Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 1/1 p. 23
  • “Okwu Chineke Wee Na-aga n’Ihu”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Okwu Chineke Wee Na-aga n’Ihu”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Chineke Abụghị Onye Na-ele Mmadụ Anya n’Ihu”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Ọrụ Ọma Ndị Na-enye Jehova Otuto
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ikpebisi Ike Ijere Jehova Ozi!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Gwa Ha na Ị Hụrụ Ha n’Anya
    Ihe Ndịàmà Jehova Kọrọ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 1/1 p. 23

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

“Okwu Chineke Wee Na-aga n’Ihu”

ỌGBAKỌ ndị Kraịst mụbara site n’ihe dị ka 120 ndị òtù gaa n’ihe karịrị 3,000 ngwa ngwa e guzobesịrị ya. (Ọrụ 1:15; 2:41) Bible na-akọwa na “okwu Chineke wee na-aga n’ihu; ọnụ ọgụgụ nke ndị na-eso ụzọ Jisọs na-abakwa ụba na Jerusalem hie nne.” (Ọrụ 6:7) Mgbe nanị afọ ole na ole gasịrị, ọgbakọ ahụ e guzobere ọhụrụ ghọrọ nzukọ gbasara na kọntinent dị iche iche na-enwe ndị Kraịst n’Africa, Esia, na Europe.

N’otu aka ahụ, ọgbakọ ndị Kraịst taa na-enwe mmụba dị ngwa. Dị ka ihe atụ, na Mexico, ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa Alaeze amụbawo n’ime nanị afọ ise site n’ihe karịrị 130,000 gaa 443,640! Na 1995, 1 n’ime 59 mmadụ na Mexico bịara Ememe Ncheta nke ọnwụ Kraịst dị ka Ndịàmà Jehova si mee ememe ahụ. Ma, owuwe ihe ubi ime mmụọ ná mba ahụ agwụsịbeghị, dị ka ahụmahụ na-esonụ mere ihe atụ ya.—Matiu 9:37, 38.

N’otu obodo n’ime steti nke Chiapas, ọ dịghị onye nakwereworo isoro Ndịàmà Jehova nwee ọmụmụ Bible ebe obibi, ọbụna mgbe ha kwusaworo ozi ọma ahụ ruo ihe dị ka 20 afọ n’ógbè ahụ. O doro anya na otu nwoke a ma ama dị ka onye na-eme ihe ike na-emenye ọtụtụ ndị obodo ahụ ụjọ. Ha tụrụ egwu ihe ga-abụ mmeghachi omume ya ma ọ bụrụ na ọ chọpụta na ha na-eso Ndịàmà na-amụ Bible.

Ndịàmà abụọ nwere obi ike, bụ́ ndị kwabatara n’ógbè ahụ, kpebiri ịgwọ nsogbu ahụ site n’ịgakwuru nwoke ahụ a na-ekwu okwu maka ya ihu na ihu. Mgbe ha rutere n’ụlọ ya, nwunye ya bịara lee ndị na-akụ aka n’ụzọ ma gee ntị nke ọma n’ozi ha. O nwere mmasị karịsịa n’ihe Bible na-ekwu banyere ibi na paradaịs n’elu ala. Ma o kwetara na di ya ga-eme ka ihe siere ya ike ma ọ bụrụ na ya ga-amụ Bible. Ndịàmà ahụ kọwaara ya na ọ gwụlakwa ma o ji nlezianya nyochaa ihe Bible na-ekwu, o nweghị mgbe ọ ga-amụta otú e si efe Chineke ma nweta ndụ n’elu ala ruo mgbe ebighị ebi. Ọ nakweere ọmụmụ Bible.

Dị ka a tụrụ anya ya, obi adịghị di ya ụtọ ná mkpebi ya. Ọ machigidere ya iwu iji ụgbọ ala ya aga nzukọ ndị Kraịst ọ bụ ezie na e kwere ka o jiri ya na-aga ihe ndị ọzọ. N’agbanyeghị mmegide ya, ọ na-eji ụkwụ aga mgbe nile n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova kasị ya nso, nke dị kilomita iri. N’oge na-adịghị anya ndị ọzọ n’ime obodo hụrụ obi ike na mkpebisi ike ya. Ndị mmadụ malitere ịṅa ntị mgbe Ndịàmà bịara n’ụlọ ha. Ọbụna ụfọdụ malitere isoro nwanyị ahụ aga nzukọ ndị ahụ. Mgbe ntakịrị oge gasịrị, Ndịàmà ahụ na-eduzi ihe dị ka 20 ọmụmụ Bible n’obodo ahụ!

Otu enyi nke nwanyị a kpebikwara ịmụ Bible n’agbanyeghị mmegide di ya. N’ụzọ na-atụ n’anya, di nke nwanyị mbụ ahụ gbara ya ume ime otú ahụ. Mgbe nwoke ahụ gwasịrị di ya okwu, mmegide ahụ kwụsịrị. Otú ahụ ka o mere na mgbe 20 afọ gasịrị, mkpụrụ nke eziokwu Bible mesịrị pupụta, na-enwe ihe karịrị 15 ndị na-amụ Bible ma na-aga nzukọ ndị Kraịst, tinyere ụmụ nwanyị abụọ a, bụ́ ndị na-ekwusa ozi ọma ahụ ugbu a.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya