Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 6/1 p. 4-7
  • Mgbe Mbunobi Na-agaghị Adịkwa Ọzọ!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mgbe Mbunobi Na-agaghị Adịkwa Ọzọ!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Chineke Adịghị Ele Mmadụ Anya n’Ihu
  • Mmetụta Bible
  • Ịkwatu Ihe Mgbochi Nile nke Mbunobi
  • Ụzọ Isi Nagide
  • “Ha Agaghị Eme Ihe Ọjọọ”
  • Olee Mgbe Ịkpọasị Na-agaghị Adịkwa n’Ụwa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Ịkpọasị Bụ Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Ị̀ Bụ Onye E Nwere Mbunobi Megide?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Njedebe nke Ajọ Mbunobi
    Teta!—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 6/1 p. 4-7

Mgbe Mbunobi Na-agaghị Adịkwa Ọzọ!

DỊ KA e si kọọ, ọkà mmụta sayensị bụ́ Albert Einstein kwuru n’otu oge na n’ụwa a nke nọ na mwute, o siri ike imeri mbunobi karịa ikewa otu atọm. N’otu aka ahụ, Edward R. Murrow, bụ́ onye nta akụkọ wuru ewu n’oge Agha Ụwa nke Abụọ ma mesịa bụrụ onye nduzi nke Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ihe Ọmụma na United States, kwuru na “ọ dịghị onye pụrụ iwepụcha mbunobi—nanị nakwere ha.”

Okwu ndị a hà bụ eziokwu? Ọ̀ bụ ihe na-agaghị ekwe omume iwepụ mkpapụ iche na ịkpa ókè agbụrụ? Olee ihe Chineke na-eche banyere mbunobi?

Chineke Adịghị Ele Mmadụ Anya n’Ihu

Bible na-ekwu okwu megide ile mmadụ anya n’ihu. (Ilu 24:23; 28:21) O kwuru na “amamihe ahụ nke si n’elu bịa buru ụzọ dị ọcha, e mesịa ọ dị udo, nwee obi ọma, na-ekwenye okwu nke ọma, jupụta n’ebere na ezi mkpụrụ, n’enweghị obi abụọ, n’enweghị ihu abụọ.” (Jemes 3:17) E mesiri ụdị amamihe ahụ ike nye ndị ikpe n’Israel oge ochie. “Unu emela ajọ omume n’ikpe,” ka a tụziiri ha. “Ahụla onye na-enweghị ike ihu ọma, asọpụrụkwala ihu nke onye ukwu.”—Levitikọs 19:15.

Nguzo siri ike nke Bible megide ile mmadụ anya n’ihu na mbunobi bụ nke Jisọs Kraịst na ndị ozi ya bụ Pita na Pọl mesiri ike. Jisọs enweghị omume ile mmadụ anya n’ihu n’ebe ndị ‘a na-esogbu, na-achụsakwa, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha’ nọ. (Matiu 9:36) Ọ kụziri, sị: “Unu elela ihu kpee ikpe, kama na-ekpenụ ikpe ziri ezi.”—Jọn 7:24.

Pita na Pọl na-emesighachi anyị obi ike na Jehova Chineke n’onwe ya adịghị ele mmadụ anya n’ihu. Pita kwuru, sị: “N’ezie ana m aghọta na Chineke abụghị onye naele mmadụ anya n’ihu: kama n’ime mba ọ bụla onye na-atụ egwu Ya, onye na-arụkwa ọrụ ezi omume, bụ onye Ọ na-anara nke ọma.” (Ọrụ 10:34, 35) Pọl onyeozi na-agwa anyị, sị: “Ile mmadụ anya n’ihu adịghị n’ebe Chineke nọ.”—Ndị Rom 2:11.

Mmetụta Bible

Bible nwere ike ịgbanwe ọdịdị mmadụ nke ndị ọ na-edu. Ndị Hibru 4:12 na-asị: “Okwu Chineke dị ndụ, na-arụsikwa ọrụ ike.” Site n’enyemaka Jehova onye nwere mbunobi pụrụ ọbụna ịgbanwe ụzọ o si eche echiche ma ghọọ onye na-adịghị ele mmadụ anya n’ihu ná mmeso ọ na-emeso ndị ọzọ.

Dị ka ihe atụ, were ọnọdụ Sọl nke Tasọs. Dị ka ihe ndekọ Bible si kwuo, n’otu oge o ji ime ihe ike megide ọgbakọ ndị Kraịst n’ihi na ọ gbasoro ọdịnala a na-adịghị agbanwe agbanwe nke okpukpe. (Ọrụ 8:1-3) Ọdịnala ndị Juu mere ka o kweta n’ụzọ zuru ezu na ndị Kraịst nile bụ ndị si n’ezi ofufe dapụ na ndị iro nke ezi ofufe. Mbunobi ya dujere ya n’ịkwado ogbugbu nke ndị Kraịst. Bible na-asị na ọ “na-ewere ịba mba na ogbugbu kuo ume megide ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị.” (Ọrụ 9:1) Ka ọ na-eme nke ahụ, o chere na ya na-ejere Chineke ozi dị nsọ.—Tụlee Jọn 16:2.

Ma, Sọl nke Tasọs nwere ike iwepụsị mbunobi ya gafere ókè. Ọbụna ọ ghọrọ onye Kraịst n’onwe ya! Mgbe e mesịrị, dị ka Pọl, onyeozi nke Jisọs Kraịst, o dere, sị: “Abụ m onye na-ekwulu Chineke na mbụ, bụrụkwa onye nsogbu, na onye na-eme mmadụ ihe ihere: otú ọ dị, O meere m ebere, n’ihi na emere m ya n’amaghị ama n’ime ekweghị ekwe.”—1 Timoti 1:13.

Pọl abụghị nanị onye mere mgbanwe siri ike dị otú ahụ n’ụzọ o si eche echiche. N’akwụkwọ ozi o degaara Taịtọs, bụ́ onye na-ezisa ozi ọma ibe ya, Pọl dụrụ ndị Kraist ọdụ “ka ha ghara ikwulu onye ọ bụla, ghara ịbụ ndị na-alụ ọgụ, ka ha nwee obi ọma, na-egosi ịdị nwayọọ nile n’ebe mmadụ nile nọ. N’ihi na anyị onwe anyị bụrụkwa ndị na-enweghị uche n’oge gara aga, ndị na-ekwenyeghị, ndị a na-eduhie, ndị bu ohu agụụ ihe ọjọọ na ihe ụtọ dị iche iche, na-ebi n’obi ọjọọ na ekworo, ndị arụ, na-akpọrịta ibe anyị asị.”—Taịtọs 3:2, 3.

Ịkwatu Ihe Mgbochi Nile nke Mbunobi

Taa, ezi ndị Kraịst na-agbasi mgba ike ịgbaso ndụmọdụ ahụ. Ha na-achọ izere ikpe ndị mmadụ ikpe ná ndabere nke ihe a na-ahụ n’elu ahụ. Nke a na-egbochi ha “ikwulu” ndị ọzọ. Ha nwere òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ nke gabigara ókèala mba, ebo, na agbụrụ dị iche iche nke ụwa a.

Tụlee ahụmahụ nke Henrique, onye Brazil na-eji ojii. Ebe ya onwe ya bụ onye e mesoro omume ịkpa ókè agbụrụ, ọ zụlitere ịkpọasị gbasiri mkpọrọgwụ ike maka ndị ọcha. Ọ na-akọwa, sị: “Ndịàmà abụọ na-acha ọcha bịara n’ụlọ m ikwu okwu banyere aha Chineke. Na mbụ achọghị m ige ntị n’ihi na atụkwasịghị m ndị ọcha obi. Ma n’oge na-adịghị anya m pụrụ ịhụ na ozi ha yiri eziokwu. Otú ọ dị, m nakweere ọmụmụ Bible. Ajụjụ mbụ m jụrụ bụ, ‘E nwere ọtụtụ ndị ojii na chọọchị unu?’ Ha zara, ‘Ee.’ Mgbe ahụ ha gosiri m foto ikpeazụ dị n’akwụkwọ bụ́ Akwukwọm nke Akukọ Bible,a na-egosi ndị na-eto eto sitere n’agbụrụ dị iche iche. N’etiti ha bụ nwatakịrị nwoke na-eji ojii, nke a gbakwara m ume. Mgbe e mesịrị agara m Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova, ebe m hụrụ ndị sitere n’agbụrụ dị iche iche ka ha na-eji nkwanye ùgwù na-emeso ibe ha ihe. Nke a dị m oké mkpa.”

Ugbu a, dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova, Henrique nwere obi ụtọ isonyere ezi òtù ụmụnna ndị Kraịst. Ọ na-aghọta na otuto ya adịghị agara mmadụ ọ bụla. Ọ na-asị: “Taa m na-ekele Jehova na Jisọs maka ihe nile ha meworo n’ihi m. M na-esoro ọtụtụ nde ndị ohu Jehova na-anọgidesi ike n’ihe sitere n’agbụrụ, ụcha, na nzụlite dị iche iche na-arụkọ ọrụ, jikọọ aka ọnụ n’otu nzube.”

Mgbe ọ na-etolite, Dario bụ onye ọzọ e nwere mbunobi megide. Mgbe ọ gbara afọ 16, ọ malitere isoro Ndịàmà Jehova na-amụ Bible. O kwuru, sị: “N’etiti Ndịàmà, achọpụtawo m na e nweghị mmetụta nke ịka elu nke agbụrụ.” Ọnọdụ ezi ịhụnanya nke e nwere mere ya obi ụtọ. Ọ chọpụtara karịsịa na ndị nke agbụrụ dị iche iche jere ozi n’ọnọdụ ibu ọrụ dị iche iche n’ime ọgbakọ. Mgbe ọ bụla ndị na-anọghị n’ime ọgbakọ nwere ụdị ụfọdụ nke mbunobi ma ọ bụ ịkpa ókè megide ya, Dario na-echeta na Jehova hụrụ ndị nke mba, agbụrụ, na asụsụ nile n’anya.

Ụzọ Isi Nagide

Anyị nile nwere mmasị ịbụ ndị e mesoro omume n’ụzọ nkwanye ùgwù na nsọpụrụ. Ọ bụ ya mere ịbụ onye e nwere mbunobi megide ji bụrụ ule tara akpụ ịtachiri obi. Ọgbakọ ndị Kraịst adịghị echebe anyị pụọ n’ịbụ ndị e kpughere nye àgwà mbunobi nke ajọ ụwa nke a. Ruo ogologo oge Setan bụ́ Ekwensu na-achịkwa ihe omume nke ụwa, ikpe na-ezighị ezi ga-adị. (1 Jọn 5:19) Mkpughe 12:12 na-adọ anyị aka ná ntị, sị: “Ahụhụ ga-adịrị ụwa na oké osimiri: n’ihi na ekwensu arịdakwuruwo unu, na-enwe oké ọnụma, ebe ọ matara na o nwere nanị nwa oge.” Nzube ya abụghị nanị ịkpata nhụjuanya. E ji ya tụnyere anụmanụ na-eri anụ ndị ọzọ. Pita onyeozi na-agwa anyị, sị: “Onye ahụ nke na-ekuru unu gaa ikpe, bụ́ ekwensu, dị ka ọdụm na-agbọ ụja, ọ na-ejegharị, na-achọ onye ọ ga-elomi.”—1 Pita 5:8.

Bible na-agwakwa anyị, sị: “Ya mere doonu onwe unu n’okpuru Chineke; ma guzogidenụ ekwensu, ọ ga-agbapụkwa n’ebe unu nọ.” (Jemes 4:7) Enyemaka mara mma iji nagide mbunobi bụ ilegara Chineke anya maka nchebe, dị ka Eze Devid mere: “Chineke m, mee ka m gbapụ n’aka onye na-emebi iwu, n’ọbụ aka nke onye na-eme ajọ omume nke na-emekwa ihe ike.” (Abụ Ọma 71:4) Ọbụna anyị pụrụ ikpe ekpere dị ka ọbụ abụ ahụ, sị: “Meere m amara, Chineke; n’ihi na mmadụ ekusiwo ume ike ilo m: ogologo ụbọchị nile ka ọ na-ebu agha na-emegbu m.”—Abụ Ọma 56:1.

Olee otú Chineke ga-esi zaghachi n’ụdị ekpere ndị dị otú ahụ? Bible na-aza, sị: “Ọ ga-anapụta ogbenye mgbe ọ na-etiku ya; Ọ ga-anapụtakwa onye e wedara n’ala mgbe ọ dịghị onye na-enyere ya aka.” (Abụ Ọma 72:12, 13) Lee ka o si dị mma ịmara na n’oge a kara aka Jehova ga-eweta ahụ efe nye ndị nile ikpe na-ezighị ezi dabaara!

“Ha Agaghị Eme Ihe Ọjọọ”

Gọọmenti dị iche iche nke ụwa a pụrụ ịnọgide na-alụso mbunobi ọgụ site n’iwu na usoro ihe omume ha nile. Ha pụrụ ịnọgide na-ekwe nkwa ịha nhata na ime ihe ziri ezi. Ma ha agaghị enwe ihe ịga nke ọma. (Abụ Ọma 146:3) Nanị Chineke pụrụ, ọ ga-ewepụkwa mmeso mbunobi nile. Ọ ga-enwogha ihe a kpọrọ mmadụ ịbụ otu ezinụlọ dị n’otu. “Oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile, pụta” ga-alanarị ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe a ma nụrụ ụtọ nke ibi n’udo.—Mkpughe 7:9, 10.

Jehova ga-edozigharị mmerụ ahụ nile nke mbunobi agbụrụ na nke ọha mmadụ kpatara. Cheedị echiche, ọ dịghị onye a ga-emeso ihe n’ụzọ na-ezighị ezi! “Ha ga-ebi, onye ọ bụla n’okpuru osisi vine ya na n’okpuru osisi fig ya; ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji.” (Maịka 4:4) Aịsaịa 11:9 na-ekwukwa, sị: “Ha agaghị eme ihe ọjọọ.”

Ọ bụrụ na ị bụ onye e nwere mbunobi megide ugbu a, olileanya a magburu onwe ya maka ọdịnihu ga-ewusi mmekọrịta gị na Jehova ike. Ọ ga-enyere gị aka ịtachi obi n’ikpe na-ezighị ezi nile nke ajọ usoro ihe a. Ka ị na-anagide mbunobi ma na-elepụ anya n’ihu, gbasoo okwu ndụmọdụ nke Bible: “Dịnụ ike, ka obi unu nweekwa ume, unu nile ndị na-echere Jehova.”—Abụ Ọma 31:24.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

[Ebe e si nweta foto dị na peeji nke 4]

U.S. National Archives photo

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya