Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 5/15 p. 10-15
  • Mikpuo Onwe Gị n’Igụ Ihe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mikpuo Onwe Gị n’Igụ Ihe
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ngọzi Na-adịrị Onye Na-agụ”
  • Chesie Echiche Ike ma Tụgharịa Uche
  • Jikọta Isi Ihe Ndị Ọhụrụ na Ndị Ochie
  • Jiri Anya nke Uche Hụ Ihe Ndị Mere n’Akwụkwọ Nsọ
  • Rite Uru Site n’Ịgụ Bible Dị Ka Ezinụlọ
  • Ịgụ Ihe na Ozi Ndị Kraịst
  • Tinyesie Mgbalị Ike n’Ịgụ Ihe
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Irite Uru Site n’Ọgụgụ Bible Kwa Ụbọchị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Ọgụgụ Bible—Ihe Bara Uru Ma Na-atọ Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Na-enweta Obi Ụtọ n’Okwu Chineke
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 5/15 p. 10-15

Mikpuo Onwe Gị n’Igụ Ihe

“Ruo mgbe m ga-abịa, na-aṅa ntị ọgụgụ akwụkwọ gị na ịdụ ọdụ gị na ozizi gị.”—1 TIMOTI 4:13.

1. Olee otú anyị pụrụ isi rite uru site n’ịgụ Bible?

JEHOVA CHINEKE enyewo ihe a kpọrọ mmadụ ikike ahụ dị ebube nke ịmụta ịgụ ihe na ide ihe. O nyewokwa Okwu ya, bụ́ Bible, ka anyị wee nwee ike ịbụ ndị e ziri ihe nke ọma. (Aịsaịa 30:20, 21) Ya bụ, peji ya nile na-eme ka anyị nwee ike isoro ndị nna ochie na-atụ egwu Chineke dị ka Abraham, Aịsak, na Jekọb “jee ije.” Anyị pụrụ “ịhụ” ndị inyom na-atụ egwu Chineke dị ka Sera, Rebeka, na nwanyị Moab guzosiri ike n’ihe bụ́ Rut. Ee, anyị pụkwara “ịnụ” ka Jisọs Kraịst na-ezi Ozizi Elu Ugwu ya. Obi ụtọ a nile na izi ihe a dị ukwuu ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ pụrụ ịbụ nke anyị ma ọ bụrụ na anyị na-agụ ihe nke ọma.

2. Gịnị na-egosi na Jisọs na ndị ozi ya pụrụ ịgụ ihe nke ọma?

2 N’enweghị obi abụọ ọ bụla, nwoke ahụ zuru okè, bụ́ Jisọs Kraịst, maara agụ ihe nke ọma, n’ezie ọ makwaara Akwụkwọ Nsọ Hibru nke ọma. Ya mere, mgbe Ekwensu nwara ya ọnwụnwa, Jisọs zoro aka ugboro ugboro n’ebe ha dị ma kwuo, sị: “E dewo ya n’akwụkwọ nsọ.” (Matiu 4:4, 7, 10) N’otu oge n’ụlọ nzukọ dị na Nazaret, ọ gụrụ ihe n’ihu ọha ma jiri otu akụkụ nke amụma Aịsaịa mee ihe n’ebe onwe ya nọ. (Luk 4:16-21) Gịnị banyere ndị ozi Jisọs? N’ihe odide ha, ha hotara Akwụkwọ Nsọ Hibru ọtụtụ mgbe. Ọ bụ ezie na ndị ọchịchị ndị Juu lere Pita na Jọn anya dị ka ndị na-agụghị akwụkwọ na ndị nkịtị n’ihi na ha agụghị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ndị dị elu nke ndị Hibru, akwụkwọ ozi ha ndị sitere n’ike mmụọ nsọ na-egosi n’ụzọ doro anya na ha pụrụ ịgụ na ide ihe nke ọma. (Ọrụ 4:13) Ma ikike ịgụ ihe ọ̀ dị mkpa n’ezie?

“Ngọzi Na-adịrị Onye Na-agụ”

3. N’ihi gịnị ka o ji dị oké mkpa ịgụ Akwụkwọ Nsọ na mbipụta ndị Kraịst?

3 Ịnara na itinye ezi ihe ọmụma nke Akwụkwọ Nsọ n’ọrụ pụrụ ịrụpụta ndụ ebighị ebi. (Jọn 17:3) Ya mere Ndịàmà Jehova ghọtara na ọ dị oké mkpa ịgụ na ịmụ Akwụkwọ Nsọ na mbipụta ndị Kraịst ndị Chineke nyere site n’aka òtù ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi nke nwekwara uche nke ndị Kraịst e tere mmanụ. (Matiu 24:45-47) N’eziokwu, site n’iji mbipụta ndị nke Watch Tower bụ́ ndị a haziri n’ụzọ pụrụ iche wee na-eme ihe, a kụziworo ọtụtụ puku mmadụ ịgụ ihe wee si otú a nweta ihe ọmụma na-enye ndụ nke Okwu Chineke.

4. (a) N’ihi gịnị ka obi ụtọ ji abịa site n’ịgụ, ịmụ, na itinye Okwu Chineke n’ọrụ? (b) Banyere ịgụ ihe, gịnị ka Pọl gwara Timoti?

4 Obi ụtọ na-abịa site n’ịgụ, ịmụ, na itinye Okwu Chineke n’ọrụ. Nke a dị otú a n’ihi na anyị si otú a na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ ma na-asọpụrụ ya, na-anata ngọzi ya, ma na-enwe ọṅụ. Jehova chọrọ ka ndị ohu ya nwee obi ụtọ. N’ihi ya, o nyere ndị nchụàjà iwu ka ha na-agụrụ ndị Israel oge ochie Iwu ya. (Deuterọnọmi 31:9-12) Mgbe Ezra onye odeakwụkwọ na ndị ọzọ gụụrụ ndị nile gbakọtara na Jerusalem Iwu ahụ, e mere ka ihe ọ pụtara doo anya, ihe sikwa na ya pụta bụ “oké ọṅụ.” (Nehemaịa 8:6-8, 12) Onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi mesịrị gwa onye ọrụ ibe ya, bụ́ Timoti, sị: “Ruo mgbe m ga-abịa, na-aṅa ntị ọgụgụ akwụkwọ gị na ịdụ ọdụ gị na ozizi gị.” (1 Timoti 4:13) Nsụgharị ọzọ na-agụ, sị: “Mikpuo onwe gị n’ịgụ Akwụkwọ Nsọ n’ihu ọha.”—New International Version.

5. Olee otú Mkpughe 1:3 si ejikọta obi ụtọ na ịgụ ihe?

5 E mere ka ọ pụta ìhè ná Mkpughe 1:3 na obi ụtọ anyị dabeere n’ịgụ na itinye Okwu Chineke n’ọrụ. N’ebe ahụ a gwara anyị, sị: “Ngọzi na-adịrị onye na-agụ, na ndị na-anụ okwu nile nke amụma nke a, ndị na-edebekwa ihe nile e deworo n’ime ya: n’ihi na oge ahụ dị nso.” Ee, ọ dị anyị mkpa ịgụpụta na ịnụ okwu amụma nile nke Chineke ndị dị ná Mkpughe na n’Akwụkwọ Nsọ nile. Onye nwere obi ụtọ n’ezie bụ onye ọ bụ “n’iwu Jehova ka ihe ụtọ ya dị; ọ bụkwa n’iwu Ya ka ọ na-atụgharị uche ehihie na abalị.” Gịnị ka ọ ga-arụpụta? “Ihe ọ bụlakwa nke ọ na-eme, ọ na-eme ka ọ gaa nke ọma.” (Abụ Ọma 1:1-3) Ya mere, n’inwe ezi ihe ndị kpatara ya, nzukọ Jehova na-agba onye ọ bụla n’ime anyị ume ịgụ na ịmụ Okwu ya n’otu n’otu, dị ka ezinụlọ, na anyị na ndị enyi.

Chesie Echiche Ike ma Tụgharịa Uche

6. Gịnị ka e nyere Joshua ntụziaka ịgụ, oleekwa otú nke a si baa uru?

6 Olee otú ị pụrụ isi rite uru karịsịa site na gị ịgụ Okwu Chineke na mbipụta ndị Kraịst? O yiri ka ị ga-ahụ ya dị ka ihe bara uru ime ihe Joshua, bụ́ onye ndú na-atụ egwu Chineke nke Israel oge ochie, mere. E nyere ya iwu, sị: “Akwụkwọ iwu a agaghị apụ n’ọnụ gị, kama ị [ghaghị ịgụ ya n’olu dị ala, NW] ehihie na abalị, ka i wee lezie anya ime dị ka ihe nile si dị nke e deworo n’ime ya: n’ihi na mgbe ahụ ị ga-eme ka ije gị gaa nke ọma, mgbe ahụ ị ga-enwekwa uche.” (Joshua 1:8) ‘Ịgụ n’olu dị ala’ pụtara iji olu dị ala na-agwa onwe gị okwu ndị ahụ. Nke a bụ ihe na-enye aka icheta ihe, n’ihi na ọ na-eme ka ihe ahụ a na-agụ bamie n’uche. Joshua gaje ịgụ Iwu Chineke “ehihie na abalị,” ma ọ bụ na-agụchi ya anya. Nke ahụ bụ ụzọ isi nwee ihe ịga nke ọma na isi mee ihe n’ụzọ amamihe n’ịrụzu ibu ọrụ ndị Chineke nyere. Ịgụ Okwu Chineke n’ụzọ chiri anya otú a pụrụ inyere gị aka n’ụzọ yiri nke ahụ.

7. Gịnị mere anyị na-ekwesịghị iji kwe ka echiche nke ịgụ ihe ọkụ ọkụ chịa anyị mgbe anyị na-agụ Okwu Chineke?

7 Ekwela ka echiche nke ịgụchapụ ya ọkụ ọkụ chịa gị mgbe ị na-agụ Okwu Chineke. Ọ bụrụ na i mewo atụmatụ itinye oge ụfọdụ n’ịgụ Bible ma ọ bụ ụfọdụ mbipụta ndị Kraịst, ị pụrụ ịchọ iji nwayọọ. Nke a dị mkpa karịsịa mgbe ị na-amụ ihe n’ebumnobi nke icheta isi ihe ndị dị mkpa. Mgbe ị na-agụkwa ihe, na-echesi echiche ike. Tụlee okwu nke onye ahụ so dee Bible. Jụọ onwe gị, sị, ‘Gịnị bụ isi ihe ọ na-ekwu? Gịnị ka m ga-eji ihe ọmụma a mee?’

8. N’ihi gịnị ka o ji baa uru ịtụgharị uche mgbe a na-agụ Akwụkwọ Nsọ?

8 Wepụta oge tụgharịa uche mgbe ị na-agụ Akwụkwọ Nsọ. Nke a ga-enyere gị aka icheta akụkọ Bible na itinye ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ n’ọrụ. Ịtụgharị uche n’Okwu Chineke na isi otú a kụbanye isi ihe dị iche iche n’uche gị ga-enyekwara gị aka isite n’obi kwuo okwu, na-enye ndị ji obi eziokwu na-ajụ ajụjụ azịza ndị ziri ezi kama ikwu ihe ị pụrụ imesịa kwaara ụta. Otu ilu sitere n’aka Chineke na-ekwu, sị: “Obi onye ezi omume na-atụgharị uche n’ịza okwu.”—Ilu 15:28.

Jikọta Isi Ihe Ndị Ọhụrụ na Ndị Ochie

9, 10. Olee otú a pụrụ isi meziwanye ọgụgụ Bible gị site n’ijikọta isi ihe ndị ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ na ndị ị mabu?

9 Ihe ka ukwuu ná ndị Kraịst aghaghị ikweta na ọ dị mgbe ha maara ihe dị nta banyere Chineke, Okwu ya, na nzube ya nile. Otú ọ dị, taa, ndị ozi a bụ́ ndị Kraịst, na-amalite n’okike na ndaba nke mmadụ dabara ná mmehie, pụrụ ịkọwa nzube nke àjà Kraịst, pụrụ ịkọ banyere mbibi nke ajọ usoro ihe a, ha pụkwara igosi otú a ga-esi jiri ndụ ebighị ebi n’elu ala e mere ka ọ ghọọ paradaịs wee gọzie ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi. Nke a kwere omume n’ụzọ dị ukwuu n’ihi na ndị ohu Jehova ndị a anarawo “ihe ọmụma Chineke” site n’ịmụ Bible na mbipụta ndị Kraịst. (Ilu 2:1-5) Ha ejiriwo nwayọọ nwayọọ jikọta isi ihe ọhụrụ ndị ha mụtara na ndị nke ochie ha ghọtawororị.

10 Ijikọta isi ihe ọhụrụ ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ na ndị ị mabu na-aba uru ma na-enyeghachi ụgwọ ọrụ. (Aịsaịa 48:17) Mgbe e bipụtara iwu, ụkpụrụ, ma ọ bụ ọbụna echiche Bible ndị a na-aghọtaghị ihe ha bụ n’oge ahụ, jikọta ndị a na ihe ndị ị mabu. Mee ka ihe ọmụma ahụ kwekọọ n’ihe ị mụtaworo banyere “ihe ilereanya nke okwu na-enye ezi ndụ.” (2 Timoti 1:13) Chọọ ihe ọmụma ndị pụrụ inyere gị aka iwusi mmekọrịta gị na Chineke ike, imeziwanye àgwà ndị Kraịst gị, ma ọ bụ inyere gị aka isoro ndị ọzọ kerịta eziokwu Bible.

11. Gịnị ka ị pụrụ ime mgbe ị na-agụ ihe Bible kwuru banyere akparamàgwà? Mee ihe atụ.

11 Mgbe ị na-agụ ihe Bible kwuru banyere akparamàgwà, gbalịa ịghọta ụkpụrụ dị na ya. Tụgharịa uche na ya, kpebiekwa ihe ị ga-eme n’ọnọdụ ndị yiri ya. Nwa Jekọb bụ́ Josef jụrụ ugboro ugboro isoro nwunye Pọtifa nwee mmekọahụ rụrụ arụ, na-ajụ, sị: “M̀ ga-esikwa aṅaa mee oké ihe ọjọọ nke a, mehie megide Chineke?” (Jenesis 39:7-9) N’akụkọ a na-emetụ n’ahụ, ị na-ahụ ụkpụrụ dị ya n’azụ—mmekọahụ rụrụ arụ bụ mmehie megide Chineke. Ị pụrụ iji uche jikọta ụkpụrụ a na ihe ndị ọzọ e kwuru n’ime Okwu Chineke, ị pụkwara irite uru site n’icheta ya mgbe a nwara gị ọnwụnwa itinye aka n’ajọ omume dị otú ahụ.—1 Ndị Kọrint 6:9-11.

Jiri Anya nke Uche Hụ Ihe Ndị Mere n’Akwụkwọ Nsọ

12. N’ihi gịnị ka a ga-eji jiri anya nke uche na-ahụ akụkọ Bible ka ị na-agụ ha?

12 Iji mee ka isi ihe dị iche iche bamie n’uche gị ka ị na-agụ ihe, jiri anya nke uche hụ ihe na-emenụ. Jiri uche hụ ọdịdị ala ahụ, ebe obibi, ndị ahụ. Nụ olu ha. Nụ ísì bred a na-esi n’ovun. Chetaghachi ọnọdụ ndị ahụ. Mgbe ahụ ịgụ ihe gị ga-abụ ahụmahụ na-akpali akpali, n’ihi na ị pụrụ ịhụ obodo oge ochie, rịgoo ugwu dị elu, nwee ihe ijuanya n’ịdị ebube nke ihe ndị e kere eke, ma ọ bụ soro ndị ikom na ndị inyom nwere okwukwe dị ukwuu kpakọrịta.

13. Ị̀ ga-esi aṅaa kọwaa ihe e dere ná Ndị Ikpe 7:19-22?

13 Ka e were ya na ị na-agụ Ndị Ikpe 7:19-22. Jiri anya nke uche hụ ihe na-ewere ọnọdụ. Onyeikpe Gideon na narị ndị ikom Israel atọ dị ike ewerewo ọnọdụ ha n’ọnụ ọnụ nke ọmụma ụlọikwuu ndị Midian. Ọ bụ ihe dị ka n’elekere iri nke abalị, mmalite nke “nche etiti abalị.” A ka zipụsịrị ndị nche Midian, ọchịchịrị na-ekpuchikwa ọmụma ụlọikwuu nke ndị iro Israel na-ehi ụra. Lee! Gideon na ndị ikom ya jicha opi ike. Ha ji nnukwute ite mmiri ndị na-ekpuchi ọwa ndị ha ji n’aka ekpe ha. Na mberede, ìgwè atọ ahụ nke dị otu narị mmadụ n’ìgwè nke ọ bụla fụrụ opi ike ha, tiwaa ite ndị ahụ, welie ọwa ndị ahụ elu, ma tie, sị: “Mma agha dịịrị Jehova dịkwara Gideon.” I lee anya n’ọmụma ụlọikwuu ahụ. Leenụ, ndị Midian etikapụ ọsọ, malitekwa iti mkpu! Ka narị mmadụ atọ ahụ nọgidere na-afụ opi ike ha, Chineke emee ka mma agha ndị Midian dịkwasị n’ahụ ibe ha. E mewo ka ndị Midian tikapụ ọsọ, Jehova enyewokwa Israel mmeri.

Ịmụta Ihe Ndị Bara Uru

14. Olee otú a pụrụ isi jiri Ndị Ikpe isi nke 9 kụziere nwatakịrị mkpa ọ dị ịdị umeala n’obi?

14 Site n’ịgụ Okwu Chineke, anyị pụrụ ịmụta ọtụtụ ihe. Dị ka ihe atụ, ikekwe ị chọrọ ime ka mkpa ọ dị ịdị umeala n’obi bamie n’ime ụmụ gị. O kwesịrị ịdị mfe iji anya nke uche hụ ma ghọta isi ihe e kwuru n’amụma nke nwa Gideon, bụ́ Jotam. Malite ịgụ ná Ndị Ikpe 9:8. Jotam sịrị: “Osisi jere eje ite otu onye mmanụ ka ọ bụrụ eze ha.” Osisi olive, osisi fig, na vine jụrụ ịchị. Ma ogwu na-enweghị ihe ọ bụ nwere obi ụtọ ịghọ onye ọchịchị. Ebe ị gụpụtawooro ụmụ gị akụkọ ahụ, ị pụrụ ịkọwa na osisi ndị bara uru nọchiri anya ndị mmadụ bara uru bụ́ ndị na-achọghị ọkwá eze n’elu ndị Israel ibe ha. Ogwu, nke bara uru nanị maka nkụ, nọchiri anya ọbụbụeze nke Abimelek dị mpako, onye ogbu mmadụ nke chọrọ ịchị ndị ọzọ ma zute ọnwụ ya ná mmezu nke amụma Jotam. (Ndị Ikpe, isi nke 9) Olee nwatakịrị ga-achọ itolite ma yie ogwu?

15. Olee otú e si mee ka ịdị mkpa nke iguzosi ike n’ihe pụta ìhè n’akwụkwọ Rut?

15 E mere ka ịdị mkpa nke iguzosi ike n’ihe doo anya n’akwụkwọ Bible bụ́ Rut. Ka e were ya na ndị òtù ezinụlọ gị na-agụpụta akụkọ ahụ onye gụsịa ibe ya agụọ ma na-agbalị ịghọta ihe ọ na-ekwu. Ị na-ahụ nwanyị Moab ahụ bụ́ Rut ka ọ na-aga Betlehem ya na nne di ya di ya nwụnahụworo, bụ́ Naomi, ị na-anụkwa ka Rut na-asị: “Ndị gị ga-abụ ndị m, Chineke gị ga-abụkwa Chineke m.” (Rut 1:16) A hụrụ Rut na-agba mbọ n’ubi Boaz ka o so ndị na-ewe ihe ubi na-achịkọta ihe ndị ha hapụrụ. Ị na-anụ ka ọ na-aja ya mma, na-asị: “Ọnụ ụzọ ama nile nke ndị m maara na nwanyị na-ejide onwe ya nke ọma ka ị bụ.” (Rut 3:11) N’oge na-adịghị anya, Boaz alụọ Rut. N’ikwekọ ná ndokwa nke alụmdi na nwunye nkuchi nwunye, ọ mụrụ nwa nwoke “nye Naomi” site na Boaz. Rut aghọọ nne nne nke Devid, e mesịakwa nke Jisọs Kraịst. O si otú a nata ‘ụgwọ ọrụ zuru okè.’ Ọzọkwa, ndị na-agụ akụkọ ahụ nke Akwụkwọ Nsọ na-amụta ihe bara uru: Guzosie ike n’ihe nye Jehova, a ga-agọzikwa gị n’ụba.—Rut 2:12; 4:17-22; Ilu 10:22; Matiu 1:1, 5, 6.

16. Ule dị aṅaa ka ndị Hibru atọ nwetara, oleekwa otú akụkọ a pụrụ isi nyere anyị aka?

16 Akụkọ maka ndị Hibru atọ ahụ aha ha bụ Shedrak, Mishak, na Abednego pụrụ inyere anyị aka ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke n’ọnọdụ ndị na-ele mmadụ ule. Jiri anya nke uche hụ ihe ahụ merenụ ka a na-agụpụta Daniel isi nke 3. Nnukwute onyinyo ọlaedo guzo ná ndagwurugwu Dura, bụ́ ebe e meworo ka ndị isi nke Babilọn zukọta. Mgbe a nụrụ ụda nke ngwá egwú dị iche iche, ha dara n’ala wee fee onyinyo ahụ nke Eze Nebukadneza guzobeworo. Ya bụ, mmadụ nile mere otú ahụ e wezụga Shedrak, Mishak, na Abednego. N’ụzọ nkwanye ùgwù, ma n’ụzọ ịkwụsi ike, ha gwara eze ahụ na ha agaghị efe chi ya nile, feekwa onyinyo ọlaedo ahụ. A tụbara ndị Hibru atọ a na-eto eto n’ime oké ọkụ nke e mere ka ọ dịbiga ọkụ oké. Ma gịnị mere? N’ilenye anya n’ime ya, eze ahụ hụrụ ndị ikom anọ dị ike, otu n’ime ha “yiri nwa nke ndị bụ chi.” (Daniel 3:25) E si n’oké ọkụ ahụ wepụta ndị Hibru atọ ahụ, Nebukadneza gọzikwara Chineke ha. Ọ bụrụwo ihe na-enyeghachi ụgwọ ọrụ iji anya nke uche hụ akụkọ ahụ. Leekwa ihe mmụta ọ na-enye banyere ikwesị ntụkwasị obi nye Jehova n’okpuru ule!

Rite Uru Site n’Ịgụ Bible Dị Ka Ezinụlọ

17. Ná mkpirikpi kọọ ụfọdụ n’ime ihe ndị bara uru ezinụlọ gị pụrụ ịmụta site n’ịgụkọ Bible ọnụ.

17 Ezinụlọ gị pụrụ irite ọtụtụ uru ma ọ bụrụ na unu na-etinyechi oge anya na-agụkọ Bible ọnụ. Na-amalite na Jenesis, unu pụrụ iji anya nke uche hụ okike ihe ma nyobanye anya n’ebe obibi mbụ nke mmadụ nke bụ́ Paradaịs. Unu pụrụ ikerịta ahụmahụ nke ndị nna ochie kwesịrị ntụkwasị obi na ezinụlọ ha ma sonyere ndị Israel ka ha na-agafe Osimiri Uhie n’ala akọrọ. Unu pụrụ ịhụ nwatakịrị nwoke ahụ na-azụ atụrụ bụ́ Devid ka o gburu dike Filistia ahụ bụ́ Golaịat. Ezinụlọ gị pụrụ ịhụ owuwu nke ụlọ nsọ Jehova dị na Jerusalem, ha pụrụ ịhụ mbibi nke usuu ndị agha Babilọn bibiri ya, ha pụkwara ịhụ mwughachi ya n’okpuru Onye Ọchịchị Zerubabel. N’isonyere ndị ọzụzụ atụrụ dị ala nọ nso na Betlehem, unu pụrụ ịnụ ịma ọkwa ahụ nke mmụọ ozi banyere ọmụmụ Jisọs. Unu pụrụ ịmụta ụmụ irighiri ihe banyere baptism ya na ozi ya, unu pụrụ ịhụ ka o nyefere ndụ mmadụ ya dị ka ihe mgbapụta, unu pụkwara ikere òkè n’ọṅụ nke mbilite n’ọnwụ ya. Ọzọkwa, unu pụrụ isoro Pọl onyeozi mee njem ma hụ nguzobe nke ọgbakọ dị iche iche ka Iso Ụzọ Kraịst na-agbasa. E mesịa, n’akwụkwọ Mkpughe ezinụlọ gị pụrụ inwe mmasị n’ọhụụ dị ebube nke Jọn onyeozi banyere ọdịnihu, gụnyere Ọchịchị Puku Afọ nke Kraịst.

18, 19. Aro dịgasị aṅaa ka e nyere banyere ọgụgụ Bible ezinụlọ?

18 Ọ bụrụ na unu na-agụpụta Bible dị ka otu ezinụlọ, gụọ ya n’ụzọ doro anya na n’ịnụ ọkụ n’obi. Mgbe unu na-agụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ụfọdụ, otu onye òtù ezinụlọ—ikekwe nna—pụrụ ịgụ akụkọ ahụ nile. Ndị ọzọ n’ime unu pụrụ iwere ọrụ nke ndị a kpọrọ aha n’ime Bible, jiri mmetụta kwesịrị ekwesị na-agụ akụkụ nke gị.

19 Ka unu na-ekere òkè n’ọgụgụ Bible dị ka otu ezinụlọ, ikike ịgụ ihe unu pụrụ ịkawanye mma. Ma eleghị anya, ihe ọmụma unu nwere banyere Chineke ga-amụba, nke a kwesịkwara ịdọta unu nso karị n’ebe ọ nọ. Esaf bụrụ abụ, sị: “Ma, mụ onwe m, ịbịaru Chineke nso dị m mma: edowo m ebe mgbaba m n’Onyenwe anyị, bụ́ Jehova, ka m wee kọọ akụkọ banyere ije ozi Gị nile.” (Abụ Ọma 73:28) Nke a ga-enyere ezinụlọ gị aka ịdị ka Mosis, bụ́ onye “nọgidesiri ike, dị ka ọ na-ahụ Onye ahụ Nke a na-apụghị ịhụ Ya anya,” ya bụ, Jehova Chineke.—Ndị Hibru 11:27.

Ịgụ Ihe na Ozi Ndị Kraịst

20, 21. Olee otú e si jikọta ọrụ ime nkwusa anyị na ikike ịgụ ihe?

20 Ọchịchọ anyị ife “Onye ahụ Nke a na-apụghị ịhụ Ya anya” kwesịrị ịkpali anyị ịrụ ọrụ iji bụrụ ndị na-agụ ihe nke ọma. Ikike ịgụ ihe nke ọma na-enyere anyị aka ịgba àmà site n’Okwu Chineke. N’ezie ọ na-enyere anyị aka ịnọgide na-arụ ọrụ nkwusa Alaeze ahụ nke Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ịrụ mgbe ọ sịrị: “Gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptism baa n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ: na-ezi ha ka ha debe ihe nile ka ha hà bụ nke M nyere unu n’iwu.” (Matiu 28:19, 20; Ọrụ 1:8) Ịgba àmà bụ ọrụ bụ isi nke ndị Jehova, ikike ịgụ ihe na-enyekwara anyị aka ịrụzu ya.

21 A chọrọ mgbalị iji bụrụ onye na-agụ ihe nke ọma na onye nkụzi dị nkà nke Okwu Chineke. (Ndị Efesọs 6:17) Ya mere, ‘na-anụ ọkụ n’obi iche onwe gị n’ihu mmadụ dị ka onye Chineke nwapụtaworo, na-ekwuzi okwu nke eziokwu ahụ.’ (2 Timoti 2:15) Mụbaa ihe ọmụma gị nke eziokwu Akwụkwọ Nsọ na ikike gị dị ka Onyeàmà Jehova site n’imikpu onwe gị n’ịgụ ihe.

Gịnị Bụ Azịza Gị?

◻ Olee otú obi ụtọ si adabere n’ịgụ Okwu Chineke?

◻ Gịnị mere ị ga-eji atụgharị uche n’ihe ị gụtara na Bible?

◻ Gịnị mere a ga-eji jiri njikọta na iji anya nke uche mee ihe mgbe a na-agụ Akwụkwọ Nsọ?

◻ Olee ihe ụfọdụ a ga-amụta site n’ọgụgụ Bible?

◻ N’ihi gịnị ka a ga-eji na-agụpụta Bible dị ka otu ezinụlọ, njikọ dịkwa aṅaa dị n’agbata ịgụ ihe na ozi ndị Kraịst?

[Foto ndị dị na peeji nke 13]

Mgbe a na-agụ Bible dị ka ezinụlọ, jiri anya nke uche hụ ihe ndị a na-akọ ma tụgharịa uche n’ịdị mkpa ha

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya