziokwu.”—2 Jọn 4; 3 Jọn 4, 8; 2 Pita 2:2.

Akụ̀ nke Kwesịrị Ụgwọ Ọ Bụla

N’ezie, ịnakwere eziokwu nke Okwu Chineke na-ewe ihe. Na mbụ, nanị ịmụ eziokwu pụrụ ịbụ ahụmahụ na-etirisị ahụ. Akwụkwọ bụ́ The Encyclopedia Americana na-ekwu, sị: “Eziokwu bụ ihe a na-adịghị ekwenyekarị, n’ihi na ọ naghị akwado inwe echiche na-ezighị ezi banyere ndị ọzọ ma ọ bụ akụkọ ọdịbendi na-emeghị eme.” Ịhụ ka e kpughere nkwenkwe anyị dị ka ụgha pụrụ ịdị na-akụda mmụọ, karịsịa ma ọ bụrụ na ndị ndú okpukpe a tụkwasịrị obi kụziiri anyị ihe. Ụfọdụ pụrụ iji ahụmahụ ahụ tụnyere ịchọpụta na nne na nna a tụkwasịrị obi bụ, n’ezie, ndị na-eme mpụ na nzuzo. Ma ọ̀ bụ na ịchọpụta eziokwu okpukpe akaghị ibi ndụ onye a ghọgburu aghọgbu mma? Ọ̀ bụ na ọ kaghị mma ịmara eziokwu karịa ịbụ onye ụgha na-achịkwa?b—Tụlee Jọn 8:32; Ndị Rom 3:4.

Nke abụọ, ibi ndụ kwekọrọ n’eziokwu okpukpe pụrụ ifu anyị nnakwere nke ụfọdụ ndị bụbu ndị enyi anyị. N’ụwa ebe ọtụtụ ndị mmadụ “weere eziokwu nke Chineke gbanwere ụgha ha,” ndị rapagidesiri ike n’eziokwu nke Okwu Chineke yiri ndị na-adapụ n’ụkpụrụ e guzobeworo, a na-ajụkwa ma na-aghọtahie ha mgbe ụfọdụ.—Ndị Rom 1:25; 1 Pita 4:4.

Ma eziokwu ruru eru ịkwụ ụgwọ ndị a maka ya. Ịmara eziokwu na-eme ka anyị nwere onwe anyị pụọ n’ụgha, nghọgbu, na nkwenkwe ụgha dị iche iche. Mgbe anyị bikwara ndụ kwekọrọ na ya, eziokwu na-ewusi anyị ike ịtachiri ihe isi ike obi. Eziokwu Chineke bụ nnọọ ihe e kwesịrị ịdabere na ya ma gbagide ụkwụ n’ihe ndị mere eme, ọ na-enyekwa anyị olileanya dị ukwuu, nke na ọ na-enyere anyị aka iguzosi ike n’okpuru ule ọ bụla. Ka a sịkwa ihe mere Pọl onyeozi ji were eziokwu tụnyere belt, ma ọ bụ ihe ike n’úkwù nke akpụkpọ anụ sara asa, nke ndị soja na-eyi aga agha!—Ndị Efesọs 6:13, 14.

Ilu Bible na-asị: “Zụta eziokwu, erekwala ya; ee, amamihe, na ịdọ aka ná ntị, na nghọta.” (Ilu 23:23) Iwezụga eziokwu dị ka ihe dabeere n’uche onye ma ọ bụ ihe na-adịghị adị bụ ịbụ onye na-enwetaghị ọchịchọ kasị na-akpali akpali ma na-eju afọ nke ndụ na-enye. Ịchọta ya bụ ịchọta olileanya; ịmara na ịhụ ya n’anya bụ ịmara na ịhụ Onye Okike nke eluigwe na ala nakwa Ọkpara ọ mụrụ nanị ya n’anya; ibi ndụ kwekọrọ na ya bụ ibi ndụ nzube na udo nke uche, ugbu a na mgbe nile ebighị ebi.—Ilu 2:1-5; Zekaraịa 8:19; Jọn 17:3.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a E nwere ihe karịrị 70 ebe ná ndekọ Oziọma ndị ahụ ebe e dere na Jisọs jiri okwu pụrụ iche mesie ike ịbụ eziokwu nke okwu ya. Mgbe mgbe ọ ga-asị “Amen” (“N’ezie,” NW) iji webata otu ahịrị okwu. Okwu Hibru kwekọrọ na ya pụtara “ihe e ji n’aka, eziokwu.” Akwụkwọ bụ́ The New International Dictionary of New Testament Theology na-asị: “Site n’iji amen malite okwu ya Jisọs kọwara ha dị ka ndị e ji n’aka ma kwesị ndabere. O guzo na ha ma mee ha ịbụ ihe ya onwe ya na ndị na-ege ya ntị na-aghaghị imezu. Ha bụ okwu nke ịdị ukwuu na ikike ya.”

b Okwu Grik maka “eziokwu,” bụ́ a·leʹthei·a, sitere n’okwu pụtara “ihe a na-ekpuchighị ekpuchi,” ya mere eziokwu na-agụnyekarị mkpughe nke ihe zoburu ezo.—Tụlee Luk 12:2.

[Igbe dị na peeji nke 6]

Ò Nwere Mgbe Eziokwu Na-agbanwe?

AJỤJỤ ahụ bụ nke V. R. Ruggiero jụrụ n’akwụkwọ ya bụ́ The Art of Thinking. Ihe ọ zara bụ ee e. Ọ na-akọwa n’ụzọ sara mbara, sị: “Mgbe ụfọdụ ọ pụrụ iyi ka ọ na-eme otú ahụ, ma e leruo ya anya a ga-achọpụta na ọ dịghị eme otú ahụ.”

“Tụlee,” ka ọ na-asị, “ihe banyere onye dere akwụkwọ mbụ nke Bible, akwụkwọ Jenesis. Ruo ọtụtụ narị afọ ndị Kraịst nakwa ndị Juu kwenyere na nanị otu onye dere akwụkwọ ahụ. Mgbe oge na-aga a mara echiche nke a aka, e mesịakwa jiri nkwenkwe nke na ihe hà ka mmadụ ise so dee Jenesis dochie ya. E mesịa, na 1981, e bipụtara ihe si n’afọ ise nke nnyocha asụsụ nke Jenesis pụta, na-ekwu na e nwere 82 pasent ohere nke otu onye ide ya, dị ka e chere na mbụ.

“Eziokwu banyere odide nke Jenesis ọ̀ gbanwewo? Ee e. Nanị nkwenkwe anyị gbanweworo. . . . Ịma ihe ma ọ bụ amaghị ihe anyị agaghị agbanwe eziokwu.”

[Igbe dị na peeji nke 7]

Nsọpụrụ Maka Eziokwu

“NSỌPỤRỤ maka eziokwu abụghị nnọọ echiche na-ezighị ezi nke ọgbọ anyị nke na-agbalị ‘ikpughe’ ihe nile, n’ikwenye na ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịzọrọ n’ezie na ya nwere eziokwu. Ọ bụ àgwà nke na-ejikọ obi ike n’ọṅụ nke na a pụrụ n’ezie ịchọta eziokwu, na iji obi umeala nọrọ n’okpuru eziokwu mgbe ọ bụla na n’ebe ọ bụla ọ pụtara. A chọrọ ụdị uche ghere oghe ahụ nye eziokwu n’aka ndị na-efe Chineke nke eziokwu; ebe nsọpụrụ kwesịrị ekwesị maka eziokwu na-eme ka e jide n’aka ịkwụwa aka ọtọ ná mmeso mmadụ na-emeso onye agbata obi ya, ma n’okwu ma n’omume. Nke a bụ àgwà, dị ka anyị hụworo, nke ma A[gba] O[chie] ma A[gba] Ọ[hụrụ] na-agba akaebe ya.”—The New International Dictionary of New Testament Theology, Mpịakọta nke 3, peji nke 901.

[Foto dị na peeji nke 7]

Ọganihu sayensị dabeere ná mkpughe nke eziokwu sayensị

[Foto dị na peeji nke 8]

Eziokwu ahụ na-agụnye Alaeze ahụ na ngọzi ya nile

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya