Jehova Na-enye Onye Dara Mbà Ike
“Ndị na-ele anya Jehova ga-agbanwe ike ha; ha ga-efego elu ná nku dị ka ugo.”—AỊSAỊA 40:31.
1, 2. Gịnị ka Jehova na-enye ndị na-atụkwasị ya obi, gịnịkwa ka anyị ga-atụle ugbu a?
UGO so ná nnụnụ ndị kasị ike na mbara igwe. Ha pụrụ iferu ebe dị nnọọ anya ọbụna n’etighị nku ha eti. N’inwe nku ndị pụrụ ịgbasapụ mita abụọ, “Eze Ụmụ Nnụnụ,” bụ́ ugo tụrụ àgwà ọlaedo, bụ “otu n’ime ugo ndị kasị adọrọ mmasị; na-efefe ugwu na ala ndị dị larịị, [ọ] na-efe ruo ọtụtụ hour gabiga usoro ugwu, wee felie elu okirikiri okirikiri ruo mgbe ọ ghọrọ kpọm dị ojii na mbara igwe.”—The Audubon Society Encyclopedia of North American Birds.
2 N’iburu ike ufe ugo nwere n’uche, Aịsaịa dere, sị: “[Jehova] na-enye onye dara mbà ike; onye ike na-adịghị ka Ọ na-emekwa ka o nwee ume n’ụba. Ọbụna ụmụ okoro na-ada mbà, ike na-agwụkwa ha, ọbụna ụmụ okorobịa na-asụ ngọngọ daa: ma ndị na-ele anya Jehova ga-agbanwe ike ha; ha ga-efego elu ná nku dị ka ugo; ha ga-agba ọsọ, ike agaghị agwụkwa ha; ha ga-eje ije, ghara ịda mbà.” (Aịsaịa 40:29-31) Lee ka o si bụrụ ihe nkasi obi ịmara na Jehova na-enye ndị na-atụkwasị ya obi ike ịga n’ihu, dị ka ọ̀ na-enye ha nku ugo na-efe oké elu nke yiri ihe ike na-adịghị agwụ agwụ! Ugbu a, tụlee ụfọdụ ná ndokwa ndị o meworo iji nye onye dara mbà ike.
Ike nke Ekpere
3, 4. (a) Jisọs gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ime gịnị? (b) Gịnị ka anyị pụrụ ịtụ Jehova anya ime n’azịza nye ekpere anyị?
3 Jisọs gbara ndị na-eso ụzọ ya ume “ikpe ekpere mgbe nile, na ịghara ikwe ka ike gwụ ha.” (Luk 18:1) Ịwụpụrụ Jehova obi anyị ọ̀ pụrụ n’ezie inyere anyị aka inwetaghachi ike ma zere inwe ike ọgwụgwụ mgbe nrụgide dị iche iche ná ndụ yiri ndị na-erikpu erikpu? Ee, ma e nwere ihe ndị anyị na-aghaghị iburu n’uche.
4 Anyị aghaghị inwe ezi uche n’ihe anyị na-atụ Jehova anya ime ná nzaghachi nye ekpere anyị. Otu onye Kraịst nke dabaworo n’oké ịda mbà n’obi mesịrị kwuo, sị: “Dị ka n’ọrịa ndị ọzọ, Jehova adịghị arụ ọrụ ebube n’oge a. Ma ọ na-enyere anyị aka ịnagide ihe na ịgbake ruo n’ókè anyị pụrụ n’usoro ihe a.” N’ịkọwa ihe mere ekpere ya ji mee ka e nwee ọdịiche, o kwukwasịrị: “Apụrụ m inweta mmụọ nsọ Jehova 24 hour kwa ụbọchị.” Ya mere, Jehova adịghị ekpuchi anyị pụọ ná nrụgide ndị na-adị ná ndụ bụ́ ndị pụrụ ịnyịgbu anyị, ma ọ ‘na-enye ndị na-arịọ Ya Mmụọ Nsọ.’ (Luk 11:13; Abụ Ọma 88:1-3) Mmụọ ahụ pụrụ ime ka anyị nwee ike ịnagide ọnwụnwa ma ọ bụ nrụgide ọ bụla anyị pụrụ iche ihu. (1 Ndị Kọrint 10:13) Ọ bụrụ na ọ dị mkpa, ọ pụrụ itinye n’ime anyị “ọkịka nke ike” iji tachie obi ruo mgbe Alaeze Chineke wepụsịrị nsogbu nile na-eweta obi mgbu n’ụwa ọhụrụ ahụ dị oké nso.—2 Ndị Kọrint 4:7.
5. (a) Ka ekpere anyị wee dị irè, olee ihe abụọ dị mkpa? (b) Olee otú anyị pụrụ isi kpee ekpere ma ọ bụrụ na anyị na-alụso otu adịghị ike nke anụ ahụ ọgụ? (ch) Gịnị ka ekpere anyị nọgidesiri ike na-ekpe ma na-akpọ okwu aha na-egosipụta nye Jehova?
5 Ma, iji mee ka ekpere anyị dị irè, anyị aghaghị ịnọgidesi ike, anyị aghaghịkwa ịkpọ okwu aha. (Ndị Rom 12:12) Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị daa mbà mgbe ụfọdụ n’ihi na ị na-alụso otu adịghị ike nke anụ ahụ ọgụ, ná mmalite nke ụbọchị ọ bụla, kpekuo Jehova ekpere inyere gị aka izere ịsụ ngọngọ n’adịghị ike ahụ kpọmkwem n’ụbọchị ahụ. Kpee ekpere n’otu aka ahụ n’ụbọchị ahụ dum na tupu ị na-alakpu ụra kwa abalị. Ọ bụrụ na i nwere ndaghachi azụ, rịọ Jehova maka mgbaghara ya, ma gwakwa ya banyere ihe dubara ná ndala azụ ahụ na ihe ị pụrụ ime iji zere ọnọdụ ndị ahụ n’ọdịnihu. Nnọgidesi ike dị otú ahụ na ekpere ịkpọ okwu aha ga-egosipụta nye “Onye na-anụ ekpere” obi eziokwu nke ọchịchọ gị imeri n’ọgụ ahụ.—Abụ Ọma 65:2; Luk 11:5-13.
6. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji zie ezi ịtụ Jehova anya ịnụ ekpere anyị ọbụna mgbe ọ dị anyị ka anyị erughị eru ikpe ekpere?
6 Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ ọ pụrụ ịdị ndị daworo mbà ka ọ bụ ha erughị eru ikpe ekpere. Otu nwanyị bụ́ onye Kraịst nke ọ dịburu otú ahụ mesịrị kwuo, sị: “Nke ahụ bụ echiche dị oké ize ndụ n’ihi na ọ pụtara na anyị ekpebiwo iji aka anyị kpee onwe anyị ikpe, ma nke ahụ adịghịrị anyị.” N’ezie, “Chineke onwe ya na-ekpe ikpe.” (Abụ Ọma 50:6) Bible na-emesi anyị obi ike na ọ bụ ezie na “obi anyị na-ama anyị ikpe . . . , Chineke ka obi anyị ukwuu, Ọ makwaara ihe nile.” (1 Jọn 3:20) Lee aha ihe nkasi obi ọ bụ ịmara na mgbe anyị pụrụ ịma onwe anyị ikpe dị ka ndị na-erughị eru ikpe ekpere, o nwere ike Jehova agaghị eche otú ahụ banyere anyị! Ọ “makwaara ihe nile” banyere anyị, gụnyere ọnọdụ ndị e nwere ná ndụ anyị bụ́ ndị pụrụ imewo ka ọ dị anyị ka anyị erughị eru otú ahụ. (Abụ Ọma 103:10-14) Obi ebere na omimi nke nghọta ya na-akwali ya ịnụ ekpere ndị sitere ‘n’obi tiwara etiwa na nke e gwepịara egwepịa.’ (Abụ Ọma 51:17) Olee otú ọ pụrụ isi jụ ịnụ mkpu anyị maka enyemaka mgbe ya onwe ya na-akatọ “onye na-ekwuchipụ ntị ya n’iti mkpu nke onye na-enweghị ike”?—Ilu 21:13.
Ikpo Ọkụ nke Òtù Ụmụnna
7. (a) Olee ndokwa ọzọ Jehova meworo iji nyere anyị aka inwetaghachi ike? (b) Ịmara gịnị banyere òtù ụmụnna anyị pụrụ ịbụrụ anyị ihe na-enye ume?
7 Ndokwa ọzọ Jehova meworo inyere anyị aka inwetaghachi ike bụ òtù ụmụnna anyị nke ndị Kraịst. Lee aha ihe ùgwù dị oké ọnụ ahịa ọ bụ ịbụ akụkụ nke ezinụlọ zuru ụwa ọnụ nke ụmụnna nwoke na nwanyị! (1 Pita 2:17) Mgbe nrụgide nile nke ndụ na-anyịgbu anyị, ikpo ọkụ nke òtù ụmụnna anyị pụrụ inyere anyị aka inwetaghachi ike. N’ụzọ dị aṅaa? Ịmara na anyị anọghị nanị anyị n’iche ihe ịma aka ndị na-akpata nrụgide ihu pụrụ ịdị na-enye ume n’onwe ya. N’etiti ụmụnna anyị ndị nwoke na nwanyị, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ụfọdụ echewo ihe nrụgide ma ọ bụ ọnwụnwa ndị yiri nke ahụ ihu, ha enwewokwa mmetụta ndị dị ka nke anyị. (1 Pita 5:9) Ọ na-emesi obi ike ịmara na ihe anyị na-enwe ahụmahụ ya apụghị iche, nakwa na mmetụta anyị abụghị nke a na-adịghị ahụkebe.
8. (a) Ihe atụ dịgasị aṅaa na-egosi ụzọ anyị pụrụ isi nweta enyemaka na nkasi obi dị oké mkpa n’òtù ụmụnna anyị? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka “enyi na-ahụ n’anya” siworo nyere gị onwe gị aka ma ọ bụ gbaa gị ume?
8 N’ikpo ọkụ nke òtù ụmụnna ahụ anyị pụrụ ịchọta ‘ezi ndị enyi’ bụ́ ndị, mgbe anyị nọ n’ihe isi ike, pụrụ inye enyemaka na nkasi obi dị oké mkpa. (Ilu 17:17) Ọtụtụ mgbe, nanị ihe ọ na-ewe bụ okwu obi ọma ma ọ bụ ihe omume nke nchebara echiche. Otu onye Kraịst gbasoro mmetụta nke abaghị uru mgba na-echeta, sị: “E nwere ndị enyi na-agwa m ezi ihe banyere onwe m iji nyere m aka imeri echiche ndị na-adịghị mma m nwere.” (Ilu 15:23) Mgbe obere nwa ya nwanyị nwụsịrị, o siiri otu nwanna nwanyị ike na mbụ ịbụ abụ Alaeze ná nzukọ ọgbakọ, karịsịa abụ ndị kwuru okwu mbilite n’ọnwụ. “Otu oge,” ka ọ na-echeta, “otu nwanna nwanyị nke nọ n’akụkụ nke ọzọ hụrụ ka m na-ebe ákwá. Ọ bịakwutere m, konye m aka, ma soro m bụọ ihe fọdụrụ n’abụ ahụ. Ejupụtara m n’ịhụnanya maka ụmụnna nwoke na nwanyị ahụ ma nwee obi ụtọ nke ukwuu na anyị jere nzukọ ndị ahụ, na-amata na ọ bụ n’ebe ahụ ka enyemaka anyị dị, n’ebe ahụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.”
9, 10. (a) Olee otú anyị pụrụ isi tinye ihe n’ikpo ọkụ nke òtù ụmụnna anyị? (b) Olee ndị karịsịa nwere mkpa mkpakọrịta na-ewuli elu? (ch) Gịnị ka anyị pụrụ ime iji nyere ndị nọ ná mkpa agbamume aka?
9 Otú ọ dị, onye ọ bụla n’ime anyị nwere ibu ọrụ nke itinye ihe n’ikpo ọkụ nke òtù ụmụnna anyị nke ndị Kraịst. N’ihi ya, obi anyị kwesịrị ịdị “obodobo” iji gụnye ụmụnna nwoke na nwanyị anyị nile. (2 Ndị Kọrint 6:13) Lee ka ọ ga-esi bụrụ ihe mwute nye ndị daworo mbà iche na ịhụnanya òtù ụmụnna ahụ ajụwo oyi n’ebe ha nọ! Ka o sina dị, ndị Kraịst ụfọdụ na-eme mkpesa inwe mmetụta nke owu ọmụma na ịbụ ndị e leghaara anya. Otu nwanna nwanyị di ya na-emegide eziokwu ahụ rịọrọ, sị: “Olee onye na-enweghị ọchịchọ na mkpa maka ọbụbụenyi ndị na-ewuli elu, agbamume, na mkpakọrịta ịhụnanya? Biko chetara ụmụnna nwoke na nwanyị anyị na ha dị anyị mkpa!” Ee, karịsịa ndị ọnọdụ ha ná ndụ na-anyịgbu—ndị nwere ndị òtù ọlụlụ na-ekweghị ekwe, ndị nne ma ọ bụ nna na-azụ ụmụ nanị ha, ndị nwere nsogbu ahụ ike na-adịghị ala ala, ndị agadi, na ndị ọzọ—nwere mkpa nke mkpakọrịta na-ewuli elu. Ọ̀ dị ụfọdụ n’ime anyị mkpa ịbụ ndị e chetaara nke ahụ?
10 Gịnị ka anyị pụrụ ime iji nye aka? Ka anyị dị obodobo n’igosipụta ịhụnanya anyị. Mgbe anyị na-egosi afọ ọma, ka anyị ghara ichezọ ndị nọ ná mkpa agbamume. (Luk 14:12-14; Ndị Hibru 13:2) Kama iche na ọnọdụ ha na-egbochi ha ịnakwere ya, gịnị ma ị kpọọ ha n’agbanyeghị ihe ga-emenụ? Mgbe ahụ hapụ ha ka ha kpebie. Ọ bụrụgodị na ha apụghị ịnara ya, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ha ga-abụ ndị a gbara ume ịmara na ndị ọzọ echewo banyere ha. Ọ pụrụ ịbụ nnọọ ihe dị ha mkpa iji nwetaghachi ike.
11. Ndị ihe na-anyịgbu pụrụ ịnọ ná mkpa enyemaka n’ụzọ dịgasị aṅaa?
11 Ndị ihe na-anyịgbu pụrụ ịnọ ná mkpa enyemaka n’ụzọ ndị ọzọ. Otu nne nanị ya na-azụ ụmụ, dị ka ihe atụ, pụrụ inwe mkpa nke nwanna nwoke tozuru okè igosi mmasị n’ebe nwa ya nwoke na-enweghị nna nọ. (Jemes 1:27) Nwanna nwoke ma ọ bụ nwanyị nwere nsogbu ahụ ike siri ike pụrụ ịnọ ná mkpa enyemaka ụfọdụ n’ịzụta ihe ma ọ bụ n’ọrụ ụlọ. Mkpakọrịta pụrụ ịgụsi onye agadi agụụ ike ma ọ bụ o nwee mkpa enyemaka ụfọdụ iji pụta ozi ubi. Mgbe e nwere mkpa na-aga n’ihu maka enyemaka dị otú ahụ, ọ na-aghọ ezi ‘ihe nnwapụta nke ịhụnanya anyị na ọ bụ ezi ịhụnanya.’ (2 Ndị Kọrint 8:8) Kama ikewapụ onwe anyị n’ebe ndị nọ ná mkpa nọ n’ihi oge na mgbalị ọ na-ewe, ka anyị gafee n’ule ahụ nke ịhụnanya ndị Kraịst site n’inwe nghọta na ime ihe banyere mkpa ndị ọzọ.
Ike nke Okwu Chineke
12. Olee otú Okwu Chineke si enyere anyị aka inwetaghachi ike?
12 Onye kwụsịrị iri ihe agaghị enwekwa ume, ma ọ bụ ike n’oge na-adịghị anya. N’ihi ya, ụzọ ọzọ Jehova si enye anyị ike ịga n’ihu bụ site n’ịhụ na a na-enyeju anyị afọ n’ụzọ ime mmụọ. (Aịsaịa 65:13, 14) Olee nri ime mmụọ o nyeworo? Karịsịa ndị ọzọ nile, Okwu ya, bụ́ Bible. (Matiu 4:4; tụlee Ndị Hibru 4:12.) Olee otú ọ pụrụ isi nyere anyị aka inwetaghachi ike? Mgbe nrụgide na nsogbu ndị anyị na-eche ihu malitere ịmịkọrọ ume anyị, anyị pụrụ inweta ume site n’ịgụ banyere mmetụta na ịgba mgba ndị weere ọnọdụ n’ezie nke ndị ikom na ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi n’oge Bible. Ọ bụ ezie na ha bụ ihe atụ pụrụ iche nke iguzosi ike n’ezi ihe, ha bụ ụmụ mmadụ ndị “yiri anyị n’ahụ.” (Jemes 5:17; Ọrụ 14:15) Ha chere ule na nrụgide ndị yiri nke anyị ihu. Tụlee ihe atụ ụfọdụ.
13. Olee ihe atụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-egosi na ndị ikom na ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi n’oge Bible nwere mmetụta na ahụmahụ ndị yiri nnọọ ndị nke anyị?
13 Nna ochie ahụ bụ́ Abraham nwere mwute miri emi banyere ọnwụ nwunye ya ọ bụ ezie na o nwere okwukwe ná mbilite n’ọnwụ. (Jenesis 23:2; tụlee Ndị Hibru 11:8-10, 17-19.) Devid chegharịrịnụ chere na mmehie ya emewo ka ya ghara ikwesị ekwesị ijere Jehova ozi. (Abụ Ọma 51:11) Mosis nwere mmetụta nke erughị eru. (Ọpụpụ 4:10) Epafrọdaịtọs dara mbà n’obi mgbe a matara na otu nrịanrịa dị njọ kpaara ihe ọ na-eme ókè ‘n’ọrụ Kraịst.’ (Ndị Filipaị 2:25-30) Pọl aghaghị ịlụso anụ ahụ dara ada ọgụ. (Ndị Rom 7:21-25) Yuodia na Sintiki, ụmụnna nwanyị abụọ e tere mmanụ nọ n’ọgbakọ dị na Filipaị, yiri ka ha nwere ihe isi ike ụfọdụ n’inwe mkpakọrịta dị mma. (Ndị Filipaị 1:1; 4:2, 3) Lee ka o si bụrụ ihe na-agba ume ịmata na ndị a kwesịrị ntụkwasị obi nwere mmetụta na ahụmahụ ndị yiri nke anyị, ma ike agwụghị ha! Ike ha agwụghịkwa Jehova.
14. (a) Ngwá ọrụ dị aṅaa ka Jehova jiworo nyere anyị aka inweta ume site n’Okwu ya? (b) N’ihi gịnị ka magazin Ụlọ Nche na Teta! jiworo buo isiokwu ndị nke mmekọrịta mmadụ na ibe ya, ezinụlọ, na mmetụta uche?
14 Iji nyere anyị aka inweta ume site n’Okwu ya, Jehova na-eji òtù ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche enye anyị ‘ihe oriri n’oge ya’ nke na-adịghị akwụsị akwụsị. (Matiu 24:45) Ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi adịwo anya o jiri magazin Ụlọ Nche na Teta! na-agbachitere eziokwu Bible ma na-akpọsa Alaeze Chineke dị ka olileanya mmadụ nwere nanị ya. Karịsịa n’iri afọ ole na ole ndị ikpeazụ, magazin ndị a ebuwo isiokwu Akwụkwọ Nsọ ndị kwesịrị oge a banyere ihe ịma aka mmekọrịta mmadụ na ibe ya, ezinụlọ, na mmetụta uche bụ́ ndị ọbụna ụfọdụ ndị Chineke na-ezute. N’ihi nzube dị aṅaa ka e jiworo bipụta ihe ọmụma ndị dị otú a? Kpọmkwem iji nyere ndị na-enwe ihe ịma aka ndị a aka inweta ume na agbamume site n’Okwu Chineke. Ma isiokwu ndị dị otú ahụ na-enyekwara anyị dum aka inwe nghọta ka doo anya banyere ihe ụfọdụ n’ime ụmụnna anyị nwoke na nwanyị pụrụ ịdị na-eche ihu. Otú a a na-akwadebe anyị nke ọma karị ịṅa ntị n’okwu Pọl: “Na-agụgụnụ ndị dara mbà n’obi, na-enyerenụ ndị na-adịghị ike aka, nweenụ ogologo ntachi obi n’ebe mmadụ nile nọ.”—1 Ndị Tesalọnaịka 5:14.
Ndị Okenye Bụ “Ebe Izonarị Ifufe”
15. Gịnị ka Aịsaịa buru n’amụma banyere ndị na-eje ozi dị ka ndị okenye, ibu ọrụ dịkwa aṅaa ka nke a na-atụkwasị ha?
15 Jehova enyewo ihe ọzọ iji nyere anyị aka mgbe anyị dara mbà—ndị okenye ọgbakọ. Banyere ndị a Aịsaịa onye amụma dere: “Otu onye ga-adịkwa ka ebe izonarị ifufe, na ebe nzuzo ịpụ n’oké mmiri ozuzo; dị ka ọtụtụ iyi jupụtara ná mmiri n’ebe kpọrọ nkụ, dị ka ndo nke oké nkume dị elu n’ala nke kpatara ike ọgwụgwụ.” (Aịsaịa 32:1, 2) Ya mere, ndị okenye nwere ibu ọrụ nke iru ọ̀tụ̀tụ̀ ihe Jehova buworo ụzọ kwuo banyere ha. Ha “ga-adịkwa ka” isi iyi nke nkasi obi na ume ọhụrụ nye ndị ọzọ ma dị njikere ‘iburịta ibu [ma ọ bụ, “ihe ndị na-enye nsogbu”; n’ụzọ nkịtị, “ihe ndị dị arọ”] na-anyị ibe anyị.’ (Ndị Galetia 6:2, ntụaka ala ala peji, NW) Olee otú ha pụrụ isi mee nke a?
16. Gịnị ka ndị okenye pụrụ ime iji nyere onye ọ bụla na-eche na ya erughị eru ikpe ekpere aka?
16 Dị ka e kwuburu, mgbe ụfọdụ ọ pụrụ ịdị onye daworo mbà ka ọ bụ na o rughị eru ikpe ekpere. Gịnị ka ndị okenye pụrụ ime? Ha pụrụ iso onye ahụ kpee ekpere, kpeekwa ekpere maka ya. (Jemes 5:14) Nanị ịrịọ Jehova, ná ntị onye ahụ dara mbà, inyere onye ahụ aka ịghọta otú Jehova na ndị ọzọ hụruru ya n’anya ga-abụ ihe nkasi obi n’ezie. Ịnụ ekpere nke sitere n’obi na-anụ ọkụ nke onye okenye pụrụ inye aka ime ka obi ike onye nwere ihe isi ike dị ike. A pụrụ inyere ya aka ịchịgharị n’uche na ọ bụrụ na ndị okenye nwere obi ike na Jehova ga-aza ekpere n’ihi onye ahụ, mgbe ahụ ọ pụrụ ikerịta obi ike ahụ.
17. N’ihi gịnị ka ndị okenye na-aghaghị iji bụrụ ndị ji ọmịiko aṅa ntị?
17 “Mmadụ ọ bụla bụrụ onye na-anụ ihe ọsọ ọsọ, onye na-adịghị ngwa ikwu okwu,” ka Jemes 1:19 na-ekwu. Iji nyere ndị dara mbà aka inwetaghachi ike, ndị okenye aghaghị ịbụ ndị ji ọmịiko ege ntị. N’ọnọdụ ụfọdụ ndị òtù ọgbakọ pụrụ ịdị na-agbaso nsogbu ma ọ bụ nrụgide ụfọdụ a na-apụghị ịgwọta n’usoro ihe nke a mgba. Mgbe ahụ, ihe pụrụ ịdị ha mkpa abụghị ihe ngwọta “idozi” nsogbu ha kama nanị ịgwa onye na-aṅa ntị nke ọma okwu—onye na-agaghị agwa ha mmetụta ha kwesịrị ịdị na-enwe kama onye ga-aṅa ntị n’ekpeghị ikpe.—Luk 6:37; Ndị Rom 14:13.
18, 19. (a) Olee otú ịnụ ihe ọsọ ọsọ pụrụ isi nyere onye okenye aka izere ime ka ibu onye dara mbà dịkwuo arọ? (b) Gịnị ka a na-arụpụta mgbe ndị okenye ‘weere obi soro hụkọọ ahụhụ’?
18 Ndị okenye, ime ọsọ ọsọ n’ịnụ ihe pụrụ inyere unu aka izere ime ka ibu nke onye dara mbà dịkwuo arọ n’amaghị ama. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na nwanna nwoke ma ọ bụ nwanyị aghaa nzukọ ma ọ bụ kwụsịlata n’ozi ubi, ò nwere mkpa ndụmọdụ n’ezie banyere imekwu ihe n’ozi ahụ ma ọ bụ banyere ịdị na-abịachikwu nzukọ anya? Ma eleghị anya. Ma ị̀ mazuuru ihe dum mere? È nwere nsogbu ahụ ike na-arị elu? Ibu ọrụ ezinụlọ ọ̀ gbanwewo n’isi nso? È nwere ọnọdụ ma ọ bụ ihe nrụgide ndị ọzọ na-anyịgbu ya? Cheta, onye ahụ pụrụrịị ịdị na-enwe oké obi amamikpe banyere enweghị ike imekwu ihe.
19 Mgbe ahụ, olee otú ị pụrụ isi nyere nwanna nwoke ma ọ bụ nwanyị ahụ aka? Tupu i kwubie okwu ma nye okwu ndụmọdụ, ṅaa ntị! (Ilu 18:13) Site n’iji ajụjụ nchọpụta eme ihe ‘dọpụta’ mmetụta nke obi onye ahụ. (Ilu 20:5) Elegharala mmetụta ndị ahụ anya—nakwere ha. Ọ pụrụ ịdị onye ahụ dara mbà mkpa ịbụ onye e mesiri obi ike na Jehova na-eche banyere anyị ma na-aghọta na mgbe ụfọdụ ọnọdụ anyị pụrụ ịkpara anyị ókè. (1 Pita 5:7) Mgbe ndị okenye ‘weere obi soro hụkọọ ahụhụ’ n’ụzọ dị otú a, ndị dara mbà ‘ga-achọta izu ike nye mkpụrụ obi ha.’ (1 Pita 3:8; Matiu 11:28-30) Mgbe ha chọtara izu ike dị otú ahụ, ha agaghị enwe mkpa ịbụ ndị a gwara ka ha mekwuo ihe; obi ha ga-arụgide ha ime ihe nile ha pụrụ ime n’ụzọ ezi uche dị na ya n’ijere Jehova ozi.—Tụlee 2 Ndị Kọrint 8:12; 9:7.
20. Ebe ọgwụgwụ nke ajọ ọgbọ a dị nnọọ nsọ, gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?
20 N’eziokwu anyị na-ebi n’oge kasị sie ike n’akụkọ ihe mere eme nile nke mmadụ. Nrụgide nile nke ibi n’ụwa Setan na-arị elu ka anyị na-abamikwu n’oge ọgwụgwụ. Cheta, dị ka ọdụm na-achụ nta, Ekwensu na-ede anyị ka anyị daa mbà ma nwee ike ọgwụgwụ ka o wee were anyị mere anụ dị mfe oriri. Lee aha ekele anyị pụrụ inwe na Jehova na-enye onye dara mbà ike! Ka anyị jiri ndokwa ndị o meworo iji nye anyị ike ịga n’ihu mee ihe n’ụzọ zuru ezu, dị ka ọ na-enye anyị nku ndị dị ike nke ugo na-efe oké elu. Ebe ọgwụgwụ nke ajọ ọgbọ a dị nnọọ nso, ugbu a abụghị oge ịkwụsị ịgba ọsọ anyị maka ihe nrite ahụ—ndụ ebighị ebi.—Ndị Hibru 12:1.
Gịnị Bụ Azịza Gị?
◻ Gịnị ka anyị pụrụ ịtụ Jehova anya ime n’azịza nye ekpere anyị?
◻ N’ụzọ dịgasị aṅaa ka anyị pụrụ isi nweta ume site n’òtù ụmụnna anyị nke ndị Kraịst?
◻ Olee otú Okwu Chineke si enyere anyị aka inwetaghachi ike?
◻ Gịnị ka ndị okenye pụrụ ime iji nyere ndị dara mbà aka inwetaghachi ike?
[Foto dị na peeji nke 17]
Mgbe a na-egosi afọ ọma, ka anyị ghara ichezọ ndị nọ ná mkpa agbamume
[Foto dị na peeji nke 18]
Ndị okenye pụrụ ịrịọ Jehova inyere ndị dara mbà aka ịghọta otú a hụruru ha n’anya