Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 5/15 p. 29-31
  • Ị̀ Bụ Onye Ọsụ Ụzọ Nwere Ezi Nhazi?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Bụ Onye Ọsụ Ụzọ Nwere Ezi Nhazi?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nọgide Na-adị Ike n’Ime Mmụọ!
  • Ịhazi Ibu Ọrụ Nile nke Ezinụlọ
  • Ezi Nhazi Akụ̀ na Ụba
  • Ndị Ọsụ Ụzọ Nwere Ezi Nhazi Bụ Ngọzi n’Ezie
  • Ngọzi nke Ozi Ọsụ Ụzọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ndị Ọsụ Ụzọ Na-enye ma Na-anara Ngọzi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Ịsụ Ụzọ Na-eme Ka Anyị na Chineke Dịkwuo ná Mma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Nọgidesie Ike N’ije Ozi Ọsụ Ụzọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 5/15 p. 29-31

Ị̀ Bụ Onye Ọsụ Ụzọ Nwere Ezi Nhazi?

ANYA nna ya na-egbuke ka ọ saghere aka ya na-eche ka nwa ya nwanyị zọọ nzọụkwụ ndị mbụ ya. Mgbe ọ dara na mberede, ọ gbara ya ume ịnwale ya ọzọ. Ọ maara na n’oge na-adịghị anya nwa ya ga-enweta ezi nguzo na ume ya.

N’ụzọ dịkwa otú ahụ, onye ozi ọsụ ụzọ ọhụrụ pụrụ ịchọ oge na agbamume tupu o nweta ezi nhazi dị mkpa iji nwee ihe ịga nke ọma dị ka onye nkwusa Alaeze oge nile. Ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ na-anọgide na-eje ozi n’ọṅụ ruo ọtụtụ iri afọ. Mgbanwe ọnọdụ ha dị iche iche nke ha na-atụghị anya ha na-achị ole na ole n’ụkwụ. Ụfọdụ ọbụna na-atụfu ọṅụ ha. N’otu mba, 20 pasent nke ndị malitere ịsụ ụzọ na-akwụsị n’ime afọ abụọ ndị mbụ nke ozi oge nile ha. Gịnị pụrụ iwepụ onye ọsụ ụzọ n’ozi a na-enye ọṅụ karịsịa? Ò nwere ihe a pụrụ ime iji zere ihe ndọghachi azụ ndị a?

Ọ bụ ezie na ahụ esighị ike, mkpa ego, na ibu ọrụ ezinụlọ pụrụ ime ka ụfọdụ hapụ ozi oge nile, ihe ịsụ ngọngọ nye ndị ọzọ abụwo ịghara ịnọgide na-enwe ezi nhazi n’etiti ibu ọrụ dị iche iche nke ndị Kraịst. Ezi nhazi na-apụta “ọnọdụ nke ọ na-adịghị otu akụkụ ma ọ bụ mmetụta na-anyịda nke ọzọ ma ọ bụ bukarịrị ndị ọzọ n’ibu.”

Jisọs Kraịst gosiri ndị na-eso ụzọ ya otú a ga-esi arụ ọrụ ime nkwusa na ime ndị na-eso ụzọ. N’ozi nke onwe ya, o mekwara ihe atụ otú a ga-esi nọgide na-enwe ezi nhazi. Jisọs gosiri na ndị ndú okpukpe ndị Juu enweghị ezi nhazi, na-agwa ha, sị: “Unu na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri nke mkpá akwụkwọ na-esi ísì ụtọ na anise na cummin, unu ahapụwokwa ihe ka arọ n’iwu, bụ́ ikpe, na ebere, na okwukwe: ma ọ dị mkpa ka unu mee ihe ndị a, ka unu gharakwa ịhapụ ihe ahụ.”—Matiu 23:23.

Ụkpụrụ a dabakwara nke ọma taa n’otu aka ahụ, karịsịa n’ozi ịsụ ụzọ. N’ịbụ ndị ịnụ ọkụ n’obi na ezi nzube kpaliri, ụfọdụ ewerewo ịsụ ụzọ na-akwadebeghị n’ụzọ zuru ezu maka ya ma ọ bụ tụlee ihe nile ọ gụnyere. (Luk 14:27, 28) Ndị ọzọ aghọwo ndị mibanyere n’ozi ubi nke na ha elegharawo akụkụ ndị ọzọ dị mkpa nke Iso Ụzọ Kraịst anya. Olee otú ha pụrụ isi nweta ma nọgide na-enwe ezi nhazi?

Nọgide Na-adị Ike n’Ime Mmụọ!

Ọ dịghị mgbe Jisọs leghaara ọnọdụ ime mmụọ ya anya. Ọ bụ ezie na ìgwè mmadụ ahụ bịara ịnụrụ ihe ọ na-ekwu na ịnata ọgwụgwọ chọrọ ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu nke oge ya, o wepụtara oge maka ekpere ntụgharị uche. (Mak 1:35; Luk 6:12) Ịsụ ụzọ n’ezi nhazi taa na-achọkwa ka mmadụ jiri ndokwa nile mee ihe n’ụzọ zuru ezu iji nọgide na-adị ike n’ime mmụọ. Pọl tụgharịrị uche, sị: “Gị onye na-ezi mmadụ ibe gị ihe, ị́ dịghị ezi onwe gị?” (Ndị Rom 2:21) Ọ ga-abụ ihie ụzọ n’ezie mmadụ iji oge ya nile na-emere ndị ọzọ nkwusa ma na-eleghara iwepụta oge maka ọmụmụ ihe onwe onye zuru ezu na ikpe ekpere mgbe nile anya.

Kumiko abụwo onye ọsụ ụzọ ruo iri afọ abụọ. Ọ bụ ezie na o nwere ụmụ atọ na di na-ekweghị ekwe, ọ chọpụtawo site n’ahụmahụ na oge kasịịrị ya mma ịgụ na ịmụ Bible bụ tupu oge ịlakpu ụra ya. Ka ọ na-amụ ihe, ọ na-arịba ama kpọmkwem isi ihe ndị ọ pụrụ iji eme ihe n’ozi ubi ka o wee nwee ike ịnọgide na-eme ka ozi ya kwa ụbọchị na-adị ọhụrụ ma na-adọrọ mmasị. Ndị ọsụ ụzọ ndị ọzọ nweworo ihe ịga nke ọma na-ebilite tupu ndị ezinụlọ ha ndị ọzọ iji nwetaghachi ume ọhụrụ nke ime mmụọ n’ime hour ụtụtụ ndị ahụ na-adị jụụ. Ị pụrụ isetịpụ oge ndị ọzọ kwesịrị ekwesị iji kwadebe maka nzukọ na ịgụ akwụkwọ ndị kasị ọhụrụ nke ndị Kraịst. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịnọgide na-enwe ọṅụ nke ozi ahụ, ọmụmụ ihe onwe onye abụghị ihe a ga-eme ọkụ ọkụ ma ọ bụ leghara anya.

Ịhazi Ibu Ọrụ Nile nke Ezinụlọ

Ọ dịkwa ndị nne na nna na-asụ ụzọ mkpa iburu n’uche na akụkụ dị ukwuu nke “ihe Onyenwe anyị na-achọ” ha n’aka gụnyere ilekọta mkpa elu ahụ, mmetụta uche, na ime mmụọ nke ezinụlọ nke aka ha. (Ndị Efesọs 5:17; 6:1-4; 1 Timoti 5:8) Mgbe ụfọdụ ọbụna onye òtù ọlụlụ kwere ekwe na ndị òtù ezinụlọ na-atụ egwu na ha agaghị enweta nkasi obi na nkwado site n’aka nwunye na nne ha ozugbo ọ malitere ịsụ ụzọ. Ụdị mmetụta ndị ahụ na-akpata mmeghachi omume nke ịnụ ọkụ n’obi na-adịchaghị na ya nye ọchịchọ ya ịghọ onye ọsụ ụzọ. Otú ọ dị, site n’ime ezi atụmatụ na ichepụ echiche n’ihu, a pụrụ ịnọgide na-enwe ezi nhazi.

Ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ na-agbalịsi ike ịrụ ọrụ nkwusa ha nile mgbe ndị òtù ezinụlọ ha na-anọghị n’ụlọ. Kumiko, onye a kpọtụrụ aha ná mmalite, na-esonyere ezinụlọ ya ka ha na-eri nri ụtụtụ ha, dupụ di ya na ụmụ ya n’ụtụtụ, ma lọghachi ụlọ tupu ha alọghachi. Ọ na-eji Monday nile na-esi nri dị iche iche tupu oge a ga-eri ha ka o wee nwee ike ịtụsara ahụ ma nweekwa ike isoro ezinụlọ ya rie nri kama iji ọrụ n’aka na kichin. Ịrụ ihe karịrị otu ọrụ e nwere n’ụlọ n’otu mgbe, dị ka ọrụ ụlọ ndị ọzọ mgbe a na-akwadebe nri, na-enyekwa aka. N’ụzọ dị otú ahụ, Kumiko ọbụna na-achọta oge ịkpọ ndị enyi ụmụ ya òkù n’ụlọ ya na ịkwadebere ha ihe ntụrụndụ pụrụ iche.

Ka ụmụaka na-eto na-eto na-abanye n’afọ iri na ụma ha, ha na-achọkarị ka ndị mụrụ ha lebakwuoro ha anya iji nagide mmetụta uche, ọchịchọ, obi abụọ, na egwu ndị ọhụrụ na-awakwasị ha. Nke a na-achọ ịmụrụ anya na mgbanwe n’usoro ime ihe nke nne ma ọ bụ nna bụ́ onye ọsụ ụzọ. Tụlee Hisako, nne na-asụ ụzọ nke mụworo ụmụ atọ. Gịnị ka o mere mgbe ada ya malitere igosipụta enweghị ọṅụ na ịnụ ọkụ n’obi maka nzukọ ndị Kraịst na ozi ubi n’ihi mmetụta nke ndị enyi ya n’ụlọ akwụkwọ bụ́ ndị ụwa na-enwe n’ahụ ya? Ihe dị mkpa n’ezie bụ ka ada ya mee eziokwu ahụ nke ya ma bụrụ onye o doro anya nke ọma na ịdị iche n’ụwa bụ ụzọ kasị mma ịgbaso.—Jemes 4:4.

Hisako na-ekwu, sị: “M kpebiri isoro ya mụgharịa ozizi ndị bụ isi n’akwụkwọ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi kwa ụbọchị. Na mbụ anyị pụrụ nanị ịmụ ihe ruo minit ole na ole, ada m na-emekarị mkpesa inwe oké afọ mgbu na isi ọwụwa mgbe oge ọmụmụ ihe ahụ ruru. Ma m na-eduzi ọmụmụ ihe ahụ mgbe nile. Mgbe ọnwa ole na ole gasịrị, mmụọ ya kawanyere mma nke ukwuu, na-eduje ná nraranye ya na baptism na nanị nwa mkpirikpi oge.” Ugbu a Hisako na-enwe ọṅụ n’ozi oge nile ya na ada ya.

Ọ dịkwa mkpa ka ndị bụ nna na-asụ ụzọ kpachara anya ka ha ghara imikpu onwe ha n’ilekọta ndị nwere mmasị n’ubi na ọrụ ọgbakọ ha nke na ha aghara inye ụmụ ha ndị na-eto eto nkwado mmetụta uche siri ike na nduzi kwesịrị ha. Ihe a abụghị ihe nwoke kwesịrị inyefe nwunye ya. Otu onye Kraịst bụ́ okenye nke na-eji ọrụ n’aka bụ́ onye bụworo onye ọsụ ụzọ ruo ogologo oge nakwa onye na-azụ ntakịrị ahịa na-ewepụta oge iji duziere nke ọ bụla n’ime ụmụ ya anọ ọmụmụ ihe n’otu n’otu. (Ndị Efesọs 6:4) Tụkwasị, ọ na-esoro ezinụlọ ya akwado maka nzukọ ndị a na-enwe kwa izu. Ndị ọsụ ụzọ nwere ezi nhazi adịghị eleghara ezinụlọ ha anya n’ụzọ anụ ahụ ma ọ bụ n’ụzọ ime mmụọ.

Ezi Nhazi Akụ̀ na Ụba

Ile mkpa e nwere kwa ụbọchị anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị bụ akụkụ ọzọ ebe ndị ọsụ ụzọ kwesịrị ịgbalịsi ike ịnọgide na-enwe ezi nhazi. N’ebe a kwa, anyị pụrụ ịmụta ihe dị ukwuu site n’ihe nlereanya na ndụmọdụ ọma nke Jisọs. Ọ dọrọ anyị aka ná ntị megide ịdị na-echegbubiga onwe anyị ókè banyere ihe onwunwe. Kama nke ahụ, ọ gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ibute Alaeze ahụ ụzọ, na-ekwe nkwa na Chineke ga-elekọta ha dị ka ọ na-emere ihe okike ya ndị ọzọ. (Matiu 6:25-34) Site n’ịgbaso ezi ndụmọdụ a, ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ enwewo ike ịnọgide n’ozi oge nile ruo ọtụtụ afọ, Jehova agọziwokwa mgbalị ha na-eme iji nweta ‘nri ụbọchị.’—Matiu 6:11.

Pọl onyeozi nyere ndị Kraịst ibe ya ndụmọdụ ‘ime ka mmadụ nile mara ezi uche ha.’ (Ndị Filipaị 4:5) N’ezie, inwe ezi uche ga-achọ ka anyị lekọta ahụ ike anyị anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Ndị ọsụ ụzọ nwere ezi nhazi na-etinye mgbalị nile iji gosi ezi uche n’ụzọ ndụ ha na n’àgwà ha n’ebe ihe onwunwe dị, na-amara na ndị ọzọ na-ahụ omume ha.—Tụlee 1 Ndị Kọrint 4:9.

Ndị ntorobịa bụ́ ndị na-ewere ozi ọsụ ụzọ kwesịrị ịghara ịdị na-eji mmesapụ aka nke ndị mụrụ ha na-eme ihe n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị. Ọ bụrụ na ha bi n’ụlọ nne na nna ha, ọ ga-abụ igosipụta ezi nhazi na ekele ikere òkè n’ọrụ ndị dị n’ụlọ nakwa inwe ọrụ nwa oge nke ga-eme ka ha nwee ike ịtụnye ụtụ n’ihe ọ na-efu iji na-elekọta ụlọ.—2 Ndị Tesalọnaịka 3:10.

Ndị Ọsụ Ụzọ Nwere Ezi Nhazi Bụ Ngọzi n’Ezie

Ị pụrụ ịbụ onye ọsụ ụzọ na-arụsi ọrụ ike iji nọgide na-enwe nhazi kwesịrị ekwesị. Nwee obi ike. Dị nnọọ ka nwatakịrị chọrọ oge iji mụta iguzozi onwe ya wee na-aga ije, ndị ọsụ ụzọ tozuru okè na-asị na o were ha oge iji nweta ezi nhazi n’ilekọta ọrụ ha nile.

Inwe ọmụmụ ihe onwe onye, ilekọta ndị òtù ezinụlọ, na igbo mkpa ihe onwunwe na-akpa ha so n’akụkụ ndị ọsụ ụzọ na-agbalị inwe ezi nhazi. Akụkọ na-egosi na ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ na-emezu ibu ọrụ ha n’ụzọ pụtara ìhè. Ha bụ n’ezie ngọzi nye ógbè ha, na otuto nye Jehova na nzukọ ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya