Ọkụ Ha Anyụghị
N’OGE Bible e nwere Ndịàmà Jehova kwesịrị ntụkwasị obi ndị nwere ndọghachi azụ na ihe isi ike. Ha zutere mmegide na ọdịda doro anya. Ka o sina dị, ha adaghị mbà n’ihi nkụda mmụọ. Ya bụ na ọkụ ha anyụghị.
Dị ka ihe atụ, e nyere onye amụma bụ́ Jeremaịa ọrụ ịbụ onye amụma Chineke nye mba Juda nke dapụrụ n’ezi ofufe. Ọ kpọsara ịdọ aka ná ntị banyere mbibi na-abịanụ nke Jerusalem. (Jeremaịa 1:11-19) Dị ka ihe si n’ime ya pụta, Jeremaịa na ndị obodo ya, bụ́ ndị lere ya anya dị ka onye na-akpọsa mbibi sere okwu ọtụtụ ugbo.
N’otu oge, onye nchụàjà bụ́ Pashụa, bụ́ onye nnọchiteanya bụ isi n’ụlọ Chineke, tiri Jeremaịa ihe n’ihi ihe o buru n’amụma ma tinye ya n’ọtọsị. N’ihi ihe nke a yiri ndọghachi azụ, Jeremaịa kwuru, sị: “Aghọwo m ihe ịchị ọchị ogologo ụbọchị nile, mmadụ nile ọ bụla na-akwa m emo. N’ihi na mgbe ọ bụla m na-ekwu, etie m mkpu; Ihe ike na Ịpụnara mmadụ ihe, ka m na-akpọ mkpu: n’ihi na okwu Jehova ghọọrọ m ihe ịta ụta na ihe ịkwa emo ogologo ụbọchị nile.” Onye amụma ahụ nwere nkụda mmụọ ọbụna ruo n’ókè nke ikwu, sị: “M gaghị ehota Ya [Jehova], m gaghị ekwukwa okwu ọzọ n’aha Ya.”—Jeremaịa 20:1, 2, 7-9.
Otú ọ dị, Jeremaịa ekweghị ka nkụda mmụọ merie ya. N’ikwu banyere “okwu Jehova,” o kwupụtara, sị: “O wee dị n’obi m dị ka ọkụ na-ere ere nke e mechibidoro n’ọkpụkpụ m nile, ike gwụkwara m ịnagide ya, enweghịkwa m ike.” (Jeremaịa 20:8, 9) N’ịbụ onye a kwaliri n’ụzọ siri ike ikwupụta mkpọsa nke Chineke, a kwagidere Jeremaịa site ná mmụọ nsọ, o jezuokwa ozi ya.
Pọl onyeozi nwekwara ọtụtụ ihe mere ọ ga-eji nwee nkụda mmụọ, a sị na ọ dalagaara ha. Ọ tachiri obi n’ọdachi ndị na-emere onwe ha, ụgbọ okpukpu, mkpagbu, na otiti ihe. Tinyekwa na nke ahụ, ‘ihe ahụ nke na-anyịgbu ya kwa ụbọchị bụ nchegbu ọ na echegbu onwe ya banyere nzukọ Kraịst nile.’ (2 Ndị Kọrint 11:23-28) Ee, Pọl aghaghị izute nsogbu dị iche iche kwa ụbọchị, ebe ọ na-eche banyere ọgbakọ ọhụrụ ndị o nyere aka iguzobe. Ọzọkwa, o zughị okè, ọ ghaghịkwa ịnagide “ogwu n’anụ ahụ,” nke pụrụ ịbụ ahụchaghị ụzọ nke ọma. (2 Ndị Kọrint 12:7; Ndị Rom 7:15; Ndị Galetia 4:15) Ọbụna na ụfọdụ kwuru okwu megide Pọl n’azụ ya, ndị a mesịkwara ruo ya ntị.—2 Ndị Kọrint 10:10.
Otú ọ bụla o si dị, Pọl ekweghị ka nkụda mmụọ rikpuo ya. Ee e, ọ bụghị onye nwere ike ka nke mmadụ. (2 Ndị Kọrint 11:29, 30) Gịnị mere ka ‘ọkụ dị n’ime’ ya nọgide na-enwu? Otu ihe bụ na o nwere ndị na-enyere ya aka, ọbụna ụfọdụ so ya gaa Rom ebe e ji ya eji n’ime ụlọ ya. (Ọrụ 28:14-16) Nke abụọ, onyeozi ahụ lere ọnọdụ ya anya n’ụzọ a ziri ezi. Ndị mkpagbu na ndị mmegide ya bụ ndị ikpe mara, ọ bụghị Pọl. Ka ọ na-eru ngwụsị nke ndụ ya n’elu ụwa, ọ tụleghachiri ozi ya n’ụzọ dị mma wee, sị: “Nke fọdụrụ bụ na e debeworo m okpueze nke ezi omume ahụ, nke Onyenwe anyị, bụ́ Onye ezi omume n’ikpe ikpe, ga-enyeghachi m.”—2 Timoti 4:8.
Karịa ihe ndị a nile, Pọl jekwuuru Jehova Chineke mgbe nile n’ekpere, ‘Onyenwe anyị guzokwara ya nso wee mee ka ọ dị ike.’ (2 Timoti 4:17) “Enwere m ike,” ka Pọl kwuru, “n’ihe nile n’ime Onye ahụ Nke na-eme m ka m dị ike.” (Ndị Filipaị 4:13) Nkwurịta okwu nke ya na Chineke na ndị Kraịst ibe ya, tinyere ntụle dị mma nke ozi ya, nyeere Pọl aka ịnọgide na-aga n’ihu n’ozi Jehova.
Chineke nyere Pọl ike mmụọ nsọ ide, sị: “Ike agwụla anyị n’obi n’ime ihe ọma: n’ihi na anyị ga-eweta ihe ubi mgbe oge ya ruru, ma anyị adaghị mbà.” (Ndị Galetia 6:7-9) Weta ihe ubi dị aṅaa? Ndụ ebighị ebi. Ya mere, mgbe ahụ, yie Jeremaịa, Pọl, na ọtụtụ ndịàmà ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi nke Jehova a kpọtụrụ aha n’Akwụkwọ Nsọ. Ee, dị ka ha, ekwela ka nkụda mmụọ merie gị. Ekwela ka ọkụ gị nyụọ.—Tụlee Matiu 5:14-16.
[Foto dị na peeji nke 25]
Pọl na Jeremaịa ekweghị ka ọkụ ha nyụọ