Ọgwụgwụ Na-adịgide Adịgide nke Ime Ihe Ike—n’Ụzọ Dị Aṅaa?
IJI gbochie mmụba nke ime ihe ike, ọtụtụ obodo ukwu na United States nwalere echiche ọhụrụ—ego ma ọ bụ onyinye maka égbè ndị e nyefere, n’ajụghị ajụjụ ọ bụla. Gịnị si na ya pụta? Dị ka ihe atụ, ná mmefu nke $341,000, obodo St. Louis nakọtara 8,500 égbè. Na New York City, usoro ihe omume yiri nke ahụ nwetara ihe karịrị otu puku ngwá agha.
Olee mmetụta ihe a nile nwere ná mpụ? N’ụzọ dị mwute, ọ dị nnọọ ntakịrị. Igbu ọchụ ndị e jikọtara ha na égbè ruru ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu na St. Louis n’afọ sochiri ya. Na New York City, a ka nwere ihe e mere atụmatụ ya ịbụ nde égbè abụọ n’aka ndị nkịtị. Na United States, e nwere ihe dị ka 200 nde égbè ndị mmadụ nwe n’onwe ha, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu maka nwoke, nwanyị, na nwatakịrị ọ bụla. N’ala ndị ọzọ, ime ihe ike ndị e jikọtara ha na égbè na-arị elu n’ọ̀tụ̀tụ̀ na-atụ ụjọ. Na Britain “n’agbata 1983 na 1993, ọnụ ọgụgụ ịda iwu nke ndị uwe ojii dekọrọ, bụ́ ndị metụtara égbè, jiri ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ okpukpu abụọ mụbaa, ruo 14,000,” ka magazin bụ́ The Economist na-ekwu. Ọ bụ ezie na ọ̀tụ̀tụ̀ igbu ọchụ dịtụ ala, e nwere ihe dị ka otu nde ngwá agha iwu na-akwadoghị ná mba ahụ.
N’ezie, ndalata ọ bụla e nwere n’ọnụ ọgụgụ ndị ahụ na-atụ ụjọ bụ ọganihu. Otú ọ dị, atụmatụ ndị dị ka ndị ahụ a kọwara n’elu adịghị eleba anya n’isi ihe ndị na-akpata ime ihe ike. Gịnị bụ ihe ndị ahụ na-akpata ya? E hotawo ọtụtụ ihe ma ole na ole n’ime ha bụ isi ihe na-akpata ya. Akwụsịghị ike nke ezinụlọ na enweghị ntụziaka ụkpụrụ omume edubawo ọtụtụ ndị ntorobịa isonyere òtù ndị na-eme ihe ike maka inweta echiche iso biri. Ndọrọ nke uru ndị buru ibu na-edubanye ọtụtụ ndị ichigharịkwuru ime ihe ike. Ikpe na-ezighị ezi na-akwanye ndị ọzọ ịchọ iji ime ihe ike dozie okwu. Nganga nke mba, agbụrụ, ma ọ bụ ọkwá e nwere ná ndụ na-eme ka ndị mmadụ leghara nhụjuanya nke ndị ọzọ anya. Ndị a bụ ihe ndị miri emi ndị na-akpata ha bụ́ ndị na-enweghị ngwọta ndị dị mfe.
Gịnị Ka A Pụrụ Ime?
Inwekwu ndị uwe ojii, oge mkpọrọ ndị ka sie ike, ịchịkwa inwe égbè, ịma ikpe ọnwụ—a tụwo aro ihe ndị a nile ma nwalee ha dị ka ụzọ isi gbochie mpụ na ime ihe ike. Ha ewetawo ọ̀tụ̀tụ̀ ihe ịga nke ọma dịgasị iche iche, ma eziokwu dị mwute bụ na anyị na ime ihe ike ka nọ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na nzọụkwụ ndị a nile na-agwọ nanị ihe na-egosi na e nwere nsogbu.
N’aka nke ọzọ, ọtụtụ ndị ọkachamara na-eche na isi ihe dị mkpa iji kwụsị ime ihe ike bụ agụmakwụkwọ. Ọ bụ ezie na echiche a dị mma, anyị aghaghị ịrịba ama na ọ bụghị nanị ná mba ndị e nwere ntakịrị ohere agụmakwụkwọ ka a na-eme ihe ike. Ma ọ dịghị ihe ọzọ, o yiri ka ụfọdụ n’ime mba ndị a kasị eme ihe ike na ha bụ ndị ahụ nwere ọ̀tụ̀tụ̀ agụmakwụkwọ ndị kasị elu. Ọ bụghị ihe siri ike ịhụ na ihe a chọrọ abụghị nanị agụmakwụkwọ kama ụdị agụmakwụkwọ ziri ezi. Olee ụdị ọ ga-abụ? Ọ̀ dị onye nwere ike ịkụziri ndị mmadụ ịbụ ndị na-ahụ udo n’anya na ndị ziri ezi?
‘Mụ onwe m bụ Jehova, Chineke gị, Onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru, Onye na-eme ka ị zọọ ije n’ụzọ ị ga-ejeso. Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a sị na ị ṅararị ntị n’ihe nile M nyere n’iwu! udo gị ewee dịworị ka osimiri, ezi omume gị adịkwa ka mmali mmiri nile nke oké osimiri.’ (Aịsaịa 48:17, 18) Olee otú Jehova Chineke si akụziri ndị mmadụ ịbụ ndị na-ahụ udo n’anya na ndị ezi omume? N’ụzọ bụ isi site n’Okwu ya, bụ́ Bible.
Ike nke Okwu Chineke
Bible abụghị nanị nchịkọta nke akụkọ ifo oge ochie na okwu ndị oge ha gafeworo, ndị na-adịghịkwa mkpa. O nwere ụkpụrụ na echiche ndị sitere n’aka Onye Okike nke ihe a kpọrọ mmadụ, bụ́ onye maara ọdịdị mmadụ karịa onye ọ bụla ọzọ site n’ọnọdụ ya kasị elu ọ pụrụ ịnọ hụ ihe nile. “Dị ka eluigwe si dị elu karịa ụwa, otú a ka ụzọ m nile dị elu karịa ụzọ nile unu, ọ bụkwa otú a ka echiche m nile dị elu karịa echiche nile unu,” ka Jehova Chineke na-ekwu.—Aịsaịa 55:9.
N’ihi nke a Pọl onyeozi na-agba àmà na “okwu Chineke dị ndụ, na-arụsikwa ọrụ ike, dịkwa nkọ karịa mma agha ọ bụla nke nwere ihu abụọ, na-adụkwa ruo n’ikewa mkpụrụ obi na mmụọ, ma nkwonkwo ma ụmị, bụrụkwa ihe nwere ike ịtụpụta echiche na izu nile nke obi.” (Ndị Hibru 4:12) Ee, Okwu Chineke nwere ike ịbami ma metụ mmadụ n’obi ma gbanwee echiche na akparamàgwà ya. Nke a ọ́ bụghị ihe a chọrọ iji gbanwee ụzọ ime ihe ike nke ndị mmadụ taa?
Ndịàmà Jehova, ndị ọnụ ọgụgụ ha dị ihe dị ka nde ise ugbu a n’ihe karịrị 230 ala, bụ ndị ndụ ha dị na-enye ihe àmà na Okwu Chineke nwere ike n’ezie ịgbanwe ndụ ndị mmadụ ịka mma. Ndị si ná mba, asụsụ, na agbụrụ nile so n’ime ha. Ha sitekwara n’akụkụ nile nke ndụ na ọkwá nile. Ụfọdụ n’ime ha biburu ndụ ime ihe ike na nke nsogbu jupụtara. Ma kama ikwe ka ihe ndị dị otú ahụ kpalite ọnụma, ịma aka, ịkpa ókè, na ịkpọasị n’etiti ha, ha amụtawo imeri ihe mgbochi ndị a, ha aghọwokwa ndị na-ahụ udo n’anya na ndị e jikọtara ọnụ n’ụwa nile. Olee ihe meworo ka nke a kwe omume?
Ihe Omume Ndị Na-eweta Ime Ihe Ike ná Njedebe
Ndịàmà Jehova nyefere onwe ha n’inyere ndị ọzọ aka inweta ezi ihe ọmụma banyere nzube Chineke dị ka e si kpughee ya n’Okwu ya, bụ́ Bible. N’akụkụ ọ bụla nke ụwa, ha na-achọta ndị chọrọ ịmụta ụzọ nile nke Jehova ma bụrụ ndị o ziri ihe. Mgbalị ha nile na-amịpụta mkpụrụ. Ihe ihe omume izi ihe a rụpụtara bụ na a na-emezu otu amụma dị ebube.
Ihe dị ka 2,700 afọ gara aga, e nyere Aịsaịa onye amụma mmụọ nsọ ide, sị: “Ọ ga-erukwa n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a, na . . . ọtụtụ ndị dị iche iche ga-ejekwa, sị, Bịanụ, ka anyị rịgoruo ugwu Jehova, ruo ụlọ Chineke nke Jekọb; Ọ ga-ezikwa anyị ụzọ Ya ụfọdụ, anyị ga-ejekwa ije n’okporo ụzọ Ya nile.”—Aịsaịa 2:2, 3.
Ịbụ ndị Jehova ziri ihe na ije ije n’okporo ụzọ ya nile pụrụ ịrụpụta mgbanwe ndị magburu onwe ha ná ndụ ndị mmadụ. E buru ụzọ kwuo banyere otu n’ime mgbanwe ndị ahụ n’ime otu amụma ahụ: “Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ògè, na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi: mba agaghị ebuli mma agha megide mba, ha agaghị amụtakwa agha ọzọ.” (Aịsaịa 2:4) Ọtụtụ ndị agụwo akụkụ akwụkwọ nsọ a. N’ezie, e dekwasịrị akụkụ akwụkwọ nsọ a n’otu mgbidi dị n’Ihu Ámá nke Mba Ndị Dị n’Otu na New York City. Ọ bụ ihe ncheta nke ihe òtù Mba Ndị Dị n’Otu na-achọ imezu ma bụrụ nke ha na-emezubeghị. A gaghị emezu mkpochapụ a nke agha na ime ihe ike site n’aka òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọ bụla mmadụ guzobere. Ọ bụ ihe Jehova Chineke nanị nwere ike ime. Olee otú ọ ga-esi mezuo ya?
N’ụzọ doro anya ọ bụghị mmadụ nile ga-azaghachi n’ịkpọ òkù ahụ ‘ịrịgoru ugwu Jehova’ ma bụrụ ndị ‘o ziri ụzọ ya ụfọdụ,’ ‘jeekwa ije n’okporo ụzọ ya nile’; nke ọ ga-abụkwanụ mmadụ nile ga-adị njikere ‘ịkpụgharị mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ògè, na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi.’ Gịnị ka Jehova ga-eme banyere ndị dị otú ahụ? Ọ gaghị emeghere ha ọnụ ụzọ nke ohere ruo mgbe ebighị ebi ma ọ bụ chere ha ka ha gbanwee. Iji weta ime ihe ike ná njedebe, Jehova ga-ewetakwa ndị nọgidere n’ụzọ ime ihe ike ha ná njedebe.
Ihe Mmụta Dị Oké Mkpa
Ihe Chineke mere n’ụbọchị Noa na-enye anyị ihe mmụta ịdọ aka ná ntị taa. Ihe ndekọ Bible na-egosi ụdị ụwa dị n’oge ahụ: “E bibiri ụwa n’ihu Chineke, ụwa jupụtakwara n’ihe ike.” N’ihi nke a Chineke gwara Noa, sị: “Ọgwụgwụ anụ ahụ nile abịawo n’ihu m; n’ihi na ụwa jupụtara n’ihe ike site na ha; ma, lee, M ga-ebibi ha na ụwa.”—Jenesis 6:11, 13.
Anyị aghaghị ịrịba otu isi ihe dị mkpa àmà. Mgbe ọ na-eweta Iju Mmiri n’ahụ ọgbọ ahụ, Chineke chebere Noa na ezinụlọ ya. N’ihi gịnị? Bible na-aza, sị: “Noa bụ onye ezi omume, onye zuru okè n’ọgbọ ya nile: Noa na Chineke yịkọrọ na-ejegharị.” (Jenesis 6:9; 7:1) Ọ bụ ezie na ọ bụghị onye ọ bụla dị ndụ n’oge ahụ na-emecha ihe ike, ọ bụ nanị Noa na ezinụlọ ya “na Chineke yịkọrọ na-ejegharị.” N’ihi nke ahụ, ha lanarịrị mgbe e wetara ụwa ahụ nke na-eme ihe ike ná njedebe.
Ka anyị na-ahụkwa ka ụwa na-aghọghachi nke ‘jupụtara n’ihe ike,’ anyị pụrụ ijide n’aka na Chineke na-ahụ ya. Dị nnọọ ka o mere n’ụbọchị Noa, otú a ka ọ ga-emekwa ihe n’oge na-adịghị anya wee kwụsị ime ihe ike—n’ụzọ na-adịgide adịgide. Ma ọ ga-emekwa ụzọ mgbapụ maka ndị na-amụ ugbu a ka ha “na Chineke yịkọrọ na-ejegharị,” ndị na-azaghachi n’oké ihe omume izi ihe ya maka udo.
Site n’ọnụ onye ọbụ abụ ahụ, Jehova na-enye mmesi obi ike nke a, sị: “Ọ fọdụrụ nwa mgbe, onye na-emebi iwu agaghị adịkwa: ị ga-elekwasịkwa ọnọdụ ya anya, ma ọ gaghị anọ. Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.”—Abụ Ọma 37:10, 11.
Ndịàmà Jehova ga-enwe obi ụtọ isoro gị mụọ Bible ka i wee nwee ike isonye ndị ahụ na-asị: “Ka anyị rịgoruo ugwu Jehova, ruo ụlọ Chineke nke Jekọb; Ọ ga-ezikwa anyị ụzọ Ya ụfọdụ, anyị ga-ejekwa ije n’okporo ụzọ Ya nile.” (Aịsaịa 2:3) Site n’ime otú ahụ, ị pụrụ iso ná ndị ga-ahụ ọgwụgwụ nke mmebi iwu na ime ihe ike nile. ‘Ịba ụba nke udo pụkwara ịtọ gị ụtọ.’
[Ebe e si nweta foto dị na peeji nke 5]
Reuters/Bettmann