Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
Ịgba Àmà Amịa Mkpụrụ n’Ebe Obibi na n’Ụlọ Akwụkwọ
NDỤ nke onye Kraịst gụnyere imere ndị ọzọ ihe ọma, karịsịa site n’isoro ha kerịta ozi ọma nke Alaeze Chineke. Ilu 3:27 na-asị: “Egbochila ezi ihe na ndị ọ dịịrị, mgbe ọ dịịrị ike aka gị ime ya.” N’Argentina otu Onyeàmà na-eto eto nọ n’afọ nke atọ ya n’ụlọ akwụkwọ dị elu chọrọ isoro enyi ya n’ụlọ akwụkwọ kerịta ozi ọma nke Alaeze ahụ. Ya ime nke ahụ rụpụtara ihe buru ibu.
Otu ụbọchị Onyeàmà ahụ na-eto eto gwara enyi ya na ọ bụghị okpukpe nile dị mma. Mgbe nwa okorobịa ahụ zaghachiri na ya emeghị ihe ọ bụla dị njọ, Onyeàmà ahụ kwuru, sị: “I meghịkwara Chineke ihe ọ bụla.” Nke a kpaliri onye ntorobịa ahụ iche echiche. Mgbe e mesịrị, Onyeàmà ahụ kọwara na ndị a bụ mgbe ikpeazụ nakwa na iji nweta ihu ọma Chineke, mmadụ ga-enweta ezi ihe ọmụma Bible ma tinye ya n’ọrụ. Enyi ya n’ụlọ akwụkwọ kwenyere. Ma ezinụlọ ya ọ̀ ga-ekwe ya inwe ọmụmụ Bible? Iji nye enyi ya ihe ọ ga-echebara echiche, Onyeàmà ahụ gwara ya ka ọ gụọ akwụkwọ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala.
Oge gafere, enyi ya ahụ hapụkwara ụlọ akwụkwọ. A nụghị ihe ọ bụla banyere ya ruo ihe karịrị otu afọ. Mgbe ahụ otu ụbọchị o juru Onyeàmà ahụ na-eto eto anya ịnata òkù telifon site n’aka enyi ya bụ́ onye kwuru na ya pụrụ ịhụ na a na-emezu amụma Bible n’ezie. N’egbughị oge Onyeàmà ahụ mere ndokwa iduziri ya Bible.
Mgbe ọ gara n’ụlọ onye ahụ bụbu enyi ya n’ụlọ akwụkwọ, ọ chọpụtara na ndị mụrụ enyi ya nwere nnọọ nchegbu banyere ihe nwa ha nwoke na-etinye aka na ya. Ọbụna nwanne nwoke ntakịrị nke enyi ya chere na ara agbawala ya. Ya mere ndị mụrụ ya gwara nwanne ya nwoke nke ntakịrị ka o sonye n’ọmụmụ ihe na-esonụ. Mgbe nke ahụ gasịrị, n’anya mmiri, nwa okorobịa a kọọrọ ndị mụrụ ya na ara adịghị agba nwanne ya nwoke tọrọ ya, bụ́ nke mere ka nne ya tie mkpu, sị, “Kama inwe otu nsogbu, enwere m abụọ ugbu a!”
Ya mere, n’ọmụmụ ihe na-esonụ nwanyị ahụ n’onwe ya nọ ya, ọ ghaghịkwa ikwere na ara adịghị agba ụmụ okorobịa ahụ. Mgbe oge na-aga e mere ndokwa maka isoro ya na di ya nwee ọmụmụ Bible. N’oge na-adịghị anya ezinụlọ ahụ nile malitere ịga nzukọ ọgbakọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. N’ikpeazụ, nne na nna ha ochie malitekwara ịmụ Bible ma malite ịga nzukọ. Kemgbe ahụ, e mewo nwa okorobịa mbụ ahụ baptism. Ọ lụrụ nwanyị, ya na nwunye ya bụkwa ndị nkwusa na-anụ ọkụ n’obi.
Ọzọkwa, site n’ịgba àmà mberede n’ụlọ akwụkwọ, Onyeàmà ahụ enyeworo ụmụ akwụkwọ ibe ya abụọ ọzọ aka nakwa nne na nwanne nwanyị nke otu n’ime ha ịmalite ịmụ Bible. Ná ngụkọta, mmadụ 11 mụtara eziokwu Bible n’ihi na Onyeàmà ahụ na-eto eto alaghị azụ n’imere ụmụ akwụkwọ ibe ya ihe ọma. Lee aha ihe obi ụtọ ọ rụpụtara! N’eziokwu, “Ndị ihe na-agara nke ọma ka ndị ahụ bụ, nke Jehova bụ Chineke ha.”—Abụ Ọma 144:15.