Ndị Ọchịchị n’Ógbè Ndị Bụ Mmụọ
ÒNYE na-achị ụwa? È nwere ụdị nlekọta nke karịrị ikike mmadụ? Ka Chineke ọ̀ hapụwo ụmụ mmadụ ka ha lekọta onwe ha? N’ịchọ azịza nye ajụjụ ndị a, ka anyị buru ụzọ tụlee otu ihe merenụ n’oge ozi elu ala nke Jisọs Kraịst.
Ntakịrị oge mgbe baptism ya gasịrị, otu mmụọ e kere eke anya na-adịghị ahụ a na-akpọ Setan Ekwensu nwara Jisọs ọnwụnwa. N’ihota otu n’ime ọnwụnwa ndị ahụ, Bible na-asị: “Ekwensu kuuru [Jisọs] gaa ugwu dị nnọọ oké elu, wee gosi Ya alaeze nile nke ụwa, na ebube ha.” (Matiu 4:8) Setan gwaziri Jisọs, sị: “Gị ka m ga-enye ike a nile, na ebube ha: n’ihi na a rarawo ya nye n’aka m; onye ọ bụla m chọkwara inye ya m nye ya. Ya mere ọ bụrụ na Gị onwe gị ga-akpọ isiala n’ihu m, ihe a nile ga-abụ nke Gị.”—Luk 4:6, 7.
Setan zọọrọ na ya nwere ike n’elu alaeze, ma ọ bụ gọọmenti nile, nke ụwa nke a. Jisọs ọ̀ gbaghara nzọrọ a? Ee e. N’ezie, ọ kwadoro ya ịbụ eziokwu n’oge ọzọ site n’izo aka n’ebe Setan nọ dị ka “onye isi nke ụwa.”—Jọn 14:30.
Dị ka Bible si kwuo, Setan bụ mmụọ ozi ọjọọ nke nwere ike dị ukwuu. Onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi jikọrọ Setan na “ndị agha mmụọ nke ajọ ihe” ma kwuo banyere ha dị ka “ndị onwe ụwa nke ọchịchịrị a.” (Ndị Efesọs 6:11, 12) E wezụga nke ahụ, Jọn onyeozi sịrị na “ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Akwụkwọ Bible bụ́ Mkpughe na-ekwu na Setan “na-eduhie ụwa nile mmadụ bi.” (Mkpughe 12:9) N’okwu ihe atụ, Mkpughe na-egosikwa Setan dị ka dragọn nke na-enye usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụwa “ike ya, na ocheeze ya, na oké ịchịisi.”—Mkpughe 13:2.
Ihe ndị na-eme n’ụwa na-agbakwa akaebe na e nwere ike ọjọọ na-arụ ọrụ, na-akpali ụmụ mmadụ imerụ onwe ha ahụ. Gịnị ọzọ mere ka gọọmenti ụmụ mmadụ ghara inwe ike ime udo? Gịnị ọzọ ga-akpata ndị mmadụ ịkpọ ibe ha asị na igbu ibe ha? N’ịbụ onye nwere mgbagwoju anya site n’oké mgbukpọsị na ọnwụ e nwere n’otu agha obodo, otu onye hụrụ ihe merenụ sịrị: “Amaghị m otú ihe a pụrụ isiworị mee. Ọ bụ ihe karịrị ịkpọasị. Ọ bụ mmụọ ọjọọ na-eji ndị mmadụ a eme ihe iji bibie ibe ha.”
Onye Dị Adị nke Na-emegide Chineke
Taa, ọtụtụ ndị ekwenyeghị na Setan Ekwensu. Ma, ọ bụghị nnọọ ụkpụrụ ajọ omume dị n’ime ihe a kpọrọ mmadụ, dị ka ụfọdụ kwenyere. Ma Bible ma ihe na-eme n’ụwa na-egosi na ọ bụ onye dị adị n’ezie. Ọzọkwa, Setan na-emegide Jehova Chineke n’ụzọ nile. Otú ọ dị, Setan na Chineke ahaghị. Ebe Jehova bụ Onye Okike nwe ike nile, ọ bụ Onye Ọchịchị nke ihe nile e kere eke n’ụzọ ziri ezi.—Mkpughe 4:11.
Chineke ekeghị ihe e kere eke dị obi ọjọọ nke ga-emegide ya onwe ya. Kama nke ahụ, otu n’ime “ụmụ Chineke” bụ́ mmụọ ozi zụlitere ọchịchọ onwe onye nanị iji ike natara onwe ya ofufe bụ nke Jehova n’ụzọ ziri ezi. (Job 38:7; Jemes 1:14, 15) Ọchịchọ a dugara ya n’ịmalite ụzọ nke nnupụisi megide Chineke. Site n’inupụ isi, ihe e kere eke a bụ́ mmụọ mere onwe ya Setan (nke pụtara “onye mmegide”) na Ekwensu (nke pụtara “onye nkwutọ”). N’ihi ihe a nile, ị pụrụ iche ihe mere e jiworo kwere ka Setan na-achị ụwa.
Ihe Mere E Jiworo Nye Setan Ohere Ịchị
Ì chetara ihe Setan gwara Jisọs banyere ịchịisi n’elu ụwa? “Gị ka m ga-enye ike a nile . . . n’ihi na a rarawo ya nye n’aka m,” ka Setan kwuru. (Luk 4:6) Okwu ahụ na-egosi na Setan Ekwensu na-akpa ike nanị site na Chineke ikwe ka o mee otú ahụ. Ma gịnị mere Chineke ji kwere ka Setan dịrị?
Azịza nye ajụjụ ahụ metụtara ihe ndị mere n’ogige Iden, ebe Setan malitere ọrụ ya dị ka onye na-achị ụwa. N’ebe ahụ Setan nyere echiche nke na Chineke na-achị n’ụzọ ọjọọ site n’izochiri nwoke na nwanyị mbụ, bụ́ Adam na Iv, ihe dị mma. Dị ka Setan kwuru, ọ bụrụ na ha erie mkpụrụ osisi ahụ Chineke machibidoro iwu, a ga-atọhapụ ha. Adam na Iv ga-enwere onwe ha ma ghara ịdabere na Jehova. Ha ga-adị ka Chineke n’onwe ya!—Jenesis 2:16, 17; 3:1-5.
Site n’ịgha ụgha n’ụzọ dị otú a na ịrafu Iv, sitekwa na ya ime ka Adam mebie iwu Chineke, Setan webatara mmadụ abụọ mbụ ahụ n’okpuru idu ndú na nchịkwa ya. Ekwensu si otú a ghọọ chi ha, nke na-emegide Jehova. Otú ọ dị, kama ntọhapụ, Adam na Iv ghọrọ ndị ohu Setan, mmehie, na ọnwụ.—Ndị Rom 6:16; Ndị Hibru 2:14, 15.
N’ikwekọ n’ikpe ziri ezi ya nke zuru okè, Jehova pụrụ igbuworị Setan na mmadụ abụọ ndị ọhụrụ na-eso ụzọ ya ozugbo. (Deuterọnọmi 32:4) Ma, e nwere ihe iseokwu omume ọ gụnyere. Setan amawo aka izi ezi nke ụzọ Jehova si na-achị. N’amamihe ya, Chineke kwere ka oge gabiga ka e wee nwee ike ịnwapụta na adabereghị n’ebe ọ nọ na-eweta ọdachi. Jehova kwere ka ndị nnupụisi ahụ nọgide na-adị ndụ ruo oge ụfọdụ, na-enye Adam na Iv ohere ịmụ ụmụ.—Jenesis 3:14-19.
Ọ bụ ezie na ihe ka ọtụtụ n’ime ụmụ Adam edobeghị onwe ha n’okpuru ịchịisi Jehova, mmeso Chineke na-emeso ndị na-efe Ya ofufe egosiwo ịka ukwuu ya. Nghọta kwesịrị ekwesị nke ikike Jehova na-eweta obi ụtọ na ezi ịnọ ná ntụkwasị obi. N’aka nke ọzọ, nhụsianya na anọghị ná ntụkwasị obi esiwo n’ọchịchị mmadụ nọ n’okpuru nchịkwa Setan pụta. Ee, “mmadụ nwere ike n’ahụ mmadụ ibe ya imejọ ya.” (Eklisiastis 8:9) Ụmụ mmadụ achọtabeghị ezi ịnọ ná ntụkwasị obi na obi ụtọ na-adịgide adịgide n’okpuru ọchịchị mmadụ n’ụwa nke a na-atọgbọ n’ike Setan. Otú ọ dị, e nwere ezi ihe mere a ga-eji nwee nchekwube.
Oge Setan Dị Mkpụmkpụ!
Mmetụta Setan n’elu ala bụ na nwa oge. Jehova agaghị ekwe ka ọchịchị Setan nọtekwuo aka! N’oge na-adịghị anya a ga-eme ka Ekwensu ghara inwe ike ịrụ ọrụ ọzọ. Onye ọchịchị ọhụrụ ga na-eduzi elu ala, onye eze ezi omume nke Chineke n’onwe ya họọrọ. Eze ahụ bụ Jisọs Kraịst. Banyere nnọkwasị ọ nọkwasịrị n’ocheeze n’eluigwe, Mkpughe sịrị: “Alaeze nke ụwa aghọwo alaeze nke Onyenwe anyị [Jehova], na nke Kraịst Ya.” (Mkpughe 11:15) Usoro ọgụgụ oge nke Bible, tinyere mmezu nke amụma Akwụkwọ Nsọ, na-egosi na ihe omume a weere ọnọdụ n’afọ 1914.—Matiu 24:3, 6, 7.
Bible kọwakwara ihe merenụ nwa ntakịrị oge mgbe Jịsọs nọkwasịchara n’ocheeze. Ọ na-asị: “Agha wee pụta n’eluigwe: Maịkael [Jisọs Kraịst] na ndị mmụọ ozi ya buru agha megide dragọn ahụ [Setan Ekwensu]; dragọn ahụ na ndị mmụọ ozi ya wee buo agha; ha enweghịkwa ike, a hụghịkwa ọnọdụ ha ọzọ n’eluigwe. E wee chụda dragọn ukwu ahụ, bụ́ agwọ ochie ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan, onye na-eduhie ụwa nile mmadụ bi; a chụdara ya n’ụwa, chụdakwa ndị mmụọ ozi ya, ha na ya.”—Mkpughe 12:7-9.
Gịnị ga-esi ná nchụpụ a chụpụrụ Setan n’eluigwe pụta? Ndị nọ n’eluigwe pụrụ ịṅụrị ọṅụ, ma gịnị banyere ndị bi n’ụwa? “Ahụhụ ga-adịrị ụwa na oké osimiri,” ka Mkpughe 12:12 kwuru, “n’ihi na ekwensu arịdakwuruwo unu, na-enwe oké ọnụma, ebe ọ matara na o nwere nanị nwa oge.” N’ezie, nchụpụ a chụpụrụ Setan n’eluigwe ewetaworo ụwa ahụhụ. Akwụkwọ bụ́ The Columbia History of the World na-asị: “Oké ọdachi nke Agha Afọ Anọ nke 1914-1918 . . . gosiri Ebe Ọdịda Anyanwụ ụwa na ọ pụghị ichebe mmepeanya site n’iberibe ma ọ bụ mkpali ọjọọ nke onwe ya. Mmụọ nke Ebe Ọdịda Anyanwụ ụwa n’ezie agbakebeghị ma ọlị site na nkụrisi ahụ.”
Ihe karịrị mmụọ a kụrisiri akụrisi nke ukwuu na-aka ahụhụ nke ọgbọ a akara. Jisọs buru amụma, sị: “Mba ga-ebili imegide mba ọzọ, alaeze ga-ebilikwa imegide alaeze ọzọ: oké ụnwụ na ala ọma jijiji ga-adịkwa n’ebe dị iche iche.” O bukwara amụma banyere ọrịa na-efe efe. (Matiu 24:7, 8; Luk 21:11) Ọzọkwa, Bible na-asị na na “mgbe ikpeazụ” nke usoro ihe Setan, ọtụtụ ga-abụ “ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya, ndị na-ahụ ego n’anya, . . . ndị na-ekwenyeghị ndị mụrụ ha, . . . ndị na-adịghị agba ndụ.” Ndị mmadụ ga-abụkwa “ndị na-ahụ ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya.”—2 Timoti 3:1-5.
Agha, ọrịa na-efe efe, ụkọ nri, ala ọma jijiji, na nretọ nke ụkpụrụ omume ọma—ụdị ihe ndị ahụ nile ewerewo ọnọdụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ na-enweghị atụ kemgbe 1914, dị nnọọ ka Bible buru n’amụma. Ha na-egosi na onye iro nke Chineke na mmadụ nke na-enwe ọnụma—Setan Ekwensu—abụrụwo onye a chụpụrụ n’eluigwe, ugbu a ọ ghaghịkwa ịwụkwasị ọnụma ya na gburugburu ụwa. Ma Bible na-egosikwa na a gaghị ekwe ka Setan kpaa ike tekwuo aka. O nwere nanị “nwa oge” nke fọdụrụnụ ruo Amagedọn, mgbe Chineke ga-ebibi usoro ihe nke ụwa nke Setan na-achịkwa.
Gịnị ga-emezi Setan? Jọn onyeozi dere, sị: “M wee hụ mmụọ ozi ka ọ na-esi n’eluigwe rịdata, na-eji mkpịsị ugodi nke abyss ahụ n’aka ya, ya na oké mkpọrọ. O wee jide dragọn ahụ, bụ́ agwọ ochie ahụ, onye bụ Ekwensu na Setan, o wee kee ya agbụ [otu puku afọ], wee tụba ya n’ime abyss ahụ, mechie ya, kaakwa ya akara n’elu ya.” (Mkpughe 20:1-3) Lee ihe ahụ efe ọ ga-abụrụ ihe a kpọrọ mmadụ na-ata ahụhụ!
Ịṅụrị Ọṅụ n’Okpuru Ọchịchị Alaeze
Mgbe Setan pụụrụ anyị n’ụzọ, Alaeze Chineke n’okpuru Jisọs Kraịst ga na-achịkwa ihe omume nke ihe a kpọrọ mmadụ n’ụzọ zuru ezu. Kama inwe ọtụtụ gọọmenti n’elu ụwa, nanị otu gọọmenti eluigwe ga-afọdụ ịchị mbara ụwa nile. Agha ga-abụ ihe gaworo aga, udo ga-ejupụtakwa ebe nile. N’okpuru ọchịchị Alaeze Chineke, mmadụ nile ga-ebikọ ọnụ n’òtù ụmụnna na-ahụ n’anya.—Abụ Ọma 72:7, 8; 133:1; Daniel 2:44.
Ụdị onye ọchịchị dị aṅaa ka Jisọs ga-anwapụta ịbụ? Mgbe ọ nọ n’elu ụwa, o gosipụtara ịhụnanya dị omimi maka ndị mmadụ. Jisọs ji ọmịiko nye ndị agụụ na-agụ nri. Ọ gwọrọ ndị ọrịa ma weghachi ọhụhụ ụzọ nye ndị ìsì, ikwu okwu nye ndị na-adịghị ekwu okwu, na ụkwụ siri ike nye ndị ngwụrọ. Jisọs ọbụna weghachiri ndị nwụrụ anwụ ná ndụ! (Matiu 15:30-38; Mak 1:34; Luk 7:11-17) Ọrụ ebube ndị ahụ bụ ihe ngosi nke ihe ndị dị ebube ọ ka ga-eme dị ka Eze. Lee ihe magburu onwe ya ọ ga-abụ inwe ụdị onye ọchịchị dị otú a na-eweta uru!
Ndị nile doro onwe ha n’okpuru ọkaaka Jehova ga-enweta ngọzi ndị na-adịghị agwụ agwụ. Akwụkwọ Nsọ na-ekwe nkwa, sị: “Mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya ndị ìsì, ọ bụkwa ntị nke ndị ntị chiri ka a ga-emeghe. Mgbe ahụ ka onye ngwụrọ ga-amali dị ka ele, ire onye ogbi ga-etikwa mkpu ọṅụ.” (Aịsaịa 35:5, 6) N’ịtụ aka n’ihu n’ụbọchị ahụ dị ebube, Jọn onyeozi dere, sị: “M wee nụ oké olu ka ọ na-esi n’ocheeze ahụ daa, sị, Lee, ụlọikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ, Ọ ga-ebinyekwara ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke Ya, Chineke Onwe ya ga-anọnyekwara ha, bụrụkwa Chineke ha: Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.”—Mkpughe 21:3, 4.
Ihe ọṅụ nke ịchịisi Jehova Chineke ga-enye site n’aka Ọkpara ya, Jisọs Kraịst, ga-akwụghachi ihe karịrị ahụhụ ọ bụla nke anyị pụrụ inweworị ahụmahụ ya n’usoro ihe dị ugbu a nke Setan Ekwensu na-achịkwa. N’ụwa ọhụrụ Chineke e kwere ná nkwa, ndị mmadụ agaghị ajụ, sị, ‘Ònye n’ezie ka ihe nile dị n’aka?’ (2 Pita 3:13) Ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi ga-enwe obi ụtọ ma nọrọ ná ntụkwasị obi n’elu ala ebe Ndị Ọchịchị na-ahụ n’anya nọ n’ógbè ndị bụ́ mmụọ, Jehova na Kraịst. Gịnị mere ị gaghị enwe olileanya nke iso n’ime ndị ha ga-achị?
[Foto dị na peeji nke 7]
Ihe a kpọrọ mmadụ ga-anọ ná ntụkwasị obi n’elu ala ebe Alaeze Chineke na-achị
[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 4]
Foto NASA