Ekworo Maka Ofufe Dị Ọcha nke Jehova
“Jehova, Nke Onye ekworo bụ aha Ya, Chineke ekworo ka Ọ bụ.”—ỌPỤPỤ 34:14.
1. Gịnị bụ àgwà bụ́ isi nke Chineke, oleekwa otú o si emetụta ekworo ya?
JEHOVA na-akọwa onwe ya dị ka “Chineke ekworo.” Ị pụrụ ịjụ ihe kpatara ya, ebe okwu ahụ bụ́ “ekworo” nwere ihe ndị na-ezighị ezi ọ pụtara. N’ezie, àgwà bụ́ isi nke Chineke bụ ịhụnanya. (1 Jọn 4:8) Ya mere mmetụta ekworo ọ bụla o nwere aghaghị ịbụ maka ọdịmma nke ihe a kpọrọ mmadụ. N’ezie, anyị ga-ahụ na ekworo Chineke dị oké mkpa maka udo na ịdị n’otu nke eluigwe na ala.
2. Gịnị bụ ụzọ ụfọdụ e si asụgharị okwu Hibru maka “ekworo”?
2 Okwu Hibru ndị yiri okwu ahụ bụ́ “ekworo” pụtara ihe karịrị 80 ugboro n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara nke izo aka ndị a bụ n’ebe Jehova Chineke nọ. “Mgbe e ji ya mee ihe n’ebe Chineke nọ,” ka G. H. Livingston na-akọwa, “echiche nke ekworo adịghị apụta mmetụta uche na-adịghị mma, kama, nke ịnọgide na-achọ ka e fee nanị Jehova.” (The Pentateuch in Its Cultural Environment) Ya mere, New World Translation mgbe ụfọdụ na-asụgharị mkpọaha Hibru ahụ ịbụ “ịrụgidesi ike n’ofufe a na-akparaghị ókè.” (Ezikiel 5:13) Nsụgharị ọzọ kwesịrị ekwesị bụ “ịnụ ọkụ n’obi.”—Abụ Ọma 79:5; Aịsaịa 9:7, tụlee NW.
3. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ekworo pụrụ ịrụzu ihe dị mma?
3 E kere mmadụ inwe ike ikwo ekworo, ma ndaba ihe a kpọrọ mmadụ dabara ná mmehie akpatawo mgbagọ nke ekworo. Otú o sina dị, ekworo mmadụ pụrụ ịrụzu ezi ihe. Ọ pụrụ ịkwali mmadụ ichebe onye ọ hụrụ n’anya pụọ ná mmetụta ọjọọ. Ọzọkwa, ụmụ mmadụ pụrụ igosi ekworo maka Jehova na ofufe ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị. (1 Ndị Eze 19:10) Iji nye nghọta ziri ezi nke ụdị ekworo ahụ maka Jehova, a pụrụ ịsụgharị mkpọaha Hibru ahụ ịbụ “anabataghị ịma aka” n’ebe ọ nọ.—2 Ndị Eze 10:16 NW.
Nwa Ehi Ọlaedo Ahụ
4. Iwu dị aṅaa metụtara ekworo ezi omume pụtara ìhè n’Iwu Chineke nyere Israel?
4 Ihe atụ nke ekworo ezi omume bụ ihe mere mgbe ụmụ Israel natara Iwu ahụ n’Ugwu Saịnaị. Ugboro ugboro, a dọwo ha aka ná ntị ịghara ife chi mmadụ mere ofufe. Jehova gwara ha, sị: “Mụ onwe m bụ Jehova Chineke gị, bụ Chineke ekworo [ma ọ bụ, “Chineke nke na-achọ ofufe a na-akparaghị ókè; Chineke nke na-adịghị anabata ịma aka”].” (Ọpụpụ 20:5; tụlee Ọpụpụ 20:22, 23; 22:20; 23:13, 24, 32, 33, tụlee NW.) Jehova sooro ụmụ Israel gbaa ndụ, na-ekwe nkwa ịgọzi ha na ịkpọba ha n’ime Ala Nkwa ahụ. (Ọpụpụ 23:22, 31) Ndị ala ahụ kwukwara, sị: “Ihe nile Jehova kwuworo, anyị ga-eme ya, nụkwa.”—Ọpụpụ 24:7.
5, 6. (a) Olee otú ụmụ Israel si mehie n’ụzọ dị njọ mgbe ha mara ụlọikwu n’Ugwu Saịnaị? (b) Olee otú Jehova na ndị na-efe ya na-anọgidesi ike n’ihe si gosi ekworo ezi omume na Saịnaị?
5 N’agbanyeghị nke ahụ, n’oge na-adịghị anya ụmụ Israel mehiere megide Chineke. Ha ka nọ n’okpuru Ugwu Saịnaị. Mosis anọworị n’ugwu ahụ ọtụtụ ụbọchị, na-anatakwu ntụziaka n’aka Chineke, ndị ala ahụ rụgidekwara nwanne Mosis, bụ́ Erọn, ka o meere ha chi. Erọn kwere ma jiri ọlaedo nke ndị ala ahụ wetara mee nwa ehi. A zọọrọ na arụsị nke a nọchiri anya Jehova. (Abụ Ọma 106:20) N’echi ya ha chụrụ àjà ma “kpọọ isiala nye ya.” E mesịa ha wee ‘gwurie egwú.’—Ọpụpụ 32:1, 4, 6, 8, 17-19.
6 Mosis si n’ugwu ahụ rịdata mgbe ụmụ Israel na-eme ememe. Mgbe ọ hụrụ omume ha rere ure, o tiri mkpụ, sị: “Ònye dịịrị Jehova?” (Ọpụpụ 32:25, 26) Ụmụ Livaị gbakọtara n’ebe Mosis nọ, ọ tụzikwaara ha ka ha buru mma agha ma gbuo ndị ahụ na-ekpere arụsị na-eme oriri mkpọtụ. Na-egosipụta ekworo ha maka ofufe dị ọcha nke Chineke, ndị Livaị gburu ihe dị ka 3,000 nke ụmụnna ha ikpe mara. Jehova mesiri ihe omume a ike site n’izite ihe otiti n’isi ndị lanarịrịnụ. (Ọpụpụ 32:28, 35) Mgbe ahụ Chineke nyeghachiri iwu ahụ: “Ị gaghị akpọ isiala nye chi ọzọ: n’ihi na Jehova, Nke Onye ekworo bụ aha Ya, Chineke ekworo ka Ọ bụ.”—Ọpụpụ 34:14.
Beal Peoa
7, 8. (a) Olee otú ọtụtụ ụmụ Israel si daba n’ikpere arụsị dị oké njọ n’ihe metụtara Beal Peoa? (b) Olee otú ihe otiti sitere n’aka Jehova si bịa ná njedebe?
7 Iri afọ anọ mgbe nke a gasịrị, mgbe ọ fọrọ nke nta ka mba Israel banye n’Ala Nkwa ahụ, ndị inyom mara mma nke Moab na Midian ratara ọtụtụ ụmụ Israel ịbịa nụrụ ụtọ ile ọbịa ha. Ndị ikom a kwesịrị ịjụworị mmekọrịta chiri anya nke ndị na-efe chi ụgha. (Ọpụpụ 34:12, 15) Kama nke ahụ, ha gbagara dị ka ‘ehi ndị na-aga ebe a ga-egbu ha,’ na-esoro ndị inyom ahụ akwa iko, na-esorokwa ha n’ịkpọ isiala nye Beal Peoa.—Ilu 7:21, 22; Ọnụ Ọgụgụ 25:1-3.
8 Jehova zijere ihe otiti igbu ndị ahụ tinyere aka n’ofufe mmekọahụ a na-eme ihere. Chineke nyekwara ụmụ Israel aka ha dị ọcha iwu igbu ụmụnna ha ikpe mara. N’ụzọ iji enweghị nkwanye ùgwù na-akpọ ekwe nkụ, otu onye isi n’Israel aha ya bụ Zimri kpọbatara nwa nwanyị onye isi ndị Midian n’ime ụlọikwu ya isoro ya nwee mmekọahụ. Mgbe ọ hụrụ nke a, onye nchụàjà na-atụ egwu Chineke bụ́ Fineas gburu nwoke na nwanyị ahụ na-eme omume rụrụ arụ. Mgbe ahụ ihe otiti ahụ kwụsịrị, Chineke kwupụtakwara, sị: “Fineas . . . echigharịwo ọnụma m pụọ n’ebe ụmụ Israel nọ; o gosiri n’etiti ha ụdị iwe ekworo nke kwaliri m, ya mekwara n’ekworo m ekpochapụghị m ụmụ Israel.” (Ọnụ Ọgụgụ 25:11, The New English Bible) Ọ bụ ezie na a zọpụtara mba ahụ site ná mbibi, ọ dịkarịa ala 23,000 ụmụ Israel nwụrụ. (1 Ndị Kọrint 10:8) Ha tụfuru olileanya ha nọworo na-enwe ruo ogologo oge nke ịbanye n’Ala Nkwa ahụ.
Ihe Mmụta Ịdọ Aka ná Ntị
9. Gịnị dakwasịrị ndị Israel na Juda n’ihi na ha ekwoghị ekworo maka ofufe dị ọcha nke Jehova?
9 N’ụzọ dị mwute, o teghị anya ụmụ Israel chefuru ihe mmụta ndị a. Ha egosighị ekworo maka ofufe dị ọcha nke Jehova. ‘Ha weere arụsị nile ha a pịrị apị mee ka Chineke kwoo ekworo.’ (Abụ Ọma 78:58) N’ihi ya, Jehova kwere ka ebo iri nke Israel bụrụ ndị ndị Asirịa dọọrọ n’agha na 740 T.O.A. Ebo abụọ nke alaeze Juda fọdụrụnụ nwetara otu ụdị ntaramahụhụ ahụ mgbe e bibiri isi obodo ha bụ́ Jerusalem n’afọ 607 T.O.A. E gburu ọtụtụ ndị, a dọkwaara ndị lanarịrịnụ n’agha gaa Babilọn. Lee aha ihe atụ ịdọ aka ná ntị ọ bụ maka ndị Kraịst nile taa!—1 Ndị Kọrint 10:6, 11.
10. Gịnị ga-eme ndị na-ekpere arụsị na-enweghị nchegharị?
10 Otu ụzọ n’ime ụzọ atọ nke ndị bi n’ụwa—ihe dị ka 1,900 nde—ugbu a na-asị na ha bụ ndị Kraịst. (1994 Britannica Book of the Year) Ihe ka ọtụtụ n’ime ndị a nọcha na chọọchị ndị na-eji ihe oyiyi okpukpe, ihe oyiyi dị iche iche, na obe eme ihe n’ofufe ha. Jehova ahapụghị ndị nke ya bụ́ ndị kpaliri ya ikwo ekworo site n’ikpere arụsị ha. Ọ gaghịkwa ahapụ ndị na-asị na ha bụ ndị Kraịst bụ́ ndị na-eji ihe a na-ahụ anya na-efe ofufe. “Chineke bụ Mmụọ: ndị na-akpọ isiala nye Ya aghaghi ịkpọ isiala n’ime mmụọ na eziokwu,” ka Jisọs Kraịst kwuru. (Jọn 4:24) Ọzọkwa, Bible na-adọ ndị Kraịst aka ná ntị iche nche megide ikpere arụsị. (1 Jọn 5:21) Ndị na-ekpere arụsị na-echegharịghị so n’ime ndị na-agaghị eketa Alaeze Chineke.—Ndị Galetia 5:20, 21.
11. Olee otú onye Kraịst pụrụ isi bụrụ onye na-ekpere arụsị n’akpọghị isiala nye arụsị, gịnịkwa ga-enyere mmadụ aka izere ụdị ikpere arụsị ahụ? (Ndị Efesọs 5:5)
11 Ọ bụ ezie na ezi onye Kraịst enweghị mgbe ọ ga-akpọ isiala nye arụsị, ọ ghaghị izere ihe ọ bụla Chineke na-ele anya dị ka ikpere arụsị, ihe na-adịghị ọcha, na ihe mmehie. Dị ka ihe atụ, Bible na-adọ aka ná ntị, sị: “Meenụ ka ihe nile dị unu n’ahụ nke dị n’elu ụwa nwụọ; ịkwa iko, adịghị ọcha, ọchịchọ ọjọọ, agụụ ihe ọjọ, na anyaukwu ahụ, n’ihi na nke a bụ ikpere arụsị; ọ bụkwa n’ihi ihe ndị a ka iwe Chineke na-abịakwasị ụmụ nke ekwenyeghị ekwenye.” (Ndị Kọlọsi 3:5, 6, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Irubere okwu ndị a isi na-achọ ịjụ omume rụrụ arụ. Nke a na-achọ izere ntụrụndụ nke a haziri iji kpalie agụụ mmekọahụ na-adịghị ọcha. Kama imeju agụụ ahụ, ezi ndị Kraịst na-enwe ekworo maka ofufe dị ọcha nke Chineke.
Ihe Atụ Ndị Sochirinụ nke Ekworo Chineke
12, 13. Olee otú Jisọs si setịpụ ihe nlereanya pụrụ iche n’igosi ekworo maka ofufe dị ọcha nke Chineke?
12 Ihe atụ pụtakarịsịrị ìhè nke nwoke gosiri ekworo maka ofufe dị ọcha nke Chineke bụ Jisọs Kraịst. N’afọ mbụ nke ozi ya, ọ hụrụ ndị ahịa anyaukwu na-azụ ahịa n’èzí nke ụlọ nsọ ahụ. Ndị Juu bịara nleta pụrụ ịchọworị ije ozi nke ndị na-agbanwe ego iji gbanwee ego mba ọzọ ha maka ego nke a ga-anabata dị ka ụtụ isi ụlọ nsọ. Ọ dịkwa ha mkpa ịzụ ụmụ anụ na nnụnụ iji chụọ àjà ndị Iwu Chineke chọrọ ha n’aka. Achụmnta ego ndị dị otú ahụ kwesịrị ịbụworị nke e mere ná mpụga nke èzí ụlọ nsọ ahụ. Nke ka njọ, ihe àmà na-egosi na ndị ahịa ahụ na-eji n’ihi mkpa okpukpe nke ụmụnna ha na-eri uru na-ezighị ezi site n’ịna oké ọnụ ahịa. N’ịbụ onye ekworo maka ofufe dị ọcha nke Chineke ripịara, Jisọs jiri ụtarị chụpụsịa atụrụ na ehi ndị ahụ. O kpukwara table nke ndị ahụ na-agbanwe ego ihu, na-asị: “Unu emela ụlọ Nna m ka ọ bụrụ ụlọ ahịa.” (Jọn 2:14-16) Jisọs si otú a mezuo okwu nke Abụ Ọma 69:9: “Ekworo ụlọ Gị eripịawo m.”
13 Afọ atọ n’ihu, Jisọs hụrụ ndị ahịa anyaukwu ka ha na-azụ ahịa n’ụlọ nsọ Jehova ọzọkwa. Ọ̀ ga-eme ka ọ dị ọcha nke ugbo abụọ? Ekworo ya maka ofufe dị ọcha nke Chineke siri nnọọ ike mgbe ahụ dị ka o siri mgbe ọ malitere ozi ya. Ọ chụpụrụ ma ndị na-ere ere ma ndi na-azụ azụ. O kwukwara ihe siri ike karị kpatara omume ya, na-asị: “É deghị ya n’akwụkwọ nsọ, sị, A ga-akpọ ụlọ m ụlọ ekpere mba nile? ma unu onwe unu emewo ya ọ́gbà ndị na-apụnara mmadụ ihe.” (Mak 11:17) Lee ihe nlereanya magburu onwe ya nke ịnọgide na-egosi ekworo Chineke nke a bụ!
14. Olee otú ekworo Jisọs nwere maka ofufe dị ọcha kwesịrị isi metụta anyị?
14 Ọdịdị nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst e buliworo elu ugbu a agbanwebeghị. (Ndị Hibru 13:8) Na narị afọ nke 20 nke a, o nwekwara nnọọ ekworo maka ofufe dị ọcha nke Nna ya dị ka o nwere mgbe ọ nọ n’ụwa. A pụrụ ịhụ nke a site n’ozi Jisọs zigaara ọgbakọ asaa ahụ nke e dekọrọ n’akwụkwọ Mkpughe. Ndị a na-enwe mmezu ha bụ́ isi ugbu a, “n’ụbọchị Onyenwe anyị.” (Mkpughe 1:10; 2:1-3:22) N’ọhụụ Jọn onyeozi hụrụ Jisọs Kraịst ahụ e buliworo elu ka ‘anya ya abụọ dị ka ire ọkụ.’ (Mkpughe 1:14) Nke a na-egosi na ọ dịghị ihe Kraịst na-adịghị ahụ ka ọ na-enyocha ọgbakọ ahụ nile iji hụ na ha dịgidere ọcha ma kwesị ekwesị maka ozi Jehova. Ọ dị ndị Kraịst nke oge a mkpa iburu n’uche ịdọ aka ná ntị Jisọs megide ịnwa ijere nna ukwu abụọ ozi—Chineke na akụ̀. (Matiu 6:24) Jisọs gwara ndị na-ahụ ihe onwunwe n’anya nke ọgbakọ Leọdisịa, sị: “N’ihi na ị dị ṅaraṅara, i kpoghịkwa ọkụ ị jụghịkwa oyi, M ga-agbọpụ gị n’ọnụ m. . . . Na-anụ ọkụ n’obi, chegharịakwa.” (Mkpughe 3:14-19) Site n’okwu ọnụ na ihe nlereanya, ndị okenye ọgbakọ a họpụtara ahọpụta kwesịrị inyere ndị kwere ekwe ibe ha aka izere ọnyà nke ịhụ ihe onwunwe n’anya. Ndị okenye aghaghị ichebe ìgwè atụrụ ahụ pụọ n’omume rụrụ arụ nke ụwa nke a nwere oké ọchịchọ mmekọahụ. Ọzọ, ndị Chineke agaghị anwa anwa kwe ka mmetụta Jezebel dịrị n’ọgbakọ.—Ndị Hibru 12:14, 15; Mkpughe 2:20.
15. Olee otú Pọl onyeozi si ṅomie Jisọs n’igosi ekworo maka ofufe dị ọcha nke Jehova?
15 Pọl onyeozi bụ onye na-eṅomi Kraịst. Iji chebe ndị Kraịst e mere baptism ọhụrụ pụọ ná mmetụta na-ezighị ezi n’ụzọ ime mmụọ, ọ sịrị: “Eji m ekworo Chineke na-ekworo unu.” (2 Ndị Kọrint 11:2) Tupu nke a, ekworo Pọl nwere maka ofufe dị ọcha akwaliwo ya inye otu ọgbakọ a ntụziaka ịchụpụ otu onye na-akwa iko na-enweghị nchegharị bụ́ onye bụ mmetụta na-emetọ emetọ. Ntụziaka ahụ e dere n’ike mmụọ nsọ nke e nyere n’oge ahụ abụrụwo oké ihe enyemaka nye ndị okenye taa ka ha na-agbalị idebe ihe karịrị 75,500 ọgbakọ nke Ndịàmà Jehova ọcha.—1 Ndị Kọrint 5:1, 9-13.
Ekworo Chineke Na-abara Ndị Ya Uru
16, 17. (a) Mgbe Chineke nyere Juda oge ochie ntaramahụhụ, àgwà dị aṅaa ka mba dị iche iche gosịrị? (b) Mgbe 70 afọ nke ndọrọ n’agha Juda gasịrị, olee otú Jehova si gosi ekworo maka Jerusalem?
16 Mgbe Chineke nyere ndị Juda ntaramahụhụ site n’ikwe ka a dọrọ ha n’agha laa Babilọn, a kwara ha emo. (Abụ Ọma 137:3) N’ịkpọasị ekworo, ndị Edọm ọbụna nyeere ndị Babilọn aka iwetara ndị Chineke ọdachi, Jehova matakwara nke a. (Ezikiel 35:11; 36:15) Ná ndọrọ n’agha ndị lanarịrịnụ chegharịrị, mgbe 70 afọ gasịkwara Jehova weghachiri ha n’ala ha.
17 Na mbụ, ndị Juda nọ n’oké nsogbu. E bibiwo obodo Jerusalem na ụlọ nsọ ya. Ma mba ndị gbara ya gburugburu megidere mgbalị nile e mere iji wughachi ụlọ nsọ ahụ. (Ezra 4:4, 23, 24) Olee ihe Jehova chere banyere nke a? Ihe ahụ e dekọrọ n’okpuru ike mmụọ nsọ na-ekwu, sị: “Otú a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị: Ekwoworo m Jerusalem na Zaịọn oké ekworo. Ọ bụkwa iwe ukwu ka Mụ onwe m na-ewesa mba nile ndị nọ jụụ: n’ihi na Mụ onwe m were iwe nke nta, ma ha onwe ha nyere aka ime ha ihe ọjọọ. N’ihi nke a ka Jehova sịrị otú a: Ejiwo m obi ebere nile laghachikwute Jerusalem; a ga-ewu ụlọ m n’ime ya, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova nke usuu nile nke ndị agha pụta).” (Zekaraịa 1:14-16) N’imezu nkwa nke a, e wughachiri ụlọ nsọ ahụ na obodo Jerusalem n’ụzọ gara nke ọma.
18. Ahụmahụ dị aṅaa ka ezi ndị Kraịst nwere n’oge Agha Ụwa Mbụ?
18 Ọgbakọ nke ezi ndị Kraịst nwere otu ụdị ahụmahụ a na narị afọ nke 20. N’oge Agha Ụwa Mbụ, Jehova nyere ndị ya ntaramahụhụ n’ihi na ha anọpụghị iche kpam kpam n’agha ụwa ahụ. (Jọn 17:16) Chineke kwere ka ndị ọchịchị kpagbuo ha, ndị ụkọchukwu nke Krisendọm ṅụrịkwara oṅụ maka ọdachi a. N’ezie, ndị ụkọchukwu nọ na-ebute ụzọ n’ime ka ndị ọchịchị machibido ọrụ nke Ndị Mmụta Bible iwu, dị ka a na-akpọ Ndịàmà Jehova mgbe ahụ.—Mkpughe 11:7, 10.
19. Olee otú Jehova siworo gosi ekworo maka ofufe ya dị ọcha kemgbe 1919?
19 Otú ọ dị, Jehova gosiri ekworo maka ofufe ya ma weghachi ndị ya chegharịrịnụ n’ihu ọma ya n’afọ na-eso afọ agha ahụ bụ́ 1919. (Mkpughe 11:11, 12) N’ihi nke a, ọnụ ọgụgụ nke ndị na-enye Jehova otuto mụbara site ihe n’erughị 4,000 na 1918 ruo ihe dị ka 5 nde taa. (Aịsaịa 60:22) N’oge na-adịghị anya, a ga-egosipụta ekworo Jehova maka ofufe ya dị ọcha n’ụzọ dị ịrịba ama karị.
Ihe Omume nke Ekworo Chineke Ndị Na-abịa n’Ọdịnihu
20. Gịnị ka Chineke ga-eme n’isi nso iji gosi ekworo ya maka ofufe dị ọcha?
20 Ruo ọtụtụ narị afọ chọọchị dị iche iche nke Krisendọm agbasowo ụzọ nke ndị Juu dapụrụ n’ezi ofufe bụ́ ndị kpasuru Jehova ikwo ekworo. (Ezikiel 8:3, 17, 18) N’oge na-adịghị anya Jehova ga-eme ihe site n’itinye echiche siri ike n’obi nke ndị òtù nke òtù Mba Ndị Dị n’Otu. Nke a ga-akwali ndị ọchịchị a ime ka Krisendọm na ihe fọdụrụ n’okpukpe ụgha tọgbọrọ n’efu. (Mkpughe 17:16, 17) Ndị na-efe ezi ofufe ga-alanarị ime ihe e kpere n’ikpe ahụ na-atụ egwu. Ha ga-azaghachi n’okwu nke ihe e kere eke ndị nọ n’eluigwe bụ́ ndị na-asị: “Haleluya; . . . n’ihi na O kpere oké nwanyị ahụ na-akwa iko [okpukpe ụgha] ikpe, bụ́ nwanyị nke weere ịkwa iko ya [ozizi ụgha ya nile na nkwado nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị rụrụ arụ] mebie ụwa, Ọ bọkwara ọ́bọ̀ ọbara ndị ohu Ya n’isi ya.”—Mkpughe 19:1, 2.
21. (a) Gịnị ka Setan na usoro ihe ya ga-eme mgbe e bibisịrị okpukpe ụgha? (b) Olee otú Chineke ga-esi meghachi omume?
21 Gịnị ga-eme mgbe e bibisịrị alaeze ụwa nke okpukpe ụgha? Setan ga-akpasu ndị ọchịchị ibuso ndị Jehova agha n’ụzọ zuru ụwa ọnụ. Olee otú ezi Chineke ahụ ga-esi meghachi omume banyere mgbalị a nke Setan ikpochapụ ezi ofufe n’elu ụwa? Ezikiel 38:19-23 na-agwa anyị, sị: “Ọ bụkwa n’ekworo m n’ọkụ nke nrubiga ókè nke iwe m ka M [Jehova] kwuworo. . . . Mụ na ya [Setan] ga-ekpekwa ikpe n’ajọ ọrịa na-efe efe na n’ọbara; ọ bụkwa oké mmiri ozuzo na-ezobiga ókè, na oké akụ́ mmiri ígwé, ma ọkụ, na brimstone, ka M ga-eme ka ha zokwasị ya, zokwasịkwa usuu nile nke ndị agha ya, zokwasịkwa ọtụtụ ndị dị iche iche so ya. M ga-emekwa Onwe m ka M dị ukwuu, M ga-edokwa Onwe m nsọ, mee ka a mara Mụ onwe m n’anya ọtụtụ mba; ha ewee mara na Mụ onwe m bụ Jehova.”—Leekwa Zefanaịa 1:18; 3:8.
22. Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị nwere ekworo maka ofufe dị ọcha nke Jehova?
22 Lee ka o si na-akasi obi ịmara na Ọkaaka nke eluigwe na ala ji ekworo na-elekọta ndị na-efe ya ezi ofufe anya! Site n’ekele dị omimi maka obi ebere na-erughịrị mmadụ, ka anyị nwee ekworo maka ofufe dị ọcha nke Jehova Chineke. Ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi gaa n’ihu na-ekwusa ozi ọma ahụ ma jiri obi ike na-echere ụbọchị ahụ dị ebube mgbe Jehova ga-ebuli ma doo aha ukwu ya nsọ.—Matiu 24:14.
Isi Ihe Maka Ntụgharị Uche
◻ Gịnị ka inwe ekworo maka Jehova pụtara?
◻ Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe nlereanya nke ụmụ Israel oge ochie setịpụrụ?
◻ Olee otú anyị pụrụ isi zere ịkpasu Jehova ikwo ekworo?
◻ Olee otú Chineke na Kraịst siworo gosi ekworo maka ofufe dị ọcha?
[Igbe dị na peeji nke 12]
Ịhụnanya Adịghị Ekwo Ekworo
BANYERE anya ụfụ, onye ọkà mmụta Bible nke narị afọ nke 19 bụ́ Albert Barnes dere, sị: “Ọ bụ ngosipụta a kasị ahụ ebe nile nke ajọ omume, ọ na-egosikwa n’ụzọ doro anya ịrụ arụ miri emi nke mmadụ.” O kwukwara, sị: “Onye ahụ nke pụrụ inyocha isi iyi nke agha na esemokwu nile na atụmatụ ụwa—atụmatụ na nzube nile nke ọbụna ndị kpọrọ onwe ha ndị Kraịst, ndị na-eme ihe dị ukwuu imebi okpukpe ha na ime ha ndị nwere echiche ụwa, ịchọpụta ebe ha sitere—ọ ga-enwe ihe ijuanya ịchọpụta na anya ụfụ akpatawo ihe dị ukwuu. Ọ na-afụ anyị ụfụ na ndị ọzọ na-enwe ọganihu karịa anyị; ọ na-agụ anyị agụụ inwe ihe ndị ọzọ nwere, ọ bụ ezie na o rughịrị anyị; nke a na-edujekwa n’ụzọ ikpe ọmụma dị iche iche ndị a na-achụso iji belata ha ịnụrụ ụtọ ya, ma ọ bụ iji nweta ya n’onwe anyị, ma ọ bụ iji gosi na ha enweghị ihe ha kwesịrị inwe. . . . N’ihi na otú ahụ ka a ga-esi emeju mmụọ nke ime anya ụfụ anyị dị n’obi.”—Ndị Rom 1:29; Jemes 4:5.
N’ụzọ dị iche, Barnes kwuru ihe na-akpali mmasị banyere ịhụnanya, nke “na-adịghị eme anya ụfụ.” (1 Ndị Kọrint 13:4, King James Version) O dere, sị: “Ịhụnanya adịghị emere ndị ọzọ anya ụfụ maka obi ụtọ ha na-enweta; ọ na-aṅụrị ọṅụ n’ọdịmma ha; ka obi ụtọ ha na-etokwa . . . , ndị ịhụnanya na-akpali . . . agaghị ebelata ya; ha agaghị emechu ha ihu n’ihi ihe onwunwe ha; ha agaghị ewepụ ihe n’obi ụtọ ahụ; ha agaghị atamu ntamu ma ọ bụ gosipụta ndakpọ olileanya na ha onwe ha abụghị ndị ihe ọma dabaara nke ukwuu otú ahụ. . . . Ọ bụrụ na anyị hụrụ ndị ọzọ n’anya—ọ bụrụ na anyị ṅụrịrị ọṅụ n’obi ụtọ ha, anyị ekwesịghị imere ha anya ụfụ.”
[Foto dị na peeji nke 10]
Fineas kworo ekworo maka ofufe dị ọcha nke Jehova