Onye Na-eme Anya Ụfụ
ASỤSỤ Hibru nwere nanị otu okwu e si wepụta “ekworo.” Mgbe ọ na-ezo aka n’ụmụ mmadụ na-eme mmehie, a pụrụ ịsụgharị okwu Hibru ahụ ịbụ “anya ụfụ” ma ọ bụ “ịma aka.” (Jenesis 26:14; Eklisiastis 4:4, NW) Otú ọ dị, asụsụ Grik nwere ihe karịrị otu okwu maka “ekworo.” Okwu ahụ bụ́ zeʹlos, dị ka nke Hibru ya na ya bụ otu, pụrụ izo aka na ma ekworo ezi omume ma nke mmehie. Okwu Grik ọzọ, bụ́ phthoʹnos, nwere ihe dị nnọọ n’echiche na-ezighị ezi. Na New World Translation, a na-asụgharịkarị ya “anya ụfụ.”
Olee otú e si jiri okwu ahụ bụ́ phthoʹnos mee ihe na Grik oge ochie? The Anchor Bible Dictionary na-ekwu, sị: “N’adịghị ka onye anyaukwu, onye phthonos na-emekpa ahụ abụkebeghị na ọ chọrọ ihe ọma ndị ahụ ọ na-achọghị ka onye ọzọ nwee; ọ chọrọ nanị ka onye ọzọ ahụ ghara inwe ha. Ọ dị iche n’ebe onye ahụ na-asọ mpi nọ n’ihi na nzube ya, n’adịghị ka nke onye ahụ na-asọ mpi, abụghị imeri kama igbochi ndị ọzọ imeri.”
Onye ahụ na-eme anya ụfụ mgbe mgbe adịghị aghọta na àgwà nke ya bụ isi ihe na-akpata nsogbu ya. “Otu n’ime ihe e ji amata phthonos,” ka otu akwụkwọ ọkọwa okwu ahụ na-akọwa, “bụ amaghị onwe onye nke ya. Onye phthoneros ahụ, ọ bụrụ na a kpọọ ya ka o kwuo ihe kpatara omume ya, ga-agwa onwe ya na ndị ọzọ mgbe nile na ndị ya na-aluso ọgụ kwesịrị ka a lụso ha ọgụ nakwa na ọ bụ ezighị ezi nke ọnọdụ ahụ na-akwali ya ịkatọ ya. A jụọ ya otú ọ pụrụ isi kwe omume ịgwa enyi ya okwu n’ụzọ ọ na-eme, ọ ga-asị na nkatọ ya bụ maka ọdịmma kasịnụ nke enyi ya.”
Ndị so dee Oziọma ahụ bụ́ Matiu na Mak na-eji okwu Grik bụ́ phthoʹnos akọwa ebumnobi nke ndị hụrụ maka ogbugbu Jisọs. (Matiu 27:18; Mak 15:10) Ee, ọ bụ anya ụfụ kpaliri ha. Otu ụdị mmetụta uche ahụ na-emerụ ahụ emewo ka ndị dapụrụ n’ezi ofufe ghọọ ndị kpọrọ ndị bụbu ụmụnna ha asị n’ụzọ dị njọ. (1 Timoti 6:3-5) Ka a sịkwa ihe mere na e gbochiri ndị na-eme anya ụfụ ịbanye n’ime Alaeze Chineke! Jehova Chineke enyewo iwu na ndị nile nọgidere na-abụ ndị “jupụtara n’anya ụfụ” “kwesịrị ọnwụ.”—Ndị Rom 1:29, 32; Ndị Galetia 5:21, tụlee NW.
[Foto dị na peeji nke 7]
Ekwela ka anya ụfụ bibie ndụ gị