“Unu Arụla Ọrụ Ịnata Ihe Oriri nke Na-ala n’Iyi”
DỊ KA DAVID LUNSTRUM SI KỌỌ
Mụ na nwanne m nwoke bụ́ Elwood kwụ ihe karịrị mita itoolu n’elu, na-ede ihe odide ọhụrụ e dekwasịrị n’ụlọ obibi akwụkwọ nke Watchtower. Ihe karịrị 40 afọ n’ihu, ọ ka dị ebe ahụ, na-agba ume, sị: “GỤỌ OKWU CHINEKE BỤ́ BIBLE NSỌ KWA ỤBỌCHI.” Kwa izu, ọtụtụ puku mmadụ na-ahụ ihe odide a ka ha na-agafe Àkwà Mmiri Brooklyn ahụ a ma ama.
IHE ndị m na-echeta site n’oge m bụ nwata gụnyere ụbọchị ezinụlọ anyị ji asa ákwà. N’elekere ise n’ụtụtụ, mama m ga-ebili n’ụra, na-asara ezinụlọ anyị buru ibu ákwà, papa m ga na-ejikerekwa ọrụ. Ha ga-enwekwa ọzọ n’ime ịrụ ụka ha na-akpụ ọkụ n’ọnụ, papa m ana-arụ ụka na n’ụzọ ụfọdụ mmadụ rịpụtara arịpụta n’ime ọtụtụ nde afọ, mama m kwa ana-ehota Bible iji gosi na ụmụ mmadụ bụ ihe ndị Chineke kere kpọmkwem.
Ọbụna mgbe m dị nanị afọ asaa, achọpụtara m na mama m nwere eziokwu. N’agbanyeghị otú m hụruru papa m n’anya, apụrụ m ịhụ na nkweta ya enyeghị olileanya ọ bụla maka ọdịnihu. Lee ka mama m gaara esiworị nwee obi ụtọ ịmata na ọtụtụ afọ n’ihu, abụọ n’ime ụmụ ya ndị nwoke dere ihe odide nke na-agba ndị mmadụ ume ịgụ Bible, bụ́ akwụkwọ ọ hụrụ n’anya nke ukwuu!
Ma esoghị m ya n’usoro. Olee otú m si bịa nwee ọrụ ihe ùgwù dị otú ahụ? Ọ dị m mkpa ịlaghachi azụ n’afọ 1906, afọ atọ tupu a mụọ m.
Ihe Nlereanya Ikwesị Ntụkwasị Obi nke Mama M
N’oge ahụ mama m na papa m ka gbasịrị akwụkwọ ọhụrụ ma na-ebi n’otu ụlọ ntu n’Arizona. Otu Onye Mmụta Bible, dị ka a na-akpọ Ndịàmà Jehova n’oge ahụ, bịara ma nye mama m usoro akwụkwọ nke Charles Taze Russell dere nke a kpọrọ Studies in the Scriptures. Mama m mụrụ anya n’abalị nile na-agụ ha, chọpụtakwa n’oge na-adịghị anya na nke a bụ eziokwu ahụ ọ nọworo na-achọ. O jisi ike chere ruo mgbe papa m lọtara site n’ije chọọ ọrụ.
Papa m kwa enweghị afọ ojuju n’ihe chọọchị dị iche iche na-akụzi, ya mere ruo oge ụfọdụ ọ nakweere eziokwu Bible ndị a. Otú ọ dị, ka e mesịrị, ọ gara iche n’ihe banyere okpukpe ọbụnakwa mee ka ihe siere mama m ike. Ma ọ dịghị mgbe mama m kwụsịrị ilekọta mkpa anụ ahụ na nke ime mmụọ nke ụmụ ya.
Apụghị m ichezọ otú mama m si esi n’ụlọ elu arịdata kwa abalị, mgbe ọ rụgbusiworo onwe ya n’ọrụ n’ụbọchị, iji gụọrọ anyị otu akụkụ Bible ma ọ bụ iji soro anyị kerịta ụfọdụ ihe ime mmụọ mara mma. Papa m bụkwa onye na-arụsi ọrụ ike, ka m na-emekwa okenye karị, ọ kụziiri m ọrụ ite agba. Ee, papa m kụziiri m ịrụ ọrụ, ma mama m kụziiri m ihe m ga-arụ ọrụ maka ya, dị ka Jisọs tụziri, ‘ihe oriri nke na-adịghị ala n’iyi.’—Jọn 6:27.
Ezinụlọ anyị mesịrị biri ná ntakịrị obodo bụ́ Ellensburg na steeti nke Washington, ihe dị ka 180 kilomita n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke Seattle. Mgbe anyị bụ́ ụmụaka malitere iso mama anyị na-eje nzukọ nke Ndị Mmụta Bible, anyị na-ezukọta n’ebe obibi ndị mmadụ. Ụmụ nwoke nile kwụsịrị isonyere ìgwè ọmụmụ ihe anyị mgbe e mesiri ike mkpa ọ dị ikere òkè n’ozi ụlọ n’ụlọ. Ma ọ dịghị mgbe mama m nwere obi abụọ. Nke a nwere mmetụta na-adịte anya n’ahụ m ịtụkwasị nduzi nke nzukọ Jehova obi mgbe nile.
N’ikpeazụ papa m na mama m mụrụ ụmụ itoolu. A mụrụ m n’October 1, 1909, nwa ha nke atọ. Ná ngụkọta, isii n’ime anyị ṅomiri ihe nlereanya nke mama anyị wee ghọọ Ndịàmà Jehova na-anụ ọkụ n’obi.
Nraranye na Baptism
Mgbe ọ fọrọ nke nta ka m dị iri afọ abụọ, emere m nrara nye Jehova, egosipụtakwara m nke a site na baptism ime mmiri na 1927. A nọ na Seattle mee baptism ahụ n’otu ụlọ ochie nke bụbu chọọchị Baptist. Obi dị m ụtọ na ha ewepụwo steeple ochie ahụ. E duuru anyị banye n’ime ọdọ mmiri nke dị n’ala ụlọ ahụ bụ́ ebe e nyere anyị uwe mwụda ojii dị ogologo ka anyị yiri. O yiri ka anyị na-eje ememe ili ozu.
Ọnwa ole na ole n’ihu alaghachitere m ọzọ na Seattle, ugbu a kwa na nke mbụ ya edetụrụ m ịgba àmà site n’ụlọ ruo n’ụlọ ire. Onye na-eduzi ya sịrị m, “Gaa n’aka nke a gburugburu ìgwè ụlọ ndị ahụ, mụ onwe m ga-agakwa n’aka nke ọzọ.” N’agbanyeghị ahụ erughị ala m, etinyere m ìgwè akwụkwọ nta abụọ n’aka otu ezigbo nwanyị. Anọgidere m n’ozi ụlọ n’ụlọ mgbe m laghachiri Ellensburg, ugbu a kwa, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 70 afọ n’ihu, ozi dị otú ahụ ka bụụrụ m ihe oké ọṅụ.
Ozi n’Isi Ụlọ Ọrụ Ụwa Nile
N’oge na-adịghị anya ka e mesịrị, otu onye nke jeworo ozi na Betel Brooklyn, bụ́ isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Watch Tower Society, gbara m ume inyefe onwe m ije ozi n’ebe ahụ. Ntakịrị oge ka mkparịta ụka anyị gasịrị, otu ọkwa pụtara na magazin Ụlọ Nche nke mere ka a mara mkpa e nwere maka enyemaka na Betel. Ya mere etinyere m akwụkwọ. Agaghị m echezọ mgbe ọ bụla ọṅụ m nwere mgbe m natara akwụkwọ ozi ka m bịa maka ozi Betel na Brooklyn, New York, na March 10, 1930. Otú a ka ọrụ oge nile m nke ịrụ ọrụ maka ‘ihe oriri nke na-adịghị ala n’iyi’ si malite.
Mmadụ pụrụ iche na n’ihi ahụmahụ m nweworo n’ite agba na a gaara enyeworị m ọrụ ite ihe agba. Kama nke ahụ, ọrụ mbụ m rụrụ bụ ịrụ ọrụ n’ígwè na-agbado ágá n’akwụkwọ nke dị n’ebe obibi akwụkwọ. Ọ bụ ezie na ọrụ a bụ nnọọ ọrụ na-agwụ ike n’ihi ịrụ otu ọrụ ọtụtụ ugboro, ọrụ a tọrọ m ụtọ ruo ihe karịrị afọ isii. Nnukwute ígwè obibi akwụkwọ nke anyị na-akpọ ụgbọ agha ochie n’ụzọ egwuregwu na-ebipụta akwụkwọ nta ndị a na-eji ígwè ọrụ e ji ebu ihe ebudata n’okpukpu ụlọ elu nke anyị dị ya n’okpuru. Ọ na-atọ anyị ụtọ ịhụ ma anyị pụrụ ịgbadocha akwụkwọ nta nile ngwa ngwa anyị si n’ụgbọ agha ochie ahụ nweta ha.
Ka nke ahụ gasịrị arụrụ m ọrụ n’ọtụtụ ngalaba, gụnyere ebe anyị mepụtara ígwè phonograph. Anyị jiri ígwè ọrụ ndị a mee ihe iji kpọọ ozi Bible ndị a gụnyere na rekọd n’ọnụ ụzọ ndị nwe ụlọ. Ndị ọrụ afọ ofufo nọ ná ngalaba anyị chepụtara ma rụpụta ígwè phonograph nke a na-akwụwa ọtọ wee na-akpọ. Ígwè phonograph a abụghị nanị na ọ na-akpọ ozi e buru ụzọ gụnye na tepu kamakwa o nwere akpa ndị pụrụ iche maka ibu akwụkwọ nta na ikekwe bredi ndị e tinyere ihe n’ime. Enwere m ihe ùgwù nke igosi ụzọ e si eji ngwá ọrụ ọhụrụ a eme ihe n’otu mgbakọ e nwere na Detroit, Michigan, na 1940.
Otú ọ dị, anyị nọ na-emepụta ọ bụghị nanị ígwè ọrụ ndị chọrọ nkà ọgụgụ isi. Anyị nọkwa na-eme mgbanwe ime mmụọ ndị dị mkpa. Dị ka ihe atụ, Ndịàmà Jehova na-eyibu otu ihe nke nwere obe na okpueze. Ma mgbe ahụ anyị bịara ghọta na e gburu Jisọs n’elu osisi kwụ ọtọ, ọ bụghị n’elu obe. (Ọrụ 5:30) Ya mere a kwụsịrị ịdị na-eyi ihe ndị a. Enwere m ihe ùgwù nke ịnyakapụta ihe oyiyi ahụ site n’ágá ndị ahụ. Ka e mesịrị, a gbazere ọlaedo ahụ ma ree ya.
Ọ bụ ezie na anyị nwere usoro ọrụ ụbọchị ise na ọkara nke iji ọrụ n’aka kwa izu, anyị keere òkè n’ozi ndị Kraịst ná ngwụsị izu. Otu ụbọchị, e jidere anyị 16 ma tinye anyị n’ụlọ nga na Brooklyn. N’ihi gịnị? N’oge ndị ahụ anyị weere ya na okpukpe nile na okpukpe ụgha bụ otu ihe ahụ. Ya mere anyị buuru ihe odide nke otu akụkụ ya na-agụ, sị, “Okpukpe Bụ Ọnyà na Ihe Aghụghọ” na n’akụkụ nke ọzọ “Jeere Chineke na Kraịst Bụ Eze Ozi.” A tụrụ anyị nga n’ihi ibu ihe odide ndị a, ma Hayden Covington, bụ́ onye ọkàiwu nke Watch Tower Society, gbapụtara anyị. N’oge ahụ a nọ na-agba ọtụtụ mgba n’okwu ikpe ndị metụtara nnwere onwe nke ife ofufe n’Ụlọikpe Kasị Elu nke United States, ọ bụkwa ihe na-akpali akpali ịnọ na Betel na ịnụ n’onwe m akụkọ banyere mmeri anyị nile.
Ka e mesịrị, e kenyere m ọrụ ndị chọrọ ka m jiri ahụmahụ m nke ite agba mee ihe. N’Àgwàetiti Staten, otu n’ime obodo ise ndị e wusiri ike nke New York City, anyị nwere ụlọ ọrụ redio anyị bụ́ WBBR. Tower nile nke ụlọ ọrụ redio ahụ dị ihe karịrị 60 mita n’elu, ha nwekwara ìgwè waya atọ ndị ji ha. Anọkwasịrị m n’elu bọdụ dị .9 mita n’ogologo na 20 sentimita n’obosara ka onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ dọliri m elu. Ka m na-anọdụ ala n’elu elu ebe ahụ ná ntakịrị oche ahụ, etere m agba na waya na tower ndị ahụ. Ụfọdụ ajụọla m ma ọ bụ na anyị ekpeghị ọtụtụ ekpere ka anyị nọ na-arụ ọrụ ahụ!
Ọrụ oge okpomọkụ m na-agaghị echezọ echezọ bụ ịsa window na ite agba n’ala window nile nke ihe owuwu ụlọ obibi akwụkwọ. Anyị kpọrọ ya ezumike oge okpomọkụ anyị. Anyị guzobere ihe anyị ji arị elu nke e ji osisi mee, sitekwa n’iji blọk na ụdọ ndị e ji adọli ihe elu na-eme ihe, anyị na-adọgo ma na-adọtu onwe anyị n’ihe owuwu ahụ nwere okpukpu asatọ.
Ezinụlọ Na-enye Nkwado
Na 1932 papa m nwụrụ, echekwara m n’uche m ma m kwesịrị ịhapụ Betel ma nye aka lekọta mama m. Ya mere otu ụbọchị tupu oge nri ehihie, edebere m otu akwụkwọ ozi n’isi oche ebe Nwanna Rutherford, bụ́ onye isi oche nke Society nọdụrụ. N’ime ya arịọrọ m ya ka mụ na ya kwurịta okwu. Mgbe ọ nụrụ nchegbu m, chọpụtakwa na m nwere ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị ndị ka bi n’ụlọ, ọ jụrụ m, sị, “Ị̀ chọrọ ịnọ na Betel na-arụ ọrụ Onyenwe anyị?”
“Eenụ, achọrọ m,” ka m zaghachiri.
Ya mere ọ tụrụ aro ka m degara mama m akwụkwọ ozi iji chọpụta ma o kwenyere ná mkpebi m ịnọgide. Nke ahụ bụ ihe m mere, o deghachikwaara m akwụkwọ na-ekwupụta nkwenye o kwenyere n’ụzọ zuru ezu ná mkpebi m. Enwere m ekele n’ezie n’obi ọma na okwu ndụmọdụ nke Nwanna Rutherford.
N’ime ọtụtụ afọ m nọrọ na Betel, edegaara m ezinụlọ anyị akwụkwọ ozi oge nile ma gbaa ha ume ijere Jehova ozi, dị nnọọ ka mama m gbara m ume. Mama m nwụrụ na July 1937. Lee ihe mkpali ọ bụwooro ezinụlọ anyị! Ọ bụ nanị nwanne m nwoke na nwanne m nwanyị ndị tọrọ m, bụ́ Paul na Esther, na nwanne m nwanyị nke m tọrọ, bụ́ Lois, bụ ndị na-aghọghị Ndịàmà. Otú ọ dị, Paul kwadoro ọrụ anyị ma wepụta ala ebe anyị wuru Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị mbụ.
Na 1936 nwanne m nwanyị bụ́ Eva ghọrọ onye ọsụ ụzọ, ma ọ bụ onye nkwusa oge nile. N’otu afọ ahụkwa, ya na Ralph Thomas lụrụ di na nwunye, na 1939 kwa e kenyere ha ọrụ njegharị ileta ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova. Ka e mesịrị, ha gafere Mexico, bụ́ ebe ha nọrọ 25 afọ na-enye aka n’ọrụ Alaeze.
Na 1939 ụmụnne m ndị nwanyị bụ́ Alice na Frances malitekwara ozi ọsụ ụzọ. Lee ihe ọṅụ ọ bụ ịhụ Alice ka ọ nọ n’azụ ebe a na-adọkwasị ihe ná mgbakọ e nwere na St. Louis na 1941 na-egosi otú e si eji ígwè ọrụ phonograph nke m nyeworo aka imepụta eme ihe! Ọ bụ ezie na Alice aghaghị ịkwụsị ịsụ ụzọ ya mgbe ụfọdụ n’ihi ibu ọrụ nile nke ezinụlọ, ná ngụkọta o tinyewo ihe karịrị 40 afọ n’ozi oge nile. Frances gara n’ihu wee gaa ụlọ akwụkwọ Watchtower Bible School of Gilead na 1944 ma jee ozi ruo oge ụfọdụ dị ka onye ozi ala ọzọ na Puerto Rico.
Joel na Elwood, mmadụ abụọ ndị ikpeazụ n’ezinụlọ anyị, ghọrọ ndị ọsụ ụzọ na Montana ná mmalite afọ ndị 1940. Joel anọgidewo na-abụ Onyeàmà na-ekwesị ntụkwasị obi, ọ na-ejekwa ozi ugbu a dị ka ohu na-eje ozi. Elwood sonyeere m na Betel na 1944, na-ewetara obi m oké ọṅụ. O rughị afọ ise mgbe m hapụrụ ụlọ. Dị ka m kwuru na mbụ, anyị rụkọrọ ọrụ ọnụ n’ide ihe odide ahụ dị n’ihe owuwu ụlọ obibi akwụkwọ, “Gụọ Okwu Chineke Bụ́ Bible Nsọ Kwa Ụbọchị.” Ọtụtụ mgbe anọwo m na-eche mmadụ ole bụ́ ndị hụworo ihe odide ahụ n’ime ọtụtụ afọ ndị gafeworonụ ka a gbaworo ume ịgụ Bible ha.
Elwood jere ozi na Betel ruo 1956 mgbe ọ lụrụ Emma Flyte. Ruo ọtụtụ afọ Elwood na Emma rụkọrọ ọrụ ọnụ n’ozi oge nile, na-eje ozi ruo nwa oge na Kenya, Africa, nakwa na Spain. Elwood dara ọrịa cancer ma nwụọ na Spain na 1978. Emma anọgidewo na Spain n’ọrụ ịsụ ụzọ ruo taa.
Alụmdi na Nwunye na Ezinụlọ
Na September 1953, ahapụrụ m Betel iji lụọ Alice Rivera, ọ bụ onye ọsụ ụzọ n’Ọgbakọ Brooklyn Center nke m nọ na ya. Emere m ka Alice mara na m nwere olileanya eluigwe, ma ọ ka nwere mmasị n’ịlụ m.—Ndị Filipaị 3:14.
Mgbe 23 afọ nke ibi na Betel gasịrị, ọ bụ nnọọ oké ime mgbanwe iji malite ọrụ ego dị ka onye na-ete agba iji lekọta onwe m na Alice n’ọrụ ịsụ ụzọ. Alice na-akwado m mgbe nile, ọbụna mgbe ọ na-aghaghị ịkwụsị ịsụ ụzọ n’ihi nsogbu ahụ ike. Na 1954 anyị nọ na-atụ anya nwa mbụ anyị. Ọmụmụ ya agaghị nke ọma, ọ bụ ezie na nwa anyị nwoke, bụ́ John, mere nke ọma. Ọbara gbara Alice nke ukwuu n’oge a wara ya ahụ iji bupụta nwa nke na ndị dọkịta echeghị na ọ ga-adị ndụ. N’otu oge ha apụghị ọbụna ịchọpụta ma obi ya ọ na-akụ akụ. Ma ọ dịrị ndụ chi bọọ ma gbakee kpam kpam ka oge na-aga.
Afọ ole na ole n’ihu, mgbe nna Alice nwụrụ, anyị kwagara n’ebe dị anya karị site na Long Island iji nọnyere nne ya. Ebe ọ bụ na anyị enweghị ụgbọ ala, ana m eji ụkwụ ma ọ bụ jiri bọs na ụgbọ okporo ígwè okpuru ala na-eme njem. N’ụzọ dị otú a enwere m ike ịnọgide n’ọrụ ọsụ ụzọ na ịkwado ezinụlọ m. Ọṅụ nile nke ozi oge nile akarịwo nnọọ àjà ọ bụla. Inyere ndị mmadụ aka—dị ka Joe Natale, bụ́ onye hapụrụ ọrụ ịkụ baseball nke yiri ihe olileanya dị na ya iji ghọọ Onyeàmà—abụwo nanị otu n’ime ọtụtụ ngọzi ndị m nweworo.
Na 1967, ka ọnọdụ dịwanyere njọ n’ógbè New York, ekpebiri m ịkpọrọ Alice na John laghachi obodo anyị bụ́ Ellensburg ije biri. Ugbu a ana m ahụ ya dị ka ihe na-akwụghachi ụgwọ ọrụ ịhụ ka ụmụ ụmụ na ụmụ ụmụ ụmụ mama m na-ekere òkè n’ozi oge nile. Ụfọdụ ọbụna na-eje ozi na Betel. John na nwunye ya na ụmụ ya jikwa ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi.
N’ụzọ dị mwute, nwunye m hụrụ n’anya, bụ́ Alice, nwụnahụrụ m na 1989. Iji ọrụ n’aka n’ozi oge nile enyeworo m aka idi mfu ahụ. Ugbu a mụ na nwanne m nwanyị bụ́ Alice nwere mmasị ịdị na-asụkọ ụzọ ọnụ. Lee ka o si dị mma ibirighachi ọzọ n’otu ụlọ ahụ na ịchọta onwe anyị dị ka ndị ji ọrụ n’aka n’ọrụ a kasị mkpa!
Ná mmalite oge opupu ihe ubi nke 1994, ejere m leta Betel nke mbụ n’ihe dị ka 25 afọ. Lee ihe ọṅụ ọ bụ ịhụ ọtụtụ ndị mụ na ha rụkọrọ ọrụ ihe karịrị 40 afọ gara aga! Mgbe m jere Betel na 1930, ọ bụ nanị 250 mmadụ nọ n’ezinụlọ ahụ, ma taa ezinụlọ Betel dị na Brooklyn dị ihe karịrị 3,500 n’ọnụ ọgụgụ!
Ịbụ Onye Nri Ime Mmụọ Kwagidere
N’ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’isi ụtụtụ nile ana m akpagharị n’akụkụ Osimiri Yakima nke dịdewere ụlọ anyị. Apụrụ isi ebe ahụ hụ Ugwu Rainier nke snow kpuchiri bụ́ nke dị ihe karịrị 4,300 mita n’elu. Anụ ndị na-ebi n’ọhịa bara ụba. Mgbe ụfọdụ ana m ahụ ele, otu mgbekwa ahụrụ m ọbụna ele ukwu.
Oge ndị a dị jụụ, nke ịnọ nanị m na-enye m ohere ịtụgharị uche ná ndokwa ndị dị ebube nke Jehova. M na-ekpe ekpere maka ume iji nọgide na-ejere Chineke anyị, bụ́ Jehova, ozi n’ikwesị ntụkwasị obi. M na-enwekwa mmasị ịbụ abụ mgbe m na-akpagharị, karịsịa abụ ahụ bụ́ “Ime Ka Obi Jehova Ṅuria,” bụ́ ndị okwu ha na-asị: “Chineke ayi ekwe ime uche gi; n’amamihe ayi ga-lu ọlu-i. Mgbe ahu k’ayi ga-ma n’ayi nwere òkè ime k’obi gi ṅuria.”
Obi dị m ụtọ na m họọrọ ịrụ ọrụ nke na-eme ka obi Jehova ṅụrịa. M na-ekpe ekpere ka m nwee ike ịnọgide na-arụ ọrụ a ruo mgbe m natara nkwụghachi ụgwọ eluigwe ahụ nke e kweworo ná nkwa. Ọchịchọ m bụ na akụkọ a ga-enwe ike ịkpali ndị ọzọkwa iji ndụ ha mee ihe ‘n’ịrụ ọrụ maka ihe oriri nke na-adịghị ala n’iyi.’—Jọn 6:27.
[Foto ndị dị na peeji nke 23]
Elwood ka ọ na-ede ihe odide ahụ bụ́ “GỤỌ OKWU CHINEKE BỤ́ BIBLE NSỌ KWA ỤBỌCHỊ”
[Foto dị na peeji nke 24]
Mụ na Grant Suiter na John Kurzen, ka anyị na-egosi otú e si eji ígwè “phonograph” ọhụrụ ahụ eme ihe ná mgbakọ e nwere na 1940
[Foto dị na peeji nke 25]
Na 1944 anyị ndị nọ n’eziokwu nọ n’ozi oge nile: David, Alice, Joel, Eva, Elwood, na Frances
[Foto dị na peeji nke 25]
Ụmụnne ndị fọrọ ndụ malite n’aka ekpe: Alice, Eva, Joel, David na Frances