Ụzọ Dị Obosara nke Nwere Ntakịrị Nnwere Onwe
Otu ezinụlọ nke mmadụ atọ mejupụtara—nna, nne, na nwatakịrị nwanyị—nọ n’ụlọ ha dị na Sydney, Australia, mgbe ụlọ ahụ malitere ịgba ọkụ. Ha gbalịrị isi na window mapụ, ma e ji ihe gechibido window ndị a. N’ihi ihe ngechibido ahụ nke nchebe, ndị na-agbanyụ ọkụ apụghị ịzọpụta ha. Nne na nna ahụ nwụrụ n’ime anwụrụ ọkụ na ọkụ ahụ na-agba. Nwatakịrị nwanyị ahụ mesịrị nwụọ n’ụlọ ọgwụ.
LEE ihe mwute ọ bụ na ezinụlọ nke a nwụrụ n’ihi ihe ndị a rụnyere nke kwesịrị ichebe ha! Ọ bụ ihe a na-ekwu n’oge anyị na ezinụlọ nke a abụghị nanị ha ka e ji ihe ngechibido na mkpọchi nchebe chebe ụlọ ha. Ọtụtụ n’ime ndị agbata obi nwekwara ụlọ na ngwongwo ndị yiri ebe ndị e wusiri ike. N’ihi gịnị? Ha na-achọ nchebe na udo nke uche. Lee ntụpọ ọjọọ nke ahụ bụ n’ọha mmadụ “nweere onwe ya” ebe ndị mmadụ na-enwe mmetụta nke ịnọ ná nchebe nanị mgbe a kpọchibidoro ha dị ka ndị mkpọrọ n’ebe obibi nke aka ha! N’ọnụ ọgụgụ ógbè na-arị elu, ụmụaka apụkwaghị igwuri egwu n’ebe ntụrụndụ dị nso n’enweghị nsogbu ma ọ bụ jee ụlọ akwụkwọ nanị ha n’abụghị ndị nne ma ọ bụ nna ma ọ bụ onye ọzọ meworo okenye sonyeere. N’ọtụtụ akụkụ nke ndụ, nnwere onwe na-apụ n’anya dị ka igirigi ụtụtụ.
Usoro Ndụ Gbanwere Agbanwe
Oge nke ndị nne na nna ochie anyị hà dị iche. Mgbe ha bụ ụmụaka, ọtụtụ mgbe ha pụrụ igwuri egwu ebe masịrị ha n’atụghị ụjọ. Mgbe ha meworo okenye, ha enweghị oké nchegbu ọ bụla banyere ihe mkpọchi na ihe ngechibido. Ha nwere mmetụta nke ịbụ ndị nweere onwe ha, ruokwa n’ókè ụfọdụ, ha nweere onwe ha. Ma ndị nne na nna ochie anyị hà ahụwo ka mmụọ nke ọha mmadụ gbanwere n’oge ndụ ha. Ọ ghọọla nke jụrụ oyi karị, nke na-achọ ọdịmma onwe onye karị; n’ọtụtụ ebe, ụjọ maka onye agbata obi anọchiela ịhụnanya maka onye agbata obi, bụ́ nke kpatara ọdachi ahụ e hotara n’elu. Ihe ya na enweghị nnwere onwe nke a na-arị elu na-agakọ bụ ndakpọ nọgidere na-aga n’ihu nke ụkpụrụ omume ọma. Ọha mmadụ aghọọla nke “ụkpụrụ omume ọhụrụ” dọọrọ mmasị ya, ma n’ezie, e ruwo ugbu a n’ọnọdụ ebe o siri ike ịhụ ụkpụrụ omume ọma ọ bụla.
Otu onye bụbu onye nkụzi mmụta na University of Queensland, bụ́ Dr. Rupert Goodman, na-ede, sị: “A na-ekpughe ndị na-eto eto ugbu a nye ụdị ndụ dị iche, nke ịchọ ihe ụtọ . . . ebe ‘onwe onye’ bụ isi: imeju ọchịchọ onwe onye, iche banyere onwe onye, obi ụtọ onwe onye, ọdịmma onwe onye.” Ọ na-ekwukwa, sị: “Ụkpụrụ omume ndị dị ka njide onwe onye, ịnapụ onwe onye ihe, ịrụsi ọrụ ike, ịghara ịdị na-emefusị ihe, ịkwanyere ịchịisi ùgwù, ịhụnanya na nsọpụrụ maka nne na nna . . . bụ ụkpụrụ ndị ọtụtụ ndị na-amaghị.”
Ọ Bụ n’Ezie Ụzọ Sara Mbara
Iche banyere onwe onye nke a gbasazuru ebe nile adịghị eju ndị maara amụma Bible nke ọma anya, n’ihi na Jisọs Kraịst dọrọ ndị na-ege ya ntị aka ná ntị, sị: “Obosara ka ọnụ ụzọ ahụ dị, mbara ka ụzọ ahụ dịkwa, nke na-eduba n’ịla n’iyi, ọtụtụ ka ha dịkwa, bụ́ ndị na-esi na ya na-aba. N’ihi na warara ka ọnụ ụzọ ahụ dị, mkpagide ka ụzọ ahụ dịkwa, nke na-eduba ná ndụ, ole na ole ka ha dịkwa, bụ́ ndị na-achọta ya.” (Matiu 7:13, 14) Ụzọ nke mbụ, bụ́ nke nwere ohere buru ibu maka ọtụtụ ndị njem, sara “mbara” n’ihi na ọ bụghị nke inwe ụkpụrụ Bible ndị na-achịkwa ụkpụrụ omume ọma na ndụ a na-adị kwa ụbọchị kpaara ókè. Ọ bụ ihe na-adọrọ adọrọ nye ndị nwere mmasị iche echiche otú o si masị ha na ibi ndụ otú o si masị ha—n’enweghị iwu ọ bụla, n’enweghị ihe ọ bụla a chọrọ ha n’aka.
N’eziokwu, ọtụtụ ndị họrọwooro ụzọ ahụ sara mbara na-azọrọ ịnụ ụtọ nke nnwere onwe ha. Ma ihe ka n’ime ha bụ ndị ọ bụ otu mmụọ ahụ nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na-akwali. Bible na-asị na ha bụ ndị “mmụọ ahụ nke na-arụsi ọrụ ike n’ime ụmụ nke ekwenyeghị ekwenye” na-achị. Mmụọ nke a na-akwali ha ibi ndụ ‘dị ka anụ ahụ si dị, na-eme ihe nile anụ ahụ chọrọ,’ ma hà bụ omume rụrụ arụ, iji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, ma ọ bụ oké nchụso nke ihe onwunwe, ùgwù, ma ọ bụ ike.—Ndị Efesọs 2:2, 3.
Ụzọ ahụ Sara Mbara Na-eduje n’Ọdachi
Rịba ama na ndị na-eje ije n’ụzọ ahụ sara mbara bụ ndị a na-enunye ime ‘ihe nile anụ ahụ chọrọ.’ Nke a na-egosi na ha enwereghị onwe ha ma ọlị—ha nwere nna ukwu. Ha bụ ndị ohu nke anụ ahụ. Ijere nna ukwu a ozi pụkwara iduje n’ọtụtụ nsogbu—ntiwapụ nke ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ, ezinụlọ ndị kewara ekewa, ahụ na uche ndị na-arịa ọrịa n’ihi iji ọgwụ na mmanya na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, ka a kpọtụ nanị ole na ole aha. Ọbụna omume ime ihe ike, izu ohi, na ndina n’ike gbanyere mkpọrọgwụ n’echiche nke iche banyere onwe onye bụ́ nke a zụlitere n’ụzọ mere otú o si masị gị nke a sara mbara. Oge nile kwa ụzọ nke a “na-eduba n’ịla n’iyi” nọgidere na-adị, mkpụrụ ya ga-aghọ nke na-adịwanye njọ.—Ilu 1:22, 23; Ndị Galetia 5:19-21; 6:7.
Tụlee ihe atụ abụọ mere eme ndị sitere Australia. Mary kwere ka ọnwụnwa merie ya, na-eji ọgwụ ndị na-eri ahụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi tinyere itinye aka n’omume rụrụ arụ.a Ma o nwetaghị obi ụtọ ọ na-achọ. Ọbụna mgbe ọ mụsịrị ụmụ abụọ, ndụ ya yiri ihe tọgbọrọ chakoo. O nwere oké ịda mbà n’obi mgbe ọ chọpụtara na ya ebutewo ọrịa AIDS.
Tom merụrụ ahụ n’ụzọ dị iche. “Etolitere m n’ogige chọọchị n’ebe ugwu nke Queensland,” ka ọ na-ede. “Mgbe m dị afọ 16, amalitere m ịṅụ oké mmanya. Nna m, ụmụnne nna m, na ndị enyi m, ha nile bụcha ndị na-aṅụ oké mmanya, ya mere o yiri ihe e kwesịrị ime. Eruru m n’ókè nke na m ga-aṅụ ihe ọ bụla, malite na biya ruo na methylated spirit. Amalitekwara m iji ịnyịnya eti ebe, mgbe ụfọdụ na-atụfu ihe ka ukwuu n’ego m tara ahụhụ kpata. Nke a abụghị ntakịrị ego, n’ihi na ego dị n’ọrụ m nke igbute okpete.
“Alụziri m nwunye, anyị mụkwara ụmụ. Kama iche ibu ọrụ m dị iche iche ihu, m na-eme ihe ndị enyi m na-eme—ṅụọ mmanya, gbaa chaa chaa, ma lụọ ọgụ. A kpọchiri m ọtụtụ mgbe n’ụlọ mkpọrọ di n’ógbè anyị. Ma ọbụna nke a enweghị mmetụta ọ bụla n’ahụ m. Ndụ m nọ na-adịwanye njọ. O jupụtara ná nsogbu.”
Ee, site n’ikwenyere ọchịchọ ọjọọ, Tom na Mary merụrụ ọ bụghị nanị onwe ha kamakwa ezinụlọ ha dị iche iche ahụ. N’ụzọ dị mwute, ọtụtụ ndị na-eto eto ndị ọzọ yiri ndị a na-adọta site na mmụọ ntụsara ahụ, nke nnwere onwe hiere ụzọ ndị a na-enye n’ụzọ ahụ sara mbara. A sị nnọọ na ndị na-eto eto pụrụ ịhụ ọdịdị ya na-eduhie eduhie. A sị nnọọ na ha pụrụ ịhụ ihe ndị bụ ezie n’ụzọ ahụ sara mbara—ụgwọ dị ukwuu nke ndị nile na-eje ije n’ime ya na-aghaghị ịkwụ n’ikpeazụ. N’eziokwu, ọ sara mbara, dịkwa mfe ịbanye. Ma ịsa mbara ya bụ ya bụ ihe ọjọọ dị n’ime ya. Ụzọ amamihe bụ iburu eziokwu ahụ na-adịghị mg̣bagha n’uche na “onye na-agha mkpụrụ nye anụ ahụ onwe ya ga-esite n’anụ ahụ weta mmebi dị ka ihe ubi.”—Ndị Galetia 6:8.
Otú ọ dị, e nwere nhọrọ ka mma. Ọ bụ ụzọ ahụ dị warara. Ma ruo n’ókè ha aṅaa ka ụzọ ahụ bụruru ihe mgbochi, ka ọ dịruru warara na mkpagide? Oleekwa ebe ọ na-eduje?
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a A gbanwewo aha dị iche iche.