Otu Narị Afọ Ma Ka Gbasie Ike
DỊ KA RALPH MITCHELL SI KỌỌ
Nna m, nwoke na-etoghị oké ogologo, bụ onye okwuchukwu Methodist. A na-agbanwe ya kwa afọ abụọ ma ọ bụ atọ ọ bụla site n’otu chọọchị gaa na chọọchị ọzọ n’ebe ihe ndị ka n’ime ha bụ obodo nta, gụnyere Asheville, North Carolina, U.S.A., bụ́ ebe a mụrụ m na February 1895. Ya mere etolitere m na-amara nnọọ Krisendọm nke ọma.
ECHETARA m mgbe a na-eduru m dị ka nwatakịrị nwoke gaa “n’oche ihu maka ndị na-eru újú” ná nzukọ ntụteghachi dị iche iche nke okpukpe iji jupụta na mmụọ nsọ—iji “nweta okpukpe” dị ka ha kpọrọ ya. A gwara m ka m kwupụta mmehie m nile, debe Iwu Iri ahụ ma bụrụ ezi mmadụ. N’ụzọ dị otú ahụ, m ga-eje eluigwe ma m nwụọ. ‘Otú ọ dị,’ ka m gwara onwe m, ‘ọ dị m ka m ga-eje ọkụ ala mmụọ n’ihi na apụghị m ịdị mma otú zuru ezu iji jee eluigwe.’ Echere m na ọ bụ nanị ndị toruru ogo mmadụ—karịsịa ndị okwuchukwu—na-adị ndụ dị ka ụkpụrụ Bible si dị.
Ma ọbụna tupu m ruo afọ iri na atọ, amalitere m ịchọpụta ihu abụọ n’okpukpe. Dị ka ihe atụ, nna m ga-eji mkpa ihe onwunwe nke ezinụlọ ya chụọ àjà nanị iji nye ego buru ibu n’ụtụ ego bishọp ná nnọkọ nke bishọp na ndị ụkọchukwu. Ọ tụrụ anya na nke a ga-eme ka e kenye ya ọrụ na chọọchị ka buo ibu. Echetara m otu onye okwuchukwu n’ógbè anyị onye bụkwa onye na-akọ owu. Ọ dị ya ọkụ n’obi inweta ọkwá dị elu, ya mere o rere otu narị ùkwù owu wee jiri ego buru ibu jee nnọkọ nke bishọp na ndị ụkọchukwu ahụ. Mgbe o yiri ka ha enwetachaala ego nile ndị ahụ bịara nwere—ndị ihe ka n’ime ha bụ ndị okwuchukwu—onye okwuchukwu a na-akọ owu maliri elu wee tie, sị: “Ihe a ọ̀ gwụla ihe unu ga-enye bishọp unu? Onye okwuchukwu ọ bụla nyere dollar ise, m ga-eji dollar iri mechie ya!” A tụkọtara ihe karịrị otu puku dollar, e mekwara nwoke a onyeisi papa m. Ekwetaghị m na nhọpụta dị otú ahụ sitere n’aka Chineke. Malite mgbe ahụ gaa n’ihu enwere m obi abụọ banyere ihe ọ bụla metụtara okpukpe.
E denyere aha m na soja ná mmanye mgbe United States tinyere aka n’Agha Ụwa Mbụ. Echetara m nke ọma ịnụ ka ndị ụkọchukwu ndị agha na-ekwusara anyị bụ́ ndị soja banyere iji iguzosi ike n’ihe na-alụrụ mba anyị agha, nanị ihe nke a mere bụ ịkpalikwu ịkpọasị m nwere maka okpukpe. Ihe mgbaru ọsọ m bụ ịlanarị, gụsịa akwụkwọ m, lụzie nwanyị. Okpukpe esoghị n’atụmatụ m maka ọdịnihu.
Mgbanwe Omume
Na 1922, mụ na otu nwa agbọghọ aha ya bụ Louise malitere ịtọ. Ọ dabara na ọ bụ ezigbo onye Katọlik, mgbe anyị kpebikwara ịlụ, ọ chọrọ agbamakwụkwọ ndị Katọlik. Achọghị m ememe okpukpe ọ bụla, ya mere o kwetara na anyị ga-alụ n’ụlọ ọrụ gọọmenti ime obodo nke dị na New York City.
Ná mmalite anyị enweghị esemokwu ọ bụla n’ihi okpukpe. Emere m nnọọ ka o doo ya anya na mụ enweghị okwukwe n’okpukpe nakwa na anyị ga na-ebi n’udo ma ọ bụrụhaala na a kpọtaghị ya aha. Mgbe ahụ, n’agbata afọ ndị 1924 na 1937, a mụrụ ụmụ anyị—otu gasịa ọzọ esochie ruo mgbe anyị mụrụ ụmụ nwoke ise na ụmụ nwanyị ise! Louise chọrọ ka ụmụ anyị gaa akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ndị Katọlik. Achọghị m ka ha nwee ụdị ọzụzụ ọ bụla nke okpukpe, ya mere anyị rụrụ ụka banyere nke ahụ.
Ná mmalite 1939 otu ihe mere nke ga-agbanwe kpam kpam otú m si ele okpukpe anya. Henry Webber na Harry Piatt, mmadụ abụọ n’ime Ndịàmà Jehova, bịara n’ụlọ m dị na Roselle, New Jersey. O doro anya ozugbo na ha chọrọ ikwu okwu banyere otu isiokwu m na-enweghị mmasị na ya—okpukpe. Okwukwe m ka bụ nke e mebiri emebi n’ihi na ndị ụkọchukwu so ná ndị agha kwuru, sị, ‘Lụọ ọgụ maka mba gị,’ ebe ndị ụkọchukwu nọ n’ụlọ kwuru, sị, ‘Egbula mmadụ.’ Lee aha ihu abụọ ọ bụ! Echere m na m ga-agbazi Ndịàmà abụọ a olu. “Ka m gwa unu otu ihe,” ka m sịrị ha. “Ọ bụrụ na okpukpe unu bụ eziokwu, mgbe ahụ ndị nke ọzọ nile bụ ụgha. Ọ bụrụkwa na ọbụna otu ná ndị nke ọzọ bụ eziokwu, mgbe ahụ ndị nke ọzọ nile, gụnyere nke unu, bụ ụgha. A pụrụ inwe nanị otu ezi okpukpe.” N’ụzọ juru m nnọọ anya, ha kwenyeere m!
Ọzọkwa, ha gwara m ka m weta Bible m ma sapeta 1 Ndị Kọrint 1:10. N’ebe ahụ m gụrụ, sị: “Ugbu a, arịọ m unu, ụmụnna m, n’aha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, ka unu nile na-ekwu otu ihe ahụ, ka a gharakwa inwe nkewa n’etiti unu; kama ka e jikọta unu ọnụ n’ụzọ zuru okè n’otu uche ahụ na n’otu echiche ahụ.” (King James Version) Akụkụ akwụkwọ nsọ a kpaliri mmasị m. N’otu mgbe ahụ, ụjọ na-atụ m na ụmụ nwoke abụọ a na-achọ ime ka m banye n’òtù nzuzo. Ma amụtala m ihe—na e kwesịghị inwe nkewa n’etiti ndị Kraịst. Ebu m ọtụtụ ajụjụ ndị ọzọ n’uche. Dị ka ihe atụ, Gịnị na-eme mkpụrụ obi mgbe mmadụ nwụrụ? Lee otú m ga-esi nwee mmasị iso ha kwurịta ajụjụ ahụ! Ma, echere m, na nke ahụ ga-akpalite oké arụmụka okpukpe n’ụlọ anyị.
Mgbe ahụ otu n’ime ụmụ nwoke abụọ ahụ kwuru, sị: “Anyị ga-enwe mmasị ịlaghachite ma soro gị kwurịta okwu ọzọ n’izu ọzọ.” Agbalịrị m iji akọ chụọ ha, ma nwunye m kwulitere okwu. “Ralph,” ka o kwuru, “ha chọrọ ịma mgbe ha pụrụ iji laghachite.” Nke a juru m anya, ebe ọ bụ ezigbo onye Katọlik! Ma, echere m, sị, ‘Ma eleghị anya anyị pụrụ ịhụ ebe ụfọdụ anyị ga-ekwekọrịta n’okwu banyere okpukpe ma e kwuwerị.’ Ya mere ekwetara m ka Henry Webber na Harry Piatt laghachite na Friday na-esonụ.
Otú a ka o si bụrụ na m malitere iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible. N’oge na-adịghị anya mgbe nke a gasịrị, a kpọrọ m òkù ịbịa otu mgbakọ na Madison Square Garden na New York City. M na-echeta nke ọma okwu Joseph F. Rutherford bụ́ “Ọchịchị na Udo,” bụ́ nke e kwuru na June 25, 1939. Abụ m otu n’ime 18,000 mmadụ nọ n’ebe ahụ. N’ezie, ọ bụ 75,000 nụrụ okwu ahụ ma ị gụnye ndị e jikọtara n’usoro nzirịta ozi mba nile nke na-eji waya nzirịta ozi redio na fon eme ihe.
Otú ọ dị, ihe agaghị were were. Ụmụazụ nke onye ụkọchukwu Katọlik bụ́ Charles Coughlin eyielarị egwu ịkpaghasị mgbakọ ahụ, kpọmkwem kwa, ka okwu Nwanna Rutherford gara ihe dị ka ọkara, ọtụtụ narị mmadụ iwe ji malitere iti mkpu ịkwa emo na iti mkpu ndị dị ka “Heil Hitler!” na “Viva Franco!” E nwere ọgba aghara dị ukwuu nke na a pụrụ ịnụ mkpọtụ ahụ na fon! O were ndị na-anabata mmadụ ihe dị ka minit 15 iji bịanyụọ ìgwè ahụ na-eme ihe ike. N’oge ahụ nile, Nwanna Rutherford nọgidere na-ekwu okwu, n’obi ike, ka aka ndị na-ege ntị kụrụ ugboro ugboro na-enye ya nkwado.
Ugbu a achọrọ m ịmatakwu ihe n’ezie. N’ihi gịnị ka onye ụkọchukwu Katọlik ga-eji kpalie oké ịkpọasị dị otú ahụ megide Ndịàmà Jehova? Echere m na ọ ghaghị inwe eziokwu dị n’ihe Rutherford na-ekwusa—ihe ndị ụkọchukwu na-achọghị ka ndị dị ka m nụ. Ya mere anọgidere m na-amụ Bible, na-enwekwa ọganihu. N’ikpeazụ, n’October 1939, egosipụtara m nrara m raara onwe m nye Jehova site na baptism ime mmiri. E mekwara ụfọdụ n’ime ụmụaka m baptism n’afọ na-esonụ, e mekwara nwunye m, bụ́ Louise, baptism na 1941.
Iche Ule Dị Iche Iche Ihu
N’oge na-adịghị anya ka m natasịrị eziokwu, mama m nwụrụ, aghaghịkwa m ịlaghachi North Carolina maka ememe olili ozu ya. Echere m na mụ apụghị ije ememe ndị ahụ a ga-eme n’ime chọọchị Methodist n’ezi akọ na uche. Ya mere, akpọrọ m papa m na fon tupu m mee njem ahụ wee gwa ya ka o debe igbe ozu ahụ n’ụlọ ebe a na-edozi ozu. O kwetara, ma mgbe m rutere n’ebe ahụ, ha nọ n’ụzọ na-aga na chọọchị, bụ́ ebe ha chere na m ga-esonyerịrị ha.
Otú ọ dị, esonyereghị m ha, nke a kpọtụkwara akpọtụ n’ezinụlọ m. Ọ bụ ezie na mụ na nwanne m nwanyị bụ́ Edna bụ ezi ndị enyi mgbe nile, mgbe ememe olili ozu mama m gasịrị ọ dịghị atụpụrụ m ọnụ. Edere m ọtụtụ akwụkwọ ozi, ma ọ zaghị ha. N’oge okpomọkụ ọ bụla mgbe Edna na-abịa New York maka ọzụzụ ndị nkụzi na City College, agbalịrị m ịhụ ya. Ma ọ na-ajụ ịhụ m, na-asị na ya enweghị ohere. N’ikpeazụ ike gwụrụ m, ebe o yiri ka ọ bụ nanị nsogbu ka m na-enye ya. Ọtụtụ afọ gafere tupu mụ anụkwa ihe ọ bụla ọzọ site n’aka ya.
N’ihi ọjụjụ ha jụrụ ikele ọkọlọtọ, a chụrụ ụmụaka m isii n’ụlọ akwụkwọ na 1941, dịkwa ka a chụrụ ọtụtụ ụmụaka ndị ọzọ na United States na Canada. Iji mezuo ihe iwu chọrọ banyere agụmakwụkwọ, Ndịàmà haziri ụlọ akwụkwọ ndị nke ha nke a kpọrọ Ụlọ Akwụkwọ Alaeze. N’ebe bụbu họtel na Lakewood, New Jersey, bụ ebe ụlọ akwụkwọ ụmụaka m jere dị. Ụlọ Nzukọ Alaeze dị n’okpukpu nke mbụ nke ụlọ elu ahụ, tinyere ọnụ ụlọ klas ụlọ akwụkwọ ahụ, kichin, na ebe iri nri. Ebe ụmụ nwanyị na-ehi ụra dị n’okpukpu nke abụọ, ime ụlọ ihi ụra ụmụ nwoke dị n’okpukpu nke atọ. Ọ bụ ụlọ akwụkwọ mara mma. Ihe ka ukwuu n’ime ụmụaka ndị bi n’ebe ahụ na-ala ụlọ nanị ná ngwụsị izu. Ndị bi n’ebe dị anya karị na-ala ụlọ kwa izu abụọ ọ bụla.
Malite n’oge m batara ọhụrụ n’eziokwu, enwere m ọchịchọ na-ere ka ọkụ ịghọ onye ọsụ ụzọ, dị ka a na-akpọ ndị nzisa ozi ọma oge nile nke Ndịàmà Jehova. Ná mgbakọ 1941 ahụ e nwere na St. Louis, Missouri, otu nwanna so n’ihe omume ahụ kọrọ otú o si nwee ike ịsụ ụzọ ka ọ na-azụlite ụmụaka 12. Echere m sị, ‘Ọ bụrụ na ọ pụrụ inwe ụmụ 12 ma na-asụ ụzọ, apụrụ m inwe ụmụ 10 ma na-asụ ụzọ.’ Otú ọ dị, ọnọdụ m enyeghị m ohere ịmalite ịsụ ụzọ ruo afọ 19 n’ihu. N’ikpeazụ n’October 1, 1960, enwere m ike ịmalite ijere Jehova ozi dị ka onye ọsụ ụzọ oge nile.
Nleta A Na-atụghị Anya Ya
Na 1975, anatara m òkù fon site n’aka nwanne m nwanyị bụ́ Edna. Adị m 80 afọ ugbu a, ahụbeghịkwa m ya anya ma ọ bụ nụ olu ya ruo ihe dị ka 20 afọ. O si n’ọdụ ụgbọ elu na-akpọ, ọ rịọkwara m ka m bịa buru ya na di ya. Ọ dị mma ịhụkwa Edna ọzọ, ma ihe kasị atụ n’anya ka na-abịa. Ka anyị nọ n’ụzọ na-alọta ụlọ, di ya sịrị, “Ị tọghatala mmadụ.” Amaghị m ihe o bu n’uche. Mgbe anyị rutere n’ụlọ, o kwukwara ọzọ, sị, “Ị tọghatala mmadụ n’ebe a.” Nwunye m ghọtara ya ozugbo. N’ichigharịkwuru nwanne m nwanyị, ọ jụrụ, sị, “Edna, ị̀ bụ Onyeàmà?” “Abụ m kpọmkwem,” ka Edna zaghachiri.
Olee otú Edna si bịa nata eziokwu? Na 1972, ná mgbalị idozi mmekọrịta anyị dakpọrọ adakpọ, ezijeere m ya onyinye ụtụ magazin Ụlọ Nche. Ihe dị ka otu afọ ka e mesịrị, Edna dara ọrịa, bụrụkwa onye na-adịghị esi n’ụlọ ya apụ apụ. Magazin ndị ahụ ka dị n’elu table ya n’ime ihe e ji fụchie ha. N’ọchịchọ ịmata ihe dị n’ime ha, Edna mepere otu wee malite ịgụ ya. Mgbe ọ gụsịrị magazin ahụ, o chere n’onwe ya, sị, ‘Nke a bụ eziokwu ahụ!’ Tupu Ndịàmà Jehova akpọtụ n’ụlọ ya, ọ gụchaala ikpo magazin Ụlọ Nche ahụ dum. Ọ nakweere ọmụmụ Bible, mgbe oge na-agakwa ọ ghọrọ otu n’ime Ndịàmà Jehova.
Ịnagide Mfu
Nwunye m bụ́ Louise, mesịrị daa ọrịa shụga, ọnọdụ ya kawanyekwara njọ ruo mgbe ọ nwụrụ na 1979, n’afọ ndụ nke 82. Mgbe Louise nwụrụ, otu akụkụ m nwụkwara. Ụwa m dum bịara ná njedebe. Amaghị m ihe m ga-eme. Enweghị m atụmatụ maka ọdịnihu, agbamume dịkwa m oké mkpa. Otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị, bụ́ Richard Smith, gbara m ume ịga n’ihu n’ọrụ ọsụ ụzọ m. Achọpụtara m na nkasi obi kasị ukwuu m nwetara bịara site n’ịkasi ndị ọzọ ndị ha hụrụ n’anya nwụnahụrụ obi.
Watch Tower Society na-ahazi ime njem mkpagharị n’Israel na 1979, ya mere edenyere m aha m. Njem a bụ ihe oké mkpali nye m, mgbe m lọghachikwara n’ụlọ, abanyeghachiri m kpọmkwem n’ọrụ n’ozi ọsụ ụzọ. Kwa afọ kemgbe ahụ, emewo m ka ọ bụrụ ọrụ m inye aka n’ókèala a na-eketaghị ọrụ ma ọ bụ nke a na-adịghị arụkebe n’akụkụ ọzọ nke mba a. N’agbanyeghị ime agadi m, aka m nwere ike iwepụta onwe m maka ihe ùgwù nke a.
Ana m eme atụmatụ na n’ime afọ ndị gafeworonụ, enwewo m ọṅụ nke inyere ihe dị ka 50 mmadụ aka ịbanye n’ụzọ nke ndụ. Ihe ka ukwuu n’ụmụaka m nọ n’eziokwu. Abụọ n’ime ụmụ m ndị nwanyị na-eje ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ oge nile. Nwa m nwanyị ọzọ, bụ́ Louise Blanton, na-eje ozi n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Brooklyn, New York, ya na di ya, bụ́ George, otu n’ime ụmụ m ndị nwoke ejewokwa ozi dị ka okenye ruo ọtụtụ afọ.
Otú ọ dị, n’ihi ezughị okè e ketara site n’aka nne na nna anyị mbụ bụ́ mmadụ, anyị nile pụrụ ịrịa ọrịa ma nwụọ. (Ndị Rom 5:12) N’ezie ndụ m abụbeghị nke na-enweghị ihe mgbu na ahụ ụfụ. Ugbu a ana m arịa ọrịa arthritis n’ụkwụ aka ekpe m. Mgbe ụfọdụ ọ na-akpatara m oké ahụ mgbakasị, ma ọ kwụsịbeghị m imegharị ahụ. Ana m ekpekwa ekpere ka ọ ghara ịkwụsị m. Achọrọ m ịnọgide na-aga n’ihu. Ọchịchọ m kasị ukwuu bụ ịnọgide n’ozi ọsụ ụzọ kpọmkwem ruo ọgwụgwụ, na-eme ihe nile m pụrụ ime iji mee ka a mara aha Jehova na nzube ya nile.
[Foto dị na peeji nke 23]
Mụ na nwa m nwanyị bụ́ Rita