Inye Ihe À Na-atụ Anya Ya?
Ọ PỤRỤ ịbụ na ị maara nke ọma na inye onyinye bụ nke omenala na-atụzi ọtụtụ mgbe. N’ihe ka n’ọtụtụ ọdịbendị, e nwere mgbe ndị a na-atụ anya onyinye. Onyinye ndị dị otú ahụ pụrụ ịbụ ndị e zubere ịbụ ngosipụta nke nkwanye ùgwù ma ọ bụ nke ịhụnanya. Ọtụtụ n’ime ha bụ ndị onye natara ha na-adịghị mgbe ọ ga-eji ha mee ihe; ndị ọzọ na-enye aka igbo mkpa n’ezie, a na-enwekwa ekele dị ukwuu maka ha.
Na Denmark mgbe a mụrụ nwa ọhụrụ, ndị enyi na ndị ikwu na ibe ga-eje nleta ma weta onyinye ndị ha na-enwe olileanya na ọ ga-abara nwa ọhụrụ ahụ uru. N’ala ndị ọzọ ndị enyi pụrụ inwe nnọkọ oriri bụ́ ebe a ga-anọ nye onyinye ndị dị otú ahụ n’atụmanya nke ọmụmụ nwa ahụ.
Mgbe ndị a na-atụ anya onyinye, na-abụ ọtụtụ mgbe, ihe ndị a na-eme kwa afọ. Ọ bụ ezie na ememe ndị dị otú ahụ abụghị ihe a na-eme n’etiti ndị Kraịst oge gboo, ha aghọọla nke a ma nnọọ ama n’etiti ihe ka ọtụtụ ná ndị kpọrọ onwe ha ndị Kraịst nakwa ndị na-abụghị ndị Kraịst. N’ọdịbendị ụfọdụ omume nke inye onyinye ncheta ụbọchị ọmụmụ pụrụ ịkwụsị ka ụmụaka na-eme okenye karị, ma omenala dị n’etiti ndị Gris dị iche. Na Gris e ji ncheta ụbọchị ọmụmụ akpọrọ oké ihe. Ha na-enyekwa mmadụ onyinye ‘n’ụbọchị aha’ ya. Gịnị ka nke ahụ bụ? Omenala okpukpe na-ejikọta otu “senti” dị iche na ụbọchị nke ọ bụla nke afọ, a na-agụkwa ọtụtụ mmadụ aha “ndị senti.” Mgbe o ruru ụbọchị “senti” ahụ, ndị na-aza aha ahụ na-anata onyinye.
Tinyere ememe ncheta ụbọchị ọmụmụ maka ụmụ ha, ndị Korea nwere ụbọchị ezumike mba nke a maara dị ka Ụbọchị Ụmụaka. Ọ bụ oge mgbe a na-enwe mkpapụ ezinụlọ na mgbe a na-enye ụmụaka onyinye n’agbanyeghị ụbọchị a mụrụ ha. Ndị Korea nwekwara Ụbọchị Ndị Nne na Nna, mgbe ụmụaka na-enye ndị mụrụ ha ihe, na Ụbọchị Ndị Nkụzi, mgbe ụmụaka na-asọpụrụ ndị nkụzi ha ma na-enye ha onyinye. Dị ka omenala ndị Korea si dị, mgbe mmadụ ruru 60 afọ, a na-enwe nnukwute nnọkọ oriri. Ezinụlọ na ndị enyi na-esonyere n’ikpe ekpere ogologo ndụ na obi ụtọ, a na-enyekwa onye ahụ ruru afọ ndụ ahụ onyinye.
Agbamakwụkwọ bụkwa oge ọzọ mgbe omenala na-ewu ewu pụrụ ịchọ ka e nye onyinye. Mgbe mmadụ abụọ lụrụ di na nwunye na Kenya, a na-atụ anya ka ezinụlọ nke nwoke nye ezinụlọ nke nwanyị onyinye. Ndị ọbịa na-ewetakwa onyinye. Ọ bụrụ na di na nwunye ahụ agbasoo omenala, ha ga-anọdụ ala n’ikpo okwu, ebe ndị ọbịa ga na-eweta onyinye ha. Mgbe e nyere onyinye nke ọ bụla, a ga-ama ọkwa na “Onye dị otú a ewetaworo di na nwunye ahụ onyinye.” Ọtụtụ n’ime ndị na-enye onyinye ahụ ga-enwe mwute dị ukwuu ma ọ bụrụ na a kpọghị aha ha.
N’etiti ndị Lebanọn, mgbe mmadụ lụrụ di ma ọ bụ nwunye, ndị enyi na ndị agbata obi, ọbụna ndị na-amachaghị di na nwunye ahụ nke ọma, na-eji onyinye abịa ọtụtụ ụbọchị mgbe ụbọchị ahụ gasịrị. Site na nwata, a na-akụziri ha na inye onyinye bụ ibu ọrụ, dị ka ịkwụ ụgwọ e ji. “Ọ bụrụ na i meghị ya, obi anaghị adị gị mma,” ka otu nwoke onye Lebanọn kwuru. “Ọ bụ ọdịnala.”
Otú ọ dị, a bịa n’oge nile a na-atụ anya inye ihe, n’ọtụtụ ala Krismas kachasị. Ọ̀ bụ na ọ dịghị otú ahụ n’ebe i bi? Na nso nso a na 1990, e mere atụmatụ na ndị America na-emefu ihe ruru $40 ijeri kwa afọ n’onyinye Krismas. Ndị Buddha na ndị Shinto nọ na Japan ji oké ịnụ ọkụ n’obi na-emekwa ememe ahụ, a na-ahụkwa ụdị dị iche iche nke ememe ahụ na Europe, South America, na akụkụ ụfọdụ nke Africa.
Krismas bụ oge mgbe ndị mmadụ na-atụ anya inwe obi ụtọ, ma ọtụtụ adịghị enwe. Ọtụtụ ndị kwa na-achọpụta na ịzụ onyinye aghara aghara na nchegbu maka ịkwụ ụgwọ ndị e butere na-ekpuchi ntakịrị oge obi ụtọ ọ bụla ha nwetara.
Ma, Bible na-asị na obi ụtọ dị n’inye ihe. N’ezie ọ dị, dabere na mmụọ e ji nye ihe ahụ.—Ọrụ 20:35.