Otú Ndị Ọzụzụ Atụrụ Bụ́ Ndị Kraịst Si Na-ejere Gị Ozi
N’ỌTỤTỤ ebe a pụrụ ịhụ otú ndị ọzụzụ atụrụ si elekọta ìgwè atụrụ. Ha na-edu, na-echebe, ma na-enye atụrụ ihe ndị dị ha mkpa. Nke a na-adọrọ mmasị ndị Kraịst bụ́ ndị okenye, ebe ọ bụ na ọrụ ha na-agụnye ọrụ ọzụzụ atụrụ. N’ezie, ọ bụ ọrụ ha ‘ịzụ nzukọ Chineke dị ka atụrụ’ na ‘ilekọta ìgwè atụrụ ahụ nile.’—Ọrụ 20:28.
Ọ bụrụ na ị bụ onye òtù nke ọgbakọ ndị Kraịst, olee otú ndị ọzụzụ atụrụ ime mmụọ pụrụ isi jeere gị ozi? Oleekwa otú i kwesịrị isi meghachi omume ná mgbalị nile ha na-eme n’ihi gị? N’ihi gịnị ka enyemaka ha ji dị ọgbakọ mkpa?
Nchebe Pụọ na Gịnị?
N’oge ochie, ọdụm na anụ ọhịa ndị ọzọ na-etinye ìgwè atụrụ n’ihe ize ndụ ma na-eri atụrụ nọ nanị ya. Ndị ọzụzụ atụrụ aghaghị ichebe ha. (1 Samuel 17:34, 35) Otú ọ dị, Setan bụ́ Ekwensu “dị ka ọdụm na-agbọ ụja, ọ na-ejegharị, na-achọ onye ọ ga-elomi.” (1 Pita 5:8) O ji ọnụma na-ebu agha megide ọ bụghị nanị nzukọ elu ala nke Jehova n’ozuzu ya kamakwa megide ohu Chineke nke ọ bụla n’otu n’otu. Gịnị bụ ebumnobi Setan? Ọ na-achọ ịkụda ndị Jehova aka na ọbụna gbochie ha ‘idebe ihe nile Chineke nyere n’iwu’ na ịrụ ọrụ ịgba “àmà nke Jisọs.”—Mkpughe 12:17.
Jehova boro ndị ọzụzụ atụrụ ọchịchị nke Israel oge ochie ebubo nlefuru anya n’ihi na atụrụ ya “ghọọrọ anụ ọhịa nile ihe oriri.” (Ezikiel 34:8) Otú ọ dị, ndị Kraịst bụ́ ndị okenye nwere ọchịchọ sitere n’obi ichebe ndị nọ n’ime ọgbakọ ka ọ ghara ịdị nke ga-efu n’ihi nlefuru anya ma ọ bụ n’ihi mmetụta nke Setan, ụwa, ma ọ bụ “agụ” ndị si n’ezi ofufe dapụ. (Ọrụ 20:29, 30) Olee otú ndị ọzụzụ atụrụ ahụ si enyere ndị nile so n’ìgwè atụrụ ahụ aka ịnọgide na-enwe anya udo ma na-eche nche? Otu ụzọ bụ site n’ikwu okwu ndị a kwadebere nke ọma ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ n’elu ikpo okwu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ụzọ ọzọ bụ site ná mkparịta ụka ndị dị mma, ndị na-agba ume tupu na mgbe nzukọ gasịrị. Ụzọ ọzọkwa dị irè bụ site n’ịdị na-eje n’onwe ha ileta “atụrụ” ahụ n’ebe obibi ha. (Tụlee Abụ Ọma 95:7.) Ma gịnị bụ nleta ọzụzụ atụrụ? Olee otú a pụrụ isi jee nleta dị otú ahụ? Ònyekwa ka e kwesịrị ije leta?
Gịnị Bụ Nleta Ọzụzụ Atụrụ?
Nleta ọzụzụ atụrụ abụghị nanị nleta efu nke ndị enyi nke gụnyere mkparịta ụka n’ụmụ irighiri ihe. Otu onye okenye kwuru, sị: “Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị nkwusa na-enwe nnọọ mmasị ịgụ otu akụkụ akwụkwọ nsọ ma ọ bụ ịkparịta banyere otu onye a kpọrọ aha n’ime Bible. N’ezie, onye okenye ahụ adịghị ekwu okwu nile nanị ya. Onye nkwusa Alaeze ahụ e jere ileta na-enwekarị mmasị ikwupụta echiche ya nile banyere Bible, imekwa nke a na-ewusi okwukwe nke ya ike. Onye okenye ahụ pụrụ iji otu magazin Ụlọ Nche ma ọ bụ Teta! jee iji soro ya kwurịta otu isiokwu na-ewuli elu. Ikekwe mkparịta ụka ime mmụọ a bụ ihe na-eme ka e nwee ọdịiche ná nleta ọzụzụ atụrụ na nleta nke ndị enyi.”
Onye okenye ọzọ nke nweworo ahụmahụ kwuru, sị: “Tupu nleta ahụ, onye okenye ahụ na-ewepụta oge chee echiche banyere onye nkwusa ahụ ọ gaje ịkpọtụrụ. Gịnị pụrụ iwuli onye nkwusa ahụ elu? Ịja mma sitere n’obi eziokwu bụ akụkụ dị mkpa nke nleta ọzụzụ atụrụ, n’ihi na ọ na-ewusi mmadụ ike ịtachi obi.” Ee, nleta ọzụzụ atụrụ abụghị nanị nleta enyi nke onye ọ bụla nọ n’ime ọgbakọ pụrụ ime.
N’ihi Gịnị Ka Onye Ọzụzụ Atụrụ Ji Abịa Ileta Gị?
Mgbe onye okenye jere ileta otu ebe obibi, ọ dị njikere ịgba ndị kwere ekwe ibe ya ume na inyere ha aka ịnọsi ike n’okwukwe. (Ndị Rom 1:11) Ya mere mgbe otu onye okenye ma ọ bụ abụọ nwere mmasị ịbịa leta gị, ị̀ na-esi aṅaa emeghachi omume? Otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị kwuru, sị: “Ọ bụrụ na a na-eje nleta ọzụzụ atụrụ nanị mgbe ihe na-adịchaghị agazi agazi, mmeghachi omume mbụ ná nleta a na-eme atụmatụ ya pụrụ ịbụ, ‘Olee nke m mekwara?’” Ndị ọzụzụ atụrụ ime mmụọ na-ahụ n’anya na-eṅomi Jehova, bụ́ onye lekọtara onye ọbụ abụ ahụ ma ‘na-eweghachi mkpụrụ obi ya’ mgbe nile, karịsịa n’oge ihe isi ike na mkpa pụrụ iche.—Abụ Ọma 23:1-4.
Nzube nke nleta ọzụzụ atụrụ bụ “iwuli elu dị ka ụlọ, ọ bụghịkwa ịkwada akwada.” (2 Ndị Kọrint 13:10) N’ezie, okwu ịja mma maka ntachi obi, ịnụ ọkụ n’obi, na ọrụ ikwesị ntụkwasị obi nke onye ahụ e jere ileta bụ ihe na-agba ume. Otu onye okenye kwuru, sị: “Ná nleta ọzụzụ atụrụ, ọ dịghị mma inye echiche nke na mmadụ bịara n’ebumnobi nke ịchọpụta na ikwurịta banyere nsogbu. Otú ọ dị, onye nkwusa ahụ n’onwe ya pụrụ ịchọ ikwu okwu banyere otu ihe isi ike kpọmkwem. Ọ bụrụkwa na otu atụrụ na-arụ ụkwụ ma ọ bụ na-ekewapụ onwe ya iche pụọ n’ìgwè atụrụ ndị ọzọ, ọ dị onye okenye ahụ mkpa ime ihe iji nye aka.”
Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndị ọzụzụ atụrụ bụ́ ndị Kraịst ga-elekọta n’ụzọ pụrụ iche onye ọ bụla yiri ndị ahụ e ji okwu ndị a kọwaa: “Nke furu efu ka M [Jehova] ga-achọ, ọ bụkwa nke a chụfuru achụfu ka M ga-ewelata, ọkpụkpụ a gbajiri agbaji ka M ga-ekezikwa, nke ahụ ya na-adịghị ike ka M ga-emekwa ka ọ dị ike.” (Ezikiel 34:16) Ee, ọ pụrụ ịdị mkpa ịchọ atụrụ achọ, welata, kezie, ma ọ bụ mee ka ọ dị ike. Ndị ọzụzụ atụrụ nke Israel lefuuru ibu ọrụ ndị a anya. Ịrụ ụdị ọrụ ahụ na-achọ ka onye ọzụzụ atụrụ kpụdewe otu atụrụ nso ma lekọta mkpa ya nile. N’ụzọ bụ isi, nke a kwesịrị ịbụ ihe e ji mara nleta ọzụzụ atụrụ ọ bụla taa.
Atụrụ Ahụ Siri Ike Chọrọ Nlekọta
Ànyị kwesịrị ikwubi na ọ dịghị ndị ọzụzụ atụrụ ime mmụọ nke oge a mkpa igosi atụrụ ahụ siri ike nlebara anya pụrụ iche? Mgbe atụrụ nkịtị dabara ná nsogbu, ọ na-aka mfe inyere ya aka ma ọ bụrụ na o nwere obi ike n’ebe onye ọzụzụ atụrụ ahụ nọ. Otu akwụkwọ kwuru na “atụrụ adịghị achọkarị ịbịa mmadụ nso, inwetakwa ntụkwasị obi ha anaghị adịcha mfe mgbe nile.” Gụnyere ihe ndị ọzọ, otu akwụkwọ ahụ na-atụ aro ntụziaka a bụ isi iji nweta ntụkwasị obi nke atụrụ: “Na-agwachi atụrụ ahụ okwu anya. Ha na-abịa mara olu ahụ, nke na-emesi ha obi ike. Na-eleta atụrụ ahụ ọtụtụ mgbe n’ebe ha na-ata nri.”—Alles für das Schaf. Handbuch für die artgerechte Haltung (Ihe Nile Maka Atụrụ. Akwụkwọ Na-akọwa Ụzọ Isi Lekọta Ha nke Ọma).
Ya mere mmekọrịta onwe onye dị mkpa ma ọ bụrụ na a ga-enwe mmekọrịta ntụkwasị obi n’etiti onye ọzụzụ atụrụ na atụrụ. Otu ihe ahụ bụkwa eziokwu n’ọgbakọ ndị Kraịst. Otu onye okenye kwuru, sị: “Ịbụ onye a maara n’ọgbakọ dị ka onye okenye nke na-eletachi atụrụ anya na-eme ka ọ dị mfe karị ịkpọtụrụ onye nwere nsogbu.” N’ihi ya, ndị ọzụzụ atụrụ ime mmụọ ekwesịghị ịgbalị ịzụ na ilekọta atụrụ ahụ nanị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ruo n’ókè ọnọdụ nyere ohere ya, ndị okenye kwesịrị ịmata atụrụ ahụ site n’ịdị na-eje nleta ọzụzụ atụrụ n’ebe obibi ha. Otu onye Kraịst na-echeta na mgbe a họpụtara ya ọhụrụ dị ka onye okenye, onye isi oche ndị okenye kpọrọ ya òkù na fon ma gwa ya ka o jee leta ma kasie otu nwanna nwoke obi bụ́ onye nwa ya nwanyị ka nwụnahụsịrị n’ajọ ihe mberede okporo ụzọ. Onye okenye ahụ na-ekweta, sị: “Lee ka o si wute m, ebe ọ bụ na ọ dịbeghị mgbe ọ bụla m letatụworo nwanna ahụ, amadịghị m ebe o bi! Ọ bụ nnọọ ihe obi iru ala mgbe otu onye okenye tozuru okè wepụtara onwe ya iso m jee.” Ee, ndị okenye na-enyere ibe ha aka ná nleta ọzụzụ atụrụ.
N’ịkwadebe maka na ime nleta ọzụzụ atụrụ, onye ohu na-eje ozi nke na-eru eru maka “ọrụ ọma” nke ịbụ onye nlekọta pụrụ isonyere onye okenye. (1 Timoti 3:1, 13) Lee ka ohu na-eje ozi si enwe mmasị n’ịhụ otú onye okenye si ejere atụrụ ahụ ozi ná nleta ọzụzụ atụrụ! Ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi si otú a abịakwu ndị nile nọ n’ọgbakọ nso, na-ewusi ihe nkekọ nile nke ịhụnanya na ịdị n’otu ndị Kraịst ike.—Ndị Kọlọsi 3:14.
Idokwa Oge Maka Nleta Ọzụzụ Atụrụ
Mgbe otu òtù ndị okenye hapụụrụ ndị nduzi Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ ọrụ nleta ọzụzụ atụrụ, e letara ndị nkwusa nile nọ n’ìgwè ụfọdụ n’ime ọnwa isii, ebe ọ na-adịghị onye a kpọtụụrụ n’ìgwè ndị ọzọ. Nke a kpaliri otu onye okenye ikwu, sị: “O yiri ka ndị okenye ụfọdụ na-eme ihe n’onwe ha ma na-arụ ọrụ ọzụzụ atụrụ dị ukwuu, ma ndị ọzọ chọrọ agbamume nke ndị okenye ibe ha iji mee otú ahụ.” Ya mere ụfọdụ òtù ndị okenye na-eme ndokwa ka ndị ọzụzụ atụrụ jee leta ndị nkwusa nile n’ime otu oge a kara aka.
N’ezie, onye okenye ma ọ bụ onye nkwusa ọ bụla ọzọ pụrụ ileta onye nọ n’ọgbakọ n’echereghị ka e mee ndokwa ndị pụrụ iche. Tupu o jee nleta ọzụzụ atụrụ, otu onye okenye na-akpọ na fon wee kwuo, sị, “M na-akpọtụrụ otu ezinụlọ kwa ọnwa. M̀ pụrụ iji otu hour ma ọ bụ ihe yiri ya bịa leta unu n’ọnwa ọzọ? Olee mgbe ga-adịrị unu mma?”
Ngọzi Dị Iche Iche nke Nleta Ọzụzụ Atụrụ
Ka nrụgide ndị sitere n’ajọ usoro ihe a nọgidere na-arị elu, nleta ndị na-agba ume nke ndị ọzụzụ atụrụ na-aghọta ihe na-aghọwanye nke bara uru. Mgbe e nyere ndị nile so n’ìgwè atụrụ ahụ agbamume na enyemaka site ná nleta ọzụzụ atụrụ, atụrụ nke ọ bụla na-enwe mmetụta nke ịnọ ná nchebe na ntụkwasị obi.
Banyere otu ọgbakọ bụ́ ebe ndị ọzụzụ atụrụ na-eletachi ndị nkwusa Alaeze nile anya, a kọrọ, sị: “Ndị nkwusa ghọrọ ndị nwere àgwà ziri ezi banyere nleta ọzụzụ atụrụ. A na-ahụkarị ka onye nkwusa na-abịakwute otu n’ime ndị okenye iji jụọ mgbe ọ ga-abịa ọzọ leta ha, ebe ọ bụ na onye ahụ na-ajụ ajụjụ nwererị mmasị ná mkparịta ụka na-ewuli elu e nwere n’oge nleta nke mbụ. Nleta ọzụzụ atụrụ bụ otu ihe nyere aka imeziwanye mmụọ nke dị n’ọgbakọ.” Akụkọ ndị ọzọ na-egosi na mgbe ndị ọzụzụ atụrụ ji ịhụnanya na-eje ozi n’ụzọ dị otú a, ọgbakọ pụrụ ito n’ịhụnanya, ịdị n’otu, na ikpo ọkụ. Lee aha ngọzi ọ bụ!
Ndị ọzụzụ atụrụ bụ́ ndị Kraịst na-eme nleta iji kwalite ọdịmma ime mmụọ nke atụrụ ahụ. Ndị okenye chọrọ ịgba ndị kwere ekwe ibe ha ume ma wusie ha ike. Ọ bụrụ na nsogbu siri ike nke chọrọ ndụmọdụ apụta ìhè n’oge e mere nleta, ọ pụrụ ịkasị mma ime ndokwa inwe nkwurịta okwu n’oge ọzọ, karịsịa ma ọ bụrụ na onye okenye ahụ na ohu na-eje ozi so. Ka o sina dị, iji ekpere mechie nleta ọzụzụ atụrụ ahụ kwesịrị ekwesị.
Onye ọzụzụ atụrụ ime mmụọ ọ̀ chọrọ ime nleta n’ebe obibi gị n’ọdịnihu dị nso? Ọ bụrụ na ọ dị otú ahụ, jiri obi ụtọ na-atụ anya agbamume nke na-echere gị. Ọ na-abịa ijere gị ozi na iwusi gị ike ná mkpebisi ike gị ịnọgide n’ụzọ ahụ nke na-eduje ná ndụ ebighị ebi.—Matiu 7:13, 14.
[Igbe dị na peeji nke 26]
ARO DỊ ICHE ICHE MAKA NLETA ỌZỤZỤ ATỤRỤ
◻ Yie agba: Ọ na-adịkarị mma iyi agba. Ọ bụrụ na onye okenye ahụ na-eme atụmatụ ilebara otu nsogbu siri ike anya, ọ ga-ekwesị ekwesị ibu ụzọ gwa onye nkwusa maka nke a.
◻ Nkwadebe: Tụlee àgwà na ọnọdụ onye ahụ. Nye ịja mma sitere n’obi. Mee ka ọ bụrụ nzube gị inye “onyinye ime mmụọ” na-agba ume, nke na-ewusi okwukwe ike. —Ndị Rom 1:11, 12, NW.
◻ Onye a ga-akpọ jee: Onye okenye ọzọ ma ọ bụ onye ohu na-eje ozi nke ruru eru.
◻ N’oge nleta ahụ: Onye okenye ahụ kwesịrị ịtụsara ahụ, na-ahụ n’anya, nwee àgwà ziri ezi, ma na-agbanwe agbanwe. Jụọ banyere ezinụlọ ahụ, ọdịmma ha, na ihe ndị ọzọ. Ṅaa ntị nke ọma. Ọ bụrụ na nsogbu siri ike apụta ìhè, ọ pụrụ ịkasị mma ime ndokwa maka nleta ọzụzụ atụrụ pụrụ iche.
◻ Otú a ga-anọru ná nleta ahụ: Anọfela oge ahụ e kwekọrịtara ịnọ, ma lawa mgbe nleta ahụ ka nọ na-atọ onye i jere na nke ya ụtọ.
◻ Imechi nleta ahụ: Ekpere kwesịrị ekwesị ma bụrụ nke a na-enwe mmasị na ya n’ezie.—Ndị Filipaị 4:6, 7.
[Foto dị na peeji nke 24]
Ndị ọzụzụ atụrụ bụ́ ndị Kraịst na-enye nchebe ime mmụọ
[Foto ndị dị na peeji nke 26]
Nleta ọzụzụ atụrụ na-eme ka e nwee ohere ndị mara mma maka agbamume ime mmụọ