Imeri Ihe Ịma Aka nke Iguzosi Ike n’Ihe
“Yikwasị mmadụ ọhụrụ ahụ nke e kere dị ka uche Chineke si dị n’ezi omume na iguzosi ike n’ihe.”—NDỊ EFESỌS 4:24, NW.
1. N’ihi gịnị ka anyị ji jiri Jehova Chineke ụgwọ iguzosi ike n’ihe?
IMERI ihe ịma aka nke iguzosi ike n’ihe nwere ọtụtụ akụkụ. Nke kasị mkpa bụ imeri ihe ịma aka nke iguzosi ike n’ihe nye Jehova Chineke. N’eziokwu, n’ihi onye Jehova bụ na ihe o mewooro anyị, nakwa n’ihi nrara anyị raara onwe anyị nye ya, anyị ji ya ụgwọ iguzosi ike n’ihe. Olee otú anyị na-esi eguzosi ike n’ihe nye Jehova Chineke? Otu ụzọ bụ isi bụ site n’iguzosi ike n’ihe nye ụkpụrụ ezi omume nile nke Jehova.
2, 3. Njikọ dị aṅaa dị n’etiti iguzosi ike n’ihe na ezi omume?
2 Iji merie ihe ịma aka ahụ, anyị aghaghị ịṅa ntị n’okwu ahụ dị na 1 Pita 1:15, 16: “Dị ka Onye kpọrọ unu dị nsọ, unu onwe unu, ghọọkwanụ ndị dị nsọ n’ibi obi nile dị iche iche; n’ihi na e dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Unu ga-adị nsọ; n’ihi na nsọ ka Mụ onwe m dị.” Iguzosi ike n’ihe nye Jehova Chineke ga-eme ka anyị na-erubere ya isi mgbe nile, na-eme ka echiche, okwu, na omume anyị na-ekwekọ n’uche nsọ ya. Ọ pụtara ichekwa akọ na uche dị mma, dị ka e nyere anyị n’iwu na 1 Timoti 1:3-5, sị: “Ma ihe e zubere iweta n’iwu ahụ [ịghara izi ozizi dị iche ma ọ bụ ịṅa ntị n’akụkọ ụgha dị iche iche] bụ ịhụnanya sitere n’obi ọcha na ezi akọ na uche na okwukwe nke ihu abụọ na-adịghị ya.” N’eziokwu, o nweghị onye ọ bụla n’ime anyị zuru okè, ma anyị kwesịrị ịdị na-agbalị ime ike anyị nile, ọ̀ bụ na anyị ekwesighị?
3 Iguzosi ike n’ihe nye Jehova ga-egbochi anyị iji ọchịchọ onwe onye nanị na-emebi ụkpụrụ ezi omume. N’ezie, iguzosi ike n’ihe ga-egbochi anyị ịbụ otu ihe n’elu ahụ ma bụrụ ihe ọzọ n’ime ahụ. Iguzosi ike n’ihe bụ ihe onye ọbụ abụ ahụ bu n’uche mgbe ọ bụrụ, sị: “Zi m ụzọ Gị, Jehova; m ga-ejegharị n’eziokwu Gị: mee ka obi m dị n’otu ịtụ egwu aha Gị.” (Abụ Ọma 86:11) Iguzosi ike n’ihe na-achọ ihe a kọwaworo n’ụzọ ziri ezi dị ka “irubere iwu mmadụ na-apụghị ịmanye isi.”
4, 5. Iguzosi ike n’ihe ga-eme ka anyị kpachara anya ka anyị wee ghara ime gịnị?
4 Iguzosi ike n’ihe nye Jehova Chineke ga-egbochikwa anyị ime ihe ga-ewetara aha ya na Alaeze ya nkọcha. Dị ka ihe atụ, n’otu mgbe ndị Kraịst abụọ nwere nnọọ nghọtahie nke na ha kpebiri n’ụzọ na-ezighị ezi ịga n’ụlọikpe ndị ụwa. Ọkàikpe ahụ jụrụ, sị, ‘Unu abụọ ùnu bụ Ndịàmà Jehova?’ O doro anya na ọ pụghị ịghọta ihe ha na-eme n’ụlọikpe. Lee ihe nkọcha nke ahụ bụ! Iguzosi ike n’ihe nye Jehova Chineke gaara emeworị ka ụmụnna ahụ ṅaa ntị ná ndụmọdụ nke Pọl onyeozi: “Ezie ọ bụ nnọọ ịla ala n’ebe unu nọ ọbụna ugbu a, na unu nwere okwu ikpe n’etiti onwe unu. Karịa nke ahụ, n’ihi gịnị unu adịghị ekwe ka e megide unu ajọ omume? karịa nke ahụ, n’ihi gịnị unu adịghị ekwe ka e megbuo unu?” (1 Ndị Kọrint 6:7) N’ezie, ụzọ nke iguzosi ike n’ihe nye Jehova Chineke bụ inwe mfu onwe onye karịa iwetara Jehova na nzukọ ya nkọcha.
5 Iguzosi ike n’ihe nye Jehova Chineke gụnyekwara ịghara ịdaba n’egwu mmadụ. “Egwu mmadụ na-eweta ọnyà: ma onye na-atụkwasị Jehova obi, a ga-eme ka ọ nọ n’elu.” (Ilu 29:25) N’ihi ya, anyị adịghị emebi okwukwe anyị mgbe mkpagbu chere anyị ihu, kama anyị na-agbaso ihe nlereanya nke Ndịàmà Jehova nọ n’ebe bụbu Soviet Union, na Malawi, n’Etiopia, na n’ọtụtụ ala ndị ọzọ setịpụrụ.
6. Iguzosi ike n’ihe ga-egbochi anyị isoro olee ndị na-akpakọrịta?
6 Ọ bụrụ na anyị na-eguzosi ike n’ihe nye Jehova Chineke, anyị ga-ezere ime ndị nile bụ ndị iro ya enyi anyị. Ọ bụ ya mere Jemes onye na-eso ụzọ ji dee, sị: “Unu ndị na-akwa iko, ùnu amataghị na ịbụ enyi nke ụwa bụ ịbụ onye iro nke Chineke? Ya mere onye ọ bụla nke zubere ịbụ enyi nke ụwa na-edo onwe ya onye iro nke Chineke.” (Jemes 4:4) Anyị chọrọ inwe iguzosi ike n’ihe nke Eze Devid nyere ihe àmà ya mgbe ọ sịrị: “Ọ́ bụghị ndị na-akpọ Gị asị, Jehova, ka m na-akpọ asị? Ọ́ bụghịkwa ndị na-ebili imegide Gị ka m na-asọ oyi? Ọ bụ ịkpọasị nke zuru okè ka m ji kpọọ ha asị: ndị iro ka ha bụụrụ m.” (Abụ Ọma 139:21, 22) Anyị achọghị isoro ndị ọ bụla na-ama ụma eme mmehie na-akpakọrịta, n’ihi na o nweghị ihe jikọrọ anyị na ha. Ọ̀ bụ na iguzosi ike n’ihe nye Chineke agaghị egbochi anyị isoro ndị iro dị otú ahụ nke Jehova na-akpakọrịta, ma ọ bụ ná mmadụ ma ọ bụ site n’usoro mgbasa ozi telivishọn?
Ịgọchitere Jehova
7. Iguzosi ike n’ihe ga-enyere anyị aka ime gịnị banyere Jehova, oleekwa otú Elaịhu si mee nke a?
7 Iguzosi ike n’ihe ga-akpali anyị ịgọchitere Jehova Chineke. Lee ezi ihe nlereanya banyere nke ahụ anyị nwere n’Elaịhu! Job 32:2, 3 na-agwa anyị, sị: “Iwe Elaịhu . . . wee dị ọkụ: megide Job ka iwe ya dị ọkụ, n’ihi na ọ gụrụ onwe ya n’onye ezi omume karịa Chineke. Ọzọ, megide ndị enyi ya atọ ka iwe ya dị ọkụ, n’ihi na ha achọtaghị ihe ọzịza ha ga-eji maa Job ikpe.” Na Job isi nke 32 ruo 37, Elaịhu gọchiteere Jehova. Dị ka ihe atụ, ọ sịrị: “Chere m nwa mgbe nta, m ga-ekwupụtakwara gị; n’ihi na okwu ọzọ dị ikwuru Chineke. . . . Ọ bụkwa Onye kpụrụ m ka m ga-enye ezi omume. . . . Ọ dịghị esepụ anya Ya n’ahụ onye ezi omume.”—Job 36:2-7.
8. N’ihi gịnị ka o ji dị anyị mkpa ịgọchitere Jehova?
8 N’ihi gịnị ka e ji nwee mkpa ịgọchitere Jehova? Taa, a na-ekwulu Chineke anyị bụ́ Jehova n’ọtụtụ ụzọ. A na-azọrọ na ọ dịghị adị, na ọ bụ akụkụ nke Atọ n’Ime Otu, na ọ na-ata ndị mmadụ ahụhụ mgbe ebighị ebi n’ime hell na-ere ọkụ, na o ji umengwụ na-anwa ịtọghata ụwa, na ọ dịghị eche banyere ihe a kpọrọ mmadụ, na ihe ndị ọzọ. Anyị na-egosipụta iguzosi ike n’ihe anyị nye ya site n’ịgọchitere ya na igosi na Jehova dị adị; na ọ bụ Chineke nwere amamihe, nke na-ekpe ikpe ziri ezi, nke pụrụ ime ihe nile, na nke na-ahụ n’anya; na o nwere oge maka ihe nile; nakwa na mgbe oge ya ruru, ọ ga-eweta njedebe nye ihe ọjọọ nile ma mee ka elu ala nile ghọọ paradaịs. (Eklisiastis 3:1) Nke a na-achọ n’aka anyị iji ohere ọ bụla gbaa àmà nye aha na Alaeze Jehova.
Iguzosi Ike n’Ihe Nye Nzukọ Jehova
9. N’ihe banyere okwu ndị dị aṅaa ka ụfọdụ gosiworo eguzosighị ike n’ihe ha?
9 Anyị abịala ugbu a n’ihe banyere iguzosi ike n’ihe nye nzukọ Jehova a na-ahụ anya. N’ezie, anyị ji ụgwọ iguzosi ike n’ihe nye ya, tinyere “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” nke a na-esi enyeju ọgbakọ ndị Kraịst afọ n’ụzọ ime mmụọ. (Matiu 24:45-47) Ka e were ya na otu ihe pụtara ná mbipụta ndị nke Watch Tower nke anyị na-aghọtaghị ma ọ bụ na-ekwenyeghị ugbu a. Gịnị ka anyị ga-eme? Ọ̀ bụ iwe iwe wee hapụ ọgbakọ? Nke ahụ bụ ihe ụfọdụ mere mgbe Ụlọ Nche, ọtụtụ afọ gara aga, kwuru na ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ga-emezu n’oge Ọchịchị Narị Afọ Iri ahụ. Ndị ọzọ were iwe n’ihe Ụlọ Nche kwuru n’otu oge n’okwu banyere nnọpụiche. Ọ bụrụ na ndị sụrụ ngọngọ n’ihi okwu ndị a guzosiri ike n’ihe nye nzukọ a na ụmụnna ha, ha gaara echereworị Jehova ime ka okwu ndị a doo anya, bụ́ nke o mere n’oge ya. Ya mere, iguzosi ike n’ihe gụnyere iji ndidi na-echere ruo mgbe ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche bipụtara nghọta ọzọ.
10. Iguzosi ike n’ihe ga-egbochi anyị inwe ọchịchọ ịmata banyere gịnị?
10 Iguzosi ike n’ihe nye nzukọ Jehova a na-ahụ anya pụtakwara ịjụ ndị si n’ezi ofufe dapụ. Ndị Kraịst na-eguzosi ike n’ihe agaghị achọ ịmara ihe ụdị ndị dị otú ahụ nwere ikwu. N’eziokwu, ndị Jehova Chineke na-eji eduzi ọrụ ya n’elu ala ezughị okè. Ma gịnị ka Okwu Chineke na-agwa anyị ka anyị mee? Ọ̀ bụ ịhapụ nzukọ Chineke? Ee e. Ịhụnanya ụmụnna kwesịrị ime ka anyị na-eguzosi ike n’ihe nye ya, anyị kwesịkwara ịnọgide ‘na-esite n’obi na-ahụrịta onwe anyị n’anya sie ike.’—1 Pita 1:22.
Iguzosi Ike n’Ihe Nye Ndị Okenye Na-eguzosi Ike n’Ihe
11. Iguzosi ike n’ihe ga-enyere anyị aka iche nche megide echiche na-ezighị ezi dị aṅaa?
11 Mgbe e kwuru ma ọ bụ mee ihe na-esiri anyị ike ịghọta n’ọgbakọ, iguzosi ike n’ihe ga-egbochi anyị inyochapụta ebumnobi, ọ ga-enyekwara anyị aka inwe echiche nke na ikekwe ọ bụ ihe metụtara ikpe ikpe. Ọ̀ bụ na ọ kaghị nnọọ mma ilekwasị anya n’àgwà ọma nile nke ndị okenye a họpụtara ahọpụta na ndị kwere ekwe ibe anyị ndị ọzọ kama ilekwasị anya n’amaghị eme ha? Ee, anyị chọrọ iche nche megide echiche ndị dị otú ahụ na-ezighị ezi, n’ihi na e jikọtara ya na ịbụ onye na-adịghị eguzosi ike n’ihe! Iguzosi ike n’ihe ga-enyekwara anyị aka irube isi ná ntụziaka Pọl ‘ịghara ikwulu onye ọ bụla.’—Taịtọs 3:1, 2.
12, 13. Olee ihe ịma aka ndị pụrụ iche nke ndị okenye na-aghaghị iche ihu?
12 Iguzosi ike n’ihe na-enye ndị okenye ihe ịma aka ndị pụrụ iche. Otu n’ime ihe ịma aka ndị a bụ ihe banyere okwu nzuzo. Otu onye òtù nke ọgbakọ pụrụ ịgwa onye okenye ihe nzuzo ya. Iguzosi ike n’ihe nye onye ahụ ga-egbochi onye okenye ahụ imebi ụkpụrụ na-achị ijigide okwu nzuzo. Ọ ga-aṅa ntị na ndụmọdụ dị n’Ilu 25:9: “Ekpughekwala izu nzuzo nke onye ọzọ.” Nke ahụ pụtara ịghara ikpughere ya ọbụna nwunye ya!
13 Ndị okenye nwekwara ule ndị ọzọ nke iguzosi ike n’ihe imeri. Hà ga-abụ ndị na-eme ihe na-atọ mmadụ ụtọ, ka ha ga-eji obi ike na ịdị nwayọọ na-enyere ndị chọrọ mgbazi olu aka, ọbụna ọ bụrụ na ha bụ ndị ikwu sitere n’otu ọbara ma ọ bụ ezi ndị enyi? Iguzosi ike n’ihe nye nzukọ Jehova ga-eme ka ụfọdụ ndị n’ime anyị bụ ndị okenye gbalịa inyere onye ọ bụla nke enyemaka ime mmụọ dị mkpa aka. (Ndị Galetia 6:1, 2) Ọ bụ ezie na anyị ga-enwe obi ọma, iguzosi ike n’ihe ga-eme ka anyị na-agwa onye okenye ibe anyị eziokwu, dị nnọọ ka Pọl gwara Pita onyeozi okwu n’eziokwu. (Ndị Galetia 2:11-14) N’aka nke ọzọ, ndị nlekọta chọrọ ịkpachara anya, ma ọ bụghị ya site n’ime omume n’ụzọ amamihe na-adịghị na ya ma ọ bụ n’ile mmadụ anya n’ihu ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ na-eji ikike ha na-eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, ha na-eme ka o siere ndị ha na-elekọta ike iguzosi ike n’ihe nye nzukọ Chineke.—Ndị Filipaị 4:5.
14, 15. Olee ihe ndị pụrụ itinye iguzosi ike n’ihe nke ndị òtù ọgbakọ n’ule?
14 E nwere akụkụ ndị ọzọ n’ihe banyere imeri ihe ịma aka nke iguzosi ike n’ihe nye ọgbakọ na ndị okenye ya. Ọ bụrụ na e nwere ihe dịtụ ka nsogbu n’ọgbakọ, nke a na-enye anyị ohere nke iguzosi ike n’ihe nye Jehova na ndị na-anọchite anya ya. (Lee Ụlọ Nche, June 15, 1987, peji nke 15-17.) Mgbe e nwere onye a chụpụrụ, iguzosi ike n’ihe na-achọ n’aka anyị ịkwado ndị okenye, ọ bụghị ịgbalị iche ma e nwere ihe zuru ezu kpatara ihe e mere.
15 Iguzosi ike n’ihe nye ọgbakọ na-achọkwa anyị n’aka ịkwado nzukọ ise nile a na-enwe kwa izu ruo n’ókè nke ọnọdụ na ikike anyị kwere. Iguzosi ike n’ihe chọrọ anyị n’aka ọ bụghị nanị ịgachi ha anya kamakwa ịkwadebe maka ha ma nye azịza ndị na-ewuli elu dị ka ohere ya dapụtara.—Ndị Hibru 10:24, 25.
Iguzosi Ike n’Ihe n’Alụmdi na Nwunye
16, 17. Ihe ịma aka ndị dị aṅaa nke iguzosi ike n’ihe ka ndị Kraịst lụrụ di na nwunye na-aghaghị iche ihu?
16 Olee onye ọzọ anyị ji ụgwọ iguzosi ike n’ihe? Ọ bụrụ na anyị alụwo di ma ọ bụ nwunye, n’ihi nkwa alụmdi na nwunye anyị, anyị aghaghị imeri ihe ịma aka nke iguzosi ike n’ihe nye di ma ọ bụ nwunye anyị. Iguzosi ike n’ihe nye di ma ọ bụ nwunye anyị ga-egbochi anyị ihie ụzọ nke imere ndị inyom ma ọ bụ ndị ikom ndị ọzọ ihe ọma karịa nwunye ma ọ bụ di anyị. Iguzosi ike n’ihe nye di ma ọ bụ nwunye anyị chọkwara ka anyị ghara ikpughere ndị nọ n’èzí adịghị ike ma ọ bụ amaghị eme nke di ma ọ bụ nwunye anyị. Ọ dị mfe imere ndị ọzọ mkpesa karịa ịrụsi ọrụ ike iji mee ka ụzọ nkwurịta okwu anyị na nwunye ma ọ bụ di anyị ghere oghe, bụ́ nke anyị kwesịrị ime n’ikwekọ n’Ụkpụrụ Ọma ahụ. (Matiu 7:12) N’ezie, ọnọdụ alụmdi na nwunye na-enye ihe ịma aka gbara ọkpụrụkpụ nye iguzosi ike n’ihe ndị Kraịst anyị.
17 Iji merie ihe ịma aka nke a nke iguzosi ike n’ihe, ọ bụghị nanị na anyị ga-ezere ịbụ ndị ikpe omume jọrọ oké njọ mara kama anyị aghaghịkwa iche echiche na mmetụta anyị nile nche. (Abụ Ọma 19:14) Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na obi anyị dị aghụghọ na-enwe anyaukwu maka ihe ụtọ na ihe mkpali, ọ dịịrị anyị nnọọ mfe iji ọchịchọ onwe onye nanị site n’inwe mmasị gaa n’ịchọ inweta ihe. Ka ọ na-agba ume ikwesị ntụkwasị obi n’alụmdi na nwunye, Eze Solomọn na-adụ ndị bụ́ di ọdụ n’ụzọ ihe atụ ‘ịṅụ mmiri sitere n’olulu nke aka ha.’ (Ilu 5:15) Jisọs sịkwara: “Nwoke ọ bụla nke na-ele nwanyị anya ka agụụ ya wee gụọ ya, ọ kwasịwo ya iko n’obi ya ugbu a.” (Matiu 5:28) Ndị di bụ́ ndị na-etinye onwe ha n’ihe na-akpali mmekọahụ nọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị a rabara n’ịkwa iko, si otú a na-aghọgbu nwunye ha ma bụrụ ndị na-eguzosighị ike n’ihe nye ha. N’otu aka ahụkwa, nwunye nke na-emikpu onwe ya n’ihe nkiri a na-adịghị emecha otu mgbe nke na-egosi ihe omume ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko pụrụ ịbụ onye a nwara ọnwụnwa ịghọ onye na-adịghị eguzosi ike n’ihe nye di ya. Otú ọ dị, site n’ịdị na-eguzosi ike n’ihe n’eziokwu nye di ma ọ bụ nwunye anyị, anyị na-ewusi nkekọ alụmdi na nwunye anyị ike, anyị na-enyekwara ibe anyị aka ná mgbalị anyị ime ihe na-atọ Jehova Chineke ụtọ.
Ihe Ndị Na-enye Aka Ịnọgide Na-eguzosi Ike n’Ihe
18. Ịghọta gịnị ga-enyere anyị aka iguzosi ike n’ihe?
18 Gịnị ga-enyere anyị aka imeri ihe ịma aka nke iguzosi ike n’ihe n’akụkụ anọ ndị a: iguzosi ike n’ihe nye Jehova, nye nzukọ ya, nye ọgbakọ, na nye di ma ọ bụ nwunye anyị? Otu ihe enyemaka bụ ịghọta na imeri ihe ịma aka nke iguzosi ike n’ihe bụ nke e jikọrọ ya na iwepụ ọbụbụeze Jehova n’ụta. Ee, site n’ịnọgide na-eguzosi ike n’ihe anyị na-egosi na anyị na-ewere Jehova dị ka Eze Eluigwe na Ala. Otú a anyị pụkwara inwe ùgwù onwe onye na olileanya nke ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ Jehova. Anyị pụrụ inyere onwe anyị aka ịnọgide na-eguzosi ike n’ihe site n’ịtụle ezi ihe nlereanya dị iche iche nke iguzosi ike n’ihe, site na Jehova gbadaa ná ndị ahụ a kpọtụrụ aha ha n’ime Bible na ná mbipụta nke Watch Tower, tinyere akụkọ Yearbook.
19. Òkè dị aṅaa ka okwukwe na-ekere n’anyị iguzosi ike n’ihe?
19 Okwukwe siri ike n’ebe Jehova Chineke nọ na egwu nke imejọ ya ga-enyere anyị aka imeri ihe ịma aka nke iguzosi ike n’ihe. Anyị na-ewusi okwukwe anyị na Jehova na egwu anyị na-atụ ya ike site n’iji ịdị uchu na-amụ Okwu Chineke na site n’ikere òkè n’ozi ndị Kraịst. Nke a ga-enyere anyị aka ime omume n’ikwekọ na ndụmọdụ Pọl e dekọrọ ná Ndị Efesọs 4:23, 24: “Ka e meekwa ka unu dị ọhụrụ na mmụọ nke uche unu, ka unu yikwasịkwa mmadụ ọhụrụ unu, nke e kere dị ka Chineke chọrọ n’ime ezi omume na ịdị ọcha [“iguzosi ike n’ihe,” NW] nke eziokwu ahụ.”
20. Nke ka nke, àgwà dị aṅaa ga-enyere anyị aka iguzosi ike n’ihe nye Jehova na ndị ọzọ nile anyị ji ụgwọ iguzosi ike n’ihe?
20 Ịghọta àgwà Jehova nile na-enyere anyị aka iguzosi ike n’ihe. Nke ka nke, ịhụnanya nke na-adịghị achọ ọdịmma onwe ya nanị maka Nna anyị nke eluigwe na ekele maka ihe nile o mewooro anyị, iji obi na mkpụrụ obi na uche na ume anyị dum na-ahụ ya n’anya ga-enyere anyị aka iguzosi ike n’ihe nye ya. Ọzọkwa, inwe ịhụnanya nke Jisọs sịrị na a ga-eji mata ndị na-eso ụzọ ya ga-enyere anyị aka iguzosi ike n’ihe nye ndị Kraịst nile nọ n’ọgbakọ na n’ezinụlọ anyị. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ọ bụ nnọọ n’ezie ihe banyere ịbụ onye na-achọ ọdịmma onwe onye nanị ma ọ bụ onye na-adịghị achọ ọdịmma onwe onye nanị. Eguzosighị ike n’ihe pụtara ịchọ ọdịmma onwe onye nanị. Iguzosi ike n’ihe pụtara achọghị ọdịmma onwe onye nanị.—Mak 12:30, 31; Jọn 13:34, 35.
21. Olee otú a pụrụ isi achịkọta ihe banyere imeri ihe ịma aka nke iguzosi ike n’ihe?
21 Iji chịkọta ihe nile e kwuru: Iguzosi ike n’ihe bụ àgwà magburu onwe ya nke Jehova Chineke, Jisọs Kraịst, na ezi ndị ohu Jehova nile gosipụtara. Iji soro Jehova Chineke na-enwe ezi mmekọrịta, anyị aghaghị imeri ihe ịma aka nke iguzosi ike n’ihe nye ya site n’ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’iwu ezi omume ya, site n’ịjụ ndị iro ya, na site n’ịgọchitere Jehova site n’ịgba àmà a haziri ahazi na nke mberede. Anyị aghaghịkwa imeri ihe ịma aka nke iguzosi ike n’ihe nye nzukọ Jehova a na-ahụ anya. Anyị aghaghị iguzosi ike n’ihe nye ọgbakọ anyị dị iche iche, na-eguzosikwa ike n’ihe nye di ma ọ bụ nwunye anyị. Site n’inwe ihe ịga nke ọma n’imeri ihe ịma aka nke iguzosi ike n’ihe, anyị ga na-ekere òkè n’iwepụ ọbụbụeze Jehova n’ụta, anyị gakwa na-anọ n’akụkụ ya nke ihe iseokwu ahụ. Site n’ụzọ dị otú ahụ, anyị ga-enweta ihu ọma ya ma nata ụgwọ ọrụ nke ndụ ebighị ebi. Ihe Pọl onyeozi kwuru banyere nsọpụrụ Chineke bụkwa nke a pụrụ ikwu banyere imeri ihe ịma aka nke iguzosi ike n’ihe. Ọ bara uru maka ndụ dị ugbu a nakwa nke gaje ịbịa.—Abụ Ọma 18:25; 1 Timoti 4:8.
Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?
◻ N’ụzọ ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ isi merie ihe ịma aka nke iguzosi ike n’ihe nye Chineke?
◻ Gịnị ka iguzosi ike n’ihe nye nzukọ Jehova chọrọ anyị n’aka?
◻ Olee otú ndị okenye pụrụ isi merie ihe ịma aka nke iguzosi ike n’ihe?
◻ Ihe ịma aka dị aṅaa metụtara iguzosi ike n’ihe ka ndị Kraịst lụrụ di na nwunye na-aghaghị imeri?
◻ Àgwà ndị dị aṅaa ga-enyere anyị aka imeri ihe ịma aka nke iguzosi ike n’ihe?
[Foto dị na peeji nke 17]
Iguzosi ike n’ihe nye ndị òtù ọgbakọ ga-egbochi ndị okenye ikpughe okwu nzuzo
[Foto ndị dị na peeji nke 18]
Iguzosi ike n’ihe nye di ma ọ bụ nwunye mmadụ na-eme ka nkekọ alụmdi na nwunye sie ike