Ị̀ Pụrụ Ịzụlitekwu Nghọta?
NGHỌTA bụ “ike ma ọ bụ ikike nke uche bụ́ nke o ji ekewa otu ihe n’ebe ibe ya nọ.” Ọ pụkwara ịbụ “ịdị nkọ ná nghọta” ma ọ bụ “ike nke ịmata ọdịiche dịgasị n’ihe ma ọ bụ n’aro dị iche iche.” Otú a ka Webster’s Universal Dictionary si kwuo ya. N’ụzọ pụtara ìhè, nghọta bụ àgwà e kwesịrị ịchọ inweta. A na-ahụta abamuru ya n’okwu Solomọn: “N’ihi na amamihe ga-aba n’obi gị, ihe ọmụma ga-adịkwa mkpụrụ obi gị ụtọ, . . . nghọta ga-echebe gị, ịnapụta gị n’ụzọ onye ọjọọ.”—Ilu 2:10-12.
Ee, nghọta ga-enyere anyị aka iguzogide ‘ụzọ onye ọjọọ,’ nke jupụtara n’ụba taa. Ọ na-ewetakwa ọtụtụ abamuru ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ mgbe ndị nne na nna na-anụ ka ụmụ ha na-asị, ‘Ị dịghị aghọta nnọọ!’ Site n’ịjụtụ ajụjụ, ndị nne na nna nwere nghọta maara ụzọ isi dọpụta mmetụta na isiokwu ndị na-enye ụmụ ha nsogbu. (Ilu 20:5) Di nke nwere nghọta ga-ege nwunye ya ntị ma nweta nghọta nke iche echiche na mmetụta ya kama ịdị ngwa iru nkwubi okwu. Nwunye ga-emekwa otu ihe ahụ n’ebe di ya nọ. Otú a, “amamihe ka e ji ewu ụlọ; ọ bụkwa nghọta ka e ji eme ka o guzosie ike.”—Ilu 24:3.
Nghọta na-enyere mmadụ aka ịchịkwa ọnọdụ dị iche iche nke ọma. Ilu 17:27 na-asị: “Onye na-egbochi okwu ọnụ ya maara ihe ọmụma: ọzọ, onye mmụọ ya jụụrụ ajụrụ bụ onye nghọta.” Onye nwere nghọta abụghị onye isi na-anụ ọkụ, na-amaba n’ọnọdụ ọ bụla n’echeghị echiche. Ọ na-eji nlezianya tụlee ihe ndị pụrụ ịdapụta tupu o tinye onwe ya. (Luk 14:28, 29) Ọ na-esokwa ndị ọzọ enwekwu mmekọrịta udo n’ihi na “ezi uche ya” na-eduga ya n’iji nlezianya ahọrọ okwu ya. (Ilu 10:19; 12:8) Ma, n’ụzọ kasị mkpa, onye nwere nghọta na-eji obi umeala aghọta erughị eru ya nile ma na-elegara Chineke karịa mmadụ anya maka nduzi. Nke a na-atọ Jehova ụtọ bụrụkwa ihe ọzọ mere a ga-eji zụlite nghọta.—Ilu 2:1-9; Jemes 4:6.
Enweghị Nghọta nke Israel
A na-ahụta ihe ize ndụ nke ejighị nghọta mee ihe n’otu ihe mere n’akụkọ ihe mere eme oge gboo nke Israel. N’ileghachi azụ n’oge ahụ, ọbụ abụ ahụ e nyere ike mmụọ nsọ sịrị: “Nna anyị ha enweghị uche ịghọta oké ọrụ Gị nile n’Ijipt; ha echetaghị ịba ụba nke ebere Gị nile; ha wee nupụ isi n’akụkụ oké osimiri, bụ́ n’Oké Osimiri Uhie.”—Abụ Ọma 106:7.
Mgbe Mosis dupụtara Israel pụọ n’Ijipt, Jehova egosiworị ike ya na nzube ya ịtọhapụ ndị ya site n’iti ike ọchịchị ụwa ahụ ihe otiti iri. Mgbe Fero hapụsịrị ndị Israel ka ha laa, Mosis duuru ha bịaruo n’akụkụ mmiri Osimiri Uhie. Otú ọ dị, ndị agha Ijipt zọọrọ ije chụsoo ha. O yiri nnọọ ka ndị Israel mara n’ọnyà nakwa na nnwere onwe ha nwetara ọhụrụ ga-adịru nnọọ nwa ntakịrị oge. Ya mere ihe ndekọ Bible na-asị: “Ha wee tụọ egwu nke ukwuu: ụmụ Israel wee tikuo Jehova.” Ha wee chigharịkwuru Mosis, na-asị: “Gịnị bụ nke a i meworo anyị, n’ime ka anyị si n’Ijipt pụta? . . . N’ihi na ọ dị anyị mma ife ndị Ijipt, karịa ịnwụ n’ọzara.”—Ọpụpụ 14:10-12.
Egwu ha tụrụ pụrụ iyi ihe a ga-aghọta ruo mgbe anyị chetara na ha ahụworị ngosipụta iri dị ịrịba ama nke ike Jehova. Ha maara n’onwe ha ihe Mosis ga-echetaghachiri ha nke dị ka 40 afọ n’ihu: “Jehova wee were aka dị ike, na ogwe aka e setịrị esetị, na egwu ukwu, na ihe ịrịba ama dị iche iche, na ihe ebube dị iche iche, mee ka anyị si n’Ijipt pụta.” (Deuterọnọmi 26:8) Ya mere dị ka ọbụ abụ ahụ dere, mgbe ndị Israel tụgharịrị megide ntụziaka Mosis, “ha enweghị uche ịghọta.” Ka o sina dị, Jehova, n’imezu nkwa ya, meriri ndị agha Ijipt ajọ mmeri.—Ọpụpụ 14:19-31.
Okwukwe anyị pụrụ ịma jijiji n’ụzọ yiri nke ahụ ma ọ bụrụ na anyị ejiri obi abụọ ma ọ bụ emeghị mkpebi zute ule. Nghọta ga-enyere anyị aka ile ihe anya nke ọma mgbe nile, na-echeta ụzọ Jehova si dị ukwuu karịa onye ọ bụla nke pụrụ ịdị na-emegide anyị. Nghọta ga-enyekwara anyị aka iburu n’uche ihe Jehova mewooro anyị. Ọ ga-enyere anyị ịghara ichefu mgbe ọ bụla eziokwu ahụ bụ na ọ bụ Onye “na-edebe ndị nile na-ahụ Ya n’anya.”—Abụ Ọma 145:18-20.
Inweta Nghọta Ime Mmụọ
Nghọta adịghị abịa ozugbo anyị mewere okenye. A ghaghị ịzụlite ya. Eze Solomọn nwere amamihe, onye a matara n’ụwa nile n’ihi nghọta ya, sịrị: “Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ nke chọtaworo amamihe bụ, ya na mmadụ nke na-enwepụta nghọta. N’ihi na ọzụzụ ahịa ya dị mma karịa ọzụzụ ahịa ọlaọcha, uru ya dị mma karịa ọlaedo ọma.” (Ilu 3:13, 14) Olee ebe Solomọn nwetara nghọta ya? Site n’aka Jehova. Mgbe Jehova jụrụ Solomọn ngọzi ndị ọ chọrọ, Solomọn zara: “Nye ohu Gị obi na-anụ ihe ikpe ndị Gị ikpe, ịghọta ihe dị iche iche n’etiti ezi ihe na ihe ọjọọ.” (1 Ndị Eze 3:9) Ee, Solomọn legaara Jehova anya dị ka onye inyeaka ya. Ọ rịọrọ maka nghọta, Jehova werekwa ya nye ya n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu. Gịnị si n’ime ya pụta? “Amamihe Solomọn wee baa ụba karịa amamihe ụmụ Ihu anyanwụ nile, karịakwa amamihe Ijipt nile.”—1 Ndị Eze 4:30.
Ahụmahụ Solomọn na-egosi anyị ebe anyị ga-eje maka ịchọta nghọta. Dị ka Solomọn, anyị kwesịrị ilegara Jehova anya. N’ụzọ dị aṅaa? Jehova ewepụtawo Okwu ya, bụ́ Bible, nke na-enye anyị izuzu banyere echiche ya. Mgbe anyị na-agụ Bible, anyị na-egwupụta ihe n’ime olulu nkume bara uru nke ihe ọmụma nke ga-enye blọkụ e ji ewu ụlọ nke nghọta ime mmụọ. E kwesịrị ịtụgharị uche n’ihe ọmụma anyị na-akwakọba site n’ọgụgụ Bible anyị. Mgbe ahụ, a pụrụ iji ya mee mkpebi ndị ziri ezi. Ka oge na-aga, ike nghọta anyị na-eto ruo n’ókè nke na anyị ga-abụ ‘ndị tozuru okè n’uche anyị,’ ndị nwere ike “ịtụle [ma ọ bụ, ịghọta n’etiti] ihe ọma na ihe ọjọọ.”—1 Ndị Kọrint 14:20; Ndị Hibru 5:14; tụlee 1 Ndị Kọrint 2:10.
N’ụzọ na-akpali mmasị, anyị ka pụrụ irite uru site ná nghọta nke Jehova nyere Solomọn. N’ụzọ dị aṅaa? Solomọn ghọrọ onye ọkà n’ikwupụta amamihe n’ụzọ ilu, nke bụ, n’ụzọ bụ isi, ọkpụrụkpụ amamihe sitere na mmụọ nsọ Chineke. E chebere ọtụtụ n’ime okwu ndị a n’akwụkwọ Ilu nke Bible. Ịmụ akwụkwọ ahụ na-enyere anyị aka irite uru ná nghọta Solomọn nakwa ịzụlite nghọta n’onwe anyị.
Iji nyere anyị aka n’ọmụmụ Bible anyị, anyị pụrụ iji ihe ndị na-enye aka maka ọmụmụ Bible, dị ka magazin Ụlọ Nche na Teta! N’ihe karịrị 116 afọ, Ụlọ Nche anọwo na-ekwupụta Alaeze Jehova nye ndị nwere obi eziokwu. Magazin Teta! na ndị bu ya ụzọ anọwo na-ekwu banyere ọnọdụ ụwa eri 1919. Magazin abụọ a na-enyocha eziokwu Bible, na-ewepụtakwa ihe ọmụma ime mmụọ na-aga n’ihu nke na-enyere anyị aka ịghọta ihie ụzọ, ma à na-akụzi ha na Krisendọm ma ọ bụ ma a na-achọta ha n’usoro iche echiche onwe anyị.—Ilu 4:18.
Ihe inyeaka ọzọ iji zụlitekwuo nghọta bụ mkpakọrịta ziri ezi. Otu n’ime ilu Eze Solomọn na-asị: “Na-ejeso ndị maara ihe, ị ga-amakwa ihe: ma enyi ndị nzuzu ka a ga-emejọ.” (Ilu 13:20) Ọ bụ ihe ihere na Rehoboam nwa Eze Solomọn echetaghị ilu nke a n’oge dị mkpa ná ndụ ya. Mgbe ọnwụ nna ya gasịrị, ebo ugwu iri nke Israel bịakwutere ya ịrịọ ka e mee ka ibu ha dị mfe. Na mbụ, Rehoboam gakwuuru ndị okenye maka ndụmọdụ, ndị a gosikwara nghọta mgbe ha gbara ya ume ka o gee ndị ọ na-achị ntị. E mesịa, ọ gakwuuru ụmụ okorobịa. Ndị a gosipụtara enweghị ahụmahụ na enweghị nghọta, na-agba Rehoboam ume iji iyi egwu zaghachi ndị Israel. Rehoboam gere ndị okorobịa ntị. Gịnị si n’ime ya pụta? Israel nupụrụ isi, Rehoboam tụfukwara akụkụ ka ukwuu nke alaeze ya.—1 Ndị Eze 12:1-17.
Akụkụ dị mkpa n’ịzụlite nghọta bụ ịchọ enyemaka nke mmụọ nsọ. N’ịtụleghachi ụzọ Jehova si mesoo ndị Israel mgbe ntọhapụ ha site ná ndọrọ n’agha laa Ijipt gasịrị, onye so dee Bible bụ́ Nehemaịa sịrị: “I nyekwara ezi Mmụọ nke Gị ime ka ha nwee uche.” (Nehemaịa 9:20) Mmụọ Jehova pụkwara inye aka ime ka anyị nwee uche. Ka ị na-ekpe ekpere maka mmụọ Jehova inye gị nghọta, jiri obi ike na-ekpe n’ihi na Jehova “na-enye mmadụ nile n’afọ ofufo, n’ataghịkwa ụta.”—Jemes 1:5; Matiu 7:7-11; 21:22.
Nghọta na Ezi Uche
Pọl onyeozi gosipụtara nghọta mgbe o kwusara eziokwu nye ndị mba ọzọ. Dị ka ihe atụ, n’otu oge, mgbe ọ nọ n’Atens, ọ “na-agabiga, na-ekirikwa” ihe ndị ha na-efe ofufe. Ihe gbara Pọl gburugburu bụ arụsị, oké iwe were mmụọ ya n’ime ya. Ugbu a o nwere mkpebi ime. Ò kwesịrị ịgbaso ụzọ nke ka mfe ma nọrọ jụụ? Ka ò kwesịrị ikwupụta hoo haa banyere ikpere arụsị nke jupụtara ebe nile nke na-ewe ya iwe, ọ bụ ezie na ime otú ahụ pụrụ ịdị ize ndụ?
Pọl jiri nghọta mee ihe. Ọ hụbuwo ebe ịchụàjà e dekwasịrị: “E nyere chi a na-amaghị ama.” N’ụzọ akọ, Pọl kwetara nsọpụrụ ha na-enye arụsị ma jirizie ebe ịchụàjà ahụ mee ihe iji webata isiokwu nke “Chineke Onye kere ụwa na ihe nile dị n’ime ya.” Ee, Jehova bụ Chineke ahụ ha na-amataghị banyere ya! Pọl si otú a lebara otú okwu ahụ si dị ha n’obi anya ma nwee ike ịgba àmà dị egwu. Gịnị ka ọ rụpụtara? Ọtụtụ ndị nabatara eziokwu ahụ, gụnyere ‘Daịọnisiọs onye Areopagọs, na otu nwanyị aha ya bụ Damaris, ha na ndị ọzọ.’ (Ọrụ 17:16-34) Lee aha ihe atụ nke nghọta Pọl bụ!
N’enweghị ajụjụ ọ bụla, nghọta adịghị abịa n’ụzọ dị mfe ma ọ bụ dị ka ihe ebumpụta ụwa. Kama site n’iji ndidi, ekpere, ezi mgbalị, mkpakọrịta amamihe, ọmụmụ Bible na ịtụgharị uche n’elu ya, na ịdabere na mmụọ nsọ Jehova, gị onwe gị kwa pụrụ ịzụlite ya.