Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 5/1 p. 9-14
  • Chineke na Siza

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chineke na Siza
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Ohu Jehova nke Oge Ochie na Ọchịchị
  • Àgwà Jisọs n’Ebe Ọchịchị Dị
  • Ndị Kraịst na Siza
  • Nghọta Na-aga n’Ihu nke “Ndị Na-achị Isi”
  • Ịnọ n’Okpuru Ruo n’Ókè Ụfọdụ
  • Ụzọ Onye Kraịst si Ele Ndị Na-achị Isi Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ụzọ Ndị Kraịst Si Ele Ịbụ Isi Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Inyeghachi Siza Ihe nke Siza
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Gịnị Na-eme Mmadụ Ezi Nwa Amaala?
    Teta!—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 5/1 p. 9-14

Chineke na Siza

“Ya mere, nyeghachinụ Siza ihe nke Siza, nyeghachikwanụ Chineke ihe nke Chineke.”—LUK 20:25.

1. (a) Gịnị bụ ọnọdụ Jehova e buliri elu? (b) Gịnị ka anyị ji Jehova ụgwọ ya nke anyị na-apụghị inye Siza mgbe ọ bụla?

MGBE Jisọs Kraịst nyere ntụziaka ahụ, o nweghị obi abụọ n’uche ya na ihe Chineke na-achọ n’aka ndị ohu Ya na-ebute ihe ọ bụla Siza, ma ọ bụ Ọchịchị, pụrụ ịchọ ha n’aka ụzọ. Jisọs ka onye ọ bụla mara ịbụ eziokwu nke ekpere onye ọbụ abụ ahụ kpegaara Jehova: “Alaeze Gị bụ alaeze ruo mgbe nile ebighị ebi, ọchịchị [ọbụbụeze]a Gị dịkwa n’ọgbọ nile.” (Abụ Ọma 145:13) Mgbe Ekwensu nyere Jisọs ịbụisi n’elu alaeze nile nke ụwa nile mmadụ bi, Jisọs zaghachiri, sị: “E dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Onyenwe anyị Chineke gị ka ị ga-akpọ isiala nye, ọ bụkwa nanị Ya ka ị ga-ekpere.” (Luk 4:5-8) A pụghị ife “Siza” ofufe ma ọlị, ma Siza ọ bụ onye ọchịchị alaeze ukwu Rom, onye ọchịchị ọzọ bụ́ mmadụ, ma ọ bụ Ọchịchị n’onwe ya.

2. (a) Gịnị bụ ọnọdụ Setan n’ihe banyere ụwa a? (b) Ònye kwere ka Setan nọrọ n’ọnọdụ ahụ ọ nọ?

2 Jisọs agọghị agọ na alaeze nile nke ụwa bụ nke Setan. Ka e mesịrị, ọ kpọrọ Setan “onye isi ụwa nke a.” (Jọn 12:31; 16:11) Ka ọ na-eru ná ngwụsị nke narị afọ mbụ O.A., Jọn onyeozi dere, sị: “Anyị matara na anyị bụ ndị si na Chineke pụta, ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Nke a apụtaghị na Jehova agbahapụla ọbụbụeze ya n’elu ụwa. Cheta na Setan, mgbe ọ na-enyefe Jisọs ịchịisi n’elu alaeze ndọrọ ndọrọ ọchịchị nile, kwuru, sị: “Gị ka m ga-enye ike a nile . . . n’ihi na a rarawo ya nye n’aka m.” (Luk 4:6) Setan na-achị isi n’elu alaeze nile nke ụwa nanị n’ihi na Chineke kwere ka ọ na-eme otú ahụ.

3. (a) Ọnọdụ dị aṅaa ka gọọmenti nke mba nile nwere n’ihu Jehova? (b) Olee otú anyị pụrụ isi kwuo na ido onwe anyị n’okpuru gọọmenti nke ụwa a apụtaghị ido onwe anyị n’okpuru Setan, chi nke ụwa a?

3 N’otu aka ahụ, Ọchịchị na-achị isi ya nanị n’ihi na Chineke dị ka Eze Na-achị Achị kwere ka o mee otú ahụ. (Jọn 19:11) Ya mere, a pụrụ ikwu na “ọ dịghị onye ọ bụla na-achị isi ma ọ bụrụ na Chineke edoghị ya.” E jiri ya tụnyere ọbụbụeze kasị elu nke Jehova, nke ha bụ nnọọ ịbụisi ka nta nke ukwuu. Otú ọ dị, ha bụ ndị “na-ejere Chineke ozi,” “ndị ozi ọha nke Chineke,” n’ihi na ha na-eje ozi ndị dị mkpa, na-eme ka a na-edebe iwu na ịdị n’usoro, ma nye ndị na-emebi iwu ntaramahụhụ. (Ndị Rom 13:1, 4, 6, NW) Ya mere ọ dị ndị Kraịst mkpa ịghọta na nanị n’ihi na Setan bụ onye ọchịchị a na-adịghị ahụ anya nke ụwa nke a, ma ọ bụ usoro ihe a, ha adịghị edo onwe ha n’okpuru ya mgbe ha ghọtara na ha nọ n’okpuru Ọchịchị ruo n’ókè ụfọdụ. Ha na-erubere Chineke isi. N’afọ a, bụ́ 1996, Ọchịchị ka bụ akụkụ nke “iwu Chineke nyere,” ndokwa na-adị nwa oge nke Chineke kwere ka ọ dịrị, ndị ohu Jehova nọ n’ụwa kwesịkwara ịghọta ya otú ahụ.—Ndị Rom 13:2.

Ndị Ohu Jehova nke Oge Ochie na Ọchịchị

4. N’ihi gịnị ka Jehova ji kwere ka Josef ghọọ onye a ma ama na gọọmenti nke Ijipt?

4 Tupu oge ndị Kraịst, Jehova kwere ka ụfọdụ n’ime ndị ohu ya nọrọ n’ọkwá dị elu n’Ọchịchị obodo. Dị ka ihe atụ, na narị afọ 18 T.O.A., Josef ghọrọ onye isi ndị ọchịchị nke Ijipt, bụrụ onye na-esote Fero na-achị achị. (Jenesis 41:39-43) Ihe ndị mesịrị mee mere ka ọ pụta ìhè na Jehova mere ka ọ dịrị otú a ka Josef nwee ike ije ozi dị ka ngwá ọrụ n’ichebe ‘mkpụrụ Abraham,’ ụmụ ya, maka imezu nzube Ya nile. Otú ọ dị, e kwesịrị iburu n’uche na e renyere Josef n’ịbụ ohu n’Ijipt, o bikwara ndụ n’oge mgbe ndị ohu Chineke na-enweghị ma Iwu Mosis ma “iwu Kraịst.”—Jenesis 15:5-7; 50:19-21; Ndị Galetia 6:2.

5. N’ihi gịnị ka e ji nye ndị Juu nọ n’ala ọzọ iwu ka ha ‘chọọ udo’ nke Babilọn?

5 Ọtụtụ narị afọ n’ihu Jehova nyere Jeremaịa onye amụma kwesịrị ntụkwasị obi ike mmụọ nsọ ịgwa ndị Juu nọ ná mba ọzọ ka ha doo onwe ha n’okpuru ndị ọchịchị mgbe ha nọ n’ala Babilọn na ọbụna ka ha kpee ekpere maka udo nke obodo ukwu ahụ. N’akwụkwọ ozi o degaara ha, o dere, sị: “Otú a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha, bụ́ Chineke nke Israel, sịrị ndị nile e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ, . . . Chọọkwanụ udo nke obodo ahụ nke M meworo ka e mee ka unu jee biri n’ebe ahụ, kpekwaaranụ Jehova ekpere banyere ya: n’ihi na n’udo ya ka udo ga-adịrị unu.” (Jeremaịa 29:4, 7) N’oge nile, ndị Jehova nwere ihe mere ha ga-eji “chọọ udo” maka ha onwe ha na mba ha bi, iji nwere onwe ha ife Jehova.—1 Pita 3:11.

6. Ọ bụ ezie na e nyere ha ọkwá dị elu na gọọmenti, n’ụzọ ndị dị aṅaa ka Daniel na ndị ibe ya atọ ji jụ imebi Iwu Jehova?

6 N’oge ha nọ n’ala ọzọ na Babilọn, Daniel na ndị Juu atọ ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị a dọọrọ n’agha nọ n’ohu na Babilọn nakweere ọzụzụ Ọchịchị ma ghọọ ndị ọrụ obodo nwere ọkwá dị elu na Babilọn. (Daniel 1:3-7; 2:48, 49) Otú ọ dị, ọbụna n’oge a na-enye ha ọzụzụ, ha weere nguzo siri ike n’ihe banyere ihe oriri ndị pụworo iduba ha n’imebi Iwu nke Chineke ha, bụ́ Jehova, nyewororị site n’aka Mosis. A gọziri ha n’ihi nke a. (Daniel 1:8-17) Mgbe Eze Nebukadneza guzobere onyinyo nke Ọchịchị, o doro anya na a manyere ndị ibe Daniel atọ bụ́ ndị Hibru isoro ndị ibe ha nọ n’Ọchịchị gaa ememe ahụ. Ka o sina dị, ha jụrụ ‘ịda n’ala kpọọ isiala’ nye arụsị Ọchịchị ahụ. Ọzọ, Jehova nyeghachiri iguzosi ike n’ezi ihe ha ụgwọ ọrụ. (Daniel 3:1-6, 13-28) N’otu aka ahụ taa, Ndịàmà Jehova na-akwanyere ọkọlọtọ nke mba ha bi n’ime ya ùgwù, kama ha agaghị efe ya ofufe.—Ọpụpụ 20:4, 5; 1 Jọn 5:21.

7. (a) Nguzo dị aṅaa magburu onwe ya ka Daniel weere, n’agbanyeghị inwe ọkwá e buliri elu n’usoro gọọmenti Babilọn? (b) Mgbanwe ndị dị aṅaa weere ọnọdụ n’oge ndị Kraịst?

7 Mgbe usoro ndị ọchịchị ọhụrụ nke Babilọn dasịrị, e nyere Daniel ọkwá gọọmenti dị elu n’okpuru ọchịchị ọhụrụ nke ndị Midia na Peasia nke nọchiri ya na Babilọn. (Daniel 5:30, 31; 6:1-3) Ma o kweghị ka ọkwá ya dị elu duje ya n’imebi iguzosi ike n’ezi ihe ya. Mgbe iwu Ọchịchị chọrọ ka o fee Eze Daraịọs karịa Jehova, ọ jụrụ ajụ. N’ihi nke a a tụbanyeere ya ọdụm, ma Jehova gbapụtara ya. (Daniel 6:4-24) Otú ọ dị, nke a bụ tupu oge ndị Kraịst. Ozugbo e guzobere ọgbakọ ndị Kraịst, ndị ohu Chineke bịara nọrọ “n’okpuru iwu n’ebe Kraịst nọ.” A gaje ile ọtụtụ ihe ndị e kwere ka ha dịrị n’okpuru usoro ihe ndị Juu anya n’ụzọ dị iche, dabere n’ụzọ Jehova si na-emeso ndị ya ihe ugbu a.—1 Ndị Kọrint 9:21; Matiu 5:31, 32; 19:3-9.

Àgwà Jisọs n’Ebe Ọchịchị Dị

8. Ihe omume dị aṅaa na-egosi na Jisọs kpebisiri ike izere itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị?

8 Mgbe Jisọs Kraịst nọ n’elu ala, o setịpụrụ ụkpụrụ ka elu maka ndị na-eso ụzọ ya, ọ jụkwara ntinye aka nile n’okwu metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ agha. Mgbe Jisọs jisịrị achịcha ole na ole na azụ ntakịrị abụọ nyejuo ọtụtụ puku ndị mmadụ afọ n’ụzọ ọrụ ebube, ndị ikom ndị Juu chọrọ ijide ya ma mee ya eze ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ma Jisọs zeere ha site n’iji ngwa gbaga n’ugwu. (Jọn 6:5-15) Banyere ihe a merenụ, The New International Commentary on the New Testament na-ekwu, sị: “E nwere oké ọchịchọ sitere n’ịhụ mba n’anya n’etiti ndị Juu n’oge ahụ, ihe ịrụ ụka adịghịkwa ya na ọtụtụ n’ime ndị hụrụ ọrụ ebube ahụ chere na e nwewo onye ndú Chineke kwadoro, onye bụ nnọọ onye ga-eduru ha imegide ndị Rom. Ya mere ha kpebiri ime ya eze.” Ọ gbakwụnyere na Jisọs “n’ụzọ pụtara ìhè jụrụ” onyinye a nke idu ndú ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Kraịst enyeghị omume nnupụisi nke ndị Juu megide ọchịchị ndị Rom nkwado ọ bụla. N’ezie, o buru amụma ihe ga-esite n’ụdị omume nnupụisi ahụ nke ga-ewere ọnọdụ mgbe ọnwụ ya gasịrị pụta—ahụhụ na-enweghị atụ nye ndị bi na Jerusalem na mbibi nke obodo ukwu ahụ.—Luk 21:20-24.

9. (a) Olee otú Jisọs si kọwaa mmekọrịta nke Alaeze ya na ụwa? (b) Nduzi dị aṅaa ka Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya banyere mmekọrịta ha na gọọmenti nke ụwa?

9 Ntakịrị oge tupu ọnwụ ya, Jisọs gwara onye nnọchiteanya pụrụ iche nke onye ọchịchị alaeze ukwu Rom nọ na Judia, sị: “Alaeze m esiteghị n’ụwa nke a: ọ bụrụ na alaeze m sitere n’ụwa nke a, ndị na-ejere m ozi ga-alụ ọgụ, ka a ghara ịrara m nye n’aka ndị Juu: ma ugbu a alaeze m esighị n’ebe a pụta.” (Jọn 18:36) Ruo mgbe Alaeze ya ga-eweta ọchịchị nke gọọmenti ndọrọ ndọrọ ọchịchị ná njedebe, ndị na-eso ụzọ Kraịst na-agbaso ihe nlereanya ya. Ha na-erubere ịbụisi ndị e guzobere isi ma ha adịghị etinye aka n’ihe omume ndọrọ ndọrọ ọchịchị ha. (Daniel 2:44; Matiu 4:8-10) Jisọs hapụụrụ ndị na-eso ụzọ ya ụkpụrụ nduzi, na-asị: “Ya mere, nyeghachinụ Siza ihe nke Siza, nyeghachikwanụ Chineke ihe nke Chineke.” (Matiu 22:21) Tupu mgbe ahụ, n’Ozizi Elu Ugwu ya, Jisọs ekwuworị, sị: “Onye ọ bụla nke ga-ejide gị ije otu mile, so ya jee mile abụọ.” (Matiu 5:41) Site n’ihe gbara ozizi a gburugburu, Jisọs na-egosipụta ụkpụrụ nke iji nrubeisi mee ihe a chọrọ nke iwu kwadoro, ma ọ bụ ná mmekọrịta mmadụ na ibe ya ma ọ bụ n’ihe ndị gọọmenti chọrọ ndị kwekọrọ n’iwu Chineke.—Luk 6:27-31; Jọn 17:14, 15.

Ndị Kraịst na Siza

10. Dị ka otu onye ọkọ akụkọ ihe mere eme si kọọ, nguzo dị aṅaa nke sitere n’akọ na uche ka ndị Kraịst oge mbụ nwere n’ihe gbasara Siza?

10 Ụkpụrụ nduzi ndị a dị mkpirikpi ga-eduzi mmekọrịta dị n’etiti ndị Kraịst na Ọchịchị. N’akwụkwọ ya bụ́ The Rise of Christianity, ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ E. W. Barnes dere, sị: “Ruo narị afọ ndị ga-abịanụ, mgbe ọ bụla onye Kraịst nwere obi abụọ banyere ọrụ ya nye Ọchịchị, o chigharịkwuuru ozizi a na-adịghị agbagha agbagha nke Kraịst. Ọ ga-akwụ ụtụ isi: ụtụ isi ndị a chọrọ pụrụ ịdị ukwuu—ha ghọrọ ihe a na-apụghị ịnagide tupu ọdịda nke Alaeze Ukwu Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa—ma onye Kraịst ga-edi ha. Ọ ga-esikwa otú ahụ nakwere ibu ọrụ ndị ọzọ nke Ọchịchị, ma ọ bụrụhaala na a chọghị ka o nye Siza ihe ndị dịịrị Chineke.”

11. Pọl dụrụ ndị Kraịst ọdụ isi aṅaa mesoo ndị ọchịchị ụwa ihe?

11 Ọ bụ n’ikwekọ na nke a ka, ihe ji nke nta gafere 20 afọ mgbe ọnwụ Kraịst gasịrị, Pọl onyeozi gwara ndị Kraịst nọ na Rom, sị: “Ka mkpụrụ obi ọ bụla doo onwe ya n’okpuru ndị na-achị isi n’elu ya.” (Ndị Rom 13:1) Ihe dị ka afọ iri n’ihu, ntakịrị oge tupu a tụọ ya mkpọrọ nke ugboro abụọ na ogbugbu ya na Rom, Pọl degaara Taịtọs akwụkwọ, sị: “Na-echetara ha [ndị Kraịst nọ na Krit] ka ha na-edo onwe ha n’okpuru ndị isi, n’okpuru ndị nwere ike, ka ha na-ekwenye ekwenye, ka ha bụrụ ndị e doziworo ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla, ka ha ghara ikwulu onye ọ bụla, ghara ịbụ ndị na-alụ ọgụ, ka ha nwee obi ọma, na-egosi ịdị nwayọọ nile n’ebe mmadụ nile nọ.”—Taịtọs 3:1, 2.

Nghọta Na-aga n’Ihu nke “Ndị Na-achị Isi”

12. (a) Gịnị ka Charles Taze Russell lere anya dị ka nguzo kwesịrị ekwesị nke onye Kraịst n’ihe metụtara ndị isi gọọmenti? (b) Banyere ije ozi n’òtù ndị agha, nguzo dị iche iche dị aṅaa ka ndị Kraịst e tere mmanụ weere n’oge Agha Ụwa Mbụ?

12 Laarị azụ na 1886, Charles Taze Russell dere n’akwụkwọ bụ́ The Plan of the Ages, sị: “Ma Jisọs ma Ndị Ozi emegideghị ndị ọchịchị ụwa n’ụzọ ọ bụla. . . . Ha kụziiri Chọọchị irubere iwu isi, na ịkwanyere ndị nwere ịbụisi ùgwù n’ihi ọkwá ha, . . . ịtụ ụtụ isi e kenyere ha, e wezụgakwa ebe ha megidere iwu Chineke (Ọrụ 4:19; 5:29) ịghara iguzogide iwu ọ bụla e guzobere eguzobe. (Rom 13:1-7; Mat. 22:21) Jisọs na Ndị Ozi ya na chọọchị oge mbụ na-edebecha iwu, ọ bụ ezie na ha nọpụrụ iche, ma gharakwa ikere òkè na gọọmenti nke ụwa a.” Akwụkwọ a n’ụzọ ziri ezi mere ka a mata “ike ndị ka elu,” ma ọ bụ “ndị na-achị isi,” nke Pọl onyeozi zoro aka, dị ka gọọmenti mmadụ na-achị isi. (Ndị Rom 13:1, King James Version) Na 1904, akwụkwọ ahụ bụ́ The New Creation kwuru na ezi ndị Kraịst “kwesịrị ịbụ ndị a hụrụ n’etiti ndị kasị edebe iwu n’oge a—ọ bụghị ndị na-eme mkpesa, ndị na-ese okwu, ndị na-ahụchata mmejọ.” Ụfọdụ ghọtara nke a ịpụta ịnọ n’okpuru ndị ọchịchị kpam kpam, ọbụna ruo n’ókè nke ịnakwere ije ozi n’òtù ndị agha n’oge Agha Ụwa Mbụ. Otú ọ dị, ndị ọzọ lere ya anya dị ka ihe megidere okwu Jisọs: “Mmadụ nile ndị weere mma agha ga-ala n’iyi site ná mma agha.” (Matiu 26:52) N’ụzọ pụtara ìhè, nghọta doro anya nke onye Kraịst ido onwe ya n’okpuru ndị na-achị achị dị mkpa.

13. Mgbanwe dị aṅaa ná nghọta nke ndị bụ ike ka elu ka e nyere na 1929, oleekwa otú nke a si ghọọ ihe bara uru?

13 Na 1929, mgbe iwu nke gọọmenti dị iche iche na-amalite ịmachibido ihe ndị Chineke nyere iwu ha ma ọ bụ ịchọ ihe ndị iwu Chineke machibidoro, e kwenyere na ike ndị ka elu aghaghị ịbụ Jehova Chineke na Jisọs Kraịst.b Nke a bụ nghọta nke ndị ohu Jehova nwere n’oge ahụ siri ike tupu na mgbe Agha Ụwa nke Abụọ na-aga n’ihu nakwa baa n’Agha Nzuzo, ya na mmenyerịta egwu ya na nkwadebe agha ya. N’ileghachi anya azụ, a ghaghị ikwu na echiche a, nke buliri ọkaaka nke Jehova na Kraịst ya elu, nyeere ndị Chineke aka ịnọgide na-enwe nguzo nnọpụiche a na-emebighị emebi n’oge ihe isi ike a nile.

Ịnọ n’Okpuru Ruo n’Ókè Ụfọdụ

14. Olee otú e si mụkwasịkwuo ìhè ná Ndị Rom 13:1, 2 na akụkụ akwụkwọ nsọ ndị yiri ya na 1964?

14 Na 1961 a sụgharịchara New World Translation of the Holy Scriptures. Nkwadebe ya achọworị ọmụmụ dị omimi nke asụsụ e ji dee Akwụkwọ Nsọ. Nsụgharị ziri ezi nke okwu ndị e ji mee ihe ọ bụghị nanị ná Ndị Rom isi nke 13 kamakwa n’akụkụ okwu ndị dị ka Taịtọs 3:1, 2 na 1 Pita 2:13, 17 mere ya ka ọ pụta ìhè na okwu ahụ bụ́ “ịbụisi ka elu” na-ezo aka, ọ bụghị n’ebe Ịbụisi Kasị Elu Jehova, na Ọkpara ya, bụ́ Jisọs nọ, kama n’ebe ịbụisi gọọmenti nke ụmụ mmadụ dị. Ná mmalite nke 1964, e bipụtara isiokwu dị iche iche n’Ụlọ Nche bụ́ ndị nyere nkọwa ziri ezi nke Ndị Rom isi nke 13 ma nyekwa echiche doro anya karịa nke ahụ e nwere n’oge C. T. Russell. Isiokwu ndị a gosipụtara na onye Kraịst ido onwe ya n’okpuru ndị na-achị achị apụghị ịbụ n’ụzọ nile. Ọ ghaghị ịbụ ruo n’ókè ụfọdụ, ma ọ bụrụ na o meghị ka ndị ohu Chineke mee ihe megidere iwu Chineke. Isiokwu ndị ọzọ n’Ụlọ Nche emesiwo isi ihe ndị a dị mkpa ike.c

15, 16. (a) Echiche ziri ezi dị aṅaa ka nghọta ọhụrụ nke Ndị Rom isi nke 13 dujere na ya? (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa ka a na-azabeghị?

15 Ihe a mere ka e nwee nghọta ziri ezi nke Ndị Rom isi nke 13 emewo ka ndị Jehova nwee ike ịhazi nkwanye ùgwù kwesịrị ekwesị maka ndị ọchịchị na nguzo a na-emebighị emebi n’ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị mkpa. (Abụ Ọma 97:11; Jeremaịa 3:15) O nyewo ha ohere inwe echiche ziri ezi banyere mmekọrịta ha na Chineke na mmekọrịta ha na Ọchịchị. O mewo ka e jide n’aka na ka ha na-enyeghachi Siza ihe nke Siza, ha adịghị eleghara inyeghachi Chineke ihe nke Chineke anya.

16 Ma gịnị nnọọ bụ ihe nke Siza? Ihe dị aṅaa nke iwu kwadoro ka Ọchịchị pụrụ ịchọ n’aka onye Kraịst? A ga-atụle ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a  Lee Abụ Ọma 103:22, nkọwa ala ala peji nke NW.

b Ụlọ Nche (Bekee), June 1 na 15, 1929.

c Lee Ụlọ Nche, January 1 na February 1, 1964; November 1, 1990; February 1, 1993; July 1, 1994.

N’ụzọ na-adọrọ mmasị, n’okwu nkọwa ya nke Ndị Rom isi nke 13, Prọfesọ F. F. Bruce na-ede, sị: “O doro anya site n’okwu ndị gbara ya gburugburu kpọmkwem, site n’ozuzu ihe ndị gbara ihe odide nke ndị ozi ahụ gburugburu, na ọchịchị pụrụ ịchọ nrubeisi n’ụzọ ziri ezi nanị n’ime nzube ndị Chineke ji maka ya guzobe ya—kpọmkwem, ọ bụghị nanị na a pụrụ kama a ghaghị iguzogide ọchịchị mgbe ọ chọrọ nraranye kwesịrị nanị Chineke.”

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

◻ N’ihi gịnị ka ido onwe onye n’okpuru ndị na-achị achị ji ghara ịpụta ido onwe onye n’okpuru Setan?

◻ Gịnị bụ àgwà Jisọs n’ebe ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke oge ya dị?

◻ Ndụmọdụ dị aṅaa ka Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya banyere mmekọrịta ha na Siza?

◻ Pọl dụrụ ndị Kraịst ọdụ isi aṅaa mesoo ndị ọchịchị nke mba nile ihe?

◻ Olee otú nghọta nke ndị bụ ndị na-achị isi siworo doo anya kemgbe ọtụtụ afọ?

[Foto dị na peeji nke 10]

Mgbe Setan nyere ya ike ndọrọ ndọrọ ọchịchị, Jisọs jụrụ ya

[Foto dị na peeji nke 13]

Russell dere na ezi ndị Kraịst “kwesịrị ịbụ ndị a hụrụ n’etiti ndị kasị edebe iwu n’oge a”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya