“Ịhụnanya Adịghị Ada Mgbe Ọ Bụla”
DỊ KA SAMUEL D. LADESUYI SI KỌỌ
Ọ na-eju m anya mgbe m leghachiri anya azụ n’ọtụtụ afọ gafeworonụ wee hụ ihe nile a rụzuworo. Jehova anọwo na-eme ihe ndị dị ịtụnanya n’ụwa nile. N’Ilesha, Nigeria, anyị mmadụ ole na ole ndị malitere ime nkwusa na 1931 aghọọla 36 ọgbakọ. Ihe dị ka 4,000 ndị na-eme nkwusa na Nigeria mgbe ndị mbụ gụsịrị akwụkwọ na Watchtower Bible School of Gilead rutere na 1947 etoruwo ihe karịrị 180,000. Ná mmalite, anyị atụghị anya, ma ọ bụ ọbụna rọọ nrọ mmụba gaje iwere ọnọdụ. Lee ka m si nwee ekele na mụ ekerewo òkè n’ọrụ a dị ebube! Ka m kọọrọ gị banyere ya.
NNA m na-atụ mgbere égbè na nsị́ égbè site n’obodo gaa n’obodo; ọ naghị anọkebe n’ụlọ. Ọ lụrụ ụmụ nwanyị asaa ndị m maara banyere ha, ma ọ bụghị ha nile ka ha na ya bi. Nna m kuchiri nne m site n’aka nwanne ya nwoke nke nwụrụ anwụ. Ọ ghọrọ nwunye ya nke abụọ, esokwa m nne m biri.
Otu ụbọchị, nna m lọtara site n’ebe o jere ileta nwunye ya nke mbụ, bụ́ onye bi n’ime obodo dị nso. Ka ọ nọ n’ebe ahụ, ọ nụrụ na nwanne m nwoke nke otu nna ji mụ na ya na-eje akwụkwọ. Nwanne m nwoke otu nna ji mụ na ya dị afọ iri, mụ na ya bụ ọgbọ. Ya mere nna m kpebiri na mụ aghaghịkwa ije akwụkwọ. O nyere m pence itoolu—pence atọ maka akwụkwọ ọgụgụ na pence isii maka sleeti. Nke ahụ bụ na 1924.
E Guzobe Otu Ìgwè Ọmụmụ Bible
Malite n’oge m dị ntakịrị, enwere m ịhụnanya maka Okwu Chineke, bụ́ Bible. Oge ndị a na-akụzi Bible n’ụlọ akwụkwọ na-atọ m ụtọ, ndị nkụzi m na Sunday school na-ajakwa m mma mgbe nile. Ya mere na 1930, ejiri m ohere nke ije nụrụ okwu ihu ọha nke otu Onye Mmụta Bible si ebe ọzọ bịa kwuru, onye so ná ndị mbụ mere nkwusa n’Ilesha. Mgbe okwu ihu ọha ahụ gasịrị, o nyefere m otu akwụkwọ bụ́ The Harp of God n’asụsụ Yoruba.
Anọwo m na-ejechi Sunday school anya. Ugbu a amalitere m iji akwụkwọ The Harp of God ahụ na-eje ma jiri ya na-eme ihe n’ịgbagha ụfọdụ n’ime ozizi ndị a na-akụzi n’ebe ahụ. Arụmụka si na ya pụta, ndị ndú chọọchị dọkwara m aka ná ntị ugboro ugboro megide iso ‘nkụzi ọhụrụ’ a.
N’afọ na-eso ya, ka m nọ na-agbada n’okporo ámá, ezutere m ìgwè mmadụ nọ na-ege otu nwoke na-agwa ha okwu ntị. Onye ahụ na-agwa ha okwu bụ J. I. Owenpa, bụ́ Onye Mmụta Bible. Ọ bụ William R. Brown (onye a na-akpọkarị Bible Brown), bụ́ onye na-elekọta ọrụ nkwusa Alaeze ahụ site na Lagos, zijere ya n’ebe ahụ.a Anụrụ m na e guzobewo ntakịrị ìgwè ọmụmụ Bible n’Ilesha ịmụ akwụkwọ The Harp of God, ya mere esonyeere m ha.
Ọ bụ m kasị bụrụ obere nwa n’ìgwè ahụ—nanị nwa akwụkwọ, dị ihe dị ka afọ 16. Dị ka ọ na-adịkarị ekwesịrị m imeworị ihere, ọbụna tụọ ụjọ, iso ndị ikom nọ n’afọ ndị 30 ha na ndị mere okenye karị na-akpakọrịta n’ụzọ chiri anya. Ma obi dị ha ụtọ nke ukwuu ịhụ m n’etiti ha, ha gbakwara m ume. Ha dị ka ndị nna nye m.
Mmegide Ndị Ụkọchukwu
N’oge na-adịghị anya anyị malitere iche mmegide siri ike ihu site n’aka ndị ụkọchukwu. Ndị Katọlik, ndị Anglịkan, na ndị ọzọ, ndị na-alụsorịtabu ibe ha ọgụ, jikọrọ aka ugbu a imegide anyị. Ha na ndị chiifu obodo gbara izù ime ihe iji kụda mmụọ anyị. Ha zipụrụ ndị uwe ojii ịbịa jichie akwụkwọ anyị, na-azọrọ na ha na-emebi ndị mmadụ. Otú ọ dị, onye isi mpaghara ahụ dọrọ aka ná ntị na ha enweghị ikike iwere akwụkwọ ndị ahụ, izu abụọ kwa mgbe nke a gasịrị e kpoghachitere akwụkwọ ndị ahụ.
Mgbe nke a gasịrị, a kpọrọ anyị nzukọ bụ́ ebe anyị na oba, ma ọ bụ eze na-achị obodo zutere, tinyere ndị ọzọ a ma ama n’obodo. Anyị dị ihe dị ka 30 n’ọnụ ọgụgụ n’oge ahụ. Ihe e zubere bụ ịkwụsị anyị ịgụ akwụkwọ ndị ahụ dị “ize ndụ.” Ha jụrụ ma ànyị bụ ndị ọbịa, ma mgbe ha leruru anya n’ihu anyị, ha sịrị, “Ndị a bụ ụmụ anyị, ọ bụ ezie na e nwere ndị ọbịa sonyeere ha.” Ha gwara anyị na ha achọghị ka anyị nọgide na-amụ akwụkwọ okpukpe ndị ga-emerụ anyị ahụ.
Anyị lara n’ekwughị ihe ọ bụla, n’ihi na anyị ekpebiela na anyị agaghị aṅa ndị ahụ a ma ama ntị. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime anyị nwere nnọọ obi ụtọ n’ihe ndị anyị nọrịị na-amụta ma kpebie ịnọgide na-amụ ihe. Ya mere, ọ bụ ezie na e menyere ole na ole egwu ha wee si n’ìgwè anyị kewapụ onwe ha, ihe ka ọtụtụ n’ime anyị gara n’ihu n’ọmụmụ ihe anyị n’ime ụlọ ọrụ onye kapịnta. Anyị enweghị onye na-eduzi ya. Anyị na-eji ekpere amalite wee na-agụzi paragraf akwụkwọ ahụ onye gụchaa ibe ya agụọ. Mgbe ihe dị ka otu hour gasịrị, anyị ekpeekwa ekpere ọzọ wee lawazie. Ma a nọ na-eledo anyị, ndị chiifu ahụ na ndị ndú okpukpe nọgidekwara na-akpọ anyị òkù kwa izu abụọ ọ bụla ma na-adọ anyị aka ná ntị megide ịdị na-amụ akwụkwọ nke Ndị Mmụta Bible.
Ka ọ dị mgbe ahụ, anyị nọ na-agbalị iji ntakịrị ihe ọmụma anyị nwere na-enyere ndị mmadụ aka, ọtụtụ ndị na-ekwenyekwara anyị. Ndị mmadụ na-esonyekwa anyị otu otu. Obi dị anyị ụtọ nke ukwuu, ma anyị amatabeghị ihe dị ukwuu banyere okpukpe anyị so na-akpakọrịta.
Ná mmalite 1932 otu nwanna si Lagos bịa ịbịa nye aka hazie anyị, n’April kwa “Bible” Brown bịakwara. N’ịhụ na e nwere ìgwè ruru 30 n’ọnụ ọgụgụ, Nwanna Brown jụrụ ajụjụ banyere ọganihu anyị na-enwe n’ịgụ ihe anyị. Anyị kọọrọ ya ihe nile anyị maara. Ọ sịrị na anyị eruola ka e mee anyị baptism.
Ebe ọ bụ oge ọkọchị, anyị aghaghị ịga ná mmiri dị 14 kilomita site n’Ilesha, e mekwara ihe dị ka 30 n’ime anyị baptism. Malite n’oge ahụ gaa n’ihu, anyị hụrụ onwe anyị dị ka ndị nkwusa nke Alaeze wee malite ịga site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Anyị atụbughị anya ime nke a, ma ugbu a ọ dị anyị ọkụ n’obi isoro ndị ọzọ kerịta ihe ndị anyị maara. Anyị aghaghị ịkwadebe nke ọma iji nwee nkwado Bible iji gbaghaa ozizi ụgha ndị anyị zutere. Ya mere, ná nzukọ anyị dị iche iche, anyị na-atụlekarị ozizi ndị ahụ, jiri ihe ndị anyị maara na-enyerịtara ibe anyị aka.
Ọrụ Ime Nkwusa Anyị
Anyị ji nkwusa anyị jezuo akụkụ ime obodo mepere emepe. Ndị mmadụ mere anyị akaje, tikwasịkwa anyị mkpu, ma anyị ejighị nke ahụ kpọrọ ihe ọ bụla. Ọṅụ anyị dị ukwuu n’ihi na anyị nwere eziokwu, ọ bụ ezie na anyị ka nwere ihe dị ukwuu ịmụta.
Anyị na-eje site n’ụlọ ruo n’ụlọ kwa Sunday. Ndị mmadụ ga-ajụ ajụjụ, anyị ga-agbalịkwa ịza ha. N’uhuruchi Sunday anyị na-ekwu okwu ihu ọha. Anyị enweghị Ụlọ Nzukọ Alaeze ọ bụla, ya mere anyị na-enwe nzukọ anyị n’èzí. Anyị na-achịkọta ndị mmadụ, kwuo okwu ihu ọha ma gwa ha ka ha jụọ ajụjụ. Mgbe ụfọdụ anyị mere nkwusa n’ime chọọchị dị iche iche.
Anyị jekwara n’ógbè ebe ndị mmadụ na-anụtụbeghị maka Ndịàmà Jehova ma ọlị. Ihe ka n’ọtụtụ mgbe anyị na-eji ịnyịnya ígwè eje, ma mgbe ụfọdụ anyị anata bọs n’ego. Mgbe anyị rutere n’ime obodo, anyị ga-afụsi opi ike. Ime obodo ahụ dum ga-anụ olu anyị! Ndị mmadụ agbapụta ịbịa chọpụta ihe na-emenụ. Mgbe ahụ anyị ezie ozi anyị. Mgbe anyị zisịrị, ndị mmadụ na-azọ ụzọ iji nweta akwụkwọ anyị. Anyị tinyere ọnụ ọgụgụ dị ukwuu.
Anyị ji ịnụ ọkụ n’obi tụọ anya ọbịbịa nke Alaeze Chineke. Echetara m na mgbe anyị natara 1935 Yearbook, otu n’ime ụmụnna ahụ, mgbe ọ hụrụ usoro ihe mmụta dịịrị ụbọchị zuru ezu maka afọ ahụ, ọ jụrụ, sị: “Nke a ọ̀ pụtara na anyị ga-anọ otu afọ ọzọ agwụsịa tupu Amagedọn abịa?”
Ná nzaghachi onye nduzi jụrụ, sị: “Nwanna, ì chere na ọ bụrụ na Amagedọn abịa echi, na anyị ga-akwụsị ịgụ Yearbook?” Mgbe nwanna ahụ sịrị ee e, onye nduzi ahụ kwuru, sị: “Gịnị mekwaranụ i ji echegbu onwe gị?” Anyị tụsiri ụbọchị Jehova anya ike, anyị ka na-atụsikwa anya ya ike.
Afọ Ndị ahụ A Lụrụ Agha
N’oge Agha Ụwa nke Abụọ, a machibidoro mbubata nke akwụkwọ anyị iwu. Otu nwanna nwoke n’Ilesha chere onye uwe ojii akwụkwọ Riches n’ihu n’amaghị ama. Onye uwe ojii ahụ jụrụ, sị: “Ònye nwe akwụkwọ a?” Nwanna ahụ sịrị na ọ bụ nke ya. Onye uwe ojii ahụ kwuru na ọ bụ akwụkwọ a machibidoro iwu, kpụrụ ya gaa n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii, kpọchiekwa ya.
Ejere m n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii, mgbe m jụsịkwara ajụjụ, agbapụtara m nwanna ahụ. Mgbe ahụ akpọrọ m Nwanna Brown na telifon na Lagos ịkọrọ ya ihe merenụ. Ajụkwara m ya ma ọ dị iwu ọ bụla nke machibidoro nkesa nke akwụkwọ anyị. Nwanna Brown gwara m na ọ bụ nanị mbubata nke akwụkwọ anyị, ọ bụghị nkesa ya ka a machibidoro iwu. Ụbọchị atọ ka nke a gasịrị, Nwanna Brown zitere otu nwanna site na Lagos ịbịa hụ ihe na-emenụ. Nwanna a kpebiri na anyị nile kwesịrị iji magazin na akwụkwọ dị iche iche gaa ọrụ ime nkwusa echi ya.
Anyị gbasara gaa n’akụkụ dị iche iche. Mgbe ihe dị ka otu hour gasịrị, anatara m ozi na e jidewo ihe ka ukwuu n’ime ụmụnna ahụ. Ya mere mụ na nwanna ahụ bịara abịa sooro gaa n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii. Ndị uwe ojii ahụ jụrụ ige ntị ná nkọwa anyị nyere na a machibidoghị akwụkwọ ndị ahụ iwu.
A kpụgara ụmụnna 33 ahụ e jidere n’Ụlọikpe Onye Majie Ukwu dị n’Ife, esokwa m ha jee. Ndị obodo hụrụ mgbe e bu anyị apụ tiri mkpu, sị, “Nke ndị a agwụla taa. Ha agaghị alọghachikwa ebe a ọzọ.”
A tọgbọrọ ebubo ahụ n’ihu onye majie ukwu ahụ, bụ́ onye Nigeria. E gosiri magazin na akwụkwọ nile. Ọ jụrụ onye ọ bụ ya nyere onye isi ndị uwe ojii ikike ijide ndị a. Onye isi ndị uwe ojii ahụ zaghachiri na ya gbasoro ntụziaka sitere n’aka onye isi mpaghara ahụ. Onye majie ukwu ahụ kpọọrọ onye isi ndị uwe ojii ahụ na mmadụ anọ ná ndị nnọchiteanya anyị, tinyere m banye n’ime ụlọ ọrụ ya.
Ọ jụrụ onye Maazị Brown bụ. Anyị gwara ya na ọ bụ onye nnọchiteanya nke Watch Tower Society na Lagos. Mgbe ahụ ọ gwara anyị na ya anatawo otu ozi teligram site n’aka Maazị Brown banyere anyị. Ụbọchị ahụ, o yigharịrị ikpe ahụ wee kwe ka a gbapụta ụmụnna ahụ. N’ụbọchị na-eso ya ọ sịrị na ikpe amaghị ụmụnna ahụ wee tọhapụ ha, o nyekwara ndị uwe ojii iwu iweghachi akwụkwọ ndị ahụ.
Anyị laghachiri Ilesha, na-abụ abụ. Ọzọkwa ndị ahụ malitere iti mkpu, ma ugbu a ha na-asị, “Ha abịakwala ọzọ!”
E Mee Ka Ụkpụrụ Jehova Maka Alụmdi na Nwunye Doo Anya
Ọ bụ na 1947 ka mmadụ atọ mbụ gụsịrị akwụkwọ na Gilead rutere na Nigeria. Otu n’ime ụmụnna ndị a, bụ́ Tony Attwood, ka nọ ebe a, na-eje ozi na Betel nke Nigeria. Malite n’oge ahụ gaa n’ihu, anyị hụrụ oké mgbanwe ná nzukọ Jehova na Nigeria. Otu n’ime nnukwute mgbanwe ndị ahụ bụ otú anyị si ele ịlụ karịa otu nwanyị anya.
Alụrụ m Olabisi Fashugba na February 1941, ihe m maara zukwara ezu ime ka m ghara ịlụkwu nwunye ọzọ. Ma rute na 1947, mgbe ndị ozi ala ọzọ ahụ bịara, ịlụ karịa otu nwanyị bụ ihe a na-ahụkarị n’ọgbakọ dị iche iche. A gwara ụmụnna ndị lụrụ karịa otu nwanyị na ha lụrụ ihe karịrị otu nwunye n’amaghị na ọ dị njọ. Ya mere, ọ bụrụ na ha nwere nwunye abụọ ma ọ bụ atọ ma ọ bụ anọ ma ọ bụ ise, ha na ha pụrụ ịdị na-ebi, ma ha ekwesịghị ịlụkwa ọzọ. Nke ahụ bụ ụkpụrụ iwu anyị nwere.
Ọ nọworịị na-agụsi ọtụtụ ndị agụụ ike isonyere anyị, karịsịa Òtù Cherubim na Seraphim dị n’Ilesha. Ha sịrị na ọ bụ nanị Ndịàmà Jehova bụ ndị na-akụzi eziokwu. Ha kwetara ná nkụzi anyị, chọọkwa ịgbanwe ụlọ chọọchị ha dị iche iche ka ha ghọọ Ụlọ Nzukọ Alaeze. Anyị nọ na-arụsi ọrụ ike ịhụ na e mezuru nke a. Anyị nwere ọbụna ebe ụfọdụ maka ịzụ ndị okenye ha.
Ntụzi ọhụrụ banyere ịlụ karịa otu nwanyị bịaziri. Otu n’ime ndị ozi ala ọzọ ahụ kwuru okwu ná mgbakọ sekit e nwere na 1947. O kwuru okwu banyere ezi akparamàgwà na omume. O hotaziri 1 Ndị Kọrint 6:9, 10, bụ́ nke na-ekwu na ndị ajọ omume agaghị eketa Alaeze Chineke. O kwukwasịziri, sị: “Ndị lụrụ karịa otu nwanyị agaghịkwa eketa Alaeze Chineke!” Ndị na-ege ntị tiri mkpu, sị: “Ohoo, ndị lụrụ karịa otu nwanyị agaghị eketa Alaeze Chineke!” Ọ rụpụtara nkewa. O yiri agha. Ọtụtụ n’ime ndị ọhụrụ malitere isonyere anyị kwụsịrị isonyere anyị, na-asị: “Ekele dịrị Chineke, anyị agamibeghị.”
Otú ọ dị, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ụmụnna malitere imezi ụzọ ha site n’ịhapụ ndị nwunye ha ka ha laa. Ha nyere ha ego wee kwuo, sị, ‘Ọ bụrụ na ị ka bụ nwa agbọghọ, gaa chọrọ di ọzọ. Emehiere m ihe site n’ịlụ gị. Ugbu a aghaghị m ịbụ di nke otu nwunye.’
N’oge na-adịghị anya nsogbu ọzọ bilitere. Ụfọdụ, mgbe ha kpebisịrị ịkpọrọ otu nwunye na ịhapụ ndị ọzọ ka ha laa, gbanwere obi ha wee kpebie na ha chọrọ ịkpọrọghachi otu n’ime ndị nwunye ndị nke ọzọ ma hapụ onye nke a kpọrọbuuru ka ọ laa! Ya mere nsogbu malitekwara ọzọ.
Ntụzi ọzọkwa si n’isi ụlọ ọrụ dị na Brooklyn bịa, bụ́ nke dabeere na Malakaị 2:14, nke na-ezo aka na “nwunye ị lụtara n’okorobịa.” Ntụzi ahụ bụ na ndị bụ́ di kwesịrị ịkpọrọ nwunye mbụ ha lụrụ. Nke ahụ bụ otú e si dozie okwu ahụ n’ikpeazụ.
Ihe Ùgwù Dị Iche Iche nke Ije Ozi
Na 1947 Society malitere iwusi ọgbakọ dị iche iche ike na ịhazi ha na sekit na sekit. Ha chọrọ ịhọpụta ụmụnna nwoke tozuru okè dị ka ‘ndị ohu ụmụnna,’ ndị a na-akpọ ugbu a ndị nlekọta sekit. Nwanna Brown jụrụ m ma m̀ ga-anakwere ọrụ dị otú ahụ. Asịrị m ya na ihe mere m ji mee baptism bụ iji mee uche Jehova, na-ekwukwasị: “Ọ bụkwa gị mere m baptism. Mgbe e nwere ohere ugbu a ijere Jehova ozi n’ụzọ ka ukwuu, ì chere na m ga-ajụ?”
N’October afọ ahụ, a kpọrọ anyị mmadụ asaa na Lagos, nyekwa anyị ọzụzụ tupu e zipụ anyị n’ọrụ sekit. N’oge ahụ sekit dị iche iche buru ibu. E kewara Nigeria dum gaa na sekit asaa nanị. Ọgbakọ dị ole na ole.
Ọrụ anyị dị ka ndị ohu nke ụmụnna siri ike. Anyị na-eje ije ọtụtụ maịlụ kwa ụbọchị, ọtụtụ mgbe n’ime oké ọhịa na-ekpo ọkụ nke ebe okpomọkụ. Kwa izu anyị aghaghị ịga site n’otu ime obodo gaa n’ime obodo ọzọ. Mgbe ụfọdụ ọ na-adị m ka ụkwụ m ọ na-adapụ adapụ. Mgbe ụfọdụ echere m na m na-anwụ! Ma e nwekwara ọṅụ dị ukwuu, karịsịa n’ịhụ ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị mmadụ na-anakwere eziokwu ahụ. Leenụ, nanị n’ime afọ asaa, ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa e nwere na ná mba a mụbara okpukpu anọ!
Ekeere m òkè n’ọrụ sekit ruo 1955 mgbe ọrịa manyere m ịlataghachi Ilesha, bụ́ ebe a họpụtara m dị ka onye nlekọta obodo ukwu. Ịnọ n’ụlọ nyeere m aka itinyekwu uche n’inyere ezinụlọ m aka n’ụzọ ime mmụọ. Taa ụmụaka m isii nile na-ejere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi.
Ezi Ịhụnanya Adịghị Ada Mgbe Ọ Bụla
Mgbe m leghachiri anya azụ n’ọtụtụ afọ gafeworonụ, enwere m ihe dị ukwuu mere m ga-eji nwee ekele. E nwere ndakpọ olileanya, nchegbu, na ọrịa, ma e nwekwara ọtụtụ ọṅụ. Ọ bụ ezie na ihe ọmụma na nghọta anyị amụbawo n’ime ọtụtụ afọ gafeworonụ, amụtawo m site n’ahụmahụ, ihe 1 Ndị Kọrint 13:8 pụtara, bụ́ nke na-asị: “Ịhụnanya adịghị ada mgbe ọ bụla.” Ọ bụrụ na ị hụrụ Jehova n’anya ma nọgidesie ike n’ozi ya, ọ ga-enyere gị aka imeri ihe isi ike gị dị iche iche, ọ ga-agọzikwa gị n’ụba.
Ìhè nke eziokwu na-achasiwanye ike. Mgbe mbụ anyị malitere, anyị chere na Amagedọn ga-abịa ngwa ngwa; ọ bụ ya mere anyị ji na-eme ngwa ime ihe nile anyị pụrụ ime. Ma ihe ahụ nile baara anyị uru. Ọ bụ ya mere m ji kwenye n’okwu onye ọbụ abụ ahụ, sị: “M ga-eto Jehova n’ogologo ndụ m nile: M ga-abụku Chineke m abụ ọma mgbe m nọ na-adị ndụ.”—Abụ Ọma 146:2.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a A kpọrọ Nwanna Brown Bible Brown n’ihi omume ya nke izo aka na Bible dị ka o kwuchaa o bie.—Lee “Owuwe Ihe Ubi nke Ezi Onye Na-ezisa Ozi Ọma” n’Ụlọ Nche nke September 1, 1992, peji nke 32.
[Foto dị na peeji nke 23]
Samuel na Milton Henschel na 1955
[Foto dị na peeji nke 24]
Samuel na nwunye ya, bụ́ Olabisi